Matiu 28:18-20; Ndi Filipai 3:7-21; Ndi Efesọs 6:10-18; I Timọti 4:1-3; II Timọti 3:1-5; 4:1-8; II Ndi Kọrint 4:16-18; 5:1-4

Lesson 273 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Som hujukọ anya, dika onye-agha ọma nke Kraist Jisus” (II Timọti 2:3).
Notes

Ezi Ndị-agha Na Ngwa-agha Ha

Pọl Onye-ozi jiri ndụ nke Onye Kraist tụnyere ihe banyere ibú-agha, maọbụ agha. Ike nke ajọ ihe na-alụsi ọlụ ike nime ụwa, Onyenweanyị na-achọ kwa ka ndị Ya dị ike nwee kwa ume iji lusoo ya ọgụ. Ọ na-achọ ka ụmụ Ya bụrụ ezi ndị-agha.

Ka O wee nyere anyị aka imeri onye iro ahụ, Onyenweanyị n’enye anyị ihe-agha. Pọl sịrị: “Chilienu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ndi-iro-unu n’ajọ ubọchi, na iguzo, ebe unu luputaworo ihe nile” (Ndi Efesọs 6:13). Ana-enye onye-agha nke ụwa ụdị uwe nke ya na ọnọdụ okpomọkụ maọbụ oyi nke obodo ebe ọ na-aga ịlụ agha dakọtara; ana-enye ya egbe na ogbunìgwè ọ ga-eji chebe onwe ya, okpu ígwè maka nchebe, karama mmiri na òkè nke nri na mmiri ọ ga-eji mgbe ana-alụ agha; mgbe ahụ ewee zipụ ya izute ndị iro.

Ihe-agha nke Onye Kraist bụ ihe ị na-apụghị ịhụ anya, ma ị pụrụ ịhụta site n’otú o si ebi ndụ na o nwere ya. Mmụọ nke Chineke, eziokwu, eziomume, na nzọpụta bụ ụfọdụ nime ihe-agha ya.

Ihe Pọl ji tụnyere ya bụ onye-agha mgbe ochie nke bu mma-agha na ọta. Ọ sịrị na okwukwe bụ ọta anyị. Mmụọ Chineke bụ mma-agha anyị, eziomume bụ ihe igbochi obi anyị, eziokwu bụ ihe ike n’ụkwụ anyị, na nkwadobe nke Oziọma bụ ihe iyikwasị n’ụkwụ anyị

Ịnọ Na Njikere

Iyikwasị ihe-agha ahụ abụghị náánị ihe dị Onye Kraist mkpà ime ka o nwee mmeri zuru-òkè. Ọ ghaghị ịnọgide n’ikpe ekpere na iché nchè. Ekwensu dị aghụghọ nke ukwuu, ọ na-eme kwa ihe niile ọ pụrụ ime ibibi ezi onye-agha ọ bụla. Náánị ụzọ anyị pụrụ isite merie ya bụ idebe onwe anyị ná njikere mgbe niile, jikere iwere Okwu Chineke lusoo ya ọgụ mgbe ọ bụla ọ na-ezipụ àkụ ọkụ ya nke obi abụọ, ekweghi ekwe, nkwutọ, maọbu agụụ nke mmehie.

Otù mgbe ekwensu kuuru Jisọs gaa n’otù ugwu dị elu ịnwa Ya ọnwụnwa. Ọ chọrọ ka Jisọs kpọọ isi-ala nye ya ma feé kwa ya òfùfè. Òlee ihe i chèrè banyere ụdị anya-ike dị otú a? Ma Jisọs maara otú Ọ ga-esi busoo ya agha ma merie kwa. Ọ gụpụtara ya ihe edere n’Akwụkwọnsọ -- ekwensu wee gbalaga. Anyị pụkwara ime otù ihe ahụ Jisọs mere. Ọ bụrụ na anyi amụọ Okwu Chineke nkeọma, kwere kwa ha niile, anyị ga-enwe ihe anyị ga-eji zaghachị mgbe ọ bụla anyi nụrụ okwu ụgha banyere Baịbụl, maọbụ nụ òzìzí dị iche iche site n’ihe Jisọs kuziri.

Ikụzi Ihe Niile

Otù nime okwu ikpe-azụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ Ya tutu Ya alaghachị n’Eluigwe bụ: “Ya mere, ganu, me mba nile ka ha buru ndi nēso uzọm, nēme ha baptism bà n’aha nke Nna, na nke Ọkpara na nke Mọ Nsọ: nēzi ha ka ha debe ihe nile, ka ha ra, bú nke M’nyere unu n’iwu” (Matiu 8:19, 20). Jisọs chọrọ ka ha mara na ọ dị mkpà nye ha ikụzi ihe niile Ọ kụziwooro ha.

Ụfọdụ mmadụ na-echè na ụfọdụ òzìzí dị na Baịbụl adịghị mkpà, ha na-ekwu okwu banyere náánị ndị ha gụrụ na ha dị mkpà. Ụfọdụ ndịọzọ na-enwe nghọta dị ichè banyere ihe dị mkpà. Ma onye-agha dị ike bụ onye ahụ nke na-agụ òzìzí niile nke Onyenweanyị n’ihe dị mkpà; ọ na-ebi kwa ndụ ya dịka òzìzí niile ahụ si dị.

Aghụghọ Niile Nke Ekwensu

Agha anyị nke ezi ihe megide ihe ọjọọ malitererị n’oge ochie n’Ogide Iden. Ekwensu jiri aghụghọ merie agha ya mbụ megide Adam na Iv. O jighị egbe maọbụ nsí etinyere n’ikuku maọbụ iti ihe. O ji okwu nduhie merie. O ji okwu ọnụ ghọgbuo nne na nna anyị mbụ.

Anyị pụrụ ịnara ndụmọdụ site na nke ahụ ma kpachapụ kwa anya banyere ihe anyị na-ege. Ekwensu enwewo nnwapụta puku arọ isii (6,000) site na mgbe ahụ, ọ mụtawo kwa ọtụtụ ihe aghụghọ ọhụụ. Ya mere Onye Kraist aghaghị ịnọ na nché mgbe niile ka o wee ghara ịma n’ọnyà ịbà n’ụzọ niile nke mmehie.

Ihe-ụtọ nke mmehie na àkụn’ụba nke ụwa na-adọrọ ọtụtụ mmadụ baa n’ogige nke onye-iro. Ma ụfọdụ dị ndị ná-elefuru ihe niile dị otú a anya; ya mere ekwensu ga-esite n’ụzọ ọzọ iduhie ha. Ọ na-ezipụ ndị-amụmụ ụgha ime onwe ha ka ha bụ ndị-ozi nke Chineke. Ụfọdụ na-ekwere okwu ụgha agwara ha, n’ihi na ha ahụghị eziokwu n’anya. Ha chọrọ idebe mmehie ụfọdụ nime obi ha.

Pọl zutere ụfọdụ ndị òzìzí ụgha, wee kpọọ ha “ndi-ọlu nātu ntu.” Ma ọ sịrị na ọ bụghị ihe iju anya na enwere ndị dị otú a, ọ bụrụ na ekwensu onwe ya na-eme onwe ya ka o yie mmụọ ozi nke ìhè. “Ya mere ọ bugh ihe uku ma asi na ndi nējere ya ozi nēme ikwa onwe-ha ka ha yie ndi nēje ozi ezi omume; ndi ọgwugwu-ha gādi dika ọlu-ha si di” (II Ndi Kọrint 11:13-15).

Mmụọ Nke Ajọ Ihe n’ebe dị N’Eluigwe

Ụfọdụ ndị-òzìzì ụgha ndịa, bụ ihe-ọlụ nke ekwensu, na akpachapụ anya pụta iweta ọdịda nke mmadụ. Ha na-abànye n’ụlọ-akwụkwọ ndị okpukpé wee gwakọta onwe ha n’etiti ụmụ-akwụkwọ nwere ezi mkpebi, ná-ezipụta onwe ha mgbe niile dịka ndị hụrụ Onyenwaanyị n’anya. Mgbe enyesịworo ha ike ikwusa, ha na abànye n’ụlọ ụkọ dị iche iche dị n’ala anyị wee guzo n’azụ okpokoro nkwusa ná-agbasa nsí dị nime ha ichigharị obi ụmụ mmadụ ime ihe ọjọọ.

Ma ndịọzọ nọ kwa ndị bụ ihe-ọlụ nke ekwensu ndị emewo kwara ka ha bụrụ ndị-nzuzu, ndị eleghị anya ha aghọtaghị na ha “esiwo n’okwukwe dapu.” O nwere ike bụrụ na ha maara Onyenwe anyị na mbụ lụsie kwa ọlụ ike n’ijéozi Ya; ma, site n’ilefuru ekpere na ịmụ Baịbụl anya ha etufuwo Mmụọ nke Chineke. Ntakịrị ntakịrị ha esiwo n’òzìzí niile nke Okwu Chineke wezuga onwe ha. Ha abụrụwo ndị nwere mmasị n’ihe nke ụwa, kwenye kwa ka ịhụn’anya nke ihe ụwa baa nime obi ha. Kama ikuzi ihe niile Jisọs nyere n’iwu, ha na-akuzi náánị ihe ndị nzukọ ha chọrọ ịnụ. Ọtụtụ ndị nzukọ na-ekwu kwa dịka ndị Israel kwuru n’oge nke Aisaia: “Unu agaghi-ahuru ayi ihe ziri ezi n’ọhù-unu, gwanu ayi okwu ire utọ nile hunu ihe-ikwa-emo n’ọhù-unu” (Aisaia 30:10). Eleghị anya ha agaghị ekwu ya n’otù okwu ahụ ma ha ga-agwa ndị nkwusa ha ka ha meere ha ohere n’ihi mmehie ha dị iche iche, nke bụ kwa otù ihe dịka ndị ahụ kwuru.

Ịlụsọ Mmehie Ọgụ

Ọ bụ ọlụ dịrị ezi Nzukọ ahụ, Nzukọ ahụ ná-ebú agha, ịlụso mmehie ọgụ ebe ọ bụla achọtara ya. Náánị ụzọ anyị pụrụ isite mee nke a nkeọma bụ ibú ụzọ nwee ịhụn’anya Chineke nime obi anyị, mgbe nke a gasịrị ewee doo anyị nsọ, anyị ewee nata baptizim nke Mmụo Nsọ nke na-enye anyị Mma-agha nke Mmụọ.

Mgbe anyi nwetazuru iha-agha niile a, anyị aghaghị iji obi anyị chụọàjà mgbe niile maka ijéozi – iji-obi-chụọ-àjà dị omìmì nke furu anyị ihe. Ekwensu ji ike ya niile ná-alụ agha, Nzukọ ahụ ná-emeri emeri ga-eji kwa obi ya niile lụsie agha ike ọ bụrụ na ọ na-ele anya imeri.

Ụfọdụ mmadụ na-akuzi na ọ dịghị mkpà maọbụ na ọ bụ ihe ana-apụghị ime bụ ibi ndụ karịa mmehie. N’ihi gịnị, ibi ndụ ná-enweghị mmehie bụ ntọ-ala nke nnwapụta anyị dịka Ndị Kraist! Ọ bụrụ na azọpụtaghị anyị site ná mmehie anyị, anyị adịghị ichè site na ndị mmehie niile ọzọ. “Umuntakirim, unu ekwela ka onye ọ bula duhie unu: onye nēme ezi omume bu onye ezi omume, dika Ya onwe-ya bu onye ezi omume: onye nēme nmehie si n’ekwensu puta” (I Jọn 3:7, 8). Ya mere anyị pụrụ ikwu ngwa ngwa ma anyị bụ nwa Chineke maọbụ na anyị abụghị.

Ịlaghachị Azụ

Ndị ọzọ dị kwa ndị na-ekwenye na aghaghị ịmụ mmadụ ọzọ o wee mata kwa na agbaagharawo mmehie ya niile ma ha adịghị ekwenye na apụrụ ido mmadụ nsọ o wee bie kwa ndụ dị nsọ. “Nka bu ihe Chineke nāchọ bú ka edo unu nsọ.” “N’ihi na Chineke akpọgh ayi ka ayi buru ndi nādigh ọcha, kama n’odido-nsọ” (I Ndi Tesalọnaika 4:3, 7). Ụfọdụ na-arụ uka na nke ahụ pụtara ịdị-ọcha n’anụ-arụ na nkewapụ. Ma ọ gara omimi karịa nke ahụ. Pọl gara n’iru n’akwụkwọozi o degaara ndị Tesalọnaika site n’ikwu sị: “Chineke nke udo, Ya Onwe-ya dozu kwa unu nsọ n’uzọ dum; ka edebezu kwa mọ-unu na nkpuru-obi-unu na aru-unu dum, nādigh ita uta n’ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist” (I Ndi Tesalọnaika 5:23).

Ndịọzọ dị ndị na-ekwusa ịdị-nsọ, ná-ekwusi kwa ike mkpà ọ dị ibi ndụ dị ọcha, ma ha na-alaghachị azụ site na baptizim nke Mmụọ Nsọ. Jisọs sịrị: “Unu gānata ike, mgbe Mọ Nsọ gābiakwasiwori unu; unu gābu kwa ndi-àmàm nime Jerusalem, na nime Judia na Sameria nile, ru kwa ebe uwa sọturu” (Ọlu Ndi-ozi 1:8). Chineke na-achọ ka ndị-àmà Ya niile nwee ike ịkọ akụkọ banyere Jisọs, ka obi ụmụ mmadụ wee nwee mmetụta nke Mmụọ Chineke.

Ụfọdụ ndịozi nke Chineke dị ndị na-enwe mmetụta na ha enweghị ike, ma ha chọrọ ijere Onyenweanyị ozi karịa, ma ha agaghị achọ isi-iyi nke ike ahụ. Onye ọ bụla azọpụtaworo doo kwa nsọ, site n’onye dịkasịrị ntà rue n’onye dịkarịsị okenye, pụrụ ịnata ike ahụ ma ọ bụrụ na ọ ga-eji ndụ ya chụọàjà zuru òkè nye Onyenweanyị. Site n’ọnụ Joel Onyeamụma, Chineke kwere nkwà, “M’gāwusa Mọm n’aru anu-aru nile, bú madu” (Joel 2:28). Nke ahụ bụ baptizim nke Mmụọ Nsọ nke na-ejupụta na ndụ nke emeworo ka ọ dị ọcha site n’Ọbara Jisọs n’odudo nsọ.

Uche Nke Kraist

Mgbe Pọl Onyeozi na-edegara ndị Filipai akwụkwọozi ọ sịrị: “Nwenu uche a nime onwe-unu, nke di kwa nime Kraist Jisus: … (onye) weda kwara Onwe-ya, we buru Onye nāaña nti rue ọnwu” (Ndi Filipai 2:5, 8). Ọgụ anyị nwere ike bụrụ ọgụ nke anyị ga-alụ rue n’ọnwụ. Anyị jikeere ime ihe ra otú ahụ nke Onyenweanyị? N’ọgụ nke ndị Korea megide ọchịchị Communism, ọtụtụ Ndị Kraist dị ndị gosipụtara okwukwe ha nime Kraist site n’inye ndụ ha karịa ịgọnarị Onye-nzọpụta ha. Chineke chọpụtara ha dịka ndị Ọ pụrụ ịtụkwasị-obi, ndị ná-agụghị ndụ ha n’ihe dị óké ọnụ rue n’ọnwụ.

Ma mgbe ụfọdụ ọ na-esikarị ike ibiri Jisọs ndụ karịa ka ọ ga-adị ịnwụ ọnwụ n’ihi Ya. Ụfọdụ mmadụ dị ndị nwere ike ịpụta nnọọ otù mgbe were kwa ihe niile nye n’ịnụ ọkụ maọbụ iché aká-mgbá; ma ọ bụrụ na ha ka ga-ebi, site n’arọ rue n’arọ, ná-agọnarị onwe ha ihe ụfọdụ dị mkpà nke ụwa ka ha wee buru Oziọma, ha nwere ike ịdaghachị-azụ site n’ijiobichụọàjà ha meworo. Ka Onyenweanyị nyere anyị aka iburu obe anyị soro kwa Jisọs kwa ụbọchị, ná-echefu ọchịchọ na ihe-ụtọ niile nke onwe anyi n’ihi Ya.

Pọl sịrị: “Otú ọ di, ihe ọ bula nke baram urù, ihe ndia ka m’guru n’ihe-iyì n’ihi Kraist-ayi. E, tukwasi kwa, anamagu kwa ihe nile n’ihe-iyì n’ihi ọkika nke ọmuma Kraist Jisus, bú Onye-nwem: Onye m’yiri iyì ihe nile nkem n’ihi Ya, anamagu kwa ha n’ihe-nkpofu, ka m’we rita Kraist n’urù” (Ndi Filipai 3:7, 8).

Pọl kọwara ihe kpatara ịchụàjà ya. “Ka m’we mara Ya, na ike nke nbilite-n’ọnwu-Ya, na nnwekọ nke ahuhu-Ya nile, n’ihi na anēme ka mu na Ya nwekọ otù udi n’ọnwu-Ya; ọ buru na uzọ ọ bula di m’gēsi ru isi na ndi nwuru anwu bilite” (Ndi Filipai 3:10, 11). Ndụ ga na-aga n’iru rue ebighị-ebi, n’Eluigwe maọbụ n’ọkụ ala mmụọ. Pọl jikeere ịhụ ahụhụ niile n’ụwa a ka o wee nwee ike rue iketa òkè ná mbiliten’ọnwụ nke mbụ, isoro Jisọs bie ndụ chịa kwa ebighị-ebi

Ndị Kraist ahụ bụ ndị Korea na-enye ndụ ha n’ihi Kraist, ha nwe kwara otù olile anya ahụ. Ná mbiliten’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ ha niile ga-apụta isoro Onyenweanyị bie ebighị-ebi. Ọ bụ óké ihe ma ọ bụrụ na arụ ga-anagide ahụhụ ntakịrị n’ebe a? Ndụ anyị n’ebe a bụ ihe dịka náánị alụlụ ma eji ya tụnyere arọ niile na-adịghị agwụ agwụ nke ebighị-ebi. Ọ bụ kwa náánị ihe anyị lụrụ nye Onyenweanyị ka aga agụnye n’ihe mgbe anyị ga-eguzo n’iru Onye-ikpé nke ụwa niile.

Jisọs nyere ndụ Ya n’ihi anyị ka ewee zọpụta anyị. Ọ gaghị abụ ihe dị ebube ọ bụrụ na anyị ga-apụ iguzo n’iru Ya kwuo na anyị enyewo Ya ndụ anyị n’ihi Ya n’ijéozi nke ijiobichụọàjà? Ọbụná kwa dịka ndị egburu n’ihi okwukwe ha, ọ bụrụ na ọ dị mkpà?

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị ka onye-agha nke Kraist ga-alụso ọgụ?
  2. Gịnị bụ ihe-agha nke Onye Kraist?
  3. Gịnị bụ ezi ihe chebe anyị megide setan?
  4. Òzìzí Kraist ole ka Ọ gwara anyị ka anyị kuzie?
  5. Kwuo ụfọdụ ụzọ ekwensu na-esi aghọgbu ụmụ mmadụ.
  6. Òlee otú anyị pụrụ isi kwuo ihe dị iche n’etiti Onye Kraist na onye mmehie?
  7. Gịnị bụ ihe mere Pọl ji jikere ịgụ ihe niile n’ihe mkpofu?
  8. Gịnị ka Chineke na-ele anya ya n’ebe anyị nọ?