I Ndi Eze 12:1-33; 14:21-23; II Ihe Emere 12:1-16.

Lesson 287 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ọzìzá-okwu di nrò nēme ka ọnuma laghachi azu: ma okwu nwuta nākpali iwe” (Ilu 15:1).
Notes

Emere Rehoboam Eze

Mgbe Solomon bụ Eze nwụsịrị ọ bụ ihe ná-eme eme na nwa ya kwesịrị ịbụ eze. Israel niile gbakọtara na Shekem n’ụbọchị ememe nke ime eze ahụ ịsọpụrụ Rehoboam dịka eze ọhụụ nke Israel n’oche-eze nna ya. Ọ dịghị ihe ọ bụla agwara anyị banyere Rehoboam tupu oge a. Eleghị-anya ọ dịghị ihe ọ bụla o mere kwesịrị ndepụta mgbe ọ na-etolite.

Otú ọ dị, edepụtara anyị ihe banyere Jeroboam, otù nwa okorọbịa ná-alụsị ọlụ ike, onye jiworo obi ike lụọrọ ndị Israel agha wee nweta kwa iruọma nke Israel niile. Ọ gbapụworo jee n’Ijipt n’ihi ekworo nke Solomon. Mgbe ọ nụrụ na Solomon anwụwo, na ana-ekpube kwa Rehoboam okpu-eze, ọ latara maka ememe niile ahụ. Onye-amụma agwaworị Jeroboam tupu ya agbapụ na aga-enye ya ebo iri nke Israel ka ọ chịa, ná-arụghị kwa ụka ugbu a ọ gana eju ya anya otú amụma ahụ ga-esi mezue.

Eboro Ndị Ahụ Ibu-arọ

Mgbe Solomon chigharịsịrị pụọ n’ebe Jehova nọ wee kpeere arụsị o wee ghọọ onye akpịrị urù ná-ezighị ezi na-akpọ nkụ. Ọ na-ana ndị ahụ ụtụ-isi dị ukwu, mee kwa ka ọtụtụ sonye ná ndị agha ya na ndị ná-alụrụ ya ọlụ. Nke a abụrụwo óké mmekpa-arụ nye Ụmụ Israel, ha ahụjuwo kwa anya n’okpuru ndị ná-achị ha n’ihe ike nwere obi ọjọọ.

N’ihi ndị Israel niile Jeroboam wee jụọ Rehoboam otú ọ ga-esi chị ha. Ọ ga-enwe obiọma n’ebe ndị ahụ nọ wee bupụ kwa ibu-arọ nke ndị ahụ buworo? Rehoboam wee sị ka enye ya mkpụrụ ụbọchị atọ nke ọ ga-eji chepụta ọzịzá ọ ga-enye ha.

Nime ụbọchị atọ ahụ Rehoboam kpọbatara ụfọdụ ndị ndụm-ọdụ. Ha bụ ndị-okenye ndị eleghị-anya nọ n’etiti ndị ná-eguzo n’iru nna ya. Ha bụ ndị amam-ihe bụrụ kwa ndị nweworo ọtụtụ arọ nke nnwapụta, ha aghọtawo kwa mkpà niile nke ndị ahụ. Rehoboam bụ nwa okorọbịa, ọ bụ kwa ihe ziri ezi n’akụkụ nke ya ịchọ ndụm-ọdụ n’aka ndịkom nweworo nnwapụta dị otú a. Ndịkom ndịa gwara ya na ọ bụrụ na ọ ga-enwe obiọma n’ebe ndị ahụ nọ, gwa kwa ha okwu dị mma, ha ga-eji obi ha niile bụrụ ndị nọ n’okpuru ya mee kwa ya mma. Ọ bụrụ na ọ ga-abụ eze ha, ọ bụ ọlụ dịrị ya inyere ndị ya aka.

Jisọs nyere ụfọdụ ndụm-ọdụ n’ihi ime nkeọma dịka onye-ndú. Ọ sịrị: “Ma onye dikariri uku n’etiti unu gābu onye nējere unu ozi. Ma onye ọ bula nke gēweli onwe-ya elu, agēweda ya; onye ọ bula nke gēweda kwa onwe-ya, agēweli ya elu” (Matiu 23:11, 12). N’oge ọzọ Jisọs sịrị: “Onye ka ibe-ya uku n’etiti unu, ya di ka onye bu nwata; onye bu kwa onye-isi, ya di ka onye nēje ozi” (Luk 22:26).

Chee échìchè ụdị ọgan’iru Rehoboam ga-enweworị dịka eze ọ bụrụ na o fèrè ndị ya òfùfè dịka Chineke tụworo àtụmàtụ ya! Nime abụ ikpe-azụ nke Devid, ọ bụrụ sị: “Chineke Israel siri, mu ka Óké Nkume Israel gwara okwu: Onye nāchi madu bu onye ezi omume, ọ nāchi n’egwu Chineke” (II Samuel 23:3).

Ezi ndụm-ọdụ niile a ka atụfusịrị n’arụ Rehoboam. Ọ kpọbatara ụfọdụ ndị-enyi ya bụ ụmụ okorọbịa wee jụọ ha ihe ha chère. Ha bụ ndị ọjọọ ha ahụghị kwa ndị ahụ n’anya. Ha gwara Rehoboam ka o mee ka ibu-arọ dị arọ okpukpu abụọ, nye kwa ha ahụhụ ọbụná karịa ka nna Rehoboam nyeworo ha.

Ndị Ana-emezughị Olile-anya Ha

Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, Jeroboam wee bịa ịnụ mkpebi nke Rehoboam, nke a bụ ihe ọ nụrụ: “Nnam mere yoke-unu ka ọ di arọ, ma mu onwem gātukwasi ihe na yoke-unu: nnam were utari dọ unu aka ná nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti.” Lee okwu ọjọọ dị otú a! Chee échìchè banyere ndị nke a ana-emezughị olile-anya ha! Ha nweworo olile-anya na eze ọhụụ ahụ ga-ewetara ha obi-ụtọ na ndụ nwere udo, ma ugbu a ha nụrụ nke a!

Ma Chineke nwere àtụmàtụ n’ihi ndị Ya. Ha agaghị ata ahụhụ ọjọọ niile ahụ. Aga-ata Solomom ahụhụ nke mmehie ya niile site n’ime ka Jeroboam chịa ebo iri nke Israel, kama ọ ga-abụ Rehoboam. Ndị Israel échèghị kwa na ha ji Rehoboam ụgwọ nsọpụrụ ọ bụla ebe o nwere náánị ebo Juda na Benjamin nọgidere n’irubere Rehoboam isi.

N’ezie, obi adịghị Rehoboam ụtọ n’ihi nkewa ahụ, o wee chịkọta óké ìgwè ndị-agha -- ndịkom 180,000 - jikere kwa ijé n’otù mgbe ahụ merie ebo niile ahụ nupụwooro ya isi. Ma Chineke na-ele anya, O wee zipụ Onye-amụma ịgwá Rehoboam na ọ bụ uche Ya ka Israel na Juda kewaa. Ka agha ghara ịdị ma-ọlị. Rehoboam rubere isi, udo wee dị n’ala ahụ.

Site n’oge a gaa n’iru anyị gana-anụ banyere mba abụọ, Juda na Israel, kama ọ ga-abụ náánị Israel. Akụkọ ochie nke arọ niile na-esoni ga-ekwu banyere ọtụtụ agha nke alụrụ n’etiti mba abụọ ahụ. Ha gara n’iru n’inwe ndị ọ bụla eze nke ha ruo mgbe adọọrọ ha n’agha jee Asiria na Babilon, mgbe ọtụtụ narị arọ gasịrị. N’oge nke ihe-ọmụmụ anyị a mere, Jeroboam bụ eze Israel, Rehoboam bụ kwa eze Juda.

Mkwà Niile Nke Chineke Nye Jeroboam

Chineke ekwewo Jeroboam mkwà dị iche iche dị ebube: “M’gānọyere gi, wu-kwa-ra gi ulo kwesiri ntukwasi-obi, dika M’wuru Devid, M’gēnye kwa gi Israel” (I Ndi Eze 11:38). Anyị matara ngọzi niile dakwasịrị ọchịchị nke Devid n’ihi na o rubeere Chineke isi. Ugbu a Chineke jikeere imere Jeroboam otù ihe ahụ ọ bụrụ na o debezuo iwu niile.

Rue ugbu a Jeroboam emezuwo uche Chineke. Ọ burụ na ọ gara n’iru n’ịrịọ nduzi nke Chineke, ọ gara-enwe ọñụ nke ọchịchị udo nke dị kwa ogologo. Ma mgbe ná-adịghị anya ọ malitere ichegbu onwe ya otú ọ ga-esi mee ka ndị ahụ ná-erubere ya isi mgbe niile. Chineke enyewo ya oche-eze, n’ezie Chineke pụkwara ijigide ya nye ya. Ma karịa ịtụkwasị Chineke obi, ọ malitere ịtụ àtụmàtụ n’ụzọ nke onwe ya ọ ga-esi chịa, o wee hụ onwe ya nime nsogbu.

Ọtụtụ nime nsogbu anyị na-esite kwa n’otù ụzọ ahụ. Anyị na-achọ ịtụ àtụmàtụ nke ndụ anyị karịa iwere nleru anya soro àtụmàtụ nke Chineke nye anyị, mgbe ahụ anyị ewee baa ná nhuju-anya. Onyenwe anyị matara ihe dị mma nye anyị karịa ka anyị matara; anyị pụrụ ịnapụta onwe anyị n’ọtụtụ ihe-mgbu ọ bụrụ na anyị gana-arịọ nduzi nke Chineke n’ihe nille.

Mmehie Nke Jeroboam

Oche nke isi-ọchịchị Rehoboam dị na Jerusalem; Jeroboam wee chee nime onwe ya na ọ bụrụ na ndị Israel ejee n’Ụlọ-ukwu dị na Jerusalem ifè òfùfè ha pụrụ ijeso kwa Rehoboam ọzọ, wee rapụ Jeroboam. O chere na ya pụrụ ime ka ndị ahụ ghara isoro Rehoboam site n’iwuru ha ebe ịchụàjà nke òfùfè ebe ga-adị ha nso ka ndị ahụ wee ghara ijé Jerusalem. O wee mee ụmụ ehi abụọ nke ọla-edo welie ha ka ana-efè ha òfùfè. Ọ gwa ndị Israel si, “Le chi-gi, Israel, ndi mere ka i si n’ala Ijipt rigoputa.”

Ị chetara ihe mere ndị Israel n’otù oge mgbe ha fèrè nwa-ehi ọla-edo òfùfè? Ejiri mma-agha gbuo puku mmadụ atọ n’otù ụbọchị, ndị Israel wee hụọ kwa ahụhụ nke ihe-otiti mgbe emesịrị. Chineke sịrị na Ya bụ Chineke ekworo O na-achọ kwa ka anyị fèe Ya òfùfè, ọbụná náánị Ya onwe Ya.

Onye ọ bụla matara na nwa-ehi awụrụ-awụ apụghị ime ka ndị Israel si n’ala Ijipt ebe ha bụ orù rigopụta. Ọbụná nwa-ehi dị ndụ apụghị ime ya. Òlee ezi ihe ụmụ-ehi ọla-edo abụọ ndịa pụrụ imere Israel ugbu a? Tinyere nke ahụ, Jeroboam mere ndịkom ná-ekwesịghị ka ha bụrụ ndị nchụàjà; ọ gbanwe kwara ụbọchị nke otù ememe dị nsọ. Ihe a niile Jeroboam mere bụ mmehie n’iru Chineke, aha ọjọọ ya wee soo kwa ya ọtụtụ narị arọ ná-esoni. Ọ fọdụrụ ntakịrị ka ọ bụrụ mgbe niile akpọrọ aha ya ka ana-atụkwasị okwu ndịa: “Nke o ji me ka Israel mehie” (maọbụ “Onye mere ka Israel mehie.”) Nke ahụ bụ ihe ncheta Jeroboam rapụrụ onwe ya -- o mere ka Israel mehie.

Anyị nwere ike ghara ịbụ ndị nwere ike n’ebe mmadụ niile nke bi n’otù obodo dị, ma ọ dịghị otù onye pụrụ ime mmehie o wee ghara inwe mmetụta n’ebe onye ọzọ nọ. Ọ dịghị onye ná-ebi ndụ nye náánị onwe ya; ọ bụrụ kwa na o mee ka onye ọzọ mehie, ikpé Chineke ga-adakwasị ya n’ezie.

Mmehie Nke Rehoboam

Rehoboam kwa chịgharịrị kpeere arụsị. N’ebe ahụ, n’okpurù ndò nke Ụlọ-ukwu dị nsọ nke Chineke, o wuru ebe ịchụ-àjà nye òfùfè nke arụsị. N’okpurù osisi niile nwere ahịhịa ndụ, ebe niile ụmụ mmadụ chọrọ, ka enwere oyiyi nke chi dị iche iche nke ndị ná-amaghị Chineke.

Chineke ekweghị ka mmehie ahụ gafee ná-enweghị ntaram-ahụhụ. Ihe ra ka arọ ise mgbe emesịrị Rehoboam eze, Shaishak, bụ eze Ijipt, jiri otù puku ụgbọ-ala na narị abụọ, puku ndị ịnyịnya iri isii, na mmadụ ana-apụghị ịgụta ọnụ bịa ịlụso Juda agha. Ha batara nnọọ n’obodo ahụ merie kwa ọbụná obodo niile agbara ogige. Ma mgbe ndị-agha ndị Ijipt malitere iché iru na Jerusalem, Rehoboam kpebiri na oge eruwo ime ihe. Ma gịnị ka ọ pụrụ ime?

Otù Onye-amụma nke Chineke nọ na Juda, o wee bịa gwa Rehoboam okwu niile nke Jehova: “Unu onwe-unu arapuwom ọzọ kwa, Mu onwem arapuwo unu n’aka Shaishak.” Nke ahụ bụ ihe nzuzo nke nsogbu dakwasịworo Rehoboam na Juda: ha arapụwo Chineke. Ihe ha kwesịrị ime ugbu a iji pụta na nsogbu ga-abụ ichigharịkwuru Chineke.

Rehoboam na ndịisi niile wee weda onwe ha n’iru Jehova wee sị, “Onye ezi omume ka Jehova bu.” Mgbe Chineke hụrụ ya, O nyere ha nnapụta ngwa ngwa. Ọ sịrị na Shaishak bụ Eze agaghị ebibi ha, kama ha gana-atụ ụtụ nye ya. Ihe gara nkeọma na Juda nwa oge, ma nime arọ iri na asaa niile Rehoboam chịrị ọchịchị, agha dị n’etiti Jeroboma na Rehoboam. Mgbe Rehoboam nwụrụ, Abaija, bụ nwa ya nwoke, wee bụrụ eze Juda.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Kpọọ aha nwa Solomom onye bụụrụ eze n’ọnọdụ ya.
  2. Gịnị mere Chineke ji basie mbá ike ikewapụ akụku nke Israel site n’ụlọ Solomon?
  3. Gịnị mere ana-apụghị ya ala-eze ahụ niile?
  4. Òlee otú Rehoboam si tụọ àtụmàtụ imeso ndị ahụ n’ala-eze ya?
  5. Gịnị bụ ndụm-ọdụ nke Chineke nye ndị ọchịchị na ndị chọrọ ịbụ ndị ukwu?
  6. Òlee ebo niile enyere Rehoboam ịchị?
  7. Ònye ka enyere ebo iri fọdụrụ?
  8. Òlee otú onye ọ bụla pụrụ isi rita urù site ná ngọzi niile nke Chineke?
  9. Gịnị bụ mmehie Jeroboam?
  10. Gịnị bụ ihe ncheta Jeroboam rapụụrụ onwe ya?