I Ndi Kọrint 15:19-23; Ndi Efesọs 5:25-27; I Ndi Tesalọnaika 4:13-18; Matiu 25:31-40; Nkpughe 11:15-18; 12:10, 11; 19:7-16; 20:4-6; 21:1-7

Lesson 274 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI “Ndi ahu we merie ya n’ihi ọbara Nwa-aturu ahu, na n’ihi okwu àmà-ha” (Nkpughe 12:11).
Notes

Ọbịbịa Nke Ugbò Abụọ Nke Jisọs

Baịbụl na-ekwu ihe banyere ọbịbịa nke ugbò abụọ nke Jisọs, nke gaje ime n’oge ná-adịghị anya, ná-agbaghị agụgọ. Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ Ya na Ya gaje ịrapụ ha ịlakwuru Nna Ya. Ọ sịrị: “Ọ buru kwa na Mu aga idoziri unu ebe, agajem ibia ọzọ, M’gānara kwa unu nye Onwem; ka unu onwe-unu we nọ kwa ebe Mu onwem nọ” (Jọn 14:3). Jisọs rapụkwara ha. Ndị ahụ na-ele Ya anya ka Ọ narịgo n’elu, igwe-ojii wee napụ kwa Ya pụọ n’anya ha. Ndịkom abụọ yikwasịrị uwe ọcha, gwara ha sị, “Jisus nka, Onye anapuru n’ebe unu nọ rigo n’elu-igwe, gābia n’otù aka ahu dika unu kiriri Ya ka Ọ naga n’elu igwe” (Ọlu Ndi-ozi 1:11).

Nwepụ na Nzuzo Nke Nzukọ Ahụ

Ọbịbịa Jisọs ga-adị okpukpu abụọ. Nke mbụ, nke Baịbụl na-akpọ “nbilite-n’ọnwu mbu” (Nkpughe 20:5, 6), jikọtara nwepụ na nzuzo nke Nzukọ ahụ. N’oge ahụ ndị-nsọ dị ndụ na ndị nọ n’ụra ọnwụ bụ ndị mejupụtara Nzukọ ahụ ka aga-eme ka ha niile ewee wepụ ha, bugoo kwa ha site na Mmụọ Nsọ, “ka agēwelikọ … izute Onye-nwe-ayị nime mbara-elu-igwe” (I Tesalọnaika 4:17).

Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ Ya banyere ihe dị iche iche gaje ime nime ụwa nke a. Ha jụrụ sị, “Òle mgbe ihe ndia gābu? Gini gābu kwa ihe-iriba-àmà nke ọbibia-Gi na nke ọgwugwu oge a?” Jisọs gwara ha banyere agha dị iche iche, óké ụnwụ, ọrịa ná-efé efè, na ala-ọma-jijiji nke ga-adị n’ebe dị iche iche. Ọ gwara ha na ụmụ mmadụ ga-akpọ ibe ha asị, ná-aghọgbu ibe ha, ná-arara ibe ha nye, ná-emejọ ibe ha, ná-egbu kwa ibe ha. Ọ gwa kwara ha na aga-ekwusa kwa Oziọma “n’elu-uwa dum madu bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.” O wee tụkwasị, “Mgbe ahu ka ọgwugwu ihe nile gēru kwa.”

Ihe niile ndịa emezuwo. Amụma niile eburu banyere ihe dị iche iche ga-eme tutu ọbịbịa nke abụọ nke Jisọs, abụrụwo ihe emezuru. Jisọs pụrụ ịbịa mgbe ọ bụla. Nke a mere eji dọọ anyị aka ná ntị ka anyi jikere maka ọbịbịa Ya. Ọ dịghị nkwupụta ọ bụla ga-adị na n’otù oge akpọrọ aha na Jisọs ga-abịa iwepụ Nzukọ ahụ na nzuzo. Ọbịbịa Jisọs ga-abịa na mberede, “dika àmùmà si n’ọwuwa-anyanwu puta, gosi kwa onwe-ya rue ọdida-anyanwu” (Matiu 24:27). Ọ dịghị onye ọzọ ma ọbụghị náánị Chineke Nna matara nnọọ oge mpụta ìhè nke Jisọs ga-adị (Matiu 24:36).

Olile anya Nke Onye Kraist

Ijikere maka ọbịbịa nke Jisọs bụ olile anya nke Onye Kraist ọ bụla. Pọl degaara Ndị Kraist nọ na Kọrint akwụkwọ sị na ọ bụrụ na olile anya anyị nime Kraist bụ náánị na ndụ a, anyị gabụ “ndi kwesiri ebere kari madu nile.” Ma Onye Kraist nwere olile anya nime Kraist na ndụ a na ndụ nke na-abịa, n’ihi na ọ na-ekwere na mkwà niile nke Chineke. Olile anya ahụ bụ “arilika nke nkpuru-obi, nke ihe-ntukwasi-obi na ihe nēguzosi ike” (Ndi Hibru 6:19). Ọ bụ olile anya ahụ na-eme ka onye kwere ekwe na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha, ọbụná dịka Kraist dị kwa ọcha (I Jọn 3:3).

Ibinyere Jisọs

Gịnị mere ọbịbịa nke ugbò abụọ nke Jisọs ji bụrụ ihe dị óké mkpà nye Ndị Kraist? Gịnị mere ha ji ná-ele anya ná-echere kwa ihe ahụ nke gaje ime? Ndị ahụ jikeere maka ọbịbịa Jisọs ga-anụ “olu isi-mọ-ozi” na “opi nke Chineke.” “Ndi nwuru nime Kraist gēbu kwa uzọ si n’ọnwu bilie”; mgbe ahụ ndị nọ ná ndụ ka “agēwelikọ n’igwe-oji, izute Onye-nwe-ayi nime mbara-elu-igwe” otú a ka anyi na Jisọs ga-anọ kwa ebighị-ebi (I Ndi Tesalọnaika 4:16, 17).

Lee otú ọ na-agụsi ọtụtụ mmadụ agụụ ike ịhụ iru Onye-mgbapụta ha! Lee otú ọ na-agụsi ọtụtụ mmadụ agụụ ike ịla n’Eluigwe! Ndị jikereworo maka Mbiliten’ọnwụ nke Mbụ ga-enwe ihe karịrị nleba anya ntà, ihe karịrị náánị ịhụ Ya n’anya, karịa náánị izute Onye-nzọpụta ha! Ha na Jisọs ga-anọ ebighi-ebi. Ha ga-esonye ná-abụ Haleluya n’Eluigwe ná-asị, “Haleluya; Nzọpụta nile na otuto nile na ike nile nādiri Chineke-ayi” (Nkpughe 19:1). Ha gabụ “ndi-nchu-àjà nke Chineke na nke Kraist, ha gēso kwa Ya buru eze nnù arọ abua na ọgu iri.” Ná Nkpughe 20:6 anyị naagụ, “Ngọzi nādiri ya, ọ di kwa nsọ, bú onye nwere òkè nime nbilite-n’ọnwu mbu ahu”.

Njikere

Eluigwe bụ ebe edoziworo (Jọn 14:2). n’ihi ndị edoziworo (Nkpughe 19:7). Ka anyị tụlee otú mmadụ pụrụ isi kwadobe maka Eluigwe nọdụ kwa ná njikere maka ọbịbịa nke Onyenweanyị. Baịbụl na-enye anyị ndụmọdụ nke dịrị ụmụntakịrị dịka ọ dịrị ndị-okenye. Aghaghị ịsachapụ mmehie nke mmadụ site n’Ọbara Jisọs, ka o wee bụrụ nke Onyenweanyị (Nkpughe 7:14). Mgbe azọpụtara mmadụ, Onyenweanyị na-enye ya ike ibi ndụ ná-enweghị mmehie (I Jọn 3:9). Mgbe mmadụ mehiere ọ bụghị kwa nwa Chineke. “Onye nēme nmehie si n’ekwensu puta” (I Jọn 3:8) na “orù nke nmehie” (Jọn 8:34).

Mmadụ aghaghị ịnọgide n’ime uche Chineke na irubeisi n’Okwu Chineke, ka o wee bụrụ onye ná-eso ụzọ Ya (Jọn 8:31). “Onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa” (Matiu 10:22). Baịbụl na-akuzi na mmadụ aghaghị ijéijè n’ìhè nke Jisọs na-enye (I Jọn 1:7). Anyị ndị ná-amụ ihe ọmụmụ ndịa nke Ụlọ-akwụkwọ Ụbọchị-ụkọ nwere ìhè dị ukwuu. Anyị nwere ìhè n’ihi na anyị anụwo ihe banyere nzọpụta (Ndi Rom 10:9), banyere idozi ụzọ (Ihe ọmụmọ 269), banyere mkpà ọ dị ibi ndụ dị ọcha, ịdị-nsọ, nke ná-enweghị ntụpọ (I Pita 1:15, 16; II Pita 3:11; Ndi Efesọs 5:26, 27), na ihe banyere mkwà nke Nna, nke bụ baptizim nke Mmụọ Nsọ, nke Jisọs nyere ndị ná-eso ụzọ Ya iwu ịnata (Ọlu Ndi-ozi 1:4, 5, 8).

Mgbe mmadụ na-ejègharị n’ìhè niile ọ nataworo, onye ahụ ga amata n’obi ya na ya ejikerewo izute Onyenweanyị. Ọ ga-edebe onwe ya “nēnwegh ntupọ site n’uwa” (Jemes 1:27). Ọ ga na-eche nche na-ele kwa anya ọbịbịa ọsọsọ nke Jisọs (Taitọs 2:11-13), Ò doro gị anya na i jikerewo maka ọbịbịa ọsọsọ nke Onyenweanyị? Ọ bụrụ na ọ bụghị otú ahụ, gịnị mere ị kpeghị ekpere chọọ kwa Chineke rue mgbe ị ga-amata na i jikerewo maka Nwepụ na nzuzo ahụ?

Ndị Meriri Emeri

Tupu mmadụ abụrụ onye jikeere maka ọbịbịa nke Jisọs, ọ ghaghị ịbụ onye meriri emeri n’òzùzù òkè. Onye meriri n’òzùzù òkè na-emeri ụwa, anụ-arụ, na ekwensu. “Nka bu kwa nmeri nke meriworo uwa, bú okwukwe-ayi (I Jọn 5:4). Ọ bụghị ihe ịtụ-n’anya na enyere anyị ndụmọdụ ka anyị “nāgbasi ngba ike n’ihi okwukwe ahu nke enyere ndi nsọ n’aka náánị otù mgbe idebe” (Jud 3)! Ọ bụ site n’okwukwe anyị nime Kraist ka anyị na-enwe mmeri. Mmadụ pụrụ ịbụ onye mmeri site n’okwukwe, “n’ihi ọbara Nwa-aturu ahu,” na n’ihi okwu àmà-ya (Nkpughe 12:11). Gụọ ihe ekwere onye mmeri ná mkwà nke a “Onye nēmeri gēketa ihe ndia; M’gābu-kwa-ra ya Chineke, ya onwe-ya gābu-kwa-ram nwa” (NKpughe 21:7). Lee otú obi na-atọ mmadụ ụtọ ịgụ banyere ihe niile Chineke kwadobewooro ndị Ya! Lee otú mmadụ ga na-enyocha obi ya, na-atụ kwa egwù ka anyị wee ghara ịbụ ndị na-agaghị eru “ibà n’izu-ike-Ya” (Ndi Hibru 4:1)!

Ịbịa Dịka Eze

Mpụta-ìhè nke Jisọs na Nwepụ na nzuzo nke Nzukọ ahụ bụ otù akụkụ nke ọbịbịa Ya nke ugbò abụọ. Akụkụ nke ọzọ ga-abụ mgbe Onyenweanyị ga-abịaghachị dịka Onye meriworo emeri, “na ndi nsọ anāpugh iguta ọnu” (Jud 14) ịbụ “EZE kachasi NDI-EZE nile, NA ONYE-NWENU kachasi NDI-NWENU nile” (Nkpughe 19:16). Aga anụ ọtụtụ olu site n’Eluigwe na-asị, “Ala-eze nke uwa aghọwo ala-eze nke Onye-nwe-ayi, na nke Kraist-Ya; Ọ gābu kwa eze rue mgbe nile ebigh-ebi” (Nkpughe 11:15).

Nke ahụ bụ oge “Nwa nke madu gābia n’ebube Ya.” Aga achịkọta mba niile nke ụwa n’iru Ya. Onyenweanyị ga-eme nkewa dịka onye ọzụzụ-atụrụ nēkewaputa aturu n’umu ewu” (Matiu 25:31, 32). Ndị ná-asọpụrụ Chineke bụ atụrụ -- ndị dị nwayọ, ndị nwere ntachị-obi, ndị bara urù. Ndị ná-adịghị asọpụrụ Chineke bụ ewu -- ndị isi-ike, ndị nnupu-isi, ndị ná-adịghị ekwe nchịkọta. Ekwenyere ka ha bikọta n’ụwa a, ma oge nkewa na-abịa. Atụrụ ahụ ga-anụ ka Eze ahụ na-asị “Bianu, ndi agọziri agọzi nke Nnam, ketanu ala-eze edoziworo unu site na ntọ-ala nke uwa.” Aga-enye ndị ná-asọpụrụ Chineke ihe nketa, ihe onwunwe dị óké ọnụ-ahịa akwadobeere ndị nke Chineke. Gịnị kpatara eji enye ha ụgwọ-ọlụ ahụ? Ha kwesịrị ntụkwasị-obi rube kwa isi. Ọlụ ha niile gosipụtara na azọpụtara ha -- ndị eji Ọbara Jisọs zụta. Ha gosiri ndịọzọ ịhụn’anya, jụ onwe ha; ihe niile ha mekwara, ka ha mere n’aha Jisọs na n’ihi otuto Ya.

Ndị ná-adịghị asọpụrụ Chineke ga-anụ okwu ndịa: “Puanu n’irum, ndi anābu ọnu, … Ka ọ ra, bú otú unu nēmegh ya nye otù onye nime ndia dikarisiri ntà, Mu ka unu nēmegh ya nye” Ndị ná-adịghị asọpụrụ Chineke ga-anata ahụhụ n’ihi ihe niile ha ná-emeghị. Ndụ ha ga-egosipụta na ha enweghị nzọpụta, na ha erubeghị-isi n’okwu niile nke Baịbụl, ihe niile ha mekwara ha emeghị ha n’ihi otuto nke Jisọs. Aga-ehetara ha oge niile ahụ ha ná-enyereghị ndịọzọ aka mgbe ha kwesịrị ime otú ahụ. “Ndia gāpu je ba n’ahuhu-nmehie ebigh-ebi: ma ndi ezi omume gābà na ndu ebigh-ebi.

Onye Meriri emeri

Ndị ná-asọpụrụ Chineke ga-enwe ndụ ebighị-ebi n’ihi na dịka “onye-iro ikpe-azụ, agaje ime ka ọnwụ ghara idi irè,” ka aga-elomi “rue nmeri” (I Ndi Kọrint 15:26, 54). Kraist ga-abụ Onye meriri ndị-iro Ya niile (I Ndi Kọrint 24, 25) -- ekwensu (Nkpughe 20:10), ndị niile na-eso ụzọ ekwensu (Nkpughe 20:15), na ọnwụ na hedis (Nkpughe 20:14). N’ihi na Kraist bụ Onye-mmeri zuru òkè ndị Ya -- Nzukọ ahụ -- ga-enwe kwa mmeri. “Ekele diri Chineke, Onye nēnye ayi nmeri site n’aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist” (I Ndi Kọrint 15:57).

Mgbe ahụ nzọpụta nke Ndị Kraist ga-ezu òkè. Ha ga-enwe mmeri n’ebe ọnwụ, ala mmụọ, na ílì dị, site n’ike nke Jisọs. Ndị Kraist ga-enwe mmeri ikpe-azụ ha. Agaghị anwa kwa ha ọzọ imehie! Ha agaghị alụso kwa ekwensu ọgụ ọzọ! Ha agaghị enwe kwa mmetụta nke ọrịa na nhuju anya ọzọ, iru-uju na ọnwụ agaghị adịkwa, ịkwa ákwá na ihe-mgbu agaghị adịkwa! “Chineke gēhichapu kwa anya-mmiri nile ọ bula n’anya-ha” (Nkpughe 21:4).

Lee óké ọñụ na mmeri! Lee óké inwe mmeri na ụgwọ-ọlụ nke a bụ! Ihe niile ndịa na ihe karịrị ndịa na-echere ndị niile ga-ejisi ike iguzoro Jisọs, ndị ná-ejikere onwe ha maka Eluigwe, ndị ná-ele kwa anya Onyenwe ha na Onyenzọpụta ha, Jisọs Kraist.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Òlee otú anyị si mata na Jisọs na-abịa ọsọsọ?
  2. Kpọọ aha ụzọ ihe abụọ ga-eme nke ga-emejupụta ọbịbịa nke ugbò abụọ Jisọs?
  3. Gịnị ga-ewere ọnọdụ mgbe ewepụrụ Nzukọ na nzuzo?
  4. Gịnị ga-eme Ndị Kraist ahụ daworo n’ụra ọnwụ?
  5. Òlee otú mmadụ ga-esi mara na ya ejikerewo maka ọbịbịa Jisọs?
  6. Oge ra añaa ka Ndị Kraist na Jisọs ga-anọ?
  7. Òlee otú mmadụ pụrụ isi bụrụ onye ná-emeri emeri?
  8. Gịnị ka ekwere onye ná-emeri emeri ná mkwà?
  9. Ònye ga-abụ Eze kachasị ndị-eze niile na Onye-nwenụ kachasị ndị-nwenụ niile?
  10. Òlee ndị ga-eguzo n’iru Jisọs ka ekpee ha ikpé?