Jọn 19:31-42; Matiu 27:62-66; Jọn 20:1-31.

Lesson 276 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Mu onwem bu mbilite n’ọnwu na ndu: onye nēkwere na Mu, ọbuná ma asi na ọ nwuru anwu, ọ gādi ndu ọzọ” (Jọn 11:25).
Notes

Ime Ihe Ọ Na-achọ

Ka Jisọs na-anwụ n’elu obe Ọ sịrị: “Ọ gwuwo.” Okwu Ya ahụ pụtara na Ya alụzuwo ọlụ niile nke Chineke nyeworo Ya ịlụ. Site na mgbe Jisọs bụ nwata, ihe banyere ime uche Chineke bụ ihe dị Ya mkpà. Mgbe Jisọs dị arọ iri na abụọ Ọ sịrị, “Ùnu amatagh na aghaghm idi n’ihe nke Nnam?” (Luk 2:49). Ka oge na-aga okwu Ya bụ: “ihe-oririm bu ka M’nēme ihe Onye ziterem nāchọ, ka M’luzu kwa ọlu-Ya” (Jọn 4:34). N’oge ná-adịghị anya tupu akpọgbuo Jisọs Ọ sịrị, “Nna, oge hour abịawo; … ebe M’luzuru ọlu I nyeworom ka M’lua” (Jọn 17:1, 4). Nime nke a, Jisọs nyere anyị ezi ihe nlere anya. Ọ na-adị Chineke ụtọ, bụrụ kwa ihe dị mkpà nye anyị dịka ndị ná-eso Ya, ka anyị na-eme ihe Ọ na-achọ. Ka anyị jisie ike mee karịa náánị ịchọ ime uche Chineke -- ka anyị mee nnọọ ihe Ọ chọrọ ka anyị mee.

Ọnwụ nke Kraist ewetaghị òzízí Ya n’ọgwụgwụ. Ndị ná-eso ụzọ Ya gara n’iru n’ọlụ site n’ikwusa na ịgbasa ezi akụkọ nke Oziọma ahụ. Ọnwụ Ya dị mkpà ka anyị wee nata mgbaghara nke mmehie anyị, n’ihi na “ọ buru kwa na nwusì ọbara adigh ngbaghara nmehie adigh” (Ndi Hibru 9:22). Jisọs bụ Nwa-atụrụ Chineke ahụ onye awụsịrị Ọbara Ya ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee nata mgbaghara mmehie ya (Jọn 3:16; Matiu 26:28).

Mmezu nke Amụma Ahụ

Akpọgburu Jisọs n’etiti ndị-ori abụọ dịka Okwu Chineke kwuwororị: “Ọ bu kwa na ndi-njehie ka aguru ya” (Aisaia 53:12; Mak 15:28). Ebe ọ bụ ụbọchị nkwadobe maka Ụbọchị izu-ike, “ka aru ha we ghara idigide n’elu obe.” Ndị-agha bịara ime ka ndị ahụ akpọgideworo n’obe nwụọ ngwa ngwa, ma Jisọs anwụwọrị. Ha etijighị ụkwụ Jisọs dịka etijiri nke ndị ọzọ. Otú ọ dị, otù onye-agha jiri ube mapuó akụkụ Jisọs, “ngwa ngwa ọbara na miri we puta.” Ndị-amụma ekwuwo kwa banyere ihe ndịa niile. (Gụọ Zekaraia 12:10 na Abù Ọma 34:20.)

Òlìlì Ya

Ụbọchị eliri Ya bụ ụbọchị iru uju nye Ndị ná-eso ụzọ Ya. Ha aghọtaghịrị n’òzùzù òkè okwu niile nke Jisọs banyere ọnwụ Ya. Olile-anya ha bụ na Ọ ga-eme ka ala-eze Ya guzo n’elu ụwa n’oge ahụ, ma ugbu a Ọ nwụwo. Ndị ahụ ná-eso ụzọ Ya tụrụ egwù, daa mbà jupụta kwa n’iru-uju.

Mmadụ abụọ n’etiti ndị kweworo n’òzízí niile nke Jisọs bụ ndị òtù Sanhedrin, nke bụ nnọkọ-ikpé ndị Ju. N’oge ndị ọzọ ná-eso ụzọ Jisọs jupụtara n’iru-uju, ndịkom abụọ ndịa gosipụtara ịhụn’anya ha n’ebe Jisọs nọ. Otù onye nime ha bụ Josef nke Arimatia, jekwuuru Pailat ná nkwuwa okwu wee nata ike idozi arụ Jisọs. Nwoke nke ọzọ, Nikọdimọs, wetara ihe-otite na-esi isi-ụtọ dị óké ọnụ-ahịa nke myrrh na aloes agwara-agwa. Ejiri ha dozie arụ Jisọs maka òlìlì, dịka omen’ala ndị Ju si dị.

Ná mbụ, ndịkom ndịa na-atụ egwù ikwupụta na ha bụ ndị ná-eso ụzọ Jisọs. Ma n’oge a omume ha gosipụtara óké ịhụn’anya ha nwere n’ebe Onyenwe anyị nọ. Nke bụ oge nnwapụta, ma ugbu a ndịkom abụọ ndịa atụfughị oge igosipụta na ha bụ ndị ná-eso ụzọ Jisọs. Onyenwe anyị Ọ pụrụ ịdabere anyị na anyi ga-eguzoro ihe ziri ezi? Ọ pụrụ ịdabere anyi ịbụ ndị eziokwu nye Ya mgbe ana-anwa anyị? Ọ pụrụ ịdabere anyị ịzọpụ ụkwụ mgbe ọlụ dị aga alụ?

Nye Onyenwe anyị

Òlìlì nke Jisọs dị dịka amụma dị iche iche ebuworo (Aisaia 53:9). Josef nke Arimatia bụ ọgaranya (Matiu 27:57). N’otù ubi agbara ogige ka o doziwooro onwe ya ílì ọhụụ nke awapụtara na nkume. Josef kwenyere iji ílì ahụ lie Onyenwe anyị. Anyị onwe anyi taa, nwere ihe ụfọdụ anyị nwere ike ịkpọ nke anyị, nke anyị nwekwara ike ịtụ àtụmàtụ iji ha mee ihe nke onwe anyị. Ha nwere ike ịbụ ndụ anyị, oge anyị, talent anyị, na ihe onwunwe anyị niile. Ànyị jikeere inye ha Onyenwe anyị, na ijéozi Ya? Josef nke Arimatia nyere, n’ihi Jisọs, nke ahụ o doziwooro onwe ya. Eliri Jisọs n’ebe ahụ Josef tụworo àtụmàtụ na aga-eli ya onwe ya, ewee were otù óké nkume kwachie ọnụ-ụzọ ílì ahụ.

Idebe Ndị-nché

Ndị-isi nchụàjà na ndị Farisii chètara okwu niile Jisọs kwuworo, ọ bụ ezie na ọ dị ka ndị ná-eso ụzọ Ya échètaghị ha. Ha gwara Pailat na Jisọs ekwuwo na Ya ga-ebili n’ụbọchị nke atọ. Ha gwara Pailat ka o nye iwu ka emechie ílì ahụ siike ka arụ Jisọs wee nọgide n’ebe ahụ. Pailat zara sị, “Unu nwere òtù ndi nche: labanu, mechienu ya si-ike dika unu mara,” dịka o nwere obi abụọ ma ha ga-apụ imechisi ya ike karịa ike nke Onyenwe anyị. Gameliel, onye ná-akuzi iwu, zipụtakwara ụdị échìchè ahụ mgbe ọ sịrị, “Ọ buru na o sitere n’aka Chineke, unu agagh-apu ikwatu ha n’ala” (Ọlu Ndi-ozi 5:39). Ndị-isi nchụàjà na ndị Farisii gbalịrị imechi ílì ahụ siike site n’ịka nkume ahụ àkárà na idebe ndị-nché ka ha chee ya nché.

Ílì Ihe Ná-adịghị

Mgbe ememe Ngabiga gasịrị, n’isi ụtụtụ, mgbe chi ákà-abọghị, Meri Magdalini jere n’ílì Jisọs. Mgbe ọ hụrụ na ewepụwo nkume ahụ site n’ọnụ-ụzọ na ílì ahụ tọgbọrọ kwa n’efu, o chètaghị na Jisọs agwawo harị banyere mbiliten’ọnwụ Ya (Matiu 16:21; 20:19; Jọn 2:19). Meri Magdaline gbakwuuru Pita na Jọn. Ọ sịrị, “Ha ebupuwo Onye-nwe-ayi n’ílì, ayi amatagh kwa ebe ha tọgbọrọ Ya” Ndịkom abụọ ahụ wee gbaa ọsọ jeruo ílì ahụ. Jọn bu ụzọ, eleghị anya ọ bụ n’ihi na ya bụ nke ntà ọ pụkwara ịgbasi ọsọ ike.

Mgbe Jọn ruru ebe arụ Jisọs tọgbọworo, ọ guzoro n’èzí wee nyoo anya nime ya. Mgbe Pita bịaruru o mere ngwa baa nime ílì ahụ Jọn wee soro ya. Ha hụrụ ezi ákwà-ozù ahụ ka ha tọgbọrọ n’ebe ahụ, ma ịchafọ nke dịworo n’isi Jisọs nọ n’ebe dị iche. Ná-enweghị obi-abụọ ọ bụla, ha anụwọ ma ha aghọtaghị. Ka ha guzo n’ebe ahụ na-ekiri ihe a, okwukwe malitere ịlụ ọlụ n’obi Jọn. “Ọ hụrụ, we kwere.”

O Biliri

Ọ dịghị onye ọ bụla bupụworo Jisọs. O siwo n’ọnwụ bilie, ákwà-ozù niile ahụ ka arapụwo kwara nime ílì. Óké ihe ịrịbá-ámá ahụ emewo dịka Jisọs kwere ná mkwà. Jisọs emewo ka ndị ọzọ si n’ọnwụ bilie -- nwa nwoke nke nwanyị Nain ahụ di ya nwụrụ anwụ (Luk 7:15), nwa nwanyị nke Jeairọs (Matiu 9:18, 25), ọbụná kwa Lazarọs onye dịworo ụbọchị anọ nime ílì (Jọn 11:17, 44). Ma Jisọs biliri pụọ n’ílì site n’ike nke Chineke. Ọ dịghị mgbe ọ bụla tupu oge ahụ ma-ọbụ mgbe nke ahụ gasịrị ụdị ihe ịrịbá-ámá ahụ meworo. Jisọs nwere ike n’ebe ọnwụ na ílì dị (Ndi Rom 6:9). Ọ bụ onye meriri ọnwụ, n’ihi na Ọ na-adị kwa ndụ anyị onwe anyị ga-adị kwa ndụ (Jọn 14:19).

Mkpụrụ Mbụ

“Otú ọ di, emewo ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie, nkpuru mbu nke ndi daworo n’ura ọnwu” (I Ndi Kọrint 15:20). N’ihi na Kraist biliri n’ọnwụ, anyị ga-ebili kwa n’ọnwụ (I Ndi Kọrint 15:23). N’ọbịbịa nke Jisọs, opi nke Chineke ga-ada “ndi nwuru nime Kraist gēbu kwa uzọ si n’ọnwu bilie: mgbe ahu ayi onwe-ayi, bú ndi nọ ná ndu, ndi anārapu, ayi na ha ka agēwelikọ n’igwe-oji, izute Onye-nwe-ayi nime mbara-elu-igwe: otú a ka ayi na Onye-nwe-ayi gānọ kwa mgbe nile” (I Ndi Tesalọnaika 4:13-17). Jisọs bụ onye mbụ siri n’ílì bilie n’ụdị ahụ. Nke a ka O mere nye anyị. Onye “arara Ya nye n’ihi ndahie-ayi nile, ewe me ka O si n’ọnwu bilie n’ihi igu ayi na ndi ezi omume” (Ndi Rom 4:25).

Okwukwe Na Mbiliten’ọnwụ

Ọ bụ ihe dị mkpà nye ụmụ mmadụ taa ikwere ná mbiliten’ọnwụ. Okwukwe na mbiliten’ọnwụ bụ ihe dị mkpà n’ihi nzọpụta nke mmadụ. Baịbụl kwuru na: “Ọ buru na i gēwere ọnu-gi kwuputa Jisus na Ọ bu Onye-nwe-ayi, ọ bụrụ kwa na i gēwere obi-gi kwere na Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, agāzọputa gi” (Ndi Rom 10:9).

Mbiliten’ọnwụ nke Kraist na-enye onye ọ bụla kwere ekwe olile-anya (I Pita 1:3). “Onye ọ bula nke nwere olile-anya nke a n’ebe Ọ nọ, ọ nēme kwa onwe-ya ka ọ di ọcha, dika Ya onwe ya di ọcha” (I Jọn 3:3). Nke ahụ pụtara na mmadụ aghaghị idozi obi na ndụ ya ka o wee nọdụ ná njikere maka ọbịbịa nke Jisọs. Aghaghị ime ka ọ dị ọcha site n’Ọbara nke Jisọs, aghaghị kwa ime ka obi ya dị ọcha pụọ ná mmehie. Mmadụ aghaghị inwe ike Chineke ná ndụ ya ka o wee nwee ike ịzá mgbe opi ga-ada n’ọbịbịa nke Jisọs. Lee otú oge ahụ ga-adị óké ebube nye ndị niile rubeworo isi n’Okwu nke Onyenwe anyị! I jikerewo maka oge ahụ Jisọs ga-abịa iwepụ ndị Ya?

Kraist Dị Ndụ

Anyị na-efè Onye-nzọpụta dị ndụ, ọ bụghị onye nọgidere n’ílì. Kraist anyị bụ onye nwe ike niile Onye ná-enye kwa anyị olile-anya dị ukwu. Anyị matara na Kraist dị ndụ n’ihi na Ọ na-ebi n’obi ndị nke Ya. Ọ ga-ekpughe Onwe ya nye ndị niile ná-achọ Ya, dịka O mere nye Meri Magdalini n’ubi ahụ agbara ogige. Ọ mataghị Onyenwe anyị ruo mgbe Ọ kpọrọ aha ya. Mgbe emesịrị, Ọ pụtara ìhè nye ndị ọzọ ná-eso ụzọ Ya. Ụfọdụ amataghị Jisọs ruo mgbe O meghere anya ha. Ndị ọzọ ekwereghị ruo mgbe ha hụrụ Onyenwe ha n’anya ha. Jisọs sịrị, “Ngọzi nādiri ndi akāhugh, ma ha kwere.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị mere anyị ji eme ememe Ista?
  2. Òlee olile-anya ọ na-enye Onye Kraist?
  3. N’ílì ònye ka eliri Jisọs?
  4. Ònye liri Jisọs?
  5. Gịnị mere ndị ná-eso ụzọ Jisọs ji na-eru uju?
  6. Gịnị mere ndị-isi nchụàjà na ndị Farisii apụghị imechi ílì ahụ siike?
  7. Ụbọchị ole gara mgbe elisịrị Jisọs tupu Ya ebilie site n’ílì?
  8. Kwuo ụfọdụ amụma mezuru n’oge ọnwụ, òlìlì, na mbiliten’ọnwụ nke Jisọs.
  9. Òlee otú ndị ná-eso ụzọ Ya ji mata na Jisọs ebiliwo ná-adị kwa ndụ?
  10. Òlee otú anyị ji mara taa na Jisọs na-adị ndụ?