Ilu 6:1-19

Lesson 279 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBIN’ISI: “N’iru ntipa ka npako nāga, ọ bu kwa n’iru isu-ngọngọ ka idi-elu nke mọ madu nāga (Ilu 16:18).
Notes

Ibi Ndụ anyị Kwa Ụbọchị

Site ná mkpali nke Mmụọ Solomon ghọtara ihe mmadụ bụ nkeọma. Ọ matara nsogbu niile ná-apụta n’ụbọchị niile nke ndụ. Ọ matara na ụfọdụ mmadụ adịghị adị ike n’ọlụ, ma ndịọzọ na-alụsi ọlụ ike, ụfọdụ na-edebe ụfọdụ nime ego ha nwere, ma ndị ọzọ na-emefusi ego niile ha nwere n’ụzọ n’ezighị ezi. Solomon dere ọtụtụ ilu ya iji gwa ụmụ mmadụ nke bụ ezi ihe ha ga-eme.

Omume ụmụ mmadụ taa ka dị kwa otú ahụ ọ dịrị puku arọ atọ (3,000) gara aga mgbe Solomon bụ eze. Anyị ga-ahụ nime ihe ndepụta ya niile ụzọ esi egbò mkpà ọ bụla ná-adakwasị anyị nime ibi ndụ anyị kwa ụbọchị.

Àmà onye nke Kraist gbara n’ụlọ-ụkọ abụghị akụkọ niile nke ndụ ya. Solomon na-eleba kwa anya ịhụ otú mmadụ si ebi ndụ n’ebe ndị èzínaụlọ ya nọ, otú o si eme omume n’ụlọ-ọlụ n’etiti ndị ọlụ ibe ya, na otú ya na ndị ọbịa si ná-emekọrịta ihe. Chineke na-ahụ ọlụ niile nke mmadụ, Ọ chọghị kwa ka mmadụ bụrụ onye ná-adịghị ike n’ọlụ, onye mpako, onye ná-ese okwu, ma-ọbụ onye ná ala ihe n’iyì.

Onyenwe anyị agwawo anyị na anyị aghaghị ịnọgide n’ọlụ ruo mgbe Ya ga-abịa. Anyị aghaghị ịnọgide ná-eri nri, ná alụpụtara onweanyị ihe anyị ga-eyi, na ebe obibi. Anyị aghaghị ilekọta ndị okenye, ndị ọrịa, ndị ngwụrọ, na ụmụntakịrị. Site ná ndụ ọma anyị na-ebi, anyị pụrụ ịbụ ihe ịchọ mma nye Nzukọ Ya.

Ume-Ngwụ

Enwere ụfọdụ mmadụ ndị ná-achọghị inyere onye ọ bụla aka, ọbụná nye onwe ha. Ọ dịghị onye ọ na-atọ ụtọ ịnọ nso onye ume-ngwụ dị otú a. Ụmụ anụmanụ na ụmụ arụrụ na-alụsi ọlụ ike karị ụfọdụ mmadụ. Tụgharịanụ uche na ụmụ ndanda. Solomon sịrị: “Jekuru ndanda onye ume-ngwu; Le uzọ-ya nile we mara ihe.” Gịnị bụ ume-ngwụ? Ọzịzá akwụkwọ na akọwa okwu nyere bụ nke a: “Onye ahu bu onye ume-ngwu site na omume ya, nke mere na ọ chọghị kwa ime ihe ọ bula.” Ya mere, nwa ahụ nke ná-achọghị inyere ndị mụrụ ya aka, nke ná-achọ kwa ka ha ná-ejere ya ozi mgbe niile bụ onye umu-ngwụ.

Nwantà ahụ ná-eje ozi mgbe niile bụ nwa nwere ọñụ. Ọ na-abụ ọlụ dịrị ụmụ, mgbe ha dị ntakịrị inyere ndị mụrụ ha aka ịchọta ihe aga-eri; ma mgbe ézìnaụlọ ahụ karịrị na mmadụ, ana-enwe ọtụtụ ọlụ aga-alụ nime ézìnaụlọ ahụ. Onye ọ bụla na enwe ọlụ nke ya, ọ na eju kwa ụmụ ntakịrị afọ mgbe ana-akụziri ha ime ihe dị iche iche. Ihe ntakịrị ahụ ha ritara ma-ọbụ enyere ha iji kwụghachị ha ụgwọ ọlụ ha lụrụ na-amasị kwa ha.

Taa, ụfọdụ mmadụ n’akụkụ dị iche iche ebe ha bi nwere ego rii nne, nke mere na ọ dịghị mkpà na ụmụ ha ga-enye aka na ịchọta ihe oriri. Ọtụtụ nime ha tolitere ná-amataghị urù ego bara, ụzọ esi enweta ya, ma-ọbụ otú esi emefu ya n’ụzọ ziri ezi. Ihe ha na-eme bụ ịgwá ndị mụrụ ha ihe ha chère ha kwesịrị inwe, ná-arịọ kwa ka ewere ya nye ha.

Ọtụtụ mgbe ndị nne na-eche na ọ dịrị ha mfé ịlụ ọlụ ha n’onwe ha, karị ịkụziri ụmụ ha ndị-nyom otú esi alụ ọlụ ahụ wee rụgide kwa ha ka ha ná-enyere ha aka. N’ihi nke a ụmụ agbọghọ ndịa ewee tolite ná-amataghị otú ọlụ dịrị ha ra, ya na njikere ha ga-eme iji nwe èzínaụlọ ebe udo na ọñụ ga-adị. Ákụzirighị ha otú esi egbò mkpà na ibu-ibu arọ niile. Ọ na-aka ha mma igwuri egwú karị ịlụ ọlụ; n’ihi nke a, mgbe ha tolitere ọlụlụ di na nwunye ha ewee bụrụ ihe gbasasịrị.

Ihe Ndị Dị Ntà Nwere.Amam-ihe

Solomon dere ọtụtụ akwụkwọ banyere òkìkè, ọ matakwara ihe banyere omume ụmụ arụrụ. Ná-arụghị ụka, ọ hụwo ụmụ ndanda ka ha na ebu ibu dị arọ karịrị ha onwe ha, o wee ná-eche n’iju-anya ebe ha bù ihe a ná-aga. Ọ ga-abụ na o lebawo anya nkeọma nime akwụ ha wee hụ mkpụrụ niile ahụ ka ha doziri ya nkeọma n’ihi oge oyi. N’oge ahụ niile ala dị kọrọkọrọ, ụmụ ndanda ntakịrị ndịa agaghị ezu-ike, ha ga-agbara gaa ebe a na ebe ọzọ, ibukọtara ha ihe oriri n’ihi oge oyi. Ha enweghi amam-ihe dịka mmadụ, kama Chineke enyewo ha ihe ná-akpali ha ịgwá ha ihe ha ga-eme.

Otú ụmụ ndanda si kpaa akwụ ha, na-abụkarị ihe ịtụ-na-anya ọtụtụ mgbe. Mgbe ụfọdụ ana-enwe ọtụtụ ụlọ ime na okpuru ya. Oge ọzọ ha na-ewu kwa ya dịka ụlọ ntà ma-ọbụ ájà akpụrụ akpụ n’elu ala. Ha na-ekewasị ya n’obodo n’obodo, wee mee ụzọ na ejikọta ha n’elu ala, mee kwa okpo n’okpuru ya.

Onye ọ bụla na-enwe ihe ọ na-alụ n’Obodo Ndanda. Ụfọdụ na-akpà akwụ, ndị ọzọ na-alụ ụzọ. Agwara anyị banyere otù ndanda nke gbupụrụ ahịhịa nke dị gburugburu ebe akwụ ya dị, nke mbara ala ahụ o gburu ruru ọtụtụ rula iri ma-ọbụ iri na abụọ iji nye ohere ka mkpụrụ ahụ ana-akpọ osikapa ndanda wee na-eto (náánị ya), ná-enweghị kwa ihe ọzọ ná-eto n’ebe ahụ. Edebere ụfọdụ ndanda iche ịbụ ndị agha. Ha na-apụ mgbe ụfọdụ ijé dọta ndanda ndị ọzọ n’agha ịbụrụ ha ndị orù. Ha na achịkọta ákwá ahụ wee chịba ha nime akwụ ka ewee bụọ ha, ndị ahụ adọtara n’agha ka ana-enye ọlụ dị nime akwụ ịlụ. Ndanda na-eme ka ụmụ irighiri ndanda bikọta n’otù ebe ka ha wee na-ewepụtara ha mmiri ara-ehi dịka ehi anyị na-ewepụtara anyị.

Solomon sịrị na ụmụ ndanda bụ otù nime ụmụ ihe anọ dịkarịsịrị ntà n’elu ụwa, ma ha jupụtara n’amam-ihe nke ukwu “ndi nādigh-ike, ma ha nēdozi nri-ha na mgbe okpom-ọku” (Ilu 30:24, 25). Mgbe oge oyi bịara ha na-anọdụ n’ụlọ ha n’ezu ike nkeọma, ná-eriju afọ arụ ewee ná-ekpo kwa ha ọkụ.

Ijikere maka Ebighị-ebi

Ọ bụghị náánị ịlụsi ọlụ ike kwa ụbọchị ka anyị pụrụ ịmata site n’aka ụmụ ndanda, kama anyị pụkwara iwere ụdị ịdị ike ahụ ha nwere ná-eme ihe nke ime mmụọ nke dịrị ndụ anyị. Ugbụ a bụ oge iji jikere maka ebighị-ebi. Oge ga-agawo kwarị mgbe “owuwe-ihe-ubi agabigawo, nghọkọta-nkpuru agwusiwo.”

Okwu Chineke na-agwa onye mmehie taa sị, Rùe ole mgbe ka i ganēdina ala, gi onye-umu-ngwu? Òle mgbe ka i gēsi n’ura-gi bilie?” Ọtụtụ ụmụ okorọbịa na ụmụ agbọghọbịa na-ejegharị ná-añụrị, ná-enwe ihe ụtọ nime mmehie, ná-echeghị échìchè ọ bụla banyere ikpé. Rùo òle mgbe ka ha ga-eteta ịmata ihe egwù chère ha n’iru iwepụ uche ha site n’ebe Chineke nọ? Anyị matara na okenye na anwụ -- ma ụmụ okorọbịa na ụmụ agbọghọbịa na anwụ kwa. Mgbe ụfọdụ ọrịa nwere ike bịa nwatakịrị arụ siriike ụbọchị ole-na-ole. Ihe mberede nke okporo-ụzọ nwere ike iwepụ ha ọsọsọ karị.

Oge adị na nwata bụ oge ịchọ Onyenwe anyị, mgbe akọn’uche ka dị nrò, ọ pụkwara ịnụ olu arịrịọ nke Jisọs. Ọ bụrụ na ụmụ mmadụ anọgide n’ime ka obi ha sie ike n’ebe olu nke Chineke dị, oge na-abịa mgbe ha ná-agaghị anụ kwa mkpali nke ịchọ Onyenwe anyị ọzọ.

Otù mgbe otù Onye ọzụzụ-atụrụ kọrọ akụkọ a: “Abaram nime otù ụlọ ewuru nime ubi, n’ọnwa nke Iri na otù nke arọ, n’ehihie mgbe oyi na-atụ, m’wee nọọ otù hour n’ebe ahụ ná-enwe mkparịta ụka n’ihe banyere okpukpé mu na èzínaụlọ ahụ. Otù agadi nwoke -- onye nwere ọñụ na ịhụn’anya – wee sorom rue n’ọnụ-ụzọ gwam nnọọ nkeọma sị ‘Ekelem gị otú isi bịa leta anyị, anam enwe kwa olile-anya na nke a agaghị abụ nke ikpe-azụ. Dịka ị malitere ọlụ gị n’etiti anyị, achọrọm inye gị okwu ndụm-ọdụ. Biko rapụ anyị bú ndị okenye, nyebiga onwe gị ókè n’ịhụ ihe banyere ụmụ okorọbịa na ụmụ agbọghọbịa nọ nime igwè atụrụ gị. Ihe banyere mkpụrụ-obim metụtaram n’obi nke ukwuu ihe dịka iri arọ anọ gara aga; ọtụtụ ụmụnna chègharịrị, ma abụghịm otù onye nime ha. Emesịa, nime ijéozi Chineke nke onye ọzụzụ-atụrụ ọzọ, ọtụtụ chègharịkwara, ma échègharịghịm. Ọtụtụ arọ ugbu a, enweghịm mmetu ọ bụla banyere òzízí nzọpụta a! Amataram na abụm onye mmehie furu-efu. Amataram na ọ bụ site náánị na Jisọs Kraist ka m’ga-enwe nzọpụta; ekwerem n’ihe ikwusara, ma ọ dịghị emetum n’arụ dịka aga-asị na abụm aja akpụrụ akpụ. Anam ele anya na m’ga-adị ndụ wee nwụọ kwa dịka m si dị. Ya mere rapụ anyị nime mmehie anyị, ma nye ike gị n’ịlụ ọlụ banyere nzọpụta nke ụmụ okorọbịa na ụmụ agbọghọbịa.’

“Elegiderem ọga n’iru nwoke ahụ anya. O siri ike ịhụ mgbe ọ ná-anọghị n’oche ya n’ụlọ ekpere; kama ọ bụ ezi onye-amụma nke ihe dakwasịrị ya. O biri ndụ ya dịka o kwuru na ọ ga-adị; wee nwụọ kwa otú ahụ. Emesịa anyị wee tọgbọ ya nime ílì ya nke olile-anya ná-adịghị, n’etiti ọgbakọ ahụ nke ọ ná-adịghị mgbe Chineke rapụrụ imeghere ha window niile nke Eluigwe.” Ọ ga-adị nnọọ mma, ma asị na ụmụ okorọbịa na ụmụ agbọghọbịa ga-eteta n’ụra ghọta onwe ha tutu ha akpasuo Mmụo nke Chineke iwe, ọtụtụ ugbò, O wee site n’ebe ha nọ wezuga Onwe ya! Okwu Chineke nyere iwu sị: “Cheta kwa Onye kèworo gi n’ubọchi nile i di n’okorọbia, mgbe ubọchi ihe ọjọ akābiagh, na mgbe arọ akābiarugh nso, mgbe i gāsi, Ha atọghm utọ” (Eklisiastis 12:1).

Anya Dị Elu

Ọ dịghị mgbe ọ bụla Chineke na-eji anya ebere ele mmehie, ma Solomon kwupụta kwara ihe asaa pụtara ihe nke Chineke kpọrọ asị. Nke mbụ bụ anya dị elu. Ụfọdụ nwere ike sị na ha emebeghị ihe ọ bụla jọkarịrị njọ n’ihi nke a, na o doro ha anya na Chineke ga-akpọrọ ha gaa Eluigwe. Ma anya dị elu bụ kwa ihe árụ n’iru Chineke. Otú ọ dị, ọ bụ site ná mpako dị nime obi, ka anya dị elu si apụta. Chineke ekwuwo na ọ bụ ndị dị nwayọ n’obi ga-eketa ụwa.

Ịnụwo ihe banyere Sọdọm, bụ obodo ahụ Chineke si n’Eluigwe zokwasị ọkụ na brimstone dịka mmiri n’ihi mmebi iwu ha niile. Ị ma ụfọdụ mmehie ahụrụ n’obodo ahụ mere ka iwe Chineke dakwasị ndị bi nime ya? Nke a bụ mmehie nke Sọdọm: “Npako, na afọ ojuju nri, na udo nke inọ-ju, diri ya na umu-ya ndinyom; ma ọ megh ka aka nke onye ewedara n’ala na ogbenye di ike. Ha we di elu n’obi, me ihe-árụ n’irum” (Ezikiel 16:49,50).

Amara Sọdọm ikpé n’ihi na ndị bi nime ya bụ ndị mpako. Ha chère na ha dị mma karị ndịọzọ. Eleghị anya ha na-ekwu okwu dịka ọgaranya ahụ ná-enweghị uche: “Nkpuru-obi, i nwere ọtutu ezi ihe edebere nye gi rue ọtutu arọ; nēzu ike, nēri ihe, nāñu ihe-ọñuñu, ka obi nātọ gi utọ” (Luk 12:19). Ma Chineke kpọrọ mpako ha, ume-ngwụ ha, iribiga ihe ókè ha, na kwa ha adịghị enyere ndị ogbenye aka asị. Ka anyị leba anya n’okwu niile nke Chineke, iji nwee njikere izute Jisọs mgbe Ọ ga-abịa.

Ụgha

Ire okwu ụgha bụ ihe ọzọ nke Chineke kpọrọ asị. Ọ ga-abụ na ọ mataghị na ọ bụ ihe jọgburu onwe ya na njọ, bụ ikwu ụfọdụ okwu ụgha ntakịrị “ụgha ọcha” iji gbanarị nsogbu ma ọ bụ iji nwetara onwe gị iruọma: ma Chineke sitere n’ọnụ Solomon kwuo na Ya kpọrọ ihe dị otú a asị. Chineke chọrọ ka ụmụ Ya n’ekwu eziokwu site nime obi ha, ka ha ghara kwa ime omume nke ụgha dị nime ya. Ndị ụgha niile -- ọ bụghị náánị ndị ahụ kwuru okwu ụgha nke ha ná-akpọ “ụgha oji”-- ga eketa ókè ha nime ọdọ ọkụ ahụ, ha na ndị ogbu-mmadụ na ndị ná-agwọ nsí, na ndị na-ekpere arụsi (Nkpughe 21:8). “Ihe-árú n’anya JEHOVA ka egbugbere-ọnu okwu ugha bu: ma ndi ji ezi-okwu eme ihe bu ndi ihe-ha nātọ Ya utọ” (Ilu 12:22).

Nime ihe ndepụta ahụ ebe ekwuru ihe banyere ụgha, ka anyị nụkwara ihe banyere igbu-mmadụ. Ọ ga-abụ na ichewo na igbu-mmadụ bụ mmehie jọgburu onwe ya, ma ikwu okwu ụgha abụghị. Ma Okwu Chineke kwuru ihe banyere ha abụọ n’otù mgbe ahụ, na ha niile bụ ihe Chineke kpọrọ asị.

Échìchè Ọjọọ Niile

Chineke kpọrọ obi “nēchèputa échìchè ajọ ihe” asị. Échìchè ọjọọ pụrụ ịbụ àtụmàtụ nke iji mee ihe jọrọ njọ echi ná-abịa. “Ahuhu diri ndi nēchèputa ajọ ihe, nālu kwa ihe ọjọ n’elu ihe-ndina-ha! n’ìhè nke ututu ka ha nēme ya, n’ihi na ọ di n’ike aka-ha” (Maika 2:1). Ndị dị otú a pụrụ ịbụ ndị ahụ ụkwụ ha “nēme ngwa igbaga n’ihe ọjọ.” Chineke kpọkwara ihe dị otú ahụ asị. Échìchè ọjọọ pụrụ ịbịara anyị, ma anyị agaghị anabata ha, ma-ọbụ kwee ka ha nọgide nime obi anyị.

Onye-àmà okwu ụgha nke ná-ekwu okwu ụgha bụ otù ihe ahụ. Ụgha ga-abụrịrị mmehie jọgburu onwe ya, n’ihi na Chineke kpọrọ ya aha ugbò abụọ nime ihe ndịa Ọ kpọrọ asị.

Onye ọzọ nke n-áeme ka iwe Chineke dakwasị ya bụ onye ahụ nke “nēzisa iseokwu n’etiti umunne.” Ọ bụ ụdị mmadụ anyị pụrụ ịkpọ onye esem-okwu. Ọ na-ekwu ihe ndị pụrụ ime ka ụmụ mmadụ ghara inwe ntụkwasị-obi n’ebe ndịọzọ nọ, ma-ọbụ kpọ mmadụ asị. Ka anyị lezie-anya hụ na anyị adịghị emejọ onye ọ bụla site n’ihe anyị na-ekwu.

Anyị chọrọ iruọma Chineke ná ndụ anyị niile. Ọ bụrụ na anyị tinye uche n’ihe niile Baịbụl gwara anyị mee anyị mee ya, anyị ga-anụ ka Ọ na-asị anyị “I mere nke-ọma, ezi orù nke kwesiri ka atụkwasi gi obi; ba n’ọñụ nke Onye-nwe-gi.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị bụ ume-ngwụ?
  2. Gịnị ka Solomon gwara onye umu-ngwụ ka o mee? N’ihi gịnị?
  3. Ihe-ọmụmụ gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’ebe ndanda nọ?
  4. Ndị-okenye aghaghị ịnwụ, òlee maka ụmụ okorọbịa na ụmụ agbọghọbịa?
  5. Kpọọ aha ihe asaa Chineke kpọrọ asị dịka ekwuru ya nime ihe-ọmụmụ a.
  6. Gịnị bụ mmehie nke Sọdọm dịka esi kwue ya na Ezikiel 16:49, 50?
  7. Gịnị ka Chineke kwuru banyere ikwu okwu ụgha, na onye na-ekwu okwu ụgha?
  8. Gịnị ka anyị chọrọ ka Chineke gwa anyị mgbe anyị guzoro n’iru ikpé?