Ọlu Ndi-ozi 4:1-31

Lesson 283 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Otú a menu ka ìhè-unu nēnwu n’iru madu, ka ha we hu ọlu ọma nile unu, we to Nna-unu Nke bi n’Elu-igwe” (Matiu 5:16).
Notes

N’Ịbà Solomon

Eleghị anya ọ bụ náánị ndị Ju ole-na-ole jere n’Ụlọ-ukwu n’oge hour nke ekpere rịbara nwoke ngwụrọ ahụ bụ ogbenye ama, bụ onye tọgbọworo n’Ọnụ-ụzọ ama Ọma iri arọ anọ. Ana-ebuga ya n’ebe ahụ kwa ụbọchị, ka o wee nwee ike ịnata ego ole-na-ole n’aka ndị ná-abànye.

Ma ụbọchị nke a pụrụ iche -- ọ gaghị arịọ kwa arịrọ ọzọ; ọ gaghị atọgbọ kwa n’iru ọnụ-ụzọ ọla ahụ ejikọtara abụọ ná-akwọ mụrụ mụrụ nke ndị Kọrint nke dị óké ọnụ karịa ọla-edo. Anya niile na-adịkwasị ya ka ọ na-ejègharị n’ịbà nke Ụlọ-ukwu ahụ.

N’ebe ahụ ka ya na Pita na Jọn na-eguzo. Iru ya na-amụke ka ọ na-ege ntị n’okwu Chukwu nke Pita na-ekwu. Nsogbu aghaghị ịdapụta. Oge niile onye arịrịọ ahụ bụ onye ngwụrọ, ọ dịghị onye ọ bụla o metụrụ n’arụ; ma ugbu a emeworo ka arụ dị ya ike, ìgwè madụ gbakọrọ ná-añụrị ọñụ. Pita na-asị na ọ bụ site n’okwukwe nime Jisọs onye Chineke mere ka O si n’ọnwụ bilie, ka eji mee ka arụ dị nwoke ngwụrọ a ike. Ma ụfọdụ ndị Ju ekweghị ná mbiliten’ọnwụ, ya mere nsogbu pụtara. Ma chere, ọ bụ ọchị-agha nke Ụlọ-ukwu Chineke na-abịa, onye agha nke ga-ahụ ihe banyere okwu ahụ. O wee duru Pita na Jọn tụbà ha nime ụlọ mkpọrọ n’abalị ahụ. Ebe niile wee dajụọ ọzọ nime Ụlọ-ukwu ahụ.

Ọtụtụ ugbò ka amataworo na ogologo oge niile onye ọrịa nọ n’ihe mgbu, ọ dịghị onye na-eme ka ọ gbasara ya. Ma-ọbụ mgbe niile onye mmehie na-ebi ndụ ajọomume, ọ dịghị onye ná-arịba àmà ma-ọbu nwee mmetụta. Ma mgbe ike Chineke gwọrọ onye ọrịa ma-ọbụ zọpụta onye mkpà na-akpá, ekwensu na-eme ụñara, ndị ahụ kwesịrị ịñụrị ọñụ karịa na-abụ ndị ọ na-ewute karịa.

N’iru Onye-isi nchụàjà

N’oge nke ijéozi Jisọs n’ụwa, mgbe ụmụ mmadụ hụrụ ihe iriba-àmà dị iche iche O mere, ụfọdụ nime ndị, Ju kpebiri na ọ bụrụ na akwụsịghị Ya n’ọlụ Ya, mgbe ná-adịghị anya mmadụ niile ga-ekwere na Ya. Ha wee jekwuru Kaiafas bụ onye-isi nchụàjà onye gwara ha na Jisọs gaje ịnwụ otù ụbọchị n’ihi ụmụ mmadụ iwetara mbà niile ndụ ebighi-ebi (Jọn 11:49-52). Ọ na-ebu amụma banyere ọnwụ na mbiliten’ọnwụ nke Jisọs.

Ọ bụ kwa n’iru otù onye-isi nchụàjà ahụ bụ Kaiafas, ka ekutara Pita na Jọn n’echi nke ụbọchi ahụ emere ka arụ dị nwoke ngwụrọ ahụ ike. “N’aha ike gini, ma-ọbụ n’aha gini, ka unu onwe-unu mere nka?” Nke a bụ ohere ọzọ nye Pita ikwupụta banyere Jisọs. Ka anyị ghara ichefu na Pita bụ onye nataworo ọwụwụ-mmiri nke Mmụọ Nsọ n’ụlọ elu n’Ụbọchị Pentikọst. Nke ahụ bụ ihe kpatara o ji pụ iwere nkwuwa okwu sị “Ọ bu n’aha Jisus Kraist Onye Nazaret, Onye unu onwe-unu kpọgidere n’obe, Onye Chineke mere ka O si ná ndi nwuru anwu bilie, ọ bu n’aha nka ka onye a ji aru di nma guzo n’iru unu n’ebe a … aha ọzọ di iche adigh kwa n’okpuru elu-igwe, nke enyeworo n’etiti madu, nke anāghagh izọputa ayi nime ya” (Ọlu Ndi-ozi 4:10-12).

Ndị-àmà Nke Jisọs

Ibobo nwụrụ ndị nchụàjà na ndị-isi n’arụ n’ihi nkwuwa okwu nke Pita na Jọn. Ha matara na ndịa ná-akụ azụ amụghị akwụkwọ dịka ha onwe ha. Òlee otú ndịa ná-amụtaghị akwụkwọ pụrụ iji kwuo okwu dịka ha kwuworo? Nwoke ahụ emere ka arụ ya dị ike na-eguzo kwa n’iru ha. Náánị otù ọzịzá dị: ndịkom ndịa na Jisọs anọworị. Ha kwuru banyere ihe iriba-àmà ahụ emere n’arụ nwoke ngwụrọ ahụ sị, “ayi apugh kwa igọ ya.”

Ndị nchụàjà ahụ kweere na-ághaghị ịkwụsị ụdị nkwusa dị otú a. Aghaghị ịgwa Pita na Jọn ka ha ghara ịgwa onye ọ bụla okwu ọzọ n’aha Jisọs. Pita na Jọn apụghị ịnabata iwu dị otú a. Ha sịrị: “Kpenu ma ọ bu ihe ziri ezi n’anya Chineke inu olu-unu kari olu Chineke: n’ihi na ayi onwe ayi apugh ighara ikwu ihe nile ayi onwe-ayi huru nu kwa” Jisọs enyewo ha ìhè, ha apụghị kwa izobe ya “n’okpuru mgbè.”

Otuto nye Chineke

Okwu Chukwu ahụ Pita kwusara dị ike na ihe karịrị puku mmadụ ise kweere. Ha wee nye Chineke otuto n’ihi ọlụ ebube ha hụrụ. Àpụrụ igbochi ụmụ mmadụ ikwusa nke a? Àpụrụ ịgọnarị ya? Ndị ọchịchị nke onye-isi nchụàjà ha pụrụ ime ka iti-mkpu nke otuto kwụsị? É-è, ọ pụghị ime!

Egbugbere ọnụ anyị ọ pụrụ ịrapụ itò Chineke n’ụbọchị taa mgbe onye mmehie siri ná mmehie ya chègharịa wee chọta ọñụ nke nzọpụta? Ànyị pụrụ ikpuchi ọnụ mgbe ngọzi Chineke na-ezo ka mmiri n’ebe nchụàjà nke ekpere? Mgbe Chineke na awụsa ngọzi na Mmụọ Ya ná mkpụrụobi ndị agụụ na agụ, ma-ọbụ mgbe emere ka arụ dị onye ọrịa ike, ò kwesịrị ka anyị gbochie otuto na-esi n’obi anyị pụta inye Chineke? É-è, n’ihi na ọ bụrụ na anyị kpuchie ọnụ, ọ ga-adị ka nkume ga-eweli olu ha toò Chineke n’ezie.

Nnọkọ-ikpé dị ná Jerusalem, ma-ọbụ ọgbakọ ọzọ nke ụmụ mmadụ apụghị ịkwụsị mgbasa Oziọma n’oge ahụ dị anya mgbe Nzukọ Kraist ka na-amalite ọlụ. Apụghị kwa igbochi ya n’ụbọchị ndịa. Ọ gbasawo n’ụwa niile: ana-agwọ ndị-ọrịa, ndị mmehie na-achọta mgbapụta site ná mmehie. Ike nke Chineke ka nọkwa n’ụwa taa: “Site n’okwukwe ekwere n’aha Ya” ana-eme ka arụ dị ndị-ọrịa ike. “Nzọputa adigh kwa n’onye ọ bula ọzọ: n’ihi na aha ọzọ di iche adigh kwa n’okpuru elu-igwe, nke enyeworo n’etiti madu, nke anāghagh izọputa ayi nime ya.”

Lee ụdị nzụkọ ekpere Ndị Kraist ahụ nwere n’ụbọchị ahụ mgbe anapụtasịrị Pita na Jọn n’aka nnọkọ-ikpé ahụ! Anyị kweere na nwoke ahụ nọ n’Ọnụ-ụzọ Ọma sonye kwara ná nzụkọ ekpere ahụ. Ike nke Mmụọ Nsọ rịdatara wee mee ka ebe ahụ mee mkpatụ. Ọ dịghị ịlaghachị azụ dị n’obi ndịkom ahụ kama ha pụrụ wee kwusa okwu Chineke ná nkwuwa okwu.

Atụghị Egwù

Ka anyị nwee mkpebi nime obi anyị na anyị agaghị atụ egwù ikwusa Jisọs. Mgbe ọ bụla ohere pụtara ikwu otù okwu banyere Ya, ihere ekwesịghị ime anyị iji nkwuwa okwu kọọ óké ihe niile nke O meere anyị.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Òlee akụkụ okwu Chukwu Pita kwuru nke ụfọdụ mmadụ jụrụ ịnagide?
  2. Ọ dị ụfọdụ ndị kweere? Ha dị ole?
  3. Ị chere na Pita na Jọn bụ ndị maara akwụkwọ?
  4. Ònye ka amaara dịka isi nkuku ụlọ?
  5. Gịnị mere ndị-isi na ndị-okenye apụghị ịgọnarị ọlụ ebube ha hụrụ?
  6. Gịnị bụ ọzịzá Pita na Jọn nye nnọkọ-ikpé ahụ mgbe agwara ha ka ha ghara ikwu okwu banyere Jisọs?
  7. Gịnị mere mgbe ndị ahụ kpere ekpere?
  8. Ò kwesịrị ịbụ ihe ihere nye mmadụ mgbe ọ bụla ma ámárá ya dịka Onye Kraist?