Ọlu Ndi-ozi 6:8-15; 7:1-60.

Lesson 289 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “E, agēsogbu kwa ndi nile nāchọ idi ndu n’uzọ isọpuru Chineke nime Kraist Jisus” (2 Timọti 3:12).
Cross References

I Onye Akpọrọ ma Rọpụta kwa

1. Stifen, ebe o jupụtara n’okwukwe na Mmụọ Nsọ, lụrụ ọtụtụ ọlụ ebube na nke ihe ịrịba-àmà dị iche iche, Ọlu Ndi-ozi 6:8; 2:17, 18; 4:29-31; 8:5-8

II Ọtụtụ Mkpagbu

1. Ijéozi nke Stifen Kpaliri ọtụtụ mgbagbu, Ọlu Ndi-ozi 6:9-15; 24:5-9; 25:7; Mak 14:55-59

III Ngọpụ nke Stifen

1. Stifen tụrụ ndịiro ya mmehie ha n’anya ná ngọpụ ya site n’ihe edere n’Akwụkwọnsọ, Ọlu Ndi-ozi 7:1-53; 2:14-36; 17:22-32; 24:25; 26:28; Luk 21:12-15

2. Stifen, nwere agbam-ume na ike n’oge ọnwụnwa ya site n’ọhụ nke Kraist ọ hụrụ, Ọlu Ndi-ozi 7:55, 56; Nkpughe 1:10-16; 2 Ndi Kọrint 12:1

IV Ịnwụ n’ihi Okwukwe

1. Ndị kpọrọ Chineke asị gburu Stifen nime mkpasu iwe nke sitere n’ekwensu, Ọlu Ndi-ozi 7:54-60; 12:2; Nkpughe 6:9; 20:4; 11:9, 10

2. Stifen sooro ihe-atụ nke Onyenwe ya site n’ikpere ndịiro ya ekpere, Ọlu Ndi-ozi 7:59, 60; Luk 23:34; Aisaia 53:7

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Ịgbá-àmà nke Eziomume

Akụkọ nsọ dị iche iche na Baịbụl gwara anyị na ọtụtụ mkpagbu na mwụsị ọbara gara n’iru megide Nzukọ Kraist mgbe mkpọgide n’obe na mbiliten’ọnwụ nke Kraist gasịrị. Mkwusa nke Oziọma ahụ ná-ewepụghị aka nke ndị ná-eso ụzọ Jisọs bụ na Jisọs bụ Kraist ahụ nke Chineke kpaliri mkpagbu ọhụụ dị iche iche megide ha, Stifen, onye arọpụtara dịka otù nime ndịkom mbụ ahụ arọpụtara ijéré Nzukọ Kraist ozi, ghọrọ onye mbụ egburu n’iru ọgụ nke Nzukọ Kraist ahụ Ná-ebu Agha. Stifen alụworị ọtụtụ ọlụ ebube na ihe ịrịbá-àmà dị iche iche n’etiti ndị ahụ ma n’ihi otú ihe si gaara ya nkeọma kpatara ụfọdụ ndị ná-eso ụzọ omen’ala Ndị Ju ji chọpụta ya iji ịkpọasị nke ha kpọrọ Chineke wụkwasị ya dịka otù onye nime ndị ná-eso ụzọ Kraist.

Ebe ha ná-enweghị ike ichọpụta ihe ọjọọ ọ bụla n’ebe Stifen nọ, ndịa bụ ndịiro nke Chineke laghachirị azụ nime aghụghọ ochie nke ndị Farisii bú ịgba-àmà ụgha na ebubo ụgha dị iche iche. Ọ bụ ihe doro anya na ha nwere otù uche na otù mnwekọ dịka ndị ahụ nke nọ na Jerusalem bụ ndị kpọgidere Onyenwe anyị n’obe, n’ihi na ha etufughị oge isoro otù ụzọ ahụ n’onwe ha.

Mgbe ha ná-enweghị ike iguzogide amamihe na mmụọ nke Stifen ji ná-ekwu okwu, ndị ahụ ná-ebo ya ebubo wee kuru Stifen gaa n’iru nnọkọ ikpé ahụ. Stifen gọpụrụ onwe ya ná-enweghị inyeaka nke ndị enyi ma ọbụ nnọkọ ikpé, ma otú ọ dị, ọ nọghị náánị ya. N’ihi na tutu Jisọs anwụọ, Ọ dọrọ ndị ná-eso ụzọ Ya aka-ná ntị banyere mkpagbu ndịa nke gaje ịbịakwasị ha ma O nyekwara ha rịị ndụm-ọdụ banyere ihe ha ga-eme. Otù nime ndụm-ọdụ niile ahụ bụ “Ha gātukwasi unu aka-ha, sogbu kwa unu, nārara unu nye n’aka ulo-nzukọ na ulo-nkpọrọ n’ebe anēduputa unu ga n’iru ndi-eze na ndi-isi n’ihi aham. … Ya mere zubenu n’obi-unu, na unu agagh ebu uzọ tughari uche otú unu gāgọpu onwe-unu: n’ihi na Mu onwem gēnye unu ọnu na amamihe, nke ndi nile nēmegide unu nāgagh apu iguzogide ma-ọbu ikwugide okwu” (Luk 21:12-15). Lee otú Jisọs si mezue mkwà a n’ebe Stifen nọ mgbe ọ na-agọpụ onwe ya n’iru ndịiro a nke nwere obi ọjọọ kpọ kwa Chineke asị!

Akwụkwọnsọ kwuru na Jisọs “gbara àmà nkwuputa àmà ahu n’iru Pọntiọs Pailat” (2 Timọti 6:13), Chineke nyekwara Stifen aka ime otù ihe ahụ. Ndị niile nọdụrụ ná nnọkọ ikpé ahụ, mgbe ha na-elegide ya anya n’iru, ha wee hụ na iru ya na-enwupụ dịka iru mmụọ ozi.

Ngọpụ nke Stifen

Okwu ngọpụ nke Stifen kwuru n’iru nnọkọ ikpé ahụ bụ okwu Chineke nke Ndị Kraist niile ga-eme nkeọma ịgụ ya mgbe niile. Ọ pụtara ìhè nkeọma na Stifen nwere nghọta dị ukwu banyere àtụmààtụ nke Chineke nye Ụmụ Israel ọ dị kwa ka onye akụziworo Akwụkwọ Nsọ nkeọma. Ọ bụ ezie na ndị ahụ náebo ya ebubo bụ ndị ná-anya isi na ha bụ ndị ná-edebe Iwu Chineke, Stifen kọwara Okwu Chineke nkeọma nye ha na o mere ka ha ghọta nkeọma na ha lefuru ijéozi ha na ihe kwesịrị ha ime nye Chineke na iwu anya. Stifen tụrụ ndị Israel mmehie ha n’anya bụ nke ọtụtụ ọgbọ gara aga, nkekanke ịkpọgide Kraist n’elu obe, nke bụ otù mmehie kachasị njọ ná mmehie niile emeworo mgbe ọ bụla. Site n’amamihe na nduzi nke Mmụọ Nsọ, Stifen gwawara ha ikpé nke mara ha n’otù n’otù site n’ịtụ ha mmehie ha n’anya. Ikpé mara ndị ahụ náebo Stifen ebubo, ha wee hụ kwa onwe ha n’iru Chineke dịka ndị ikpé mara.

Mgbe nke a karịrị ihe ndị ná-ebo ya ebubo pụrụ ịnagide, ha wee dakwasị Stifen ịtụgbụ ya na nkume; mgbe ahụ Chineke kwenyere ka onye nsọ Ya ahụ dị ukwu hụ Eluigwe ka emeghere ya bụ nke ma eleghịanya ọ dịbeghị mmadụ ọ bụla nke emeghere ya nye tutu oge a maọbụ site na mgbe ahụ. Mgbe Stifen na-elegide anya n’Eluigwe, o wee hụ ebube Chineke, na Jisọs ka Ọ na-eguzo n’aka nri Chineke -- ọhụ pụrụ iche nke ana-ahụbeghị mgbe ọ bụla! Ọ dịghị ebe ọzọ edere n’Akwụkwọnsọ na Jisọs guzoro ọtọ n’aka nri nke Chineke.

Dịka Onye Ya na Chineke Nna ra otù, ná-achịkọ kwa ọchịchị, Jisọs ga-anọdụ ala n’aka nri nke Chineke, ọbụná dịka Ọ gwara onye isi nchụàjà ahụ na Ya ga-anọdụ ala (Lee Matiu 26:64). Eze na-anọdụ ala n’ọche eze nke ịdị ukwu Ya mgbe ndịọzọ na-eguzo n’iru Ya ịkpọ isi-ala ná nsọpụrụ nye Ya. Ihe akụkụ Akwụkwọnsọ a na-akọwa bụ na Jisọs na-eguzo ná nsọpụrụ na ùgwù nye onye nsọ nke Chineke a onye ji ike ná-alụrụ eziokwu ahụ ọgụ n’iru ndịa nke kpọrọ Chineke asị onye gaje kwa ịtụfu ndụ ya n’ihi ịgbá-àmà ya.

Ọnwụ nke Stifen na ogbugbu egburu ya n’ihi okwukwe ya kpaliri ọgba aghara dị ukwu n’etiti Nzukọ Kraist mbụ ahụ. Ntachi obi nke Stifen nime ahụhụ ya na okwukwe ya nime Kraist nke ná-asụghị ngọngọ lụrụ ọlụ dị ukwu n’obi otù nwoke ana-akpọ Sọl onye Tasọs. Sọl kwenyere n’ogbugbu egburu Stifen, ọ dị kwa ka ọ bụ otù nime ndị isi ndị kpaliri ọnụma nke ìgwè mmadụ ahụ ndị tụgburu Stifen na nkume. Ike nke Stifen nwere iji kpeere ndị ná-ewepụ ndụ ya ekpere dị ka aga-asị na ọ mụnyere ọkụ n’ịkpọ asị nke Sọl megide ndị ná-eso ụzọ Jisọs karịa. N’oge ná-adịghị anya ọ gaje ịkpali ọtụtụ mkpagbu megide ndị nke Kraist, ma n’ikpe-azụ ọ ghọrọ onye emere ka o kwere na Kraist.

Dịka anyị na-echè ihe banyere Stifen n’oge nke ọnwụnwa a, ana-echetara anyị ihe banyere ekpere nke Onye dere Abù Ọma “Ọ buru na ejeghariam n’etiti ahuhu, I gēme kam di ndu: I gēseti aka-Gi imegide iwe ndi-irom, aka-nri-Gi gāzọputakwam. JEHOVA gēmezurum ihe nile: JEHOVA, ebere-Gi nādiru mgbe ebigh-ebi: arala aka n’ọlu nile nke aka-Gi abua” (Abù Ọma 138:7, 8). Anyị maara na Chineke arapụghị onye nsọ Ya nke a.

Ọbara nke Ndị Nsọ

Stifen bụ onye mbụ egburu n’ihi okwukwe ya n’ọgbọ nke ndị Kraist. O sonye kwara n’òtù ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị-obi nke ọgbọ niile bụ ndị gbara àmà ha nye ụwa nke kpọrọ Chineke asị na nke jụkwara Kraist site n’iji ndụ ha n’ụwa kwụọ ụgwọ àmà ha. Ndị ahụ biliri n’iwe nke sitere n’ekwensu igbu Stifen abụghị ndị mbụ meworo ụdị omume a. Setan bụ ogbu mmadụ site na mbụ, ọ dịghị etufu oge ịchọ ụzọ igbu ndị niile ná-adịghị ekwenyere ya n’ụbọchi taa.

Nime èzínaụlọ mbụ ahụ n’elu ụwa, Ken, jupụtara n’ekworo na ịkpọ asị n’ebe Ebel nwanne ya nọ, o wee gbuo ya, n’ihi na Chineke naara àjà nke Ebel nkeọma ma Ọ naraghị nke ya onwe ya. Ken chère na ya nwere ike ikpuchi olu nke Chineke rue mgbe ebighị ebi bụ nke gwara ya ihe ọjọọ o mere, n’igbu nwanne ya nwoke Ebel bụ ihe atụ nke eziomume Chineke, ma ewere ya tụlee ndụ Ken, ma Ken chère na site n’igbu Ebel na ya ga-agbanarị amamikpé nke akọ-na-uche.

“Apụọ n’anya apụọ kwa n’obi” bụ omume nke ụmụ mmadụ site na mgbe ochie, ma ọ dịghị mfé isi otú a wepụ Chineke n’obi. Ọ dịghị anya mgbe Ken gbusịrị nwanne ya nwoke na ọ nụrụ olu Chineke nke ná-ajụ ya ajụjụ n’óké olu “Òle ebe Ebel, bú nwa-nne-gi nọ?” Ken wee chọpụta na mmadụ apụghị izonarị akọ-na-uche ọjọọ ya ma ọbụ zopụ onwe ya site n’anya Chineke nke ná-ahụzu ihe niile. Onye dere Abù Ọma kọwara okwu a nkeọma mgbe ọtụtụ ọgbọ gasịrị: “Òlee ebe m’gālanari mọ Gi? ma-ọbu òle ebe m’gēsi n’iru-Gi gbalaga? Ọ buru na arigom n’elu-igwe n’ebe ahụ ka I nọ: … Ọ buru na achirim nkù nke ututu, biri n’akuku dikarisiri anya nke oké osimiri; ọbuná n’ebe ahu ka aka-Gi gēdurum, aka nri-Gi gēkpuchim; ma abali ghọrọ ìhè gburugburum Ọbuná ọchichiri adigh agbachiri Gi ma abali nēnye ìhè dika ehihie: dika Ọchichiri si di, otú a ka ìhè si di n’anya-Gi” (Abù Ọma 139:7-12).

Mmehie ana-ekwupụtaghị ekwupụta nke ọgbọ niile gara aga, na ikpé ọmụma nke akaọbara nke ndị ogbu mmadụ nke ọgbọ niile agaghị abụ ihe ezoro ezo mgbe niile n’ílì nke ndịkom na ndịnyom ahụ dị ukwu ndị egburu n’ihi okwukwe ha bú ndị ahụ nọgidesịrị ike n’ikwusa eziokwu nke Chineke. Mgbe ụmụ mmadụ biliri n’iwe nke ọkụ mmụọ megide ndị nsọ nke Chineke, ha kwesịrị icheta na ọ bụ Ọkpara Chineke ka ha na-ebili megide. Jisọs kwuru sị: “Ọ buru na uwa akpọ unu asị, unu mara na ọ kpọwo Mu onwem asị mgbe ọ kākpọgh unu asị. … Ọ buru na abiaghm, ọ buru kwa na agwaghm ha okwu, ha agagh-enwewori nmehie: ma ugbu a ha enwegh ihe-agugọ banyere nmehie-ha. Onye nākpọm asị nākpọ kwa Nnam asị” (Jọn 15:18, 22, 23).

Akwụkwọnsọ na-agwa anyị na onye nsọ nke Chineke ga-eyikwasị ụdị nke Kraist (Gụọ Ndi Efesọs 4:24; Ndi Kọlọsi 3:10). N’izube ihichapụ ihe ncheta ahụ niile, ya na ịhụ ụdị nke Kraist bụ onye eziomume ahụ nke akpọrọ asị -- ndị ajọomume na-achọsi ike ibibi ndị nsọ, ma náánị ihe ha na-achọpụta n’akọ-na-uche ha nke ikpé mara bụ na ha na-abụ ndị ikpé mara karịa otú ọ dị na mbụ.

Iko nke Ajọomume

Oge ga-eru mgbe Chineke ga-eche n’ụwa nke jụrụ Kraist, ihe ọjọọ niile ha na ogbugbu mmadụ niile ha n’uju n’ụzọ ana-apụghị ịgba agụgọ. Ihe ngosi a ga-abụ ihe àmà ikpe-azụ igosi na amụrụ mmadụ nime mmehie na o jupụtakwara n’ajọomume ma ọ bụrụ na o nweghị Kraist. Eleghịanya nke a bụ otù nime ihe kpatara Chineke ji ná-ekwenye ka egbuo ndị nsọ Ya n’ihi okwukwe ha. Jisọs gwara ụfọdụ ndị na-akpagbu mmadụ n’oge nke ya “Unu agwọ, unu aju-ala, ùnu gēsi aña gbanari ikpé nke ọku-ala-mọ? N’ihi nka, le, Mu onwem nēzitere unu ndi-amuma, na ndi-amam-ihe, na ndi-ode-akwukwọ: ufọdu nime ha ka unu gēgbu, kpọgide kwa ha n’obe; ufọdu nime ha ka unu gāpia kwa ihe n’ulo-nzukọ-unu, si kwa n’otù obodo nēsogbu ha ga obodo ọzọ; ka ọbara ndi ezi omume nile awusiworo n’elu uwa we biakwasi unu, site n’ọbara Ebel onye ezi omume ahu rue ọbara Zakaraia nwa Barakaia, onye unu gburu n’agbata ulo nsọ na ebe ichu-àjà-unu” (Matiu 23:33-35)

Stifen alaghị àzụ n’ikwusa Kraist, eziomume, na nzọpụta site ná mmehie. Ndị ahụ kpọrọ Kraist asị, jupụtara n’iwe n’ihi na ha apụghị ịgọnarị ebube niile na okwu niile nke Stifen kwuru megide omume ọjọọ ha niile, ha gburu ya iji kpuchie ya ọnụ. Ọ dịghị anya mgbe Stifen nwụsịrị ewee malite ịbọọbọ n’ihi ya, n’ihi na ikpé Chineke malitere ịdakwasị ndị Ju nke ọgbọ ahụ n’ịdịọkụ ya niile. Mbibi nke ndịagha Rom bibiri Jerusalem malitere mmezu nke amụma ahụ Jisọs buru banyere ikpé nke gaje ịbịkwasị ha. Ikpé ahụ adakwasịwo ndị Ju n’ụzọ dị egwù náewepụghị ya ihe site n’oge ahụ wee rue taa. Otú ọ dị, o rubeghị n’ọgwụgwụ ya, ọ ghaghị akwụsị kwa tutu abịaruo n’oge Óké Mkpagbu ahụ n’ihi ịnọgide n’ịjụ Jisọs Kraist dịka Mesaia na Eze ha nke gaje ịbịa.

Ọbụná n’ụbọchị nke anyị ugbu a, anyị na-ahụ n’obodo ndịọzọ mkpagbu dị iche iche jọgburu onwe ha nke ndị niile ná-ekwupụta Kraist na-enwe. Agụkọwo na ọnụ ọgụgụ ndị egburu n’ihi okwukwe ha nime Kraist n’arọ olenaole gara aga dị ọtụtụ karịa ọnụ ọgụgụ ndị egburu n’ọgbọ niile gara aga. Ọtụtụ nde mmadụ ka egburu n’arọ olenaole gara aga náánị nime China na Korea. Oge nke igbu NdịKraist n’ihi okwukwe ha agafebeghị maọlị, ya mere ndịnsọ nke Chineke ga-anọ ná njikere mgbe niile iji ọbara ha kachie ịgbá-àmà ha ákàrà ma ọ bụrụ na ọ dị mkpà. Jisọs kwuru sị: “Orù adighi-aka onye-nwe-ya uku. Ọ buru na ha sogburum, ha gēsogbu kwa unu” (Jọn 15:20). O kwukwara sị, “Gosi onwe-gi onye kwesiri ntukwasi-obi rue ọnwu, M’gēnye kwa gi okpu-eze ahu, bú ndu” (Nkpughe 2:10).

Jisọs kwuru na onye ọ bụla nke ga-atụfu ndụ ya n’ihi Ya onwe Ya na n’ihi Oziọma ahụ ga-azọpụta ndụ ya n’ezie. Stifen tụfuru ndụ ya n’ụwa nke a n’ihi ịnọgidesi ike ya ikwusa Oziọma ahụ, ma ọ chọtara ndụ ebighị ebi n’ọnọdụ nke a. N’oge óké mkpà o wee nwee ike ileba anya nime Eluigwe n’onwe ya, ewee kpọbata ya nnọọ n’ebe Chineke nọ. Mkwà nke Chineke nye mmadụ niile bụ na ọ bụrụ na anyị gaatụfu ndụ anyị n’ihi Oziọma ahụ anyị ga-achọta kwa ya. Nke anyị ga-abụ ndụ ahụ nke ná-enweghị ọgwụgwụ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị mere ụmụ mmadụ ji kpọọ Stifen asị?
  2. Ònye nyeere Stifen aka n’oge ọnwụnwa ya?
  3. Òlee otú o si mee na ndị ahụ ná-ebo Stifen ebubo ghọrọ ndị amara ikpé n’iru Chineke?
  4. Gịnị mere Chineke ji mee ka Stifen hụ ọhụ banyere Kraist ahụ eyikwasịworo ebube?
  5. Gịnị mere ndị ahụ nke gere Stifen ntị ji gbue ya?
  6. Gịnị mere ndị ajọomume ji achọsi ike igbu ndị nke Kraist?
  7. Gịnị mere eji egbu ụmụ mmadụ n’ihi okwukwe ha n’ọgbọ nke a?