Ọlu Ndi-ozi 2:1-47

Lesson 281 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Unu gānata ike, mgbe Mọ Nsọ gābiakwasiwori unu: unu gābu kwa ndi-àmàm nime Jerusalem, na nime Judia na Sameria nile, rue kwa ebe uwa sọturu” (Ọlu Ndi-ozi 1:8).
Notes

Mkwà nke Onye nwe anyị

N’anyasị ikpe-azụ ahụ nke Jisọs na Ndị-ozi Ya nọkọrọ tupu akpọgide Ya n’obe, O kwere ha mkwà na Onye nkasị-obi nke sitere n’Eluigwe ga-abịa biri nime ha. Onye nkasị-obi ahụ ga-agwa ha ihe banyere Jisọs na Eluigwe karị, Ọ ga-akụzi kwara ha ihe ha ga-eme na ebe ha ga-eje.

Ọzọ, mgbe Jisọs bilisịrị n’ọnwụ, Ọ gwara ha na Mmụọ Nsọ ga-abịakwasị ha. O kwere ha mkwà sị: “Unu gānata ike, mgbe Mọ Nsọ gābiakwasiwori unu: unu gābu kwa ndi-àmàm nime Jerusalem, na nime Judia na Sameria nile, ru kwa ebe uwa sọturu” (Ọlu Ndi-ozi 1:8). Mmụọ Nsọ bụ kwa Onye nkasị-obi ahụ Onye Jisọs gwaworo ha banyere Ya. Ọ ga-akasi ha obi, kuziere ha ihe, nye kwa ha ike.

Ndị ná-eso ụzọ Ya apụghị ịnagide ihe niile Jisọs na-agwa ha, ma ha ka na-achọ ịmata ma Jisọs Ọ ga-amalite Ala-eze Ya n’ụwa n’oge a. Eleghị-anya ha chère na ike a bụ nke anụ-arụ, na ọ ga-eme kwa ka ha dị ike nke ukwuu ịkwatu Ọchịchị nke ndị Rom. Ma Jisọs mere ka ha mata na nke ahụ adịghị mkpà. Ọ chọrọ ka ha nwee mmasị n’inwe ike nke ime mmụọ iji merie ekwensu. Ọ chọrọ ka ha bụrụ ndị-àmà ndị Mmụọ Nsọ ga-esite na ha nwee ike ịgbanwe ndị mmehie nye Ala-eze nke Eluigwe.

Nzukọ ahụ nime Jerusalem

Jisọs gwara ha na Jerusalem bụ ebe Mmụọ Nsọ ga-adakwasị ha, na ọ ga-abụ kwa “mgbe ọtụtụ ubochi nāgagh-agabiga site n’ugbu a.” Ya mere ndị ná-eso ụzọ Ya laghachirị na Jerusalem ngwa ngwa wee malite ikpe ekpere. Ha dị narị mmadụ na iri abụọ ná nzukọ ahụ, ná-efé òfùfè ná-eto kwa Chineke. Ha adịghị eru kwa uju ọzọ n’ihi ọnwụ Jisọs, kama ha na-añurị ọñụ n’ihi na O meriwo ọnwụ wee laa n’Eluigwe. Lee óké mmeri ọ bụ nye ha na Onye-nzọpụta ha ebiliwo n’ọnwụ, ná-egosi na Ya bụ Ọkpara Chineke n’ezie!

Nzukọ ekpere ahụ nọgidere rue ụbọchị iri, ebube Chineke mụwakwara n’arụ ha. Ha niile bụ ndị edoro nsọ, ná-efé òfùfè n’otù olu na otù obi; ya mere Mmụọ Chineke ji pụ ịgọzi. Ndị-ọzọ niile na ndịnyom ahụ soworo Jisọs, nke nne Ya bụ Meri bụ otù onye nime ha, nọ n’ebe ahụ ná-eto Onyenwe ha enyeworo otuto.

Ụbọchị Pentikọst

Iri ụbọchị ise mgbe ememe Ngabiga gasịrị ndị Israel mere ememe ncheta nke inye Iwu ahụ n’Ugwu Sainai site n’ememe ana-akpọ ememe nke Izù, ma-ọbụ ememe nke Pentikọst. Jisọs, Nwa-atụrụ nke Ngabiga anyị, nwụrụ n’ụbọchị ememe Ngabiga. Mgbe iri ụbọchi ise gasịrị, mgbe o ruru Ụbọchị Pentikọst, narị mmadụ na iri abụọ ahụ ka nọ n’ifè òfùfè na n’itò Chineke. Ha adabeghị mbà wee laghachị n’ụlọ ha, kama ha na-anọgide dịka Jisọs nyeworo ha iwu. Na mberede ha nụrụ otù ihe ná-ada dịka ụzụ nke óké ifufé si n’Eluigwe ná-abịa. O wee jupụta ụlọ ahụ niile ebe ha nọ. Ọ bụ Mmụọ nke Chineke na-abịkwasị ha, Mmụọ Nsọ Onye Jisọs kweworo ná mkwà.

Lee óké ọñụ ha nwere! Ọ bụghị ihe ịtụ-n’anya, Mmụọ Nsọ Onye nke Atọ nke Atọnimeotù ahụ, ịbịa biri n’obi nke ụmụ mmadụ. Ọ batakwara nime obi ha niile n’otù n’otù. Lee óké ọñụ ha nwere ha wee nye Onyenwe anyị otuto!

N’asụsụ Dị Iche

Ị matara otú ha si wee mara na Mmụọ Nsọ abịakwasịwo ha? O kwuru okwu site n’ọnụ onye ọ bụla nime ha n’asụsụ nke ha ná-amaghị. Ndị sitere n’obodo ọzọ niile ndị ná-asụ asụsụ niile ahụ pụkwara ịghọta ha.

Dịka ọ bụ mgbe ememe nke okpukpé, ọtụtụ ndị ná-atụ egwù Chineke sitere n’ala ọzọ dị iche nọ na Jerusalem ime ememe nke ụbọchị nsọ niile ahụ. Mgbe ndịa nụrụ ihe ná-eme n’etiti narị mmadụ na iri abụọ ahụ dị ume-ala bụ ndị ná-eso ụzọ Jisọs, ha wee jee ige ha ntị. Onye ọ bụla n’etiti ndị ahụ sitere n’obodo ọzọ dị iche iche pụkwara ịnu ka otù onye nime ndị ná-eso ụzọ Jisọs na-ekwu okwu n’asụsụ ala ya -- ná-ekwu banyere ọlụ ebube niile nke Chineke. Ọ bụ Mmụọ Chineke sitere n’ọnụ ndị Ju ahụ ná-amụghị akwụkwọ ná-ekwu okwu, were kwa ire ha ná-eto Chineke n’asụsụ nke ha onwe ha ná-amataghị. Mmụọ ahụ na-agwa ha banyere Jisọs karị, dịka O kwuworo na Ọ ga-eme. Ọ bụghị ihe ịtụn’anya na ibobo nwụrụ ndị-ọbịa ahụ n’arụ, o wee ju kwa ha anya. Ọ dịwo mgbe anụrụ ihe dị otú a na mbụ?

Amụma nke Joel

Ée, ihe ra ka narị arọ asatọ gara aga, Joel bụ Onye-amụma ebuwo amụma na nke a ga-eme; ugbu a Pita na mmadụ iri na otù ahụ wee guzo were kwa nkwuwa okwu gwa óké ìgwè mmadụ ahụ na ọ bụ amụma Joel ka ana-emezu. “Nka bu nke ekwuworo site n’ọnụ Joel onyeamuma.” Lee ihe ntụkwasị-obi nke a bụ, lee kwa ike dị n’okwu niile ahụ Pita kwuru! Nke a bụ ihe ahụ; emezuru mkwà nke Chineke.

Pita site n’okwu ya ná-enweghị egwù gosipụtara na ya anatawo ike sitere na Chineke ịgba-àmà nye ndị ahụ ná-ákwá emò ná-asị kwa na manya bàra ndị ahụ ná-eso ụzọ Jisọs n’anya. Ọ dịwo mgbe Pita gọnarịrị Onyenwe ya n’iru otù nwa agbọghọ ntà, n’ihi na egwù tụrụ ya iguzoro eziokwu. Ma ugbu a, ebe ọ nataworo Mmụọ Nsọ, ọ dịghi ihe ọ bụla ga-apụworị igbochi ya ikwupụta na Jisọs bụ Ọkpara Chineke; na ya onwe ya, Pita, bụ otù nime ndị ná-eso ụzọ Ya.

O boro Ndị Farisii ebubo na ha gburu Jisọs. O gwara ha ná-atụghị egwù sị, “Onye, … unu kpọgidere n’obe gbu kwa site n’aka ndi nāmaghị iwu-ayi.” Nke ahụ ezuwo ime ka iwe wee ha, ma Pita ka nwekwara ọtụtụ ihe ọ ga-agwa ha banyere Kraist “Onye Chineke mere ka O si n’ọnwụ bilie.” Ha achọghị ikwere na Jisọs siri n’ọnwụ bilie, n’ihi na ọ bụrụ na ha kwere ya, ọ ga-abụ na ha ga-ekwere na Ọ bụ kwa Ọkpara Chineke.

Amụma nke Devid

Pita kwuru banyere amụma nke Devid, Jisọs, mgbe Ọ na-ekwu okwu site n’ọnụ nna ha ochie bụ Devid sịrị, “I gagh-arapu nkpuru-obim nime Hedis; I gagh-enye kwa Onye nke Gi di Ọcha n’obi ka Ọ hu ire-ure.” Ndị Ju ndịa sọpụụrụ Devid; ha kwesị kwara ige ntị n’okwu ya niile. N’ihi na Ọ sọpụụrụ Onyenwe anyị kwuo kwa okwu banyere mbiliten’ọnwụ Ya. Ugbu a Devid anwụwo laa kwa, náánị ihe ha nwere bụ ílì ya. Ma Jisọs karịrị Devid ukwu nke ukwuu na O siwo na ndị nwụrụ anwụ bilie wee rapụ ílì ghere oghe.

Ọ bụrụ na Devid ebuwo amụma kwere kwa ná mbiliten’ọnwụ ihe karịrị puku arọ gara aga, gịnị mere ndịa ji anya ha hụ ya apụghị ikwere ya? Jisọs ejegharịwo ihe ruru iri ụbọchị anọ n’etiti ha mgbe O bilisịrị n’ọnwụ. Narị mmadụ na iri abụọ ahụ bụ kwa ndị-àmà nke mbiliten’ọnwụ ahụ.

Adụrụ Ha nime Akọ-na-uche ha

Ụfọdụ nime ndị ahụ nụrụ okwu Pita kweere na o kwuru ezi okwu. Akọ-na-uche ha wee malite ịma ha ikpé n’ihi òkè nke ha n’ịjụ Jisọs, ha wee chọọ ịmata ihe ha ga-eme ka ha nweta ụdị ike ahụ Pita nwere. Pita gwara ha na ha aghaghị ibu ụzọ chègharịa ewee zọpụta ha. Ha bụ ndị okpukpé ná-eje ụlọ ụkọ ná-akwụ kwa otù ụzọ n’ụzọ iri nwee kwa ịnụ-ọkụ n’obi dị ukwu. Ma ha échègharịbeghị ná mmehie niile ha.

Pita gwara ha na ọ bụrụ na ha chọrọ ụdị ike ahụ ya onwe ya nwere, ha gaekwere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Mgbe azọpụtarịrị ha, agawụ ha mmiri dịka Jisọs nyeworo n’iwu -- n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ -- ọ bụghị dịka ha si eme ya n’oge ochie, ọ bụghị kwa ọbụná n’ụdị nke Jọn onye ọwụmmiri mere.

Ike Site n’iji-obi-chụọ-àjà

Ụfọdụ mmadụ nọ n’ụbọchị ndịa ndị ọ ga-amasị ka ha nwee ike Chineke na ndụ ha ka ha wee nwee ike ịlụrụ Onyenwe anyị ọlụ, ma ha ejikereghị inye ihe Chineke chọrọ ka ha nye. Pita ejiwo obi ya chụọ àjà ebe ọ dị ukwu ka o wee nata ike ahụ o nwere ugbu a. Pita tụkwasịwororị onwe ya obi, kwee kwa Onyenwe anyị mkwà na ya ga-eso Ya ọbụná ruo n’ọnwụ. Ọ tụwo kwa àtụmàtụ nke onwe ya, ọ bụwo kwarị onye-ndú nke Ndị-ozi ndị ọzọ. Ọ pụrụ ikwu okwu ná-atụghị egwù, ọ jikekwara n’ezie ịlụrụ Jisọs ọlụ. Ma ọtụtụ ugbò ọ dịghị enwe ike imezu ihe niile ahụ dị ya n’obi. Náánị ịkwa-emò ntà mere ka Pita gọnarị Onyenwe anyị!

Mgbe Pita ghọtara adịghị ike na ọdịda ya, ọ pụọ n’ezi kwaa ákwá dị ilu. N’ekpere ahụ, o wezugara nchepụta niile nke ya wee rịọ maka inye-aka nke Chineke. Agbaghaara ya o wee bụrụ kwa Onye Kraist otù ugbò ọzọ. Emesịa, mgbe Jisọs mere ka mmadụ iri na otù ahụ hụ Ya anya mgbe ha na-egbu azụ, wee sị Pita, “Ì hurum n’anya kari ndia?” Pita pụrụ ikwu site n’obi ya niile na ọ dịghị ihe ọ bụla ọzọ dị ya mkpà karịa ijere Onyenwe anyị ozi. Jisọs jụrụ ajụjụ ahụ ugbò atọ, rue mgbe Pita amataghị kwa ihe ọ ga-aza. O jiwo obi ya chụọ àjà rue omimi niile nke ndụ ya, náánị ihe o mere bụ iti-mkpu sị: “Onye-nwe-ayi, Gi onwe-gi matara ihe nile” (Jọn 21:17). N’ezie, Jisọs matara ihe niile, Ọ pụkwara ịhụ ime obi anyị. Ọ matakwara ma anyị na-enye ihe niile isoro Ya ma-ọbụ na anyị adịghị enye.

Chee échìchè banyere ike ahụ Pita natara mgbe awụsịrị ya mmiri. Site n’okwu Chineke o kwuru n’ụbọchị mbụ ahụ, emere ka puku mmadụ atọ (3,000) chègharịa. Ma nke ahụ bụ kwa náánị mmalite nke ijé ozi ya jupụtara na Mmụọ Nsọ.

Ike ahụ nime Anyị

Ọ bụrụ na anyị chọrọ ike ahụ nke ná-abịa site na ọwụwụ-mmiri nke Mmụọ Nsọ ná ndụ anyị, anyị ga-eme otù udị iji-obi-chụọ-àjà ahụ Pita mere. Anyị aghaghị inye Jisọs anụ-arụ anyị, mkpụrụ-obi anyị, na mmụọ anyị kpamkpam ka O ji anyị mee ihe ọ bụla dị Ya mma. Jisọs sịrị na ike ahụ ga-abịakwasị anyị mgbe anyị natasịrị Mmụọ Nsọ. Ka anyị na-eji obi anyị chụọ àjà, na-eji kwa ike ahụ O nyere anyị ná-alụ ọlụ, anyị gana-anata kwa karị.

Mgbe azọpụtasịrị mmadụ, iji-obi-chụọ-àjà ya ga-eduru ya n’ịdị-nsọ. Iji-obi-chụọ-àjà, ejikọtara ya na okwukwe nime mkwà niile nke Chineke, ga-eweta odudo-nsọ. Nke a bụ ime ka “ụlọ nsọ nke Mọ Nsọ” dị ọcha. “Ùnu amatagh na aru-unu bu ulo nsọ nke Mọ Nsọ?” (I Ndi Kọrint 6:19). Mmụọ Nsọ agaghị abata nime ụlọ ná-adịghị ọcha, ya mere aghaghị ịnụcha anyị sachaa kwa anyị site n’odudo nsọ. Mgbe ahụ ka anyị ga-abụ ndị tozuru ịrịọ ka Mmụọ Nsọ bịa biri kwa nime anyị.

Pita sịrị: “Unu ka nkwa nka diri, na umu-unu, na ndi nile nọ n’ebe di anya, ka ha ra, bú ndi Onye-nwe-ayi Chineke-ayi gākpọtara Onwe-ya.” Anyị so kwa ná ndị ahụ “nọ n’ebe di anya.”

O rubewo ihe ra ka puku arọ abụọ site na mgbe ndị ná-eso ụzọ Jisọs natara Mmụọ Nsọ n’Ụbọchị Pentikọst, ma anyị onwe anyị n’ụbọchị taa na-anata kwa otù ụdị mmezu nke mkwà ahụ nime obi anyị mgbe anyị zara òkù nke Chineke, were kwa onwe anyị nye kpamkpam ime uche Ya. Anyị ga-anata kwa otù ihe iriba-àmà ahụ ha natara dịka ihe ịgba-àmà na Mmụọ Nsọ abatawo: ikwu okwu n’asụsụ dị iche, dịka Mmụọ ahụ na-enye ike ikwuwa okwu.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Òlee ụbọchị ka Mmụọ Nsọ bu ụzọ rịdata?
  2. Òlee ndị natara ọwụwụ-mmiri nke Mmụọ Nsọ n’oge ahụ?
  3. Kọwaa mgbanwe batara nime Pita mgbe ọ natasịrị ọwụwụ-mmiri ahụ.
  4. Ònye buwororị amụma banyere Mmụọ Nsọ ihe ra ka narị arọ asatọ tupu oge ahụ?
  5. Oge ra añaa gabigara mgbe emesịrị Oriri Ngabiga tupu Pentikọst eruo?
  6. Òlee otú ndị ahụ si mata na Mmụọ Nsọ abịakwasịwo ha?
  7. Gịnị ka ndị-ọbịa ahụ nọ na Jerusalem chère banyere ihe a mere?
  8. Gịnị ka Pita gwara ndị ahụ na ha aghaghị ime ka ha wee nweta ike ahụ?
  9. Òlee ndị ekwere mkwà nke Mmụọ Nsọ?
  10. Òlee ihe-ngosi pụtara ìhè anyị na-enweta mgbe ejiri Mmụọ Nsọ wụọ anyị mmiri?