Ilu 3:1-35.

Lesson 277 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Nwam, echezọla iwum; ma ka obi-gi chebe ihe nile m’nyere n’iwu” (Ilu 3:1)
Notes

Obi-ụtọ Adịghị N’àkụ-na-ụba

Eze Solomon sitere ná nwapụta mata ihe na-eme ka mmadụ nwee obi-ụtọ -- ọ bụghị kwa ihe ọ bụla ụwa a pụrụ inye. O biri n’obí mara mma, n’etiti àkụ kachasị mma nke ụwa. Ụgbọ-mmiri ya na-eje na mmiri nke ndị ọzọ mgbe niile ịchọta ihe dị ọhụụ dị kwa óké ọnụ-ahịa iwetara ya. Ndị-orù na-eme ngwa ijé n’iru na n’azụ irube-isi n’iwu ọ bụla o nyere; otù aka ahụ, ndị-agha ya jikeere mgbe niile ịdọrọ obodo n’agha ọ bụrụ na ọ chọọ.

Eze Solomon lụrụ ada-eze sitere n’Ijipt, nke mere ka o nweta iruọma nke eze Ijipt. O nwere ihe niile nke ọtụtụ mmadụ na-alụsi ọlụ ike inweta; ihe ha na-achọsi ike ná-agbasi kwa mgbá ike maka ha; otú ọ dị, ná-agbanyeghị ihe ndịa niile, ọ sịrị: “Ihe nile bu ihe-efu.” Ọ chọtaghị obi-ụtọ n’ihe niile nke ụwa a.

Obi-ụtọ nime Amam ihe

Ọ bụrụ na ikpokọta àkụn’ụba, nsọpụrụ na udé adịghị eweta obi-ụtọ, gịnị na-eweta ya? Amam-ihe nke Chineke. Ị matara otú anyi si enweta amam-ihe ahụ? Anyị adịghị agụta ya n’akwụkwọ n’ụlọ-akwụkwọ. Solomon mụtara eziokwu, o wee sị: “Nmalite amam-ihe ka egwu JEHOVA bu.” N’ihi nke a, anyị na-ahụ na mmalite nke obi-ụtọ anyị ga-abụ ka anyị hụ Jisọs n’anya nke ukwuu ruo na anyị ga-adị ndụ ime ihe na-atọ Ya ụtọ, tụọ kwa egwù, ka anyị ghara ime ihe ga-ewute Ya.

Solomon sịrị: “Nwam, echezọla iwum ma ka obi-gi chebe ihe nile m’nyere n’iwu.” Ọ na-ekwugharị ozi Chineke ziwororị Moses ọtụtụ narị arọ gara aga banyere Iwu ahụ: “I gējisi kwa ike izí ha umu-gi, i gēkwu kwa okwu banyere ha mgbe i nānọdu n’ulo-gi, na mgbe inēje ije n’uzọ, na mgbe i nēdina ala, na mgbe i nēbili ọtọ (Deuteronomi 6:7). Nwata agaghị echefu Okwu Chineke eji ekpere kụnye n’obi-ya. Ọ dịghị ọzụzụ ọ bụla sitere na Baịbụl aga-enye ga-anọchi nlefu anya elefuru ikuziri nwata ihe mgbe ọ dị ntà.

Okwu ahụ nime Obi

Ụfọdụ mmadụ na-amụsị ihe-ọmụmụ ike ka ha wee mụta iwu Chineke. Ha na-amụ ọtụtụ amaokwu nke Akwụkwọnsọ buru n’isi, ná-agbalịsị kwa ike idebezu iwu Chineke. Ma Solomon matara na ọ ga-ewe mmadụ ihe karịrị nke ahụ tupu o nwee obi ụtọ. Ọ sịrị: “Ka obi-gi chebe ihe nile m’nyere n’iwu.” Mgbe amụrụ anyị ọzọ n’ezie, anyị na-enwe iwu Chineke n’obi anyị. Ana-agbanwe ụdị eji kèè anyị, anyị na-eme kwa uche Chineke n’ihi na anyị hụrụ Ya n’anya. Mgbe ahụ obi-ụtọ anyị na-amalite.

Ijé-ijè ná Ntụkwasị-obi

Mgbe azọpụtara anyị, ndụ ọhụụ na-amalite nime anyị. Anyị na-enwe mmetụta nke udo Chineke, ịhụn’anya Ya na-ejupụta kwa ná ndụ anyị. Ọñụ nke Onyenwe anyị na-enye anyị ike na arụ-ike. Ma anyị ga-anọgide ibi ndụ n’ụwa, ọnwụnwa ga-abịakwasị kwa anyi. Ụzọ anyị adịghị adị mfé mgbe niile. Mgbe ahụ ka anyị ga-aghọta urù ịhụn’anya Chineke baara anyị karịa ka anyị ghọtara na mbụ. “Mgbe ahu ka i ganēje ijè n’uzọ-gi na ntukwasi-obi, i gagh-akpọbì kwa ukwu-gi. Ọ buru na i dina ala, i gagh-atu okè egwu: e, i gēdina ala, ura-gi gātọ kwa gi utọ.”

Ọtụtụ mgbe anyị na-anụ ka ụmụ mmadụ na-ekwu banyere ọtụtụ abalị ha nọrọ n’ararụghị ụra mgbe ha bụ ndị mmehie. Esogburu ha n’ihi ajọ omume ha, ha chekwara na ụwa niile biliri megide ha, na ọ dịghị kwa onye ọ na-emetụ n’obi. Ma mgbe Jisọs batara nime obi ha, ibu-arọ niile ahụ gabigara. Ha wee pụ ịrarụ-ụra n’udo, zuo kwa ike n’ọñụ. Chineke akụziworo ha na ihe banyere ha na-emetụ Ya n’obi, O nyewo kwa ha ụra Ya dị ụtọ.

Ọtụtụ Ndị Kraist bụ ndị-agha nwapụtara n’oge agha na Chineke na-enye ụmụYa izu-ike. Nime nsogbu niile nke ile anya nke ndị-iro mgbe dum na egwù nke ọnwụ, ha pụrụ ịnọ n’udo n’ihi na ha matara na mmụọ ozi nke Onyenwe anyị nọ nso ilekọta ha.

Ọ bụrụ na egwù na-atụ gị, gwa Jisọs. Rịọ Ya ka O wepụ egwù ahụ. Ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraist, ndị mmụọ ozi Ya na-eché gị nché ime ka ị nọdụ n’udo.

Nghọta Anyị

Ezi ndụm-ọdụ ọzọ Solomon nyere bu; “Tukwasi JEHOVA obi-gi nile, adabere-kwa-la nghọta-gi.” Ọtụtụ mgbe anyị na-achọ ka ihe ná-aga otú anyị si tụọ àtụmàtụ, ọ na-ewuta kwa anyị mgbe ha ná-agaghị otú ahụ. Onyenwe anyị maara ihe dịrị anyị mma karịa ka anyị maara, Ọ chọkwara ka anyị tụkwasị obi n’amam-ihe Ya. Ọ matakwara iru-uju nwere ike ịdakwasị anyị, na “dika nna si enwe obi-ebere n’aru umu-ya otú a ka JEHOVA nwere obi-ebere n’aru ndi nātu egwu Ya” (Abù Ọma 103:13). Mmadụ nke nwere obi-ụtọ bụ onye matara na ihe niile ya na-eme dị Chineke ezimma, na ya nwekwara ojuju-afọ ikwe ka Onyenwe anyị duzie nzọ-ụkwụ ya niile.

Ekwere anyị mkwà arụ-ike ọ bụrụ na anyị erube-isi nye uche Chineke ma rapụ ịnọgidesi ike n’ịchọ ime uche nke anyi. Ogologo ndụ na obi-ụtọ bụ ihe-nketa nke nwoke ma-ọbụ nwanyị nke ji obi ya chụọ àjà. Chineke nyere ụmụ-ntakịrị iwu ka ha sọpụrụ ndị mụrụ ha, nke atụkwasịrị, “Ka ihe we nāgara gi nke-ọma, ka i we di kwa ogologo ndu n’elu uwa” (Ndi Efesọs 6:3).

“N’uzọ-gi nile mara Ya.” N’ihe ọ bụla anyị na-eme anyị kwesịrị ịtụle ihe bụ uche Chineke. Ụfọdụ nwere ike ná-eche na ha achọghị inye Onyenwe anyị nsogbu n’ihe ntà -- na ha dị ntà nke ukwuu nye Onyenwe anyị ịma ihe banyere ha. Ma Chineke ekwuwo na n’ụzọ anyị niile anyị tụgharịa uche n’ihe bụ uche Ya, na Ya gaagọzi kwa anyị.

Ịbá-mbá

Ka ewee kuziere anyị amam-ihe, aghaghị ịpịa anyị ihe ma-ọbụ baara anyi mbá mgbe ụfọdụ. Eleghị anya anyị emewo ihe ná-adịghị mma n’amaghị-ama ma-ọbụ ná nlefu anya, o wee bụrụ na Onyenwe anyị ga-agwa anyị banyere ya; ọ bụrụ kwa na ọ dị mkpà, O nye anyị ahụhụ. Ịbá-mbá ahụ ga-eme ka anyị mara ihe karị ọ bụrụ na anyị anara ya. “Onye JEHOVA nāhu n’anya ka Ọ nābara mba; ọbuná dika nna si abara nwa-ya nke ihe ya nātọ ya ụtọ nba.”

Mgbe Pọl Onye-ozi na-edegara ọgbakọ ọhụụ nke Ndị Kraist dị na Hibru akwụkwọ, o kwuru ihe banyere amaokwu a. Ọtụtụ ihe dị nke dị ha mkpà ịmụta, ma ha were iwe n’ịbá-mbá nke Pọl. O we jisie ike igosi ha na abaara ha mbá n’ihi na Chineke hụrụ ha n’anya.

Ọ na-abụ ihe siiri ụmụ-ntakịrị ike ịghọta na ndị mụrụ ha hụrụ ha n’anya mgbe ana-enye ha ahụhụ; ma ịbá-mbá bụ ihe ga-eme ka ha bụrụ ezi ụmụ ndị ihere ha ná-agaghị eme ndị mụrụ ha.

Ebere

Anyị na-enweta ebere na ịhụn’anya nke Chineke. Ọ chọrọ ka anyi na-egosi ndị ọzọ ebere na ịhụn’anya. Otù ụzọ anyị pụrụ isi mee nke a bụ site n’ileta ndị ọrịa na eleghị anya iwegara ha okooko osisi, ma-ọbụ meziere ha ihe-ndina ha, ma-ọbụ nye ha ihe-oriri.

Otù oge Jisọs gwara ndị ná-eso ụzọ Ya na mgbe ndị eziomume ga-abịa n’iru Ya n’ikpé, na Ya ga-agwa ha sị: “Bianu, ndi agọziri agọzi nke Nnam, ketanu ala-eze edoziworo unu site na ntọ-ala nke uwa: n’ihi na agu gurum, unu we nyem ihe M’gēri: akpiri kpọrọm nku, unu we kuru miri nyem: abum ọbia, unu we kpọbatam; agbaram ọtọ, unu we gbokwasim ákwà: aru adighm ike, unu we letam: anọm n’ulo-nkpọrọ, unu we biakutem” (Matiu 25:34-36).

Ọtụtụ nime ndị eziomume ahụ ga-eguzo n’iru Jisọs nwere ike bụrụ ndị ahụbeghị Ya anya mbụ, ọ ga-eju kwa ha anya mgbe ha nyeworo Ya-rị mmiri ka Ọ ñụọ, ma-ọbụ nye Ya ihe-oriri. Mgbe ahụ Ọ ga-asị ha: “Ka ọ ra bụ otú unu si me ya nye otù onye nime umu-nnam, ndia, bu ndi dikarisiri nta, Mu ka unu mere ya nye” (Matiu 25:40). Ha ga-egosiworị ndị nọ ná nsogbu ebere. N’ihi nke a, ka anyị jisie ike inyere ndị ọzọ aka n’aha Jisọs, na-eme ya nye ha dịka anyị na-emere ya Jisọs.

Inyere ndị ọzọ aka na-enye anyị obi-ụtọ. Jisọs sịrị, “Ọ di ngọzi inye ihe kari inara ihe” (Ọlu Ndi-ozi 20:35). Ọ sịkwara, “Nēnyenu, agēnye kwa unu; ọtùtù ọma, nke abiadaworo ala, yọkọta, nke nējubiga kwa ókè, ka ha gēnye n’obi-unu” (Luk 6:38). Ọtụtụ mmadụ achọpụtawo na ka ha na-enye ndị ọzọ ihe ka ha onwe ha na-enweta ihe karị.

Mkpụrụ Mbụ Niile

Agwara anyị ka anyị meere mmadụ ibe anyị ebere, ma enyekwara anyị iwu ka anyị sọpụrụ Jehova site na “nkpuru mbu” nke ihe onwunwe anyị. Nke ahụ pụtara na anyị ga-akwụ otù ụzọ n’ụzọ iri. Otù ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ọ bụla anyị nwetara bụ nke Chineke, anyị agaghị emefu ha n’onwe anyị. Chineke ekwewo mkwà ngọzi nye ndị niile ga-erube isi. “Webatanu otù uzọ n’uzọ iri nile n’ulo-àkù nkem ka ihe-oriri we di n’ulom, biko, nwanum na nke a, ka JEHOVA nke usu nile nke ndi-agha siri, ma M’gagh-emeghere unu window nile nke elu-igwe, wusara unu ngọzi rue mgbe ọnọdu agagh-ezu inagide ya” (Malakai 3:10). Anyị ga-anata ngọzi nke ime mmụọ, natakwa nke anụ-arụ. “Ọba-gi nile gējuputa kwa n’ihe-nriju-afọ, ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi nile gētiwa kwa na manya vine ọhu.”

Chineke kwere ndị Israel mkwà mgbe ha bara na Kenean, na mmiri ga-ezo mgbe ha na-agha mkpụrụ, ọ ga-ezo kwa n’oge ha ga-acha. Ma Ọ sịrị na mmiri agaghị ezo n’oge owuwe ihe-ubi imebi ihe ọ bụla -- ọ bụrụ na ha erube-isi n’iwu Ya. Ihe niile ga-adị nnọọ mma ọ bụrụ na ndị Israel erubere Chineke isi; ma ha erubeghị, n’ihi nke a ha enwetaghị ọnọdụ niile ahụ zuru òkè.

Ebipụrụ Ndị Ná-emebi Iwu

“Ekwosola onye nēme ihe ike ekworo, arọputa kwa la otù efu n’ụzọ-ya nile.” Mgbe ụfọdụ ọ ga-adị ka ihe nagara ndị ná-emebi iwu nkeọma nime ụwa a karịa Ndị Kraist, ma Devid sịrị: “Agēbipu ndi nēme ihe ọjọ: ma ndi nēle anya JEHOVA, ndi ahụ gēnweta ala” (Abù Ọma 37:9). Ezi Ndị Kraist ga-eso Jisọs chịa ọchịchị puku arọ n’ụwa nke a mgbe Ọ ga-abịa ọzọ.

Mkpakọrịta Anyị na Onyenwe anyị

Ìzù nzuzo nke Onyenwe anyị dịrị ndị eziomume. Ha na Ya na-enwe mkpakọrịta dị nso nke ndị ụwa ná-amaghị ihe banyere ya. Ọ na-agwa ha banyere ịhụn’anya Ya, na Ya chọkwara ka Ya na ha bikọọ n’ebube Ya. Site na Baịbụl anyị na-amụta mkwà Ya dị óké ọnụ-ahịa; ọ bụrụ kwa na anyị erube-isi n’iwu Ya niile, mkwà niile ahụ ga-emezu n’arụ anyị. “Ìzù nzuzo JEHOVA dịrị ndi nātu egwu Ya; ya na ọgbugba-ndu-Ya, ime ka ha mara ihe” (Abù Ọma 25:14).

“Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke chọtaworo amam-ihe bu, ya na madu nke nēnweputa nghọta.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Òlee ụdị ihe dị iche iche Solomon gbaịlịrị ịchọta obi-ụtọ nime ha?
  2. Gịnị ka Solomon kwuru banyere ihe nke ụwa?
  3. Gịnị bụ mmalite amam-ihe?
  4. Òlee ebe o kwesịrị ka anyị nwee iwu Chineke?
  5. N’ụzọ òle ka anyị kwesịrị ịmara Chineke?
  6. Gịnị ka Onyenwe anyị na-eme ụmụ Ya dahiere adahie? Gịnị mere?
  7. Gịnị mere ndị mụrụ ụmụ ji enye ụmụ ha ahụhụ?
  8. Nye ihe ịma-atụ nke igosi ebere.
  9. Gịnị bụ mkpụrụ mbụ?
  10. Gịnị ga-eme ndị na-eme ihe ọjọọ?