Ilu 3:1-35

Lesson 277 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBIN’ISI: “Tukwasi JEHOVA obi-gi nile, adabere-kwa-la nghọta-gi” (Ilu 3:5).
Cross References

I Idebe Iwu Chineke

1. Otù nna na-echètara nwa ya ka ọ ghara ichezọ iwu Chineke, Ilu 3:1, 3, 21; Deuteronomi 4:9; 6:12; 8:11

2. Idebe iwu nke Chineke na-eweta ogologo ụbọchị, ogologo ndụ, na udo, Ilu 3:2; Deuteronomi 5:33; 11:18-21; Abù Ọma 119:165

3. Aga-achọta àmàrà (iruọma) n’ebe Chineke na mmadụ nọ site n’idebe iwu nke Chineke, Ilu 3:4; Abù Ọma 19:11; Jeremaia 32:41; Daniel 1:9; Luk 2:52; Ọlu Ndi-Ozi 2:47

4. Iwu nke Chineke bụ ezi nchebe nye ndị niile na-ejigide ya, Ilu 3:21-26; I Samuel 2:9; II Samuel 22:29-31; Abù Ọma 119:105; 112:7

II Ịtụkwasị obi na Chineke

1. Chineke ga-eduzi ụzọ ndị ahụ rọọrọ ịtụkwasị Ya obi, Ilu 3:5, 6; Abù Ọma 37:3; Aisaia 26:3, 4; Abù Ọma 23:2, 3

2. Aghaghị ịrapụ iweli onwe onye elu ịdabere ná nchebe nke ihe anụ-arụ ka ewee nweta amam-ihe, Ilu 3:7, 8; 26:12; Aisaia 29:9-16; I Ndi Kọrint 1:18-24

3. Ụmụ mmadụ kwesịrị igosi mmesoọma Chineke n’ebe ha nọ site n’ịkwụ otù ụzọ n’ụzọ iri nke ihe nnweta ha niile, Ilu 3:9, 10; Ọpupu 22:29, 30; Malakai 3:8-11; I Ndi Kọrint 16:2; Ndi Hibru 7:1-9

III Ịdọ-aka-ná-ntị nke Chineke

1. Agaghị ajụ ịdọ-aka-ná-ntị Chineke, kama aga-anara ya maka ọdị-mma, Ilu 3:11, 12; Deuteronomi 8:5, 6; Ndi Hibru 12:5-13

IV Urù Amam-ihe Bara

1. Apụghị ịgụta ọnụ urù niile na ọnụ-ahịa nke amam-ihe bara, Ilu 3:13-20; Job 28:12-28; Ilu 2:1-9; I Ndi Kọrint 2:1-16

V Ịdị-mma nye Onye agbata-obi

1. Ndebezu nke ihe niile enyere n’iwu ka ana-emezu site n’iwu nke ịhụn’anya, Ilu 3:27-30; Levitikọs 19:18; Mak 12::29-33; Matiu 22:27-40; Ndi Rom 13:8-10

VI Agaghị ekwoso Ndị Ná-emebi Iwu Ekworo

1. Agaghị ekwoso ndị ná-emebi iwu ekworo n’ihi na ikpé ga-abịakwasị ha, Ilu 3:31-35; Abù Ọma 37:1-40; Ilu 24:19, 20

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Echezọla Iwum

Ebe ọgụgụ anyị yiri ọtụtụ ebe akwụkwọ Ilu nke ná-amalite site n’ịrịọ arịrịọ ka aghara ichezọ iwu nke Chineke, na ka añaa ntị nkeọma na ndụmọdụ nke Onye dere akwụkwọ ahụ. Eleghachiri anya n’Iwu ndị Livai bụ nke Chineke nyere Moses iwu ka ọ kụziere Israel. Ha ga-ekegide Iwu a (edere n’elu mbadamba ihe) n’egedege iru ha, magide kwa ya n’ebe dị iche iche pụtara ìhè, dịka n’ibo ọnụ-ụzọ ụlọ na n’ọnụ-ụzọ ama ha niile. (Gụọ Deuteronomi 6:6-9; 11:18-20). Ọ bụ ọchịchọ Chineke na aga-eweta Iwu Ya nso ọlụ niile nke ana-alụ kwa ụbọchị, ka ewee ná-echètara Israel mgbe dum banyere urù niile dịrị ha n’okpuru Iwu na ọlụ dị iche iche dịrị ha n’ebe Iwu Chineke dị. Site n’ikekwasị akụkụ dị iche iche nke Okwu Chineke n’arụ ha, esitere na nke a na-eme ka ha mara na Ọ ghaghị ịghọ otù akụkụ nke dị mkpà nime ndụ ha.

Ekwere mkwà n’Okwu Chineke na Mmụọ nke Chineke ga-edekwasị Okwu ahụ n’elu mbadamba nke obi nke anụ-arụ. Ihe odide a na-amalite n’ezi nchègharị bụrụ kwa ihe ná-adigide site na mgbe ahụ rue ogologo ndụ niile nke Onye Kraist ahụ. Ọ bụ ntọ-ala nke Ọgbụgba-ndụ Ọhụụ bụrụ kwa n’onwe ya nnwapụta nke ezi nchègharị, n’ihi na Chineke kwere Israel mkwà site n’ọnụ Onye-amụma Ya bụ Jeremaia: “Mgbe ubọchi nile ahu gasiri (ọ bu ihe si n’ọnu JEHOVA puta); M’gētinye iwum n’ime ha, ọ bu kwa n’obi-ha ka M’gēdekwasi ya dika n’akwukwọ; M’gābu-kwa-ra ha Chineke, ha onwe-ha gabu-kwa-ram otù ndi: ha agagh-eme kwa onwe-ha ka ha muta ọzọ, onye ọ bula o me ka onye-agbata-obi ya muta, onye ọ bula o me kwa ka nwa-nne ya muta, si, Maranu JEHOVA: n’ihi na ha nile gāmara Mu Onwem, site n’onye dikarisiri ntà nime ha we rue onye dikarisiri uku nime ha” (Jeremaia 31:33, 34). N’akwụkwọ-ozi Pọl degaara ndị Kọrint, ọ na-ekwu, sị: “Ebe emere ka unu puta ìhè na unu bu akwukwọ-ozi Kraist, nke ayi jere ozi ya, nke anējigh ink de, kama ọ bu Mọ nke Chineke di ndu ka eji de ya; ọ bugh n’elu mbadamba nkume, kama ọ bu n’elu mbadamba ihe di iche, bú obi nke anu-aru” (II Ndi Kọrint 3:3). (Gụgharịa iheọmụmụ 157, 158 na 159 maka inwe ezi mmụta dị omimi banyere Ọgbụgba-ndụ Ọhụụ ahụ, ya na Ndi Hibru 8:10; 10:16). O doro anya nkeọma na dịka ebe ọgụgụ anyị kwuru náánị ná mkpirikpi okwu banyere icheta iwu Chineke, ọ na-atụ aka n’otù okwu dị ukwu nke metụtakarịrị ihe ahụ dị nime óké àtụmàtụ nke nzọpụta Chineke.

Ụbọchị Ndụ dị Ogologo na Udo

Okwu ahụ bụrị ihe echèzọrọ echèzọ ma lelie kwa anya ya na mkwà nke dị n’ebe ọgụgụ anyị nye onye ahụ nke ná-adịghị echèzọ iwu nke Chineke: “Ubọchi ndu nke di ogologo, na ọtutu arọ nke ndu, na udo, ka ha gātukwasiri gi.” Ọzọ kwa Okwu ahụ na-ekwe mkwà mkpuchi n’oge nsogbu mberede ná-abịa. “Atula egwù site n’oké egwù mberede, ma-ọbu site n’ikuku siri ike nke ndi nēmebi iwu, mgbe ọ nābia: N’ihi na JEHOVA gābu ntukwasi-obi-gi, Ọ gēdebe kwa ukwu-gi ka aghara ijide ya” (Ilu 3:2, 25, 26). Ka onye ahụ na-achọ nchebe, udo, na mkpuchi, bịakute Chineke dị ndụ, onye na-enye ndụ, ma na-enyebiga kwa ya ókè.

Ọtụtụ ihe ka ana-ekwu banyere ọgan’iru nke mmụta nke ihe-ọmụma n’ịchọpụta ọgwụ iji mee ka ụbọchị ndụ mmadụ dị ogologo karia site n’ime ka nlekọta nke ndị ụlọ-ọgwụ na-enye dị mma karịa, site n’inweta ihe anakpọ “medical insurance,” na imepụta ọtụtụ mkpụrụọgwụ ọbịara ọhụụ dị iche iche na ọtụtụ ihe ndịọzọ. Otú ọ dị, ọnụ-ọgụgụ ha na-enye iji kwagide ihe ha na-ekwu na-abụ ọnụ-ọgụgụ ogologo ụbọchị ndụ ọgbọ ọ bụla. Ha adịghị ekwe onye ọ bụla mkwà mkpuchi site n’ihe nsogbu mberede dị iche iche ga-abịakwasị ya ga-eweta. Chineke enyewo mmadụ iri arọ asaa, iri arọ asatọ kwa site n’ịdị-ike ya, ọzọkwa nzube niile nke mmadụ apụghị ịgbanwe Okwu Chineke. N’okwu nke onye Ode Abụ Ọma, “Ubọchị arọ nile ayi di ọgu arọ atọ na iri; ma ọ buru na ha esite n’idi-ike-ayi rue ọgu arọ anọ, otú ọ di, nganga-ha bu nání idọgbu-onwe-ha n’ọlu na ajọ ihe; n’ihi na ọ gbapuwo ọsọsọ, ayi we fela dika nnunu” (Abù Ọma 90:10).

Ịtụkwasị Jehova Obi

Akụkụ ọzọ nke ebe ọgụgụ ahụ na-adụ ọdụ na mmadụ aghaghị inwe ndabere ha, ntụkwasobi ha, na okwukwe niile ha, nrube-isi na olile-anya ha n’Onye ahụ bụ Chineke. Ọ dị ọtụtụ mmadụ n’ụbọchị taa ndị ná-eji ihe banyere mmadụ inwe Onye-nzọpụta nke aka ya na-eme ihe ọchị, ya na nghọta na Chineke, “ma ọ bụrụ na Chineke dị” bụ onye ihe banyere ọnọdụ nke mmadụ náadịghị emetụ n’obi. Ndị ọzọ naasị na ihe Baịbụl kwuru banyere Chineke abụrụwo ihe oge ya gafere, ihe mere ochie, na ihe náabaghị urù n’oge ọgbara ọhụụ nke ụbọchi taa.

Ndị ka n’ọnụ-ọgụgụ n’etiti ụmụ mmadụ n’oge a arapụwo ifè Chineke òfùfè nime ịma mma nke ịdị-nsọ, wee chọpụta kwa ihe ọhụụ dị iche dịka ndị Grik mgbe ochie mere. Ndị Grik dịka otù mba ekwuworị na ha achụsowo eziokwu dịka ihe kachasị mkpà ná ndụ mmadụ. Ebe ha ná-achọtaghị ya, ha wee ghọọ otù mba nke na-achọ ihe-ụtọ, na-achọ ihe-ụtọ dịka ihe kachasị mma mmadụ pụrụ inweta. N’ihi nke a obodo ha wee ghọọ mba nke si n’eziokwu dapụ wee mikpuo nime mmehie nke jọkarịrị njọ; ebibiri ndụ nke obodo ahụ; ha wee ghọọ kwa ndị emeriri emeri n’ọtụtụ agha mmeri nke Ndị Rom ná-enweghị ebere.

Ọtụtụ mba nime ndị ahụ anakpọ “uwa nke nwere onwe ha” n’ụbọchị taa nọ n’ọnọdụ dị otú a. Mmadụ ntà ahụ nke bi n’obodo, mgbe ọ rapụsịrị nghọta ya banyere Chineke, eziokwu, ezi ihe na ihe ọjọọ, na ihe niile banyere ikpé ziri ezi n’àzụ dịka échìchè ndị mgbe ochie nke ná-enweghị kwa ọnọdụ n’ụbọchị taa, onye ahụ ná-aghọ onye jọkarịrị njọ n’ịchọpụta ndahie nke ndịọzọ; ná-enweghị okwukwe n’ebe onye ọ bụla nọ, ma-ọbụ ezi ntọ-ala ma-ọbụ olile-anya nke ndụ ebighị-ebi n’òzìzí ọ bụla ma-ọbụ okpukpé, ma ọ na-aghọ onye bara n’uche ajụrụ ajụ ọsọsọ n’anya Chineke. Ihe ndịa na-eme n’ihi na elefuuru iwu Chineke ahụ anya bụ nke ná-asị “adabere-kwa-la nghọta gi.”

Ịbambá nke ndị bụ Nne na Nna

Onye ahụ dere Ilu na-ekwu kwa okwu metụtara onye ọ bụla n’otù, nke bụ nna ịbara nwa ya mbá. Ọ bụ akàrà nke “oge ikpe-azu” na ụmụ ga-abụ ndị “nēkwenyegh ndi muru ha, ndi nēnwegh ekele, ndi nādigh ọcha n’obi” (Lee II Timọti 3:1-5; Ndi Rom 1:30). Ọ bụrụ na ụmụ mmadụ ekwenyeghị ha n’ụwa, ọ bụ ihe doro anya na ha agaghị ekwenye Chineke, Onye bi n’Eluigwe.

Baịbụl ekwuwo ya n’ọtụtụ ebe dị iche iche na “onye JEHOVA nāhu n’anya ka Ọ nābara nba” (Ilu 3:12), ma ọ bụrụ na adịghị ezi anyị ihe site n’inye anyị ahụhụ, anyị abụghị ụmụ n’ezie (Lee Ndi Hibru 12:3-11).

Amam-ihe

Eze Solomom, onye dere karị nkera Akwụkwọ Ilu, bụ nwoke onye nwere ọtụtụ àkụ nke ana-apụghị ịkọwa otú ha ra. O nwererị ike mee ihe ọ bụla obi mmadụ pụrụ ichepụta iji wee chọọ ihe-ụtọ, afọ ojuju na izu ókè nke ndụ. Ihe ọ kọrọ banyere ihe-efu nke ndụ mgbe ewezugara Chineke, nke amaara dịka Akwụkwọ Eklisiastis, enweghị àtụ. Mgbe ọ na-ekwu ihe nna ya kwuru, Solomon kwuru n’ilu sị, “Isi ihe ka amam-ihe bu; nweta amam-ihe: E, were ihe nile i nwetaworo nweta nghọta” (Ilu 4:7).

Ọ bụrụ na ọ bụ ogbenye kwuworo ụdị okwu ahụ, ọtụtụ ga-elefuru ya anya, ná-asị na o rughị ogo ikwu ya n’ihi na ọ matabeghị ihe ọ bụla banyere àkụ dị iche iche na ihe-ụtọ ha pụrụ iweta. Otú ọ dị, Solomon nwererị àkụ rii nne dịka onye ọ bụla nweworo, n’ihi nke a anyị pụrụ ịnara ndụm-ọdụ ya, n’ihi na ọ bụ Chineke kpaliri ya ikwu okwu, ike dị kwa n’okwu ya, ọ bụ eziokwu bụrụ kwa olu okwu sitere ná nnwapụta.

Job, nwoke ọzọ ná-atụ egwù Chineke, nke nwekwara àkụ rii nne, nwere nke a ikwu banyere ịdị óké-ọnụ nke amam-ihe: “Adigh-enye ọla-edo makarisiri nma n’ọnọdu ya, adigh-atù kwa ọla-ọcha ibu ọnu-ahia-ya. Adigh-eji ọla-edo ọma nke Ofia, adigh-eji kwa onyx di oké ọnu-ahia, ma-ọbu sapphire, tu ya. Adigh-ewere ọla-edo na enyo turu ya: Ihe ọla-edo anụchara anucha abugh kwa ihe-ngbanwe-ya. Agagh-ehota coral na crystal: E, nnweta amamihe kariri ruby. Adigh-ewere topaz nke Etiopia turu ya, adigh-eji ọla-edo ọma anāgwagh agwa tù ya” (Job 28:15-19).

Lee ka ha si bụrụ ihe pụrụ iche rii nne, bụ nkọwa dị iche iche nke ndịkom abụọ ndịa banyere ihe ahụ dị óké-ọnụ n’iji ya tụnyere nghọta nke mmadụ anụ-arụ banyere ihe bụ ezi àkụ.

Gịnị bụ amam-ihe? Gịnị bụ kwa nghọta? “Le egwu Onye-nwe-ayi, nke ahu bu amam-ihe; Ọzọ, isi n’ihe ọjọ puta bu ghọta” (Job 28:28).

Ịhụ Onye agbata-obi n’anya

“Ihun’anya adigh-alu ọlụ ọjọ n’ebe onye-agbata-obi-ya nọ; ya mere ihu-n’anya bu idebezu iwu” (Ndi Rom 13:10). Ebe a, n’okwu nke Pọl, ka achịkọtara ihe ọ pụtara bụ otù akụkụ nke ebe ọgụgụ anyị. Ihe ọjọọ dị añaa ka aga egbochiworị n’ụwa ma asị na ụmụ mmadụ tinyere ya n’ọlụ bụ ndụm-ọdụ nke Chineke banyere, otú aga-esi mee ka udo dị n’etiti ndị agbata-obi site n’ịrapụ igbochi ezi ihe n’ebe ndị ọ dịrị nọ, na site kwa n’esesaghị mmadụ ọ bụla okwu n’efu (Ilu 3:27, 30)!

Jisọs Kraist, Eze nke Udo, bụ Ụzọ ahụ ná-eweta udo ná-adị rue ebighị-ebi n’etiti mmadụ na ibe ya. “Unu enyeghachila onye ọ bula ihe ọjọ n’ọnọdu ihe ọjọ … Ma ọ buru na agu nāgu onye iro-gi, nāzu ya; ọ buru na akpiri nākpọ ya nkú, gi me ka ọ ñua miri: n’ihi na n’ime nka i gāgukwasi icheku nēre ọku n’isi-ya. Ekwela ihe ọjọ meri gi, kama were ezi ihe meri ihe ọjọ” (Ndi Rom 12:17, 20, 21). Jisọs sịrị: “Nāhunu ndi-iro-unu n’anya, nēkpe kwa ekpere nye ndi nēsogbu unu” (Matiu 5:44). Inyere ndị Ya aka idebe ndụm-ọdụ a, Jisọs nyere ha udo. Ọ sịrị: “Udo ka M’rapuru unu; udo nkem ka M’nēnye unu: ọ bugh dika uwa nēnye ka Mu onwem nēnye unu” (Jọn 14:27).

Ekpughere Oziọma n’amaokwu ndịa dị n’ebe ọgụgụ anyị; ọzọ, ịghọta ụdị ịhụn’anya kwesịrị ka ụmụ mmadụ na-enwe n’ebe ibe ha nọ ka apụrụ inwe site n’ịtụle ụdị ịhụn’anya Chineke nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ. “N’ihi na Chineke huru uwa n’anya otú a, na Ọ nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nánị Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n’iyì, kama ka ọ nwe ndu ebigh-ebi” (Jọn 3:16). Edere ya ọtụtụ ùgbò nime Baịbụl na anyị ga-adị ka Jisọs, ọzọ, Onyenwe anyị gwara ndị ná-ege Ya ntị ka ha yie Nna ha nke Eluigwe, Onye “nwere iru-ọma n’ebe ndị nēnwegh ekele na ndi ajọ madu nọ” (Luk 6:35). Ọkpụrụkpụ ihe nke ndụm-ọdụ ikpe-azụ enyere ụmụ Chineke n’ihe-ọmụmụ dị n’ebe ọgụgụ anyị bụ: “Ekwosola onye nēme ihe-ike ekworo, arọputa-kwa-la otù efu n’uzọ-ya nile” “Nsọpuru ka ndi maraa ihe gēketa; Ma ndi-nzuzu nēbuli nleli” (Ilu 3:31, 35).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị mere Chineke ji nye Israel iwu ka ha kekwasị akụkụ Iwu ndị ahụ edere-ede n’arụ ha?
  2. Òlee otú aga-esi dee iwu nke Chineke nime obi?
  3. Gịnị ga-eweta ụbọchị ndụ dị ogologo, ọtụtụ arọ nke ndụ na udo?
  4. Gịnị bụ ọnụ-ahịa nke amam-ihe?
  5. Òlee otú anyị ga-esi nweta amam-ihe?
  6. Gịnị bụ ịdị-mma nke onye agbata-obi?
  7. Gịnị mere anyị agaghị ekwoso onye ná-emebi iwu ekworo?