Jọn 19:31-42; Matiu 27:62-66; Jọn 20:1-31.

Lesson 276 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ọ fọduru nwa oge, uwa ahukwaghm ọzọ; ma unu onwe-unu nāhum: Unu onwe-unu gādi kwa ndu, n’ihi na Mu onwem nādi ndu” (Jọn 14:19).
Cross References

I Ọnwụ na Òlìlì

1. Ndị Ju natara ike ka ndị-agha Rom mee ka Jisọs nwụọ ọsọsọ, Jọn 19:31, 32

2. Jisọs anwụworị, ma otù onye n’etiti ndị-agha ahụ mapuru akụkụ arụ Jisọs, Jọn 19:33-37; Zekaraia 12:10

3. Josef na Nikọdimọs nwetara arụ Jisọs, dozie Ya maka òlìlì, wee tọgbọ ya n’ílì nke aka Josef, Jọn 19:38-42; Matiu 27:60; Mak 15:43-46; Luk 23:50-53

II Òtù Ndị Nche Ílì Ahụ

1. Échètara Okwu ahụ Jisọs kwuru, na Ya ga-esi n’ọnwụ bilie mgbe ụbọchị nke atọ gasịrị, Matiu 27:62, 63; Jọn 2:18-22

2. Ndị Farisii na ndị-isi nchụàjà tụrụ egwù na ndị ná-eso ụzọ Jisọs ga-abịa zuru arụ Ya n’ori n’abalị ma eleghị anya, Matiu 27:64

3. Pailat rọpụtara òtù ndị nche, ewee were akàrà kaa nkume ahụ eji mechie ílì ahụ igbochi mmadụ ọ bụla ịbịaru ya nso, Matiu 27:65, 66

III Mbiliten’ọnwụ ahụ

1. N’ụbọchị nke atọ, mgbe chi ákà-abọghị, mmụọ-ozi nke Onyenwe anyị si n’Eluigwe rịdata, bịa ruo, kpọrepụ nkume ahụ n’ọnụ-ụzọ ílì ahụ, Jọn 20:1; Matiu 28:1, 2

2. Jisọs Kraist siri n’ílì bilie ịdị ndụ rue mgbe niile ebighị-ebi, Matiu 28:6; Mak 16:6; Luk 24:5-7; I Ndi Kọrint 15:4-6; Nkpughe 1:8, 18

3. N’isi ụtụtụ Meri Magdalini bịaruru ílì ahụ wee gbaa ọsọ gaa ịkọrọ Pita na Jọn, Jọn 20:1, 2

4. Pita na Jọn weere ọsọ gaa ọsọsọ ịchọpụta, Jọn 20:3-10; Luk 24:12

5. Meri nọgidere na nso ílì ahụ, nzute nke Onyenwe anyị zutere ya wee bụụrụ ya ihe nkwụghachị, Jọn 20:11-18

IV Ngosi Dị iche iche Nye Ndị ná-eso Ụzọ Ya

1. Mgbe o ruru anyasị, n’ụbọchị ahụ nke bụ Ụbọchị Onyenwe anyị, Jisọs mere ka ndị ná-eso ụzọ Ya hụ Ya anya inye ha ndụm-ọdụ na ime ka obi tọọ ha ụtọ, Jọn 20:19-23; Mak 16:14-18

2. Tọmas, nke ana-akpọ Didimọs, anọghị mgbe Jisọs mere ka ahụ Ya anya nke mbụ, o kweghị kwa na Jisọs esiwo n’ọnwu bilie n’ezie, Jọn 20:24, 25

3. Mgbe ụbọchị asatọ gasịrị, n’Ụbọchị Onyenwe anyị kwa, Jisọs pụtara igosi onwe Ya nke ugbò abụọ, Tọmas nọ kwa ya, Jọn 20:26

4. Jisọs mere ka ekweghị ekwe ahụ niile nke Tọmas nwere gwụsịa, Jọn 20:27-31

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Ọtụtụ Obi Nke Ná-eru Újú

Òtù ahụ ndị kwesịrị ntụkwasị-obi n’etiti ndị ná-eso ụzọ Jisọs biliri n’isi ụtụtụ n’ụbọchị mbụ nke ụbọchị asaa ná-esota ọnwụ Ya n’elu obe. Obi adịghị ha mma -- obi ha na-eru újú ebe ọ dị ukwu rii nne. Anarawo ha Onye-ndú ha na Onyenwe ha, ha hụrụ n’anya, bụ Jisọs Kraist, Onye akpọgideworo n’obe n’ụzọ ná-adịghị ebere; Jisọs, Onye ahụ lụwororị ọlụ ukwu dị iche iche na ihe ịrịba-àmà dị iche iche n’etiti ha; Onye ahụ ziworo harịị ụzọ esi abịa nso Chineke; Onye ahụ nke gwaworo harịị ọtụtụ ihe mara mma banyere Eluigwe na ihe egwù niile nke ọkụ ala-mmụọ; Onye ahụ ha tụkwasịworo obi ịbụrụ ha eze nke ụwa na Mesaia. Olile-anya ahụ niile, nzube niile na agụụ nke obi niile ndị ná-eso ụzọ Jisọs nwere, bụ nke ewusiwo kwara ike site n’arọ niile ha na Jisọs nọkọrọ mgbe Ọ na-alụ ọlụ Ya n’ụwa, ma n’otù ụbọchị ka emebiri ọtụtụ nime olile-anya ndịa.

Òtù ntà ahụ nke kwesịrị ntụkwasị-obi esoroworị Jisọs chee nché ogologo ụbọchị ahụ niile mgbe akwụbara Ya n’elu obe. Ha hụkwara oge hour ahụ niile nke ọchịchịrị gbara n’ala ahụ dum n’oge ehihie. Ha nụrụ mgbe Ọkpara Chineke agọziri agọzi na-ekpe ekpere ka agbaghara ndị ná-esogbu Ya; ha nụrụ mgbe O kwere otù nime ndị-ori ahụ akpọgidere ha na Ya n’obe mkwà ndụ ebighị-ebi; ha nụkwara mgbe Jisọs weere óké olu tikuo Nna Ya mkpu, sị, “Chinekem, Chinekem, ọ bu n’ihi gini ka I rapuru náni Mu?” Ọgbakọ ntakịrị ahụ nọnyererị Onyenwe ha rue mgbe Ọ rara ndụ Ya nke ná-enweghị ntụpọ nye; ma ha amataghị óké mkpà ihe niile ahụ meworo nke ha onwe ha bụ kwa ndị-àmà ha dị nye ụwa nke ndị mmehie.

Josef na Nikọdimọs

Ngwa ngwa Jisọs rarasịrị ndụ Ya nye, Josef nke Arimatia jekwuuru Pailat, rịọ arụ Jisọs. O juru Pailat anya na Jisọs ga-anwụworị, ya mere o zigara onyeozi ka ọ chọpụta ihe bụ eziokwu; o wee nye Josef ike iburu arụ Jisọs. Nikọdimọs bịakwara inyere Josef aka, ha abụọ mere ngwa lụzuo ọlụ ha: ibudata arụ Jisọs site n’elu obe; iké arụ Ya n’ezi àkwà-ozù, ya na ụdà ísì-ụtọ ndịa na ịtọgbọ Ya n’ílì ọhụụ nke aka Josef, nke egwuwararị n’óké nkume nke dị kwa n’ubi agbara ogige. Ndị ná-eso ụzọ Ya, ndị nọdụworo nso obe ahụ hụrụ ebe ílì ahụ dị, ha wee laghachị n’ụlọ ha dị iche iche n’obi nke jupụtara ná mwute. Ebe echi ya bụ Ụbọchị izu-ike ndị Ju, ọ dịghị ihe ọzọ ha pụrụ ime tutu rue mgbe Ụbọchị izu-ike gasịrị.

Ezi Ememe Ngabiga ahụ

Amụma niile ebuworo n’Akwụkwọnsọ banyere ọnwụ na òlìlì Jisọs mezuru n’ụzọ niile. Ndị Ju amaghị na n’ụbọchị mkwadobe nke ememe a nke ha na-eme kwa arọ, na ha na-eme ka egbuo ezi Ngabiga ahụ -- ọ bụghị ụdị ya, ọ bụghị kwa onyinyo nke ihe gaje ịbịa, kama ọ bụ nnọọ ezi Ngabiga ahụ. “N’ihi na achụkwara àjà ngabiga ayị, bú Kraist” (I Ndi Kọrint 5:7). Ọ bụ ezie na ebu ụzọ mara Jisọs Kraist site na ntọ-ala nke ụwa dịka Onye ji obi Ya dum nye ndụ Ya dịka Àjà, ka ndị mmehie wee dị ndụ, Chineke abụwo ndị niile kpatara ọnwụ Ya ọnụ. Ọ bụghị náánị ndị Ju ka amam-ikpé a dịrị. Mmehie ọ bụla emeworo, ma-ọbụ tupu Kraist abịa ma-ọbụ mgbe Ọ bịasịrị, bụ ihe kpatara ọnwụ Jisọs; ọzọ kwa náánị otù ihe ga-ehichapụ amam-ikpé ahụ bụ, mgbe onye ahụ ikpé mara gbakuuru Kraist ahụ akpọgburu, ka ewere Ọbara Ya nke na-eme ka adịn’otù na ebere Ya sachaa ya. “Mgbe m’huru ọbara ahu, M’gāgabiga unu” (Ọpupu 12:13). Ọ bụ Chineke nke pụrụ ime ihe niile na-ekwu okwu ndịa.

Ọnụma dị egwù nke ndị Ju nwere megide Jisọs dị ka ihe ná-enweghị nsọtụ. Iwe ha mere ka ha zipụ ndị-agha Rom ka ha tijie ogwe-ụkwụ ndị niile ahụ akpọgburu n’obe, ka ewee mee ka ha nwụọ ọsọsọ; ma iwu Chineke banyere Nwa-atụrụ ahụ akpọgburu pụtara ìhè. “Ọ digh kwa ọkpukpu unu gētiji nime ya.” Ọzọ kwa, “Ha agagh-eme ka ihe fọdu nime ya rue ututu, ọ digh kwa ọkpukpu unu gētiji nime ya.” Mmụọ nke Chineke kwuru okwu site n’ọnụ onye ahụ nke dere Abù Ọma, sị, “Ọ nēdebe ọkpukpu ya nile: ọ digh otù nime ha nyajiri anyaji” (Abù Ọma 34:20). Ndị-agha ahụ tijiri ogwe-ụkwụ nke ndịkom abụọ ọzọ ahụ akpọgidekọrọ ha na Jisọs n’obe, ma ike Chineke gbochiri aka ha ịlụ ọlụ dị otú a n’arụ Jisọs. N’ezie, ọ dịghị mkpà itiji ogwe-ụkwụ Ya ime ka Ọ nwụọ ọsọsọ, n’ihi na Ọ nwụworị. Otù onye n’etiti ndị-agha ahụ weere ubè maa Jisọs n’akụkụ, “ngwa ngwa ọbara na miri we pụta.” Ọnyá a nke ghere-oghe abụworị ụzọ ná-adịghị ịgọ agọ nye ndị ná-ekwugide na ndị ná-adịghị ekwenye na Jisọs nwụrụ anwụ n’ezie.

Òfùfè Efù

Ịhụn’anya iru-abụọ Ndị Ju nwere n’ebe Ụbọchị izu-ike dị mere ka ha chọọ ka ebupụ ndị ahụ akpọgburu site n’obe ndịa, ma ọ bụ náánị nke a kpatara ya? Ọ bụghị ihe siiri ha ike ilefuru ikpé ahụ akọ-na-uche ha na-ama ha anya? Ndị Ju emewo ihe jọkarịsịrị njọ n’ụwa, akọ-na-uche ha wee ná-ebo ha ebubo banyere ya. Ma eleghị anya ha na-echèrị na ọ bụrụ na ha ebupu arụ ndịa n’anya ha, na akọ-na-uche ha ga-edere dúú ha ewee nwee kwa ike ịlụ ọlụ dịrị ha n’Ụlọ Chineke nkeọma. Ma chere! Chineke abụghị Onye ana-elelị! Ọ na-ahụ ìzù niile nke obi tutu O lee ọlụ nke aka mmadụ anya. Òfùfè nke jupụtara n’iru-abụọ apụghị ihichapụ mmehie nke obi ọjọọ na ọbara nke ogbugbu mmadụ site n’obi mmadụ. Iwe ka jupụtakwara Ndị Ju n’obi megide Kraist, ma ha na-achọ kwa ime ihe ga-atọ Onye ahụ nke na-ahụzu ihe niile ụtọ site n’idebezu usoro Ụbọchị izu-ike náánị site n’otú edere ya n’akwụkwọ. Ihe jọkarịsịrị njọ bụ, na mmadụ agbanwebeghị. Ha ka na-ejisi kwa ike ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ otù ùgbò n’izù ụbọchị asaa, site n’ọlụ, omume na ememe dị iche iche ana ahụ anya, ma obi ha na-ejupụta n’ajọ ihe, ihe-efu, na enweghị nchègharị.

Àtụmàtụ nke Mmadụ

Ihe ndị-isi nke ndị Ju na-eme edoghị ha onwe ha anya ma-ọlị. Ya mere, ọ bụghị ihe iju-anya na ọtụtụ nime ha so nime ndị hụrụ Nikọdimọs na Josef ka ha na-akpọre otù nkume ịkwachi ọnụ-ụzọ ílì ebe ha tọgbọworo arụ Jisọs. Ha chetakwara òzìzí Onyenwe anyị nkeọma mgbe ha chọrọ ka O gosi ha ihe ịrịba-àmà, “Kwatunu ulo nsọ a, n’ubọchi atọ M’gēweli kwa ya elu” (Jọn 2:19). Mgbe ahụ ha na-ekpe Ya ikpé, ndị Ju tụgharịrị okwu ndịa n’ụzọ ọzọ, ha wee ná-ebo Ya ebubo na Ọ chọrọ ikwatu Ụlọ ukwu Chineke; ma nime obi ha, ha matara ihe okwu ahụ Jisọs kwuru pụtara. Ugbu a ha jekwuuru Pailat sị na Jisọs ekwewo ndị na-eso ụzọ Ya mkwà na Ya ga-esi n’ọnwụ bilie mgbe ụbọchị atọ gasịrị. Ha chọrọ ka emechie ílì ahụ siike megide ihe ọ bụla ga-achọ ịbà na ya, ka òtù ndị-nche ndị-agha gbochie kwa ndị ná-eso ụzọ Ya ịbịa zuru arụ Jisọs n’ori laa. Otù ugbò ọzọ anyị na-ahụ eziokwu ahụ, “N’ihi na ọnuma madu gēkele Gi” (Abù Ọma 76:10), ka ọ pụtara ìhè. Nzube efu nke ndị-isi ndị Ju ahụ zubere iji doziere onwe ha ihe niile ka Chineke mere ka ọ ghọọ ihe-àmà megide obi ekweghị ekwe niile, bụ eziokwu nke ná-adịghị ịgọ agọ nke mbiliten’ọnwụ ahụ.

Ike Mbiliten’ọnwụ

Ọ dịghị inye-aka sitere n’èzí achọrọ n’ụtụtụ ahụ Kraist biliri. Ọ dịghị ime ngwa ngwa dị n’iwepụ arụ Jisọs n’ílì ahụ, n’ihi na onye ahụ nke ná-eso ụzọ Ya ahụrụ n’anya hụrụ ezí ákwà-ozù ahụ ka ha tọgbọrọ nkeọma, ịchafọ ahụ kwa, nke dị n’isi Jisọs, atụpụwo kwa ya debe n’otù ebe dị ichè. Ndị enyi Jisọs ebupụghị Ya, n’ihi na ọ dịghị enyi Ya ọ bụla hụrụ Ya n’anya ga-emeworị Onye-nsọ ahụ nwụrụ anwụ ihe ná-adịghị mma site n’iwepụ ákwà-ozù ahụ wee bupụ arụ ahụ ná-eyikwasịghị ákwà. Jisọs nataghachị kwara ndụ ahụ O nyewororị n’ihi ụwa. Mgbe chi ákà-abọghị n’ụbọchị mbụ ahụ nke izù ụbọchị asaa mgbe ọnwụ Ya n’obe gasịrị, Mmụọ nke Kraist laghachịrị n’arụ Ya, mbiliten’ọnwụ nke Jisọs wee mezue: “Onye Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, mgbe Ọ tọpusiri ihe mgbu nile nke ọnwu: n’ihi na ọnwu apughi ijide Ya” (Ọlu Ndi-Ozi 2:24). Ákàrà ọchịchị-isi dị ike nke Rom etipịawo, ndị-agha ahụ mara jijiji, bịa dị ka ndị nwụrụ anwụ, akpọrepụwo nkume ahụ site n’ọnụ-ụzọ ílì ahụ, Jisọs ebiliwo merie ọnwụ, ọkụ ala-mmụọ na ílì. “Otú ọ di emewo ka Kraist si ná ndị nwuru-anwu bilie, nkpuru mbu nke ndi daworo n’ura ọnwu” (I Ndi Kọrint 15:20).

Ndịnyom ụfọdụ n’etiti ndị ná-eso ụzọ Jisọs ákà-anụghị ihe banyere oziọma ahụ dị ebube banyere mbiliten’ọnwụ Jisọs mgbe ha rapụrụ ụlọ ha dị iche iche n’isi ụtụtụ ahụ ijé dozie arụ Jisọs. Ha ji obi nwute ná-aga n’íli ahụ n’isi ụtụtụ mgbe chi ákà-abọghị. Mgbe ha na-abịaru ílì ahụ nsọ, na mberede ibobo nwụrụ ha n’arụ, n’ihi na nkume ahụ bụ nke ha ná-apụghị ịkpọrepụ n’ihi ịdị ukwu ya -- ka akpọrepụworo n’ọnụ-ụzọ ílì ahụ. Ha wee baa n’ílì ahụ, ma o juru ha anya na arụ Jisọs adịghị kwa. Kama ha hụrụ ndịkom abụọ yiri uwe ná-egbu àmùmà, ndị sịrị ha: “Gini mere unu nāchọ Onye di ndụ n’etiti ndi nwuru anwu? Ọ nọgh n’ebe a; kama emere ka O si n’ọnwu bilie: Chetanu otú Ọ gwara unu okwu mgbe Ọ nọ kwa na Galili, si na aghagh irara Nwa nke madu nye n’aka ndikom nēmehie emehie, na aghagh kwa ikpọgide Ya n’obe, na Ọ ghagh kwa isi n’ọnwu bilie n’ubọchi nke atọ”(Luk 24:5-7).

Ịkọ Akụkọ Ọma Ahụ

Ndịnyom ahụ kweere eziokwu ahụ, ha wee were ọñụ laa ọsọsọ, ịkọrọ ndị ná-eso ụzọ Ya akụkọ a, ma okwu ndịa dị ka okwu efu ná ntị ndị ná-eso ụzọ Ya. Mmadụ abụọ n’etiti ha gbara ọsọ rue ílì ahụ ịhụ n’onwe ha ihe akọworo ha. Otù nime ha laghachitara kwere kwa okwu ahụ, ma onye nke abụọ lara n’ụlọ ya, ihe nke mere wee na-eju kwa ya anya. Mgbe anyị na-atụgharị uche ọtụtụ ùgbò Jisọs kwuru okwu banyere ọnwụ Ya na mbiliten’ọnwụ Ya, ọ bụ ihe ana-apụghị ikwere na ndị ná-eso ụzọ Ya ekwereghị n’okwu a ọsọsọ; ma ọnọdụ obi dị otú a na-egosi otú ebubo ndị Ju boro ndị ná-eso ụzọ Ya mgbe emesịrị, na ha zuru arụ Jisọs n’ori si bụrụ ebubo nzuzù. Ọ dịghị mgbe ọ bụla ha nwere olile-anya ma-ọbụ mee omume iji gosi na ha na ele-anya mbiliten’ọnwụ Onyenwe ha nke aga-asị na ọ bụ ihe dị otú a mere ka ha si n’obi ha chepụta akụkọ banyere Onye nzọpụta nke biliri n’ọnwụ. Ihe ka n’ọnụ-ọgụgụ n’etiti ha ekweghị na Jisọs esiwo n’ọnwụ bilie tutu rue mgbe ha hụrụ Ya ná ndụ. Tọma sịrị na ya agaghị ekwe tutu ya ahụ Jisọs wee tinye kwa aka ya n’akụkụ Ya. Jisọs wedara onwe Ya ala imezù ọchịchọ Tọmas, ma dụ kwa ya ọdụ n’otù mgbe ahụ sị, “N’ihi na i huwom i kwerewo? ngọzi nādiri ndị akāhụgh, ma ha kwere.”

Óké ọñụ jupụtara obi Tọmas mgbe ọ matara na akụkọ mbiliten’ọnwụ ahụ bụrị eziokwu. Otù ọñụ ahụ ka mkpụrụobi ọ bụla ga-ejekwuru Kraist ahụ dị ndụ site n’okwukwe na nrube-isi n’iwu Ya niile ga-enweta. Jisọs gwara ndị ná-eso ụzọ Ya sị, “Unu onwe unu gādi ndu n’ihi na Mu onwem nādi ndu” (Jọn 14:19). Ndị niile bú ezi ndị ná-eso ụzọ Kraist na-ewere mkwà a dịka nke ha.

Ihe dị Iche iche Kachasị Nke Mere N’ụwa

Ọnwụ Jisọs nwụrụ dịka ihe ịchụàjà na mbiliten’ọnwụ Ya dị mkpà dịka ọmụmụ Ya n’ụwa. Ihe ndịa mere kachasị ihe niile meworo site n’òkìkè ụwa. Ọ bụrụ na amụghị Jisọs, ọnwụ Ya na mbiliten’ọnwụ Ya ga-abụworị ihe ana-apụghị imezù ma-ọlị; kama ọnwụ Jisọs na mbiliten’ọnwụ Ya na-ewepụta eziokwu dị na ọmụmụ Ya na ndụ Ya. Mbiliten’ọnwụ Ya bụ ndụ, olile anya na ike Oziọma nwere. “Ma ọ buru na nbilite-n’ọnwu nke ndi nwuru anwu adigh, emegh kwa ka Kraist si n’ọnwu bilie: ma ọ buru na emegh ka Kraist si n’ọnwu bilie, ya mere ihe ayi nēkwusa bu ihe-efu, okwukwe unu bu kwa ihe-efu” (I Ndi Kọrint 15:13, 14). Ma ezigbo okwukwe adịghị abụ n’efu. Kraist ahụ nke si n’ọnwụ bilie egosiwo obi ọ bụla kwere ekwe, na Ya dị ndụ. Nwapụta Chineke n’onwe gị, biko, gị obi na-amaghị ike nke Kraist ahụ si n’ọnwụ bilie.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị mere ndị Ju ji chọọ ibupụ arụ niile ahụ akpọgidere n’obe ahụ dị iche iche?
  2. Òlee ụzọ ndị Ju ji chọọ ime ka Jisọs nwụọ ọsọsọ?
  3. Kpọọ ọbụná aha ebe atọ n’Akwụkwọnsọ nke mezuru n’ọnwụ na òlìlì Jisọs.
  4. Ònye so n’etiti ndị ahụ buru ụzọ jee n’ílì ahụ n’ụbọchị mbụ nke ízù ụbọchị asaa?
  5. Gịnị mere n’ílì ahụ?
  6. Gịnị ka Pita na Jọn mere mgbe ha nụrụ akụkọ ahụ?
  7. Òlee ụzọ Jisọs si kpughere Meri Magdalini onwe Ya?
  8. Òlee otú Jisọs si bata n’ụlọ ebe ndị ná-eso ụzọ Ya nọkọrọ?
  9. Gịnị ka Tọmas kwuru banyere otú Jisọs si mee ka ahụ Ya anya?
  10. Gịnị ka Jisọs gwara Tọmas mgbe O mere ka ahụ Ya anya ọzọ?