Ọlu Ndi-ozi 3:1-26

Lesson 282 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Onye nēkwere na Mu, ọlu Mu onwem nālu ka onye ahu gālu kwa; ọlu ka ndia uku ka ọ gālu kwa; n’ihi na Mu onwem nāgakuru Nnam” (Jọn 14:12).
Notes

Ndụ Ọhụụ

Ndụ ọhụụ amalitewo nye Ndị-ozi nke Jisọs. Mmụọ Nsọ arịdatawo n’Ụbọchị Pentikọst, ugbu a emejuwo ha n’ike sitere n’Eluigwe ịpụ lụọ kwa ọlụ ebube n’aha Jisọs. Kama ịtụ egwù, ha pụrụ iguzo ná nkwuwa okwu nye ezi okwu niile nke Jisọs kuziwooro ha.

Ọ bụ mgbe ná-adịghị anya site na mgbe nzukọ ekpere abalị iri ahụ gasịrị, nke ha nwere ọwụwụ-mmiri nke Mmụọ Nsọ nime ha, ka Pita na Jọn jere n’Ụlọ ukwu Chineke ikpe ekpere. Ha ka hụ kwara mkpà ọ dị ha ikpe ekpere. Ha ga-anọgide ná-ekpe ekpere ọ bụrụ na ha chọrọ ijigide ike ahụ Chineke nyeworo ha ná ndụ ha.

Nwoke Ahụ Nọ N’ọnụ-ụzọ

Mgbe Pita na Jọn bịaruru nsọ ọnụ-ụzọ Ụlọ-ukwu, ha hụrụ otù onye ngwụrọ ka ọ nọdụrụ ebe ahụ ná-arịọ arịrịọ. Ọ dịghị onye ọ bụla ná-elekọta agadi nwoke a dara ogbenye, ya mere o ji nọdụ n’ọnụ-ụzọ, ná-ele anya na ndị bịara ifè òfùfè ga-enwe obiọma inye ya ego ntà maka ihe-oriri.

Pita na Jọn nwere obiọma, ma ha enweghị ego ọ bụla. Gịnị ka ha pụrụ imere nwoke a bụ ogbenye? Pita lere ya anya ná-enwe obi ebere n’arụ ya, wee sị: “Ọ digh ọla-ọcha na ọla-edo m’nwere; ma ihe m’nwere, nke ahu ka m’nēnye gi. N’aha Jisus Kraist Onye Nazaret, je ijè” (Ọlu Ndi-ozi 3:6).

Pita kwuru okwu ná ntụkwasị-obi. Ọ matara na Chineke ga-aza ekpere ya. Ọ matara na ọ bụrụ na ya arịọ n’aha Jisọs, aga-alụ ọlụ ebube.

Ọlụ Ka Ndịa Ukwu

Jisọs ekwuwo sị: “Onye nēkwere na Mu, ọlu Mu onwem nālu ka onye ahu gālu kwa; ọlu ka ndia uku ka ọ gālu kwa; n’ihi na Mu onwem nāgakuru Nnam” (Jọn 14:12). Mgbe Jisọs lakwuuru Nna, O zitere Mmụọ Nsọ; ọ bụ kwa site n’ike nke Mmụọ Nsọ ka ndị ná-eso ụzọ Ya ga-enwe ike ịlụ ọlụ ebube n’aha Jisọs.

Pita anatawo Mmụọ Nsọ ugbu a, o jiwo kwa ndụ ya chụbiga àjà ókè nye ọlụ nke Onyenwe anyị na ọ pụrụ ịgwá onye ngwụrọ ahụ sị, “je ijè.” Lee ka nke a si bụrụ ihe dị ebube ịgwá onye aka-ejeghị ijè ná ndụ ya niile! Eleghị-anya, o siiri ya ike ịghọta okwu niile ahụ. Pita wee jide nwoke ahụ dara ngwụrọ aka, nyere ya aka o wee bilie. Ngwa ngwa ụkwụ ya abụọ na nkwonkwo ụkwụ ya abụọ wee nwee ume, o wee pụ ijé ijè -- ọ bụghị nsụkwara-achị dịka onye ngwụrọ, kama n’ịdị gara gara na n’ijé ijè nkeọma. Ọ wụlikwara elu.

Obi tọrọ onye ngwụrọ ahụ ụtọ nke ukwu na agwọrọ ya na ọ soro Pita na Jọn baa n’Ụlọukwu Chineke inye Chineke ekele. Ọ matara onye gwọrọ ya, obi ya jupụtakwara n’otuto nye Nna nke Eluigwe onye zaworo ekpere nke ndịorù Ya abụọ kwesịrị ntụkwasịobi.

N’aha Jisọs

Otù ihe kpatara Chineke ji gwọọ onye ngwụrọ ahụ bụ na Pita na Jọn rịọrọ n’aha Jisọs. Jisọs agwawo ndị ná-eso ụzọ Ya sị: “Ihe ọ bula unu gārịọ kwa n’aham, ihe ahu ka M’gēme, ka ewe nye Nnam otuto nime Ọkpara Ya” (Jọn 14:13).

Ndị Farisii achọghị ikwere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Ma site n’ọlụ ebube ndị ná-eso ụzọ Ya lụrụ n’aha Jisọs, enyere Ya otuto dịka Chineke. Ọ bụrụ na ha kpere ekpere n’aha onwe ha -- dịka n’aha Jọn, ma-ọbụ n’aha Pita, maọbụ n’aha Meri, nne Jisọs -- Chineke agaghị azaworị ekpere ha. Ha bụ mmadụ efu, dịka mụ na gị. Náánị ihe pụrụ iche banyere ha bụ na ha ejiwo ndụ ha dum chụbiga àjà òkè n’ijéozi Chineke nke mere na ha nwere okwukwe zuru òkè iji kwere na Chineke ga-eme ka onye ngwụrọ ahụ jee ijè mgbe ha kpere ekpere n’aha Jisọs.

Pita na Jọn abụghị ndị ná-eme ihe-ike. Otù aka ahụ kwa Elaija onye meworo ọtụtụ ihe dị iche iche site n’ekpere nke mmadụ ná-apụghị ime n’onwe ya. Jemes sịrị: “Elaija bu madu yiri anyi n’aru-ya, ọ we kpesie ekpere ike ka miri ghara izo; miri ezogh kwa n’ala arọ atọ na ọnwa isi. Ọ we kpe ekpere ọzọ; elu igwe we nye miri ozuzo, ala we mia nkpuru ya” (Jemes 5:17, 18).

Chee ihe anyị pụrụ ime n’aha Jisọs ọ bụrụ na anyị kpesie ekpere ike dịka ndịkom ahụ kpere! Okwu ahụ ná-agwa anyị sị: “Nāgbasi ngba ike n’ihi okwukwe ahu nke enyere ndi nsọ n’aka nání otù mgbe idebe” (Jud 3). Ya mere anyị hụrụ na Onyenwe anyị chọrọ ka anyị chọsie ike dị otú a ike.

Gịnị bụ ihe kachasị anyị mkpà n’ụbọchị ndịa? Ànyị nwere mmasị n’inweta ike Chineke ná ndụ anyị karịa ka anyị nwere n’ịkpakọtara onwe anyị ihe? Gịnị bụ ihe na-ewere oge anyị karịsịa -- échìchè otú anyị ga-esi pụ inweta ike Chineke karị, ma-ọbu na mbụ? Ihe banyere ọlụ nke Onye-isi anyị ọ na-emetụ anyị n’ọbị karịa nke anyị?

Obi-ụtọ Dị N’inwe Ike

Ị chere na o metụrụ nwoke ahụ agwọrọ ọrịa na Pita na Jọn enweghị ego? O nwetawo karịa ihe ego pụrụ ịzụta. Ị chere na Pita na Jọn na-esogbu onwe ha banyere ogbenye ha bụ? Obiụtọ nke ndụ ha bụ ịmata na ha na-eme uche Chineke. Lee obiụtọ ndị ahụ nwere ka ha ji ọsọ ná-abịa ịhụ ihe ahụ meworo! Ọtụtụ puku mmadụ gbakọrọ wee lee Pita na Jọn anya ná mgbagwoju-anya. Òlee ụdị mmadụ ndịkom ndịa pụrụ ịbụ bụ ndị pụrụ ime ka onye ngwụrọ jee ijè? Nke a bụ kwa ohere ọzọ nye Ndị-ozi ikwusa banyere Jisọs.

Pita adịghị atụ kwa egwù mmadụ ọzọ. Ọ sara ajụjụ ha site n’ikwu sị, “Gịnị mere ihe a nēju unu anya? maọbụ gịnị mere unu nēlegide ayi anya, dịka ọ bu site n’ike nke aka anyị maọbụ dika anyị onwe anyị nāsọpuru Chineke ka anyị meworo ya ka o je ije?” Ọ bụrụ na ndịkom Israel ndịa kweere na Chineke dịka ha kwuru, ha ga-aghọtaworị na Jisọs bụ Ọkpara Chineke, na ọ bụ kwa n’aha Ya ka alụworo ọlụ ebube a.

Agọnarịrị Jisọs

Lee otú Pita boro ndịa ebubo iru na iru! “Unu onwe-unu gọnariri Onye Nsọ na Onye Ezi Omume ahu, we riọ ka ewere amara nye unu ogbu-madu; unu we gbue Onye ahu nke nēdubà madu na ndu.” Nke ahụ ọ bụghị ihe dị óké egwù ndị okpukpé ndịa meworo?

Ma okwu niile Pita abụghị ebubo. Ọ bụ eziokwu na ndịa kpọgburu Jisọs, ma ha mere ya ná-amaghị ama. Ọtụtụ ndị ode-akwụkwọ na Ndị Farisii aghọtaghị na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Pita ka nyekwara ha olile-anya ọ bụrụ na ha ga-échègharị

Jisọs alawo n’Eluigwe, ha apụghị kwa imegharị ihe ha meworo Ya; ma Ọ na-abịa ọzọ, ha pụkwara ijikere izute Ya. Nke ka nke ha bụ ndị arọpụtaworo; ha bụ ụmụ Abraham onye ya na Chineke gbaworo ndụ, “Ọ bu kwa na Nkpuru gi ka agāgọzi agburu nile nke uwa.” Chineke ka chọkwara iji ha kuziere ndị ọzọ nzọpụta.

Okwu nke Ndị-amụma

Pita adịghị enye ndị ahụ òzízí ọhụụ mgbe ọ na-ekwusa banyere Kraist. O chètaara ha ihe ndị amụma deworo nime ọtụtụ narị arọ gaworo aga. Ndị ahụ maara okwu nke ndị amụma. Gịnị mere ha ahụtaghị na amụma niile ahụ bụ banyere Jisọs?

Moses ekwuwo sị: “Onye-nwe-ayi Chineke gēme ka Onye-amuma, Nke di ka mu onwem, biliere unu site n’etiti umu-nne-unu; Onye ahu ka unu gēge nti n’ihe nile, ka ha ra bú nke Ọ gāgwa unu.” Ndị ahụ ga-eleziworị anya ige ntị n’okwu niile ahụ, n’ihi na ịdọ-aka-ná-ntị so ha: “Ọ gēru, na madu ọ bula, nke nāgagh ege ntị Onye-amuma ahụ, agēkpochapu ya n’etiti ndim” (Ọlu Ndi-ozi 3:22, 23). Onye amụma ahụ bụ Jisọs; ọ bụrụ kwa na ha agaghị ekwere na Ya aga-ekpochapụ ha.

Samuel, na ndị amụma niile ọzọ kwa, ekwuwo banyere Jisọs. Onye amụma ọ bụla nke kwuwororị okwu, ekwuwo n’otù ụzọ ma-ọbụ n’ụzọ ọzọ banyere ọbịbịa nke Jisọs. Ha ebuwo amụma na ọ bụ nwa agbọghọ ná-amaghị nwoke ga-amụ Ya, na Betlehem, site n’agbụrụ Juda, na otù eze ga-achọ ibibi ndụ Ya mgbe Ọ dị na nwata; na mgbe O tolitere ndị nke Ya ga-ebili megide Ya, kpọgide kwa Ya n’obe, na Ọ ga-esi kwa n’ọnwụ bilie ọzọ. Ihe niile a emewo dịka edere ha n’Akwụkwọ nke ndị amụma.

Ihe kpatara ndị Ju ndịa apụghị ikwere bụ n’ihi na mmehie dị n’obi ha; ma Pita na-enye ha ohere. Ha aghaghị ichègharị, nwee mwuta n’ihi mmehie ha chigharị kwa site na ha, mgbe ahụ ha ga-enweta okwukwe. Chee échìchè banyere ebere Chineke n’ebe ndị mmehie ndịa nọ! Ha bụ ndị kpọgideworo Jisọs n’obe ná-agbanyeghị nke a, ebukwara ụzọ zigara ndị Ju Kraist ahụ siri n’ọnwụ bilie inye kwa ha otù ohere ọzọ.

Ụfọdụ kweere, ma ọtụtụ ekweghị. N’ihi ekweghị ekwe ha, ndị-agha ná-emeri emeri sitere na Rom nọchigidere ha mgbe ihe ra ka iri arọ atọ na ise gasịrị, ebibi kwara obodo Jerusalem. Nime ọtụtụ arọ niile ndịa, ndị Ju enwewo mkpagbu ana-apụghị ịkọ na ihe isi-ike dị ukwu n’ihi na ha jụrụ Kraist ahụ, Onye bịaworo inye ha ọtụtụ ihe ra otú a.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Òlee ebe Pita na Jọn na-eje mgbe ha hụrụ onye ngwụrọ ahụ?
  2. Gịnị ka Pita gwara nwoke ahụ?
  3. Gịnị mere mgbe Pita jidere aka ya?
  4. Ike gịnị ka Pita ji lụọ ọlụ? n’àha onye kwa?
  5. Banyere gịnị ka Pita boro ndị Ju ebubo?
  6. Òlee ohere Pita nyere ha?
  7. Gịnị ka ndị Ju pụrụ ime nke ga-enyere ha aka ikwere na Jisọs?
  8. Ihe ịrịba-àmà ọ ka na-eme n’ụbọchị ndịa?