Ọlu Ndi-ozi 5:17-42.

Lesson 285 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Asi na ayi soro ya nwukọ ọnwụ, ayi gēso kwa Ya dikọ ndu: asi na ayi nēnwe ntachi obi, ayi gēso kwa Ya bukọ eze: asi na ayi gāgọnari Ya, Ya onwe Ya gāgọnari kwa ayi” (II Timọti 2:11, 12).
Cross References

I Ịtụba N’ụlọ Mkpọrọ na Nnapụta

1. Onye-isi nchụàjà na ndị Sadusi ji óké iwe tụba Ndị-ozi ahụ n’ụlọ mkpọrọ, Ọlu Ndi-ozi 5:17, 18

2. Otù Mmụo ozi meghere ọnụ-ụzọ niile nke ụlọ mkpọrọ ahụ wee nye Ndị-ozi ahụ iwu ka ha ná-ezi ihe n’Ụlọ ukwu Chineke, Ọlu Ndi-ozi 5:19, 20

II Nnọkọ-ikpé ahụ Ana-akpọ Sanhidrin

1. Nnọkọ-ikpé nke Sanhidrin zukọrọ ma ahụghị Ndị-ozi ahụ nime ụlọ mkpọrọ, Ọlu Ndi-ozi 5:21-23

2. Ndị-isi ọchịchị ahụ nọ n’óké mgbagwoju anya, Ọlu Ndi-ozi 5:24

3. Ahụrụ Ndị-ozi ahụ nime Ụlọ-ukwu Chineke, ma ndị ahụ ná-eje ozi kutere ha n’ejighị ihe-ike, Ọlu Ndi-ozi 5:26, 26

III Ọzịzá nke Ndị-ozi ahụ

1. Onye-isi nchụàjà ahụ jụrụ ihe kpatara Ndị-ozi ahụ ji nupu-isi n’iwu nke ndị nnọkọ-ikpé ahụ nyere, Ọlu Ndi-ozi 5:27, 28

2. Pita na Ndị-ozi ndịọzọ zaghachirị na ha kwenyeere Chineke karị mmadụ, Ọlu Ndi-ozi 5:29-32

3. Nkwupụta nke Ndị-ozi ahụ kpaliri iwe nke nnọkọ-ikpé Sanhidrin ahụ, Ọlu Ndi-ozi 5:33

4. Gamaliel dọrọ ha aka-ná-ntị ka ha kpachara anya eleghị-anya na òzízí nke Ndị-ozi ahụ bụ ihe sitere na Chineke n’ezie, Ọlu Ndi-ozi 5:34-39

5. Apịara Ndị-ozi ahu ihe, ma ha ñurịrị ọñụ ná-aga kwa n’iru ikwusa okwu Chineke, Ọlu Ndịozi 5:40-42.

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Ọnụma nke Mmadụ

Ndị-ozi ji ikwesị ntụkwasị-obi mezue mkwà ha kwere nke irube-isi nye Chineke na inupụ-isi n’iwu nke nnọkọ-ikpé ahụ nyere ka ha ghara ikwusa ma-ọbu izi ihe ọzọ n’aha Jisọs. Nzukọ ahụ wee ná-etó, ná-aba kwa ụba. Chineke mere ọtụtụ ihe ịrịba-àmà na ọlụ ebube dị iche iche site n’aka Ndị-ozi ahụ ime ka eziokwu nke ozi ahụ nke ha na-ekwusa guzosie ike. Ọ dị ka ọnọdụ ọgbakọ nke Ndị Kraist bụ n’ịbà Solomon nke dị n’Ụlọ-ukwu Chineke ahụ, bụ nke ná-eweta mgbagwoju anya na mwuta nye Onye-isi nchụàjà na ndị-isi niile nke Ụlọ-ukwu Chineke.

Mgbe Onye-isi nchụàjà ahụ ná-enweghị kwa ike ịnagide ịta-ụta nke akọn’uche ya ọzọ ma-ọbụ ekwòrò nke na-eripịa obi ya, o wee bilie ya na òtù ndị Sadusi ijide òtù Ndị-ozi ahụ na ịtụba kwa ha n’ụlọ mkpọrọ. Óké iwe were ndị ahụ ná-eje ozi nke mere na ha tụbara Ndị-ozi ahụ nime ụlọ mkpọrọ nke ọra mmadụ. Ebe ekwensu na-ezube ịla mkpụrụ-obi ụmụ mmadụ n’íyì, o ji Ndị Sadusi na onye-isi nchụàjà mere ngwa-ọlụ nke ime ka obi daa ndị-nkwusa nke eziokwu ahụ mbà, igbochi na ime ka ha kpuchie ọnụ ha; ma ọ gazirighị ya. Lee otú o si bụrụ ihe dị egwù -- na ekwensu ga-eji mmadụ ọ bụla mere ngwa-ọlụ ya! Ma onye ọ bụla nke ana-azọpụtabeghị aghaghị ịdabà n’ọnọdụ a.

Ndapụta nke Ihe Dị Iche iche Ana-atụghịanya Ha

Akwụkwọnsọ akọwaghị oge ra añaa nke Ndị-ozi ahụ nọdụrụ n’ụlọ mkpọrọ n’abalị ahụ; ma otù ihe dòrò anya: Onyenwe anyị arapụghị ma-ọbụ chéfué ha. Ná-agbaghị agụgọ ha kpere ekpere, ma tutu abalị ahụ agabiga, otù ihe nke áná-atụghị anya ya ma-ọlị mere. Otù mmụọ ozi nke Onyenwe anyị meghere ọnụ-ụzọ niile nke ụlọ mkpọrọ ahụ wee duru Ndị-ozi ahụ pụọ mee ka ha nwere onwe ha. Mgbe onye ikpe-azụ gafesịrị, ọnụ-ụzọ ahụ niile jiri nwayọ mechie kwa.

Ọ dịghị ụlọ mkpọrọ pụrụ ijide ndịkom a dị ike nke Chineke ogologo oge, n’ihi na ha bụ mkpụrụ nke ihe ọkụkụ ọhụụ nke Chineke -- Nzukọ Kraist ahụ. Ọ bụrụ na mkpụrụ ahụ efuo, itó-étó ya ga-efu kwa; n’ihi na Nzukọ Kraist esibeghị ike na mgbe ahụ iguzo n’enweghị òzízí otú o kwesịrị. Onye mmegide ahụ zubere n’obi ya igbochi ijé ozi niile nke Ndị-ozi ahụ na itinye aha ha n’ihe ihere site n’ịtụba ha n’ụlọ mkpọrọ; ma Chineke gbanwere àtụmàtụ ahụ, mee ya ka ọ bụrụ ụzọ ime ka ndị ahụ ná-ejere Ya ozi nwee amam-ihe na agbam-ume karịa. Ha amatawo ugbu a n’onwe ha eziokwu ahụ nke dị n’Akwụkwọnsọ. “Chineke-gi, onye gi-onwe-gi nēfè mgbe nile, Ya onwe-ya gādọputa gi” (Daniel 6:16). Mmụọ ozi ahụ wetara ozi nke sitere n’Onyenwe anyị na Ndị-ozi ahụ aghaghị ịlaghachị n’Ụlọ-ukwu Chineke ịgwa ndị ahụ “okwu nile nke ndu a.” Ana-apụtaghị Ndị-ozi ahụ ka ha wee zopụ onwe ha n’ebe ndị ná-akpagbu ha nọ. Ọlụ ha bụ nke Chineke, ọ dị kwa mkpà nke ukwu; ya mere Chineke nyere ha iwu ka ha malite kwa ọlụ ha n’ebe ahụ nke onye-iro mere ka ha kwụsị. Ná-agbaghị agụgọ ime ka ijéozi nke Ndị-ozi ahụ kwesịrị ntụkwasị-obi dị ọhụụ mere ka ha nwee agbam-ume.

Ọgụ ahụ Emeriri Ekwensu

Ekwensu esepụbeghị aka n’ilụso okpukpé nke Ndị Kraist ọgụ. Ọ na-agba mbọ igbochi ezi ọgan’iru nke ndị-agha Chineke ahụ nke kwesịrị ntụkwasị-obi. Ọ na-eji nrịanrịa na ihe mgbu dị iche iche n’ụzọ dị ukwu ịchọ igbochi ijéozi ahụ nke bara óké úrù nye Chineke. Ọzọ kwa ọtụtụ mgbe Chineke na-akagbu àtụmàtụ nke ekwensu ma mee ka otuto na ike si na ya pụta bụ ihe ahụ o chere na ọ ga-nwe mmeri na ya. Chineke adịghị enye ndị nke ya ike iji mezue ọchịchọ niile nke onwe ha; Ọ na-enye ha ike ka ewere ya jeere Ya ozi. Onye Kraist ga-elezi anya iji àmàrà niile nke Chineke jee ozi dịka àtụmàtụ Ya si dị.

Òtù Nnọkọ ikpé Pụrụ Iche

Nzukọ nke gbakọtara n’ụtụtụ echi ya pụrụ iche n’ọnụ-ọgụgụ. Onye-isi nchụàjà na ndị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya, nnọkọ-ikpé nke ndị Sanhidrin, na nzukọ ndị-okenye nke ndị Ju zukọrọ inụ ihe banyere ikpé a. Eleghị anya onye-isi nchụàjà ahụ chọrọ iji ọnụ-ọgụgụ nke ndị-ikpé a dị ọtụtụ mee ka Ndị-ozi ahụ hụ ihe a dịka óké ihe mgbochi nye ọgan’iru ha; ma ọbụ Chineke mere ka ọ dị otú a ka ọtụtụ ndị-isi nke ndị Ju site na nke a wee hụ ìhè nke Oziọma ahụ. Onye-isi nchụàjà nọdụrụ dịka onye-eze ikpé. O wee kpọkọta nnọkọ-ikpé ahụ n’otù mgbe ahụ o ziga n’ụlọ mkpọrọ ka akpọta ndị ahụ ana-ele anya na ha bụ ndị mmebi iwu. Mgbe ndị ahụ ná-eje ozi pụrụ, ná-agbaghị agụgọ onye-isi nchụàjà ahụ kọwaara ha n’ụzọ dị mkpirikpi ihe dị iche iche Ndị-ozi ahụ mere, ná-egosipụta kwa ihe kpatara eji nwee ọgbakọ dị otú a. Ná-agbaghị agụgọ, ọ na-ekwu ihe sitere n’ala-ala obi ya. Ndịkom ahụ ndị gaje ịpụta n’iru ha n’oge ná-adịghị anya bụ ndịkom jọgburu onwe ha -- ndị jọgburu onwe ha nye ọnọdụ nke onye-isi nchụàjà ahụ nke nọ n’oge ahụ. Ụfọdụ nime ha eledaworị iwu nke nnọkọ-ikpé ahụ nyere n’iru mmadụ niile anya, ọzọ ọ bụrụ na aga anapụta n’òfùfè nke Ụlọ-ukwu Chineke site ná mbibi, aghaghị imechi Òtù ahụ nke ndị okpukpé Kraist. Ndị-isi nke ndị òtù a gaje iguzo n’iru ha n’oge ná-adịghị anya. Nnọkọ-ikpé ahụ pụrụ ichepụta ụzọ ka mma ha ga-eso.

Chee échìchè ụdị ojuju-anya na egwù nke dị n’etiti ndị ọchịchị ahụ nke zukọtara n’otù, mgbe ndị ahụ ná-eje ozi latara wee kwuo na ahụghị kwa Ndị-ozi ahụ nime ụlọ mkpọrọ. Emechikwara ọnụ-ụzọ ahụ niile nkeọma (eleghị-anya ọ bụ náánị ndị-isi ji mkpisi ugodi ahụ niile), ndị nlekọta ma-ọbụ ndị nché nke ụlọ mkpọrọ ahụ nọ ná njikere n’ebe dị iche iche ha na-eche nche. Ndị-okenye ahụ ga-akọworị ọkọ n’isi n’óké mgbagwoju anya, ná-atụgharị n’obi ha ihe nke a ga-alụpụta.

Ịlụ-ọlụ Nime Ubi Vine ahụ

N’oge a Ndị-ozi ahụ nọ n’ijéozi nke Nna ha. N’isi ụtụtụ ngwa-ngwa mgbe ndị ahụ malitere izukọta n’Ụlọ-ukwu Chineke, ha malitere ikuziri ha ihe n’iru ọra mmadụ. Nkwuwa okwu nke ha nwere bụ ike nke sitere na Chineke; n’ihi na mgbe Chineke zipụrụ mmadụ, ekwesịghị ịtụ-egwù n’ihe ọ bụla nke nwere ike ịdapụta na ya ma ọ bụrụ na onye ahụ anọgide n’ikwesị ntụkwasị-obi n’ọkpụkpọ nke akpọrọ ya. Nkwuwa okwu nke sitere n’aka mmadụ ma-ọbụ nke mmadụ meere onwe ya na-akwụsị n’iru-ùjù; ma mgbe Jisọs nyere nkwuwa okwu, tinyere odudú nke Mmụọ Nsọ, ihe ọ ga-alụpụta bụ mmeri.

Otù onye kọọrọ nnọkọ-ikpé ahụ na Ndị-ozi ahụ nọ n’Ụlọ-ukwu Chineke, ya mere ha zigara ọchị-agha ahụ na ndị ahụ ná-eje ozi ka ha gaa kute ha ọsọsọ n’iru ọgbakọ ahụ. N’ihi egwù nke ndị mmadụ, ọchị-agha ahụ ejighị ikeike kute ndị nke Chineke ahụ wee guzo kwa ha n’iru nnọkọ-ikpé ahụ. Onye-isi nchụàjà ahụ wee kwuo n’iru ha iwu ahụ nke ha dara. “Ayi nyesiri unu iwu ike ka unu ghara izi ihe n’aha nke a: ma le, unu ewerewo ozizi unu mejue Jerusalem, unu nēzube kwa iweta ọbara Nwoke a tụkwasị ayị n’isi.” Rịba-àmà otú nwoke ahụ ji rapụ ịkpọ aha Jisọs. Amam-ikpé dị n’aha ahụ, karịsịa nye onye-isi nchụàjà ahụ, n’ihi na ọ bụ otù onye nime ndị-isi ahụ nke kwagidere ịkpọgide Ya n’obe. Otù mgbe ya na ndị òtù ya kwusiri ike sị “ọbara Ya di ayi n’isi di kwa n’isi umu ayi;” ma ugbu a ọ dị ka ha malitere ịghọta ihe ọnụ-ahịa nke ọbara Jisọs bụ. Ọ bụ náánị onye-isi nchụàjà ahụ ka aha Jisọs na-ama ikpé? Ọ bụ náánị ya kpọgidere Ọkpara Chineke n’obe? É-è! Mmehie niile nke ụwa ka ebokwasịrị Jisọs ahụ dị ngọzi mgbe akpọgburu Ya n’obe. Mmehie gị na mmehiem nyere aka ịkpọgide Ya n’obe ahụ; ma ọ bụrụ na anyị anọgide nime mmehie, anyị bụ ndị ikpé Ọbara Jisọs mara -- ndị-ikpé mara n’ezie!

Ndị-ozi ahụ nke Ná-alụsị Ọlụ ike

Eleghị anya onye-isi nchụàjà ahụ jiri ihe ntà kwufee okwu ahụ otú o siri mee, otú ọ dị ọ na-egosipụta ịlụsi ọlụ ike nke Ndị-ozi ahụ iji mee ka Oziọma ahụ gbasaa. “Unu ewerewo ozizi unu meju Jerusalem.” Ọ ga-abụworị ihe na-ewuli obi Ndị-ozi ahụ elu mgbe ha na-ahụ ọtụtụ mmadụ ka ha na-enubata ịmụta Oziọma ahụ n’òzùzù òkè ya. Mgbe agwọrọ nwoke ahụ nke ná-anọ n’Ọnụ-ụzọ àmà Ọma ahụ, Onyenwe anyị tụkwasịịrị Nzukọ Kraist puku mmadụ ise (5,000). Site na mgbe ahụ rue ugbu a ịba ụba nke ọnụ-ọgụgụ ahụ na-abụ ihe dị ebube; n’ihi na onye ahụ déré ihe banyere akụkọ ahụ dị nsọ na-akọwa, “ewe tukwasi kari nye Onye-nwe-ayi ndi kwere na Ya, ìgwè madu ma ndikom ma ndinyom” (Ọlu Ndi-ozi 5:14).

Gịnị ga-eme ka Onyenwe anyị ghara ịtụkwasịrị òtù ndị ahụ kwere ekwe mmadụ? Ha niile nọ n’otù obi na n’otù mkpụrụ-obi. Mgbe mkpagbu biliri, ihe egwù dị kwa n’ụzọ, ha kpere ekpere ruo mgbe Mmụọ Nsọ gbara-àmà n’ekpere ha, ewee mee ka ebe ahụ ha zukọrọ mee mkpatụ. Ọ dịghị ọchịchọ nke onwe-onye dị n’etiti ha. Ha na-añurị ọñụ mgbe ha na-ahụ ahụhụ, na-agụ ya n’ihe ọñụ ịhụ ahụhụ nke ihere n’ihi aha Jisọs. Ọ bụrụ na Nzukọ Kraist nwere ụdị ntozu òkè ndịa n’ụbọchị taa, ike na nsọpụrụ ya agaghị enwe ọgwụgwụ. Ekele dịrị Chineke n’ihe niile nke O nyeworo, ma anyị agaghị akwụsị n’ebe a “Ọ dim mkpà idegara unu akwukwọ nāriọ unu ka unu nāgbasi mgba ike n’ihi okwukwe ahu nke enyere ndi nsọ n’aka nání otù mgbe idebe” (Jud 3).

Okwu Chineke nke dị Nkọ

Mgbe Pita na Ndị-ozi ndịọzọ na-enyeghachị ọzịzá n’ebubo ahụ nke nnọkọ-ikpé ahụ boro ha, Mmụọ Nsọ mejupụta kwara ọnụ ha ọzọ site n’ọzịzá nke jupụtara n’amam-ihe. Eziokwu ahụ gbara n’obi ndị ahụ na-ege ntị dịka àkụ. Ozi ahụ bụ maka nzọpụta, ma asị na ha rọọrọ ikwenye n’òkù nke Oziọma ahụ, ma ha rọọrọ ịnọgide na nganga ha na ịlụso Chineke ọgụ. Okwu ahụ nke ga-abụworo harịị “isìsì nke sitere ná ndu we duba ná ndu,” kama nke ahụ ọ ghọrọ “isìsì nke sitere n’ọnwụ duba n’ọnwu” nye ha. Ihe ha rọọrọ bụ dịka ọchịchọ obi ha si dị. N’ezie Chineke nyere ha ohere ọzọ ichègharị.

Ọnụma nke nnọkọ-ikpé ahụ dị ukwu nke mere na ha gbara ìzù igbu Ndị-ozi ahụ. Otú ọ dị, Chineke zitere nnapụta. Otù onye nime ndị ahụ, onye Farisii nke aha ya bụ Gameliel, gwara ndị-ikpé ahụ na ndịkom ndịa nwere ike ịbụ ndị sitere na Chineke. Ọ bụrụ na òzízí nke a sitere n’aka mmadụ, ọ ga-anwụ n’onwe ya; ma ọ bụrụ na o sitere n’aka Chineke, ọ dịghị ihe ọ bụla nke ndị Sanhidrin ma-ọbụ onye ọ bụla pụrụ ime iji gbochie Okwu Chineke. Nnọkọ-ikpé ahụ nabatara okwu Gameliel; iwe ha wee dajụọ nke ntà. Apịara Ndị-ozi ahụ ihe ma nye kwa ha iwu ka ha ghara ikwu okwu n’aha Jisọs ọzọ; mgbe ahụ arapụrụ ha ka ha laa. “Ha siri n’iru nnọkọ-ikpé ahụ laa, nāñụrị ọñụ na aguru ha na ndi kwesiri ka emee ha ihe ihere n’ihi Aha ahu.” Hà mere dịka nnọkọ-ikpé ahụ gwara ha ka ha mee? Ha emeghị ya ọbụná otù mgbe. Ha na-anọ nime Ụlọ-ukwu Chineke ụbọchị niile -- bụ ebe pụtara ìhè nkeọma karịsịa na Jerusalem wee ná-akụzi ná-ekwusa kwa ihe banyere Jisọs Kraist n’ụlọ niile.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị mere onye-isi nchụàjà ahụ na ndị Sadusii ji jupụta n’iwe?
  2. Otù mmụọ ozi napụtara Ndị-ozi ahụ site n’ụlọ mkpọrọ. Ihe dị otú a ò meworị na mbụ?
  3. Gịnị mere eji napụta Ndị-ozi ahụ site n’ụlọ mkpọrọ? Ha ka ga-eguzo n’iru nnọkọ-ikpé ahụ echi.
  4. Gịnị bụ omume nnọkọ-ikpé ahụ mere mgbe ha ná-apụghị ịchọta Ndị-ozi ahụ nime ụlọ mkpọrọ?
  5. Òlee ebe achọtara Ndị-ozi ahụ?
  6. Gịnị bụ ebubo nke nnọkọikpé ahụ megide Ndịozi ahụ?
  7. Gịnị bụ ọzịzá Pita?
  8. Òlee ụzọ Chineke si napụta Ndị-ozi ahụ site n’aka nnọkọ-ikpé ahụ?
  9. Òlee otú Ndị-ozi ahụ si nara ahụhụ ha?