Ilu 4:1-27

Lesson 278 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Karia ihe-ndebe-gi nile chebe obi-gi; n’ihi na site na ya ka nputa nile nke ndu di” (Ilu 4:23).
Notes

Nna Solomon

Anyị amụwo ọtụtụ ihe banyere Devid -- nwata nwoke na-azụ atụrụ, onye na-akpọ ụbọ akwara, onye na-ede abụ, na eze. Ọ bụ kwa onye-òzízí ukwu, ọ ga-ejiwokwarị ọtụtụ áwà ná-akuziri ụmụ ya ihe. Ọ bụ ezie na Solomon abụghị nwa nwoke amụrụ náánị ya, ma nna ya nwere obi-ọma ziri ya ihe were kwa nleru anya duzie nzọ-ụkwụ ya dịka ọ bụ nwa amụrụ náánị ya. Chineke nyere Solomon ike idepụta okwu ahụ niile nke ọ nụworo n’ọnụ Devid nye ụmụ ntakịrị, ụmụ okorọbịa na ụmụ agbọghọbịa, ewee dee ha na Baịbụl.

Mgbe ụfọdụ ike na-agwụ ụmụ ntà ịnụ ka ndị mụrụ ha na-ekwu na-ekwukwasị, “Ị pụghị ime nke ahụ”; “Ị pụghị ije ebe ahụ”; “Ị ghaghị ime dịka m’gwara gi.” Ma gee ntị ka Devid bụ Eze, otù nime ndị kachasị n’etiti mmadụ, na-ekwu. Ọ dị nnọọ ka anyị na-ahụ ya ka ọ na-asị, “Solomon nwam nwoke, ‘nweta amam-ihe, nweta nghọta: … echezọla; … Arapula ya, … Isi ihe ka amam-ihe bu; nweta amam-ihe: e, were ihe nile i nwetaworo nweta nghọta.’ ” (Ilu 4:5-7). Ma n’otù abalị nnwapụta bịara: Solomon ò gere nna ya ntị n’ezie? Ọ ñara ntị nkeọma mgbe nna ya nyere ya ndụm-ọdụ? Anyị chetara nkeọma akụkọ banyere abalị ahụ mgbe Chineke zutere Solomon ná nrọ we sị, “Rịọ ihe M’gēnye gi.” Arịrịọ Solomon “we di nma n’anya Onye-nwe-ayi” (I Ndi Eze 3:10). “… nye orù-Gi obi nānu ihe ikpe ndi-Gi ikpe, ighọta ihe di iche n’etiti ezi ihe na ihe ọjọ.” Ọ bụ ezie na amam-ihe Solomon natara sitere n’aka Chineke, ma ná-arụghị ụka ọ bụ òzìzí ọ natara n’aka nna ya mere ka ọ rịọ amam-ihe.

Izere Ọnwụnwa

Ka anyị gụọ site n’ebe ọgụgụ anyị ihe ọzọ dị iche iche Solomon mụtara n’ọnụ nna ya, nke ọ na-eme kwa ka anyị mara. Ama-okwu nke iri na anọ na iri na ise na-agwa anyị: “Abàla n’okporo-uzọ ndi nēmebi iwu, aga-kwa-la n’iru n’uzọ ndi ọjọ. Zere ya, agabigala nime ya: wezugara ya onwe-gi, gabiga.” Ọ bụrụ na anyị mata ebe mmehie dị, anyị pụrụ izere ịdaba n’ọnwụnwa site n’iwezuga onwe anyị n’ebe ahụ. O kwesịghị ka anyị danye n’ọnyà nke ekwensu dọbawooro anyị. Ọ dịghị anyị mkpà ịgụ ihe-ndepụta banyere sinima nke pụtara ọhụụ. Ọ dịghị mkpà na anyị ga-agụ akwụkwọ ọjọọ dị iche iche ma-ọbụ gee ntị n’ihe dị iche iche rụrụ-arụ ana-eme na redio tutu anyị amata na ọ bụ ihe na-emebi omume ụmụ okorọbịa na ụmụ agbọghọbịa. O kwesịghị ka anyị yiri uwe ma-ọbụ mee omume dịka ndị ụwa.

Ekwensu na-anwa mmadụ site n’uche na anya. Mgbe ọnwụnwa bịakwasịrị mmadụ onye ahụ wee kwenye wee mee ihe ọ matara na o zighị ezi, obi ya anọghị n’okpuru Ọbara. Solomon dere, “Kari ihe-ndebe-gi nile chebe obi-gi; n’ihi na site na ya ka nputa nile nke ndu di.” Anyị na-agụ na Mak 7:21, 22, na site n’obi ka ọtụtụ ihe mmebi iwu na-esite: “échìchè nile jọrọ njọ, ikwa-iko nile, ori nile, igbu-madu nile, ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, anya-uku nile, ajọ ihe nile, aghughọ, agu ikwa-iko, ajọ anya, nkwulu, npako, na enwegh-uche.”

Ihe Nlere-anya -- Nke Ọjọọ na Nke Ọma

Ekwensu matara ụzọ esi arafu mmadụ. N’Ogige Iden ọ bụ mkpụrụ osisi ahụ Chineke sịrị ha erila ka o ji rafuo ha; na gburugburu ala niile nke Jọdan, ọ bụ ala mmiri na-ede nkeọma ka o jiri rafuo; n’obodo Jeriko, mgbe ndị Israel bàra inweta obodo ahụ, ọ bu otù mkpirikpi ọla-edo na otù ezi uwe nwuda nke Shaina ka o ji. O ji agụụ ihe-oriri rafuo Isọ -- o wee ree ọnọdụ ọkpara ya ngwa ngwa n’ihi achịcha na ofe lentil.

Anyị chetara akụkọ banyere Belam na akụkọ Gihezi, bụ orù Elaisha. Ndịkom abụọ ndịa gbasoro urù nke ụwa. Ananaias na Safaira kwa, gbalịrị inweta urù site n’aghụghọ, ma ha ji ndụ ha kwụọ ụgwọ. Ma, ekele dịrị Chineke n’ihi Jisọs onye meriri ọnwụnwa! O nwere ike ijide anyị ka anyị ghara ịda ọ bụrụ na anyị ledgide Ya anya.

Ezi Onye Kraist na-ebu akàrà nke nwa Chineke, apụkwara ịmata ya site n’akàrà ahụ. Ndị ọzọ pụrụ ịsị na ọ dị iche bụrụ kwa mmadụ agba ochie, ma nke ahụ dị mma karịa ịbụ onye amaara aha ya n’ụwa wee bụrụ onye ná-adịghi enweta iruọma nke Chineke. Ekwuwo ya sị “omume bụ nnọọ ihe madụ bụ; ude aha bụ nánị ihe echere na ọ bụ.”

Egbochiri Obi Ntiwa

Ụfọdụ ụmụ okorọbịa na ụmụ agbọghọbịa chère na ha aghaghị ibi ndụ mmehie nwa oge ka ha wee nwee ike ịgba-àmà nye Jisọs mgbe azọpụtara ha. Nke ahụ bụ échìchè ihie ụzọ. Anụrụ ka otù nwa agbọghọbịa sịrị, “Anamañụrị ọñụ na abàram nime ụwa wee detụ mmehie nke ndụ ire, n’ihi na agaghịm enweworị afọ juju ná-anwapụtaghị ha.” Ụgha ekwensu nke a emewo ochie dịka ụwa onwe ya, n’ihi na ekwensu nyere Iv nchèpụta yiri nke a na mmalite nke oge mgbe ọ sịrị na ọ ga-enwe amam-ihe ọ bụrụ na o rie mkpurụ nke osisi ahụ a sịrị ha erila. Ma mmadụ ekwesịghị ibu ụzọ bụrụ onye mmehie tupu ya amara ihe, “Amam-ihe nke uwa nke a bu ihe-nzuzu n’ebe Chineke nọ” (I Ndi Kọrint 3:19). Ọ dịghị mkpà ka mmadụ keta òkè n’ihe ọjọọ niile nke ụwa ka o wee mara na ọ dịghị ihe ọzọ ọ na-eweta ma ọ bụghị obi ntiwa, iru-uju, na ịkwa-ụta. Ọ dịghị mkpà ka mmadụ detụ ihe ilu nke mmehie ire tutu ya amata na ha na-edebe ihe ọgbụgba ha n’arụ mmadụ. Eleghị anya mmadụ pụrụ ịchọta ọñụ ná-adị nwa oge n’ihe-ụtọ nke mmehie, ma ezi obi-ụtọ na udo ná-adịgide na-esite náánị n’ịjụ ụdị ọ bụla nke mmehie na ịchọ wee chọta Onye ahụ na-enye ezi onyinye niile na onyinye ọ bụla zuru òkè. Otù nwa agbọghọbịa azọpụtara mgbe ná-adịghị anya gara aga sịrị na échìchè banyere arọ niile ya tụfuru nime mmehie bụ náánị ihe mwuta ya nwere na ndụ ya dịka Onye Kraist.

Otù onye ụkọ Chukwu kwuru okwu a sị: “Mgbe m’bụ nwata, wee na-anụ ka Ndị Kraist na-agba àmà banyere óké mmehie jọgburu onwe ha nke Onyenwe anyị zọpụtara ha na ya; ọdịm ka m’bụ onye emegburu emegbu, n’ihi na enweghịm oghere ime ụdị mmehie niile ahụ. Ọ bụ náánị mgbe arọ ole-na-ole gasịrị ka m’malitere ịghọta ụdị ngọzi dị ebube Onyenwe anyị gọziworom. Ọ zọpụtaghịm site nime òlùlù nke mmehie, kama site n’aka nne na nna bụ Ndị Kraist na òtù ọma dị iche iche ana-apụghị ịgụta ọnụ, Ọ zọpụtaram pụọ n’ịdaba n’òlùlù.” Mgbe otù onye nwere nghọta dị omimi n’ọlụ nke ịnapụta ndị ná-ala n’iyì na-agwa ndị-ọlụ, ndị-nkuzi nke Ụlọ-akwụkwọ Ụbọchị-ụkọ, na ndị nne na nna okwu, ọ sịrị: “Ọlụ unu dị mkpà karịa nke ndị ná-agbasa Oziọma. Unu na-anapụta ndụ kpamkpam; ma anyị na-achịkọta ndụ tiwaworo etiwa. Unu na-anapụta mmadụ pụọ n’obi ntiwa na ịkwa-ụta; anyị na-agbalị ikekọta obi nke tiwaworo etiwa … Ọtụtụ ụmụ okorọbịa na ụmụ agbọghọbịa na-amịpụ n’aka unu, unu ndị nne na nna, … ndị-nkuzi na ndị-nkwusa; nlefu-anya unu na-eme ka ọlụ nke ịnapụta ndị n’ala n’iyì dị mkpà. … Ọ dị óké mkpà ịnapụta ndụ pụọ n’ịdaba n’òlùlù nke mmehie karịa isite nime òlùlù nke mmehie gụpụta ya mgbe o rusịrị unyi, tipịa, tiwaa kwa.”

Ịdị-mkpà nke Ụlọ-akwụkwọ Ụbọchị-ụkọ

Ọ bụghị ụmụtakịrị niile nwere iruọma inwe nne na nna na-atụ egwù Chineke dịka Solomon. Ọtụtụ ndị nne na nna n’ụbọchị ndịa na-elefuru ọlụ dịrị ha anya, n’ihi na ha adịghị eziga ụmụ ha Ụlọ-akwụkwọ Ụbọchị-ụkọ, ha adịghị agụpụta kwara ha Okwu Chineke; site na nke a ha adịghị agha mkpụrụ nke eziokwu ahụ n’obi ndị ntà ndịa. Ụmụntakịrị ná-aga Ụlọ-akwụkwọ Ụbọchị-ụkọ mgbe niile nwere ohere ka mma ịmara ezi ihe site n’ihe ọjọọ, bụrụ kwa ndị ejikeere ịbànye nime ụwa jupụtara n’ọnwụnwa, karịa ndị ná-adịghị aga. Otù onye nkuzi Ụlọ-akwụkwọ Ụbọchị-ụkọ gwara ụmụ akwụkwọ ya otù mgbe sị, “Otù onye nime unu ụmụ okorọbịa nwere ike ịbụ ụkọ Chukwu.” Otù nime ụmụ okorọbịa ahụ wee kwuo ngwa ngwa nime obi ya sị, “Agamabụ nwa okorọbịa ahụ.” Ọ bụ ezie na ọ gbara náánị arọ iri na atọ ma-ọbụ iri na anọ n’oge ahụ, ma site n’ụbọchị ahụ ruo mgbe o kwuru okwu Chukwu mbụ ya, o nweghị agụụ ịbụ ihe ọzọ na ndụ ya. Azọpụtara ya mgbe ọ gbara arọ iri na isii, emesịa o wee ghọọ ụkọ Chukwu. Otù onye ikpe nke ọtụtụ puku ụmụ okorọbịa bịaworo n’iru ya sịrị n’otù oge, “Ụmụ okorọbịa na-aga Ụlọ-akwụkwọ Ụbọchị-ụkọ adịghị abịa ịhụm.”

Chineke kwuru banyere Abraham na ézìnaụlọ ya sị, “N’ihi na amawom ya, ka ọ wee nye umu-ya na ulo-ya, ndi gānọchị ya, iwu, ka ha we debe uzọ JEHOVA, ime ezi omume na ihe ekpere n’ikpe” (Jenesis 18:19). Ị doziwo ndụ gị n’iru Chineke nke pụrụ ime ka O kwuo banyere gị sị: “Amamwom nwatakịrị a mara kwa nne na nna ya, mara kwa otú ha doziworo nzọ-ụkwụ ha; ha agaghị-échigharị gaa n’aka nri ma-ọbụ n’aka ekpe, kama ha ga-anọgide n’ụzọ ahụ dị warara dị kwa mkpagide nke na-eduba n’Eluigwe.”

Okporo-ụzọ Emere Ka O Guzozie

“Me ka okporo ụzọ nke ukwu-gi abua di lari.” Ọ bụrụ na i nwere olile-anya ịbụ onye nkuzi n’ụlọ-akwụkwọ ma-ọbụ onye na-edozi ígwè eji alụ ọlụ, ị ga-ejikere onwe gị maka ọlụ ahụ. Inwe nlepụ-anya na ezi àtụmàtụ ka ọgan’iru nke ndụ dabeere. Otú a ka ọ dị kwa na ndụ nke Onye Kraist. Onye Kraist arapụwo ekwensu na ụzọ nke na-eduba n’ịla n’iyì, o chekwara iru n’ụzọ nke Chineke na Eluigwe. Ụkpụrụ nke Oziọma ka o ji atụ àtụmàtụ nke ndụ ya. Ọchịchọ ya niile bụ ịlụrụ Chineke ọlụ kachasị mma na irita ọtụtụ mkpụrụobi niile o nwere ike n’urù nye Chineke ná ndụ a dị mkpụmkpụ. Ọ bụrụ na o nwere olile-anya isoro ndị abụ ndị-okenye n’ụlọ nzụkọ Kraist, ọ ghaghị iji obi ya niile mụọọ ihe-ọmụmụ niile nke abụ ya. Ọ bụrụ na ụzọ ihe ụwa meghee nye ya, ihe mbụ ọ na-atụle n’uche ya bụ: “Ọ ga-ebochi ọlụm nye Chineke? Àpụrụm ime ihe a, jezue kwa òfùfè niile n’ụlọ Chineke? Ọ bụrụ na ọ ga-anapụm ohere ọ bụla m’nwere ịlụrụ Chineke ọlụ, ọ ka mma na m’sịrị É-è.” Ọ kara gi mma igbochi ụzọ ọ bụla nwere ike ime ka ịnụ-ọkụ n’obi gị nye Chineke na ndabere gị n’ebe Ọ nọ bilata. Ana-eme ka ndụ gị n’ọlụ Chineke baa ụbakarị site n’inwe ezi nleru-anya n’ebe egbugbere ọnụ na anya gị dị, ha na obi gị kwa: “Si n’ebe i nọ wezuga ọnụ nēkwu ihe gbagọrọ agbagọ, me kwa ka egbugbere ọnu nke nēkwuhie ekwuhie di anya n’ebe i nọ, Ka anya gị abụa legide n’iru, ka mbubere anya gi lezi kwa n’iru gi.”

Ka nwa okorọbịa na nwa agbọghọbịa ọ bụla gee ntị nkeọma n’okwu niile nke nwoke nwere amam-ihe kachasị: “Nwam (nwoke ma-ọbụ nwayị), ña nti n’okwum nile; tọ nti-gi n’ala n’okwu-ọnum nile. … debe ha n’etiti obi-gi.” Nke a bụ iwu nwere mkwà: “N’ihi na ndu ka ha buru ndi nāchọta ha, ha bu kwa ihe nāgwọ anu-aru-ha nile” (Ilu 4:20-22).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Site n’aka onye ka Solomon natara amam-ihe ya?
  2. Kpọọ aha ihe ụfọdụ ekwere ndị ga-enweta amam-ihe ná mkwà.
  3. Òlee otú anyị nwere ike isi zeere ọnwụnwa?
  4. Gịnị bụ ihe dị iche site n’ụzọ nke onye eziomume na okporo-ụzọ nke onye ná-emebi iwu?
  5. Gịnị mere o ji dị óké mkpà ka i “chebe obi-gi.”
  6. Gịnị ka “ọnu nēkwu ihe gbagọrọ agbagọ” na “gbugbereọnụ nēkwuhie ekwuhie” pụtara?
  7. Iwu ole nwere mkwà ka ị chọpụtara n’ebe ọgụgụ a?
  8. Nime Baịbụl niile, ònye ka ekwere mkwà ogologo ndụ?