Ilu 4:1-27

Lesson 278 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Okporo-uzọ ndi ezi omume di ka ìhè nēnwu enwu, nke nāmù aga n’iru n’iru rue mgbe chi bọchara” (Ilu 4:18),
Cross References

I Ezi Òzìzí

1. Solomon na-enye ụmụntà ezi ndụm-ọdụ, Ilu 4:1, 2; Abù Ọma 34:22

2. Nna Solomon, bụ Devid, ziri ya ka o debe ihe niile o nyere ya n’iwu, Ilu 4:3, 4; 7:2

II Amam-ihe

1. Egosịrị amam-ihe dịka isi-ihe, Ilu 4:5-7; 2:2-5; Matiu 13:44

2. Agụkọrọ ọtụtụ ngọzi nke na-eso amam-ihe, Ilu 4:8, 9; 1:9; 3:22

3. Ekwere mkwà nye ndị niile nke ná-aga n’ụzọ amam-ihe ogologo ndụ, Ilu 4:10-13, 19; 3:2

III Ụdị Okporo-ụzọ Abụọ

1. Adọrọ anyị aká-ná-ntị ka anyị ghara ịbà n’okporo-ụzọ ndị ná-emebi iwu, Ilu 4:14-17; 1:10-15; Abù Ọma 1:1

2. Okporo-ụzọ ndị eziomume dị ka ìhè ná-enwu enwu, Ilu 4:18; Matiu 5:14; II Samuel 23:4

3. Ọ dị mma ka anyị ná-eche obi anyị nche karị ihe ndebe anyị niile, Ilu 4:20-27

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Solomon bụ onye amụbatara n’èzínaụlọ nke ndị nwere àkụ na ọtụtụ ihe-nketa. Ọ bụ onye nwere ọnọdụ ọma ịbụ nwa Devid n’oge agadi ya, na kwa itólite n’okpurù nzọpụta nsọ Ndị Kraist dịka ọ dịrị n’oge ahụ. Solomon ketara inwe mmasị n’ihe-odide na ịgụ akwụkwọ nke nna ya, ike nke ịchị-achị, na ịhụ ihe nke Chineke n’anya. Azụlitere ya n’ụzọ okpukpé na ọmụmụ-ihe nke ndị Ju. Ọ bụ onye nwere nghọta n’ihe-odide na nke ihe-ọmụma, ebe o dere ihe ra ka puku ilu atọ, ọnụ-ọgụgụ abụ ya dị kwa otù puku na abụ ise (I Ndi Eze 4:29-34). Solomon wee bụrụ otù nime ndị nwere nghọta dị ịtụn’anya n’ihe banyere ihe-odide n’ụwa. Anyị ná-agụ nime Baịbụl ebe edere sị, “JEHOVA we hu ya n’anya” (II Samuel 12:24).

Ịdọ-aká-ná-ntị nke Devid Dọrọ Solomon

Solomon meghere akụkụ a, nke bụ ụfọdụ nime ihe-odide ya site n’okwu ndịa: “Umum, nurunu idọ-aka-na-nti nke nna, tọkwa-nu nti n’ala ima nghọta: n’ihi na ezi ihe-nmuta ka m’nyeworo unu, unu arapula iwum. N’ihi na nwa ka m’buru nnam, di nrò, buru kwa nwa enwere nani ya n’iru nnem. O wee zim ihe, sim, Ka obi gi jide okwum nile: debe ihe nile m’nyere n’iwu. We di ndu” (Ilu 4:1-4). Solomon chọrọ ime ka ọgbọ niile nke ga-esote ya n’àzụ mata ihe bụ ezi òzìzí kwesịrị ntụkwasị-obi nke nna ahụ bụ onye nke Kraist.

Mgbe Solomon bụ nwantà, Devid dọrọ ya aká ná ntị site n’Okwu Chineke na ezi òzìzí, na mkpà ọ dị idebe iwu nke Chineke ka o wee nwee ndụ ebighị-ebi. Mgbe ha nọ n’okpuru iwu, adọrọ Ndị Ju aká ná ntị ka ha kụziere ụmụ ha ihe nke Chineke mgbe ha nọ n’ụlọ ha, ma-ọbụ mgbe ha nọ n’ụzọ ijè, ma-ọbụ mgbe ha na-eje ịrarụ-ụra, na mgbe ibili-ebili n’ụtụtụ. Solomon chọrọ ka anyị hụ ezi ihe ngosi pụtara ìhè nke ezi ịdọ-aká-ná-ntị a nke nna ya dọrọ. “Ọ we zim ihe, sim, Ka obi gi jide okwum nile; debe ihe nile m’nyere n’iwu, we di ndu” (Ilu 4:4).

Achọrọ Amam-ihe

Otù nime ndụm-ọdụ mbụ enyere nwaokorọbịa ahụ nke gaje ịbụ eze bụ: “Nweta amam-ihe, nweta nghọta; echezọla, esikwala n’okwu nile nke ọnum wezuga onwe gi: Arapula ya, ọ gedebe kwa gi; hu ya n’anya, ọ gēchebe kwa gi. Isi ihe ka amam-ihe bu; nweta amam-ihe: E, were ihe nile i nwetaworo nweta nghọta” (Ilu 4:5-7). Anyị matara na ịdọ-aka-ná-ntị adọrọ n’ebe a bụ ka ejide eziomume na amam-ihe nke Chineke; n’ihi na Okwu Chineke na-agwa anyị ka anyị chọọ amam-ihe ahụ, na ọ ga-echebe anyị, ka anyị hụ ya n’anya, na ọ ga-ebede anyị. Náánị nchebe ma-ọbụ ike nchebe ntakịrị dị n’amam-ihe ma-ọbụ nghọta nke uwa. Ma ịtụ egwù Chineke bụ mmalite nke amam-ihe, inwe kwa egwù Chineke na-eweta nchègharị maka mmehie. Mgbe anyị nwetara amam-ihe a, obi anyị na mkpụrụobi anyị na-emeghe, anyị ewee bụrụ ndị nwere nghọta nke ime mmụọ.

Ọ bụ ezie na ọ bụ nwatakịrị n’oge ahụ, ma Solomon gere ntị nkeọma wee nabata ezi òzìzí niile nke nna ya nime obi ya. Mgbe emesịrị Solomon eze, Chineke bịakutere ya wee jụọ ya ihe Ọ ga-enye ya. Solomon sịrị, “Ugbu a nyem amam-ihe na ihe ọmuma ka m’we nāpu nābata kwa abata n’iru ndi nka n’ihi na ònye gēkpe ndi Gi nka di uku ikpé?” (II Ihe Emere 1:10).

Solomon ghọtara na ọ bụ n’ebe Chineke nọ ka ọ ga-enwe ndabere ya niile maka amam-ihe, iji wee chịa ndị “nka bara uba dika ájá ala.” Arịrịo ya tọrọ Chineke ụtọ, o wee nye ya ọbụná karị ihe nke ọ rịọrọ. N’iji wee tụkwasịrị ya ihe na amam-ihe, Chineke tụkwasịịrị ya àkụ, ụbá, na nsọpụrụ. “Tukọba ya elu (bú amam-ihe), ọ gēbuli kwa gi: ọ gāsọpuru gi, mgbe i gāgbaku ya obi. Ọ gēnye isi-gi okpu amara: okpu-eze mara nma ka ọ gēnye gi n’aka” (Ilu 4:8, 9).

Okporo-ụzọ Abụọ

Otù nime ndụm-ọdụ ọzọ enyere Solomon bụ, “Abala n’okporo-uzọ ndi nēmebi iwu, agakwala n’iru n’uzọ ndi-ọjọ” (Ilu 4:14). N’ebe a anyị na-achọpụta na ọ dị okporo-ụzọ abụọ nke ná-eduba n’ebighị-ebi. Otù bụ ụzọ obosara nke ná-eduba n’ịlan’iyi ebighị-ebi. Okporo-ụzọ nkeọzọ bụ ụzọ nke ndị eziomume.

Ana-ahụ ọtụtụ mmadụ n’ụzọ obosara ahụ nke ná-eduba n’ịlan’iyi, n’ihi na ịhụ ihe-ụtọ nke mmehie n’anya kérè ha agbụ. O nwere ike ịbụ site n’ijé n’ụlọ ité egwú, ịga sinima, ịgba kad na ịnọ n’òtù ndị ná-agbá chacha, ma-ọbụ egwuri egwú bọl emeere ha; ma-ọbụ na o nwere ike bụrụ na ha nọ n’ụzọ obosara ahụ n’ihi ịkpachapụ anya nọdụ ná-enweghị mmasị nime onwe ha. Ụfọdụ mmadụ nọ kwa n’ebe ahụ n’ihi nnupụ-isi ahụ nke dị n’obi ha megide Chineke. Ụfọdụ na-anọdụ kwa n’ebe ahụ n’ihi ihere nke ihe ndị enyi ha ga-ekwu. Ụfọdụ nọ n’ebe ahụ n’ihi na ha na-achọ ego na ihe nnweta nke ụwa nke a, kama ịchọ akụ-na-ụbá nke Chineke -- bụ ezi olile anya nke ndụ ebighị-ebi nke Chineke n’Eluigwe. Mmadụ ụfọdụ nọ kwa n’ebe ahụ n’ihi na ha achọghị ịnagide ịta-ụta nke Obe Kraist. Ụfọdụ kwa nọ n’ebe ahụ n’ihi na ha chọrọ ụzọ nke ka mfé iji fee Chineke òfùfè, nke mere na ha wepụtara ụzọ nke aka ha, ma-ọbụ soro ụzọ nke onye ọzọ wepụtara iji ná-efé òfùfè. Ụfọdụ nọ kwa n’ebe ahụ n’ihi na ha jụrụ nzọpụta nke ha onwe ha.

Ụzọ nke ndị eziomume bụ ụzọ dị warara, ọ bụ kwa náánị mmadụ ole-na-ole na-achọ ịchọta ya. Ọ bụ ihe akọwara nkeọma, bụrụ kwa ihe onye ọ bụla nke bụ ezi Onye Kraist ga-aghọta mgbe ọ na-agụ: “Okporo-uzọ ndi ezi-omume di ka ìhè nēnwu enwu, nke nāmu aga n’iru rue mgbe chi bọchara” (Ilu 4:18). Okporo-ụzọ ndị ná-emebi iwu bụ óké iru-uju, ọchịchịrị, jupụta kwa n’ihe egwù; ma nke ndị eziomume ghere-oghe jupụta kwa n’ìhè. Ezi Onye Kraist na-ejé ijè n’iwu niile nke Chineke ná-enweghị ịta-ụta: ọ na-eme kwa ka ìhè ahụ ná-enwuru ndị niile nọ ya gburugburu, ma-ọbụ onye ọ bụla nke ná-abịakute ya n’ụzọ ọ bụla.

Idebe Obi

Obi bụ isi-iyi nke ndụ nke anụ-arụ nke anyị na-adị. Ya mere, n’ihe nke ime mmụọ, anyị na-asị na obi bụ oche-eze nke Onyenwe Ndụ na Ebube, ọ bụ kwa n’ebe Ọ nọ ka mmiri nke ndụ nke ime mmụọ si abịa wee rue akụkụ niile nke arụ mgbe Ọ nọ n’oche-eze Ya. Anyị ga-abụ ndị na-elezi anya nkeọma ịhụ na isi-iyi a agaghị abụ ihe ana-akpagbu, ime ka mmiri nke ndụ a wee gwụsịa.

Mgbe ahụ, anyị ga-abụ ndị ga-ewezuga ọnụ na-ekwu okwu gbagọrọ agbagọ n’ebe anyị nọ, ya na egbugbere ọnụ nke na-ekwuhie ekwuhie, ma otú ọ dị, anyị ga na-aga n’iru. Ọ bụrụ na obi dị ọcha dị kwa nsọ, nzube ya niile ga-adị ọcha dị kwa mma. Ime ngwá niile, okwu ọjọọ niile, na enweghị ndidi niile ga-agwụ. Mee ka okporo-ụzọ nke ụkwụ gị dị larị ịhụ na ọ dịghị ajọ omume ọ bụla nke ị na-eme. Chee kwa échìchè nkeọma banyere omume gị niile.

Nkwubi-okwu ahụ

N’akụkụ ọzọ nke Baịbụl, agwara anyị nkwubi-okwu ndịa: “Tua egwù Chineke, debe kwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nka bu ọlu madu nile. N’ihi na ọlu ọ bula ka Chineke gēme ka ọ ba n’ikpé, ya na ihe ọ bula zoro ezo, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ” (Eklisiastis 12:13, 14).

Mgbe anyị nọ ná-adị ndụ nke ezi Ndị Kraist, anyị na-anụ ọtụtụ ịgbá-àmà nke ndị ntorọbịa ndị jégharịrị n’uche nke aka ha, ná-achọghị ime uche Chineke; ma Chineke mere ka ha baa n’ikpé site n’ebere Ya. Ụfọdụ nime ndịa bụ ndị nwere nne na nna bú Ndị Kraist, ndị dụrụ ha ọdụ banyere iso ezi ụzọ, ndị ná-adịghị ezu-ike n’icheta ha n’ekpere n’ogologo ndụ ha niile. Mgbe ha nọ ná-ebi ndụ nime mmehie, ọtụtụ mgbe ka ha nụrụ ekpere nke ndị mụrụ ha, ndị bụ ndị nke Chineke, mgbe ụfọdụ ha na-echeta kwa ọtụtụ ihe nke eziri ha. Chineke ji ụzọ dị otú a mee ka ha bịarue kwa ná nchègharị ọzọ.

Ndịọzọ bụ kwa ndị ná-enweghị nne na nna bụ Ndị Kraist, ma ha na-ekwu na Chineke kpọbatara ha n’Oziọma site n’otù ụzọ ma-ọbụ n’ụzọ ọzọ. Ha, na ndị ahụ bụ ndị matara ihe banyere iso ụzọ Kraist na ihe kwesịrị ka ha mee, ahụwo ahụhụ n’ihi mmehie ha nke ekpe-kwara ha ikpé, n’ebere, n’ihi na ha mebiri iwu Chineke na nke mmadụ. Chineke kwenyere ka iru-uju na nsogbu dakwasị ha, ka ha wee hụ nnukwu amam-ikpé nke ná-abịkwasị ha ma ọ bụrụ na ha anọgide n’ụzọ ọjọọ ahụ.

Enwere ike izonarị omume ọjọọ n’anya mmadụ, ma Chineke na-ahụ ha niile. Ọ dịghị ihe ọ bụla ezoro ezo n’ebe Ọ nọ, aga-eme kwa ka omume ọjọọ niile pụta ìhè n’ikpé. Eziomume niile nke ndị nke Chineke emere na nzuzo, ka Chineke ga-akwụghachi ha n’ìhè.

Ndụm-ọdụ nke Solomon nyere ndị bụ ụmụ, nke kachasị ịbà urù bụ: “Cheta kwa Onye keworo gi n’ubọchi nile i di n’okorọbia” (Eklisiastis 12:1).

Cheta Chineke mgbe ị dị n’okorọbia, ka i wee nwee ogologo ndụ na ndụ agọziri agọzi, ka ewee zọpụta gị ná nsogbu na mbibi nke na-adakwasị onye mmehie. Lee ka Chineke ga-esi nwee obi-ụtọ n’arụ onye ahụ nke azọpụtara mgbe ọ di n’okorọbia; onye nke ọ ná-adịghị mgbe ọ bụla ọ na-eso n’ime ihe ọjọọ dị iche iche; onye na anara kwa ndụmọdụ nke ndị mụrụ ya bụ ndị ná-atụ egwù Chineke, nke ná-adịghị ekwe ka ụkwụ ya jégharịa n’okporo-ụzọ nke mmehie. Ụmụ dị otú a bụ ndị agọziri agọzi nke Jehova.

Otú ọ dị, mgbaghara na óké ịhụn’anya zuru òkè dịkwara ndị ahụ bú ndị rapụrụ èzínaụlọ nke Ndị Kraist wee bànye nime mmehie na n’iru-uju, dịka ọ dịkwara ndị ahụ ná-amaghị ihe banyere ibi ndụ nke Ndị Kraist, ma-ọbụ ihe banyere iso ụzọ Kraist. O nwere ndụ ọma nke ijéozi nke dị n’iru, ya na ọtụtụ ụgwọ-ọlụ nke sitere n’Eluigwe, nke dịrị ndị niile bịakutere Chineke na ndị ga-ejere Ya ozi n’ikwesị ntụkwasị-obi, ná-agụghị ọnọdụ ha nọ n’ụwa mgbe ha ji kpee ekpere banyere mgbaghara. Mgbe Chineke na-agbaghara, Ọ na-echezọ kwa mmehie ahụ. Ana-ehichapụ kwa mmehie anyị mgbe àmàrà nke mgbaghara Chineke bịaruru anyị nso. Anyị na-abụ ndị emere dịka aga-asị na anyi emehietụbeghị mbụ. Onyenwe anyị kpọrọ mmehie asị. O nyere Ọbara nke ndụ Ya ka O wee gbapụta ndị mmehie. Ọ hụrụ mkpụrụobi nke onye-mmehie ọ bụla n’anya, ma Ọ kpọrọ mmehie ahụ niile nke onyemmehie mehieworo asị.

Chineke kere anyị ka anyị wee nwee ọñụ, ma ọ bụ náánị nime Chineke ka anyi na-enwe ezi ọñụ ahụ. Cheta Ya n’ihi ịhụn’anya Ya, ebere Ya, na nchebe Ya. Ị na-echèta Ya? Òlee otú anyị ga-esi chezọọ Ya? O nyere ndụ Ya n’ihi anyị!

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Ònye nyere Solomon ụdị ndụm-ọdụ ahụ nke jupụtara n’amam-ihe?
  2. Gịnị ka ọ sịrị na ọ bụ isi ihe nke aga-enweta?
  3. Kpọọ aha ihe ole-na-ole nke amam-ihe ga-emere gị?
  4. Kwue okwu banyere okporo-ụzọ abụọ ahụ nke ekwuru okwu banyere ya n’ebe a.
  5. Gịnị ka Solomon gwara anyị ka anyị wepụ n’ebe anyị nọ?
  6. Òlee ụzọ anyị ga-esi chebe obi anyị?