Ọlu Ndi-ozi 2:1-47.

Lesson 281 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBU N’ISI: “Le kwa, Mu onwem nēziputa nkwà nke Nnam n’isi unu: ma nọdunu n’obodo a, rue mgbe agēwere ike nke si n’elu yikwasi unu” (Luk 24:49).
Cross References

I Ọwụwụ-mmiri Nke Mmụọ Nsọ Ahụ Dịka Nnwapụta Nke Atọ

1. Nnwapụta nke atọ a nye Ndị Kraist kwere ekwe bụ mkwà Kraist kwere tupu Ya Ọ nwụọ, Jọn 14:15-18, 26; 15:26, 27; 16:7-15; Luk 11:13; 24:49; Ọlu Ndi-ozi 1:4-8 cf. Matiu 3:11 na Jọn 1:33

2. Ndị-amụma Agba Ochie ebuwo kwa amụma banyere nwụsa nke Mmụọ Nsọ, Matiu 13:17; I Pita 1:9-12; Joel 2:21-29; Aisaia 32:15; 59:20, 21; Ezikiel 36:25-27; 39:27-29

3. Egosiri nnwapụta atọ ndịa n’ụdị ha dịka ihe dịrị Ndị Kraist nke oge a

(a) Ihe atọ ahụ nke mere n’ugwu Mọraia, Jenesis 22:1-18; I Ihe Emere 21:18-27; II Ihe Emere 5:1-14

(b) Ebe atọ ahụ dị iche iche enwere n’Ụlọikwu n’ụlọ-ọgbakọ ebe ana-efé Chineke òfùfè, Ọpupu 40:17-35 cf. Ndi Hibru 9:1-12 na 10:9-22

4. Baptizim nke Mmụọ Nsọ ka náánị ndị ahụ edoro nsọ site ná nfesa Ọbara ahụ nke ugbò abụọ pụrụ ịnata, Ndi Hibru 12:14; 13:11, 12 cf. Levitikọs 4:1-12; 6:24-30; na 16:1-28; Ndi-Efesọs 5:25-27; Ezikiel 36:22-29

II Ọbịbịa nke Onye Nkasị-obi ahụ

1. Otù narị mmadụ na iri abụọ ahụ ndị náesoụzọ Kraist nọ n’otù, nke náegosi na ha bụ ndịkom na ndịnyom edoro nsọ, Ọlu Ndi-ozi 2:1; Ndi Hibru 2:11; Jọn 17:17-23; Abù Ọma 133:1

2. Onye nkasị-obi ahụ bịara dịka Jisọs kwere ná mkwà, Ọlu Ndi-ozi 2:2-4

3. Enyere ihe ngosi nke ndahie na nke ịrụ-ụkà ná-adịghị nime ya iji mata na nke a bụ Mmụọ Nsọ ahụ -- Onye nkasị-obi ahụ ekwere ná mkwà, Ọlu Ndi-ozi 2:5-13, 16; Joel 2:28, 29

4. Nwụsa Mmụọ Nsọ niile ọzọ nke na-esochita nke a wetakwara otù ihe ịrịbá-ámá ahụ, Ọlu Ndi-ozi 10:44-48; 15:7-9; 19:1-7; I Ndi Kọrint 14:18, 22

III Onye Ozi ahụ Jupụtara na Mmụọ Nsọ na Okwu Chineke O Kwuru

1. Ebe emejuworo ha n’ume ọhụụ nke mmụọ, Pita wee were ohere ahụ gwa ndị zukọrọ okwu Chineke, Ọlu Ndi-ozi 2:14, 15

2. O mere ka ijé ozi ya pụta ìhè site n’iji ihe edere n’Akwụkwọnsọ dịka ike O nwere, Ọlu Ndi-ozi 2:16-21; II Timọti 4:5; II Pita 1:19-21

3. Mgbe O mesịrị ka mmezu nke amụma ebururị pụta ìhè O kwuru okwu banyere Jisọs, Ọlu Ndi-ozi 2:22-36; 4:12; Jọn 10:7-9

IV Ihe Nwụsa nke Mmụọ Nsọ Ahụ Lụpụtara nime Ndị ahụ Gere-ntị

1. Emezuru mkwà Kraist kwere ewee nye kwa ndịozi ahụ, ike ọhụụ, Ọlu Ndi-ozi 1:8; 2:37, 43; 4:13, 33; 6:10

2. Nzaghachị Pita nke ná-eme ka ekwere jikọtara otù mkwà dị ebube nye anyị onwe anyị ndị ná-adị ndụ n’oge mmiri òzùzò ikpe-azụ a, Ọlu Ndi-ozi 2:38-40

3. Óké ihe ngosi ndị ahụ doro anya nke Ọwụwụ-mmiri nke Mmụọ Nsọ bụ ọtụtụ ihe ịrịbá-ámá nke sooro ijéozi nke ndị ahụ ejiworo Mmụọ Nsọ mee ọwụwụ-mmiri, Ọlu Ndi-ozi 2:41-47; Mak 16:15-18

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Ezigbo Ndị Kraist taa nwere ohere dị ebube, ma ha matara eziokwu a ma-ọbụ na ha amataghị ya. Anyị na-ebi n’oge ọchịchị nke Mmụọ Nsọ -- Ọgbọ nke Chọọchị. Ugbu a bụ oge ana-enye nnwapụta nke ngọzi niile ana-enye ndị ahụ “gēwere nkwuwa okwu biarue oche-eze amara” n’òzùzù òkè ya. Nke a bụ oge ahụ ndị amụma Agba Ochie leworo anya ya site n’iju-anya na n’olile-anya. Nke a bụ oge ahụ ihe ndị ahụ niile pụtara ìhè bụ ihe ndị ahụ ndị Mmụọ ozi chọsiri ike ileba anya nime ha. Nke a bụ oge ahụ mgbe anyị pụrụ ịhụ, mata kwa, nwee kwa ike ịnata, ihe ahụ niile nke gụrụ ndị eziomume mgbe ochie agụụ ịhụ, ịmata na ịnata.

Ọ bụghị ihe iju-anya, na Jisọs sịrị na onye kachasị ntà n’oge a nke Ala-eze karịrị ọbụná onye kachasị ukwu n’oge nke Agba Ochie! Jisọs asịghị na anyị karịrị n’ịdị-nsọ, ma-ọbụ n’eziomume, ma-ọbụ n’ihe niile ahụ dị mkpà n’ịbụ onye nke Chineke n’ihi na ihe niile anyị bụ -- na ihe niile ha bụ kwa -- bụ site n’amara Chineke nke egosipụtara nime Kraist Jisọs. Kama Jisọs na-akọwa na anyị karịrị ukwu n’ọkwa, n’ịlụ ọlụ dị iche iche, n’ọkpụkpọ-òkù nke ijé ozi, na mmekọrịta anyị n’ihe n’oge a nke ka nke dịka o si metụta ọbịbịa nke ugbò abụọ Ya.

Òzùzù Òkè nke Ngọzi Niile Ahụ Ana-anwapụta

N’ihi ọtụtụ mgbanwe nke na-abịa kwa arọ, mkpụrụ okwu nke asụsụ na-enwe nkọwa dị iche iche mgbe ụfọdụ, ma-ọbụ site n’otú esi tinyesịa ya ihe o wee nwee nghọta dị iche iche. N’ọtụtụ arọ gara aga, anyị ejiwo mkpụrụ okwu a bú nnwapụta mgbe anyị na-ekwu maka nnwapụta dị iche iche pụtara ìhè, dịka ọlụ ebube nke ịgụ mmadụ n’onye ezi-omume na odudo-nsọ zuru òkè. Nkọwa nke okwu ahụ dịrị iche na mbụ site n’ihe ekwekọrịtara na ọ pụtara ugbu a. Mgbe ahụ anyị kwuru na ọ bụ àmàrà niile nke Chineke na-alụrụ ndị nke Ya dịka Okpukpé nke nnwapụta. Ma nkọwa nke okwu a agbanwewo n’ihi otú ndị ọbịara ọhụụ si were ya ná-ekwu okwu na dịka nke mmadụ ji were olile-anya na okwukwe ya tụkwasị ná nchepụta niile nke na-agwụ agwụ na n’akụkọ ụwa. Taa ụmụ mmadụ na-eme nchọpụta nke ebere na àmàrà Chineke, karị ịnwapụta ya, ma n’ihi nke a, okpukpé nke nnwapụta abụghị kwa ihe ana-ewere dịka nnwezù nke ezi owuwe anya nke onyinye àmàrà nzọpụta Chineke, ike nsacha, ma-ọbụ Mmụọ agbam-ume. Anyị rọọrọ ka anyị were okpukpé nnwapụta karị isi okpukpé nchọpụta, n’ihi na ihe ahụ Chineke nwere inye -- na ihe ahụ Ọ na-enye -- abụghị kwa ihe nchọpụta. Ọ bụ ihe anwapụtara, nke nwekwara owuwe anya zuru òkè, nghọta dị ndụ na ntọ-ala guzosiri ike.

Ndị mgbe ochie nwetara ezi nnwapụta a, na nghọta nke mgbaghara mmehie na nke ịsacha mkpụrụ-obi. Agụrụ ha ná ndị eziomume ma doo kwa ha nsọ, site n’ike nke Àjà ahụ Zuru òkè nke aga-achụ site n’ilepụ anya n’iru hụ Obe ahụ site n’okwukwe nke Chineke kunyeworo nime obi ha. Dịka anyị na-amụ ihe banyere ndụ ha, na ezi ihe nke Akwụkwọnsọ kwuru banyere ha, tinyere ákwà nke obi ha nke chọtara afọ ojuju na ebere n’àmàrà nke Chineke, na-egosi anyị na ha natararị otù nzọpụta site ná mmehie nke na-adịghị iche site na nke anyị. Ejikwara ha maa àtụ n’Agba Ọhụụ dịka ihe nlere anya nke okwukwe na ịtụ-egwù Chineke (ịdị-nsọ) (Ọlu Ndi-ozi 2:29, 30; 28:25; II Pita 1:21; Ndi Hibru 11). N’ihi nke a, ọ bụ ihe pụtara ìhè nkeọma na mgbe Jisọs kwere mkwà Onye nkasị-obi ahụ, na mgbe Ọ sịrị na Onye nkasị-obi ahụ aka-abịaghị na ọ gaghị abịa kwa ma ọbụghị ma Ya (Jisọs) rigooro n’Eluigwe. Ọ dịghị ekwu maka otù nime ọlụ amara abụọ ahụ nke ndịkom na ndịnyom nke Agba Ochie nataworo site ná mmalite. Ọ dịghị mgbe ọ bụla ọwụwụ-mmiri nke Mmụọ Nsọ ga-abụ nnwapụta nke odudo-nsọ zuru òkè, dịka ụfọdụ mmadụ na-akuzi, n’ihi na edoro mmadụ nsọ na mgbe ochie. Onye nkasị-obi ahụ aka-abịaghị kwa, Ọ gaghị kwa abịa -- n’ezie, Ọ pụghị kwa -- ịbịakwasị ndị kwere ekwe ma ọbụghị ma Jisọs rigooro n’Eluigwe.

Meri, nne Jisọs, bụ nwanyị edoro nsọ. Ma Meri bụ kwa otù nime ndị ahụ nọgidesịrị ike n’ekpere wee nata Onye nkasị-obi ahụ (Ọlu Ndi-ozi 1:14). Anyị gụrụ na odudo-nsọ na-eme ka anyị dị n’otù n’etiti onwe anyị, mee kwa ka anyị na Chineke dị n’otù (Jọn 17:21, 23; Ndi-Hibru 2:11). Anyị gụkwara na narị mmadụ na iri abụọ ahụ ndị natara mkwà nke nna ahụ nọ kwa n’otù olu na otù obi (Ọlu Ndi-ozi 2:1). Ọ dịghị kwa okwu ọhụụ ọzọ apụrụ ịtụkwasị n’amaokwu a karị náánị na otù narị mmadụ na iri abụọ ndịa bụ ndị edoworo nsọ n’ezie.

Ekpere Jisọs n’ihi odudo-nsọ nke ndị na-eso ụzọ Ya bụ ihe azawororị tutu Ụbọchị nke Pentikọst eruo. Ha niile nọ n’otù olu na otù obi n’ụbọchị ahụ! Nne nsọ, nke Jisọs onye edowokwara nsọ, na onye ozi ahụ akpọghachiri, bụ nke gọnarịwororị Onyenwe ya n’ụbọchị ole-na-ole gara aga dị n’otù. Onye ọrụ-ụkà ahụ na ndị ahụ nwere óké ọchịchọ inwe ọnọdụ nke nsọpụrụ n’Ala-eze Jisọs nọ kwa n’otù olu. Onye ọna-ụtụ ahụ eledara anya nọ kwa n’otù obi ya na onye ahụ anyị ga-akpọ onye mgbasa Oziọma mbụ n’etiti ndịozi niile -- nwoke ahụ onye kwusara Oziọma nke ọbịbịa Kraist nye onye ya na ya ga-alụkọ ọlụ n’ọdịn’iru nime Nzukọ Kraist.

Ndịa niile nọ n’otù olu na otù obi! Ọ bụ kwa n’isi ndịa ka Mmụọ Nsọ dakwasịrị! Ọ bụ náánị ọlụ nsacha ahụ zuru òkè pụrụ iweta ịdịn’otù dị otú a. Ọ bụ ihe ana-apụghị ime bú ndị edoro nsọ na ndị aka-edoghị nsọ ịnọkọ n’ụdị otù obi na otù olu. Ha niile aghaghị ịbụ ndị alụworo ọlụ amara nke abụọ ahụ ná ndụ ha tutu ọnọdụ dị otú a enwe ike ịdị.

Otú ọ dị, ọ bụ ihe dị mfé ịhụ na mgbe anyị na-ekwu banyere òzùzù òkè nke nnwapụta ngọzi ndị ahụ pụtara ìhè, anyị na-ekwu maka nnwapụta ukwu atọ ahụ dị óké mkpà. Nke mbụ, anyị aghaghị ịbụ ndị agbaghara mmehie niile ha ka ewee kpọbata anyị n’èzínaụlọ nke Chineke. Nke abụọ, aghaghị ido anyị nsọ site na nfésa Ọbara nke ugbò abụọ n’obi anyị ka ewee weghachị anyị n’oyiyi nke Chineke bụ nke atụfuworo, nke anyị na-ahụ n’Akwụkwọnsọ na ọ bụ eziomume na ịdị-nsọ. Ma, nke ikpe-azụ, ebe ọ bụ na ndị Agba Ochie niile pụrụ ịnata nnwapụta abụọ ndịa, na ọ bụ kwa ihe doro anya na otù narị mmadụ na iri abụọ (120) ahụ ndị nọ n’Ụlọ Elu ahụ natara nwapụta ọzọ pụtara ìhè nke Jisọs kwere ná mkwà, nke ndị amụma Agba Ochie bukwara n’amụma na ọ bụ ihe dịrị náánị ndị nke oge anyị nke a, anyị wee na-ahụ na ọ dị nnwapụta nke atọ pụtara ìhè nke dịrị anyị. Nnwapụta nke atọ a dị ukwu dị kwa ebube bụ nnata nke Onye nkasị-obi ahụ, Mmụọ Nsọ ahụ, nke Jisọs kwuru okwu banyere ya (Jọn 14:15-18, 26; 16:7-15). Ọ bụ ọwụwụ-mmiri nke Mmụọ na ọkụ nke Jọn Onye Ọwụ mmiri kwuru maka ya (Matiu 3:11).

Ịwụ Mmiri nke Mmụọ Nsọ na Ọkụ

Mgbe Jisọs rapụrụ ndị na-eso ụzọ Ya, Ọ gwara ha na Onye nkasị-obi ahụ ga-abịa iduba ha nime eziokwu niile, inye ha ike ịlụ ọlụ, na ịtụ ụwa mmehie ha n’anya, ikuzi eziomume, na kwa nke ikpé gaje ịbịa. Ihe ndịa niile ka emezuworo, ana-emezu kwa ha. Ekpere Jisọs kpere maka odudo-nsọ nke ndị na-eso ụzọ Ya ka Ọ zara, mkwà Ya izite Mmụọ Nsọ ka emezu kwara.

Agwaghị mmadụ 120 ahụ otú Mmụọ Nsọ ahụ ga-esi gosipụta Onwe Ya. Anyị onwe anyị kwa agwaghị anyị otú Ọ ga-esi bịa, otú Ọ ga-esi gosipụta onwe Ya ma-ọbụ ihe niile Ọ ga-eji anyị mee, nke Ọ ga-eme nime anyị, ma-ọbụ site na anyị, mgbe ejiri Ya wụọ anyị mmiri. Ma ọ dịghị obi abụọ dị n’obi mmadụ 120 ahụ, ma-ọbụ n’obi ndị guzoro n’akụkụ, mgbe Mmụọ Nsọ ahụ bịara. Mmụọ Nsọ ahụ adịghị egosi onwe Ya n’otù ụzọ, dịka anyị kwuworo, ma ọ dị ihe ụfọdụ dị iche iche O meworo mgbe niile nke ọ ga na-eme ka mgbe ọ bụla. Ọ dị mkpà ka anyị nyochaa Okwu Chineke ịhụ ihe ndịa niile nke dị mkpà bụ.

Nke mbụ, Onye nkasị-obi ahụ ga-enye anyị ike maka ijé ozi. Ọ ga-abụkwara anyị Onye-ndú. Mmụọ Nsọ ahụ ga-eduba anyị n’eziokwu niile. Ọ ga-echètara anyị ihe niile. Mgbe ejiri Mmụọ Nsọ wụọọ anyị mmiri anyị na-achọpụta na Ọ na-abata nime anyị, ebe ọ bụ na mgbe gara aga ọ bụ náánị nnọnye ka Ọ nọnyeworo anyị. Ọ ga-eme anyị ndị-àmà nke Kraist ma zipụ kwa anyị ịgbasa Oziọma ahụ. Ihe ndịa niile ka ọtụtụ ndị na-akpọ onwe ha Ndị Kraist kweere taa ná-arụghị ụkà ọ bụla. Ma ọ bụghị náánị nke a ka Ọ na-eme, ọ bụghị kwa náánị ndịa bụ ihe-àmà Ọ na-enye ndị kwere-ekwe mgbe Ọ wụsịrị ha mmiri.

Ọ dị kwa ihe ịrịba-ámá na ihe ndịọzọ dị iche iche nke soro nwụsa Mmiri Òzùzò nke Mbụ ahụ. Ndị na-emegide òzìzí dị ọcha nke Okwu Chineke na-arụ ụkà sị, ọ bụrụ na aga agụ otù nime ihe ndịa n’ihe dị mkpà taa, anyị aghaghị ilekwasị ha niile anya isite n’otù ụzọ ahụ mezue. Ọ bụ ihe dịrị anụ-arụ ichè na n’ụbọchị ukwu ahụ nke nnwapụta nke oge a dị mkpà, mgbe ahụ ihe Ochie gafere, nke Ọhụụ wee malite n’òzùzù òkè nime nnwapụta ya niile, na aghaghị ile-anya óké ihe ngosi dị iche iche. Ọ pụrụ ịbụ ihe siri ike ichè, mgbe mmadụ na-atụle mkpà ụbọchị ahụ dịrị, ihe mere enyeghị ihe ngosi ahụ karị. Ana-emezu kwa mkwà ahụ. Onye nkasị-obi ahụ abịawo. Óké, ogologo abalị niile ahụ agafewo kwa, ma ana-enye kwa òzùzù òkè nke ngọzi ahụ. Ee, ọ dị ọtụtụ ihe ịrịba-ámá na ihe ngosi pụtara ìhè enyere na mgbe ahụ nke ana-adịghị egosi kwa ọzọ taa. Ma n’ezie ọ pụrụ ịdị otú a mgbe mmadụ na-atụle mkpà ụbọchị ahụ dị na ịdị ukwu nke óké ihe ahụ mere na mgbe ahụ.

Ma ka anyị tụle ihe ịrị-ámá ndịa na ihe ngosi ha niile. Ọ dị ụzụ dị ka nke óké ifufe ná-efesi ike. Ọ ga-abụ na anyị onwe anyị enwetụbeghị mmetụta n’arụ site na mmụọ nke otú esiri kèe anyị, otù nnubata ahụ nke óké ifufe ahụ ná-efesi ike dị otú a mgbe Mmụọ nke Chineke batara n’etiti ọgbakọ ahụ nke na-echere n’ekpere imeju na inye otù onye ike ịlụọlụ n’ubi vine nke Chineke? •zụ ahụ pụrụ ịbụ nke anyi ná-agaghị eji ntị nke anụ-arụ nụ ugbu a dịka ọ dị mgbe ahụ, ma ọlụ nke Mmụọ Nsọ ahụ ka bụ kwa otù ihe. Ihe niile Chineke kwuru na aga-eme ma nye kwa onye nke na-achọ onyinye àmàrà ka na-eme kwa taa n’otù ụzọ ahụ o siri mee na mbụ.

Ewee hụ “ire dika nke ọku nēkesa onwe-ha; o wee nọkwasi ha nile n’otù n’otù” na nwụsa Mmiri Òzùzò Mbụ ahụ; na nke a kwa, ka emezuworo site ná nghọta nke ime mmụọ n’oge Mmiri Òzùzò nke Ikpe-azụ. Ire ọkụ ahụ ana ahụ anya ka ana-enyekwaghị ọzọ mgbe enyesịrị nwụsa nke mbụ ahụ, ma ọlụ nke Mmụọ Nsọ na ihe ngosi ya bụ nke O kwere mkwà bụ kwa otù ihe ahụ ugbu a dịka ọ dị na mgbe gara aga.

Ọ bụ n’ihi otù ihe-àmà ahụ fọdụrụ ka ikwu ọtụtụ okwu ji malite nke webatakwara obi abụọ n’obi ụfọdụ mmadụ. Ma o kwesịghị ka ajụjụ ọ bụla pụta. Obi abụọ ekwesịghị kwa ịdị. Baịbụl kwuru sị na emejuru mmadụ 120 ahụ na Mmụọ Nsọ, ma ọtụtụ mmadụ achọghị ịnabata ahịrị okwu ndịọzọ fọdụrụ. Ọ na-asị ha “we malite ikwu okwu n’asusu di iche, dika Mọ ahu nēnye ha ike ikwuwa okwu.”

Ihe ịrịba-àmà nke a ọ gafewo? Ihe ịrịba-àmà nke a ọ dịrị náánị mmalite ụbọchị nke Nzukọ nke oge gboó? Anyị kwere na ụfọdụ ihe ịrịba-àmà ndịa dịrị náánị mmalite Ụbọchị nke Pentikọst, ọ bụ kwa ihe doro anya nkeọma na enyeghị kwa ihe ndịa ọzọ mgbe ụbọchị mbụ ahụ gasịrị! Ha niile jupụtara na Mmụọ Nsọ; mkwà ahụ bụ kwa nke anyị taa dịka ọ dịrị ha. Tụkwasị kwa nke a, ha niile kwuru okwu n’asụsụ dị ichè, dịka Mmụọ Nsọ nyere ha ike ikwuwa okwu. Edebeghị ihe ịrịba-àmà nke a nye náánị ụbọchị mbụ ahụ, kama ọ dịkwara anyị onwe anyị taa. Ọ bụ ihe-àmà nke Akwụkwọnsọ banyere ọwụwụ mmiri nke Mmụọ Nsọ na ọkụ ahụ. Ọ bụ akàrà ikpe-azụ nke Mmụọ Nsọ nke ná-egosi na alụwo ọlụ ahụ. Onye ọ bụla natara onyinye nke ike a ga-achọpụta ma Mmụọ nke Chineke ewerewo egbugbere ọnụ ha kwupụta okwu otuto n’asụsụ nke onye natara ya na-amataghị ma ọ na-abụkarị asụsụ pụrụ ichè, ọ na-abụ kwa, ọtụtụ mgbe, nke otù onye maara ya nọ nso.

N’eziokwu ọ bụghị okwu nkwugharị ọnụ nke amam-ihe ná-adịghị nime ya na nke ná-abaghị kwa urù. Ọ bụghị kwa ime ụñara nke arụ ana-apụghị ijide ma-ọbụ mmali elu na ịma jijiji nke na-eme ka ime mkpatụ dị. Ọ bụghị kwa ikwu okwu n’asụsụ nke ụwa ná-amataghị. Ọ bụ ezi asụsụ nke kwesịrị ịdị-adị, ọ na-adị kwa ọtụtụ mgbe, bụrụ kwa nke ndị nwe asụsụ ahụ na-amata ma ọ bụrụ na ha nọ nso. Ọ bụ okwu ejikọrọ nkeọma, okwu nwere nghọta sitere n’obi Chineke, nke Mmụọ Nsọ na-ekwupụta site n’egbugbere ọnụ nke mmadụ bụ ụrọ. Ọ bụghị ihe na-akpasu mwute n’obi nke ndị nọ nso, kama ọ bụ ndọrọ n’agha nke ihe niile dị n’arụ nke onye ahụ natara ya rue na aga-agọzi ndị ahụ niile nọ nso, wulie kwa mmụọ ha elu, mee kwa ka ha dị ọhụụ site na Mmụọ ahụ.

Ọ dị mgbe ọzọ emere ka ihe ịrịba-àmà nke Akwụkwọnsọ a pụta ìhè? Ee. Mgbe Ụbọchị Pentikọst gasịrị, ha kwuru okwu n’asụsụ dị iche iche wee bulie kwa Chineke elu (Ọlu Ndi-ozi 10:44-48; 15:7-9). Mgbe ihe ra ka iri arọ abụọ na atọ gasịrị site n’ụbọchị nwụsa mbụ ahụ Pọl gara Efesọs, “ha kwuru okwu n’asusu di iche” (Ọlu Ndi-ozi 19:1-7). Ọ dịghị ihe dị ka “ùzù, dika nke oké ifufe” ma-ọbụ “ire dika nke ọku” edepụtaara anyị na ọ pụtara ìhè n’oge abụọ ndịa, kama Chineke nyere ha ikwu okwu n’asụsụ di ichè dịka Baịbụl gbara aka-ebe na ọ bụ nlụzu ọlụ nke ọwụwụ mmiri nke Mmụọ Nsọ. O debeghị ihe ngosi nke a nye náánị nwụsa mbụ nke Mmụọ Nsọ ahụ kama O nyere ya n’oge abụọ ndịa gara aga arụtụrụ aka, na-ekwughị ihe ọ bụla banyere ọtụtụ puku ugbò awụsa kwara Mmụọ Nsọ n’ọtụtụ arọ nke akụkọ nke oge Chọọchị.

Mmiri Òzùzò Ikpe-azụ

Mgbe Pita kwuru okwu Chukwu ya ahụ anapụghị ichezọ n’ụbọchị Pentikọst, ọ gụpụtara okwu amụma nke Joel banyere óké ihe ga-eme n’oge a. Tụlee nkeọma n’ihe edere n’ozi ya, ma hụ kwa na ọ bụ náánị ọkàrà nke amụma ahụ ka ọ gụpụtara. Otù nime okwu ikpe-azụ Pita kwuru bụ “unu ka nkwa nka diri, na umu-unu, na ndi nile nọ n’ebe di anya, ka ha ra, bú ndi Onye-nwe-ayi Chineke-ayi gākpọtara Onwe-ya.” Ya mere, ọ dịghị ọnọdụ ọ bụla ga-eme ka amụma nke a, ma-ọbụ onyinye nke Mmụọ Nsọ ahụ dịka enyere ya N’ụbọchị Pentikọst, bụrụ ihe akwụsịrị n’oge mmalite nke Chọọchị. Mkwà ahụ dịrị “ka ha ra, bú ndi Onye-nwe-ayi bú Chineke ayi gākpọtara Onwe-ya”; ọ dịrị ndị “nọ n’ebe di anya.” Mkwà nke amụma ahụ dịkwara anyị onwe anyị. N’ihi nke a, ọ bụrụ na anyị na-eje ijè n’izù-òkè nke ìhè nke Oziọma -- ná-achọ kwa ojuju nke ngọzi niile nke ezi nnwapụta ahụ, anyị onwe anyị kwa, ganata ọwụwụ mmiri nke Mmụọ Nsọ.

Mgbe ahụ anyị onwe anyị, kwa, ga-ekwu okwu n’asụsụ dị iche dịka Mmụọ Nsọ na-enye ike ikwu? N’imesi ya ike, Ee! Ike Chineke, Àtụmàtụ Ya, Okwu Ya na mkwà Ya niile dị kwa otú ha dị nyahụrụ, taa, na rue mgbe ebighị-ebi. Ikwu okwu n’asụsụ dị iche dịka Mmụọ ahụ na-enye ike ikwuwa okwu bụ ihe-àmà nke Baịbụl na alụzuwo ọlụ ahụ. Ọ dị kwa mkpà ịbụ ihe-àmà Ya taa dịka ọ dịworo n’ụbọchị mbụ ahụ na dịka awụsakwara n’ụbọchị niile ndị sochiri ya dịka edepụtara anyị ha n’akwụkwọ.

Ebe okwu Pita kwuru banyere amụma Joel bụ maka nwụsa nke Mmụọ Nsọ ahụ n’Ụbọchị Pentikọst náánị, ọ dị mkpà ka anyị tụlee amụma ahụ n’ebe mbụ edere ya ịhụ ihe niile ekwuru nke metụrara anyị. Joel na-agwa anyị na aga-enwe nwụsa nke onyinye Mmụọ Nsọ ahụ ugbò abụọ, nke mbụ ka aga-eji tụnyere mmiri òzùzò mbụ nke na-ezò na Palestine, nke ọzọ dịka mmiri ikpe-azụ nke na-ezò tutu ewee ihe ubi. Mmiri òzùzò mbụ n’ala Palestine bụ ka mkpụrụ malite itó ma mmiri òzùzò ikpe-azụ bụ nke na-eme ka mkpụrụ ahụ chazie nkeọma. Otú a ka nwụsa nke Mmụọ Nsọ ga-adị. Mmiri òzùzò mbụ ahụ ga-abụ maka mmalite Nzukọ nke Kraist n’Ọgbọ ọhụụ a -- na mmalite nke otuto ya. Mmiri òzùzò Ikpe-azụ ahụ ga-ewerute Nzukọ ahụ n’ọnọdụ ikpe-azụ nke owuwe ihe-ubi zuru òkè.

Leba anya n’ihe ndịọzọ ahụ nke Joel metụrụ aka banyere nwụsa nke Mmụọ Nsọ. Ekwughị oge Mmiri òzùzò Mbụ ji malite, ma nke Ikpe-azụ bụ nke ekwuru na ọ ga-ewere ọnọdụ n’ọnwa mbụ nke arọ ndị Ju. Ma n’oge nke akụkọ ụwa a mgbe arọ a nke ana-ekwu ihe banyere ya ga-abịa ka akpọrọ oge nke ọgwụgwụ ihe niile.

Mmadụ pụrụ ikwu na amụma niile ndịa gbasara náánị Ụmụ Israel na amụma ndịa niile banyere Mmiri òzùzò Ikpe-azụ ahụ metụta kwara náánị ha n’oge mkpọghachị ha, masị na Onye-ozi ahụ ekwughị na nnwapụta nke a dị kwara ndị nọ n’ebe dị anya, ndị Onyenwe anyị ga-akpọ. Ọ dịghị mgbe ọ bụla akpọrọ Ndị Ju ndị “nọ n’ebe di anya.” Nhazi dị otú a bụ ihe edebeere Ndị Mbaọzọ, ndị ana-akpọ kwa “ndi nọ n’ebe di anya,” “ndi nọ na ezi,” “ndi ọbịa,” na “alaka Olive ọhịa.” Okwu nke amụma a nwere nkọwa abụọ. Anyị ekwụghị na ọ bụ náánị ndị Mbaọzọ n’ọgbọ ahụ bụ ndị agụrụ na ndị “nọ n’ebe dị anya,” na otù olu okwu ahụ adịghị atụ aka ndị ahụ kweera na Kraist bụ ndị “nọ ebe dị anya” n’ịgụ ogè -- ndị ahụ nke na-achọ òzùzò Ikpe-azụ. Ọ naekwu banyere ụzọ mmadụ abụọ ndịa, bụ ndị kwere ekwe.

Ihe niile Chineke kwuru na Ya ga-eme nime nwụsa ọ bụla ndịa niile jikọtara n’ezie ma ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche dịka Mmụọ ahụ na-enye ike ikwuwa okwu. “Anu-arụ nile” -- Ndị Ju na Ndị Mbaọzọ -- ga-anata ya; ma tụkwasị kwa nke a, “umu unu ndikom na umu unu ndinyom gēbu kwa amuma.” Ikwu na ebe a emetụrụ aka bụ ikike zuru òkè maka ihe ebube nke ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche taa ka ejiri ọlụ ebube nke ndịọzọ nke Chineke kwere ná mkwà na-egosi na ha aghaghị ịdị. Ịrọ nrọ na ịhụ ọhụ ka aga-enye; ọ bụ eziokwu na ihe ndịa niile agaghị ewere ọnọdụ mgbe Mmụọ Nsọ batara, n’ihi na ana-enye ụfọdụ ịrọ nrọ nye kwa ndịọzọ ịhụ ọhụ.

Nime ọnwa anọ (April), nke arọ 1906, nke bụ ọnwa mbụ n’okpukpé arọ nke ndị Ju, nime obodo Los Angeles -- ọ fọdụrụ ntakịrị ka ọ bụrụ otù oge áwà ahụ n’ọtụtụ akụkụ ọzọ nke ụwa -- awụsa kwara Mmụọ Nsọ nye ndị ahu edozuworo nsọ bụ ndị ná-echere mkwà nke nna ahụ. Emezuru amụma Joel buru banyere nke a n’ọnwa mbụ ahụ; ihe ịrịba-àmà niile ahụ nke Mmụọ Nsọ nyere ka enye kwara na nwụsa mbụ nke Mmiri òzùzò Ikpe-azụ a dịka awụsa kwara ya n’ụbọchị niile nke Ndị-ozi dịka edere ya n’akwụkwọ. Ndị ahụ awụrụ mmiri ahụ bụ ndị edoworo nsọ na mgbe gara aga. Mmụọ Nsọ nyere ha ike ijé ozi mgbe ọ bịakwasịrị ha: egbugbere ọnụ ha ahụ nke na-apụghi ikwuwa okwu na mbụ wee ghọọ ngwá ọlụ dị nkọ ịgọpụrụ okwukwe ahụ ndị na-eso ụzọ ahụ ihere ná-adịghị ekwe iweli anya elu wee bụrụ ndịkom na ndịnyom nke Chineke ná-adịghị atụ kwa egwù. Ha kwuru okwu n’asụsụ dị iche iche dịka Mmụọ ahụ nyere ha ike ikwuwa okwu, ọ bụ kwa otù ihe ahụ dịka Baịbụl depụtaworo ya ùgbò atọ. Otù ùgbò ọzọ kwa ndị na-eso ụzọ Ya wee pụọ ịgbasa Oziọma, rue ụwa niile, Mmụọ ahụ na-enye kwa ha ike, Onye Nkasị-obi ahụ dị Nsọ na-edu kwa ha.

Ọ nweghị ihe ọ bụla pụrị ịdị n’obi nke onye ji obi ya niile na-achọ ibi ndụ eziomume nke ga-achọ ịgọnarị ọlụ ọ bụla nke Chineke na-alụ n’obi mmadụ. Ka ha ra bụ ndi “agụụ eziomume na-agụ, ndị akpịrị na-akpọ kwa nkụ na ya” na-achọsị ike ịnata ihe niile Chineke nwere inye ha. Ọ bụrụ na ụfọdụ nwere obi abụọ, site na-amaghị ihe ha ma-ọbụ egwù nke ọnọdụ ha ga-eweta, Mmụọ Nsọ ahụ kwesịrị ntụkwasị-obi ga-ewepụ ha ngwà ngwà bụ, Onye ahụ nke kwere mkwà iduba anyị nime Eziokwu niile. Ọ nọ n’ụwa taa Ọ ga-edu kwa ndị ahụ chọrọ ka O due ha. Ọ na anọnye kwara ndị niile bụ ndị ahụ cheworo iru n’ụzọ Eluigwe; ma mgbe Ọ bịara nime obi ha n’òzùzù òkè nke nnwapụta ngọzi ahụ, ọ bụghị kwa náánị nnọnye ka Ọ na anọnyere ha, kama Ọ na-eji ụdị mmekọrịta ọhụụ bịakute ha. Site na mgbe ahụ gaa n’iru, ka ha na-anọgide n’ikwesị ntụkwasị-obi n’ebe Chineke nọ, Ọ na-anọ nime ha. Otù nime ihe ịrịba-ámá nke na-egosi na Ọ na anọnyere ha bụ na mgbe ọ bụla Ọ batara, Ọ na-eji ebgugbere ọnụ ha kwue okwu n’asụsụ nke ha na-amaghị.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Ọ bụ mgbe dị añaa ka Kraist kwere mkwà Onye Nkasị-obi ahụ? Gụpụta ka ha ra bụ mkwà ahụ niile nke ị maara.
  2. Òlee amụma eburu n’Agba Ochie banyere nwụsa nke Mmụọ Nsọ ahụ?
  3. Kwuo otú esi egosi ụdị nnwapụta atọ ndịa n’Agba Oche.
  4. Òlee ihe mgbakwasị ụkwụ anyị nwere site n’Akwụkwọ Nsọ nke na-egosi na onye ọ bụla nke na-achọ ọwụwụ-mmiri nke Mmụọ Nsọ aghaghị ịbụ onye edoworo nsọ?
  5. Chọpụta ihe niile yiri ibe ha nke i nwere ike, bụ nke mere mgbe ana-agọzi Ụlọukwu Solomon ná nrịdata nke Mmụọ Nsọ n’Ụlọ Elu ahụ
  6. Gịnị ka Baịbụl gosiri bụ ihe-àmà nke nwụsa mmiri nke Mmụọ Nsọ? Ènyere ihe ịrịba-ámá ọzọ n’oge nwụsa ahụ niile sochiri nwụsa ahụ enyere n’oge ndị-ozi? Ènyere ya ná mmalite nke Mmiri òzùzò Ikpe-azụ? Àna-enye kwa ya ndị niile na-anata ọwụwụ nke Mmụọ Nsọ taa?
  7. Gụọ Ndi Hibru 13:8 ma kọwaa otú o si metụta ihe ịrịba-ámá Baịbụl banyere nwụsa mmiri nke Mmụọ Nsọ taa?
  8. Mmetụta dị añaa ka ịnata nnwapụta a dị ebube nwere n’ijé ozi nke Ndị-ozi ahụ? Were ndụ ha dị tupu ha anata nwụsa mmiri a tụnyere ndụ ha dị mgbe ha natasịrị Mmụọ Nsọ ahụ.
  9. Gịnị ka ọ pụtara bụ mmadụ ịnwapụta ihe bụ ọkpụkpọ ya?
  10. Mụọọ ma buru kwa n’isi, kpọpụta kwa mkwà ahụ ekwere banyere anyị onwe anyị ndị bi n’ogwụgwụ oge a, dịka edere ya n’Ọlu Ndi-ozi 2:39.