Ọlu Ndi-ozi 3:1-26

Lesson 282 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBIN’ISI: “Ekpere nke okwukwe ahu gāzọputa kwa onye ahu aru nādigh ike, Onye-nwe-ayi gēme kwa ka o bilie; ọ buru kwa na ọ mehieworo, agāgbaghara ya nmehie ahu” (Jemes 5:15).
Cross References

I Ịlụ-ọlụ Niile nke Chineke

1. Agwọrọ onye ngwụrọ dịka mkwà nke Chineke si dị, Ọlu Ndi-ozi 3:1-10; Mak 16:18; Jọn 14:12-14

2. Chineke nyere Nzukọ Kraist ike niile ịlụ ọlụ ebube, ma ana-eme ha náánị site n’ọchịchọ na mkpali nke Mmụọ Nsọ, Ọlu Ndi-ozi 3:11, 12; I Ndi Kọrint 12:4-11, 28-31; Ndi Rom 12:3-8

3. Okwukwe nke enwere nime Kraist mere ka ike ahụ nke ejiri gwọọ onye ngwụrọ ahụ dị ìrè, Ọlu Ndi-ozi 3:13-16; 14:9; Ndi Hibru 11:6; Matiu 8:16-18

4. Pita dụrụ ìgwè mmadụ ahụ ọdụ bụ ndị nwere ịnụ ọkụ n’obi ka ha si ná mmehie ha chègharịa, ma chigharịkute kwa Chineke, Ọlu Ndi-ozi 3:17-26; 5:28-32; 14:15-18

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ike Nke Sitere N’Elu

Jisọs enyewo ndị ná-eso ụzọ Ya iwu sị: “Nọdunu n’obodo a, rue mgbe agēwere ike nke si n’elu yikwasi unu” (Luk 24:49). Erubewo isi nye iwu ahụ, ndị ná-eso ụzọ Ya anatawo kwa ọwụwụ mmiri nke Mmụọ Nsọ na ọkụ. Ike nke ikwusa Oziọma Jisọs Kraist wee bụrụ nke ha, Chineke nyekwara ihe ngosi zuru òkè banyere ike ahụ site n’iji ọtụtụ ọlụ ebube kwagide ijéozi ha.

Jisọs ekweworị ndị Ya mkwà: “Ihe-iriba-ama ndia gēso kwa ndi kwere; … ha gēbikwasi ndi-nriaria aka, agēme kwa ka aru ha di ike” (Mak 16:17, 18). Mkwà ahụ abụrụworị ezie, ma ọgwụgwọ nke onye ngwụrọ ahụ site n’iwu nke Pita na Jọn nyere bụ nnọọ ihe ná-egosi na Chineke kwesịrị ntụkwasị-obi ná mkwà Ya. Ọtụtụ mgbe ka Jisọs gwọrọ ụmụ mmadụ iji gosipụta ike Ya, na dịka ngosi nke ịbụ Ọkpara Chineke Ya. Ọtụtụ mgbe ka Ọ na-eji ụzọ dị otú ahụ mee ka okwukwe ha dị ọhụụ nime Ya na Ọ pụrụ ịgbaghara ha mmehie ha. Ọlụ ebube nke a pụrụ ichè tụkwasịrị ihe n’elu ihe ngosi nke mbiliten’ọnwụ na ọdịdị Ebighị-ebi Ya.

Ọgwụgwọ nke agwọrọ nwoke ahụ dara ngwụrọ N’ụlọ Ukwu Chineke abụghị ihe Pita na Jọn mere site n’onwe ha ma ewezuga inye-aka ma-ọbụ mkpali nke Chineke. Akwụkwọnsọ kọwara n’ebe dị iche iche na Mmụọ Chineke bụ Onye òzìzí dị Nsọ na Onye-ndú nke Nzukọ Kraist nke ná-adịghị adahie adahie mgbe Jisọs Kraist ná-anọghị kwa n’ụwa. (Gụọ Jọn 14:16, 17, 26; 16:7-15). Jisọs gwara ndị ná-eso ụzọ Ya, “Unu apugh ime ihe ọ bula ma Mu anọgh ya” (Jọn 15:5). (Gụọ kwa Jọn 8:28; 9:33). Mgbe Jisọs rapụsịrị ụwa, Mmụọ Nsọ na-aga n’iru n’ịlụ ọlụ Chineke bụ nke Jisọs malitere.

Ọ dịghị mgbe ọ bụla Mmụọ Nsọ nọworo n’okpuru mmadụ. Chineke ná-achị achị n’ihe niile, ma ndị niile guzoro na-anọ n’okpuru odudu nke Mmụọ Nsọ. Chineke na-eme ka ndị Ya mara nke a ma ná-ajụ kwa ha ajụjụ sị ọ bụ onye n’etiti unu pụrụ idu ma-ọbụ nye ya ndụm-ọdụ. Chineke sịrị: “Ònye tụpụtaworo mọ nke JEHOVA, maọbụ, dịka onye-ndụm-ọdụ ya, nēme ka Ọ mara ihe? Ya na onye gbara ìzù? ònye mere ka Ọ ghọta ihe? ònye ziri ya ihe n’okporo-uzọ-ikpé, zi kwa ya ihe-ọmuma, me kwa ka Ọ mara uzọ nghọta” (Aisaia 40:13, 14). “N’ihi na ònye mara uche Onye-nwe-ayi? Ma-ọbu ònye putara ibu onye Ya na ya nāgba izù?” (Ndi Rom 11:34).

Eziokwu nke odudu Mmụọ Nsọ na ịlụ ọlụ Ya niile ka ekwusịrị ike n’ihe-ọmụmụ a n’ihi na ọ dị mmadụ ndị ga-eji ihe a mere bụ nke akọwara n’ihe-ọmụmụ a maa àtụ iji gosi na ụmụ mmadụ pụrụ ịnata ike site n’aka Chineke iji gwọọ onye ọ bụla ha chọrọ igwọ, dika o ziri ezi n’anya ha onwe ha, ná-esiteghị n’uche na odudu Chineke. Otú ọ dị ọ dịghị ebe ọ bụla ihe ọgụgụ anyị kọwapụtara n’ụzọ doro anya na Chineke kpaliri Pita na Jọn ka ha mee ihe a n’okwukwe ka ewee gwọọ onye ngwụrọ ahụ, ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ichè na Chineke kwagidere ha ime ya, ọ dịghị kwa ihe nkwagide ọ bụla nke sitere n’Akwụkwọnsọ nke ga-eme ka écheé na ọ dịghị otú a.

Akụkụ nke Okwu Chineke bụ nke amaara taa dịka Testament Ọhụụ bụ ihe aka-edeghị na mgbe ahụ ma Chineke chọrọ ime ihe ịrịba-ámá ndị ahụ niile pụtara ìhè ka ha bụrụ ihe mkwagide ná-adịghị ada ada nke ná-enweghị kwa mgbagha bụ nke mbiliten’ọnwụ nke Kraist na eziokwu nke Okwu Ya. Eritara ọtụtụ mmadụ ndị ná-ekweghị ekwe n’urù nye ezi nzọpụta n’ihi omume ndị dị otú ahụ. Ọlụ ebube abụghị náánị nke mgbe ochie kama Chineke nọ kwa ná-alụ ọlụ ebube taa. Okwu Chineke nke edeworo ede dị kwa n’aka anyị ugbu a, ọ bụ kwa ya bụ mkpughe dịkarịsịrị elu nke uche Chineke nke Ọ ga-enye ụmụ mmadụ rue mgbe Kraist ga-abịa n’ụwa ọzọ. Ọlụ ebube agaghị anọchi nkwusa nke Okwu Chineke nke ga-eduru ụmụ mmadụ rue nchègharị na nzọpụta. Ọlụ ebube kachasị nke Chineke lụworo bụ mgbanwe nke ndụ ụmụ mmadụ mgbe ha na-ekwere na Kraist rue nzọpụta, site n’ịnụ Okwu Chineke!

Anyị matara na Pita ghọtara ihe ndịa, n’ihi nkọwa na nkwusa ya nye ìgwè ndị zukọrọ mgbe emesịrị ka arụ onye ngwụrọ ahụ dị ike. Ọ dị ka aga-asị na mmadụ ụfọdụ n’etiti ndị ahụ zukọrọ na-ekwu na Pita na Jọn gwọrọ onye ngwụrọ ahụ site n’ike nke onwe ha. Okwu Pita gwara igwè mmadụ ahụ dị mkpà: “Ndikom nke Israel, gini mere ihe a nēju unu anya? ma-ọbu gini mere unu nēlegide anyị anya, dika ọ bu site n’ike nke aka ayi ma-ọbu dika ayi onwe-ayi nāsọpuru Chineke ka ayi meworo ya ka ọ je ije? … ekwere n’aha-Ya ka aha-ya nyere nwoke a ume, onye unu nēle anya mata kwa: e, okwukwe ahu nke sitere n’aka-Ya mere ka aru-ya dizu nma n’iru unu nile” (Ọlu Ndi-ozi 3:12, 16).

Okwukwe N’aha Ya

Pita etufughị oge n’inye Kraist otuto n’ihi ọgwụgwọ nke nwoke ahụ dara ngwụrọ. O mere ka igwè mmadụ ahụ mata na ọ bụ okwukwe n’aha Jisọs Kraist nyere ike eji gwọọ onye ngwụrọ ahụ.

Chineke adịghị alụ ọlụ ebube iji mejue ọchịchọ efu nke mmadụ (Matiu 12:38, 39). Ọtụtụ ndị nwere obi abụọ nke ziri ezi échigharịkutewo Kraist n’ezie n’ihi na Chineke agwọwo ha ma-ọbụ n’ihi na Ọ lụworo ha ọlụ ebube n’oge óké mkpà. Mgbe ụfọdụ ọlụ ebube na-egosi ụmụ mmadụ na Chineke dị karị otú ihe ọ bụla ọzọ pụrụ igosi. Chineke na-ekpughe ike ya na-eme kwa ka ámárá na Ọ dị nye obi niile nke ná-achọsị Ya ike, n’ihi na Ọ chọrọ ka ụmụ mmadụ kwere na Ya. Ọ na-eme ka okwukwe ha dị ndụ nime Ya, ka ha wee chigharịa ewee gbaghara kwa ha mmehie ha. Ọgwụgwọ nke onye ngwụrọ ahụ bụ otù ihe-àtụ dị otú a.

Pita, ebe ọ matara na ọlụ ebube nke Jisọs lụrụ bụ iji mee ka ụmụ mmadụ kwere na Ya bụ Kraist nke Chineke, na O nwekwara ike ịgbaghara mmehie ha, ngwà ngwà o mere ka obi ìgwè mmadụ ahụ pụọ n’ebe nwoke ahụ dara ngwụrọ nọ site n’igosi ha Onye ahụ nke meworo ihe ahụ. (Gụọ Mak 2:1-12). Pita chètaara ha ọjụjụ nke ha jụrụ na Jisọs bụ Kraist ha n’oge gara aga, nkwenye nke ha kwenyere na mkpọgide n’obe Ya, na ọlụ ha n’ebe Chineke nọ banyere nchègharị site ná mmehie ha niile. Egosịrị ya n’ụzọ doro anya na Pita mere nkeọma ma kwesị kwa igosi ụmụ mmadụ mkpà ọ dịrị ha inwe nzọpụta, karịa ịdị ná-ekwu banyere ike Chineke ji agwọ ọrịa, n’ihi na ihe ra ka puku mmadụ ise kwere na Kraist n’ihi Okwu Chineke nke Pita kwuru.

Ọgwụgwọ Nsọ

Emewo ijéozi nke Kraist ọtụtụ ihe ike n’ihi ọtụtụ ọnụ-ọgụgụ nke ndị uche ha gbagọrọ agbagọ bụ ndị jiworo òzìzí nke Akwụkwọnsọ banyere Ọgwụgwọ nsọ zụọ ahịa. Ha adịghị atụfu oge ikwu na ha nwere “onyinye nke ịgwọ ọrịa,” na ha pụkwara ịgwọ ndị niile ná-abịakute ha. Óké “nkwusa banyere ọgwụgwọ” ka ana-eji ghọgbu ọra mmadụ n’ọnọdụ ikwusa Oziọma. Ọtụtụ mgbe náánị ihe ntà ka ana-ekwu banyere mkpà ọmụmụ ọhụụ dị, n’ihi na ndị ahụ dị ike ná mkwusa ndịa niile nwere mmasị n’ego nke ha ga anata n’aka ìgwè mmadụ ahụ, ma ha maara náánị nwantịị banyere ezi nzọpụta.

Ọ bụ ezie na onyinye nke ọgwụgwọ dị nime onyinye niile nke Mmụọ Nsọ na-enye Nzukọ Kraist. (Gụọ I Ndi Kọrint 12:9, 28). Otú ọ dị, o kwesịghị ka onye ọ bụla nwee obi abụọ n’ihe bụ eziokwu banyere ndị ọ bụla mere onwe ha ndị ọgwụgwọ. Ọ dịghị mgbe ọ bụla Jisọs nwere “nzukọ nke ọgwụgwọ ọrịa”! Ọ gwọrọ ndị niile bịakutere Ya, ma n’otù mgbe ahụ gwa ha ka ha ghara kwa imehie ọzọ, ka ihe jọkarịrị njọ ghara ịbịakwasị ha. (Gụọ Jọn 5:14). Mgbe niile Jisọs na-ewepụ anya ụmụ mmadụ ebe Ya Onwe Ya nọ ná-atụrụ ha aka ebe Nna Ya nke bi n’Eluigwe nọ, Onye esitere n’aka Ya zite Ya. Ihe ná-ekwesịghị ka ezi nwa Chineke mee n’ụwa a bụ ịchọ ịdọrọ obi ụmụ mmadụ nye onwe ya n’ihi ọlụ nke Chineke lụworo. Pita na Jọn dọọrọ obi ìgwè mmadụ ahụ chee iru n’ebe Jisọs nọ, ọ bụghị n’ebe ha onwe ha nọ, wee kwupụta kwa na ọ bụghị site n’ike ọ bụla ma-ọbụ ịdị-nsọ nke aka ha ka agwọrọ nwoke ngwụrọ ahụ.

Nke ahụ abụghị omume nke ndị ahụ ana-akpọ “ndi oji okwukwe agwọ.” Ndịkom na ndịnyom ndịa na-eme ihe niile ha nwere ike ime iji dọrọ obi nke ụmụ mmadụ nye onwe ha; ma mmụọ nke nzukọ ọgwụgwọ dị otú ahụ bụ nnọọ ihe ná-emegide Mmụọ nke Chineke. Ana-ebuli Kraist elu ebe ana-ekwusa ezigbo Oziọma ahụ, ma ọ dịghị otù òzìzí nke Baịbụl aga-asị na ọ karịrị ibe ya. Kraist atụkwasịghị ụgwọ ọ bụla n’elu ike ọgwụgwọ Ya, ma onye ọ bụla kwa nke na-eme otú ahụ nwere ikpe-ọmụmá nke iji Oziọma zụọ ahịa. Akwụkwọnsọ na-ekwu, “Igwe-oji na ifufe nke miri-ozuzo nādigh ka onye nke nānya isi n’onyinye okwu ugha bu” (Ilu 25:14). Ọ naekwu kwa sị “N’efu ka unu natara, nyenu n’efu” (Matiu 10:8).

Onye ọ bụla nke nwere ezi onyinye nke ọgwụgwọ gaje inye Kraist otuto niile, dịka ndị ná-eso ụzọ Ya mere. Ha ga-abụ ndịkom na ndịnyom dị ezi nsọ nwee kwa omume ziri ezi, ha na ụwa na ihe ịchọ otuto efu ya niile enweghị mmekọ. Chineke ekwuwo: “Mu onwem bu JEHOVA; nke ahu bu aham: M’gagh-enye kwa onye ọzọ nsọpurum” (Aisaia 42:8).

Ọgwụgwọ nsọ dị n’àtụmàtụ nke mgbapụta, ọ bụ kwa otù akụkụ nke Mkpuchi mmehie. (Gụọ I Pita 2:24; Matiu 8:16, 17; Aisaia 53:5). N’efu ka enyere ya mmadụ niile, ọ dịkwara mmadụ niile, apụkwara iji okwukwe ekwere nime Kraist nweta ya, dịka Pita kwuru. Anyị gụrụ: “Site kwa n’okwukwe ekwere n’aha Ya ka aha-Ya nyere nwoke a ume.” Okwukwe nime Kraist, ka O wee bụrụ ihe ịjụrụ Chineke obi n’ebe mmehie anyị dị, site kwa n’ubiri ụtarị Ya apụrụ ime ka arụ anyị dị ike, ga-eweta ngọzi ahụ.

Jemes sịrị: Ọ di onye ọ bula n’etiti unu nāhuju anya? ya kpe ekpere.… Ọ di onye ọ bula n’etiti unu nke aru-ya nādigh ike? Ya kpọ ndi-okenye nke nzukọ Kraist ka ha biakute ya; ka ha kpe kwa ekpere n’isi-ya, nēte ya manu olive n’aha Onye-nwe-ayi: ekpere nke okwukwe ahu gāzọputa kwa onye ahu aru nādigh ike, Onye-nwe-ayi gēme kwa ka o bilie; ọ buru kwa na ọ mehieworo, agāgbaghara ya nmehie ahu” (Jemes 5:13-15). Nke a bụ ụzọ ziri ezi iji bịakute Chineke maka ọgwụgwọ. Ndị ahụ na abịakute Chineke n’ụzọ ziri ezi ka ana-eme ka arụ ha dị ike, n’ihi na Chineke kwesịrị ntụkwasị-obi n’ebe Okwu Ya dị. Ọ bụ ihe dịkarịsịị ike bụ inweta ọgwụgwọ nsọ ọ bụla site n’aka ndị ahụ ná-akpọ onwe ha “ndị ọgwụgwọ nsọ” ma otú ọ dị ana-esite ná mkpụrụ ha mara ha.

Okwukwe bụ ụzọ kachasị mfé nke ụmụ mmadụ, n’ebe niile pụrụ isi nweta ngọzi nke Chineke. Ọgaranya na ogbenye, onye nọ n’agbụ na onye nwere onwe ya, Onye Ju na onye Grik -- ha niile nwere ike ịnata ngọzi nke Chineke site n’okwukwe. Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’iru, ụmụ mmadụ ekwesịghị kwa iketa ihe ọma ọ bụla site n’ebe Chineke nọ, ha apụghị kwa inweta iruọma Chineke site n’àtụmàtụ nke onwe ha. Otú ọ dị site na náánị okwukwe nke nwata anyị pụrụ ime ka Chineke tinye ike ukwu Ya n’ọlụ n’ihi anyị. Asịkwarị na ọ bụ maka ọgwụgwọ nke anụ-arụ, ma-ọbụ mgbaghara nke mkpụrụ-obi -- ha niile ka apụrụ iji okwukwe nime Chineke nweta.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị ka Pita na Jọn nyere nwoke ahụ dara ngwụrọ n’ọnọdụ ego?
  2. Èsi añaa mee ka arụ onye ngwụrọ ahụ dị ike?
  3. Gịnị mere Pita na Jọn ji jụ ịnara otuto n’ihi onye ngwụrọ ahụ emere ka arụ ya dị ike?
  4. Òlee otú apụrụ isi nweta ọgwụgwọ taa?
  5. Chineke Ọ kà na-alụ kwa ọlụ ebube? ma ọ bụrụ otú a, n’ihi onye?
  6. Gịnị ka okwu Chukwu Pita kwuru nye ọra mmadụ lụpụtara?