I Ndi Eze 11:9-43

Lesson 286 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ekwela ka ebere na ezi-okwu rapu gi: ke ha n’olu-gi; de ha n’elu mbadamba nkume, bú obi-gi” (Ilu 3:3).
Cross References

I Ọdịda Nke Solomon

1. Chineke were iwe megide Solomon, I Ndi Eze 11:9; Ndi Rom 1:18; II Ndi Eze 22:13

2. Mmebi nke ọgbụgba-ndụ Ya na Chineke bụ ihe kpatara iwe Chineke, I Ndi Eze 11:10, 11, 33; I Ndi Eze 3:14; 9:2-9; Deuteronomi 17:14-20

3. Egosịrị ebere n’ihi David, I Ndi Eze 11:12, 13; II Samuel 7:11-29

II Ntụfu Nke Udo Na Ọnwụ Nke Solomon

1. Chineke kpaliri Hedad, I Ndi Eze 11:14-22

2. Chineke kpali kwara onye-iro ọzọ, Rezon, I Ndi Eze 11:23-25

3. Jeroboam weliri aka ya megide Solomon, I Ndi Eze 11:26-36

4. Chineke chere Jeroboam ọgbụgba-ndụ n’iru, I Ndi Eze 11:37-39

5. Solomon chọrọ igbu Jeroboam, I Ndi Eze 11:40

6. Solomon wee nwụọ, I Ndi Eze 11:41-43

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Nnupụ-isi

N’oge dị anya tutu ụbọchị niile nke Solomon ọbụná tutu Ụmụ Israel eruo n’Ala ahụ Ekwere ná Mkwà, Chineke sitere n’aka Moses nye ndụm-ọdụ banyere ndị-eze ha. Chineke kwuru banyere eze sị: “Nání na ọ gagh-eme ka inyinya bara ya uba, … ọ gagh eme kwa ka ndinyom bara ya uba, ka obi-ya ghara iwezuga onwe-ya: ọ gagh eme ka ọla-ọcha na ọla-edo bara ya uba nke uku” (Deuteronomi 17:16, 17). Solomom na mgbe agadi ya lefuuru ndụm-ọdụ ndịa pụtara ìhè anya nke sitere n’Okwu Chineke nke mere na Chineke were iwe megide ya.

Dịka àtụmàtụ nke Chineke si dị, eze Israel ọ bụla ga-eji aka ya dee iwu a, ma ná-agụ kwa ya kwa ụbọchị, “Ka obi-ya we ghara idi elu karia umu-nne-ya ka ọ ghara kwa isi n’ihe enyere n’iwu wezuga onwe-ya, n’aka-nri, ma-ọbu n’aka-ekpe: ka o we me ka ubọchi-ya di anya n’ala-eze-ya, ya onwe ya na umu ya n’etiti Israel” (Deuteronomi 17:20). Ọ bụghị náánị na Solomon nwere okwu nke Iwu a, kama Chineke egosiwo ya Onwe Ya ugbò abụọ ná mkpughe pụrụ ichè ma nye kwa ya ndụm-ọdụ ka o debe ihe niile enyere n’iwu.

Ọ bụghị n’Amaghị-amá

Ọ bụ ihe doro anya na Solomon apụghị ikwu na ya amaghị ihe banyere iwu Chineke. Ndụm-ọdụ ahụ niile dị mfé, Solomon bụ kwa onye nwere amam-ihe, ma ọ rapụrụ isoro ndụm-ọdụ niile nke dị n’Iwu Chineke ma-ọbụ iji amam-ihe nke Chineke nyere ya mee ihe. Otù aka ahụ kwa ndịkom na ndịnyom enweghị ihe ngọpụ ọ bụla n’ụbọchị taa n’ileli Okwu Chineke. Baịbụl eruwo mbà niile, Mmụọ Chineke kwesị kwara ntụkwasị-obi nye mkpụrụobi ọ bụla, ma ná-agbanyeghị nke a ọtụtụ mmadụ adịghị eje ijè n’ụzọ niile nke Chineke. Ụfọdụ nime ha pụrụ ịsị na ha amaghị ihe banyere ya ma ha niile enweghị ihe ngọpụ. Ọbụná ma asị na onye ahụ enwebeghị ohere mgbe ọ bụla ịgụ Baịbụl, ọ bụghị nke a ga-eme ya ka ọ ghara ịma ihe banyere Chineke “N’ihi na ihe apuru imata banyere Chineke nāputa ìhè nime ha; n’ihi na Chineke mere ka ọ putara ha ìhè, N’ihi na ihe-Ya anya nāhugh site n’òkìkè uwa ka anāhu nke-ọma, ebe anaghọta ha site n’ihe nile ekèrè èkè bú ike ebigh-ebi Ya n’udi-Chineke-Ya; ka ha ghara inwe ngọpu” (Ndi Rom 1:19, 20).

Mkpughe niile pụrụ ichè nke ana-enweta site na nrọ dị iche iche -- dịka ndị ahụ nke Solomon nwere -- n’ezie ha bụ ihe dị ebube, ma ọ bụghị Ndị Kraist niile ka ana-egosi ya. Amam-ihe ahụ dị ukwuu nke Solomon nwere sitere na Chineke; ma ịmata ihe banyere ụzọ nke nzọpụta achọghị óké amam-ihe, n’ihi na ọ bụ ihe doro anya nkeọma na ọbụná onye nzuzu pụrụ ịghọta ya. Ọ bụghị ihe iju-anya na Chineke wesara Solomon iwe, n’ihi na ya onwe ya anatawo mkpughe niile ahụ pụrụ iche; enyewokwa ya amam-ihe karị nke mmadụ ọ bụla nwere; ọ natakwara ọtụtụ ngọzi dị ebube site n’aka Chineke. Agụrụ iwe ahụ ewesara ya n’ihe ziri ezi n’ihi na Solomon echìgharịwo megide Chineke, n’ịkpachara anya nupụ-isi n’iwu Ya. Anyị nọ n’ọgbọ nke amam-ihe bara ụba. Chineke ewerewo kwa àkụn’ụba pụrụ ichè gọzie Nigeria n’ùjù, ma obi nke ọtụtụ mmadụ n’ụbọchị taa ebuliwo onwe ha elu megide Chineke.

Obi Ume-ala

Obi ume-ala bụ omume dị ụkọ. Solomon nwere obi ume-ala mgbe ọ dị n’okorọbịa ma mkwupụta nke egbughere ọnụ ya na mgbe ahụ bụ “Mu onwem bụ nwatakiri: amaghm ipu apu na ibata abata” (I Ndi Eze 3:7). Solomon matakwara úrù nke obi ume-ala bara n’ihi na okwu nke ya onwe ya kwuru bụ: “Ọkpukpu-ọlu nke obi-ume-ala na egwù JEHOVA bu àkù, na nsọpuru, na ndu” (Ilu 22:4), ọ sịrị, “Ọ di nma inwe mọ di ala n’etiti ndi ewedara n’ala, kari isoro ndi-npako kesa ihe akwatara n’agha” (Ilu 16:19). Ọ matara na “mpako madu gēme ka ọ di ala ma onye mọ-ya di ala nējidesi nsọpuru ike” (Ilu 29:23). Ekwuwo ya na okwukwe na-enweta ihe kachasị ukwuu ịhụn’anya na-eme ihe ukwu ma obi ume-ala na-edebe ihe kachasị ukwuu. Ka ewee nwee ike idebe ngọzi niile nke Chineke, ọ bụ ihe dị mkpà “iji obi-ume-ala soro Chineke-gi nēje ijè” (Maika 6:8). Anyị na-ebi n’ọgwụgwụ oge mgbe ụmụ mmadụ bụ “ndi-isi-ike, ndi afuliworo elu, (na) ndi nāhu ihe-ụtọ n’anya kama ihu Chineke n’anya” (II Timọti 3:4).

Ikpere Arụsị na Ikwenyere Ụgha

Mgbe Solomon wuru ebe ịchụàjà dị iche iche nye Ashtoret, nye kwa Kermosh nye kwa Molek chi niile nke ndị ná-amaghị Chineke, ná-agbaghị agụgọ ọ chọrọ ụzọ ịgọpụ onwe ya site n’ikwu na ya na-eme ya iji mee ka obi tọọ ndị nwunye ya ụtọ na iji weta ezi mmekọrịta n’etiti ya na ndị ala-ọzọ ndị nọ n’okpuru ya ndị na-abịa kwa n’ogige ya. Eleghị anya ọ ga-abụ kwa échìchè dị otú a ka ndị-isi nke òtù mba ụwa nwere (United Nations Organization) mgbe ha jụrụ imeghe nzukọ ha site n’ekpere n’ihi egwù ka ha ghara itinye mba ndị ahụ n’ekweghị na Chineke n’ọgba-aghara. Mmụọ dị otú a bụ nke ikwenye n’ihe ọjọọ bụ ihe-arụ n’anya Chineke. “JEHOVA we wesa Solomon iwe.” Ka ihere dịkwasị nwoke maọbụ nwanyị ahụ onye ga-esi n’eziokwu wezuga onwe ya n’ihi ime ka obi tọọ nwunye, ma-ọbụ di ma-ọbụ onye ọ bụla ọzọ ụtọ! Ọ bụ ihe ihere nye mba ahụ ndị okwu mgbakwasị ụkwụ ha bụ “Na Chineke ka ayi tukwasiri obi,” ịrapụ ịsọpụrụ Chineke n’ihi na onye ná-ekweghị na Chineke nọ n’ebe ahụ. Ka ndị niile kwere na Chineke jide okwukwe ha dịka Elaija mere, onye sịrị: “Ọ buru na JEHOVA bu Chineke, jesonu Ya” (I Ndi Eze 18:21).

Àkụ-na-ụba

“Unu atukwasila obi na nmegbu, ọzọ, n’ipunara madu ihe unu aghọla ihe-efu: mgbe àkụ nābakari ụba, unu atukwasila ya obi” (Abù Ọma 62:10). Solomon nwetara àkụnaụba ya dịka ngọzi nke sitere n’aka Chineke, ma ọ tụkwasịrị obi ya n’àkụnaụba ya. (Lee Ndi Eze 3:13). Ndị Israel kpesarà Rehoboam na Solomon emewo ka yoke ha dị arọ. Site na nke a ọ dị ka Solomom na-ara ego ụtụ dị ukwu karịa otú o kwesịrị iji lekọta ala-eze ahụ. “Onye ọ bula nke kwesịrị ntukwasi-obi gēnwe ọtutu ngọzi: ma onye nānukpọ onwe-ya ibu ọgaranya, agagh-agu ya n’onye nēmegh ihe ọjọ” (Ilu 28:20). Ebe ọ bụ Chineke na-enye ike eji enweta àkụ-na-ụba, ụfọdụ na-echè na “nsọpụrụ-Chineke bụ ụzọ irita úrù;” ma adọrọ anyị aka-ná-ntị banyere échìchè dị otú a, ma ná-agwà anyị sị: “Ma nsọpuru Chineke ya na inwezu ihe nile di nkpà, bu uzọ irita urù nke uku. N’ihi na ayi ewetagh ihe ọ bula n’uwa, ọ bu kwa n’ihi na ayi apugh iwere ihe ọ bula pua nime-ya. Ma ebe ayi nwere ihe-oriri na ihe igbokwasi n’aru afọ gēju ayi n’ihe ndia. Ma ndi nēzube ọgaranya nādabà n’ọnwunwa na ọnyà na ọtutu agu ihe ọjọ nke uche nādigh nime ha nke nēmeru kwa aru, bú ihe nēme ka madu mikpù emikpù nime nbibi na ila-n’iyi. N’ihi na ihu ego n’anya bu nkpọrọgwu nke ihe ọjọ nile di iche iche. Nke ufọdụ nāgbasosi ike ewe duhie ha n’okwukwe ayi ha were kwa ọtutu ihe-ngbu dupue onwe-ha” (I Timọti 6:5-10).

Ndị Mmegide

“JEHOVA we me ka onye-nmegide biliere Solomon” (I Ndi Eze 11:14). Chineke ewuworo Solomon ala-eze dị ukwu ma mee kwa ya onye-ukwu, ma onye kụworo mkpụrụ nwere ike iropụ mkpụrụ ahụ nke ọ kwụworo. Chineke nyere Solomon udo, ma ọ pụkwara ịnapụ ya udo ahụ. Samuel gwara Sọl “Ebe JEHOVA wezugaworo onwe-ya n’aru gi, we ghọ onye-iro-gi” (I Samuel 28:16). Ndị-iro anyị n’ụwa pụrụ ime anyị ọtụtụ ihe ọjọọ ma lee otú o si dị njọ karị bụ inwe onye ahụ dịka onye-iro bụ Onye “nwere ike itubà n’ọku ala-mọ mgbe O gbusiri” (Luk 12:5).

Onye mmegide mbụ nke Solomon nwere bụ Hedad onye Edom; onye nke abụọ bụ Rezon onye Damaskọs; onye nke atọ bụ Jeroboam nke na-achị ụlọ Josef. Ndị-iro ya mmadụ abụọ ahụ eburu ụzọ kpọọ aha sitere n’obodo ọzọ, ma onye nke ikpe-azụ sitere n’ala-eze ahụ n’onwe ya. Chineke ekweworị Jeroboam mkwà inye ya ebo iri mgbe Solomon nwụsịrị, ma ọ dị ka Jeroboam chọrọ ime ihe a n’ike nke onwe ya n’oge ọchịchị nke Solomon. Ime ihe ọ bụla mgbe oge Chineke ná-erubeghị adịghị eweta ọgan’iru. Asị na Jeroboam sogidere iwu niile nke Chineke, ụlọ ya ga-adịgideworị, ala-eze ya ga-adịwokwarị dịka nke Devid.

Amam-ihe

Solomon nwere amam-ihe dị ukwu, ma o wezugara onwe ya n’ebe Chineke nọ. Jeroboam bụ nwoke dị ike, onye ná-alụsị ọlụ nke iji ígwè akpụ ihe ike ma o geghị ntị n’iwu niile nke Chineke “Chineke emegh ka amam-ihe uwa buru ihe-nzuzu?” “Ọ digh ọtutu ndi mara ihe dika anụ-arụ si mara ihe, ọ digh ọtutu ndi ike, ọ digh ọtutu ndi amazuru aha-ha, ka akpọrọ” (I Ndi Kọrint 1:20, 26). Úrù gịnị ka amam-ihe ụwa a bara ma ọ bụrụ na o dubaghị anyị ná ndụ ebighị-ebi? ọ ka mma ka akpọ mmadụ “onye nzuzu” o we baa n’Eluigwe n’ikpe-azụ ndụ ya karịa ichè na mmadụ bụ onye ukwu n’ikpe-azụ o wee baa n’ọkụ ala-mmụọ.

Solomon nyochara ihe niile dị n’okpuru anyanwụ. Ọ nwara amam-ihe; ọ nwara àkụ-na-ụba; ọ nwara oriri na ọñụñụ, abụ, na manya; O tinye kwara onwe ya n’omume jọgburu onwe ya nke ikpere arụsị dị iche iche. Ma ọ chịkọtara ihe ndịa niile ọnụ kpọọ ha “ihe-efu na ichọ ijide ifufe” (Eklisisatis 1:14), o wee bịaruo ná nchịkọta nke ihe niile n’ụzọ dị ebube. O wee sị: “ka ayi nuru nkwubi okwu a nile: tua egwu Chineke, debe kwa ihe nile O nyere n’iwu: n’ihi na nka bu ọlụ madu nile” (Eklisisatis 12:13). Ka anyị nwee olile-anya na Solomon ritere úrù ná mkpebi ikpe-azụ na ma chègharịa kwa tutu ụbọchị o “so nna-ya ha dina n’ọnwụ, elie ya n’obodo Devid, bú nna-ya” (I Ndi Eze 11:43)

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị mere Chineke jiri wesa Solomon iwe?
  2. Ò dị mgbe Devid ma-ọbụ Sọl chigharịkwuru ikpere arụsị?
  3. Gịnị mere Hedad onye Edom jiri nupụ-isi megide Solomon?
  4. Gịnị mere Chineke jiri nọọ ọdụ n’ikpé Solomon ikpé
  5. Òlee mba dị iche nke obodo ndị ahụ biliri megide Solomon nọchiri anya ha?
  6. Gịnị bụ ọnọdụ Jeroboam tutu ọ gbalaga n’Ijipt?
  7. Gịnị bụ ụdị mkwà abụọ ahụ nke Chineke kwere Jeroboam?
  8. Gịnị bụ ihe dị iche iche nke ụlọ Jeroboam ga-eme ma ọ bụrụ na ọ na-achọ ịnọgide n’inwe ike?
  9. Ị na-echè na ọ bụ ihe dị ka arọ ole ka Solomon dị tutu ọ nwụọ?
  10. Ị na-echè na Solomon ghọrọ mkpụrụ úrù nke dị na mkwà nke Chineke kwere ya na I Ndi Eze 3:14?