Ọlu Ndi-ozi 4:32-37; 5:1-16.

Lesson 284 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ikpa àkù site n’ire okwu ugha bu otù nku-ume anēfesa n’ifufe; ndi nāchọ àkù ahu nāchọ ọnwụ (Ilu 21:6).
Cross References

I Nzukọ Kraist Mbụ ahụ

1. Ìgwè ndị ahụ kwere ekwe nwere otù obi na otù mkpụrụ-obi, Ọlu Ndi-ozi 4:32; Ndi Rom 15:5, 6; Ndi Filipai 1:27; 2:2; I Pita 3:8

2. Ha ji ike ukwu ná-agba àmà banyere mbiliten’ọnwụ nke Kraist, Ọlu Ndi-ozi 4:33; 1:8, 22

3. Ọtụtụ ụlọ na ala ka erere ewee ná-ekesara ha òkè, Ọlu Ndi-ozi 4:34-37; 2:45

II Iru abụọ nke Ananaias na Safaira

1. Ananaias na Safaira rere otù nime ihe ha nwere wee zoo ụfọdụ nime ọnụ-ahịa ya, Ọlu Ndi-ozi 5:1, 2

2. Pita baara Ananaias mbá ma Chineke zitere ikpé megide ya, Ọlu Ndi-ozi 5:3-6; Ọnu-ọgugu 30:2

3. Safaira kwu kwara okwu ụgha wee nata otù ụdị ikpé ahụ, Ọlu Ndi-ozi 5:7-11

4. Ihe ịrịba-ámá nke ná-eso ndị kwere ekwe pụtara ìhè n’etiti ha, ná-egosi na Chineke dịnyeere Nzukọ Kraist ahụ, Ọlu Ndi-ozi 5:12-16; Mak 16:17, 18

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Ịdị-N’otù

Arọ atọ na ọkàrà nke ijé-ozi Jisọs, tinyere ọnwụ Ya na mbiliten’ọnwụ Ya, ya na nwụkwasị nke Mmụọ Nsọ n’Ụbọchị Pentikọst, ewetaworị mgbanwe dị ebube n’obi na ná ndụ nke ndị ná-eso ụzọ Ya. Ha ghọtara na ha abụghị kwa nke onwe ha ọzọ, n’ihi na ewerewo ọnụ-ahịa zụta ha -- Ọbara nke Jisọs. Akpọwokwa harịị site n’ụzọ ndụ dị iche iche ịbụ ndị ná-eso ụzọ nke Onye Nazaret ahụ dị ume-ala n’obi. Ha anụworị ka Ọ na-ekwu okwu banyere Ala-eze ahụ nke gaje ịbịa ma ha enwewo kwa omume dị iche iche na nzube dị iche iche banyere nwụkwasị na ọchịchị nke Ala-eze ahụ. Ha ahụwo kwa Ya ka Ọ na-agwọ ndị-ọrịa, ná-akasị ndị ná-eru újú obi, zụọ ìgwè mmadụ ná nri, mee ndị nwụrụ anwụ ka ha si n’ọnwụ bilie, ma bakwara ndị ná-eme ihe ọjọọ mbá. Ha anụworị ka Ọ na-abara ndị iru-abụọ nke oge ha mbá ma too kwa nwanyị ahụ di ya nwụrụ anwụ bụ onye nyere ihe niile o nwere. Ha na Onyenwe ha anọworị ná nri-anyasị ikpe-azụ ahụ wee hụ kwa Ya ka arara Ya nye n’aka ndị ahụ nke chọrọ igbu Ya. Ha anụwokwarị mgbe Onyenwe ha na-ekpere ha ekpere ka ewee doo ha nsọ, ka ha wee nwee ịdị-n’otù ahụ nke apụrụ inweta náánị site n’Ọbara nke odudo-nsọ. Edowo kwa ha nsọ.

Eleghị anya ọ dịbeghị mgbe ịdị-n’otù dị otú a dị ná Nzukọ Kraist dịka ọ dịrịị n’oge ahụ. Ha niile nọ n’otù obi na n’otù mkpụrụ-obi. Ntụpọ niile nke ọchịchọ onwe-onye na anya ukwu ka ewepụworo ná ndụ ha. Ha bụ nnọọ ndị òtù nke ezi “nzukọ ahu di ebube, nēnwegh ntupọ, ma-ọbu iru ndọli, ma-ọbu ihe ọ bula n’ihe di otú a; … di nsọ buru kwa ihe anāpugh ita uta” (Ndi Efesọs 5:27). Ha bụ ndị òtù, nke na-egosi kwa anyị onyinyo nke, òtù ahụ dị omimi nke ndị kwere ekwe bụ ndị amaara dịka Nwunye ọhụụ nke Kraist, Nzukọ nke Ndị eburu ụzọ mụ, Ndị Ná-emeribiga ókè. Ha bụ ndị edoro nsọ zuru-ókè n’ezie, ha anatawokwarị onyinye àmàrà a dị ebube -- mwụsa mmiri nke Mmụọ Nsọ bụ nke ha natara n’Ụbọchị Pentikọst ahụ (Ọlu Ndi-ozi 2:1 cf. Ndi Hibru 2:11; na Jọn 17:21, 23).

Mbiliten’ọnwụ nke Kraist na olile-anya nke mbiliten’ọnwụ nke Nzukọ Kraist bụ isi-okwu nke àmà ha na nkwusa ha. Ọ bụ nkwusa nke mbiliten’ọnwụ ahụ kpaliri njikọta-ọnụ nke ike niile nke ọkụ ala-mmụọ ma mee kwa ka ndị ná-eso ụzọ Setan bulie onwe ha imegide Ndị-ozi ahụ na ndị ahụ ná-eso ụzọ Ya. Ma ha achọtaworị olile-anya ọhụụ nime Chineke, olile-anya nke mbiliten’ọnwụ, ma emere ka olile-anya a bụrụ olile-anya dị ndụ n’ihi na emere ka Kraist si na ndị nwụrụ anwụ bilie. “Ọ buru na emegh ka Kraist si n’ọnwu bilie, okwukwe-unu bu ihe-efu; unu nānọ ná nmehie nile unu ugbu a.” Pọl Onye-ozi kwusịrị ya ike mgbe nke a gasịrị, ma site na nke a ná-egosị anyị okwu ahụ nke ná-eguzosi ike na nguzosi ike nke Ndị-ozi ahụ nwere site ná mmalite.

Mgbe ha na-anụ ịbá mbá dị iche iche ma mata kwa ọtụtụ mkpagbu nke chere ha iru site n’ike nke ihe ọjọọ dị iche iche ejikọtara ọnụ, n’ihi nkwusa nke ndị ná-eso ụzọ Ya banyere olile-anya a dị óké mkpà na òzízí ná-enye ndụ nke Nzukọ Kraist ahụ, ndị ná-eso ụzọ Ya malitere ikpesi ekpere ike ka Chineke nye ha nkwuwa okwu iji kwusaa Okwu ahụ, na ka ewee mee kwa ihe ịrịba-àmà dị iche iche na ọlụ ebube ọzọ site n’aha Jisọs.

Ọñụ na obi-ụtọ juru obi ha; ma ịhụn’anya ahụ dị ọkụ nke ha nwere n’ebe Onyenwe ha nọ n’etiti ha onwe ha dị nime ha nke mere ka obi ha nke edowororị nsọ bụrụ ihe ejikọtara ọnụ karịa. Ajụrụ otù onye amam-ihe ajụjụ otù mgbe si: “Gịnị bụ enyi?” Ya wee zaghachị sị: “Ọ bụ mmadụ abụọ inwe otù mkpụrụobi.” Akwụkwọnsọ na-agwá anyị na “ọra ndị kwere na Kraist nwere otù obi na otù mkpụrụobi.” Ejikọtara ha n’otù ná nkekọ nke ịhụn’anya nke Ndị Kraist na nnwekọ ahụ nke náánị ndị edoro nsọ maara -- nke ndị ụwa ná-apụghị ịma.

Ha akpọghị ihe ha nwere nke ha, ọ dịghị kwa onye ọ bụla nime ha nke nọ ná mkpà. Ha nwekọrọ ihe niile n’otù. Ndị niile nwere ụlọ na ala rere ha weta ọnụ-ahịa ha nye Ndị-ozi ka ekesaa ya nye onye ọ bụla dịka mkpà ya si dị.

Agwara anyị na Joses, onye Ndị-ozi ahụ kpọrọ Banabas, nwere ala na o rekwara ya wee weta ego ya tọgbọ ya n’ụkwụ Ndị-ozi ahụ. Agwaghị anyị na ọ bụ Chineke chọrọ ya n’aka ya, ma o nyere Chineke ihe niile o nwere site n’obi ya niile. Anyị amaghị ọnụ-ahịa nke ala ahụ ruru. O nwere ike ịbụ ego dị ukwu ma-ọbụ na o nwere ike ịbụ ego dị ntakịrị. Ma ihe ọ bụla ọ bụ, enyere ha niile n’ihi Kraist na ọlụ Ya.

Ịrapụ Ịkwụ Ụgwọ ahụ

Ma anyị hụrụ na ọbụná nke àmàrà dị otú a ọ dị kwa mfé ịdapụ. Ananaias na Safaira nwunye ya, rere otù ihe onwunwe ha ma debere onwe ha ụfọdụ n’ọnụ-ahịa ya. Nke a bụ nnọọ ihe-átụ pụtara ìhè nke ụfọdụ ndị na-akpọ onwe ha Ndị Kraist ndị ná-arapụ inye Onyenwe anyị ihe kwesịrị inye Ya. Ụfọdụ na-ejide oge ha; ha enweghị ohere ọ bụla ma-ọlị maka ịlụ ọlụ Onyenwe anyị. Ndịa nwere ohere maka ihe ụtọ ha na ọlụ ha, ma ha na-elefuru òfùfè nke Chineke anya. Ha nwere ike nọdụ n’ụlọ ha ma rapụ ijé n’ụlọ Chineke ma ọ bụrụ na ọ dịrịghị ha mfé ijé ebe ahụ; ma-ọbụ na ọ bụrụ na ha nwere ike ọgwụgwụ ntà, ma-ọbụ asị na ha nwere ọlụ ntà ha ga-alụ, ha ga-enye ihe ngọpụ nke ga-eme ka ha ghara inye Chineke ịhụn’anya, oge, na ijéozi nke kwesịrị inye Ya.

Ndịọzọ ná-ejide talent ha dị iche iche kama ha ga-eji talent ha jeere Onyenwe anyị ozi, ha na-ejide ha kpamkpam ma-ọbụ nye akụkụ ụfọdụ nke dị ha mma, ná-akwụ náánị otù akụkụ nke ụgwọ ahụ.

Ikwu Okwu Ụgha

Ihe enwere ike ikwu na ọ bụ ihe jọgburu onwe ya n’akụkọ banyere Ananaias na Safaira abụghị na ha debere ụfọdụ n’ọnụ-ahịa ahụ, kama na ha kwuru okwu ụgha n’ihe ahụ ha mere. Ha chọrọ ka Ndị-ozi ahụ chee na ha na-enye ihe niile; ya mere, aghụghọ na iru abụọ bụ ihe ha bu n’obi. Ananaias na Safaira ga-akparịtaworị ụkà banyere ihe a wee tụlee kwa n’onwe ha, ná-agbaghị agụgọ, wee kpebie na ọ ga-adị mma idebe ụfọdụ n’ego ahụ iji chere mgbe ha ga-eme okenye. Ha ga-echèworị na oge ga-abịa mgbe nlekọta nke Chineke ná-agaghị adị kwa ìrè, mgbe ahụ ha ga-achọ ụfọdụ ego ha debere nke ha ga-eji lekọta onwe ha. Ha chọrọ ịgbaso ụzọ ndị ụwa n’ime ka ha bụrụ ndị amaara aha ha, ka ha ghara ịtụfu urù ọ bụla nke ụwa a ma ọ bụrụ na ha enyecha ihe niile, n’ihi nke a ha kpebiri idebe ụfọdụ n’ọnụ-ahịa ahụ ma mee kwa omume dịka aga-asị na ha nyere ihe niile. Ananaias na Safaira anọghị duu tụgharịa uche na ọ bụ Chineke ka ha na Ya na-eme ihe na ọ bụghị ha na ụmụ mmadụ. Ha chefuru na “ọlu ọ bula ka Chineke gēme ka ọ ba n’ikpé, ya na ihe ọ bula zoro ezo, ma-ọbu ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ” (Eklisiastis 12:14).

Pita asịghị, “Ananaias i gwawom okwu ụgha.” O kwuru sị, “n’ihi gini ka Setan mejuru obi-gi igwa Mọ Nsọ okwu ugha? … ọ bugh madu ka i gwara okwu-ugha, kama ọ bu Chineke.” Mgbe Ananaias nụrụ okwu ndịa o wee daa n’ala nwụọ ngwa ngwa, ụmụ-okorọbịa wee bupụ ya wee lie kwa ya.

Mgbe ihe ra ka oge àwà atọ gasịrị, nwunye ya batara, n’amataghị ihe ọ bụla banyere ihe mewororị di ya. Pita wee jụọ ya ma-ọbụ ihe ra otú a ka ha rere ala ahụ. Nzaghachi ya bụ “Éé, ihe ra otù a”. Pita wee bara ya mbá si, “Gini mere unu nwere otù olu inwa Mọ nke Onye-nwe-ayi?” N’otù mgbe ahụ o wee daa n’ụkwụ Pita nwụọ, ma ụmụ-okorọbịa ahụ ndị si n’òlìlì di ya na-alata bupụkwara ya wee lie ya.

Ikpé

N’ebe a ikpé nke Chineke sochitara ngwa ngwa na mberede. Mmehie ahụ adịghị ntà ma Onyenwe anyị jiri ahụhụ dị ukwu leta ha. Ikpé nwere ike ọ gaghị abịa ngwa ngwa mgbe niile dịka ọ dị na nke a na kwa n’ihe ndịọzọ yiri nke a, ma-ọbụ n’ebe ọzọ nke mere ụdị mmehie ọ bụla dị iche, ma ná-agbanyeghị nke a ikpé aghaghị ịbịa. Mmadụ nwere ike ịhụ ahụhụ ná ndụ a n’ihi mmehie ya, ma nke ahụ apụtaghị na ikpé ya ga-adị ntà nime ụwa nke gaje ịbịa. Ndị niile ikpé nke mmehie nke échègharịghị mara ka aga atụba n’ọkụ ala-mmụo ebighị-ebi.

N’oge a Nzukọ Kraist ka ná-amalite amalite, ma n’ihi ọdị-mma nke Nzukọ ahụ Onyenwe anyị gosịrị na obi adịghị Ya ụtọ n’ebe aghụghọ, nghọgbu na iru-abụọ dị. Asị na arapụrụ mmadụ abụọ ahụ mehiere ka ha dị ndụ, ndịọzọ ga-esoworị nzọ-ụkwụ ha, ná-echè na ogologo ntachị-obi nke Chineke ga-eme ka àmàrà baara ha ụba. Chineke maara na “N’ihi na emegh ihe ekpere n’ikpe megide ọlu ọjọ ọsọsọ, n’ihi nka obi umu madu juru eju n’ime ha ime ihe ọjọ” (Eklisiastis 8:11). Chineke mere ka ahụhụ nke Ananaias na Safaira bụrụ ihe-àtụ na Ọ bụ onye eziomume n’ikpé ikpé.

Ihe Ịribá-àmà Dị Iche iche Dị Ebube

Óké egwù wee dị n’etiti Nzukọ Kraist na n’etiti ndị niile nụrụ ihe banyere ọlụ niile nke Chineke na-alụ n’etiti ndị Ya. Ihe ngosi nke ikpé a mezuru ihe ebu n’obi zipu ya, n’ihi na ha nyebigara onwe ha ókè site n’obi ha; nke mere na asị na enwere ihe dịka iru-abụọ na aghụghọ nke dị n’etiti ha achụpụrụ ya n’ebe ha nọ n’otù mgbe ahụ. Ndị ahụ nwere mmetụta n’obi site n’ike na ume nke dị n’òzìzí nke Ndị-ozi ahụ, n’ịgbakwara eziokwu nke òzìzí ahụ àmà, Onyenwe anyị lụrụ ọtụtụ ọlụ-ebube pụrụ ichè site n’aka Ndị-ozi ahụ.

Akụkọ banyere ihe ndịa niile agbasaghị náánị ruo na Jerusalem, kama ruo kwa obodo niile gbara ya gburugburu. Ìgwè mmadụ bịara site n’ebe niile ná-akpọta ndị ha arụ ná-adịghị ike. Ha dị ọtụtụ nke mere na ha enweghị ike ịbịaru Pita nsọ n’ihi nke a ụfọdụ mmadụ wee tọgbọ ndị ha arụ ná-adịghị ike n’elu ihe ndina ha n’akụkụ ụzọ ka onyinyo Pita dakwasị ha mgbe ọ na-agafe. Akwụkwọnsọ gwara anyị na “ewe ma ka aru ha nile n’otù n’otù di ike.” Nke a bụ okwukwe nke ndị ahụ obi ha dị nrò, nke a bụ kwa ike nke Nzukọ Kraist ná mmalite ya. Ọ bụ obi ume-ala nke Ndị-ozi ahụ mere ka Mmụọ Nsọ gosipụta Onwe ya nime ijé ozi ha. Ọ dịghị mgbe ọ bụla ha nyara isi na ọ bụ n’ihi ike ma-ọbụ n’ihi n’ịdị-nsọ nke onwe ha ka ha ji ná-alụ ọlụ ebube ndịa, Ọ bụ site n’aha Jisọs na okwukwe nke ha nwere n’aha ahụ ka eji lụọ ọlụ nke ọgwụgwọ ahụ. Ka anyị “nāgbasi ngba ike n’ihi okwukwe ahu nke enyere ndị nsọ n’aka nání otù mgbe idebe” (Jud 3).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị bụ ọnọdụ ime mmụọ nke Nzukọ Kraist ahụ n’oge a?
  2. Gịnị ka Joses mere banyere ala ụfọdụ nke o nwere?
  3. Gịnị ka Ananaias na Safaira mere banyere ihe ụfọdụ ha nwere?
  4. Òlee otú Chineke si lee ihe ahụ Ananaias na Safaira mere anya?
  5. Gịnị ka ọnwụ mberede a lụpụtara ná Nzukọ Kraist na ná ndụ mmadụ niile?
  6. Gịnị na-eme anyị ma anyị kwuo okwu ụgha ma-ọbụ ghọọ aghụghọ taa?
  7. Òlee otú Onyenwe anyị si ná-alụ ọlụ ebube site n’ekpere Ndị-ozi ahụ?
  8. Mgbe ha ná-enweghị ike ịbịaru nso Ndị-ozi ahụ, Gịnị ka mmadụ ụfọdụ mere banyere ndị ha arụ ná-adịghị ike?