I Ndi Eze 11:9-43

Lesson 286 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ka obi-gi jide okwum nile; debe ihe nile m’nyere n’iwu, we di ndu” (Ilu 4:4).
Notes

Ezi Mmalite nke Solomon

Chineke mere ka Solomon hụ Ya anya na Gibeon, n’abalị ahụ dị ebube ka ọ na-ararụ ụra. Anyị na-agụ na “Solomon huru JEHOVA n’anya, nēje ije n’ukpuru nile nke Devid, bú nna-ya” (I Ndi Eze 3:3). Otù ugbò ọzọ, eleghị-anya mgbe arọ iri gasịrị, Chineke mere ka Solomon hụ Ya anya n’oge ido Ụlọ-ukwu ahụ mara mma nsọ. Solomon bụ eze nọ Chineke ezi nso ka o kpere ekpere: “JEHOVA, bú Chineke Israel, ọ digh Chineke dika Gi, n’elu-igwe di n’elu, ma-ọbu n’elu uwa di n’okpuru; I nēdebere ndi-orù-Gi ọgbugba-ndu na ebere, bú ndi were obi-ha nile nējeghari n’iru Gi” (I Ndi Eze 8:23).

Ewerewo nna ná-atụ egwù Chineke gọzie Solomon nke ná-abụghị onye ọzọ ma ọbụghị Devid, nwoke “nke di ka obim (Chineke) si achọ” (Ọlu Ndi-ozi 13:22)

Ọzụzụ ázụrụ Solomon n’ụzọ okpukpé nwere mmetụta dị omimi ná ndụ Solomon na nwa oge.

Ụmụ okorọbịa na ụmụ agbọghọbịa ndị nwere nne na nna bụ Ndị Kraist nwere urù kachasị ná ndụ ha. Ọ bụrụ na ha ñaa ntị n’òzízí niile nke Ndị Kraist, ọ ga-enyere ha aka inweta nzọpụta ngwa ngwa ha toruru ịghọta na ha emehiewo. Emesịa, ka ha na-aga n’iru n’ụlọ akwụkwọ, ọ bụrụ na ha na-echeta ikpe ekpere ụtụtụ ọ bụla na anyasị ọ bụla, ha ga-apụ idebe ịhụn’anya Chineke nime obi ha. Ọ dịghị mkpà ịdaghachị-azụ wee baa nime mmehie ịchọta ihe-ụtọ, Ọ dịghị ọñụ nke ụwa apụrụ iji tụnyere igbu ikpere n’ekpere mgbe ana-awụpụ ngọzi dị iche iche sitere n’Eluigwe. Oziọma nke Jisọs nwere ihe-ụtọ kachasị inye ọbụná mkpụrụobi nke ụmụ-ntà. Enwere Ụlọ akwụkwọ Ụbọchị-ụkọ ebe ha na-amụta ihe banyere Jisọs na uche Ya karịa; ana-enye ụmụntakịrị ohere ịbụ abù na ịfụ opi na ịkpọ ụbọ ná nzukọ ụmụ okorọbịa na ụmụ agbọghọbịa. Ana-akwagide ha ịlụrụ Jisọs ọlụ n’ọtụtụ ụzọ ọzọ dị iche iche.

Ọdịda nke Solomon

O doro anyị anya na Solomon hụrụ Onyenwe anyị n’anya mgbe ọ dị ntakịrị, ọtụtụ ezi ihe dịkwara ya n’iru dịka ọ na-esogide Onyenwe anyị. Ma lee óké ihe-nwute ọ bụ mgbe mgbanwe bịakwasịrị eze ukwu ahụ o “we me ihe jọrọ njọ n’anya JEHOVA (I Ndi Eze 11:6)! Ka anyi gụọ ama-okwu ole-na-ole ọzọ site n’ebe ọgụgụ anyị, nke gosịrị anyị na ọ nọgideghị n’ikpá Jehova nso: “Mgbe agadi Solomon, … obi ya ezugh kwa òkè n’ebe JEHOVA, bú Chineke ya nọ, dika obi Devid, bú nna ya.” “Solomon we me ihe jọrọ njọ n’anya JEHOVA, o jesozugh kwa JEHOVA, dika Devid, bú nna ya, mere.” “Ọ debegh ihe ahu nke JEHOVA nyere n’iwu” (I Ndi Eze 11:4, 6, 10).

Mgbe mmadụ ji obi ya niile ná-ejere Jehova ozi, ụzọ ya niile wee ná-atọ kwa Jehova ụtọ, Chineke “nēme ọbụná ndi-iro-ya ka ha na ya di n’udo” (Ilu 16:7). Ma mgbe mmadụ wezugara onwe ya n’ebe Jehova nọ, o doro anya na nsogbu ga-adị. N’ihi ọdịda nke Solomon, Chineke sịrị ya, “Aghaghm idọwapu ala-eze n’aru gi.” N’ihi na Solomon erubeghị isi, aga anapụ ya ebube na ike Chineke nyere ya, na ohere enyere ya ịbụ eze nke ndị ahụ niile. Adọwo ya aka-ná-ntị; o nweghị ihe ngọpụ; o matara na ya aghaghị inwe obi zuru òkè n’iru Chineke dịka Devid bụ nna ya nweworo.

Àkụ Ná-abawanye

Ma ịhụn’anya nke ụwa na ihe-ụtọ nke mmehie ya egbebawo nime obi Solomon. Ndụ ya jupụtara n’ịchọ ihe-ụtọ mgbe niile. Ọ gbalịrị ime ka obi ya nwee ojuju afọ site n’ịchọ ọñụ, abụ, manya, na àkụ-na-ụba. Site n’ọla-edo na nkume dị óké-ọnụ ná-abịa kwa arọ site n’Ọfia, ụda dị iche iche dị óké-ọnụ nke ndị ahịa sitere n’ala dị anya ná-ebute, cedar bara ụba sitere na Lebanon, na ọla-edo, ọla-ọcha, ọdụ, na ihe niile ọzọ bàra urù ndị ahịa na-ebute otù ugbò n’arọ atọ site na Tashish, Solomon “nēri ihe, nāñu ihe-ọñuñu, ka obi nātọ kwa gi utọ.” Ma ezi ọñụ na udo ná-adịgide adịghị abịa site n’ụzọ dị otú ahụ. Solomon matakwara ya nkeọma, n’ihi na anyị nwere ihe o dere nke ná-agwa anyị sị, “Tua egwu Chineke, debe kwa ihe nile Ọ nyere n’iwu; n’ihi na nka bu ọlu madu nile” (Eklisiastis 12:13). Kama ọ bụ otù ihe ịmara ihe mmadụ kwesịrị ime, bụrụ kwa nnọọ ihe ọzọ ime ya. “Onye matara ime ihe ọma, ma ọ megh ya, ọ buru onye ahụ nmehie” (James 4:17). Ikpé Chineke megide Solomon bụ ihe dị ka okwu ikpé ekwuru megide otù nzukọ: “M’gāgbọpu gi n’ọnum. … I nāsi, abum ọgaranya, emewo ka m’buru ọgaranya, ọ digh kwa ihe ọ bula nākpam; I matagh kwa na gi onwe gi bu onye ahu nāhuju anya na onye kwesiri ebere na onye dara ogbeye na onye kpuru ìsì na onye nāgba ọtọ” (Nkpughe 3:16, 17).

O doro anya na ndị ná-ewezuga onwe ha n’ebe Onyenwe anyị nọ ná-enupụ kwa isi n’iwu Ya ga-ezute nsogbu. Mgbe Eze Sọl. nupụụrụ Onyenwe anyị isi, ọ tụfuru oche-eze ya, n’ikpe-azụ ọ tụfuo mkpụrụobi ya. (I Samuel isi 15 na 31). Belshaza bụ eze buliri onwe ya elu na nganga, ndị-iro ya wee napụ ya oche-eze, gbuo kwa ya (Daniel 5). Chineke na-emeso ụmụ mmadụ taa dịka O mere na mgbe dị anya gara aga. Ngọzi niile nke Chineke na-eso ndị ná-erube isi, ma nkọcha nke Chineke na-eso ndị ná-ekwesi olu ha ike ịrapụ Chineke.

Onye Ná-enye Ezi Onyinye niile

Solomon bụ nnọọ nwoke nwere àkụ rii nne, ọ bụghi mmehie n’iru Chineke inwe ọtụtụ ihe onwunwe; ọ bụghị kwa ihe jọrọ njọ na mmadụ ga-enwe ọtụtụ nke ihe dị mma nke ndụ a. Otú ọ dị, adọrọ anyị aka-ná-ntị nime Baịbụl na mgbe àkụ ná-abakarị ụba, anyị atụkwasịla ya obi (Abù Ọma 62:10). Chineke na-ele anya ka anyị were ezi ihe O nyeworo anyị nyere ndịọzọ aka n’afọ ofufo. Àkụ bụ ngọzi nye ụfọdụ mmadụ, ma ọ bụ nkọcha nye ndịọzọ. Ụfọdụ mmadụ na-afụli elu ná mpako mgbe àkụ na-abakarị ụba. Ọ bụ náánị inwe ike nke Mmụọ Chineke rii nne bụ ihe ga-enyere anyị aka iguzo mgbe ihe na-aga nkeọma, karịa mgbe anyị nọ n’ụkọ. Anyị aghaghị iji aka gbasara agbasa jide ihe Chineke nyere anyị, nwee kwa afọ ofufo inye ndịọzọ ụfọdụ nime urù nke ihe ná-adị nwa oge anyị nwere. Site nime nke a, anyị agaghị ná-enyere náánị ndị nọ ná mkpà aka kama anyị ga-enye aka ịgbasa Oziọma n’ebe niile. Ma ngọzi nke Onyenwe anyị adịghị adakwasị ndị ná-emefusi ihe niile ha nwere n’arụ onwe ha; n’ihi na, ọ bụ ezie na ọ na-abịa site n’aka Onye ahụ na-enye ezi onyinye na onyinye niile zuru òkè.

Ebere Dị Ukwu nke Chineke

Otú ọ dị, n’ụbọchị ikpe-azụ nke Solomon anyị hụrụ ebere agwakọtara ikpé. N’ihi nna ya bú Devid, Onyenwe anyị dịrị ya mma, ọbụná mgbe o chigharịworo pụọ n’ebe Chineke nọ. Chineke sịrị: “Ọ bugh ala-eze-gi nile ka M’gādọwapu; otù ebo ka M’gēnye nwa-gi, n’ihi Devid, bú orùm” (I Ndi Eze 11:13); “ka Devid, bú orùm, we nwe oriọna ubọchi nile n’irum na Jerusalem, bú obodo nke M’rọputaworo Onwem itinye aham n’ebe ahu” (I Ndi Eze 11:36).

Ka anyị lee ụbọchị ikpe-azụ Solomon ma ewere ya tụnyere ụbọchị ikpe-azụ niile nke Devid. Anyị na-agụ banyere Devid na: “Ọ we nwua n’ezi isiawọ, ubọchi nile nke ndu-ya na àkù na nsọpuru ju-kwa-ra ya afọ” (I Ihe Emere 29:28). Ma okwu niile anyị chọpụtara edere banyere ụbọchị ikpe-azụ niile nke Solomon bụ: “Na mgbe agadi Solomon, … obi-ya ezugh kwa ókè n’ebe JEHOVA, bù Chineke-ya, nọ dika obi Devid, bú nna-ya” (I Ndi Eze 11:4). Lee óké ihe dị iche! Agwara anyị na “onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa” (Matiu 10:22).

Solomon egeghị ntị otú o kwesịrị na ndụm-ọdụ nke Devid bụ nna ya onye sịrị, “Nuru, nwam, nara kwa okwu-ọnum nile; arọ ndu gāba-kwa-ra gi uba” (Ilu 4:10). Ọ bụrụ na o mere nke a, ya onwe ya kwa, gara ebi ndụ ruo ezi isi awọ. Kama nke a, ọ nwụrụ tupu ya eruo “ọgu arọ atọ na iri.” Ka nwa okorọbịa na nwa agbọghọbịa lezie anya n’ụzọ ya ñaa kwa ntị n’iwu mbụ nke nwere mkwà enyere nime Okwu Chineke:

“Umu, nāñanu nti okwu ndi muru unu nime Onye-nwe-ayi: n’ihi na nka bu ihe ziri ezi.

“Sọpuru nna-gi na nne-gi (nke bu ihe mbu enyere n’iwu nke nkwà diri ya;)

“Ka ihe we nāgara gi nke-ọma, ka i we di kwa ogologo ndu n’elu uwa” (Ndi Efesọs 6:1-3).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Kwuo banyere ugbò abụọ ahụ Jehova mere ka Solomon hụ ya anya.
  2. Gịnị ka Chineke kwere mkwà inye ya mgbe mbụ O mere ka Ọ hụ Ya anya?
  3. Gịnị mere Chineke ji kwuo sị:, “Aghaghm idọwapụ ala-eze n’aru gi”?
  4. Gịnị mere anapụghị ya ala-eze ahụ niile?
  5. Kpọọ aha ndị niile wetaara Solomon nsogbu.
  6. Gịnị bụ mkwà Chineke kwere Jeroboam?
  7. Òlee ihe ekwekọrịtara aga-eme tupu emezue mkwà ahụ?
  8. Ogologo oge ra anāa ka Solomon bụrụ eze?
  9. Òlee otú ụbọchị ikpe-azụ niile nke ndụ ya dị ma ewere ya tụnyere ụbọchị ikpe-azụ niile nke Devid?
  10. Ònye ka ekwere mkwà ogologo ndụ?