Ilu 6:1-19

Lesson 279 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: Oriọna ka ihe ahu enyere n’iwu bu; iwu ahu bu kwa ìhè; Ọ bu kwa uzọ ndu ka iba-nba nile nke idọ-aka-na-nti bu” (Ilu 6:23).
Cross References

I Amam-ihe nke Inwe Ezi Uche

1. Egosịrị ịma-n’ọnyà dị iche iche nke ịnapụ (ma-ọbụ ịnọdụrụ) mmadụ n’aka mbé, Ilu 6:1-5

2. Akọwapụtara ịdị-mma niile nke dị n’ịlụsi ọlụ ike na ọbụbụ-ọnụ nke dịrị ume-ngwụ, Ilu 6:6-11

3. Ọgwụgwụ iru-uju nke onye ná-emebi iwu aghaghị ịdị, Ilu 6:12-15

II Ihe niile ahụ Chineke Kpọrọ Asị

1. Ndị mpako ka akpọrọ ihe-arụ n’ebe Chineke nọ, Ilu 6:16, 17; 11:2; 13:10; 16:18; 21:4; Abù Ọma 10:4; 119:21; Habakuk 2:4; Mak 7:20-23; I Timọti 3:6; I Jọn 2:16

2. Onye na-ekwu okwu ụgha ka agụnyere n’òtù ọjọọ ahụ, Ilu 6:17; 11:1; 19:9; Abù Ọma 15:1, 2; 63:11; Aisaia 44:24, 25; Ndi Efesọs 4:25; Nkpughe 21:8

3. Agụnyere Ndị ogbu-mmadụ n’òtù ahụ, Ilu 6:17; Jenesis 4:8-15; 49:5-7; Ọpupu 20:13 na Matiu 19:18 tụlee Matiu 5:21, 22 na I Jọn 3:15; Ndi Rom 1:28-32; I Pita 4:15; Nkpughe 21:8

4. Onye ná-echépụta échìchè ọjọọ dị iche iche ka egosiri ọnọdụ ha n’iru Chineke, Ilu 6:18; Jenesis 6:5-7; 8:21; Abù Ọma 10:2; 38:12; 33:10; Ndi Rom 1:20-25; II Ndi Kọrint 10:5; Job 5:12

5. Onye na-ese Okwu chọpụtara na Chineke kpọrọ ya na ọlụ ọjọọ ya niile asị, Ilu 6:18; 1:10-19; 4:14-19; Aisaia 59:1-8; Maika 2:1-3; Ọlu Ndi-ozi 13:10, 11; Ndi Rom 3:10-18; Abù Ọma 10:4-11

6. Agaghị anagide onye-àmà okwu ụgha, Ilu 6:19; 19:5, 9; 24:28; 25:18; Abù Ọma 24:3, 4; Matiu 5:33; Ọpupu 20:7; 23:1; Deuteronomi 19:16-21; Zekarais 5:3, 4; Malakai 3:5

7. Ihe-árụ ikpe-azụ nke edepụtara bụ enweghị ngọpụ nke onye na-ezisa ise-okwu n’etiti ụmụnne, Ilu 6:19; 16:28; II Ndi Tesalọnaika 3:11, 12; I Timọti 5:13; I Pita 4:15; Hosea 8:7; Ndi Galetia 6:8

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Ihe-odide dị ukwu adịwo n’ezie, site ná mgbalị nke ụmụ mmadụ bụ ndị, site na mgbe dị anya gara aga, ha agbalịwo igosi ụzọ ndị ahụ ụmụ mmadụ soworo nke dị Chineke ezi mma na ụzọ ndị ahụ nke ná-adịghị Ya mma. Ma nime Baịbụl ka achọpụtara okwu dị mfé dị kwa mkpirikpi, nke aghọta kwara na nke pụtara ìhè banyere ihe ndị ahụ nke ná-adịghị Chineke ezimma. Okwu a bụ isi-okwu nke ịhe-ọmụmụ anyị.

Nime isi-okwu ahụ amaokwu ole-na-ole ndịa ka ọtụtụ ebe ọgụgụ nke ná-akuzi amam-ihe nke ihe-ọmụmá n’ihe nke aka anyị na n’ihe nke mmụọ anyị na-ebutere ụzọ. N’ịtule ihe anyị rọpụtaworo dịka isi-okwu nke ihe-ọmụmụ a, anyị adịghị eme ka ekwenye na anyị weere akụkụ ọzọ niile nke ebe ọgụgụ a dịka ihe ná-adịghị óké mkpà. Oghere adịghị iji dee ihe banyere ebe ọgụgụ ahụ n’òzùzù òkè; ebe ọ bụ na ihe edere n’akụkụ nke mbụ enweghị kwa nkọwa ọzọ, anyị ga-amalite ihe-ọmụmụ ndịa site n’ịkọwa okwu ahụ n’otù n’otù, ọ bụ ezie na ọ dị mkpirisi n’onwe ya, ma otú ọ dị ọ chịkọtara ihe niile n’òzùzù-òkè bụrụ kwa ihe ruru n’akụkụ niile nke okwu ahụ.

“Ihe isi di nke JEHOVA kpọrọ asị; E, ihe asa di

nke bu ihe-árú nke nkpuru-obi-Ya.”

N’ụzọ dị otú a ana-eme ka anyị mara amaokwu anọ ndị ahụ ana-atụle. Anyị aghaghị ịtụgharị uche n’amaokwu a ma ọ bụrụ na anyị ga-eritazu urù zuru-òkè n’amaokwu ndị ahụ ná-esote.

“ONYENWE ANYỊ Ahụ” abụghị onye ọzọ ná-abụghị Jehova, Chineke ahụ ná-eme ọgbụgba-ndụ ma ná-edebe kwa ọgbụgba-ndụ n’elu ụwa; Chineke nke ebere, ịhụn’anya, na ịdị-mma; Chineke ahụ onye ịdị-nsọ Ya zuru-òkè; Chineke onye ná-apụghị ilekwasị mmehie anya ịnabata ya n’ọtụtụ ya ọ bụla; Chineke ahụ onye ná-adịghị ele mmadụ anya n’iru. Chineke a nwere ike ịkpọ asị -- ịkpọ asị nke zuru òkè, nke ziri ezi, na nke, anyị pụrụ ikwu, n’onwe ya, na ọ bụ ụdị nke ịdị-nsọ Ya na ịdị-ọcha Ya nke ná-enweghị ntụpọ.

Anyị ga-ahụ na mgbe ụmụ mmadụ ná-akpọ asị ha bụ ndị ikpé mmehie mara -- n’ezie mmehie nke igbu-mmadụ n’onwe ya. Ma ịkpọ asị nke Chineke dị nnọọ ichè site n’ebe nke ahụ ná-adịkarị nime mmadụ ahụ nke ana-ekèghị ọhụụ. Ọtụtụ mgbe mmadụ na-achọ ịbọ-ọbọ n’ihi ịkpọ asị. Ọ na-akpọ asị n’ihi na o jupụtara ná mmehie nke ekwòrò. Ọ na-akpọ asị n’ihi na ọ pụghị inwe ihe ọ na-achọ ma-ọbụ hụ ka emezuru àtụmàtụ ahụ nke o chèpụtara. Ma ịkpọ asị nke Chineke bụ ịkpọ mmehie asị. Ọ na-eleda adịghị ọcha anya, bụ ihe ahụ nke ná-adịghị nsọ na nke emerụrụ emerụ. Ọ na-akpọ nnupu-isi asị. Dịka o si dị ma zi-kwa ezi, Chineke kpọrọ mpako asị nke pụrụ iduba ụmụ mmadụ n’ọnwụ ná enweghị olile-anya ebighị-ebi ma ọ bụrụ na arapụ ya ka ọ nọgide nime obi.

Chineke na-akpọ ihe ahụ nke na-emegide uche Ya zuru òkè asị, n’ihi na ụzọ ọ bụla ọzọ karị nke Ya na-eduba n’ịlan’íyì ná-enweghị olile anya ebighị-ebi. Chineke na-akpọ ịwụsị ọbara nke ná-emeghị ihe ọjọọ asị. Chineke na-akpọ kwa ọtụtụ ihe niile ọzọ asị, n’itule kwa ha anyị ga-ahụ ihe dị iche iche nke kpatara O ji nwee ike ịkpọ ha asị ma mee kwa otú ahụ n’eziomume na n’ịdị-ọcha nke ịdị-nsọ. Ma mmadụ nke na-emehie ichè na ya pụrụ ịkpọ asị n’ihi na Chineke gosipụtara ịkpọ asị n’ụzọ ndịa abụghị ihe-ọzọ karịa ngosipụta nke ihe mbụ ahụ nke akpọrọ aha n’ihe-ndepụta niile ahụ sitere n’Akwụkwọnsọ nke bụ kwa ihe-arụ n’ebe Chineke nọ. Onye ọ bụla nke na-enwe ihe-ngọpụ (maọbụ inye ụsà) ya n’ihi nke a, na-ejupụta ná mpako. Ya mere, ka anyi tụlee mmehie a nke jọgburu onwe ya na nke bụ kwa isi mmehie.

Mpako nime Obi Mmadụ

Apụrụ ịkọwa mpako dịka ịfụlị onwe onye elu, ma-ọbụ inwe mmasị ná-ezighịezi ma-ọbụ óké mmasị n’ọnọdụ nke mmadụ ọzọ nwe, ihe ọ lụpụtara ma-ọbụ n’ihe nnweta ya. Okwu Chineke na-agwà anyị na nganga nke obi nwere ike iduhie onye ahụ nke rapụrụ ya ka ọ nọdụ n’obi ya. Ya mere, site na nkọwa nke a na site n’ihe enyere n’iwu nke dị na Baịbụl banyere ọlụ ọjọọ ya niile zoro ezo, anyị pụrụ ịhụ na ọ bụ ihe dị óké egwù.

Ebe ntụpụta niile nke mmehie a nke jọgburu onwe ya bụ ihe dị aghụghọ dịkwa egwù, ọ dị mkpà na anyị ga-enyocha onweanyị mgbe niile ịhụ ma ọ dị ụzọ ọ bụla dị ntà ọ si dịrị n’obi anyị. Mmadụ nwere ike ịsị: “Ma nganga nke dị n’obim dị ezi ntà ma buru kwa ihe efu. Nke ahụ n’ezie apụghị ịbụ ihe dị njọ maọbu dị kwa egwù.” Ma ọ bụrụ na ọ pụrụ iduhie onye ahụ nke rapụrụ ya ka ọ nọgide n’obi ya, site n’aghụghọ ya, agaghị anagide ya ma-ọbụ rapụ ịsachapụ ya.

Ọ ga-abụ ihe nzuzu n’ezie ịrapụ ihe ọ bụla ka o were ọnọdụ nime anyị bụ ihe nwere ike ịla anyi n’íyì ma emesia, ebe ọ na-eduhie anyị mgbe niile banyere ụdị ya na ọlụ nke mbibi ọ na-alụ. Eziokwu ahụ pụtara ìhè na mmadụ nwere ike ikwu okwu dị otú a iji kwadoo mmalite nke akpọrọ ihe dị ntà nke mmehie a jọgburu onwe ya, na-egosipụta n’ụzọ ná-enweghị agụgọ na nduhie ahụ amalitewo n’obi ahụ. Mmalite ahụ niile, dịka anyị pụrụ ịhụ, abụghị ihe dị ntà ma-ọlị. Ha dị óké egwù; ma ọ bụrụ na adọkapụghị ha laa kwa ha n’íyì, ihe ndapụta dị óké egwù dị n’iru. Ọlụ ha nke pụrụ ịla mmadụ n’íyì amalitewo ya na ihe nzúzó nke sitere n’omume nduhie nke mmehie na eme ka onye ahụ nke ọ dị n’obi ya ghara ịmata ihe mmehie a na-alụpụta. Ọ bụghị ihe ịtụn’anya na Chineke kpọọ mpako asị!

“Ma gịnị bụ mmehie ahụ nke dị ná mpako?” ka enwere ike ịjụ. Mpako na-eweli mmadụ ekèrè èkè elu; mpako na-eweda Chineke, Onye òkìkè ala. Mpako na-eweli mmadụ n’anya nke ya onwe ya, site kwa na nke a mee ya onye nọ n’ọmụma ikpé nke ikpere arụsị; n’ihi na ọ na-enye ihe ọzọ otuto na nsọpụrụ karịa ịsọpụrụ Chineke. Ihe ọ bụla nke na-ewere ọnọdụ nke Chineke, ihe ahụ bụ arụsị. Ọ bụrụ na mpako adị n’obi anyi n’ihi ọnọdụ anyị, ihe anyị lụpụtara ma-ọbụ ihe onwunwe anyị, ihe ndịa ewerewo ọnọdụ nke Chineke nye ihe ahụ anyị hụrụ n’anya na ihe ahụ anyị na-enye oge anyị na uche anyị. Ya mere ndị mpako, ọ bụghị náánị na ha nọ n’ọmụma ikpé nke iweli onwe ha elu na nke iweda aha Chineke, kama ha nọ kwa n’ọmụma ikpé nke ikpere arụsị. Chineke ga-ekpe ma maa kwa onye na-ekpere arụsị ikpé, obi mpako bụ kwa ihe arụ n’ebe Chineke nọ.

Ọtụtụ Ire Ụgha nke Ụmụ mmadụ

Ebe Chineke bụ Chineke Nke na-agbà ndụ, bụrụ kwa Chineke Nke na-edebe ọgbụgba-ndụ, ebe O kekwara mmadụ n’ụdị Ya na n’oyiyi Ya wee chọọ kwa ka mmadụ dị ka Ya onwe ya mgbe niile, anyị ga-ahụ site n’ebe mbụ nke akụkụ ihe-ọmụmụ anyị a, na ndị niile na-ekwu okwu ụgha bụ ihe-arụ n’ebe Ọ nọ.

Ụmụ mmadụ ekwusiwo okwu ụgha n’ụzọ dị iche iche, na-asị na ụfọdụ abụghị mmehie n’ihi ihe nke kpatara ha. Ma Chineke ekwuwo na ikpé ga-adịrị “ndi ụgha niile,” Ọ sị kwa na òkè ha ga-abụ ọnwụ nke abụọ ahụ, nke olile-anya nke nnapụta ná-adịghị kwa.

N’ezie, “Ndi ụgha niile” ọbụná ndị ana-akpọ ndị ụgha ntà (ma-ọbụ ụgha ọcha), ha niile bụ kwa otù. Aghụghọ nke iji megide eziokwu na mmekọrịta nke mba ma-ọbụ mmadụ na ibe ya, ebe asịrị É-è n’ọnọdụ Ee, ebe ekwekwara mkwà nke ana-ezubeghị imezu, ma-ọbụ ebe ekwuru okwu nke ná-abụghị dịka eziokwu si dị, ihe ndịa niile bụ ụgha bụrụ kwa ihe Chineke kpọrọ asị.

Ụfọdụ mmadụ na-agụ okwu ụgha dịka ihe ziri ezi ma ọ bụrụ na ha ekwuo ya, dịka ha na-asị, ka ha wee mee ka ala-eze Chineke gaa n’iru. Ụzọ niile nke Chineke bụ eziokwu. Jisọs bụ Eziokwu ahụ. Mmụọ Nsọ na-eduba n’eziokwu niile. Okwu Chineke bụ Eziokwu. Chineke apụghị ime mmehie. Chineke apụghị ikwu okwu ụgha. Ndị-orù Ya agaghị eme kwa mmehie ma-ọbụ ghaa ụgha, ma-ọbụ ime otú a n’ọnọdụ ngọpu na ha na-eme ya ka ọlụ Chineke gaa n’iru site n’itinye aka ná mmehie dị otú a.

Igbu Mmadụ

Ná mmalite nke oge, Ken gburu Ebel wee bụrụ onye mbụ nke edere ihe banyere ya dịka ogbu mmadụ. Ikpé nke Chineke dakwasịrị Ken ngwà ngwà ná-alaghị àzụ; ya onwe ya kwa sịrị na ahụhụ ya dị ukwu karịa nke o nwere ike ibu. Chineke bụ Onye nyere anyị ndụ, ọ dịkwa n’ike aka Ya iwere kwa ya. N’oge iwu nke Moses, Chineke nyere ndị ọchịchị ike ma-ọbụ kwenye ka ewepụ ndụ mmadụ n’ihi ọmụmá ikpé nke iwu obodo bayere mmehie dị iche iche. O nyekwara iwu ka ekpochapụ mba niile ọ bụla nke jụrụ Chineke n’elu ụwa, ka ewee gbochie ọgan’iru nke ụzọ ọjọọ ha nke jupụtara ná mbibi. Ma ọ bụ náánị Ya bụ onye ọ dị n’aka iwepụ ndụ mmadụ.

Igbu-mmadụ bụ iwepụ ndụ mmadụ site ná nzube ọjọọ nke obi. Iwepụ ndụ mmadụ n’agha n’ụzọ ná-ezighị ezi bụ igbu mmadụ. Nke ha na-akpọ ogbugbu n’ụzọ ebere, na igbu nwantakịrị nọ n’afọ bụ kwa igbu-mmadụ. Adịghị agụnye igbu-mmadụ na mberede ma-ọbụ igbu anụmanụ dịka igbu-mmadụ. Iwu ahụ, “Gị egbula madu” ka atụgharịrị kọwaa kwa nkeọma nye anyị nime Testament Ọhụụ. N’ebe mbụ ahụ edekwara ya ọzọ bụ n’ezie, “Gị egbula madu” (Matiu 19:18). Jisọs kọwara Iwu ahụ wee gosi kwa ihe dị elu nke dị na Testament Ọhụụ site n’ịgwa anyị na ọ bụrụ na anyị akpọ mmadụ asị anyị bụ ndị nọ n’amam-ikpé nke mmehie nke igbu-mmadụ (Matiu 5:21, 22; I Jọn 3:15).

Mmadụ iwepụ ndụ ya bụ kwa igbu-mmadụ. Mmadụ enweghị ikikere igbu onweya. Ọ bụ kwa eziokwu na mgbe mmadụ gburu onweya, onye ahụ mehiere megide onweya, n’ihi nke a ọ ghaghị ịhụ ahụhụ n’ihi mmehie ahụ. Ma onye ọ bụla nke na-egbu onweya na-emehie kwa megide Chineke, ọ ga-aza kwa ajụju banyere mmehie ahụ mgbe ọ ga-eguzo n’iru Oche-ikpé Chineke.

Ihe-arụ Anọ Dị Iche iche Fọdụrụ

Ihe anọ ahụ dị iche iche fọdụrụ nke Chineke kpọkwara asị, nke anyị ga-atụle, bụ kwa ihe-arụ n’anya Chineke. “Obi nke nēcheputa echiche ajọ ihe” na “Onye-àmà okwu ụgha nke nēkupu okwu ugha dị iche iche dika ume” so kwa n’ihe nke anyị deworo banyere ire okwu ụgha nke ụmụ mmadụ. Obi nke ụmụ mmadụ abụworị ihe emerụrụ emerụ na ihe jupụtara n’ihe ọjọọ site n’ọdịda nke mmadụ ná mmalite nke oge. Ekwensu atụfụghị oge n’iweda ha n’ala, bụ ndị sitere n’inụpụrụ Chineke isi wee rọrọ ịrapụ ala-eze nke ezi ihe baa na nke ná-ezighị ezi. Site n’oge ahụ rue ugbu a omume nke asọpụrụghị Chineke na-abá ụba na-aga n’iru n’iru nime ụwa. Omume a nke asọpụrụghị Chineke bụ ihe jupụtara n’ụwa n’otù oge nke mere na Chineke lara mmadụ niile nọ n’elu ụwa n’íyì, ọ bụ kwa náánị mmadụ ole-na-ole ahụ ndị nọ n’ụgbọ ka O chebere. Ma isi mmalite mmehie nke ndịa nwụrụ n’iju-mmiri ahụ na mmadụ niile nke mmehie na-achị site n’oge iju-mmiri gasịrị bụ náánị na “ncheputa nile ọ bula nke echiche obi ya bu nanị ihe ọjọ ogologo ubọchi nile” (Jenesis 6:5).

Ọchịchọ nke mmadụ bụ náánị ihe ọjọọ. Mgbaso nke obi ya bụ náánị ebe ihe ọjọọ dị. Ọ na-echepụta mmehie ná-eme kwa ya. Nke a bụ n’ihi ndụ ya nke mmehie na-achị. Ọ dịghị ihe ọzọ ana-ele anya site n’ebe ọ nọ nime ndụ ya ahụ nke ana-amụghị ọzọ. Náánị ihe kwesịrị ka o mee bụ ijé na Kalvarị, site n’ikpe ekpere nke nchègharị, ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịgbanarị ahụhụ mmehie ebighị-ebi. Ụzọ nke eziokwu adịghị nime ya. Ọ na-ekwu okwu ụgha – ma-ọbụ na-ekwu eziokwu -- dịka ọ dị ya mma ma-ọbụ dịka o kwere ya ime na dịka onye ọ rọọrọ ịbụ nna ya ukwu na-edu ya n’ọnọdụ Onye ahụ náánị Ya bụ ezi Nna ukwu, Onyenwe anyị Chineke Nke pụrụ ime ihe niile. Ya mere mmadụ ọ bụla nke nọ n’ọnọdụ onye ana-amụghị ọhụụ bụ ihe-arụ n’ebe Chineke nọ. Ọ ga anọgide n’ọnọdụ ọjọọ ahụ ná-enweghị olile-anya náánị ma o chègharịrị site ná mmehie ya wee chọọ ebere nke Chineke Onye na-akpọ ya mgbe niile ka ọ bịaruo ná nchègharị ka ewee zọpụta ya.

“Ukwu nēme ngwá igbága n’ihe ọjọ” na “onye nēzisa ise okwu n’etiti umu nne” dị ichè náánị n’akụkụ ahụ ebe ha na-alụpụta ihe ma-ọbụ ndị ahụ ha na-emetụta ma-ọbụ ndị ha na-emerụ arụ.

Akọwara ajọ ihe dịka nsogbu ma-ọbụ iwu nke ụmụ mmadụ kpatara. Chineke akpọwo anyị ịnọ n’udo. Ọ gwawo kwa anyị na anyị aghaghị ibụ ndị nwere ogologo ntachi-obi, obi ebere, n’ịdị-mma, na ịdị-nwayọ. Onye na-akpasụ esem-okwu, maọbụ onye ná-añụrị ọñụ mgbe ndịọzọ na-ese okwu, onye ahụ adịghị eso ọchịchọ nke ezi Onye Nsọ ahụ Onye chọrọ ka anyị dị ka Ya. Ọ gwara anyị sị “nāgbasonu udo n’ebe madu nile nọ, ya na ido nsọ ahu, nke onye ọ bula agagh-ahu Onye-nwe-ayi anya ma ọ nwegh ya” (Ndi Hibru 12:14).

Onye ná-ezisá ise-okwu bụ ihe-arụ n’anya Chineke, nke kachasị nke mgbe ọ na-ezisa ise-okwu n’etiti ụmụnna. Onye dị otú a n’ezie, na-achọ iguzogide ọlụ nke Chineke na igbochi Ala-eze nke Kraist. N’ụzọ dị otú a onye ahụ na mmụọ nke onye ahụ na-emegide Kraist bụ otù.

Ebe udo dị, onye ahụ nke ná-ezisà ise-okwu na-ebu agha. Ebe ntụkwasị-obi dị, ọ na-eweta ekwesịghị ntụkwasị-obi. Ebe nchekwube, okwukwe na olile-anya dị, onye a nke na-ekwesịghị ekwesị nke Chineke kpọkwara asị ga-ajụ ajụjụ megide ụfọdụ maọbụ ihe niile ndịa bụ ịdị-mma nke Chineke. Ndịọzọ na-ewuli ewuli, site n’amara na amam-ihe nke Chineke, ma onye a na-ebibi ọbụná nke ewuworo ewu. Ndịọzọ na-alụsi ọlụ ike idozi ọtụtụ ihe nke ná-adịgide adịgide na nke ná-eduba n’Ala-eze Eluigwe, ma onye arụ a na-alụ ọlụ imebi ọbụná ihe ahụ nke edoziworo maka náánị nsọpụrụ na otuto nke Chineke.

Onye a nke na-ezisa ise-okwu adịghị eji eziokwu mgbe niile mee ihe. Ọ na-ekwu okwu ụgha maọbụ tụpụta ihe ndúhie. Ọ na-aghị achọ eziokwu mgbe niile, n’ihi na ọlụ ya na-aga n’iru nkeọma n’ebe eziokwu kọrọ na ebe eji aghụghọ dochie eziokwu. Ọ na-eso ụzọ nke onyenwe ya, bụ setan, onye na-ebo ụmụnna ebubo ụgha, onye nwe ya na-eme kwa ọsọsọ inye ya ihe niile ọ bụla ọ chọrọ iji mee ka ọlụ ọjọọ ya gaa n’iru.

Mkpà nke Iché nchè Dị

Ka anyị ghara ịbụ ndị ná-ekwenyere onye-iro nke mkpụrụobi mmadụ site n’ịbụ ndị amam-ikpé nke ihe ọ bụla Chineke kpọrọ asị na nke bụ kwa ihe-arụ n’anya Ya ga-ama. Anyị pụrụ ịhụ site n’ihe ndepụta nke ihe-ọmụmụ anyị na ọ bụghị náánị ihe ndị ahụ nke akpọrọ aha ka Chineke kpọrọ asị, kama Ọ na-ewere ndị ahụ na-eme ha dịka ihe-arụ n’ebe Ọ nọ.

Anyị ekwesịghị ịhụn’anya nke Chineke, na ebere nke àjà Ya, maọbụ nke ịdị-mma. Ma O nyewo anyị ezi ihe niile na ezi onyinye niile n’ihi ịhụn’anya ahụ na ebere na ọmiko ahụ niile. Ebe ọ bụ na amara ndịa dị ukwu otú a, dị kwa ebighị-ebi, ha dịkwara ọbụná onye ahụ nke kachasị njọ n’etiti mmadụ. Ọkụ ala-mmụọ ga-abụ ebe egwù na ahụhụ ebighị-ebi dị n’ihi na ndị niile ga-anọ nime ya ga-amata na ha bụ ndị Chineke kpọrọ asị. Ịbụ onye Chineke kpọrọ asị, ná-abụghị onye Ọ hụrụ n’anya, onye ná-abụghị onye Ọ ga-enwe obi ebere n’arụ ya, nke ná-abụghị kwa onye Ọ ga-eji ịdị-mma Ya gọzie, ga-abụ nnukwu ihe ọjọọ karịa ihe ọ bụla nke mmadụ ọ bụla pụrụ iche échìchè ya.

Anyị na-enye Chineke ekele na ọ bụghị ihe dị mkpà ka anyị baa n’ebe ahụhụ a nke olile-anya ná-adịghị nime ya. Otù ebe nke dị mfé bụrụ kwa ebe ahụrụ n’anya nke bụ kwa amaokwu ana-agụ ọtụtụ mgbe nime Baịbụl ezuwo inye anyị olile-anya ahụ nke anyị chọrọ. Ọ bụrụ na anyi anara ozi nke amaokwu a nara kwa onyinye ahụ nke Chineke nyere, anyị ga-enwe ọñụ nke Eluigwe, udo nke dị ukwu nke ana-apụghị ịkọwa omimi ya na ngọzi niile nke ná-adị ebighị-ebi na ọtụtụ ụgwọ-ọlụ nke O kwere anyị ná mkwà. Anyị na-enye Chineke ekele n’ihi na “Chineke huru uwa n’anya otú a, na O nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n’íyì, kama ka o nwe ndu ebigh-ebi”! (Jọn 3:16).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị mere mmadụ ga-eji kpachapụ anya ịnara ọlụ nke ịnọrọ onye ọzọ ná mbé?
  2. Ọ bụ gịnị ka amaokwu mbụ niile nke ihe-ọmụmụ anyị gwara anyi ka anyị mee ma ọ bụrụ na anyị ekwenye ịlụ ọlụ a?
  3. Gịnị bụ ihe ahụ dị n’òkìkè nke Chineke jiri zi anyị ihe banyere ịlụsi ọlụ ike?
  4. Gịnị bụ ụgwọ-ọlụ nke ume-ngwụ n’ihe banyere ihe nke ime mmụọ maọbụ ihe nke anụ-arụ?
  5. Gịnị bụ ikpe-azụ nke onye nnupụ-isi?
  6. Kpọọ ihe asaa nke Chineke kpọrọ asị, nke bụ kwa ihe-arụ nke mkpụrụ-obi Ya?
  7. Were n’otù n’otù nime ihe asaa ndịa kwuo ihe mere Chineke ji kpọọ ha asị, na ihe ha ga-eweta n’ikpe-azụ ma ọ bụrụ na asachapụghị ha (site n’Ọbara Jisọs).
  8. Kwuo amaokwu ndị ọzọ dị iche iche site na Testament Ochie na nke Ọhụụ ná-egosi ihe jọbigara njọ ókè nke dị nime ihe asaa ndịa n’otù n’otù.
  9. Gịnị bụ olile-anya nke onye ahụ nwere bụ onye nke nọ n’amam-ikpé nke ihe ndịa?
  10. Mụta buru kwa n’isi Ndi Rom 5:8; gụọ kwa ya nye ndị ahụ i chere na ha enweghị olile-anya nime Chineke.