Ọlu Ndi-ozi 4:32-37; 5:1-16.

Lesson 284 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Agagh-agu onye-àmà okwu ugha n’onye nēmegh ihe ọjọ; ọzọ, onye nēkupu okwu ugha dika umu agagh-ewepuga onwe ya” (Ilu 19:5)
Notes

Ịdịn’otù

Mgbe akpọpụtasịrị ha site n’ụlọ mkpọrọ, ndị-ozi ahụ nọgidere n’ikwusa Oziọma. Ha kwuwara okwu site n’ike ahụ enyere ha mgbe emejupụtara ha na Mmụọ Nsọ ka ha na-ekpe ekpere. Ha kwusara banyere Jisọs na mbiliten’ọnwụ Ya. Ha ji ike dị ukwu kwuo okwu ka ha na-agba àmà ná-ekwupụta kwa. Jisọs ekweworị mkwà na ha ga-anata ike, bụrụ kwa ndị-àmà mgbe ha natasịrị Mmụọ Nsọ (Ọlu Ndi-ozi 1:8).

Ìgwè mmadụ dị bụ ndị kwere ekwe. Otù ụbọchị, ka Pita na-ekwusa, puku mmadụ atọ (3,000) kweere ewee wụọ ha mmiri (Ọlu Ndi-ozi 2:41). N’oge ọzọ, nime ndị nụrụ Oziọma, puku mmadụ ise (5,000) kweere (Ọlu Ndi-ozi 4:4). Ejikọtara ndị ahụ kwere ekwe n’otù n’ịhụn’anya na ịdịn’otù, n’ihi na Jisọs agwawo ha ka ha hụrịta onwe ha n’anya (Jọn 15:12). O kpeworo ndị ná-eso ụzọ Ya ekpere ka ha niile wee bụrụ otù (Jọn 17:21, 22). Ha nọ n’otù olu na n’otù obi dịka Pọl dere akwụkwọ na ndị ná-eso ụzọ Kraist ga-anọ (Ndi Rom 15:6; Ndi Filipai 1:27; II Ndi Kọrint 13:11).

Erere Ihe Enwere

Ọ bụ ezie na o nweghị ihe gosiri na agwara ha mee otú ahụ, ndị ná-eso ụzọ Kraist rere ihe onwunwe ha wee nye Ndị-ozi ego ya. Site ná nchèpụta nke onwe ha ka ha mere nke -- ọ dịghị ndị agwara ma-ọbụ kwagide ka ha mee otú ahụ. Ndị ahụ kwere ekwe dị ka ha nwere óké ịnụ-ọkụ n’obi banyere ihe onwunwe nke ime mmụọ. Àkụ n’Eluigwe (Matiu 6:19-21) dị ka ọ bụ ihe dị óké ọnụ-ahịa nye ha karịa ihe bụla ọzọ.

Ezoghị ego ahụ ezo. Ndị-ozi ahụ bụ ndị ná-enye n’afọ ofufo, ha nyekwara ndị niile nọ ná mkpà. Ezi Mmụọ nke Oziọma bụ inyere ndịọzọ aka, n’ihi na Baịbụl na-ekwu sị: “Chineke huru onye were obi utọ nēnye n’anya” (II Ndi Kọrint 9:7). Ọ bụghị ihe na-eme mgbe niile na Chineke na-achọ ka mmadụ ree ihe o nwere ka o wee ghọọ Onye Kraist. Ọ bụ ezie na ọ bụrụ na mmadụ ahụ ihe ọ nwere n’anya nke mere na ha na-egbochi ya ifè Chineke òfùfè, ọ dị mkpà ka eree ihe niile ahụ. Otù akụkọ dị na Baịbụl banyere otù nwa okorọbịa ná-achịachị nwekwara àkụ, onye ọtụtụ ihe o nwere ná-ekweghị ka o fèe Onyenwe anyị òfùfè. Ọ jụrụ Jisọs ezi ihe nke ọ pụrụ ime ka o wee keta ndụ ebighị-ebi (Matiu 19:16). O biworị ezi ndụ, ọ hụwo kwa ndị agbata-obi ya n’anya, debe kwa iwu ụfọdụ. Ọ jụọ sị: “Gini fọdurum ọzọ ime?” Nwa okorọbịa ahụ nwere ọtụtụ ihe onwunwe, ọ hụkwara ihe niile ahụ n’anya karịa Chineke. Jisọs wee gwa ya na ọ ga-enwe àkụ n’Eluigwe ọ bụrụ na o ree ihe niile o nwere wee nye ndị ogbenye. Nwa okorọbịa ahụ nwere àkụ rii nne, hụ kwa ego ya n’anya nke ukwuu. O wee laa ná mwute. Ihe onwunwe ya gbochiri ya ifè Chineke òfùfè (Mak 10:22).

Àkụ nke Ime-mmụo

Ọtụtụ nime ndị ná-eso ụzọ Kraist enweghị àkụ nke ụwa nke a ebe ọ dị ukwu, ma ihe ha nwere ka ha nyefere Chineke n’aka maka ọlụ Ya. Ha nwekwara onyinye ime mmụọ nke apụrụ iji mee ihe o wee bụrụ ngọzi nye ndịọzọ. Otù ụbọchị Pita na Jọn nyeere onye ngwụrọ aka. Pita sịrị: “Ọ digh ọla-ọcha na ọla-edo m’nwere; ma ihe m’nwere, nke ahu ka m’nēnye gi. N’aha Jisọs Kraist Onye Nazaret, je ijè.” Ọgwụgwọ agwọrọ onye ngwụrọ ahụ, nke ga-eme ka ọ ghara ịbụ onye ngwụrọ ọzọ bụụrụ ya ihe dị ukwu karịa inye ya ego. Anyị onwe anyị pụkwara ikpe ekpere, gbaa-àmà, gwa kwa ndị nọ ná mkpà nke ime mmụọ okwu agbam-ume. Anyị ná-agụ n’Asaia 41:6, na: “Ha nyeritara onwe-ha aka n’otù n’otù; onye ọ bụla nime ha nāsi nwa-nne-ya, Di ike.”

Banabas

Nime ndị ahụ kweere rere ihe ha nwere ma nye Ndị-ozi ego ha retara, otù ka akpọrọ aha n’ụzọ pụrụ iche. Ọ bụ nwoke ana-akpọ Joses, onye Ndị-ozi mesịrị kpọọ Banabas. Onyenwe anyị jiri nwoke a lụọ ọlụ n’ụzọ dị ukwu mgbe emesịrị. O kweghị ka ihe ọ bụla gbochie ya ijere Chineke ozi. O nyere Chineke onwe ya na talent ya, nye kwa ihe onwunwu ya. O nyeere Pọl aka mgbe o chègharịrị ọhụụ mee kwa ka ọ bụrụ enyi ya (Ọlu Ndi-ozi 9:26, 27). Emesịrị zigaa Banabas n’Antiọk ịgba ndị nọ n’ebe ahụ ume, n’ihi na “ọ bu ezi nwoke, juputa kwa na Mọ Nsọ na okwukwe; ewe tukwasi oké ìgwè madu nye Onye-nwe-ayi” (Ọlu Ndi-ozi 11:24). Banabas na Pọl yịkọrọ jee ijè mkwusa Oziọma mbụ nke Pọl jere, ya na Mak wee soro kwa jee Saprọs (Ọlu Ndi-ozi 15:39). N’ụzọ dị otú a, Banabas natara ọtụtụ ngọzi, bụrụ kwa ngọzi nye ndịọzọ.

Ananaias

Otù nwoke na nwunye ya rekwara ihe ha nwere ma debere onwe ha otù ụzọ nime ego ha retara. Mgbe Ananaias nyere Ndị-ozi ụfọdụ nime ego ahụ, o mere ka aga asị na ya enyewo ha niile. Eleghị-anya Ananaias ekwughị ihe ọ bụla. O wee gosị onwe ya dịka onye obiọma na ezi onye ma aghụghọ dị nime obi ya. Ná-arụghị ụkà, ọ chọrọ otuto nke mmadụ. Ọ chọkwara ego ahụ. Ananaias apụghị ịtụkwasị-obi na Chineke pụrụ ilekọta ya ma asị na o were ihe niile o nwere nye Onyenwe anyị. Ananaias dị ka onye ahụ chọrọ ifè Chineke na àkụ òfùfè otù mgbe (Matiu 6:24).

Aghụghọ

Chineke mere ka Pita ghọta na Ananaias abụghị onye eziokwu. Onyenwe anyị na-ele obi Ọ na-amata kwa ezi nzube nke dị nime ya. Mmadụ apụghi ịghọgbụ Chineke. Ọ bụrụ na ọ gbalịa ịghọgbụ mmadụ, Chineke na-ekpughe ya nye ndị-ụkọ Chukwu ya, ndị nkuzi, na ndị mụrụ onye ahụ.

Pita matara na ọ bụ setan tinyeworo ụdị ntụpụta dị otú a nime obi Ananaias, Ananaias ekwenyewo kwara ọnwụnwa ahụ. Ọ bụrụ na anwara gị ka ị mee ihe ná-ezighị ezi, mara na setan tụpụtara ya wee gbalịa tinye ya nime obi gị.

Pita chetaara Ananaias na ọ dịghị mgbe enyere iwu ma-ọbụ manye ya ka o ree ihe o nwere ma nye Ndị-ozi ego ya. Ananaias mere nke ahụ n’onwe ya. Ihe niile o nwere bụ nke ya iji mee ka ọ masịrị ya. Ọbụná mgbe eresịrị ya, atụghị anya ka Ananaias nye Ndị-ozi ahụ ego ya. Ọ bụghị mmehie n’ebe Ananaias nọ inye otù ụzọ nime ego ahụ. Ananaias mehiere mgbe ọ nwara ịghọgbu Ndị-ozi. Ọ chọrọ ịghọ ihe ọ na-abụghị. Omume ya gosịrị na ọ hụrụ ego n’anya, ma ọ tụkwasịghị kwa Chineke ma-ọbụ ndị ná-eso ụzọ Ya obi. Pita wee sị Ananaias, “Ọ bugh madu ka i gwara okwu-ugha, kama ọ bu Chineke.”

Ikpé

Eleghị-anya Ananaias elewo anya ka ekwuo na ya mere nkeọma ma toò kwa ya n’ihi ihe ọ hụtara dịka ihe dị mma nke o meworo. Ọ ga-abụ na ọ tụworị àtụmàtụ ihe ọ ga-ekwu ma ọ bụrụ na ajụọ ha ajụjụ. Mgbe oge ahụ ruru, ọ pụghị ịsaghe ọnụ ya. Ikpé dị ọsọsọ dakwsịrị nwoke a tụrụ àtụmàtụ ime iheọjọ. Ikpé ahụ dị egwù -- otú a ka mmehie ahụ dị kwa. N’àtụmàtụ Ananaias ịghọgbu Chineke, ọ na-eleda ike Chineke anya. Mmadụ adịghị agwa onye-ozi Chineke okwu ụgha o wee ghara ịbụ na Chineke ka ọ gwara ya. Nke a aghaghị ịbụ ihe ịdọ-aka-ná-ntị nye ndịọzọ ka ha ná-emeso Chineke na ndị ya n’ikwesị ntụkwasị-obi.

Mgbe Ananaias nụrụ okwu Pita, o wee da n’ala nwụọ, ná-enweghị ohere maka nchègharị. Ná-agwaghị nwunye ya ihe ọ bụla, edoziri arụ Ananaias wee buru ya pụọ ijé lie ya, dịka ọ bụ omen’ala n’ebe ahụ ílì mmadụ otù mgbe ahụ onye ahụ nwụsịrị.

Safaira

Ihe ra ka hour atọ site na mgbe ebupụsịrị ozù di ya, Safaira, bụ nwunye Ananaias jekwuuru Ndị-ozi. Ya na di ya ekwekọrịtawo ikwu ihe ọzọ banyere onyinye ha nke ego. Ha agbawo ìzù na nzuzo inye otù ụzọ nke ego ha na ikwu na ọ bụ ha dum ka ha nyere.

Eleghị-anya Safaira achọwo kwa ekele na nsọpụrụ; ma mgbe Pita jụrụ ya ajụjụ, achọpụtara na o ketara òkè ná mmehie Ananaias ná enweghị nsọpụrụ ya -- o kwughị eziokwu banyere ego ahụ. O nyeghị ihe ngọpụ, ọ dịghị kwa oge enyere ya iji chègharịa. Agụpụtara amam-ikpé, ọnwụ wee bịa ọsọsọ. Mgbe Pita gwara ya ihe mere Ananaias, na ya onwe ya ga-anwụ kwa, o wee daa n’ala n’ụkwụ Pita wee nwụọ. Mgbe ndị jere lie Ananaias na-alaghachị, ha wee hụ ka ozù nwunye ya tọgbọrọ ka ewee lie ya n’akụkụ di ya.

Ọnwụ Mberede

Ọ dịwo kwa mgbe ejiri amam-ikpé nke Onyenwe anyị tigbuo ndị ahụ mebiri iwu Chineke. Anyị anụwo banyere mbili mmegide nke Kora n’oge Ụmụ Israel (Ihe-ọmụmụ 105). Kora na ndị niile nwere obi-ebere n’arụ ya na ka ha ra bụ ndị ha na ya soro mehie ka ebibiri. “Ala we saghe ọnu-ya, loda ha, … Ha we rida na ndu rue ala-mọ, ha onwe-ha na ihe nile ha nwere: ala we mechie n’elu, ha we la n’iyi” (Ọnu-ọgugu 16:32, 33). O nwekwara akụkọ ọzọ dị iche iche egosiri nime Baịbụl banyere mmadụ ndị enyere ahụhu nke amam-ikpé nke Onyenwe anyị na mberede n’ihi mmehie ha (Ọnu-ọgugu 14:37, II Ndi Eze 1:10-12).

Otú ọ dị, ndị mmehie niile adịghị ada n’ala wee nwụọ na mberede; ọnwụ mberede niile abụghị kwa ahụhụ nke mmehie. Oge ụfọdụ ndị nke Chineke na-anwụ kwa ọnwụ mberede, ọ bụrụ na nke ahụ bụ ụzọ Chineke chọrọ iji were ha. Ma mgbe ọnwụ bịara onye mmehie na mberede, ọ dịghị enwe ohere ikpe ekpere na ichègharị -- oge aganarịwo ya ịnata mgbaghara mmehie ya, ya na Chineke apụghị kwa ime udo. Ọnwụ nke onye ná-emebi iwu adịghị atọ Chineke ụtọ (Ezikiel 33:11); ma, “Ihe di oké ọnu-ahia n’anya JEHOVA ka ọnwụ nke diri ndi-ebere Ya bu” (Abù Ọma 116:15).

Ikekọ Òkè nime Mmehie

Ihe mere Safaira kwesịrị ịdọ anyị aka-ná-ntị. Ya na Ananaias esoghị jee inye ego ahụ wee site n’ụzọ dị otú a keta òkè nime mmehie ya. Safaira kpuchitara Ananaias nime mmehie ya ma kwuo kwa okwu ụgha iji nyere ya aka. Ọ bụ onye nketa òkè nime aghụghọ nke Ananaias.

Ka anyị lezie-anya wee ghara iketa òkè ná mmehie ndịọzọ site n’ikpuchi njehie ha na inwe kwa ngọpụ banyere mmehie ha. Onye Kraist adịghị ekpuchi mmehie; kama ọ na-abara ihe ahụ bụ ihe ọjọọ mba (Ndi Efesọs 5:11).

Eziokwu Ahụ Ma-ọbụ Okwu ụgha

Nime ọlụ gị n’ụlọ-akwụkwọ na n’igwuri-egwú, esokwala ụzọ ọjọọ ndịọzọ na-eso site n’ịrapụ iguzoro ezi ihe. Ọ bụghị mgbe niile ka ana-eji ọnụ ekwu okwu ụgha; mgbe ụfọdụ ana-eme ya n’omume. Ma ekwuru ya ekwu ma emere ya n’omume, “ọ digh ugha ọ bula si n’ezi-okwu ahu puta” (I Jọn 2:21).

Mgbe anyị mụrụ akwụkwọ Ilu, anyị mụtara na Chineke kpọrọ okwu ụgha asị (Ilu 6:16-19). Ekwensu bụ onye okwu ụgha bụrụ kwa nna ya (Jọn 8:44). Mgbe mmadụ ná-adịghị ekwu eziokwu, ọ bu nke setan ọ pụghị kwa ijé Eluigwe ma ọ bụghị na o chègharịrị kwuo kwa eziokwu. Nime Nkpughe 21:8 anyị na-agụ na ndị ụgha niile, “òkè-ha gābu nime ọdọ ahu nke ji ọku na brimstone nēre.”

Óké Egwù

Òlee mmetụta nke ọnwụ mberede nke Ananaias na Safaira nwere n’arụ ụmụ mmadụ? Nke a webatara échìchè n’obi ndị niile nụrụ ya. Egwù batara nime ha, ha wee ghọta ịdị njọ nke ikwu okwu ụgha, na mkpà ọ dị ikwesị ntụkwasị-obi n’ebe Chineke nọ. Ha wee mara na “ọ bu ihe di egwu idaba n’aka Chineke di ndu” (Ndi Hibru 10:31). Eleghị-anya échètaara ha banyere okwu ndị mgbe ochie kwuru: “Ònye puru iguzo n’iru JEHOVA, bu Chineke nsọ a?” na ọzịzá Devid nyere n’Abù Ọma 24: “Onye nwere ọbụ-aka abua nēmegh ihe ọjọ, na obi di ọcha; onye nēbuligh nkpuru-obi ya nye ihe efu, ọ ñugh kwa iyi aghughọ.”

Ọnwụ nke Ananaias na Safaira egbochighị ma-ọbụ kwụsị mgbasa nke Oziọma. Ndị nke Onyenwe anyị nọgidere n’ọlụ na n’ifè òfùfè ha. Ọnụ-ọgụgụ ndị kwere ekwe wee baa ụba, ewee tụkwasịrị Nzukọ Kraist ọtụtụ ndịkom na ndịnyom. Ngọzi nke Onyenwe anyị dakwasị kwara ụmụ mmadụ n’ihi na ewepụwo mmehie n’etiti ha. Ka ewee nweta ngọzi Chineke n’ụbọchị taa, aghaghị isite ná ndụ ụmụ mmadụ na ndị ná-eso Ya wepụ mmehie. Ọ bụrụ na mmehie anọgide nime ndụ na obi mmadụ, Chineke apụghị ịlụ ọlụ dịka Ọ ga-achọworị ịlụ.

Ọlụ Ebube

Site n’ike Chineke, Ndị-ozi ahụ lụrụ ọlụ ebube n’ebe ụmụ mmadụ nọ. Ìgwè mmadụ bịara site n’obodo niile na ala niile dị Jerusalem gburugburu. Alụrụ ọtụtụ ọlụ ebube mee kwa ihe ịrịba-àmà -- ndị arụ ná-adịghị ike nwetara arụ-ike, chụpụ ndị mmụọ ọjọọ, ndị niile akpọtaara Ndị-ozi ahụ ka agwọkwara ọrịa ha. Ụmụ mmadụ nwere ntụkwasị-obi na okwukwe nke mere na ha na-ekupu ndị arụ ná-adịghi n’ámá, ka onyinyo Pita “we kpuchie otù onye (ụfọdụ) nime ha.”

Eleghị-anya Jisọs na-ekwu banyere ọlụ ebube ndịa mgbe O kwere ndị ná-eso ụzọ Ya mkwà nke Onye nkasị-obi wee sị: “Onye nēkwere na Mu ọlu Mu onwem nālu ka onye ahu gālu kwa; ọlu ka ndia uku ka ọ gālu kwa; n’ihi na Mu onwem nāgakuru Nnam” (Jọn 14:12). Ọlụ ebube ndịa bụ ụfọdụ nime ihe iriba-àmà nke Jisọs kwuru na ha ga-eso ndị kwere na Ya (Mak 16:17, 18). Ihe iriba-àmà ndịa ka dịkwara ndị kwere ekwe n’ezie n’ụbọchị taa mgbe ha ji okwukwe, kpe ekpere n’aha Jisọs maka nsọpụrụ na otuto nke aha Ya. (Gụọ Ọlu Ndi-ozi 4:29, 30 na Ndi Rom 15:18, 19).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị nyeere Ndị-ozi aka inwe nkwuwa okwu?
  2. Gịnị bụ ịdị-n’otù?
  3. Kwuo ihe ị matara banyere Banabas.
  4. Òlee otú Pita ji mara na Ananaias ekwughị eziokwu?
  5. Ònye mere ihe Ananaias na Safaira ji ghọọ aghụghọ?
  6. N’ụzọ dị añaa ka Ananaias na Safaira ji mee mmehie?
  7. Gịnị bụ ikpé Chineke megide Ananaias na Safaira?
  8. Òlee otú okwu ụgha ji emetụ Onyenwe anyị?
  9. Òlee mmetụta nke ọnwụ Ananaias na Safaira nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ?
  10. Òlee otú Ndị-ozi ji nwee ike ịlụ ụdị ọlụ ebube niile ahụ?