Ilu 1:1-33; 2:1-22

Lesson 275 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Egwu JEHOVA bu nmalite ihe-ọmuma: amam-ihe na idọ-aka-ná-nti ka ndi gbagọrọ agbagọ n’uche ledaworo anya” (Ilu 1:7).
Cross References

I Ọkpụkpọ-òkù nke Amam-ihe

1. Enyere ilu iji kuzie amam-ihe, Ilu 1:1-6; Matiu 13:10, 11; Mak 4:10-12

2. Ịdọ-aka-ná-ntị nke ndị bụ nne-na-nna bụ ihe ịchọ mma nke amara, Ilu 1:7-9; Ọpupu 20:12

3. Zeere ịra-ụrà ọjọọ niile, Ilu 1:10-19; I Ndi Tesalọnaika 5:22; I Ndi Kọrint 15:33

4. Olu nke amam-ihe ka áná-anụ ebe niile, Ilu 1:20-24; Abù Ọma 19:1-6; Luk 9:6; Ọlu Ndi-Ozi 8:4; Ndi Rom 1:18-21

5. Edebere ikpé nye onye ná-ákwá emò, Ilu 1:24-32; 29:1

II Ụgwọ-ọlụ ahụ nke dịrị Ịzà-Òkù ahụ

1. Ige-ntị na-eweta ụgwọ-ọlụ, Ilu 1:33; Jeremaia 38:20

2. Onye ná-achọsi Chineke ike ga-achọta Ya, Ilu 2:1-5; Jeremaia 29:13; Matiu 5:6; 13:44

3. Jehova ná-enye amam-ihe, Ilu 2:6-9; Jemes 1:5

4. Ìzùzù gana-eché gị nchè, Ilu 2:10-22; Daniel 4:27

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Eweere Amam-ihe Dịka Mmadụ

“Amam-ihe nēti nkpu n’èzí; n’ama nile ka ọ nēme ka olu-ya da udà;

“N’isi ebe nile anātu ùzù ka ọ nākpọ òkù n’oghere ọnụ-uzọ-ama nile; n’obodo, ka ọ nēkwu okwu-ọnụ-ya nile” (Ilu 1:20, 21).

Akwụkwọ Ilu jupụtara n’okwu amụma. Mgbe Solomon na-ede okwu ndịa nke ná-ewuli obi, ọ ga-adịworị mmụọ dị nime ya nke ghọtara àtụmàtụ Chineke n’ebe mmadụ nọ n’ọgbọ niile nke gaje ịbịa. Amam-ihe a nke ana-ekwu banyere ya abụghị ihe ọzọ karịa Mmadụ: Amam-ihe a nke ghọrọ mmadụ bụ Kraist Jisọs -- ọ bụghị amam-ihe nke ụwa, ọ bụghị amam-ihe ahụ nke ụmụ mmadụ na-achụso taa n’ụwa nke a, kama amam-ihe ahụ nke si n’elu.

Ọkpara Chineke guzoro n’óké ụbọchị ikpe-azụ nke ememe ahụ wee tie mkpu sị, “Ọ buru na akpiri kpọrọ madu ọ bula nku, ya biakutem, ñua miri” (Jọn 7:37). N’ebe ọgụgụ a sitere n’Akwụkwọ-nsọ anyị na-ahụ na “amam-ihe nēti mkpu n’èzí; n’ama nile ka ọ nēme ka olu ya da uda.” Jisọs guzoro n’ama niile; ahụrụ Ya n’ọma-ahịa niile; O ziri ihe ná nnukwu ọgbakọ dị iche iche ebe ọtụtụ mmadụ zukọrọ.

Amam-ihe nke Chineke

Amam-ihe nke Chineke zuru òkè dị nime Jisọs Kraist. N’Akwụkwọ-ozi anyị na-agụ na nime Ya “ka òzùzù nile nke ihe Chineke bu nēbigide nwere aru madu,” nime Ya kwa ka “àkù nile nke amam-ihe na ihe-ọmuma di nime Ya, bú ihe ezoro ezo nime Ya” (Ndi Kọlọsi 2:3, 9). Okwu Chineke ka ekwupụtara na ọ bụ amam-ihe nke Chineke; mgbe nwoke ma-ọbụ nwayị na-edebe Okwu Chineke n’obi ya, wee kwee ka edee ụkpụrụ niile ahụ na tebụl nke obi ya, o nwere amam-ihe rue nzọpụta; mgbe ahụ ka ọ na-amara ihe ahụ nke kwesịrị ịmara karịa ihe niile -- nguzo nke ime mmụọ ya n’iru Chineke. Pọl, ka ọ na-agwa Ndi Kọrint okwu, sịrị “Ayi onwe-ayi nēkwusa Kraist, na akpọgidere Ya n’obe, Onye buru ndi-Ju ọnyà, buru kwa ndi mba ọzọ ihe-nzuzu; ma Ọ buru ndi akpọrọ, ma ndi-Ju ma ndi Grik, Kraist, bú ike nke Chineke, na amam-ihe nke Chineke” (I Ndi Kọrint 1:23, 24).

Ihe-nzuzu ahụ nke Dị ná Nlefuru-anya

Mkpú ahụ nke amam-ihe na-eti n’ama niile bụ, “Unu ndi nēnwegh uche, rùe ole mgbe ka unu gāhu enwegh-uche n’anya?” Ndị ahụ bụ “ndi nēnwegh uche” bụ mmadụ ndị ahụ na-aga ná-enweghị nlezi anya nime ụwa, ná-échèghị uche banyere Chineke nke nzọpụta ha, ma-ọbụ tụgharịa uche banyere ikpe-azu ha. Ọ dị okwu ịdọ aka-ná-ntị nke na-ada n’Okwu Chineke, nke na-asị, “Àyi onwe-ayi gēsi aña gbanari, ma ọ buru na ayi lefuru oké nzọputa di otú a anya?” (Ndi Hibru 2:3). Ụfọdụ mmadụ n’ụbọchị taa na-eleli nzọpụta ha ná-échè na ịdị-mma Chineke ga-eleghara enweghị nlezi anya ha anya meghe kwara ha Ọnụ-ụzọ ama niile nke Eluigwe n’ikpe-azụ inye ha nnabata ahụ dị ebube nime Obodo Ọla-edo ahụ; ma Akwụkwọnsọ kwupụtara ya n’ụzọ pụtara ìhè na nke ziri ezi na ọ dịghị mgbanarị ọ bụla dị nye “ndi nēnwegh uche” ndi lefuuru óké nzọpụta ahụ anya.

Amam-ihe Ụwa

I nwere ike ịtụkwasị uche n’amam-ihe nke ụwa, i nwekwara ike ná-agbaso ụzọ ahụ nke ụwa na-aga na ya n’ụbọchị taa. Ọ dị óké nchụso nke mmụta n’ụwa nke a, ọchịchọ nke ịmụ ihe n’akwụkwọ dị elu. Ụlọ-akwụkwọ, kọleji na mahadum dị iche iche nke ana ewu n’ụwa niile bụ ihe-àtụ nke óké nchụso n’ebe mmụta na nghọta dị. Anyị apụghị ịmalite itụle nnyocha na nchọpụta dị ebube nke ndị mmadụ na-eme n’ụbọchị taa. Ma nime ihe-ọmụma niile nke ụwa nke a mkpurụobi ụmụ mmadụ na-ala n’íyì -- n’otù ụzọ ịlan’íyì ná-enweghị olile-anya ahụ nke mkpụrụobi ogbenye ahụ ná-échègharịghị échègharị, onye ná-enwèghị mmụta nke bi kwa nime obodo ná-emepeghị anya.

Onye Ná-ákwá Emò

Ihe-ọmụma na-eti mkpu n’ama niile; amam-ihe na-eme ka olu ya daa ụdà, ná-asị: “Unu ndi nēnwegh uche, rùe ole mgbe ka unu gāhu enwegh-uche n’anya rùe ole mgbe ka ndi nākwa emò gāchọsi-kwa-ra onwe-ha ikwa-emò ike?” (Ilu 1:22). Ọ dị òtù ndị mmadụ ọzọ ndị ná-ákwá aha Jisọs emò, ná-eji Baịbụl nke a ná-eme ihe-ọchị, ná-asị, “Anyị chọrọ Baịbụl ọhụụ nke kwesịrị ọgbọ ọhụụ.” Ha na-ala n’íyì n’ezie dịka ndị ahụ lefuru óké nzọpụta ahụ anya. “Rue ole mgbe … ka … ndi-nzuzu gākpọ kwa ihe-ọmuma asì?” (Ilu 1:22).

Chineke adịghị akpọ ụmụ mmadụ ndị nzuzu n’ihi na ha bụ ndị iberibe -- ọ bụghị ya ma-ọlị! Akpọrọ ha ndị nzuzu n’ihi na ha atụleghị ikpe-azụ ha, n’ihi na ha atụgharịghị uche n’ihe ahụ nke kachasị mkpà n’ebe ọdị-mma nke mkpụrụobi ha ná-adịghị- anwụ anwụ dị.

Jisọs kwuru okwu banyere otù nwoke nke nwere àkụ rii nne nke ọ kpadoro n’ụlọ-àkụ nye ọtụtụ ụbọchị; ma n’oge ahụ nke o nwere ezi nchebe, Chineke si n’Eluigwe wee kwue okwu sị, “Onye nēnwegh uche, n’abali a ka anāchọ nkpuru-obi-gi n’aka-gi” (Luk 12:20). Chineke akpọghị ya onye ná-enweghị uche n’ihi na ọ dị ihe kọrọ n’akọ n’uche ya; Chineke gwara ya okwu n’ihi na o lefuru amam-ihe ahụ nke si n’elu anya. Ọ chọrọ náánị ihe gbasara onwe ya; ọ chụsoro ihe ndị ahụ nke ga-emezu ọchịchọ niile nke anụ-arụ ya, wee chọta kwa ha; ma n’etiti àkụn’ụba ya ọ nụrụ olu Chineke nke ná-asị, “Onye nēnwegh uche.” O geghị ntị Olu nke Amam-ihe nke ná-eti mkpu nye mmadụ niile n’ebe ọ bụla, “Laghachinu n’iba-nbam” -- chègharịa, jikere izute Chineke.

Ọgwụgwụ nke Ndị Ná-ajụ Òkù Chineke

O! ọnọdụ iru-uju nke ndị ahụ jụrụ ichịgharị pụọ ná mmehie, bụ ndị olu nke Chineke ga-asị: “N’ihi na akpọwom òkù, unu we jụ; Esetipuwom akam, ma ọ digh onye nāña nti; Unu we wezuga ndum-ọdum nile, unu achọgh kwa iba-nbam: Mu onwem kwa, na nhuju-anya-unu m’gāchi ọchi; M’gākwa emò mgbe oké egwu-unu nābia” (Ilu 1:24-26). Okwu Chineke na-ekwu na ndị ahụ jụrụ Ya na òkù Ya “gēri kwa ufọdu nime nkpuru nke uzọ-ha” (Ilu 1:31).

Ọkụ ala-mmụọ nke ná-enwu enwu na mmekpa-arụ ebighị-ebi bụ ụdị ihe egwù ahụ kwesịrị ịtụgharị n’uche nke mere na ọ na-adị ka ihe ana-apụghị ime eme na onye ọ bụla akọ-na-uche ya zuru-ezu, nke na-echè échìchè ga-arapụ ịña ntị n’olu Chineke. Ma otú ọ dị ọtụtụ puku mmadụ na-aga n’ụzọ ahụ nke ná-eduba n’ịlá n’íyì ná-enweghị óké mmetụta n’obi banyere ebe ha ga-anọ ebighị-ebi. N’okporo ụzọ nke mmehie ha, ha na-achị ọchị na-eme kwa òkù nke Oziọma ihe efu; ma ọ ga-abụ akụkọ dị ichè mgbe aga-eweda ha n’ala Chineke ewee ná-asị, “Mu onwem kwa, ná nhuju anya unu m’gāchi ọchi.” Òlee ihe-ọchị ma-ọbụ ịkwa-emò ntà nke onye ná-akwa emò ga-abụ mgbe “Onye nānọdu n’elu-igwe nāchi ọchị: Onye-nwe-anyị nākwa ha emò”. (Abù Ọma 2:4).

Ịchọ Chineke

Nwoke ahụ nke ná-achọ ịgbanarị ikpé niile nke Chineke aghaghị ịña ntị n’òkù Ya. Chineke bụ Onye ebere na Onye kwesịrị ntụkwasịobi; ma ọ dịghị onye ana-azọpụta ná-abụghị site ná nrọrọ nke onwe ya inwe ezi nchègharị. Akpọrọ anyị ma ọ bụghị náánị ịña ntị, kama itinye obi anyị n’inwe nghọta. “E, ọ buru na ọ bụ nmata ka i nākpọku, ọ buru kwa na ọ bụ nghọta ka i nēweliri olu-gi; ọ buru na i chọ ya dika ọla-ọcha, ọ buru kwa na ọ bụ dika akù zoro ezo ka i nēgwuputa ya: mgbe ahu ka i gāghọta egwù JEHOVA, ọ bu kwa ihe-ọmuma Chineke ka i gāchọta”.(Ilu 2:2-5).

Ịchọ àkù nke zoro ezo edugawo ụmụ mmadụ ịchọta ụzọ baa n’óké ọhịa nke gbachiri agbachi, ịgafe ebe dị óké egwù nke jụrụ oyi, ịbànye nime omimi niile nke óké osimiri, na itinye ndụ ha nime ọtụtụ ihe ndịọzọ siri ike. Òkù ahụ nke Amam-ihe na-akpọ n’ezie achọghị ịnụ ọkụn’obi maọbụ ọlụ dị ntà. Ọ bụ uche Chineke na ụmụ mmadụ ga-egosi otù ụdị obi-ike ahụ, buo agha n’otù ụdị mkpebi ahụ, wee chọkwa site n’otù ụdị nleru anya ahụ, ka ha wee nwee ike ịnata ihe-omimi niile nke Ala-eze Chineke.

Àkụ dị ukwu karịa nke ụwa pụrụ inye ka ana-achọta n’ihe-omụma nke Chineke. Àkụ niile nke ụwa na-adị nwa oge, ebe amam-ihe nke Chineke na-adịru ebighị-ebi. Ọtụtụ ndị ná-achọ àkụ nke ụwa ezutewo ọnwụ na mbibi, ma egwù nke Onyenwe anyị na-eduba ná ndụ ebighị-ebi. Iché-aka-mgbá n’iru nke Oziọma bụ ka ụmụ mmadụ ndị nwere obi-ike (ma-ọbụ ume) guzogide nchépụta niile, ịchị-ọchị niile, na ime ihere nke onye ahụ ná-ákwá emò, guzogide kwa ndị agha nke setan, wee jidesie eziokwu ahụ nke Okwu Chineke ike. Okporo-ụzọ niile nke eziomume, nke ikpé, na nke ziri-ezi, na okporo-ụzọ ọma niile ọzọ ghere oghe nye ndị niile ná-etinye obi ha ịghọta ụzọ niile nke Chineke.

“Ndi ziri ezi gēbi n’ụwa, ndi zuru òkè gāfọdu kwa nime ya.

“Madu ndi nēmebi iwu ka agēbipu n’uwa, ọ bu kwa ndi nāghọ aghụghọ ka agēropu na ya” (Ilu 2:21, 22).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. N’ihi gịnị ka ana-eji ilu kwue okwu
  2. Gịnị bụ omume onye nzuzu n’ebe ịdọ-aka-ná-ntị (maọbụ ndụm-ọdụ) dị?
  3. Gịnị ka eji tụnyere ịdọ-aka-ná-ntị nke nne na nna
  4. Gịnị bụ ụzọ ahụ nke ndị akpịrị ùrù ná-ezịghị ezi na akpọ nkụ?
  5. Òlee ndị bụ “ndi nēnwegh uche” ahụ akpọrọ aha n’Ilu 1:22?
  6. Gịnị ga-abụ ọnọdụ ndị ahụ jụrụ òkù nke Chineke?
  7. Òlee ilu Jisọs tụrụ nke yiri Ilu 2:1-5?
  8. Òlee ebe amam-ihe na-ewere ọnọdụ nime mmadụ?
  9. Gịnị bụ ụgwọ-ọlụ ụfọdụ nke ndị ahụ chọtara amam-ihe?