Ọlu Ndi-ozi 6:1-7; I Ndi Kọrint 12:4-6, 15-28; Ndi Efesọs 4:1-8, 11-13; I Timọti 3:1-13; 5:17-19; Taitọs 1:5-9;I Pita 5:1-5.

Lesson 288 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ma unu nile were obi di ume-ala ke onwe-unu dika ákwà, ijerita ibe-unu ozi; n’ihi na Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n’obi amara” (I Pita 5:5).
Cross References

I Ihe Mere O Ji Dị Mkpà na Ndị kwesịrị ntụkwasị obi Ga-abụ ndị Ná-ejé ozi nime Nzukọ Kraist

1. Ka ọlụ Onyenwe anyị wee ná-agazi nkeọma, Chineke tụrụ àtụmààtụ ka ekesasịa ọlụ ahụ n’etiti ndị kwere ekwe, I Ndi Kọrint 12:4-6, 14, 18-20

2. Inyerịta ibe anyị nsọpụrụ, na ịdịn’otù; aghaghị ịdị, I Ndi Kọrint 12:15-17, 21-26; 7:20; Ndi Efesọs 4:1-6

3. Eburu ụzọ rọpụta ndị ná-ejé ozi nke ihe mmụọ, n’ihi na ihe nke mmụọ kwesịrị iwere ọnọdụ mbụ tutu ihe nke ná-adị nwa oge, I Ndi Kọrint 12:27, 28; Ndi Efesọs 4:8, 11-13

4. Ntozu òkè niile nke onyeozi (minister) na nke onye nlekọta (overseer) bụ nke náewere ihe niile mmadụ bụ, I Timọti 2:1-7; 4:1-16; 2 Timọti 2:6; 4:1, 2, 5; Ndi Rom 11:29; Ndi Efesọs 4:7; Taitọs 1:5-9; I Pita 5:2-5; I Ndi Kọrint 14:32; 2 Ndi Kọrint 6:10; Ọlu Ndi-ozi 20:28

II Ịtọ ntọ-ala Nrọpụta nke Ndị Ná-ejé ozi Ná Nzukọ Kraist Mbụ ahụ

1. Ịba ụba n’ọnụ ọgụgụ nke ndị ná-eso ụzọ Jisọs wetara nsogbu dị ukwu nye Ndịozi ahụ, Ọlu Ndi-ozi 6:1

2. Mgbe ha matara óké ịdị mkpà nke ọlụ nke ihe mmụọ, Ọlu Ndi-ozi 6:2, 4

3. Egosịrị na ntozu òkè nke ana-achọ n’aka ndị ahụ ná-alụ ọlụ nke ihe ná-adị nwa oge aghaghị ịbụ kwa otù ihe dịka nke achọrọ n’aka ndị ahụ nke ná-alụ ọlụ nke ihe mmụọ, Ọlụ Ndi-ozi 6:3

4. Arọpụtara ndị ná-ejere Nzukọ Kraist ozi, (deacon) nye kwa ha ndụm-ọdụ kwesịrị ntụkwasị obi ka ha ná-elekọta ihe banyere mkpà nke ihe ná-adị nwa oge, Ọlu Ndi-ozi 6:5-7; Ndi Filipai 1:1, 9-11; I Timọti 3:8-13

5. Ndị okenye na enwe ọnọdụ n’ọlụ nke ihe mmụọ ana-ahụta kwa ha n’etiti ndịozi, ndị nlekọta, ma ọbụ ndị inye-aka ha, Taitọs 1:5, 6; I Timọti 5:17; Ọlu Ndi-ozi 11:29, 30; 14:23; 15:1-6, 22, 23; 16:4; 20:17, 28; 21:18; Jemes 5:14; I Pita 5:1-5

6. Mbuli elu nime Nzukọ Kraist abụghị site ná nzube nke mmadụ ma ọbụ dịka ọchịchọ onye ahụ si dị ka ebulie ya elu karịa ndị ọzọ, Abù Ọma 75:6, 7; Ndi Galetia 5:20; I Pita 5:2, 3; I Ndi Kọrint 1:26-31; 9:16-23; 2 Ndi Kọrint 3:5, 6; 5:18; Ndi Kọlọsi 1:1; I Timọti 1:12

7. Ndị ahụ nke ji oge ha niile náejere Nzukọ Kraist ozi ka enyeworo ike ịnata inyeaka maka nlekọta ha site ná Nzukọ Kraist mgbe ọ dị mkpà na mgbe apụrụ ime ya, Matiu 10:9, 10; I Ndi Kọrint 9:7-15, 18; 16:17; Ndi Galetia 6:6; Ndi Filipai 4:14; I Timọti 5:18; Ndi Hibru 13:16; Ọlu Ndi-ozi 18:1-3; 20:33-35; I Ndi Tesalọnaika 2:9; 2 Ndi Tesalọnaika 3:7-9

8. Nsọpụrụ na nrube isi kwesịrị inye ndị niile akpọrọ nime ijéozi ahụ, I Timọti 5:17-19; Ndi Hibru 13:7, 17, 18; I Ndi Kọrint 16:15, 16; I Pita 5:5; Ndi Rom 15:30; Ndi Galetia 4:14; Ndi Filipai 2:25-30; I Ndi Tesalọnaika 5:12, 13

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Govment nke Nzukọ Kraist Mbụ ahụ

Chineke malitere ịgọzi Nzukọ Kraist mbụ ahụ ngwa ngwa awụsasịrị Mmụọ Nsọ n’Ụbọchị Pentikọst, ihe ịrịba-ámá niile nke ekwere ná mkwá malite kwara iso nzisa Oziọma nke Ndịozi ahụ “Ndi nēso uzọ Jisus nāba uba” site n’ịbá ụba ahụ, nsogbu ụfọdụ ọzọ pụtara.

Ndị ozi ahụ, site n’ime ihe dịka nghọta ha banyere uche Chineke si dị, kpọrọ igwè ndị ná-eso ụzọ Jisọs ka ha kwue okwu banyere nsogbu nke pụtara site n’itóétó ahụ dị ịtụ n’anya nke Nzukọ Kraist ahụ na-étó. Anyị pụrụ ịhụ, ọbụná ná mmalite ọlụ nke Ndịozi ahụ, usoro ahụ nke Chineke rọpụtara ma kwagide kwa maka ọchịchị nke Nzukọ Ya, na ilekọta ihe nke mmụọ na mkpà nke ihe ná-adị nwa oge nke Nzukọ Kraist. Ihe ndịa niile dị kwa otú a, “ewe de ha n’akwukwọ nsọ ka ha we buru ihe idu ayi ọdu, ndi ọgwugwu oge ndia ruteworo” (I Ndi Kọrint 11:10). N’ebe a nime Ọlụ Ndịozi, anyị nwere ọtụtụ ihe nlere-anya edebere nke ná-egosi anyị otú anyị ga-esi fèè Chineke òfùfè na otú anyị ga-esi jee ozi nke mkpà nke ihe ná-adị nwa oge nke dị n’ọlụ nke Onyenwe anyị.

Ndịozi ahụ nwere mmetụta dị ukwu n’ebe ọkpụkpọ òkù nke Chineke dị. Ha elelịghị ọlụ ahụ enyere ha anya bụ nke agaje inyefe ndị niile ná-eso ụzọ Kraist n’aka n’ihi ijéozi ukwu ahụ (Matiu 28:18-20). Mkpebi nke ha nwere n’oge a bụ ka ha wee nwee ike ịnọgide n’ịlụ ọlụ nke ihe mmụọ bụ nke werewororị oge ha niile na igosi na ha agaghị arapụ ya wee lụọ ọlụ nke ndịọzọ pụrụ ịlụ bụ ndị ákà akpọghị n’oge ahụ ịlụọlụ nke ihe mmụọ nime Nzukọ Kraist.

Ọlụ nke Dịrị Mmadụ niile nime Nzukọ Kraist

Ọ na-ákákarị mma mgbe niile, nkekanke n’ọlụ Onyenwe anyị, ma ọ bụrụ na apụrụ ikesara ọtụtụ mmadụ ọlụ ahụ dịka ọ ga-adị mfé ime. Nke a bụ ihe dị mma ime n’ihi ọtụtụ ihe. Nke mbụ o kwesịghị ka ọ dịrị ndị ná-eme “ndi bu ihe nketa dika unu bu ndi nwe ha” (I Pita 5:3), kama unu niile ga-ewere “obi di ume-ala ke onwe-unu dika ákwà” na “ijerita ibe-unu ozi” (I Pita 5:5). Dịka awapụtara nkume dozie kwa ya n’ebe ana-edozi ya wee weta ya n’ebe ana-ewu Ụlọukwu, otú a ka Chineke na-edozi ndị nsọ nke Ya wee tinye ha n’ọlụ pụrụ iche ná Nzukọ Ya. Ndị niile bụ ndị nke Chineke n’ezie nwere ọlụ ha ga-alụ n’ọlụ nke Onyenwe-anyị. Ọ dịghị onye ọ bụla ewepụrụ. Ọ dịghị kwa onye ọ bụla échèfuru. Ọ dịghị ndị ana-echè na ha ekwesịghị inwe ọnọdụ ụfọdụ n’ijéozi nke Chineke -- n’ebe ha pụrụ ịbà urù otú ha nwere ike -- ma ọ bụrụ na ha bụ ụmụ Chineke n’ezie. Ọ dịghị ndị kwesịrị ka ha nọdụ ná-alụghị ọlụ. Mmadụ niile nwere ọnọdụ ha gaanọchị -- ha nwere ike ịbụ ndị dị ala ma ọbụ ndị ana-amaghị ama -- ma aga-akwụghachị onye ọ bụla ụgwọ ọlụ dịka o si lụọ ọlụ Chineke nyere ya ịlụ.

Ebe anyị niile bụ anụ-arụ bụ mmadụ, ndị ka nwekwara uche dị mkpịrikpị, ọ dịghị onye ọ bụla nime anyị pụrụ ịhụ ma ọbụ nwere ike ịghọtazu ụdị nsogbu niile ná-apụta n’akụkụ dị iche iche nke ọlụ Onyenwe anyị mgbe niile. Enyere ụfọdụ mmadụ onyinye n’ebe ihe ụfọdụ dị, nye kwa ndịọzọ n’ụzọ dị nnọọ ichè. Ụfọdụ maara otú esi ekwu okwu nkeọma, ụfọdụ kwa dị ike n’ịlụ ọlụ aka. Ụfọdụ na-amá jijiji n’ebe ọlụ ụfọdụ dị ma ha pụrụ ịlụọlụ ọzọ nkeọma ná mkwuwaokwu. Mmadụ niile nwere ọnọdụ ha ga-anọchị, achọkwara mmadụ niile.

Anyị aghaghị ịdabere n’ibe anyị. Ebe otù onye ná-apụghị ịnọchị otù ọnọdụ nkeọma, onye ọzọ aghaghị iwere ọnọdụ ahụ ime ka ọlụ ahụ gaa n’iru. Ebe mmadụ ná-enweghị ike ịlụ otù ọlụ nkeọma, onye ọzọ agaghị inyere ya aka, inye ya okwu agbam-ume, maọbụ kpesiere ya ekpere ike. Apụrụ ime ọtụtụ ihe dị ukwu nye Chineke na mmadụ ma ọ bụrụ na ezi mmụọ nke ịlụkọ ọlụ n’otù adị n’etiti ndị kwereekwere.

Ntozu òkè dị iche iche nke Ndịọlụ

Ọ bụ iheiju anya ịhụ na ntozuòkè niile nke Ndịozi mgbe ochie wepụtara dị nnọọ iche site ná ntozuòkè nke ndị ụwa naele ụmụmmadụ ulé naachọ. Ndị nke ụwa naachọ ntozuòkè nke náadịghị n’ihe niile nke ndịozi ahụ depụtara.

“Ndikom ndi agbara ha ezi àmà, ndi juputara na Mọ Nsọ na amam-ihe” bụ ndị apụrụ iji lụọra Chineke ọlụ. Mmadụ nwere ike ịjụ ajụjụ sị: “Gịnị mere eji ekwusi okwu ike banyere ntozu òkè nke ime mmụọ nke ndị ahụ gaahụ ọlụ nlekọta nke ihe banyere ihe oriri? Ọlụ nke mmadụ ndịa nwere ịlụ, ọ bụghị náánị ikesa iheoriri na mkpà niile ọzọ nke ndịòtù Kraist nwere?”. Éé, nke ahụ gaabụ ọlụ ha. Ma ọbụná n’ihi ọlụ ahụ na ọlụ ọ bụla ọzọ banyere Alaeze ahụ, ọ bụ ihe dị mkpà ka orù nke Kraist bụrụ “onye agbara ya ezi àmà, juputara na Mọ Nsọ, na amam-ihe.”

Dịka ihe ana-ahụ anya si dị, mmadụ aghaghị ịbụ onye ana agbara ezi àmà ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịbụ onye òtù nke Nzukọ Kraist. Ékwesịghị ntụkwasị obi nke ọ nọ nime ya na mbụ agawo. Ọ bụrụwo onye ekèrè ọhụụ. Ọ dịghị eje kwa ijè n’ụzọ nke okwu ụgha. Ya mere, ọ bụrụ na onye ahụ na-ebi ndụ ana-enyo enyo n’ebe o kwesịrị ka o gosi onweya dịka onye eziokwu na onye kwesịrị nsọpụrụ, apụrụ ikwu ya n’owuwe anya na ọ bụghị onye òtù nke Nzukọ Kraist n’ezie, o nweghị kwa òkè n’ijéozi n’akụkụ ọ bụla dịka onye ná-anọchị anya nke Nzukọ Kraist ahụ.

Pọl Onyeozi gosịrị ụfọdụ nime ntozù òkè niile ahụ n’ụzọ anyị ga-esi ghọta ha mgbe ọ na-enye ndị nọ n’okpuru ya iwu. O kwuru na onye ahụ aghaghị ịbụ onye áná apụghị ịta ụta, ọ ghaghị ịbụ onye nọ ná njikere mgbe ọ bụla, onye nwere anya udo, onye omume ya kwesịrị ekwesị, onye ná-elekọta ndịọbịa nkeọma, onye nọ ná njikere mgbe niile ịnara ndụm-ọdụ, onye nwere ike ịkụziri ndịọzọ ihe ma ọ bụrụ na nke ahụ bụ ọkpụkpọ akpọrọ ya. Ọ gaghị abụ onye ná-ese okwu, ọ ghaghị abụ onye óké ọchịchọ n’ebe ego dị ma ọbụ úrù nke aka ya, ọ gaghị abụ onye jupụtara n’esemokwu na ibu iro, ma nkekanke, ọ gaghị abụ onye anyaukwu. Ụmụ ya ga-abụ ndị azụrụ nkeọma ma èzínaụlọ ya gaabụ kwa ndị eji nleru anya ná-achị, bụrụ ndị eji ịhụn’anya nke nne na nna ná-achị.

Ma ntozu òkè ndịa abụghị náánị ihe ekwuru na ndị ná-ejere Chineke ozi ga-enwe. Ndị enyere ọlụ pụrụ ichè n’aka aghaghị ịbụ ndị jupụtakwara na Mmụọ Nsọ na amamihe. Ọ bụ ihe dị mkpà na akpọrọ amamihe aha n’ebe a mgbe ana-ekwu ihe banyere Mmụọ Nsọ.

Amamihe ahụ nke anyị ná-aghaghị inwe, ma ọ bụrụ na anyị gaje ịlụọlụ Chineke n’ikwesị ntụkwasị-obi, bụ amamihe ahụ nke ná-esi n’elu abịa. Nke a abụghị amamihe nke ụwa maọbụ nke mkpụrụobi mmadụ na-achị, maọbụ ihe ndị mmụọ ọjọ na-ezi, nke ná-akpali ekworo na iseokwu. Amamihe ahụ nke si na Chineke bịa, “buru uzọ di ọcha, emesia ọ di udo, nwe obiọma, nēkwenye okwu nke ọma, juputa n’ebere na ezi nkpuru, nēnwegh obi-abua, nēnwegh iru-abua” (Jemes 3:17). Anyị pụrụ ịrịọ maka ya n’okwukwe, ná-enweghị obiabụọ, n’ihi na Chineke naenye ya “madu nile n’afọ-ofufo” (Jemes 1:5, 6). N’ihi nke a ọ dịghị ngọpụ dịrị onye ahụ nke ná-enweghị ya. Ọ bụrụ na o nweghị ya, ihe kpatara nke a bụ na ọ rịọbeghị maka ya kama o nwere afọ ojuju ịga n’amamihe nke aka ya, nghọta nke aka ya na inwe ojuju afọ nke onwe onye.

Ntozu òkè nke ikpe-azụ kachasị mkpà bụ mwụkwasị nke Mmụọ Nsọ. Ihe a nke akpọrọ aha n’ebe a bụ mbinyere nke mwụkwasị nke ike nke ijéozi ahụ dị ebube. Ọ bụ ike ahụ nke Jisọs kwere ná mkwà tutu Ọ nwụọ n’elu obe na kwa tutu Ya arịgo n’Eluigwe. (Gụọ Jọn 14:15-26; 15:26, 27; 16:7-15; Ọlu Ndi-ozi 1:8). Ọ bụ onyinye dị mkpà nke si n’elu ná-ejikere anyị ná-enye kwa anyị ike, nke ná-eme ka anyị nwee ike ịkpọtara Chineke mmadụ.

Ọkwá dị Iche iche nke Ijéozi N’ọlụ nke Apostolic Faith

Site n’ilezi anya nkeọma, Onyeisi mbụ nke ná-elekọta ọlụ niile nke ọgbakọ a (General Overseer) na ndị ya na ha na-alụ ọlụ tọrọ ntọala nke ọgbakọ a otú ya na ihe niile edere n’Akwụkwọ nsọ ga-adakọta n’ụzọ niile. Ebe ahụrụ na eburu ụzọ kwue ihe banyere ọkwá dị iche iche nke ihe mmụọ na ndị ga-anọchị ọnọdụ ahụ niile, ná mmalite nke Nzukọ Kraist mbụ ahụ, ọnọdụ ọlụ ndịa dị iche iche ka eburu ụzọ mejue ma nye kwa ha ohere mbụ nime ọlụ nke ọgbakọ Apostolic Faith.

“Okìkè nke ijéozi dị kwa” na “okìkè nke ihe alụtaworo n’ọlụ dị kwa” n’ọlụ anyị, dịka ọ dị kwa ná Nzukọ Kraist mbụ ahụ. Ikwusa okwu Chineke bụ ọlụ kachasị mkpà nime Nzukọ Kraist ma aghaghị kwa ime ka ọ gaa n’iru site n’aka ndị ahụ akpọrọ bụ ndị tozuru òkè n’onyinye na àmàrà ahụ niile nke dị mkpà maka ọlụ ukwu ahụ nke ná-ewere oge na ihe niile anyị nwere. Ọ ghaghị ibute ụzọ n’ọlụ niile ọ bụla ana-alụ ná Nzukọ Kraist. Ọ ghaghị kwa ibute ụzọ n’ihe niile ọ bụla ọzọ nke Nzukọ mere ma ọbụ nke ọ ná-achọ ime. Ọnọdụ ọlụ nke ndị amụma (ndị ná-ekwusa Okwu Chineke), ndị ná-agbasa oziọma, ndị ná-azụ ìgwè atụrụ Chineke, ndị òzízí, dịka o si dị mkpà, ọnọdụ ndịa aghaghị ịbụ ihe ebu ụzọ mejupụta ka ewee mee ka ndị nsọ zue òkè ma wuli kwa òtù nke ndị kwere ekwe elu dịka ụlọ.

Mgbe emejupụtasịrị ọkwá ndịa nke ana-akpọ ọnọdụ dị iche iche nke ijéozi nke ihe mmụọ, mgbe ahụ ka aga-eleba anya n’ọlụ niile ọzọ dị mkpà banyere ịgbasa Oziọma nke Kraist. Site ná mmalite ọlụ nke Apostolic Faith akụziiri anyị na agaghị enwe ịkpa òkè ma ọbụ nkewa n’otù arụ ahụ. Mmadụ niile ga-anọ n’ịdị n’otù ahụ bụ nke ana-achọta náánị nime na n’etiti ndị ahụ nwere odudo nsọ zuru òkè (Gụọ Ndi Hibru 2:11; Jọn 17:9-23; Ndi Efesọs 5:22-32). Ezikwara anyị na aghaghị ime ihe niile ka ewee wulie mmadụ elu dịka ụlọ, n’ụzọ dị mma, na n’usoro (I Ndi Kọrint 14:26, 40), n’ihi na Chineke abụghị Chineke nke aghara (I Ndi Kọrint 14:33). Mmụọ nke ndịozi nke Oziọma aghaghị ịbụ ihe ana-edo n’okpuru ibe ha (I Ndi Kọrint 14:32; I Pita 5:5, 6). N’otù aka ahụ kwa anyị onweanyị ndị bụ ndị òtù nke ndị kwere ekwe ka adọkwara aka-ná-ntị ka anyị ná-edo onwe anyị n’okpuru ibe anyị ọbụná dịka adọkwara ndịozi nke Oziọma aka-ná-ntị ka ha tụgharịa uche na amamihe, ikpé na ntule nke ihe mmụọ nke ndịozi na ibe ha. Ọ dịghị onye ọ bụ nime anyị, ndịozi ma ọbụ ndị nzukọ anyị, nke ga-egosi mmụọ ma ọbụ omume nke ịdabere onweanyị n’ebe ibe anyị nọ ma ọbụ ichè na anyị zuru òkè nime onweanyị n’ihe ọ bụla. Nkekanke dịka ọbịbịa nke Onyenwe anyị na-abịaru nso, ike nke nduhie na-aba kwa ụba n’elu ụwa, anyị kwesịrị ịdabere, nata kwa inye-aka site n’aka ibe anyị nime mkpà niile nke ihe mmụọ.

Anyị ga-ewere “obi nānu ọku chọ onyinye amara ndịa nke kari ukwu” were “nāgbasi mgba ike n’ihi okwukwe ahu nke enyere ndi nsọ n’aka nání otù mgbe idebe” (I Ndi Kọrint 12:31; Jud 3). Anyị gaeme “ka onyinye-amara nke Chineke nwuru ọku,” bụ nke dị nime anyị (2 Timọti 1:6). Anyị ga-ewere ike anyị mee ihe niile ọ bụla aka anyị na-ahụ ime (Eklisiastis 9:10). Mgbe anyị mesịrị ihe ndịa niile dịka ike anyị ra, ọ bụ mgbe ahụ ka apụrụ ịtụkwasị Chineke obi maka ngọzi Ya n’ebe mgbalị anyị niile dị. Chineke asọpụrụwo otú esi ná-alụ ọlụ a, ngọzi Ya adịkwasiwo kwa ya. N’ihi mkwado nke Mmụọ Nsọ na-akwado ọlụ a, na n’ihi mkwà ahụ ekwere banyere ihe ịrịba-àmà dị iche iche nke anyị na-ahụ ka ha ná-eso ezi mgbalị na ekpere niile nke ana-ekpe, anyị nwere ezi ihe mgbakwasị ụkwụ ikwere na ụzọ niile nke anyị ná-eso dị nnọọ mma ma kwesị ekwesị.

Anyị nwere Onye isi ná-elekọta ọlụ niile nke Apostolic Faith (General Overseer) na otù onye nke ná-eso ya, Onye nlekọta nke ọlụ niile nke Nzukọ a dị n’aka ya. Alaka nzukọ ọ bụla nọ n’okpuru Onyeisi a nke nọ n’Isi Ụlọ ọlụ anyị. Ihe niile nke ndị ọchịchị nke obodo anyị na-achọ ime ka enwee ike ịlụpụta ọlụ dịka iwu metụtara obodo si dị, ya na ọlụ nchịkọta nke ọgan’iru niile dị anyị mkpà maka Apostolic Faith Mission dị na Portland, Oregon, na alaka ya niile bụ ihe dị n’aka Òtù nke Mmadụ olenaole atụkwasịrị obi (Board of Trustees) ndị arọpụtara n’Isi Ụlọ ọlụ anyị. Òtù nke Mmadụ olenaole ahụ atụkwasịrị obi ka ana-arọpụta site n’etiti ndịozi Chineke, ọra ndị kwere ekwe na-ewelikwara ha aka elu mgbe enwere ọgbakọ nke mmadụ niile maka ọdịmma nke ọlụ ahụ. Otù onye Ode akwụkwọ oche ego ná-ahụ maka ihe niile metụtara ego na iwu, ma mgbe ọ bụla o sonyere ná Nzukọ nke Ndị ahụ Atụkwasịrị-obi, ewee kpọọ nnọkọ ahụ òtù ndị Àtùmààtù dị n’Aka (Executive Board).

Enwere ndị okenye, ndịkom na ndịnyom ná-ejere nzukọ Kraist ozi (Deacons and Deaconess) dịka enwere ha ná Nzukọ Kraist mbụ ahụ. Ọlụ nke onye okenye bụ inye aka ná ịkwagide ọlụ nke ijéozi nke Okwu Chineke nime nrubeisi na mkwagide nke ihe niile ana-eme iji hụ na Oziọma gara n’iru. Ndịkom na ndịnyom ndịa ná-asọpụrụ Chineke na-alụ ọlụ nke ihe mmụọ nke ọ bụ náánị ndịozi kwesịrị ịlụ ya ma elee ya anya n’ụzọ ọzọ. Ha nwere ike ikpere onye ọrịa ekpere, ha na ụkọ Chukwu ma ọbụ onye okenye ọzọ. Mgbe ụkọ Chukwu na-adụ mmadụ ọdụ ma ọbụ mgbe ọ ná-aba mbá, ana-agwa okenye ahụ ọtụtụ mgbe ka o nyere ụkọChukwu ahụ aka ime ka eziokwu ahụ guzosie ike na ịhụ na enyere onye ahụ ahụhụ ruru ya. Onye ụkọChukwu ahụ na-achọkarị inyeaka nke onye okenye ahụ ọtụtụ mgbe ọ na-achọ ịnwapụta ụfọdụ mmụọ ịmata ma ha sitere na Chineke ma ọbụ na ha esiteghị na Ya (I Ndi Tesalọnaika 5:21; I Jọn 4:1). Ndịokenye ndịa bụ ndị lụworo ọlụ a ọtụtụ arọ ma mara kwa ihe banyere ya nkeọma ndị ọkpụkpọ ha sitere na Chineke, bụrụ kwa ndị anwapụtaworo ịhụn’anaya ha n’ebe mkpụrụobi ụmụ mmadụ dị, na ikwesị ntụkwasị-obi ha n’òzízí niile nke Nzukọ Kraist, na nrubeisi ha n’ebe ọlụ nke ijéozi ahụ dị. Ọtụtụ mgbe ka onye ụkọChukwu maara ihe na-achọ ndụm-ọdụ ha, ọtụtụ ùgbò kwa ka ana-akpọ ha ka ha mejupụta ọnụ ọgụgụ òtù ahụ nke ná-achị achị nwere ihe ụfọdụ dị mkpà nke ọ na-achọ ime. Ha bụ ndị ana-akpọ ọtụtụ mgbe idé nke ji Nzukọ Kraist, úrù nke ekpere ha na okwukwe ha bụ kwa nke ná-enweghị àtụ.

Ndịkom na ndịnyom ná-ejere Nzukọ Kraist ozi bụ ndị ná-elekọta ọlụ Chineke nke metụtara ọdịmma nke ihe ná-adị nwa oge n’ọlụ Chineke. Ebe niile enwere ọlụ nke aga-alụ banyere ilekọta na idozi ihe onwunwe na ngwa-ọlụ niile nke Nzukọ Kraist, na ọlụ ịdozi ìgwè niile eji alụ ọlụ ma ọbụ ọlụ-aka ọzọ dị mkpà iji gbassa Oziọma, ka ndịkom na ndịnyom ndịa na-alụrụ Nzukọ Kraist ọlụ na-ahụ ihe banyere ha.

Nime ọgbakọ anyị, anyị adịghị ewere ya n’ihe dị óké mkpà bụ aha dị iche iche nke ọkwá nke ijéozi ndịa, maọbụ uwe oyiyi dị ichè; ma anyị na-amata mkpà nke ọlụ ndị ahụ na-alụ dị, bụ ndịa ji ọkwá dị icheiche nke ijéozi ahụ. Ọ bụ Chineke kpọrọ onye ọ bụla nime ha n’ọlụ a, n’ihi na ọ bụ Mmụọ Nsọ bụ onye ná-achọpụta ndị kwesịrị ekwesị karịsịa n’ịlụọlụ na ịnọchị ọnọdụ dị iche iche nime Nzukọ Kraist. Ọchịchọ nke obi anyị na nzube anyị bụ ịhụ na mbuli elu si n’ụzọ dị otú a, n’ihi nke a, na kwa ka ewee nye Mmụọ Nsọ Chineke ohere zuruòkè ịlụọlụ Ya niile nime nzukọ, anyị na-ebilata ma ná-egbochị kwa usoro nke inwe òtù dị iche iche dịka anyị nwere ike.

Ọ bụ ihe doro anya na òtù nke ndị kwere ekwe aghaghị inye ndị ahụ nke Chineke kpọrọ nsọpụrụ nke kwesịrị ha. Ọlụ ma ọbụ ijéozi ọ bụla nke metụtara nzukọ Kraist dị óké mkpà, ma ọkpụkpọòkù maọbụ nrọpụta ọ bụla dị mkpà ma bụrụ kwa ihe gaewe anyị ọtụtụ ihe. Anyị aghaghị inye ihe kachasị mma ná ndụ anyị n’ọlụ ahụ ọ bụrụ na anyị naachọ ka agụọ anyị ná ndị kwesịrị ntụkwasịobi na ya; ma site n’ime otú a, anyị gaaga n’iru ịlụọlụ dị ukwu bụ nke gaewere ihe niile anyị nwere.

Filip na Stifen kwesịrị ntụkwasị-obi n’ọlụ ha, ha chọtakwara ọnọdụ dị ukwu karịa n’ijéozi nke Okwu Chineke. Stifen kwuru Okwu Chineke nke kpaliri ndị kpọrọ Kraist asị n’oge nke Ya imegide ya ma ọ natara otuto wee lụzuo ọlụ ahụ nke ọ bụ náánị mmadụ olenaole, ma ọ bụrụ na enwere, ndị ọzọ lụrụ ọlụ dị otú ahụ. Filip kwusara Oziọma nke Jisọs ọtụtụ arọ n’ebe dị iche iche, Chineke jikwara ya lụọ ọlụ n’ụzọ dị ebube iji wetara ndị nọ ná mkpà Eziokwu ahụ. Anyị pụrụ ịhụ site n’ihe nlereanya abụọ ndịa na ikwesị ntụkwasị-obi nwere ụgwọ ọlụ ya, anyị pụkwara ịhụ na nsọpụrụ na otuto kwesịrị ndị ahụ akpọrọ n’ọlụ nke nlekọta, n’ihi na site ná ndịa ka apụrụ ịchọta ndịozi na ndị ndú maka ọlụ nke ihe mmụọ n’ọdịn’iru.

Ụkpụrụ dị iche iche nke eji elekọta alaka niile nke nzukọ anyị bụ kwa otù ihe ahụ n’ụzọ nke esi elekọta nzukọ dị n’ebe Isi ọlụ anyị dị. Onye ọzụzụ-atụrụ Chineke ma ọbụ ụkọChukwu nke ná-elekọta nzukọ, ka ndịozi ibe ya, ndịokenye, ndịkom na ndịnyom ná-ejere nzukọ Kraist ozi na-enyere aka dịka o sị dị mkpà ma dị kwa mfé, dịka ịdị ukwu ma ọbụ ịdị ntà nke nzukọ ọ na-achịkọta ra. Enwere ike ịrọpụta otù onye ilekọta ihe banyere ego, dịka ana-eme n’ebe Isi ụlọ ọlụ niile nke nzukọ a dị. Ebe òtù nke ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị-obi arọpụtara ịhụ ihe banyere ọgan’iru nke Nzukọ Kraist ná-adịghị, onye ọzụzụ-atụrụ nke maara ihe ga-ewere ndị ahụ nwere amamihe na nlepụ anya nke ime mmụọ n’ebe nsogbu nke nwere ike ịdapụta imetụta ọlụ nke Chineke gbaa onwe ya gburugburu.

Lee ụdị ohere nke a bụ ịbụ otù onye nime Arụ ahụ dị omimi -- Nwanyị ahụ ana-alụ ọhụụ nke Kraist -- na isoro Kraist lụkọ ọlụ n’ọlụ nke mgbapụta! Anyị ka O nyeworo ijéozi nke ime ka adị n’otù ahụ (2 Ndi Kọrint 5:18, 19). Anyị bụ “ndi nāchi èzínaụlọ n’iheomimi nke Chineke” (I Ndi Kọrint 4:1). Ọ bụ Mmụọ Nsọ na Nwanyị ahụ ana-alụ ọhụụ nke Kraist na-ezipụ Oziọma n’ụbọchị taa nye mkpụrụobi ndị furu èfù, nime njikere ahụ dị ukwu banyere Ụbọchị nke Onyenwe anyị (Nkpughe 22:17).

Enwere agha dị iche iche aga-alụrụ Chineke, ma “ihe-agha nke ibu-agha-ayi abugh nke anu-aru, kama ha sitere, na Chineke bú ihe puru ikwada ebe ewusiri ike” (2 Ndi Kọrint 10:4). Anyị nwere ọlụ dị mkpà nke anyị gaalụ, na ime ka ọ gaa n’iru, na ịhụ na emezuru ya. Ma lee ohere dị ukwu nke anyị nwere! Lee otú ihe anyị ga-alụpụtara Chineke ga-esi dị ukwu ma ọ bụrụ na anyị alụọ ọlụ niile ahụ O nyere anyị ịlụ n’ikwesị ntụkwasị-obi! Lee otú ụgwọ-ọlụ anyị ga-esi dị ebube ma ọ bụrụ na anyị anọgide rue ọgwụgwụ ma nwee kwa ike ịtọgbọ ihe ubi dị óké ọnụ-ahịa n’ụkwụ Ya n’ihi na anyị ejiwo ikwesị ntụkwasị-obi, nleru anya na ịnụ-ọkụ n’obi dị nsọ wee lụọ-ọlụ niile ahụ O nyere anyị ka anyị lụọ!

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị bụ ihe dị iche n’etiti onye ná-eso ụzọ na Onyeozi?
  2. Gịnị bụ ọlụ dị iche iche nke onye ọzụzụ atụrụ Chineke? Onye ná-ezisa Oziọma? Na onye òzízí?
  3. Gịnị mere eji rọpụta mmadụ asaa ahụ bụ ndị ná-ejere Nzukọ Kraist ozi n’oge a?
  4. Òlee ọlụ kachasị mkpà ná Nzukọ Kraist?
  5. Kwue ntozù òkè ụfọdụ nke ezi onye ọlụ Kraist.
  6. Gịnị bụ ọlụ dị iche iche nke okenye?
  7. Òlee òtù dị iche iche nke anaesi na ha arọpụta ndị okenye ná Nzukọ Kraist?
  8. Gịnị bụ ọlụ dị iche iche nke ndịkom na ndịnyom ná-ejere Nzukọ Kraist ozi?
  9. Òlee mmadụ abụọ nime mmadụ asaa ahụ ndị ná-ejere Nzukọ Kraist ozi ndị ghọrọ ndị nkwusa dị ukwu nke Oziọma?
  10. Ònye na-enye mbuli elu nime Nzukọ Kraist? Gịnị bụ omume ná-ekwesịghị ka agbaso n’ihe banyere mbuli elu?