Ilu 1:1-33; 2:1-22

Lesson 275 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Le, egwu Onye-nwe-ayi nke ahu bu amam-ihe; ọzọ isi n’ihe ọjọ puta bu nghọta” (Job 28:28).
Notes

Ihe Solomon Rịọọrọ

Solomon, nwa Devid, bụ nwoke nwere amam-ihe nke ukwu. Mgbe nna ya nwụsịrị, Solomon malitere ịbụ eze nke Ụmụ Israel. N’oge ahụ Onyenwe anyị mere ka Solomon hụ Ya anya O wee sị ya, “Rịọ ihe M’gēnye gi.” Solomom ghọtara na ịbụ eze nke ìgwè mmadụ ahụ bụ óké ọlụ. Solomon rịọrọ Chineke ka O nye ya “obi nānu ihe” ikpé ndị ahụ ikpé (I Ndi Eze 3:9). Ihe ahụ Solomon rịọọrọ tọrọ Chineke ụtọ O wee nye ya ihe ọ rịọrọ bụ obi ná-anụ ihe. Ewezuga amam-ihe, Chineke nyere Solomon nsọpụrụ na àkụ, na ogologo ndụ kwa. Chineke chọrọ ka Solomon rube isi n’iwu niile nke Onyenwe anyị (I Ndi Eze 3:13, 14).

Amam-ihe Sitere N’ebe Chineke Nọ

Chineke gọziri Solomon mee kwa ka ọ bụrụ onye maara ihe karịa mmadụ niile (I Ndi Eze 4:31). Ọtụtụ mmadụ nụrụ banyere amam-ihe Solomon. Ha jekwuuru ya ịnụ okwu ya (I Ndi Eze 4:34). Anyị amụwo ihe banyere Eze-nwayị Sheba onye jekwuuru Solomon ka o wee zaara ya ajụjụ niile dị ike o nwere ( Ihe-ọmụmụ 259).

Solomon jiri amam-ihe Chineke nyere ya lụọ ọlụ. O dere “nnù abụọ na ọgụ iri na abù ise” tụọ kwa puku ilu atọ (I Ndi Eze 4:32). Edere ha ka ụmụ mmadụ wee rita urù site n’amam-ihe Solomon, ọ bụ ezie na Solomon n’onwe ya anọgideghị n’ibi ndụ dịka ilu niile ọ tụrụ si dị.

Ilu

Ilu bụ nwa okwu ntà nke ná-akuzi ihe. Ọ na-abụkarị ahịrị-okwu ntà nke ná-akwọwara mmadụ ọtụtụ ihe. Ọ dịghị mkpà ka ewere ahịrị-okwu ọzọ kọwapụta ya. Ọtụtụ mgbe Jisọs kwuru okwu n’ilu, nke kuzi kwara ihe. Ọtụtụ ahịrị-okwu na-emejupụta ya, ma omume ọma ma-ọbụ ihe mmụta dị nime ha ka apụrụ ịkpọ ilu.

Ọtụtụ ilu ọzọ dị iche iche dị kwa ma ewezuga nke Solomon. Mgbe ụfọdụ ana-akpọ ha okwu ntà na-akọwa nchepụta mmadụ, okwu ndị ichie, okwu na-eduzi mmadụ, na okwu mgbe ochie. Ana-eji ha ekwu okwu ọtụtụ mgbe, anwapụtawo kwa na ha bụ eziokwu. Ilu niile a nke mmadụ, ọ bụ ezie na ha akpaliwo ọtụtụ mmadụ ime ezi ihe, adịghị eme ha ka ha chọọ Chineke na nzọpụta Ya. Akwụkwọ Ilu karịrị náánị nchịkọta nke okwu amam-ihe, n’ihi na ilu niile dị na Baịbụl bụ ihe si n’obi Chineke pụta bụrụ kwa ihe baara anyị urù n’ihi ọdị-mma nke mmụọ anyị. Ụfọdụ nime ilu niile nke Solomon ka ekwuru banyere ha depụta kwa ụfọdụ na Testament Ọhụụ. (Lee Ndi Rom 2:6; Ndi Hibru 12:5, 6; I Pita 4:8). Ọtụtụ nime ha ka amaara nkeọma bụrụ kwa ihe ọtụtụ mmadụ na-eji ekwu okwu n’ụbọchị ndịa bụ ndị maara náánị ihe ntà banyere Baịbụl.

Solomon edeghị ilu niile ahụ iji mee ka amata ya dịka onye na-ede akwụkwọ ma-ọbụ iji nwetara onwe ya aha. O dere ha n’ihi ọdị-mma nke mmadụ niile, ọ bụghị nye náánị Ụmụ Israel bụ ndị ọ na-achị. Ọ dịghị otù nime ilu niile nke Solomon nke anyị ná-apụghị iji kwuo okwu n’ụbọchị ndịa dịka Ụmụ Israel n’oge nke ha. Ekwuwo ya na ọ dịghị ahịrị-okwu ọ bụla dị n’Akwụkwọ Ilu nke baara Ụmụ Israel urù nke ná-adịghị adaba na ndụ mmadụ niile taa.

Ọnụ-ahịa Ha

Ilu niile ahụ ga-enyere mmadụ aka ịmata omimi nke ihe-ọmùmá na ịdọ-aka-ná-ntị, nyekwara mmadụ aka ime omume na ikwu okwu dịka onye nwere uche. Ha ga-enyere mmadụ aka ịmata ezi ihe na ihe ọjọọ, dị kwa ka ihe ná-eduzi mmadụ ka ọ ghara ịdahie. Ha ga-enyere mmadụ aka idozi okwu ya dịka o kwesịrị, na-eduzi kwa mmadụ ijé ijè n’ezi-omume na ikpé.

Ndị niile chọrọ, nwere ike irita urù site n’ihe-odide niile a nke Solomon. Ha pụtara ìhè doo kwa anya na mmadụ niile pụrụ ịghọta ha. Ha bara urù nye ndị niile nwere agụụ ịmụta ihe na ndị ghọtara mkpà ọ dị ka akụziere ha ihe. Otù onye ná-ede akwụkwọ amaara nkeọma, gụrụ ọtụtụ isi Akwụkwọ Ilu buru n’isi mgbe ọ dị na nwata, o wee kwuo na ha bụ ihe dịkarịsịrị óké ọnụ-ahịa na ihe kachasị mkpà n’ihe-ọmụmụ ya niile.

Ọ bụ ezie na ọtụtụ ilu Solomon bụ ihe o dere iji gwa ụmụ ya okwu, ma ha dịrị ụmụ ndịọzọ dịka ha dịrị ụmụ ya. Ọtụtụ nime ilu niile ahụ dị ka ha dịịrị ụmụ okorọbịa na ụmụ agbọghọbịa, n’ihi na ọ bụ oge ịmụ ihe, oge itinye ihe amụtara n’obi, oge apụrụ ijidesi ihe ike n’échìchè anyị na oge apụrụ ichèta ihe nkeọma. Mgbe okorọbịa na agbọghọbịa bụ kwa oge ana-anwapụtabeghị ọtụtụ ihe, mgbe ana-aghaghị iji iwu na-eduzi mmadụ.

Ịtụ-egwù Chineke

Solomon nyere ụzọ ihe abụọ nke mmadụ pụrụ isite na ha nweta amam-ihe. Solomon enyeghị ndụm-ọdụ ka mmadụ gụọ ọtụtu akwụkwọ ma-ọbụ jee ụlọ-akwụkwọ ọtụtụ arọ. Ihe abụọ ndịa nwere ike ghara ịdabara mmadụ niile, ma ụzọ Solomon kwuru okwu ya bụ nke onye ọ bụla pụrụ inweta. Solomon sịrị na ịtụ egwù Jehova bụ mmalite ihe-ọmụmá. Mgbe mmadụ ná-atụ egwù Chineke, ọ na-egosi nsọpụrụ n’ebe Chineke na Okwu Ya nọ site nime ihe ná-atọ Chineke ụtọ na ifè Ya òfùfè.

Ndị ahụ na-asị na ọ dịghị Chineke dị na-egosipụta onwe ha dịka ndị na-amụ ihe na ndị hụrụ amam-ihe n’anya, ma ha bụ ndị-iro na ndị-ọbịa n’ebe ezi amam-ihe nọ n’ihi na ha enweghị ọchịchọ nke iruọma Chineke ha adịghị kwa atụ egwù iwe Ya. “Onye-nzuzu asiwo n’obi-ya, ọ digh Chineke ọ bula di” (Abù Ọma 14:1).

Ịsọpụrụ Ndị Mụrụ Anyị

“Nwam, nuru idọ-aka-na-ntị nke nna gi, arapu-kwa-la iwu nne-gi.” Mgbe nwata na-aña ntị ná-edebe kwa okwu ndị mụrụ ya, ọ na-asọpụrụ ha. N’iwu nke ise agwara anyi ka anyị sọpụrụ nne na nna anyị (Ọpupu 20:12). Mmadụ ịsọpụrụ ndị mụrụ ya bụ ịkwanyere ha ùgwù na irubere ha isi. Solomon bu n’obi na ndị mụrụ ụmụ -- nne na nna – ga-akụziri ụmụ ha na ha ga-ewere kwa ike ha nwere n’ebe ụmụ ha nọ nye ha iwu n’ihi ọdị-mma ụmụ ahụ. Solomon tụkwasị kwara na ọ bụghị náánị na ndị bụ nne na nna ga na-enye ụmụ ha iwu kama ha ga na-akuzi kwara ụmụ ahụ.

Ekwere mkwà inye ndị ahụ ga-asọpụrụ ndị mụrụ ha debe kwa okwu ha ụgwọ-ọlụ. “Okpu amara ka ha gābu” n’iru Chineke, nke bụ ihe bara urù karịa amam-ihe na àkụ nke ụwa. Pọl deere Ndi Efesọs ihe banyere nke a. Ọ sịrị: “Umu, nāñanu nti okwu ndi muru unu nime Onye-nwe-ayi: n’ihi na nka bu ihe ziri ezi. Sọpuru nna-gi na nne-gi (nke bu ihe mbu enyere n’iwu nke nkwà diri ya), ka ihe we nāgara gi nke-ọma, … Ndi bu nna, akpasu-kwa-la umu-unu iwe: kama nāzùputa ha n’ọzùzù na idu-ọdu nke Onye-nwe-ayi” (Ndi Efesọs 6:1-4).

Òtù Ọjọọ

Solomon nyere ịdọ-aka-ná-ntị megide ndị na-eme ka ndịọzọ mee ihe ọjọọ. Apụrụ ịdọrọ mmadụ ntakịrị ntakịrị bamie n’ime ihe ọjọọ. Òtù ọjọọ pụrụ ịbụ nzọ-ụkwụ mbụ n’ụzọ nke ọdịda. Baịbụl sịrị na “nkparita nile ọjọ nēmebi omume ọma” (I Ndi Kọrint 15:33); ọzọ “onye bu eyì ndi nēribiga ihe ókè nētinye nna-ya n’ọnọdụ-ihere” (Ilu 28:7). Jihu, bụ nwa onye-amuma, gwara Jehoshafat, bụ eze Juda sị: “Ọ kwesiri gi iyere onye nēmebi iwu aka? ọ bu kwa ndi nākpọ Jehova asì ka i nāhu n’anya? ma n’ihi ihe a iwe dikwasi gi site n’iru Jehova” (II Ihe Emere 19:2). Òlee ndị bụ ndị enyi gị dịkarịrị gị nso? Ị pụrụ isoro Onye dere Abù Ọma sị, “Onye ekekọtaworo mu na ndi nile nātu egwu Gi n’otù ka m’bu, onye ekekọtaworo mu na ndi nēdebe ihe-iriba-ama-Gi nile n’otù” (Abù Ọma 119: 63)?

Nzọ-ụkwụ mbụ nke ọdịda pụrụ ịbụ mgbe ị zara òkù nke ndị ná-emebi iwu mgbe ha sịrị gị, “Soro ayi je.” Ọzọ, ha ga-achọ ka ị bụrụ onye-òtù ha ka ị wee keta òkè n’ihe ha na-eme na ụgwọ-ọlụ ha. Eji onye ná-apụnara mmadụ ihe jupụtara n’obi ọjọọ nye ihe ịma-àtù. Mgbe adọọrọ mmadụ baa n’ime mmehie, ana-apụnara ha ezi ihe niile nke mmụọ. Ụzọ nke onye ná-emebi iwu adịghị atọ Chineke ụtọ ọ na-emerụ kwa ụmụ mmadụ arụ. Solomon sịrị, “Gbochie ukwu-gi n’iga n’okporo-uzọ-ha.” Ọ na-agbada rue na mbibi. Ọ dịwo mgbe ị siri n’elu ugwu rịdaa? Ị ga-achọpụta na ọ dị mfé ịgba ọsọ karịa ijé ijè; ma ka ị na-agbada, ka ị na-aga ọsọsọ karị -- ruo mgbe ọ gadị ka ị pụghị kwa ịkwụsị. Ị ga na-agbada ọsọsọ ọsọsọ ruo mgbe ị matara na náánị ma ọ dị ihe kwụsịrị gị, na ị ga-emeru arụ. Otú a ka ọ na-adịrị ndị nọ n’ụzọ ọdịda. Ọ bụghị na ọ chọrọ ijeru ebe dị anya, ma mgbe ná-adịghị anya ha hụ onwe ha ka ha na-agami ọsọsọ ọsọsọ karịa ka ha chọrọ. Ma ọbụghị náánị ma ha kpọkuru Chineke maka inye-aka, ha ga-adaba ná mbibi.

Enyewo ịdọ-aka-ná-ntị ahụ. Ị ga-adị ka nnụnụ bara n’ọnyà n’ihi na o nwere anya ukwu iri ihe ahụ eji sie ọnyà, ọ bụ ezie na ọ hụrụ ọnyà ahụ nkeọma?

Nrọrọ Gị

Dịka Solomon nwere nrọrọ ọ ga-eme, otú a ka ọ ga-adịrị onye ọ bụla nime anyị. Onyenwe anyị kwesịrị ntụkwasị-obi n’ịkpọ mmadụ niile ka ha soro Ya. Anyị pụrụ inwe egwù Jehova nke bụ mmalite amam-ihe (Ilu 9:10). Ụfọdụ mmadụ nwere náánị nghọta ntà banyere ihe nke ime mmụọ ha rọrọkwara ịnọgide ná-enweghị ihe-ọmụmá nke ime mmụọ karị -- ha “gāhu enwegh-uche n’anya.” Ụfọdụ mmadụ na-achị ihe niile dị nsọ ọchị ná-akwa kwa ndị tụkwasịrị Chineke obi emò -- ha “gāchọsi-kwa-ra onwe-ha ikwa-emo ike” Ndịọzọ adịghị achọ ka agwa ha ihe banyere Chineke na ibi ndụ nke ezi-omume. Ha “gākpọ kwa ihe-ọmụma asì.”

Ha rọọrọ ibi ndụ ná-enweghị Chineke, ma Ọ ka nọ ná-atụ ha mmehie ha n’anya, ná-adọ ha aka-ná-ntị isí n’ụzọ ọjọọ ha niile chịgharịa. Akọn’uche ha na-agwa ha na ha adịghị eme omume ka ndị maara ihe. Chineke akpọwo ha òkù, ma ha añaghị ntị n’olu Ya. Chineke esetịpụwo aka ebere Ya inyere ha aka, ma ha jụrụ ijide Ya. Aisaia bụ Onye-amụma sịrị, “Chọnu JEHOVA mgbe anāchọta Ya, kpọkuenu Ya mgbe Ọ nọ nsọ” (Aisaia 55:6). Solomon kuzi kwara na oge ga-adị mgbe mmadụ ga-akpọku Onyenwe anyị, ma Chineke agaghị aza. Ndị ahụ jụworo ịña ntị n’olu Chineke ga-akpọ kwa n’oge nsogbu, ma Chineke agaghị aña ha ntị. Ha jụrụ inwe egwù Chineke, ma ha ga-enwe egwù ọzọ dị iche iche (Ilu 1:26). Egwù ha ga-achọ mkpagbu na ihe-mgbu. Ha ga-achọ Chineke ma ha agaghị achọta Ya. Ha ga-akpọku Chineke, ma Ọ gaghị aza ha. Ị ñawo ntị n’òkù nke Chineke na-akpọ, rọrọ kwa inwe egwù Chineke nime obi-gị?

Mbibi Ma-ọbụ Ịnọ n’udo

Gịnị mere ị gaghị abụ onye nwere uche wee chigharịkute Chineke ugbu a Ọ ka na-aza ekpere? Onye nkuzi gị nke Ụlọ akwụkwọ Ụbọchị-ụkọ ga-enyere gị aka ikpe ekpere na ịchọ Chineke, ichègharị na ịrịọ Chineke ka O duzie gị dịka amam-ihe Ya si dị.

Ndị ná-atụ àtụmàtụ ịnọgide n’ụzọ ọjọọ ha niile ga-achọpụta na mmehie na-ebute ọnwụ. “Nmehie ahu, mgbe o tozuru okè, o we muputa ọnwu” (Jemes 1:15). “Ugwọ-ọlụ nke nmehie bu ọnwu; ma onyinye-amara nke Chineke bu ndu ebigh-ebi nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi” (Ndi Rom 6:23). Onyenwe anyị tikuru Ụmụ Israel mkpu sị, “Chigharianu, sinu n’uzọ ọjọ nile unu chigharia; ọ bu kwa n’ihi gini ka unu gānwu, ulo Israel?” (Ezikiel 33:11).

Ndị niile ñara ntị n’ọkpụkpọ nke Chineke rube kwara Ya isi ga-ebi n’udo na obi-ụtọ. Onyenwe anyị bụ ọta nye ndị niile na-ejé ijè n’izu òkè. Okwu ndịa niile nke Solomon yiri okwu ndị ahụ nna ya kwuru. Devi sịrị, “JEHOVA bu nkumem di elu, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka m’gbapu; Ọ bu Chinekem, na oké nkumem, anamagbaba nime Ya, Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum” (Abù Ọma 18:2). Onyenwe anyị ga-edebe chebe kwa ndị Ya ma ha aghaghị irube-isi tụkwasị kwa Chineke obi. Pọl sịrị: “Yikwasinu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ihe nile ekwensu nēzuputa” (Ndi Efesọs 6:11). (Gụọ ná Ndi Efesọs 6:13-17) banyere akụkụ dị iche iche nke ihe-agha ahụ, nke “ọta nke bu okwukwe, nke unu gāpu imenyu àkú uta nile nēnwu ọkụ nke ajọ onye ahụ nime ya” bụ otù nime ha.)

Anyị ná-agụ nime Baịbụl: “Ma ọ buru na amam-ihe fọduru onye ọ bula nime unu inwe, ya riọ n’aka Chineke, Onye nēnye madu nile n’afọ-ofufo, nātagh kwa uta; agēwere kwa ya nye ya” (Jemes 1:5). Amam-ihe a nke Chineke na-enye dị iche site na mmụta nke mmadụ na-enweta n’ụwa. Mmadụ kwesịrị ijé ụlọ-akwụkwọ wee mụta itó-étó nke a ga-enyere mmadụ aka inwe nnwapụta na ihe-ọmụmá ka o wee nwee ihe-ụtọ nke ụwa nke a n’òzùzù òkè, nwee kwa ike ịlụpụta ihe ọ ga-eri kwa ụbọchị, ọ bụrụ na Onyenwe anyị anọọ ọdụ. Ọ bụrụ na ị mụtaghị otú esi agụ akwụkwọ, ị ga-esi añaa pụ ịmụ Baịbụl gị? Ma inwe mmụta na ihe-ọmụmá ezughị, Onyenwe anyị na amam-ihe Ya dị kwa mmadụ mkpà.

Job jụrụ ajụjụ sị: “Amam-ihe, òle ebe agāchọputa ya? òle ebe kwa ka ọ bu, bú ọnọdu nghọta? (Job 28:12). Job nye kwara ọzịzá ya, “Le, egwù Onye nwe ayi, nke ahu bu amam-ihe; ọzọ, isi n’ihe ọjọ puta bu nghọta (Job 28:28). Agwara Ụmụ Israel ka ha rubeisi, debe, ma mee ihe niile Jehova nyere n’iwu. “N’ihi na nka bu amam-ihe-unu na nghọta-unu n’anya ndi nile, ndi gānu ukpuru ndia nile, we si, Otú ọ di, ndi mara ihe na ndi nwere nghọta ka mba uku a bu” (Deuteronomi 4:6). Ọtụtụ mmadụ nwere nghọta nke ihe ziri ezi, ma inwe amam-ihe bụ ime ihe dị mma zikwara ezi (Gụa Jemes 3:13-18, nke ná-agwa anyị banyere amam-ihe nke ụwa na nke sitere n’Eluigwe.)

Àkụ

Solomon gbara ụmụ mmadụ ume ka ha chọọ amam-ihe nke Chineke dịka mmadụ si achọ àkụ zoro ezo. Ọtụtụ mmadụ jikeere ka náánị ha biri, lụsie kwa ọlụ ike ogologo oge, n’ebe ihe-egwù dị iche iche dị, iji chọta àkụ nke ụwa. Ọtụtụ mgbe ka ha adịghị eri ezi nri, ha adịghị enye onwe ha ezi ihe ga-enyere ndụ ha aka, na izu-ike. Nwoke ahụ dị n’otù ilu Jisọs tụrụ rere ihe niile o nwere ka o wee zụta otù pearl dị óké ọnụ-ahịa (Matiu 13:46). Òlee otú anyị si ná-achọ, ná-alụsi kwa ọlụ ike banyere ihe nke Chineke?

N’Abù Ọma, Devid dekwara banyere egwù Chineke. Ọ sịrị: “Ònye ka ọ bu, bú nwoke nātu egwu JEHOVA? O gēzi ya ihe n’uzọ ọ nārọputa” (Abù Ọma 25:12); na “Le ka ezi ihe-Gi si ba uba, nke I tukọbaworo nye ndi nātu egwù Gi, nke i luworo nye ndi nāgbabà nime Gi n’iru umu madu!” (Abù Ọma 31:19).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Ònye ka Solomom bụ?
  2. Òlee otú o si bụrụ onye nwere amam-ihe otú a?
  3. Gịnị mere Solomon ji dee ilu dị iche iche?
  4. Gịnị bụ ilu?
  5. Gịnị bụ mmalite amam-ihe?
  6. Gịnị mere nwata ji kwesị irubere ndị mụrụ ya isi?
  7. Òlee otú ndị mmehie si agbalị ịrà mmadụ ụrà?
  8. Òlee otú anyị ga-esi chọọ amam-ihe nke Chineke?
  9. Gịnị ka Chineke na-emere ndị ná-atụ egwù Ya?
  10. Gịnị ga-eme ndị ná-adịghị atụ egwù Chineke?