Ọlu Ndi-ozi 5:17-42.

Lesson 285 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBIN’ISI: “Ngọzi nādiri unu mgbe ọ bula ha nāta unu uta, nēsogbu kwa unu, nēkwu kwa ajọ ihe nile di iche iche megide unu n’okwu-ugha, n’ihim” (Matiu 5:11).
Notes

Nguzogide

Mgbe atụkwasịịrị ndị ná-eso ụzọ Kraist ìgwè mmadụ, Ndị-ozi Ya wee lụpụta kwa ihe iriba-àmà, ọlu ebube, na ọlụ dị ike dị iche iche, ha nwere nguzogide. Ná-arụghị ụka, n’ihi ekworo ka ndị ahụ kpagburu Ndị-ozi ji kpọọ ha asị. Onye-isi nchụàjà, na ndị ahụ akpọrọ ndị okpukpé, amatara dịka ndị Sadusi, ndị ná-agọnarị mbiliten’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, jupụtara n’iwe na ọnụma megide Ndị-ozi. Ha kpebiri ịkwụsị ọlụ nke Ndị-ozi Jisọs wee tụbà ha n’ụlọ mkpọrọ. Ahụghị ebubo ọ bụla megidere Ndị-ozi, kama na nwa oge ntà o gbochiri ha ịlụ ọlụ dịka ha na-alụ na mbụ. Eleghị-anya ndị Sadusi ahụ atụwo àtụmàtụ itinye egwù n’obi ndị ná-eso ụzọ Kraist, site kwa n’ịtụba ha n’ụlọ mkpọrọ ha elewo anya ime ha na ọlụ ha ihe ihere.

N’otù oge gara agaa, otù ndị ahụ kwa abaworo Ndị-ozi mbà, mee kwa ka òtù nnọkọ-ikpé jụọ ha ajụjụ. Mgbe enyesịrị Ndị-ozi iwu ka ha ghara ikwu okwu ma-ọbụ ikuzi ihe n’aha Jisọs, ha zara sị, “Kpenu ma ọ bu ihe ziri ezi n’anya Chineke inu olu-unu kari olu Chineke.” Òtù nnọkọ-ikpé ahụ apụghị ịchọpụta ihe ọ bụla ha ga-eji nye Ndị-ozi ahụ ahụhụ, ewee rapụ ha ka ha laa n’ihi ìgwè mmadụ ahụ. Egwù atụghị Ndị-ozi n’ihi okwu nke ịbá mbá, ya mere ha gara n’iru ikwusa na ikuzi ihe banyere Jisọs.

Ikwesị Ntụkwasị-obi Nye Chineke

Ọ bụrụ na ihe dị otú a adapụtara ụfọdụ mmadụ, ha ga-akwụsị ikwusa Oziọma ahụ na nwa mgbe ntà. Ebe ọ bụ na nguzogide dị, ụfọdụ mmadụ n’álá-azụ ime ihe ha matara na o ziri ezi. Egwù ibá-mbá na nguzigide adịghị atụ ụmụ Chineke. Ọchịchọ ha bụ ime ihe ha matara na o ziri ezi. Nwanta hụrụ Onyenwe anyị n’anya nke nwekwara nzọpụta, ga-eguzosi ike n’ihe ahụ o kweere, iji mee ihe ahụ ziri ezi, ọbụná ma ụmụ ntakịrị ndị ya na ha n’egwu-egwú, ma-ọbụ ná-ejekọ akwụkwọ rọrọ ime otú o masịrị ha. Dịka Onyenwe anyị nyeere Ndị-ozi Ya aka, Ọ ga-asọpụrụ nye kwara ndị ahụ aka n’ụbọchị taa, bụ ndị ná-eme ihe ziri ezi ọbụná ma ana-eme ha ihe iwe, ná-achị ha ọchị, ma ná-akpagbu kwa ha ebe ọ dị ukwu.

Nime Baịbụl enwere ihe nlere-anya ndị ọzọ mara mma nke ndị guzooro Chineke n’ezie n’oge ihe dịrị ha ike na n’oge mkpagbu. Abaara Daniel mbá banyere ekpere ọ na-ekpe, ma ọ nọgidere n’ikpe ekpere, Chineke wee nọnyere ya, napụta kwa ya site n’olulu ọdụm (Daniel 6:22). N’oge ọzọ, mgbe ana-ewu mgbidi gburugburu Jerusalem, Sanbalat na Tobaia gbalịrị n’ụzọ dị iche iche ime ka Nehemaia bụ onye-ndú kwụsị ọlụ ahụ. Nehemaia atụghị kwa egwù ndị-agha ha niile, amụma niile ha buru na ihe ọjọọ niile ha zubere ime ya. Ọ gara n’iru n’ịlụ ọlụ Onyenwe anyị. Mgbe alụsịrị mgbidi ahụ, ndịiro ahụ niile wee nụ ihe banyere ya, “ha we mara na esitere n’aka Chineke ayị je ozi a” (Nehemaia 6:16).

Nnapụta Sitere N’aka Mmụọ-ozi

Ndị-ozi abụrụwọrị ndị kwesịrị ntụkwasị-obi na ndị ná-erubere Chineke isi. Ha na-ekwusarị Oziọma, ná-ezi kwa ihe rue mgbe ndị-iro ha biliri imegide ha, ewee tụbà kwa Ndị-ozi n’ụlọ mkpọrọ n’oge ahụ. N’oge mkpà ha, Chineke arapụghị ha ma-ọlị. Ná-abalị mgbe ebe niile dị jụụ, ọchịchịrị wee gbachi kwa nime ụlọ mkpọrọ, otù ọbịa bịara. Mmụọ-ozi nke Onyenwe anyị meghere ọnụ-ụzọ niile nke ụlọ mkpọrọ, duru ndị-ozi wee pụta, wee zie ha ozi. Mmụọ-ozi ahụ sịrị, “Gānu, guzo gwa kwa ndi-Ju n’ulo uku Chineke okwu nile nke ndu a.” Échètakwaara ha ihe banyere ọlụ ahụ enyere ha ịlụ. Ọ bụ kwa otù ihe ahụ dịka ọ dịwororị na mbụ. Ndụm-ọdụ niile enyere ha doro anya. Ha agaghị ekwusa n’ebe ọzọ dị iche, ma-ọbu náánị na nzuzo. Ọ bụ ụmụ mmadụ ka ha ga-ekwusara, ozi ha bụkarị otù ihe ahụ ha na-ekwusa -- okwu niile nke ndụ, okwu nke ná-eweta ndụ ebighị-ebi, okwu nke nzọpụta. Ọ bụ eziokwu niile nke Oziọma ka ha ga-ekwusa.

Ọ dị ihe kpatara mmụọ-ozi nke Onyenwe anyị ji napụta Ndị-ozi ahụ -- n’ihi otuto na nsọpụrụ nke Chineke. Ọlụ ha bụ ịlụ ọlụ Onyenwe anyị. Mgbe Chineke napụtara mmadụ site ná mmehie, ọ na-adị ihe kpatara ya -- ka ndụ ya wee ná-enye Chineke nsọpụrụ. Mgbe agwọrọ anyị ọrịa ma-ọbụ napụta anyị ná nsogbu site n’ike nke Chineke, anyị ga-esite ná ndụ anyị na-ebi, na ozi anyị na-ejere Ya, nye Chineke otuto na nsọpụrụ. Mgbe ị na-arịọ Chineke maka inye-aka ma-ọbụ nnapụta n’oge mkpà, cheta ikpe ekpere ka Onyenwe anyị mee ya n’ihi otuto na nsọpụrụ nke Ya onwe ya, ọ bụghị náánị maka ihe-ụtọ na ọdị-mma nke gị onwe gị, kama ka i wee bụrụ onye àmà banyere ike nke Chineke. Anyị na-agụ nime Abù Ọma: “Ka nkpuru-obim di ndu, o gēto kwa Gi” (Abù Ọma 119:175); na “Me ka nkpuru-obim si n’ebe emechibidoworo ya puta, ka m’we kele aha-Gi” (Abù Ọma 142:7)

Ụlọ Mkpọrọ Tọgbọrọ N’efu

N’ụbọchị nke ná-eso ya, Ndị-ozi gara n’iru n’ịlụ ọlụ ha, ná-atụfughị oge ma-ọbụ ịrụ-ụka. Ha matakwara ihe achọrọ n’aka ha, o jukwara ha afọ ịtụkwasị Chineke obi. Mkpagbu ahụ gakwara n’iru. Onye-isi nchụàjà kpọkọtara ndị nnọkọ-ikpé na nzukọ ndị okenye Ụmụ Israel niile. Ka ha gbakọtara n’ebe ahụ ezigara ndị-isi ụlọ mkpọrọ ka ha gaa kpọta ndị mkpọrọ ahụ. Ha chọpụtara na emechisịrị ụlọ mkpọrọ nkeọma, ndị nché nọ kwa n’ọlụ ha, ma ọ dịghị kwa onye ọ bụla ahụrụ nime ya. Ha wee gwa òtù nnọkọ-ikpé ahụ na ụlọ mkpọrọ ahụ tọgbọrọ n’efu. Ndị ahụ gbalịwororị iwetara ụmụ-azụ Kraist ihe imebi échìchè na ihe ihere, bụ ndị ewetaara ihe ihere, ihe imebi échìchè na ọgba aghara. Ka òtù nnọkọ-ikpé ahụ na-echè ihe ọzọ ha ga-eme, ozi rutere ha na ndịkom ahụ ha tinyewororị n’ụlọ mkpọrọ nọ n’Ụlọ-ukwu Chineke ná-ezi ụmụ mmadụ ihe. Nime ọgba aghara nke ndị-iro ha, Ndị-ozi nọgidere ná-akụzi ná-ekwusa kwa nime Ụlọ-ukwu Chineke, ná-agbanyeghị ndị ahụ bawororị ha mbá.

Ịtụ Egwù Chineke ka ọ bụ Ịtụ Egwù Mmadụ

Ekutara Ndị-ozi ahụ ọzọ, Ndị-isi ụlọ mkpọrọ kutara ha, ma ha emeghị ya n’ihe-ike n’ihi na ha tụrụ egwù ụmụ mmadụ. Ha enweghị egwù ọ bụla na ha na-emejọ Chineke, kama ha kpachapụru anya ka ha ghara ịkpalị ụmụ mmadụ. Baịbụl kụziri na anyị aghaghị ịtụ egwù Chineke karị ịtụ egwù ihe mmadụ pụrụ ime anyị (Luk 12:4, 5). Anyị na-agụ na “egwu madu nēweta ọnyà: ma onye nātukwasi JEHOVA obi, agēme ka ọ nọ n’elu” (Ilu 29: 25) na ka anyị “tua egwu Chineke, debe kwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nka bu ọlu madu nile” (Eklisiastis 12:13).

Okwu Niile Nke Onye-isi nchụàjà

Ndị-ozi ahụ guzoro n’iru òtù nnọkọ-ikpé Sanhidrin, òtù nnọkọ-ikpé kachasị nke Ndị Ju nwere. Onye-isi nchụàjà wee sị, “Ayi nyesiri unu iwu ike ka unu ghara izi ihe n’aha nka” Ndị-ozi zaghachirị sị, “Ayi aghagh ikwenyere Chineke kari madu.”

Ndị-ozi rubeere Chineke isi Onye ike Ya karịrị nke mmadụ. Ha nupụrụ-isi n’iwu nke ndị-isi ndị Ju nyere ha, n’ihi na o megidere iwu nke Onyenwe anyị nyewororị ha, Onye nke Kraist bụ ezi onye na obodo ya, ọ na-edebe kwa iwu obodo. Agaghị enupụ-isi n’iwu nke obodo anyị ma ọ bụghị ma ha megidere iwu Chineke. Ọlụ mbụ anyị nwere ịlụ bụ irubere Chineke isi. Ekwesịrị ịgụ Ndị-ozi ná ndị-ikpé ná-amaghị n’ihi na ha rubeere Onyenwe anyị isi.

Onye-isi nchụàjà ekweghị ị kpọ aha Jisọs Onye bụ Mesaia ha, onye aha Ya gaara abụrụ ya, ma kwesị kwa ị bụrụ ya ihe di óké-ọnụ. Ná-arụghị ụka, onye-isi nchụàjà chetara ụbọchị ahụ akpọgidere Jisọs n’obe, mgbe ndị Ju tikuru Pailata bụ onye ọchịchị sitere na Rom mkpu, sị, “Ọbara-Ya di ayi n’isi, di kwa n’isi umu-ayi” (Matiu 27:25). Ọ bụghị na Ndị-ozi chọrọ ime ka Ọbara Jisọs na ihe kpatara O ji nwụọ dịrị n’isi ndị ahụ. Ọ bụ ha onwe ha kpatara ihe mere Ọbara Jisọs ji dịrị n’isi ha na n’isi ụmụ ha. Ndị ọchịchị ahụ achọghị ka ámá ha ikpé ihe ọjọọ ahụ ha mererị, kama ha bu n’obi ịgụ Ndị-ozi ahụ ná ndị ikpé mara. Akọ-na-uche nke ndị òtù nnọkọ-ikpé ahụ, ga-amawo harị ikpé. Ha agaghị ekwuworị okwu dị otú a asị na Jisọs kwesịrị ọnwụ, kama okwu ọnụ ha gosịrị na ha matara na ọ dịghị ihe O mere.

N’iru Òtù nnọkọ-ikpé

Eleghị-anya okwu niile nke Jisọs batara nime obi Ndị-ozi ka ha guzoro n’iru ndịkom niile ahụ ọchịchị dị n’aka. Jisọs ekwuworị sị: “Mgbe ọ bula ha kuru unu bia n’iru ulo-nzukọ na ndi-isi, na ndi nāchi isi, unu echegbula onwe-unu otú unu gāgọpu onwe-unu ma-ọbu ihe unu gēji gọpu onwe-unu, ma-ọbu ihe unu gēkwu: n’ihi na Mọ Nsọ gēzi unu n’oge hour ahu ihe unu nāghagh ikwu” (Luk 12:11, 12).

Asị na òtù nnọkọ-ikpé ahụ lererị anya ịnata ọzịzá ná-adịghị ike site n’ebe ndị-ozi nọ, ọ ga-ejuworị ha anya n’ihi na Pita na ndị-ozi ọzọ ji nkwuwa okwu n’ekwupụta na Chineke asọpụrụwo, weli kwa Jisọs elu ịbụ onye ọchịchị na Onye nzọpụta. Pita gakwara n’iru ikwu na ọ bụ Chineke rọpụtara Jisọs iwetara Israel nchègharị na kwa ịgbaghara ha mmehie ha niile. O kwusa kwara Oziọma ná-asị na nchègharị ga-eweta mgbaghara. Pita emeghị ihe ngọpụ, ma-ọbụ rịọ mgbaghara banyere omume niile nke Ndị-ozi mere. Kama ime nke a, o kwukwara ya ọzọ na ọ bụ ndị ahụ ya gwara okwu ka ikpé mara n’ihi mkpọgide n’obe akpọgidere Jisọs, na site n’asọpụrụghị aha Jisọs, na n’erubereghị Ya isi ha adịghị asọpụrụ Chineke.

Ámàpuru Ha n’obi

Eziokwu ahụ Pita gwara ndị-isi a dịka onye àmà emeghị ka agụọ Ndị-ozi ná ndị-ikpé ná-amaghị n’iru òtù nnọkọ-ikpé ahụ. Mgbe emere ka “amapue ha n’obi ha” site n’iwe na amam-ikpé, ndị òtù nnọkọ-ikpé ahụ, zubere igbu Ndị-ozi ahụ.

Ọ dị kwa mgbe ọzọ Pita kwusara ụdị mkwusa a, “ewe dua ha nime obi-ha” bụ ndị ahụ gere ha ntị nke mere na o metụrụ ha ịchọ nzọpụta (Ọlu Ndi-ozi 2:37). Ụbọchị ahụ puku mmadụ atọ kweere, chègharịa kwa, ewee wụọ ha mmiri. Mkwusa nke Oziọma bụụrụ ndị kwere ekwe ndụ nke ime mmụọ; ma ọ bụrụ òtù nnọkọ-ikpé ahụ bụ ndị jụrụ Oziọma ọnwụ nke ime mmụọ (II Ndi Kọrint 2:15, 16).

Gameliel

N’oge a mgbe ọ dị ka aga egbu Ndị-ozi, otù onye nime òtù nnọkọ-ikpé ahụ, nyere ụfọdụ ndụm-ọdụ. Ọ bụ onye Farisi, onye ọkà iwu onye ana-akpọ Gameliel, onye ụmụ mmadụ maara nke ọma, hụ kwa n’anya. O nyere ndụm-ọdụ ka arapụ Ndị-ozi na nwa mgbe ntà, O dọkwara òtù nnọkọ-ikpé ahụ aka-ná-ntị banyere ihe ha zubeworo ime ndịkom ahụ. Gameliel nyere ihe atụ abụọ banyere ndị ọzọ ndị òzízí ha gbasawororị na nwa oge, emesia anụghị kwa ihe banyere ha ọzọ, ma nke a emeghị site n’inye aka nke ndị nnọkọ-ikpé ahụ.

Ihe Gameliel na-ekwu bụ na, ọ bụrụ na ọlụ Ndị-ozi a sitere n’aka mmadụ na “agākwatu ya n’ala,” ma ọ bụrụ na ọ bụ ọlụ Chineke, na ha apụghị ikwatu ya. Gameliel ekwughị ihe ya onwe ya kweere banyere ọlụ nke Ndị-ozi ahụ na-alụ. Ihe o kwuru gọsịrị na ọ matara na ọ dịghị ihe ọ bụla karịrị ike Chineke, na ọ bụ kwa náánị ezi ọlụ nke Onyenwe anyị pụrụ ịnagide mkpagbu. (Gụọ Abù Ọma 127:1; na Ilu 21:30). Nime ọtụtụ arọ, enwewo ọtụtụ òzízí na okwukwe dị iche iche nke ekewasịworo, ma-ọbụ tinye kwa ihe n’ime ya, ma-ọbụ na ọ dịghị kwa ihe eji ha ná-eme, ma “okwu Onye-nwe-ayi nādigide rue mgbe ebigh-ebi” (I Pita 1:25).

Ịhụ Ahụhụ N’ihi Onyenwe anyị

Òtù nnọkọ-ikpé ahụ kweere idebe ndụm-ọdụ Gameliel nyere ha nke bụ ichere wee hụ ihe ga-adakwasị Ndị-ozi na òzízí ha. N’oge a, òtù nnọkọ-ikpé a egbughị onye ọ bụla nime Ndị-ozi ahụ. Tupu arapụ ha, apịara ha ihe, wee gwa ha ka ha ghara ikwu okwu ọzọ n’aha Jisọs. Ná-arụghị ụka, ndị-isi nke Ndị Ju chererị na site n’ịpịa Ndị-ozi ihe, ha ga-eme ha ihe ihere, mee kwa ka egwù tụọ ha. Ma mkpagbu ahụ dapụtara wetara ihe dị iche iche nye Ndị-ozi. Ha hụrụ ahụhụ ahụ ná-ejighị iru mgbaru. Ha ñụrịrị ọñụ na agụwo ha ná ndị kwesịrị ịhụ ahụhụ n’ihi Jisọs. Ndị-ozi ahụ gakwara n’iru n’ịlụ ọlụ ha. Ha kụzirị ihe n’Ụlọ-ukwu Chineke ụbọchị niile dịka Jisọs mererị tupu Ọ nwụọ. (Luk 19:47; Matiu 26:55). Ha kwusara n’ìhè, kwusaa kwa na nzuzo -- nime Ụlọ-ukwu Chineke na n’èzínaụlọ ọ bụla. Ha agbanweghị kwa isi-okwu nke ozi ha. Ha kwusa kwara banyere Jisọs na ike nke O nwere iji zọpụta.

Òtù nnọkọ-ikpé ahụ emezughị ihe ha bu n’uche, ma-ọbu irita urù ọ bụla site n’iguzogide mkwusa nke Oziọma. Ndị-ozi ñurịrị ọñụ nime ahụhụ ha. Ná-enweghị obi-abụọ, ha jikeere ịbụ ndị kwesịrị ntụkwas-obi n’ebe Chineke nọ karị ka ha dị na mbụ. Ọ bụ ihe doro anya na ejikọrọ ha nime ịdị-n’otù nke ịhụn’anya, ha wee nọgide kwa n’ịgbasa Oziọma. Mkpagbu nke ndị ná-eso ụzọ Kraist nyere ha ohere ikwu okwu n’iru òtù nnọkọ-ikpé ahụ nke mere na ụfọdụ gere ntị n’Oziọma bụ ndị ná-enwebeghị ohere dị otú a na mbụ. Ndị kpagburu Ndị-ozi bụ ndị tara ahụhụ n’ezie, n’ihi na ha jụrụ inara Oziọma: ma Ndịozi ñụrịrị ọñụ ka ha na agbasa Oziọma nke Nzọpụta.

Site n’oge ahụ akpagbuwo ọtụtụ ndị ná-eso ụzọ Kraist, aga akpagbu ụfọdụ, ana-akpagbu kwa ụfụdụ ọbụná n’ụbọchị taa. “E, agēsogbu kwa ndi nile ndi nāchọ idi ndu n’uzọ isọpuru Chineke nime Kraist Jisus” (II Timọti 3:12), ma ụgwọ ọlụ dịrị ha. Jisọs sịrị: “Ngọzi nādiri unu mgbe ọ bula ha nāta unu uta, nēsogbu kwa unu, nēkwu kwa ajọ ihe nile di iche iche megide unu n’okwu-ugha, n’ihim. Ñurianu ọñu, ka obi tọ kwa unu utọ nke-uku: n’ihi na ugwọ-ọlu-unu di n’elu-igwe: n’ihi na otú a ka ha sogburu ndi amuma ndi buru unu uzọ” (Matiu 5:11, 12). Pọl, Onye-ozi, onye esogburu nke ukwuu, nke hụkwara ọtụtụ ahụhụ dị iche iche n’ihi Kraist na n’ihi Oziọma, siri, “Asi na ayi nēnwe ntachi-obi, ayi gēso kwa Ya bụkọ eze: asi na ayi gāgọnari Ya, Ya onwe-ya gāgọnari kwa ayi” (II Timọti 2:12).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị mere eji tụba Ndị-ozi n’ụlọ mkpọrọ?
  2. Ònye meghere ọnụ-ụzọ ụlọ mkpọrọ wee dupụta Ndị-ozi ahụ?
  3. Gịnị bụ ozi nke mmụọ-ozi nke Onyenwe anyị wetara?
  4. Òle ebe ndị ọchịchị ahụ chọtara Ndị-ozi ahụ?
  5. Gịnị ka Ndị-ozi ahụ mere mgbe òtù nnọkọ-ikpé ahụ jụrụ ha ajụjụ?
  6. Gịnị bụ ndụm-ọdụ nke Gameliel?
  7. Gịnị mere eji tie Ndị-ozi ahụ ihe?
  8. Gịnị mere Ndị-ozi ahụ ji ñurịa ọñụ?
  9. Gịnị bụ mkpagbu?
  10. Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na ana akpagbu anyị?