Lesson 280 - Junior
Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Onye nēkpuchi njehie-ya nile, ọ gagh-agara ya; ma onye nēkwuputa ha, nke nārapu kwa ha, agēnwe obi-ebere n’aru-ya” (Ilu 28:13).Notes
Echi
N’ebe ọgụgụ ndịa n’Akwụkwọ Ilu, Solomon dere banyere ọtụtụ isi-okwu dị iche iche. Onyenwe anyị kpaliri Solomon idé ha n’ihi ọdị-mma na urù nke mmadụ niile. Site n’ịgụ Akwụkwọ Ilu, ndị ana-azọpụtabeghị pụrụ ịhụta urù dị na mmadụ na Chineke ime udo na ibi ndụ nke eziomume. Ndị azọpụtaworo pụrụ ilezi-anya site n’ịdọ-aka-ná-ntị niile enyere n’Akwụkwọ Ilu.
“Anyala isi banyere echi.” Solomon na-adọ anyị aka-ná-ntị na mmadụ amataghị ihe ga-eme n’otù ụbọchị. Ọtụtụ mgbe ụmụ mmadụ na-atụ àtụmàtụ gamie n’ụbọchị dị n’iru. Ha na-eme àtụmàtụ ná-echètaghị Onyenwe anyị.
Ọba Buru Ibu Karị
Nime Baịbụl, enyere ihe-atụ nke otù nwoke ọgaranya nyara isi banyere ụbọchị dị n’iru. Ọgaranya ahụ bara ụba. Ọba ya apụghị ịnagide mkpụrụ niile o nwere. O kpebiri ịkwatu ọba ya wuo nke buru ibu karị. N’ọba niile ahụ buru ibu ka ọ tụrụ àtụmàtụ ịchịkọba mkpụrụ osisi na mkpụrụ niile ya. Emesịa, o wee chee, na ya ga-eje zuru-ike, n’ihi na o nwewo ihe ga-ezuru ya ọtụtụ arọ. Ọ ga-asị onwe ya, “Nkpuru-obi, … nēzu ike, nēri ihe, nāñu ihe-ọñuñu, ka obi nātọ gi utọ” (Luk 12:19). Ọ tụwo àtụmàtụ gamie n’ọdị n’iru, ná-echètaghị Chineke, ná-ekpeghị kwa ekpere. Ma ọ mataghị ihe ụbọchị na-esoni ga-ewetara ya, ka arapụ ikwu banyere ọtụtụ ụbọchị.
Chineke sịrị nwoke ọgaranya ahụ, “Onye nēnwegh uche, n’abali a ka anāchọ nkpuru-obi-gi n’aka-gi; ma ihe i doziri, ònye gēnwe ha?” Otú a ka ọ dịịrị ndị na-echè échìchè banyere onwe ha ma ha adịghị echè échìchè banyere Chineke. Ha nwere ike ịbụ ọgaranya n’onwe ha ma ha bụ ogbenye n’ebe Chineke nọ. Àkụ nke ụwa ná-adị náánị nwa oge ntà! Lee otú ọ ka mma ịkpado àkụ n’Eluigwe site n’ịlụrụ Onyenwe anyị ọlụ na ibi ndụ nye ya (Matiu 6:19, 20).
Ọ bụrụ na Onyenwe anyị Chọọ
Okwu niile nke Solomon egbochighị mmadụ ijikere maka echi. Ọ bụ inwe ojuju afọ n’onwe-onye, na mmadụ edoghị onwe ya n’okpuru Chineke, bụ ihe jọrọ njọ na ihe ga-eweta iru-uju na mgbasasị. Onye Kraist na-adabere Chineke, na-ekwu kwa ihe banyere ọdị n’iru sị “Ọ buru na Chineke kwenye” ka ọ bịa, ma-ọbu “ọ buru na Jisọs anọọ ọdu” rue mgbe ahụ. “Nke kwesiri unu ka unu kwue bu, asi na Onye-nwe-ayi chọrọ, ayi gādi ndu, me kwa ihe a, ma-ọbu ihe ahu” (Jemes 4:15).
Ọ Dịghị Mgbe Enwere Oge
Baịbụl na-agwa kwa anyị banyere nwoke ọzọ onye ndụ ya kwesịrị ịbụ ihe ịdọ-aka-ná-ntị nye ndị niile áná-azọpụtabeghị. N’oge ejidere Pọl Onye-ozi tụba kwa ya n’ụlọ mkpọrọ n’ihi ikwusa Oziọma, Filiks bụ onye-isi “we kpọta Pọl, we nu okwu-ya banyere okwukwe nime Kraist Jisus.” Mgbe Pọl gwara ya okwu banyere “ezi omume, na imeru ihe okè, na ikpé ahu nke gaje ibia,” Filiks tụrụ egwù nwee kwa amam-ikpé n’ihi mmehie ya. O wee zilaga Pọl ná-ekwu sị, “Mgbe m’nwere oge m’gākpọ kwa gi” (Ọlu Ndi-ozi 24:25). Ọ nyara isi n’onwe ya na ya ga-enwe oge ikpe ekpere; ma anyị agụtaghị na ọ dị mgbe Filiks nwere nzọpụta. Ọ bụrụ na azọpụtabeghị gị, atụfula oge ma-ọbu ụbọchị (Ọlụ Ndi-ozi 1:7). Mgbe ahụ, òlee otú mmadụ ji pụ ịnya-isi n’ụbọchị ya niile? Chọọ Chineke maka nzọpụta, dabere Chineke, rubere Ya isi, mgbe ahụ ị ga-abụ onye nọ ná njikere maka ihe ọ bụla nke ga-abịa.
Itò Onwe
“Ka onye ala ọzọ to gi, ma ọ bugh ọnu-gi.” N’ilu nke a Solomon ekwughị ihe kpatara o ji kwue okwu a, o kwughị kwa ihe ga-eme ma emee ya, dịka o mere n’ọtụtụ ilu ya niile. Mmadụ itò onwe ya ma-ọbụ ibuli onwe ya elu adịghị enyere onye ọ bụla aka. Ihe mgbochi ka ọ bụ. Mmadụ itó onwe ya bụ mmadụ ịchọ ntipịa nke onwe ya (Ilu 17:17)). Ụmụ mmadụ adịghị achọ ịnụ ka mmadụ na-etò onwe ya. Ha na-eche na ọ bụ na onwe ya juru ya afọ. Mgbe o kwusịrị, ndịọzọ ná-eche na ọ dị njọ karịa inwe échìchè dị elu banyere ya dịka o leworo anya.
N’òzízí nke Jisọs ana-adọ anyị aka-ná-ntị “onye ọ bula nke gēweli onwe ya elu, agēweda ya; onye ọ bula nke gēweda kwa onwe ya, agēweli ya elu” (Matiu 23:12). Gịnị pụrụ ịbụ ihe ga-akpata itò onwe ma ọ bụghị ibuli onwe n’iru ndịọzọ? Ọ bụrụ na mmadụ na-eme ihe maka otuto nke mmadụ, n’ezie nke ahụ bụ ụgwọ-ọlụ ya (Matiu 6:1, 2).
Otù Onye Farisii
Nime Baịbụl anyị na-agụ banyere otù nwoke onye tóró onwe ya. Ọ bụ Onye Farisii ahụ jere n’Ụlọ-ukwu Chineke ikpe ekpere (Luk 18:10-14). Kama ikpe ekpere nye Chineke, o kpere ekpere “nye onwe-ya.” O kwupụtara ezi ihe niile o meworo, dịka ọ bụ na Chineke amataghị ha, ọ tụgharịghị kwa uche na “dika uwe emeruru emeru, otú a ka ezi omume nile ayi di” (Aisaia 64:6). Onye Farisii ahụ ekwughị ihe ọ bụla banyere ịdị-mma na eziomume nke Chineke, n’ihi na o nweghị ihe niile ahụ ná ndụ ya. Onye Farisii tóró ịdị-mma nke onwe ya karịa ịbụ onye “juputaworo ná nkpuru nke ezi omume, nke sitere n’aka Jisus Kraist, ka Chineke we nwe ebube na otuto” (Ndi Filipai 1:11), na kama ọ ga-ewere “ihe-agha nke nēgbochi obi yikwasi” (Ndi Efesọs 6:14) nke bụ otù nime ihe-agha nke ime mmụọ.
Mkpụrụ-obi Nke Rijuworo Afọ
Onye Farisii ahụ chere na ya dị mma nke ukwu ruo na ọ dịghị kwa ya mkpà ịrịọ Chineke ihe ọ bụla. Ọ nátaghị ihe ọ bụla n’aka Chineke, wee laa ná-abụghị onye agụrụ n’onye eziomume. Site na nke a, ọ bụrụ ihe-atụ ọzọ nke ilu nke Solomon, “Nkpuru-obi nke rijuworo afọ nāzọda manu-añu nke si n’ugbugbọ-manu-añu nābusi.” Nke pụtara na onye ná-amaghị mkpà ya adịghị añụrị ọñụ ọbụná ma enye ya ihe kachasị mma. Nke a na-abụkarị otú ọ na-adị n’ihe nke ime mmụọ mgbe mmadụ na-eje n’ụlọ ụkọ dịka onye Farisii ahụ. Mgbe mmadụ na-eche na ọ dịghị ihe dị ya mkpà, ọbụná mkwà niile kachasị mma adịghị emetụ ya ọ na-ala kwa n’aka “efu” (Luk 1:53). Onye ọ bụla nwere agụụ nke ihe nke mmụọ wee jee n’ụlọ ụkọ -- na-enwe mmetụta na ya chọrọ ịmata ihe banyere Chineke na Baịbụl karịa -- ná-enwe ọñụ n’akụkụ niile nke nzukọ ahụ. Okwu Chineke, abụ na ịgba-àmà niile nwere ike igosi ya agazighị agazi ya, ma ọ na-la n’afọ ojuju n’ihi na ọ na-ekpe ekpere ná-erube kwa isi n’ihe niile nke ọ nụworo.
Ndị-enyi
Eleghị-anya ịchọpụtawo na ka i wee nwee ndị-enyi ị ghaghị ịbụ onye ná-akpara ndịọzọ enyi (Ilu 18:24). Ọtụtụ ụmụ mmadụ na-enwe ndị-enyi. Ndịọzọ nọ kwa ndị chere na ha nwere ndị-enyi ma ha chọpụtara na ndị ahụ bụ náánị ndị ha matara. Ọ bụ ihe ana-ekwenye ebe niile na onye na-emere mmadụ obiọma bụ enyi ya. Solomon kwuru okwu banyere otù “enyi” ọtụtụ ugbò n’ihe-odide ya niile. Ama-okwu ise n’Ilu isi iri abụọ na asaa ka ekwuru ihe banyere ndị-enyi. Solomon na-agwa anyị ka anyị jidesie ezi enyi ike. Ndị-enyi ochie egosipụtawo na ha bụ ezi ndị-enyi; ha maara agazighị agazi nke mmadụ, ha na-achọ kwa ka onye ahụ nweta ezi ihe. Ha ga-enye aka site n’ịgwá mmadụ erughị erụ ya dịka ha ga-agwa kwa ya ezi ihe na ọ na-eme ka ewee merie agazighị agazi niile ahụ.
Mmetụta Ọma ma-ọbụ Nke Ọjọọ
Solomon kwuru na omume anyị naenwe ike n’ebe ndị-enyi anyị nọ, “Madu nāmucha iru eyi-ya.” Òlee ụdị mmetụta ndị-enyi gị na-enweta n’ebe ị nọ? Ị ná-agwa ha okwu ire-ụtọ ka ha wee nwee ike malite ichè na ọ bụ náánị iruọma ha ka ị na-achọ? Solomon sịrị na “nkọcha ka agāgu ngọzi ahụ nye ya” ọzọ kwa “nwoke nke nāgwa madu-ibe-ya okwu ire-utọ nāgbasara nzọụkwụ ya niile ụgbụ.” Mgbe gị na ndị-enyi gị kwusịrị okwu, hà na-ala ná-enwe nwuta karịa ka ha nwere tupu gị na ha ekwuo okwu? ka ọ bụ hà na-ala na-enwe obi-ụtọ na agbam-ume ifè Onyenwe anyị òfùfè?
Otù Enyì Nke Jisọs
Solomon sịrị na “mgbe nile ka eyi nāhu n’anya” (Ilu 17:17). Nke ahụ pụtara na eyi ná-ahụ n’anya n’oge mkpà na n’oge nsogbu dịka kwa n’oge ọgan’iru na otuto. Okwu niile ahụ nke Solomon ka apụrụ iji mata ezi enyi. Ị bụ enyì nke ndịọzọ?
Solomon sịrị na “onye nāhu n’anya di nārapara n’aru kari nwa-nne” (Ilu 18:24). Ònye pụrụ ịbụ enyi dị otú a? Ọ dịghị onyeọzọ ma ọ bụghị Jisọs Kraist, Ọkpara Chineke. N’oge mkpà O gosipụtara na Ya bụ Enyi nye Meri na Mata, ụmụ nne ndịnyom nke Lazarọs (Jọn 11:15). Jisọs kpọrọ Ndịozi ahụ ndị-enyi Ya (Jọn 15:15). Ọtụtụ abụ dị ụtọ ka edeworo nke ná-ekwu na Jisọs bụ Enyì anyị. Eleghị-anya nke amatara karịa ndịọzọ niile bụ nke ná-asị:
“Jisus bu ezi Eyi ayi,
Nēbu njọ n’ahuhu ayi!
Ịgwa Chineke ihe dum
N’ekpere bu ok’urù!
Ayi nētuf’ udo nke uku,
Nēbu ihe-mgbu nēfu
N’ihi n’ayi agwagh Chineke
Ihe nile n’ekpere!”
Ná-arụghị ụkà ị ga-achọ ịrọrọ Jisọs ka Ọ bụrụ Enyi gị. Ọ bụrụ na azọpụtawo gị, ọ bụrụ kwa na ị na-erubere Onyenwe anyị isi, gị na Jisọs bụ enyi, n’ihi na Ọ sịrị, “Unu onwe-unu bu ndi-eyim, ma ọ buru na unu eme ihe Mu onwem nēnye unu n’iwu” (Jọn 15:14).
Ndị Ná-emebi iwu
Ọtụtụ ugbò ka Solomon kwuru banyere urù nke ndị azọpụtaworo na-erita. Mgbe niile ọ na-ekwupụta ihe ndụ onye eziomume ji dị iche na nke onye ajọ omume. Solomon sịrị, “Ndi nēmebi iwu agbalagawo mgbe ọ digh onye nāchu ha: ma ndi ezi omume nwere ntụkwasi-obi dika ọdum.” Ị pụrụ icheta ihe-ọmụmụ ọ bụla nke anyị mụworo ebe okwu nke Solomon ndịa nwere ike ịdaba? Ọ dịwo mgbe ọ bụla Ụmụ Israel nwere nkwuwa okwu nwee kwa obi-ike n’ihi na ha tụkwasịrị Onyenwe anyị obi? Ọ dịwo mgbe ọ bụla ndị-iro ha gbalagara n’iru ha ọbụná n’ezie na o nweghị onye ná-achụ ha?
Ebere
Solomon mere karịa ịkọwa ndụ nke ndị ná-emebi iwu. O gosipụtara ihe dị iche n’etiti ndị ná-ebi ndụ eziomume na ndị ná-ebi ndụ imebi iwu. Ewezuga ịdọ ndị ána-azọpụtabeghị aka-ná-ntị, Solomon nyekwara ndụm-ọdụ banyere ịchọ Chineke maka ebere na nzọpụta. Solomon sịrị, “Onye nēkpuchi njehie ya niile, ọ gagh-agara ya: ma onye nēkwuputa ha, nke nārapu kwa ha, agēnwe obi-ebere n’aru ya.” Mgbe mmadụ jikeere ịnabata na ya bụ onye mmehie, wee rịọ Chineke mgbaghara, ebe o jikeere ịgbakụta mmehie ya azụ, Onyenwe anyị ga-eme ebere gbaghara kwa onye ahụ.
Ịrapụ mmehie
Ọ bụ ihe pụrụ ime eme na mmadụ ga-ekwupụta mmehie ya niile ma bụrụ onye ana-azọpụtaghị, n’ihi na o jikereghị ịrapụ ha. Sọl bụ ụdị mmadụ ahụ. Enyere ya iwu ka o jee tigbue Amalek, ibibi ya ghara kwa inwe ọmiko n’arụ ya. Ma Sọl na ndị ahụ nwere ọmiko n’arụ Egag bụ eze na n’arụ anụ niile kachasị mma, “ha ekweghi kwa iwezuga ha ka ebibie ha.” Sọl erubeghị isi emesịa o wee sị na ya emezuwo ihe Jehova nyere n’iwu. Chineke zigara Onye-amụma Ya bụ Samuel ijekwuru Sọl. Mgbe ajụrụ ya ajụjụ banyere atụrụ na ehi niile ahụ arapụrụ ndụ, Sọl tara ndị Israel ụta n’ihi mmehie niile ahụ, wee sị na ya tụrụ egwù ndị ahụ. N’ikpe-azụ Sọl kwenyere na ya emehiewo, ma o jikereghị ịrapụ mmehie niile ahụ. Chineke jụrụ ya ịbu eze n’ihi na Sọl ajụwo okwu Jehova (I Samuel 15:23). Enyere onye ọzọ ala-eze Sọl, Sọl wee nwụọ ná-enwetaghị kwa nzọpụta ọzọ.
Mmehie Zoro-ezo
Nwoke ọzọ gbalịrị izo mmehie ya bụ Ekan. Mgbe Ụmụ Israel jere ibu agha megide obodo Ai, emeriri ndị Israel, kama ha ga-enwe mmeri dịka Chineke kweworo ha ná mkwà. Joshua jụrụ Chineke ihe kpatara ya. Chineke gwara Joshua na mmehie dị n’ọmụma ụlọ-ikwu ha -- otù onye “ewerewo ufọdụ nime ihe ewezugara nyem” zoo kwa ya n’etiti ihe-ya. Chineke sịrị na Ya agaghị anọnyere Ụmụ Israel ma ọ bụghị na ha bibiri mmehie ahụ. Ma Ekan ekwupụtaghị mgbe Joshua ziri Ụmụ Israel ozi ahụ. Ha guzoro n’iru Joshua n’ebo n’ebo, n’agbụrụ n’agbụrụ, n’ụlọ n’ụlọ, n’ikpe-azụ ha bịara ndịkom ndịkom. Chineke wepụtara Ekan dịka onye ahụ ikpé mara. Ma Ekan ekwughị kwa ihe ọ bụla. Mgbe ahụ Joshua wee nye ya iwu ka o kwupụta ma gwa kwa ya ihe o meworo. Amanyere Ekan amanye ikwenye na ya emehiewo (Joshua 7:20). Ọ sịrị, “M’we hu … m’we nwe anya-uku n’ebe ha di, m’we chiri ha; ma, le, ezoworo ha n’ala n’etiti ulo-ikwum.” Mgbe Ekan chere na mmehie ya bụ ihe ekpuchisiworo, Chineke kpughere ya. Emere ka Ekan nwụọ. Ekan kwupụtara mmehie ya ma ọ chọtaghị ebere n’ihi na o chigharịghị site ná mmehie ya o chègharịghị kwa n’iru Chineke.
Mkwà Dị Iche iche
Solomon kwuru okwu banyere ọtụtụ mkwà dị iche iche nke ngọzi nke Chineke ga-enye ndị ná-ebi ndụ eziomume, ụfọdụ nime ha bụ: obi-ụtọ (Ilu 29:18), nsọpụrụ (Ilu 29:23), ịnọ n’udo (Ilu 29:25), ọñụ (Ilu 29:6), nghọta (Ilu 28:5), ọgan’iru (Ilu 28:10), na nnapụta (28:18). O kwukwara banyere mkwà dị iche iche nke ikpé na mbibi megide ndị ji oge niile na mgbe niile ọ bụla jụ ọkpụkpọ òkù nke Chineke.
Nime ihe-odide niile nke Solomon a, anyị na-ahụ n’iru anyị ụzọ nke nzọpụta nke Chineke, na nke megidere ya -- ụzọ nke ndị mmehie. Òlee ụzọ nke ị rọrọworo? Ndụ ka ọ bụ ọnwụ? Ngọzi ka ọ bù nkọcha? Ọgan’iru ka ọ bụ mbibi? Solomon sịrị, “Onye anābara nba ọtụtụ mgbe ma ọ nēkwesi olu-ya ike, n’otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ digh kwa ngwọta di”; ma, “Onye ọ bula nke kwesiri ntukwasi-obi gēnwe ọtụtụ ngọzi.”
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE- Òlee otú Onye Kraist si ekwu okwu banyere ụbọchị dị n’iru?
- Ònye bụ “nkpuru-obi agu nāgu”?
- Ònye bụ Enyi kachasị mma mmadụ pụrụ inwe?
- Òlee ndị bụ ndị enyi nke Jisọs?
- Gịnị bụ ihe dị iche n’etiti mmadụ ikwupụta mmehie ya na ịrapụ ha?
- Gịnị ka ekwuru banyere onye “nānapu nna ya maọbu nne ya ihe n’ike?
- Gịnị mere ịmata iru mmadụ n’ikpé adịghị mma?
- Gịnị mere o ji kwesị ekwesị ka adọọ ụmụ aka-ná-ntị?
- Gịnị bụ ịbá-mbá?
- Ònye “gēnwe ọtụtụ ngọzi?”