Ọlu Ndi-ozi 4:1-31

Lesson 283 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ndi nēmebi iwu agbalagawo mgbe ọ digh onye nāchu ha: Ma ndi ezi omume nwere ntukwasi-obi dika ọdum” (Ilu 28:1).
Cross References

I Itinye N’ụlọ Mkpọrọ na Idubata N’iru Nnọkọ-ikpé

1. Akpaliri ndị-isi ndị Ju site ná mkwusa nke Pita na Jọn, Ọlu Ndi-ozi 4:1, 2

2. Atụbara ndị-ozi abụọ ahụ nime ụlọ mkpọrọ abalị ahụ niile, Ọlu Ndi-ozi 4:3

3. Atụkwasịịrị òtù ndị ahụ kwere ekwe ọtụtụ mkpụrụ-obi, Ọlu Ndi-ozi 4:4

4. Akpọrọ nnọkọ-ikpé ahụ ewee kubata Pita na Jọn n’iru ha, Ọlu Ndi-ozi 4:5-7

II Nnọkọ-ikpé Nwere Ojuju-anya

1. Mmụọ Nsọ nke Chineke tinyere okwu amam-ihe n’ọzịzá nke Pita nyere, Ọlu Ndi-ozi 4:8-12

2. Nnọkọ-ikpé ahụ nwere ojuju-anya dị ukwu n’ebe Ndị Kraist nke nwere nkwuwa okwu nọ, ma ọ dịghị ebubo apụrụ ibo ha, Ọlu Ndi-ozi 4:13, 14

3. Ndị-isi ahụ nyere Pita na Jọn iwu ka ha ghara kwa ikwu ọzọ n’aha nke Jisọs, Ọlu Ndi-ozi 4:15-18

4. Pita kwupụtara na ndị ná-eso ụzọ Kraist aghaghị ige ntị n’olu Chineke karịa olu nke mmadụ, Ọlu Ndi-ozi 4:19-22

III Ha na ndị Òtù Ha

1. Ndị ahụ nke ná-eso ụzọ Jisọs arapụrụ gara nnọọ kpọmkwem n’ebe ndị òtù ha nọ, Ọlu Ndi-ozi 4:23

2. Ha kpere ekpere banyere nkwuwa okwu nke ikwusa Okwu Chineke, Ọlu Ndi-ozi 4:24-30

3. Chineke zara ekpere ha site n’ihe ngosi dị iche iche pụtara ìhè, Ọlu Ndi-ozi 4:31

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Mmeri

Ọgwụgwọ nke onye ngwụrọ ahụ n’Ọnụ-ụzọ ama ọma nke Ụlọ ukwu Chineke ahụ dọtara ìgwè mmadụ. Ngwa ngwa Pita hụrụ ohere nke Chineke meghere, o wee malite ikwusara ndị ahụ ihe banyere Jisọs, Onye ahụ nke mere ka ọgwụgwọ nke onye ahụ dara ngwụrọ ndị ìrè. Dịka Pita na-ekwu ihe banyere mkpọgide n’obe, mbiliten’ọnwụ na nrịgo n’Eluigwe nke Jisọs. Mmụọ Nsọ nke Chineke wee dọrute eziokwu ahụ nke Pita na-ekwu nso karị n’obi nke ndị niile ná-anụ okwu ahụ, ọtụtụ nime ha wee kwere n’Onyenwe anyị. Ọ bụ mmeri pụtara ìhè nye Ndị-ozi ahụ, ma ọ dịghị anya mgbe enwesịrị mmeri ahụ na onye-iro buru agha megide mmeri ahụ. Ndị mmegide ahụ bịakwasịrị Pita na Jọn site n’ụzọ atọ: ndị-nchụàjà, ọchị-agha nke Ụlọ ukwu Chineke, na ndị Sadusii. Ejidere ndịkom abụọ nke Chineke ahụ wee tụba ha n’ụlọ mkpọrọ n’abalị ahụ niile, n’ihi na oge agamiwo n’anyasị ahụ nke mere na ọ dịghị mfé ịkpọkọta nnọkọ-ikpé nke ndị Ju tupu abalị abịa.

Mkpagbu

N’ụzọ dị otú a ka mkpagbu mbụ nke okwukwe Ndị Kraist bú nke atọrọ ntọ-ala ya ọhụụ si malite. Ka ana-amụ ihe-ọmụmụ a ná-aga n’iru, aga-ahụ otú okwu banyere Kraist na okwukwe nke dị nime Ya ji guzogide mkpagbu ahụ bụ nke okwukwe ekwere n’Ọkpara Chineke lụpụtaworo n’ọgbọ niile, ná-agbanyeghị ọnụ-ọgụgụ nke ndị mkpagbu ahụ ma-ọbụ ịdị elu nke ọnọdụ nke ụwa nke ha ji. “Ma ekele diri Chineke, Onye nēdughari ayi n’ọñụ-agha nime Kraist mgbe nile” (II Ndi Kọrint 2:14).

Ọchịchịrị abalị gbachigidere Pita na Jọn n’ụlọ mkpọrọ -- nnwapụta ọhụụ nye ha, ma nnwapụta a ga-abụ ihe ga ná-eso ụzọ Onye Nazaret ahụ dị ume-ala n’obi. Ọbụná taa n’obodo ụfọdụ nke ụwa ịkpọ aha banyere okwukwe nke dị nime Jisọs Kraist bụ ihe aga-agụ na ọ ga-eweta ịtụ-egwù, mkpagbu dị iche iche, itụba n’ụlọ mkpọrọ, ma-ọbụ ogbugbu. N’oge nke ana-akpọ Ọgbọ nke Ọchịchịrị (Dark Ages), ka egburu ọtụtụ ìgwè mmadụ ana-apụghị ịgụta ọnụ n’ihi okwukwe ha nime Kraist, ma ekwuru na egbuworị ọtụtụ ndị nke Kraist nime arọ iri abụọ na ise gara aga karịa otú egburu ha n’oge Ọgbọ Ọchịchịrị ahụ. Ndị-ozi a hụrụ ahụhụ ná mmalite nke óké ifufe nke ekwensu megide okpukpé nke Ndị Kraist -- ihe nke mere n’oge ochie nke ná-adịgide kwa rue taa, n’eziokwu n’ezi ọtụtụ kwa. N’obodo a nke mmadụ nwere onwe ya nke anyị bi nime ya na-enye kwa anyị ohere nke ifè Chineke òfùfè n’inwere onwe anyị nke anyị na ekele ekele n’ihi ya, ma enwere ike ịgbanwe nke a n’otù abalị ma ọ bụrụ na etinyere ndị nke ná-ekwesịghị ekwesị n’ọchịchị.

N’iru Nnọkọ-ikpé ahụ

N’echi ya, ndị-isi ha, ndị-okenye, ndị ode-akwụkwọ, onye isi-nchụàjà na ọtụtụ nime ndị sitere n’ikwu ya zukọrọ ná nnọkọ-ikpé ahụ -- òtù ndị ọchịchị nke ana-asọpụrụ n’ebe ọ dị ukwu nime Jerusalem. Akpọbatara Pita na Jọn n’iru nnọkọ-ikpé ahụ ka ha zaa ajụjụ banyere ọgwụgwọ nke nwoke ahụ bụ onye dara ngwụrọ site n’ọmụmụ ya. Ndịkom ndịa, ná-enweghị obi abụọ, chètara ụdị ọgbakọ dị ka nke a ọ bụ kwa otù ndịkom ndịa ka ahụrụ na ya n’ọnwa ole-na-ole gara aga. Ọgbakọ ahụ bụkwarị nke ahụ Kraist guzoro n’iru ya n’oge ana-ekpé Ya ikpé nke ịkwa emò, nke amakwara Ya ikpé ịnwụ ọnwụ n’elu obe. Pita ga-echètaworị ihe ahụ niile nke mere site ná mmalite rue ọgwụgwụ, n’ihi na n’ụbọchị ahụ ebubo nke nwa-agbọghọ ná-eje ọzi mere Pita ka ọ gọnarị Onyenwe anyị. Nke a bụ Pita ọhụụ onye guzoro n’iru nnọkọ-ikpé a, otú ọ dị, óké mgbanwe adịwo nime obi ya na ná ndụ ya. Pita akwaworị ákwá dị ilu ma chègharịa kwa site n’obi ya niile n’ihi ngọnarị ahụ, Jisọs agbagharawo ya, ma nyeghachị ya nzọpụta nke mkpụrụ-obi ya. Pita esosiworị Jisọs ike, ná-ewere ndụ ya chụọàjà n’ihi ijé ozi Kraist, ná-arọrọ Kraist karịa ihe niile nke dị n’ụwa. Edoworị obi Pita nsọ, n’ihi na n’Ụbọchị Pentikọst ya na ndịozi ahụ dị 120 n’ọnụ-ọgụgụ nọ n’otù olu na otù obi n’Ụlọ Elu ahụ, n’ebe ahụ ka ya na ha natara ọwụwụ-mmiri nke Mmụọ Nsọ. Eleghị anya nnọkọ-ikpé ahụ tụrụ anya na Pita na Jọn ga-ama jijiji n’iru ha n’ihi egwù; ma Pita na Jọn gosịrị óké nkwuwa okwu, n’otù-aka ahụ kwa ná-akọwa ihe banyere olile-anya ahụ nke bara ha n’ọkpụkpụ na ụmị.

Ebum-N’uche Jupụtara n’Ekworo

Apụghị ịgọnarị ọlụ ebube nke ọgwụgwọ ahụ. Nwoke ahụ n’onwe ya guzoro n’ebe Pita na Jọn nọ, ọlụ ebube ahụ gbaara onwe ya àmà. Emesịa ikpé ahụ ghọrọ ajụjụ banyere otú esi lụọ ọlụ ebube ahụ -- eziokwu nke onye ọ bụla nọ ná nnọkọ-ikpé ahụ ga-amaworị. Nke a bụ isi-okwu dị óké mkpà. Onye-isi nchụàjà na ndị òtù ya akpọgideworị Jisọs n’obe. Ọ bụrụ kwa na ekwenye ka Ndị-ozi ahụ kwusaa banyere Kraist nke si n’ọnwụ bilie ná-enweghị ihe mgbochi ọ bụla, ọ ga-eweta nlelị nye onye-isi nchụàja ahụ, ikpé-ọmụma nke ọbara Kraist ga-adịkwasị kwa n’isi ndị ahụ boro Ya ebubo. Ọzọkwa, ọ bụ ndị chụàjà Ụlọ ukwu Chineke, ha nwere ekwòrò n’ebe ike na nsọpụrụ nke ha hụrụ Ndị-ozi ahụ na-enweta mgbe ha na-ekwusa òzízí Kraist. Ike nke ndị ná-achị Ụlọ ukwu Chineke ga na-adị ala ala ma ọ bụrụ na ekwee ka Oziọma ahụ gbasaa ná-enweghị ihe mgbochị.

Ndị Sadusi, n’otù aka ahụ tinyekwara aka ná mkpagbu ahụ, n’ihi na òzízí nke mbiliten’ọnwụ megidere okwukwe èfù ha nke ha kwere. Mbiliten’ọnwụ, ma-ọbụ ndị mmụọ ozi adịghị n’òzízí ha nke ha jidesirị ike. Ndị Sadusi ga-abụ ndị emeriri emeri ma ọ bụrụ na aga-ekwe ka Ndị-ozi ahụ ná-agbasa Oziọma ahụ gaa n’iru.

Eziokwu ahụ Ná-enwu-enwu

Jisọs adọwọrị Ndị-ozi Ya aka-ná-ntị na ọnwụnwa ga-abịa. O kwuworị na: “Ha gātukwasi unu aka-ha, sogbu kwa unu, nārara unu nye n’aka ulo-nzukọ na ulo-nkpọrọ, n’ebe anēduputa unu ga n’iru ndi-eze na ndi-isi n’ihi aham” (Luk 21:12). Jisọs kwekwara mkwà ọzọ: “Ya mere, zubenu n’obi-unu, na unu agagh-ebu uzọ tugharia uche otú unu gāgọpu onwe-unu: n’ihi na Mu onwem gēnye unu ọnu na amam-ihe, nke ndi nile nēmegide unu nāgagh-apu iguzogide ma-ọbu ikwugide okwu” (Luk 21:14, 15). Emezuru mkwà ahụ mgbe Pita na Jọn guzoro n’iru nnọkọ-ikpé ahụ ịzá ajụjụ banyere ebubo niile eboro ha.

Ndị-ozi ahụ kwuru okwu Chineke, Eziokwu nke Chineke wee dụọ ndị ahụ ná-ege ntị nime obi, ha enweghị kwa okwu ọ bụla iji boo ha ebubo. Ọ bụ okwu Chineke doro anya ka Pita kwuru, bụ nke ekwuru nnọọ kpọmkwem nye ndịkom ahụ ndị kpọgidere Jisọs n’obe. Okwu ngọpụ ahụ nke Pita kwuru bụ okwu dị ike, nke dokwara anya, ma dị kwa nkenke banyere Jisọs na ọlụ Ya, mgbe ahụ o wee mee ka ha ghọta nkeọma mmehie nke dị n’ịjụ Onye-nzọpụta ahụ, o wee kwubie okwu ngọpụ ahụ site n’ọkpụkpọ òkù nke ịgwa ha na nzọpụta dịịrị mmadụ niile, mgbe ọ sịrị: “Nzọputa adigh kwa n’onye ọ bula ọzọ: n’ihi na aha ọzọ di iche adigh kwa n’okpuru elu-igwe, nke enyeworo n’etiti madu, nke anāghagh izọputa ayi nime ya” (Ọlu Ndi-ozi 4:12).

Ịmụtaworị Ihe Site N’aka Jisọs

Òtù ahụ na onye-isi nchụàjà apụghị ilefuru eziokwu ahụ anya na ndị-ozi ahụ na Jisọs anọworị, na ha mụtakwara ihe site n’aka Ya. Ha chètara ntukwasị-obi ahụ dị ukwu nke Jisọs nwere n’ebe Chineke nọ, ugbu a Ndị-ozi ahụ na-egosi kwa otù ụdị ntụkwasị-obi ahụ. Akụkọ banyere Jisọs bụ eziokwu ná-agbanyeghị ihe onye-isi nchụàjà nwere ike ikwu. Apụghị ịgọnarị mbiliten’ọnwụ ahụ, ma lee otú obi ga-esiworị tọọ nnọkọ-ikpé ahụ ụtọ ịgọnarị ya! Ndị Kraist na-atụ aka n’ílì ahụ tọgbọrọ n’efu, ndị-isi ahụ maara site n’ala ala obi ha na ílì ahụ tọgbọrọ n’efu n’ezie. Okpukpé nke Ndị Kraist ga-abụworị ihe akwadara n’otù ntabi-anya ma ọ bụrụ na ndị-isi ahụ nwere ihe ha ga-eji gosipụta na Kraist esighị n’ílì ahụ bilie; ma ha enweghị ike. Onye-nzọpụta ahụ nke si n’ọnwụ bilie nyere Pita ntọ-ala nke o ji ná-ekwu okwu, ma Mmụọ Nsọ mejupụtara ya n’ike ikwu okwu. Nnọkọ-ikpé ahụ “enwegh ike ikwugide ya.”

Gịn ị mere ụmụ mmadụ ji ebu agha megide Nna, na Ọkpara, na Mmụọ Nsọ? -- nke bụ náánị ebe ezi ihe nke ụmụ mmadụ na enwe olile-anya inweta n’ụwa si apụta. Nnọkọ-ikpé ahụ ghọtara Eziokwu ahụ nkeọma, ma otú ọ dị ha nọgidesiri ike ná nnupu-isi ha megide Chineke. Nganga nke obi ha gbochiri ha ime ihe akọn’uche ha mere ka ha mara nkeọma. Ndị ụwa na-agbaso kwa otù ụdị omume a. Chineke na-eme ka ụmụ mmadụ mara ezi ụzọ ahụ na ihe Ọ chọrọ n’aka ha, ma ha na-ajụ iso ụzọ ahụ. “Onye matara ime ihe ọma, ma o megh ya, ọ buru onye ahu nmehie” (Jemes 4:17). Ọ dịghị mmehie ọ bụla ga-aba n’Eluigwe.

Ige Ntị Olu Chineke

Mgbe Nnọkọ-ikpé ahụ hụrụ na ha apụghị inye Ndị-ozi ahụ ahụhụ n’ụzọ ziri ezi, ha wee gbaa izù n’etiti onwe ha ka ha wee kpuchie ọnụ ha site n’ịbara ha mbá. Ha wee nye Pita na Jọn iwu ka ha ghara ikwu okwu ma-ọbụ izi ihe ma-ọlị n’aha Jsiọs -- iwu nke ana añaghị ntị. Onye nke Kraist na-eji obi ya dum ná-erube isi n’iwu ndi-isi na nke ndị Gọvment mgbe ha ná emegideghị iwu niile nke Chineke. Pita na Jọn zaghachiri nnọkọ-ikpé ahụ sị, “Kpenu ma ọ bụ ihe ziri ezi n’anya Chineke inu olu unu karia olu Chineke.” Onye ọ bụla nke ná-echè échìchè n’ụzọ ziri ezi ga-ekwu na ọ bụ ihe dịkarịrị óké mkpà irubere Chineke isi.

“Ihe ziri ezi n’anya Chineke.” Nke ahụ bụ olile-anya na ọchịchọ nke Onye Kraist ọ bụla. Onye-ozi Chineke nke oge gara aga kwuru sị: “Mgbe ahụ na ugbu a nke a kwesirị ịbụ iwu ahụ -- ime ihe ziri ezi. Ihe ziri ezi, ọ bụghị ihe aga-erịta úrù na ya; ihe ziri ezi, ọ bụghị ihe ná-enye obi-ụtọ; ihe ziri ezi, ọ bụghị nke ịchọ mma; ihe ziri ezi, ọ bụghị nke ná-eduba otuto nke ụwa. N’ịmata ihe ziri ezi anyị aghaghị inye onwe anyị, ọ bụghị akwụkwọ iwu nke mmadụ, kama n’iwu nsọ nke Chineke -- n’ihi na iwu nke Onye Kraist bụ ime ihe ziri ezi n’anya Chineke.”

N’ebe Ndị Òtù Ha Nọ

Nnọkọ-ikpé ahụ bakwara Pita na Jọn mbá ọzọ wee rapụ ha ka ha laa. Ngwa ngwa emere ka ha nwere onwe ha, ha bịakutere ndị-òtù ha ịkọrọ ha ihe niile ka ha ra bụ nke ndị nchụàjà na ndị-okenye sịrị harịị. Akụkọ ahụ mere ka ndị niile nụrụ ihe banyere ịbámbá ahụ were otù obi kpee ekpere n’otù ntabi-anya ahụ. Òtù Ndị-ozi ahụ ekpeghị ekpere maka ịbọ ọbọ n’arụ ndị ahụ ná-akpagbu ha, kama ha kpere ekpere ka enye ha nkwuwa okwu karịa iji kwue Okwu Chineke. Ha rịọrọ ka alụọ ọlụ ịrịba-ámá dị iche iche nke ọgwụgwọ nsọ ọzọ, “ka ewe mee kwa ihe ịrịba-ámá na ọlu ebube site n’aha onye nsọ ahụ nējere Gi ozi, bú Jisus.” Ndị òtù ahụ kpesiri ekpere ike; n’ihi na mgbe ha kpesịrị ekpere, “ewe me ka ebe ha nọ me nkpatu: ha nile we juputa na Mọ Nsọ, we were nkwuwa okwu nēkwu okwu Chineke.” Chineke rọọrọ ịzá ekpere a site n’ihe ịgbá-àmà pụtara ìhè, ma onye ọ bụla nke kpere ụdị ekpere a n’ezi-obi ga-amata n’owuwe anya na aga-aza ekpere ya. Chineke ga-agbá àmà n’obi ya. Chineke ga-enyere onye ahụ aka bụ onye ná-achọsi ike iji nkwuwa okwu kwue Okwu Chineke.

Okpukpé Chineke Dị Ọcha

“E, agēsogbu kwa ndi nile ndi nāchọ idi ndu n’uzọ isọpuru Chineke nime Kraist Jisus” (II Timọti 3:12). Onye Kraist amụtawo na o nweghị ike ijé ozi nke okpukpé ya otú o kwesịrị n’enweghị obubu-agha site n’aka ndị ụwa. Obubu-agha ahụ nwere ike ịbụ náánị okwu nke nleli ma-ọbụ nke iji mmadụ eme ihe-ọchị; o nwere ike ịbụ ịchụpụ mmadụ n’ọkwá; ma-ọbụ igbochi ibuli onye ahụ n’ọkwá dị elu; o nwere ike ịbịa n’ụdị mkpasu iwe ntà dị iche iche ma-ọbụ nke ibuso mmadụ agha n’ụzọ pụtara ìhè; ma otù ihe doro anya: ụwa agaghị ele ezi okpukpé nke Ndị Kraist anya ọma, n’ihi na ọ na-ama mkpụrụ-obi ndị ahụ ná-ahụ ya ikpé. Ụmụ Chineke niile ga-atụkwasị Nna ha nke bi n’Eluigwe obi idubiga ha ọnwụnwa ahụ n’ụzọ inye ha mmeri dị iche iche. Ọnwụnwa ahụ nwere ike iwere ọtụtụ ekpere: ma mgbe ọ gasịrị, onye nke Chineke ahụ ga-enwe ike kwuo Okwu Chineke ná nkwuwa okwu karịa. Ọ bụ kwa gịnị bara úrù karịa nke a?

Ihe ọzọ dị óké mkpà nke aga arịba-àmà: Ndị ná-eso ụzọ Kraist chètaara nnọkọ-ikpé ahụ ihe banyere Kraist Onwe ya. Mmadụ agaghị abụ ezi Onye Kraist ma ọ bụghị ma omume ya, okwu ọnụ ya na ihe niile ọ na-eme na-echètara ụwa ihe banyere Jisọs. “Dika o si echè échìchè na nkpuru-obi-ya, otú a ka ọ di” (Ilu 23:7). Ụfọdụ mmadụ na-ebi ndụ nke enweghị ezi nleru anya mgbe ha rapụrụ gburugburu ogige nke ụlọ ukwu Chineke, omume ha n’ebe ndị ụwa nọ jupụtara n’ịta-ụta; ma n’etiti ndị enyi ha bụ ndị nke Kraist ha na-egosi na ha nọ n’omimi nke ikpere Chineke. Nke ahụ abụghị ezi okpukpé. Okpukpé nke Ndị Kraist abụghị nke igosi ọtụtụ uwe, nke aga-ahụ náánị na mgbe na mgbe, mgbe kachasị mma. Ọ dị mfé ibi ndụ onye nke Kraist na Monde dịka ọ dị kwa n’ụbọchị Sọnde, aga na-enyocha ya mgbe niile. Ezigbo okpukpé nke Kraist aghaghị igosipụta Onye ahụ tọrọ Ntọ-ala ya na Onye ahụ nke ná-eme ka o guzo n’ebe ọ bụla na n’oge niile.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị mere eji tụba Pita na Jọn n’ụlọ mkpọrọ? Ònye tụbara ha n’ebe ahụ?
  2. Kpọọ aha ụfọdụ nime ndịkom ahụ ndị nọdụrụ ná nnọkọ-ikpé ahụ megide Pita na Jọn. Ànyị anụwo ihe banyere ndịkom ndịa n’oge gara aga?
  3. Gịnị bụ ajụjụ nke nnọkọ-ikpé a ji mere isi-okwu n’ikpé ha megide Ndị-ozi ahụ?
  4. Òlee otú Pita si zaa ajụjụ ahụ?
  5. Òlee ihe abụọ nke dị n’omume Pita na Jọn nke juru ndị òtù nnọkọ-ikpé ahụ anya?
  6. Òlee otú nnọkọ-ikpé ahụ si gbalịa igbochi Ndị-ozi ahụ ikwusa banyere Jisọs?
  7. Òlee ụzọ anyị ga-esi gosi nke a n’omume anyị dịka Ndị Kraist bụ iwu nke nrube-isi ahụ bụ nke Pita gosịrị nnọkọ-ikpé ahụ?
  8. Gịnị ka ndị ná-eso ụzọ Ya mere mgbe ha nụrụ ihe banyere ịbámbá nke nnọkọ-ikpé ahụ?
  9. Òlee ụzọ Chineke si mee ka ọzịzá Ya pụta ìhè?