I Ndi Eze 12:33; 14:21-23; II Ihe Emere 12:1-16

Lesson 287 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Uzọ nke onye gbagọrọ agbagọ n’uche-ya ziri ezi n’anya ya onwe-ya: Ma onye nēge ntị ndum-ọdụ ka onye mara ihe bu” (Ilu 12:15).
Cross References

I Mbili nke Imegide Ọchịchị ahụ na Shekem

1. Ebo niile nke ugwu rịọrọ ka ewebilata ego ụtụ-isi ha, I Ndi Eze 12:1-5

2. Eze chọrọ ndụm-ọdụ nke ụmụ okorọbịa na ndị okenye, I Ndi Eze 12:6-11; Ilu 1:25-33

3. Eze zaghachiri site na ndụm-ọdụ nke ụmụ okorọbịa nyere, I Ndi Eze 12:12-15

4. Ebo niile nke ugwu wee nupụ-isi megide ọchịchị ahụ, I Ndi Eze 12:16-19

II Ala-eze Ugwu nke Israel

1. Emere Jeroboam eze, I Ndi Eze 12:20, 25

2. O wee tụpụta ụdị okpukpé ga-adịrị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya mma, I Ndi Eze 12:26-33; Ndi Galetia 1:6

III Ala-eze Ndịda nke Juda

1. Rehoboam tụrụ àtụmàtụ ibu-agha, ma o rubere isi n’ịdọ-aka-ná-ntị nke Chineke nke sịrị ya ebula, I Ndi Eze 14:21-24

2. Rehoboam dubara Juda baa n’omimi nke ikpere arụsị, I Ndi Eze 14:21-23; II Ihe Emere 12:1

3. Chineke jiri Shaishak, eze Ijipt kwara ngwa-ọlụ inye ha ahụhụ, II Ihe Emere 12:2-5; Ndi Ikpe 2:14; 3:7, 8, 12

4. Chineke gosịrị ebere mgbe Rehoboam wedatara onwe ya ala, II Ihe Emere 12:6-12; I Ndi Eze 21:29

5. Ọchịchị Rehoboam ka achịkọtara n’ikpe-azụ dịka nke jọgburu onwe ya, II Ihe-Emere 12:13-16

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Ihe Nlere anya Ọjọọ

“Mu onwem kpọ-kwa-ra ndọgbum nile asì, bú nke mu onwem nādọgbu onwem n’ọlu n’okpuru anyanwu: n’ihi na m’gārapuru ya madu nke gānọ mgbe m’gasiri. Ma ònye mara ma ọ gābu onye mara ihe ma-ọbụ onye-nzuzu?” (Eklisisatis 2:18, 19). N’ezie ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ka Solomon chee échìchè n’ihe banyere omume nke nwa ya nwoke, ma ọ ga-akaworị mma ma asị na ọ rapụụrụ ya ihe nlere anya ịgbaso bụ nke ịsọpụrụ Chineke. Nrapụ nke Solomon rapụrụ Chineke na mgbe okenye ya bụ ihe kwesịrị imere ebere. Ọ bụ ihe ana-apụghị ikwenye na onye ahụ bụ onye Onyenwe anyị gọziworo karị ndị-eze niile ọzọ ga-arapụ Chineke wee laghachị n’ikpere arụsị. Lee ihe ndụ ya lụpụtara ná ndụ nwa ya nwoke na kwa ná ndụ ndịọzọ! Òlee otú ọ ga-esi kuziere nwa ya nwoke ihe banyere ịmara ezi Chineke, ebe omume ya na ndụ ya na-egosi ihe dị iche? Ụfọdụ nne na nna n’ụbọchị taa na-achọ ka ụmụ ha ná-eso ụzọ ahụ nke ha onwe ha rapụworo. Lee otú ọ ga-esi bụrụ ihe amam-ihe dị nime ya ma asị na ha ga-edebere ụmụ ha ezi ihe nlere anya!

Ikpé Ekpebiri Ọsọsọ

Ngwa ngwa Solomon nwụrụ ndị Israel wee zigara Jeroboam ozi ka o si n’Ijipt lata. Onyenwe anyị ekwewo ya mkwà ebo iri, ndị ahụ niile matakwara nke a wee chọọ ya. Ọ bụ site n’aka ya ka ebo iri nke ugwu Israel jiri chọọ ka ha na Rehoboam kwuzie maka ime ka ego ụtụ ha dị mfé.

Chineke enyewo Solomon amam-ihe dị ukwu, ma nwa nwoke Solomon ka anapụrụ ezi ikpé n’oge a. Onye ahụ nke na-enye ezi onyinye na ihe niile zuru òkè nwe kwara ike iweghachị aka Ya mgbe ikpé Ya kabiri otú ahụ. Onye ahụ nke nyere Nebukadneza ala-eze na ịdị-elu na otuto na nsọpụrụ wedara ya ala wee napụ kwa ya uche ya. Ndị na-eje ijè ná mpako ka Ọ pụrụ iweda n’ala. “Eze we ghara ige ndị Israel ntị; n’ihi na nchigharị nke a sitere n’aka JEHOVA” (I Ndi Eze 12:15). Mkpebi nke a Rehobaom kpebiri ọsọsọ bụ ụzọ nke Chineke chọrọ iji napụ n’akụkụ ụfọdụ nke ala-eze ahụ.

Okpukpé nke Mmadụ Mere

Ebe ajụrụ arịrịọ ha, ebo niile nke ugwu nupụrụ-isi megide ya ma mee kwa Jeroboam eze ha. Ọ bụ náánị ijé ijè n’iwu niile nke Chineke pụrụ ime ka ala-eze ya guzosie ike. Kama irube-isi na ịtụkwasị Chineke obi, o chigharịrị n’amam-ihe nke aka ya wee malite okpukpé nke ya. Ọ chọghị eziokwu ahụ kama nchépụta aghụghọ nke ga-ekwesị ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke dị n’obi ya onwe ya. O wepụtara ụzọ òfùfè dị mfé nye Ụmụ Israel, ha wee nara ya n’ìgwè. “Unu arigozuwo Jerusalem” (ma-ọbu ọ diri unu anya nke uku bú irigoru Jerusalem), bụ okwu aghụghọ nke Jeroboam ji duba Israel nime ụdị òfùfè nke oriri na ememe dị iche iche ma ike adịghị na ya ịgbanwe ndụ ha.

Ozi nke jupụtara n’oriri na ọñụñụ nke Jeroboam chèpụtara n’obi ya bụ ihe iji tụnyere ọtụtụ okpukpé nke ná-akpọ onwe ha Ndị Kraist n’ụbọchị taa. Ọtụtụ mmadụ arapụwo ụzọ mgbe ochie ahụ wee chọta ụzọ dị iche iche ka mfé. Ha agụghị kwa ya n’ihe dị mkpà igbu ikpere n’ala n’oche iru-uju n’ezi nchègharị ka ewee mụọ ha ọzọ. Site n’ikwe n’aka, inye akwụkwọ mkwà na arịrịọ sị mmadụ “mara Kraist dịka onye nzọpụta gị,” ị ghọwo Onye Kraist, ka ha na-asị. Ma ezi nzọpụta na-aga omimi karịa nke a. Anya mmiri ákwá dị ilu nke nchègharị, iti-mkpu maka ebere, mgbanwe nime ala-ala nke obi, na ọgbụgba-àmà sitere na Chineke na agbaghaworo mmehie niile ná-ákà ndị ahụ nke nọ n’ụzọ nke Chineke akàrà na ha ejikerewo onwe ha maka Eluigwe. Òlee úrù dị n’ememe ahụ niile, nzukọta niile na aghụghọ niile nke okpukpé ga-àbà ma ọ bụrụ n’ikpe-azụ mmadụ ahụ ewee tụfue mkpụrụ-obi ya?

Okpukpé nke Jeroboam ahụ chọtara iruọma n’ebe ndị hụrụ mmehie n’anya nọ, bụ ndị ná-ahụghị ihe nke dị n’ịñụ manya, ité-égwú, ma-ọbụ ihe dị iche iche. Ụwa n’ụbọchị taa jupụtara n’ọtụtụ ndị ná-ekpe okpukpé dị iche iche ndị ná-ekwenyeghị na ọ dị mfé mmadụ ibi ndụ karịa mmehie. Ha mechiri anya ha n’ebe eziokwu ahụ dị ma ná-achọ ụzọ n’akụkụ niile nke Okwu Chineke ahụ pụtara ìhè nke ná-asị “Onye ọ bụla nke amuworo site na Chineke adigh-eme nmehie” (I Jọn 3:9). Ụfọdụ ndị okpukpé egbugbere ọnụ na-eguzosi ike na ha nọ n’ezi ụzọ ọ bụ ezie na ha ná-ebi ndụ nime mmehie, nke ná-eme kwa ka mmadụ maa jijiji tụọ kwa egwù na ha bụ otù nime ndị ahụ nke “anaragh ihu-n’anya nke eziokwu nkeọma, ka ewe zọpụta ha.” Okwu Chineke na-ekwu sị “n’ihi nka Chineke nēzite-kwa-ra ha ilusi-ọlụ ike nke njehie, ka ha kwere ugha ahu: ka ewe kpe ha nile ikpé, bú ndi nēkwegh ezi okwu, kama ajọ omume diri ha ezi nma” (II Ndi Tesalọnaika 2:10-12).

Ndị Òzízí Ụgha

Mmadụ pụrụ ichè na ụdị okpukpé a nke mmadụ rọpụtara dịka nke Jeroboam malitere pụrụ ịbụ ihe ná-agaghị aga kwa n’iru mgbe ná-adịghị anya bụrụ kwa ihe ewezugara n’akụkụ; ma mgbọrọgwụ niile nke mmehie bamiri abami nime ndụ nke mmadụ, otú a kwa ka mkpụrụ-obi ahụ ana amụbeghị ọzọ jupụtara ná mmehie, na Israel soro ikpere arụsị nke ifè nwa ehi awụrụ-awụ òfùfè ruo mgbe adọtara ha n’agha mgbe ihe karịrị narị arọ abụọ gasịrị. Onye-amụma ahụ edewo sị: “Obi di aghughọ kari ihe nile, ihe nādigh ngwọta ka ọ bu kwa: ònye gāmara ya? Mu onwem, bu JEHOVA, nēnyocha obi, nānwa akuru, ọbuná inye onye ọ bula dika uzọ-ya nile si di” (Jeremaia 17:9, 10). Ọtụtụ mmadụ bụ ndị na-ekwe ka ana-anyagharị ha ka ụgbọ n’ihe ha kweere, nke bụ na ha pụrụ ịnara ihe ọ bụla n’aha okpukpé, ma adọrọ anyị aka-ná-ntị banyere ndị amụma ụgha. “Ma ndi amuma ugha puta-kwa-ra ìhè n’etiti ndi Israel, dika ndi-òzízí ugha gādi kwa n’etiti unu, bú madu ndi gēwere nzuzo webata iro-otù di iche iche nke ila-n’íyì, nāgọnari ọbuná Onye-nwe-ha, Onye gbara ha, ndi nēweta ila-n’íyì, di ngwa tukwasi onwe-ha n’isi. Ọtụtụ madụ gēso kwa uzọ agu-ikwa-iko ha; ndi agēkwulu uzọ nke ezi-okwu n’ihi ha. Nime anya-uku ka ha gēji kwa okwu nrafu di iche iche were unu zua ahia: ndi ọmuma-ikpe-ha nābugh ihe nādigh-alu ọlụ site n’oge ochie, ila-n’íyì ha adigh-eru kwa ura. N’ihi na asi na Chineke emeregh ndi mọ-ozi ebere mgbe ha mehiere, kama Ọ tubara ha n’ime-ime ọku ala-mọ...” (II Pita 2:1-4). Chineke agaghị anabata onye ọ bụla nke na-akpọku aha Jisọs náánị n’egbugbere ọnụ. O nyewo anyị ngọta na anyị aghaghị iso eziokwu ahụ na ibi ndụ ná-enweghị mmehie ka anyị wee keta Ala-eze Eluigwe.

Rehoboam

Rehoboam amataghị omimi nke mgbọrọgwụ nnupụ-isi ahụ gamiri ruo mgbe o zigara Adoram, bú onye nnakọta ụtụ nke ndị Israel dị n’aka. Mgbe ahụ ka Rehoboam gbalagara nime ụgbọ-ala ya ruo Jerusalem ịzọ ndụ ya wee kpọkọta ndị-agha site na Juda na Benjamin ka ha kwatuo òtù ndị nnupụ-isi ahụ. Otú ọ dị ọ bụ n’ihi ọdị-mma ya, ka ọ ñara ntị n’okwu nke Chineke wee ghara ịpụ ibu agha megide Israel. Ọ bụ kwa n’ihi ọdị-mma ya, na nke ndị ọchịchị ya, na ha wedara onwe ha n’ala mgbe Shaishak bú eze Ijipt bịara imegide Jerusalem; ma ọtụtụ mgbe Rehoboam wee “me ihe ọjọ, n’ihi na o dozigh obi-ya ichọ JEHOVA” (II Ihe Emere 12:14).

Ọgwụgwụ nke Ọgbọ Ọla-edo Ahụ

Lee otú ịma mma nke ala-eze ahụ nke Chineke nyeworo Solomon ji bụrụ ihe daruru ala n’ihi ikpere arụsị! Ngwa ngwa Solomon nwụrụ ekewara ala-eze ahụ ụzọ abụọ; ala-eze nke ugwu jikọtara ebo iri nke amaara dịka Israel, ma ala-eze nke ndịda jikọtara ebo Juda na Benjamin bú nke amaara dịka Juda. Ọ bụghị náánị na ala-eze ahụ kewara kama ngwa ngwa n’arọ nke ise Rehoboam malitere ịbụ eze, Shaishak, bú eze ndị Ijipt batara na Jerusalem wee wezuga àkù niile nke ụlọ-ukwu Chineke na nke ụlọ eze. Kama ọta nke ọla-edo, Rehoboam wee mee ọta nke ọlà n’ọnọdụ ya. Ha gbalịrị ime ka aga-asị na ihe ana-ahụ anya nke obodo ahụ ka dị otú ọ dị ma ezi ebube nke Jerusalem apụworị, ọla-edo ya aghọwo “ọlà n’arà àrà”, ọñụ ya kwa aghọwo “ájà ọlà nāda udà.” Ụmụ ndịkom Israel kwesịrị ka ha kwaa ákwá, ru kwa ujú, ụmụ ndịnyom nke Jerusalem kwesị kwara iti-mkpu ákwá, n’ihi na otuto nke ala-eze ahụ adawo n’ihi na Juda arapụwo Chineke ya!

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị bụ okwu ahụ Israel tọgbọrọ n’iru Rehoboam?
  2. Gịnị ka ị ná-eche banyere ọzịzá ya?
  3. Gịnị mere Rehoboam jiri nye ọzịzá dị otú a?
  4. Òlee ebo soro Jeroboam? Òle kwa bụ ndị soro kwara Rehoboam?
  5. Ogologo oge ra añaa ka nkewa ala-eze ahụ nọrọ?
  6. Gịnị gbochiri Rehoboam ibu-agha megide ndị Israel?
  7. Gịni mere Jeroboam ji kpụọ ụmụ ehi ọla-edo ahụ?
  8. Òlee ebe Jeroboam si nweta échìchè nke okpukpé ya ahụ?
  9. Òlee otú obi ebere Chineke si pụta ìhè nye Rehoboam?
  10. Gịnị bụ nchịkọta ọnụ nke ọchịchị Rehoboma?