Ilu 27:1-27; 28:1-28; 29:1-27.

Lesson 280 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ihe-árù n’anya ndi ezi omume ka onye ajọ omume bu: ọzọ, ihe-árù n’anya onye nēmebi iwu ka onye ziri ezi n’uzọ-ya bu” (Ilu 29:27).
Cross References

I Eziokwu nke Sitere n’Amam-ihe nke Chineke

1. Amaghị ihe ndụ anyị ga-abụ n’ọdịn’iru, mere ka ọ dị mkpà na anyị ga-eso ụzọ nke amam-ihe mgbe niile, Ilu 27:1; 28:22; 29:1; 25:6, 7, 27; Abù Ọma 39:5; Jemes 4:13-15; I Pita 1:24

2. Itò onwe-onye na ire-ụtọ, ha abụọ na-edubà n’ịlan’íyì, Ilu 27:2, 5, 6, 14, 21; 28: 23; 29:4, 5, 23; Job 32:21; Abù Ọma 12:3; I Ndi Tesalọnaika 2:1-6; Aisaia 47:10, 11; Ezikiel 31:10-14; Obadaia 4; Matiu 23:12

3. Iwe, ọnụma na ekworo bụ mmehie jọgburu onwe ha, Ilu 27:3, 4; 29:21, 22; 14:17; 16:32; 23:17; Eklisiastis 7:9; Jemes 1:19; 3:16; Abù Ọma 37:1, 8; Matiu 5:22; Ndi Rom 13:13; I Ndi Kọrint 13:4; Ndi Galetia 5:26; Jemes 3:14, 15

4. Egosịrị urù nke ezi enyi bara, Ilu 27:9, 10, 15-17; 29:9; Eklisiastis 4:9, 10; I Samuel 18:1; Ndi Filipai 2:25; II Timọti 1:16, 17

5. Agụụ nke ihe mmụọ na-eweta ngọzi nke ime mmụọ mgbe niile; enweghị ya na-eweta ụnwụ nke ihe mmụọ, Ilu 27:7, 8, 19, 20; 28:18; 29:18; Matiu 5:6; Emọs 8:11, 12; Aisaia 55:1-3; Jọn 4:14; 6:35; 7:37

6. Nchụso na mnweta nke amam-ihe Chineke bụ ihe mnweta kachasị elu kwesịrị ekwesị ná ndụ, Ilu 27:11-13, 22; 29:3, 11, 20; 2:1-9; 4:7; Job 28:28; Matiu 7:24; II Ihe Emere 1:10-12; Jemes 1:5

7. Ọlụ kwesịrị ntụkwsị-obi nye Chineke na mmadụ na-eweta ụgwọ-ọlụ ya, Ilụ 27:18, 23-27; 28:19, 20; Ndi Efesọs 6:5-8; Matiu 10:42; 24:31-46; Abù Ọma 126:5, 6; Jọn 4:36

8. Ọlụ, omume na olile-anya ebighị-ebi nke onye eziomume na nke onye mmehie ka atụlere, Ilu 28:1-18, 25, 26; 29:6-8, 24, 25; 14:32; Job 27:8; Abù Ọma 10:1-18; 33:18; 71:5; 146:5; Ọlu Ndi-ozi 24:15; Jeremaia 17:5-8; I Jọn 3:1-3

9. Ile mmadụ anya n’iru bụ mmehie megide Chineke na mmadụ, Ilu 28:21; 29:12-14, 26, 27; Levitikọs 19:15; Deuteronomi 1:17; Job 13:10; Jemes 2:1-9; Ndi Efesọs 6:9

10. Inye ụmụntakịrị ahụhụ (ịdọ-aka-ná-ntị) bụ ọlụ dịrị nne na nna, ma ịsọpụrụ nne na nna bụ ọlụ dịrị nwata ọ bụla, Ilu 28:24; 29:15, 17, 21; 13:24; 19:18; 22:6, 15; 23:13; Ọpupu 20:12; Ndi Efesọs 6:1-4; Ndi Kọlọsị 3:20; Ndi Hibru 12:5-11

11. Ebere bụ otù nime mkpụrụ nke eziomume, Ilu 28:27, 28; 29:2, 7, 10; 3:3; Maika 6:8; Matiu 5:7; Jemes 2:13

12. Esem-okwu ná-abaghị n’ihe na-eweta ịta-arụ nke mkpụrụ-obi, ọ dịghị kwa alụpụta ezi ihe ọ bụla n’ebe ọlụ nke Chineke dị, Ilu 29:9, 11, 20, 22; 17:14; 20:3; Ndi Filipai 2:3; II Timọti 2:14, 23, 24; Taitọs 3:9; Jemes 3:16; I Ndi Kọrint 1:11; 3:3

13. Eziomume ga-enwe mmeri n’ikpe-azụ ná-agbanyeghị ihe niile na-emegide ya, Ilu 29:16, 27; Aisaia 3:10; Abù Ọma 34:15; 37:3-9, 25, 35-37

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Ihe-ọmụmụ Dị Iche iche Sitere n’Ilu

Apụrụ iji amaokwu ọ bụla nke ebe ọgụgụ nke ihe-ọmụmụ anyị a kwuo Okwu Chineke. Dịka ana-ahụ site n’usoro eji dee ya, ọtụtụ isi-okwu dị iche iche ka ewepụtara site n’ebe ọgụgụ atọ ndịa. Ọtụtụ Ilu ndịa bụ ihe apụrụ ịghọta nkeọma n’onwe ha, nke a na-eme ka ọ bụrụ ihe ná-abàghị urù ịtụkwasị ha okwu, nke-ka-nke, ọ bụrụ na ewere Baịbụl nwere nkọwa ná-amụ otú ha ji metụta akụkụ niile ọzọ nke Akwụkwọnsọ. Na nkọwa nke ihe-ọmụmụ a sitere n’Akwụkwọnsọ bụ iweta onye ná-amụ ya nsọ ruo ọzịzá niile ahụ nke Akwụkwọnsọ n’uju n’ihe niile ewelitere n’ihe-ọmụmụ a dị iche, ka o wee nwee ike ikewapụ Eziokwu ma nara kwa òzízí nke Chineke nwere inye ya. Site na nkọwa ndịa, anyị arọpụtawo isiokwu ole-na-ole ndịa anyị ná-akuzibeghị ọtụtụ ugbò n’ihe-ọmụmụ ndịọzọ dị iche iche.

Echi ná Amaghị Ihe Ọ Ga-eweta

“Le ugbu a bu oge anānara madụ nke-ọma; le ugbu a bu ubọchi nzọputa” bụ okwu nke Chineke. Otù ụkpụrụ a dịrị ijè anyị n’ogologo ụbọchị niile nke ndụ anyị. Ná-agụnyeghị ihe niile ọzọ edeworo ebe ọzọ dị iche iche nime Akwụkwọnsọ banyere isiokwu a. Akwụkwọ Ilu jupụtara n’ezi ndụm-ọdụ nke isi-okwu a: N’ihe-ọmụmụ nke a nke sitere n’ilu anyị na-agụ: “Anyala isi banyere echi; N’ihi na i magh ihe chi gābọ.”

N’ihe banyere nzọpụta ebighị-ebi anyị ọ bụ ihe nzuzu na amaghị ihe idebe ruo echi ihe anyị pụrụ ịrịọ ma nweta kwa taa. Na Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’iru ka anyị ga-ahụ site n’ileba anya n’ihe-ọmụmụ a, Ọ bụghị kwa Onye na-ele ebe ma-ọbụ oge anya n’iru. O jikeere ịnụ ezi ekpere nke obi ahụ ná-echègharị, Ọ pụkwara ịnụ ekpere ahụ n’ebe ọ bụla anọ kpee ya. Chineke na-eme kwa ngwá ịzá ụdị ekpere ahụ; ma okwukwe nke ná-akpali ekpere ahụ; ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịdị ka ọ dị ntakịrị, ọ ga-eme ka Chineke tụkwasị okwukwe n’ụba ka ngọzi nke nzọpụta ahụ wee ruo mkpụrụ obi ahụ agụụ na-agụ n’ihe nke mmụọ.

Ọ bụ ihe-nzuzu idebe rue echi ihe ọ bụla banyere nzọpụta anyị, n’ihi na anyị amataghị ma ndụ ga-abụ nke anyị echi. Otù ntabi-anya nke oge pụrụ ịgbanwe ọnọdụ ebighị-ebi onye ọ bụla nime anyị. Otù nwa mgbe ntà nke ndụ anyị ga-edubà onye ọ bụla nime anyị nime ebighị-ebi. Ekweghị anyị mkwà ọ bụla na mgbe ahụ ga-abụ mgbe dị anya. Ọ pụrụ ịbụ na nkeji nke ọzọ ka ndụ anyị ga-agwụsị. Ọ bụrụ na anyị arapụ ekpere ahụ nke ga-eweta nzọpụta nke Chineke nye ọdịn’iru, anyị na-etinye n’aka anyị ihe banyere oge nke dị n’iru nke ana-apụghị inye anyị ma-ọlị. Ma eleghị-anya, anyị agaghị adị ndụ ịhụ ọdịn’iru ahụ bụ oge anyị rọpụtaworo ikpe ekpere nke nchègharị, anyị ewee si otú a la n’íyì ebighị-ebi.

Otù iwu a jikọtara ihe anyị na-eme ná ndụ anyị. Anyị apụghị ịnya isi banyere echi. Echi aka-abụghị nke anyị rue mgbe Chineke onwe Ya nyere anyị ya. Náánị mgbe anyị na-ebi ya ná nsọpụrụ na otuto nke Chineke, ná-eji kwa obi anyị niile ná-eme ka ha ra bụ ihe aka anyị ga-achọpụta ime, mgbe ahụ ka anyị ga na-emezu ihe niile bụ uche nke Chineke n’ebe anyị nọ. Nke a apụtaghị na anyị agaghị enwe ihe anyị na-ezube ime ná ndụ nke anyị ga na-agbaso kwa ime. Ọ pụtaghị kwa na anyị agaghị elepụ anya hụ ihe yiri nzube Chineke nye anyị. Ọ pụtara na ihe ọ bụla anyị na-eme, ihe ọ bụla anyị na-echè, na ihe ọ bụla anyị na-ezube -- ha niile ga-anọ n’okpuru uche Chineke dịka ekpugheworo ya nye na dịka O nyeworo anyị oge, amara na ume ime ha. Ịrapụ inye Ya ọnọdụ n’ihe niile anyị na-ezube ime bụ imebi iwu Ya, n’ihi na Ọ dọwọ anyị aká-ná-ntị sị, mgbe ọ bụla anyị na-ezube ihe ọ bụla, ihe “kwesiri unu ka unu kwue bu, Asi na Onye-nwe-ayi chọrọ, ayi gādi ndu, me kwa ihe a ma-ọbu ihe ahu” (Jemes 4:15).

Itò onwe-onye na Ire-ụtọ

Otù onye ode-akwụkwọ n’ọgbọ gara aga dere sị: “Ọ dịghị otù nwoke ọ bụla maara ihe n’etiti iri mmadụ abụọ ga-eto onwe ya. Mmadụ abụọ ọzọ dekwara otù ihe ahụ sị: “Ndi ire ụtọ bụ ndi iro kachasị njọ” na “Ihụn’anya nke onwe onye bụ onye ire ụtọ kachasị.” Ma okwu Chineke ji asụsụ dịkarịsị ike máá mmehie ndịa ikpé, n’ihi na ọ dịghị ihe ọzọ ná-emegide mmụọ nke Oziọma eziokwu a karị mmehie ndịa. Ọ dịghị kwa ihe ọzọ ná-edubà mkpụrụ-obi nke ụmụ mmadụ ná mbibi dịka ha. Ihe na-amụpụta ma ná-edebe kwa ha abụọ bụ mmehie mpako, nke anyị mụworo ihe banyere ya n’ihe-ọmụmụ gara aga nke akwụkwọ a.

Okwu nke Chineke kwuru sị “ka JEHOVA bipu egbugbere-ọnụ nile nke nēkwu okwu ire-utọ, na ire nēkwu oké ihe” ma-ọbu na (“Onye-nwe-ayi gēbipu egbugbere-ọnu nile nēkwu okwu ire-utọ, na ire nke nēkwu okwu mpako nile”) (Abù ọma 12:3). Banyere onye na-eto onwe ya, Akwụkwọnsọ nwere nke a ikwu: “I we si n’obi-gi, Mu onwem nọ, ọ digh kwa otù efu ọzọ di ma ewezuga nání mu onwem. Ma ihe ọjọ abiakwasiwo gi; i gāgh-enwe ike ikpuchi anya ya: ila-n’iyi gābiakwasi kwa gi na mberede, nke i nāmagh” (Aisaia 47:10, 11). Ọ baraghị anyị urù ịgbaso ụzọ amam-ihe ọzọ karị nke Okwu Chineke, ka anyị wee hụ ajọ ihe dị ukwu nke ịnọgide ná mmehie abụọ ndịa ga-eweta.

Iwe na Ịkpọ Asị

“Onye iwe nākpali iseokwu, ọzọ onye nēnwe ọnụma ri nne nējehie ri nne.” Onye ọ bụla nwere nnwapụta nke aka ya n’ihe iwu na ọnụma na-eweta -- site ná ndụ na omume ya tutu o chègharịa, ma ọ bụrụ na ọ bụ onye nke Kraist, na site ná ndụ na omume ụfọdụ ndị ya na ha na-enwe mmekọrịta kwa ụbọchị. Ọtụtụ ihe ike nke ajọ omume jọgburu onwe ha ka ana-eme taa site n’ọchịchị nke mkpụrụ anụ-arụ ndịa. Ana-ebibi ndụ, ná emebi ma-ọbụ na-ezú àkụ, ahụhụ nke mmadụ na-aba ụba, èzínaụlọ na-agbasa, ụmụntà ná-emeghị ihe ọjọọ ka ana-atụba n’ụwa nke ná-enweghị obi ebere n’ihi iwe na ọnụma.

Ma Akwụkwọ nke Chineke na-ekwu kwa ọzọ. N’ebe ahụ ka anyị na-agụ, “Ihe nēnwegh obi ebere ka ọnuma bu, iju miri ka iwe bu kwa; ma ònye gēguzo n’iru ekworo?” N’ebe a ọ pụtara ìhè na dịka iwe na ọnụma jọrọ njọ n’iru Chineke, na ekworo jọkarịrị ha ná njọ. Chineke amawo mmehie niile ndịa ikpé ma onye ọ bụla nke na-edebe kwa ụdị ajọ ihe ndịa nime obi ya enwebeghị mmetu aka n’obi nke ike ọmụmụ ọhụụ nke nzọpụta Chineke ịpụ ná mmehie, ma-ọbụ na ọ daghachiwo àzụ. Ọ bụ onye mmehie. Ọ nọghị kwa nime mkpuchi na amara nke Chineke. Ọ bụ nwa ekwensu.

Ụfọdụ na-ekwusi ike na ọ dị mkpà ka Onye Kraist ọ bụla nwetazue odudo-nsọ -- bú ọlụ amara nke abụọ zuru òkè nke na-eso ọlụ eziomume sitere n’okwukwe nke ana-enwe tutu Baptizim nke Mmụọ Nsọ na ọkụ -- ka ewee wepụ iwe ná ndụ ya. Ma okwu nke Chineke na-egosi anyị n’ezie na ana anapụta Onye Kraist ọ bụla site ná mmehie ndịa mgbe agụrụ ya n’onye eziomume. Ọ si: “Ma ọlụ nke anu-aru putara ìhè, nke di ka ndia; … ekworo, ọnuma … ikpọ-asị, … na ihe yiri ihe ndia: nke m’buru uzọ gwa unu … na ndi nēme ihe di otú a agagh eketa ala-eze Chineke” (Ndi Galetia 5:19-21).

Ise-Okwu

Otù nwoke ọzọ bụ onye amam-ihe nke ọgbọ anyị a n’igbaso òzízí nke Akwụkwọnsọ dere “Ise-okwu banyere okpukpe bụ owuwe-ihe-ubi nke ekwensu”. Mmụọ Nsọ gwara anyị-rị na “Nánị na nganga ka ilu-ọgụ nāputa” (Ilu 13:10). Chineke agwawo ayị “tutu ilu-ọgù esie ike rapu ya” (Ilu 17:14) na n’ihi na “ọ buru madu nsọpuru ikwusi ilu-ọgù” (Ilu 20:3).

Ụfọdụ na-echè na ịlụ-ọgụ na esem-okwu bụ eziomume ma isi ya bụrụ ihe banyere ikpere Chineke. Ọtụtụ nime ndịa na akụzi kwa na okwu-ụgha bụ ezi-omume -- ná mkpirimkpi, na mmehie abụghị kwa mmehie -- mgbe ọ na-emetụta ọlụ nke okpukpé ha. Ma Chineke onye kwuworo n’okwu Ya sị na agatụba ndị ụgha niile nime ọdọ-ọkụ ahụ kwukwara sị: “Unu emela ihe ọ bula n’uzọ ikpa-iche-iche, ma-ọbu n’uzọ ichọ otuto efu, kama n’obi di ume-ala nāguritanu ibe-unu ná ndi ka unu onwe-unu nma” (Ndi Filipai 2:3). Ya onwe Ya eziwo kwa anyị ka anyị “nēze okwu efù nile emeruru emeru: n’ihi na ha gāga kari n’iru nāsọpugh Chineke.” O kwuwo kwa ka anyị ná-ezè ajụjụ nzuzu na nke amaghị ihe niile, “ebe i matara na ha nāmuputa ilu-ọgù,” n’ihi na “orù nke Onye-nwe-ayi aghagh ibu onye nādigh alu-ọgù; kama ọ ghagh idi nwayọ n’ebe madu nile nọ, ọ ghagh kwa ibu onye nwere ike izi ihe, onye nānagide ihe ọjọ, n’idi nwayọ nādọ ndi nēdo onwe ha imegide ya aka-ná-nti; ma asi na ọ bu ezie ma elegh anya na Chineke gēnye ha nchèghari ka ha we mazu ezi-okwu” (II Timọti 2:16, 23-25). Agwakwara anyị ka anyị “nēze ajuju nile, na osuso-ọmumu nile, na esem-okwu nile, na ilu-ọgù nile banyere iwu; n’ihi na ha bu ihe nābagh urù na ihe-efu” (Taitọs 3:9).

Agụụ nke Ihe-mmụọ na Mmeri nke Ezi-omume

Ọ dị otù ebe nime obi nke mmadụ afọ ná-adịghị eju site n’ihe ná-adị nwa mgbe ntà, ma-ọbụ ifè ihe ọ bụla òfùfè ma ọbụghị site n’ezi Chineke ahụ nke dị ndụ. Ụfọdụ na-achọ imeju akpịrị ịkpọ-nkụ ahụ ma-ọbụ mee ka afọ ju ha n’ụzọ nke aka ha, ma Akwụkwọnsọ gwara anyị sị “Afọ adigh eju anya nke madu.” Okwu Chineke na-akasi anyị obi n’ezie n’ihi na ebe ahụ ka anyị na-agụta na “Ngọzi nādiri ndi agu ezi omume nāgu, ndi akpiri nākpọ kwa nku na ya: n’ihi na ndi ahu ka afọ gēju.”

Afọ ojuju ka aga-achọta, ma agaghị achọta ya n’ihe nke ụwa. Ezi afọ ojuju dịrị náánị ndị agụụ eziomume na-agụ ndị akpịrị na-akpọ kwa nkụ na ya. N’ihi nke a, anyị nwere ike ikwu sị na ezi obi-ụtọ bụ ihe dịrị náánị ndị ezi-omume. “Ọ gādi kwa ka osisi akuworo n’akuku iyi juputara na miri, nke nāmi nkpuru-ya na mgbe-ya, ọzọ akwụkwọ ya adigh akpọnwu; ihe ọ bula kwa nke ọ nēme, ọ nēme ka ọ ga nke-ọma” (Abù Ọma 1:3).

Ahụwo onye ná-emebi iwu ka ọ na-agbasa onwe ya dịka ahịhịa ndụ nke osisi dị na mmiri, ma ọ gabigawo. Achọwo kwa ya ma apụghị ịchọta ya. N’ụzọ ọzọ, onye eziomume, maọbụ nwoke zuru-òkè, nwere udo ná ndụ nke a ma ná ndụ nke ná-abịa. Otù amaokwu nke ihe-ọmụmụ anyị kwuru na “Mgbe ndi nēmebi iwu nāba uba kari, njehie nāba kwa uba kari: ma ndi ezi-omume gēlekwasi ọdida ha.” Ndị eziomume “Nkpuru nke omume-ha nile ka ha gēri” (Aisaia 3:10) na ọ “gāwa igu dika nkwu” (Abù Ọma 92:12). Ndị eziomume “gēnwupu dika anyanwu n’ala-eze nke Nna-ha” (Matiu 13:43). Ọ bụ náánị ndị eziomume ga-emejupụta ndị-agha nke ga-eso Eze ebube nke ndị-eze na Onye nwenu nke ndị nwenu niile mgbe Ọ ga-abịa n’ebube Ya ịmalite Ala-eze Ya n’elu ụwa wee chịa puku arọ (Nkpughe 19:14).

Lee ụdị olile-anya dị ebube otú a nke anyị nwere! Onye ná-emebi iwu pụrụ ịdị ka ọ na-aga n’iru, ma ahụhụ ebighị-ebi aghaghị ịdịrị ya n’ezie. Ndị mkpagbu pụrụ ime óké mkpatụ megbu kwa, ma ọlụ ha ka aga-ebibi na nwa mgbe ntà, aga-atụba kwa ha n’ebighị-ebi ná-enweghị olile-anya, náánị ma ha siri n’ụzọ ọjọọ ha wee chègharịa. “Ma ndi ahu ndi nwere uche ganēnwu ọcha dika onwunwu-ọcha nke mbara igwe; ndi nēme ọra madu ka ha ghọ ndi ezi-omume ganēnwu kwa dika kpakpando rue mgbe nile ebigh-ebi” (Daniel 12:3). “Ma ekele diri Chineke, Onye nēnye ayi nmeri site n’aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist” (I Ndi Kọrint 15:57).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị bụ ilu?
  2. Gịnị ka ekwuru banyere amaghị ihe ndụ ga-eweta na ihe anyị kwesịrị ime banyere ya n’ihe-ọmụmụ nke a na n’ebe niile ọzọ nime Akwụkwọnsọ?
  3. Gụpụta ụfọdụ amaokwu ná-egosi ihe ọjọọ nke itò onwe-onye na ire ụtọ dị.
  4. Gịnị bụ mmehie ahụ nke ná-amụpụta itò onwe-onye na ire-ụtọ?
  5. Gịnị bụ mmehie ọzọ dị iche iche nke na-esite n’iwe?
  6. Gịnị bụ mmehie ọzọ dị iche iche nke na-esite n’ekwòrò?
  7. N’ihi gịnị ka ịgbaso amam-ihe nke Chineke ji bụrụ ihe dịkarịsịrị ukwu karị ihe niile ọzọ anyị pụrụ inweta ná ndụ?
  8. Ịdọ ụmụntakịrị aká-ná-nti, ọ bụ ọlụ dịrị ndị mụrụ ha? Òlee ụdị omume ụmụntakịrị kwesịrị inwe n’ebe ndị mụrụ ha nọ?
  9. Gịnị mere esem-okwu ji bụrụ amaghị ihe? Gịnị mere ọ na-eweta ịta-arụ nke mmụọ na-alụpụta kwa náánị ihe dịkarịsịrị ntà nye Chineke?
  10. Gụpụta ụfọdụ amaokwu ná-egosi óké mmeri nke eziomume ná-aghaghị imeri ma emesịa.