Ọlu Ndi-ozi 8:1-25.

Lesson 290 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Orù adigh-aka onye-nwa-ya uku. Ọ buru na ha sogburum, ha gēsogbu kwa unu; ọ buru na ha debere okwum, ha gēdebe kwa nke unu” (Jọn 15:20).
Cross References

I Mkpagbu ahụ na Mgbasa nke Oziọma

1. Ndị nsọ ahụ gbasasịrị na Judia na Sameria niile, Ọlu Ndi-ozi 8:1; 1:8

2. Pọl sogburu Nzukọ Kraist nke ukwuu, Ọlu Ndi-ozi 8:2-4; 26:9-12

3. Ijéozi Filip nime Sameria lụpụtara nchègharị nke ọtụtụ mmadụ, Ọlu Ndi-ozi 8:5-8; Mak 16:15-18

II Nchègharị Saimon site n’ijéozi nke Filip

1. Saimon naeme mgbasị n’etiti ndị Sameria, Ọlu Ndi-ozi 8:9-11

2. Anapụtara ndị Sameria n’ọlụ mgbasị site n’Oziọma ahụ, Ọlu Ndi-ozi 8:9-11

3. Ọlụ ebube niile Saimon hụrụ tụrụ ya n’anya, o wee chègharịa, Ọlu Ndi-ozi 8:13

III Obi Ná-ezighị ezi nke Saimon na ọdịda ya

1. Ezigaara ndị Sameria Pita na Jọn, ndị natakwara Mmụọ Nsọ mgbe ahụ, Ọlu Ndi-ozi 8:14-17

2. Saimon nyere ego ka enye ya ike nke inye mmadụ Mmụọ Nsọ, Ọlu Ndi-ozi 8:18, 19

3. Pita baarà Saimon mbá, Ọlu Ndi-ozi 8:20-25

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Ga N’ụwa Niile

“Ganu n’uwa nile, kwusara ihe nile ekère èkè ozi-ọma nkem” (Mak 16:15) bụ iwu ikpe-azụ nke Onyenwe anyị nyere ndị ná-eso ụzọ Ya (Lee kwa Matiu 28:18-20.) Ebe ọ bụ na ike nke ijéozi a dịrị Ndị Kraist niile, ana-akpọ ya ọtụtụ mgbe Inye ike nke Ijéozi ukwu ahụ. Ndị ná-eso ụzọ Ya échèréworị ka emejuo ha n’ike ahụ, enyewo kwa Mmụọ Nsọ dịka ekwere ná mkwà. Ma ọ dị ka ha nwere ojuju afọ ịnọ nso ụlọ ha. Ihe na-agara ha nkeọma. Onyenwe anyị na-agwọ ndị arụ ná-adịghị ike, ana-azọpụta kwa ụmụ mmadụ, ha na-añụrị kwa ọñụ n’ihe ebube dị iche iche nke Onyenwe anyị na-eme n’obodo nke aka ha. Ha ga-ajụworị sị, “Gịnị mere anyị gaeji rapụ ntụte nke dị n’obodo anyị pụọ ijé hụọ ahụhụ dị icheiche nke ịga n’obodo ndi ọzọ?” ma Onyenwe anyị ekwuwo sị, “jee.”

Mkpagbu Dị Iche iche

Ekwensu na-agbalị mgbe niile imeri na ịla Nzukọ nke Jisọs Kraist n’íyì. Akụkọ nke ndị mgbe ochie na-akọwara anyị na ndị ná eso ụzọ nke Kraist egburu n’ihi okwukwe ha ná mmalite mkpagbu nke Nzukọ Kraist mbụ ahụ dị puku mmadụ abụọ (2,000) n’ọnụ ọgụgụ. Ma ụzọ ahụ ekwensu chèpụtara iji laa Nzukọ Kraist ahụ n’íyì ghọrọ ngwa-ọlụ nke iji gbasaa ya n’ebe niile na ime ka o guzosie ike. Ndị Ju apụghị ịnagide òzízí nke mbiliten’ọnwụ Kraist. Ya mere mgbe ana-ezi ma ná anwapụta isiokwu nke òzízí a, o mere ka óké amamikpé nke dịrị ndị Ju n’ihi ikpọgide Mesaia ha n’elu obe pụta ìhè nkeọma. Dịka Ndịozi ahụ nọgidesịrị ike ná-ekwusa mbiliten’ọnwụ nke Kraist na amamikpé nke dịrị ndị ahụ, emere ka mkpagbu ana-akpagbu ha baa ụba karịa.

Ọ dịghị mgbe ọ bụla mkpagbu na-egbochi ọgan’iru nke Nzukọ Kraist; kama nke a Nzukọ Kraist na-aga n’iru itó étó mgbe niile ọnwụnwa na mnwapụta ya niile. Stifen amataghị mgbe nkume na-ezo ya n’arụ dịka mmiri rue mgbe “Ọ dara n’ura,” na ọnwụ ya bụ mmalite nke mkpagbu ahụ nke ga-eme ka Oziọma ahụ gbasaa rue ọtụtụ obodo. Eleghịanya ọ mataghị ihe ukwu nke nguzosi ike ya nye Chineke ga-alụpụta.

Sọl. onye nnọkọ ikpé Sanhidrin nyere ike, na kwa onyeisi nke mkpagbu ahụ megide ndị ná-eso ụzọ Jisọs, ná-akpagbu ndịkom na ndịyom n’ebe niile. Ọ na-abà ọbụná n’ụlọ ha n’otù n’otù ịdọpụta ha iziga ha n’ụlọ mkpọrọ -- dịka otù ụdị ihe ahụ nke emeworo n’ọtụtụ mba dị iche iche nime arọ olenaole gara aga.

Onyenwe anyị sịrị, “Ma mgbe ọ bụla ha sogburu unu n’obodo a, gbalaganu n’obodo di iche” (Matiu 10:23). Ya mere ha “jèghariri nēzisa Oziọma, bú Okwu Chineke.” Ọ bụ àtùmààtụ nke Chineke iji mee ka Oziọma ahụ gbasaa. Otù onye ekwuwo na ndịnsọ a ndị na-awagharị awagharị yiri ọtụtụ ọrịọna, nke eji ọkụ nke Mmụọ Nsọ mụnye, ná-agbasa kwa n’ebe niile ire ọkụ ahụ dị nsọ bụ nke ejikwara mee ka ha onwe ha ná enwu enwu.

Agha Ụwa Nke Abụọ

N’arọ olenaole gara aga ọtụtụ ụmụ okorọbịa anyị nwere mmetụta banyere ọkpụkpọ òkù nke Chineke ná ndụ ha. Ha chọrọ ịgbasa ozi nke nzọpụta ahụ na ịgwa ndịọzọ ihe banyere ụzọ ha ga-esi si ná mmehie ha na nsogbu ha pụta. N’oge ana-alụ agha n’arọ olenaole gara aga ha ji ohere ha nwere gbara Onyenwe anyị àmà; ma mgbe ha na ejere obodo anyị ozi, ná mba na obodo dị iche iche dị anya, ha biri ndụ ha nye Jisọs. Site n’ime nke a ha nwapụtara ike nke Chineke ijide ha ibi ndụ dịka ndị nke Kraist na inye ha ike na odúdú ha chọrọ n’ọlụ ha náalụrụ Chineke. N’ihi ikwesị ntụkwasị-obi ha, na n’ihi okwukwe dị ukwu nke ha nwere na Chineke, ha ji kwa ọkụ Chineke nke ná-enwu enwu nime obi ha lata, ha jikekwaara ịlụ ọlụ ahụ nke o nyere ha ka ha lụọ ná-agbanyeghị ebe ọlụ ahụ ga-eduru ha jee.

Ikwusa Okwu ahụ

Nime mkpagbu a nke Nzukọ Kraist mbụ ahụ nwere, ndị ná-eso ụzọ Jisọs jègharịrị n’ebe niile ikwusa Okwu Chineke. Ọ dịghị Oziọma ma ọbụ Akwụkwọozi edeworo mgbe ahụ, ma ndị ná-eso ụzọ Jisọs maara ihe edere n’Agba Ochie nkeọma, ma ha sitere na ya ná-ewere okwu nke ha na agwa ụmụ mmadụ bụ ndị ná-aña ha ntị n’okwu nke ijéozi ha. Ma isiokwu nke ozi ha bụ Jisọs. Ha na-agwa ndị ahụ ha na ezi Oziọma ihe niile Jisọs kụziiri -- otù nime ihe niile ahụ nke Jisọs kuziiri ndị ná-eso ụzọ Ya bụ na Ya onwe-Ya bụ Mesaia ahụ ekwere ná mkwà, Ọkpara Chineke (Jọn 5:17-40).

Jisọs akụziwororị ndị ná-eso ụzọ Ya ihe banyere ọmụmụ ọhụụ (Jọn 3:1-16). Ọ kụzi kwaara ha ihe banyere ọbịbịa Ya nke ugbò abụọ na Ala-eze Ya (Matiu 16). Ọ kụzi kwaara ha òzízí nke ịdị-nsọ na eziomume, O kpekwaara ha ekpere ka edoo ha nsọ (Jọn 17:1-26; Matiu 5:48). Ọ kụziwo kwara ha ihe banyere ọbịbịa nke Onye nkasi-obi ahụ, na ike nke Mmụọ Nsọ ahụ ga-etinye nime ha (Jọn 14:15-18). Ọ kụziworo harịị ihe banyere ọbịbịa Ya nke ùgbò abụọ na Ala-eze Ya (Matiu 24). Ọ gwawo ha okwu banyere ọnwụ na mbiliten’ọnwụ Ya -- ha onwe ha bụ kwa ndịàmà nke ihe niile ahụ. N’eziokwu, ihe niile nke dị n’Okwu Chineke bụ ozi ha ná-ezi ụwa nke furu efu.

Ọwụwụ mmiri ná-aha nke Onyenwe anyị Jisọs

Filip, otù onye nime mmadụ asaa ahụ ná-ejere Nzukọ Kraist ozi bụ ndị arọpụtara inyere ndị ozi ahụ aka, gara na Sameria wee kwusaa Kraist nye ndị Sameria. Ndị Sameria kweere wee nábata kwa mkwusa ya, Onyenwe anyị lụkwaara ọtụtụ ọlụebube n’etiti ha. Óké ọñụ wee dị n’obodo ahụ, awụkwara ọtụtụ mmadụ mmiri.

Ihe edere n’Akwụkwọ Nsọ na-akowa na awụrụ ndịa niile kwere ekwe mmiri “n’aha Onyenweayi Jisus.” Ndị ná-ekwugide òzízí ahụ nke dị n’Akwụkwọ Nsọ banyere Atọnimeotù Dị nsọ ejidesiwo amaokwu a ike wee wezuga ya n’ihe ọ ná-akọwa iji ya wee kwugide ihe àmà ahụ nke ana-apụghị ịgba-agụgọ banyere Atọnimeotù nke dị n’ụkpụrụ ahụ Jisọs nyere maka ịwụ mmiri (Matiu 28:19). Nke a bụ kwa ihe ịma-àtụ ọzọ ebe eweere akụkụ ụfọdụ nke ihe edere n’Akwụkwọ Nsọ, tụgharịa ya pụọ n’ihe ọ na-akọwa wee wezuga kwa eziokwu ahụ nke ọ nakụzi, setan na ndịozi ya ewerewo kwa ya ná-eme ka òzízí ụgha gaa n’iru.

Ebumn’uche nke ana-akụzi n’ihe ọmụmụ a bụ na ndịa ná-amaghị ihe ọ bụla banyere Oziọma nke Jisọs Kraist na mbụ n’ihi na ha bụ ndị Sameria, abụrụwo ugbu a ndị náesoụzụ Kraist n’ezie n’ihi na ha “anarawori Okwu Chineke.” Ọ pụtaara ìhè nkeọma n’ebe a na apụghị ịgọnarị òzízí nke Atọnimeotù Dị Nsọ, n’ihi na aha nke Chineke Nna na nke Jisọs Kraist bụ Ọkpara Ya ka akpọrọ n’otù amaokwu (Ọlu Ndi-ozi 8:12), n’ihe ọmụmụ a kwa anyị gụrụ na ha rịọrọ arịrịọ ka Mmụọ Nsọ bata nime obi ndịa azọpụtara ọhụụ dịka ọ batara nime obi narị mmadụ na iri abụọ (120) ahụ n’Ụbọchị Pentikọst.

Ekwuru okwu n’ebe a banyere ọwụwụ mmiri nke mmiri dịka ọwụwụ mmiri “ba n’aha Onye-nwe-ayi Jisus” iji gosi ihe dị iche na ọwụwụ mmiri nke mmiri ahụ nke Jọn Onye ọwụ mmiri na-eme. Baịbụl gosịrị ihe dị iche n’etiti ọwụwụ mmiri nke Jọn na nke Kraist n’ebe o doro anya dịka anyị naahụ ya n’amaokwu niile a edepụtara.

Na mbụ, ọwụwụ mmiri nke Jọn bụ “ọwuwu mmiri nke nchèghari inwe ngbaghara nmehie” (Mak 1:4; Luk 3:3; Ọlu Ndi-ozi 13:24; 19:4), ma nke ahụ Jisọs tọrọ ntọala ya bụ náánị nye ndị kwere ekwe, ọ bụ kwa ngosi nke ndụ ọhụụ nke ha bawororị nime ya site n’Ọbara nke Jisọs (Ndi Rom 6:1-6).

Ndị nọ n’ebe ahụ mgbe Jisọs kọwara ọnọdụ Jọn n’ebe ndị amụma ọzọ nke Agba Ochie nọ kewara onwe ha ụzọ abụọ. Ndị nọ n’otù ụzọ bụ ndị ejiri “ọwụwụ mmiri nke Jọn wụọ ha mmiri,” ma Baịbụl kwuru sị “ha we gua Chineke n’onye ezi omume.” Ndị n’ọ nm’òtù ọzọ nke naa abughị ndị Jọn wụrụ mmiri, ma edeputara ya n’Akwụkwọnsọ na ha juru onwe ha izù Chineke (Luk 7:29, 30). Akwụkwọnsọ kwuru n’ebe ọzọ na ndị ahụ bịara na “ọwụwụ mmiri ya (nke Jọn)”; okwu ahụ bụ “ọwụwụ mmiri nke Jọn” ka ejikwara kwuo okwu n’ọtụtụ ebe nime Akwụkwọnsọ ná-abụghị ndịa anị kwuru n’ebe a. (Lee ihe ịma-àtụ ndịa Matiu 21:25); Mak 11:30; Luk 20:4.) Tụkwasị kwa na nke a mgbe Pọl na ajụ ndị ná-eso ụzọ Kraist n’Efesọs ajụjụ banyere ọwụwụ mmiri nke Mmụọ nsọ, ha sịrị na ha matara náánị ọwụwụ mmiri nke Jọn, ndị Pọl zaghachiri “ka ha kwere n’onye ahu nke gaje ibia n’àzù ya, nke ahu bu, na Jisus.” Ihe akọwara n’ebe a ná-egosi na mgbe ndị Kraist ahụ nọ n’Efesọs nụrụ okwu niile nke si n’ọnụ Pọl, “ewe wụọ ha mmiri ibà n’aha Onye-nwe-ayi Jisus” (Ọlu Ndi-ozi 19:1-5).

Site na nke a anyị na-ahụ na Mmụọ Nsọ na-akụzi na ọwụwụ mmiri nke mmiri so nime àtụmààtụ nke Chineke banyere anyị na mgbapụta anyị. Ọ na-akụziri anyị na mgbe ndị Sameria ndịa chègharịrị na awụrụ ha mmiri nime mmiri, ọ bụghị kwa na ọwụwụ mmiri mbụ nke nchègharị nke Jọn Onye Ọwụ mmiri wụrụ kama ọ bụ ịbànye na n’ọwụwụ mmiri nke onye amụworo ọhụụ ma ọbụ onye chègharịrị echègharị dịka Kraist tọworo ntọ-ala ya. Ọwụwụ mmiri nke mmiri, dịka Jisọs tụrụ ụkpụrụ ya bụ ihe akụziri nkeọma na Baịbụl na ọ bụ “n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ.” Ọ bụ otù ùgbò ka ana-emikpu mmadụ nime mmiri, ọ bụghị ùgbò atọ nke bụ otù mmikpu nye otù Ebube nime Ịbụ-Isi Chineke. Site na nke a anyị na-ahụ nke ọma na ịrụ ụka nke mmadụ ụfọdụ na ọwụwụ mmiri nke mmiri nke Kraist tụrụ ụkpụrụ ya dabeere n’aha atọ dị iche iche nye Jisọs bụ òzízí ụgha nke ekwensu ji ná-eduhie ụmụ mmadụ n’ụwa.

Saimon Onye Mgbasị

Nime obodo a bụ Sameria enwere otù onye mgbasị ana-akpọ Saimon, onye ná-eduhie ọra mmadụ site ná mgbasị ya, ná-eme kwa ka ha ná-echè na ya onwe ya bụ onye ukwu. O jiworị aghụghọ duhie ha, ma mgbe ọ hụrụ na ọlụ ebube niile nke Filip na-alụ bụ ezie, na alụrụ ha site n’ike nke Chineke ọ bụghị site n’aghụghọ nke mmadụ, ya onwe ya wee kwere ewee wụọ ya mmiri. Na nwoke dị otú a pụrụ ikwere na Kraist ewee zọpụta ya, bu ọlụ ebube pụrụ ichè n’onwe ya.

Nziga ezigara Pita na Jọn

Mgbe Nzukọ Kraist nọ na Jerusalem nụrụ na ndị Sameria anabatawo Okwu ahụ, ha zigara Pita na Jọn inyere Filip aka ná ntute ahụ na ime ka ndị Sameria guzosie ike n’okwukwe. Ndịozi ahụ gwara ndị Sameria ihe banyere ọwụwụ mmiri nke Mmụọ Nsọ, n’ihi na ha maara ha “nkwà nka diri … ndi nile nọ n’ebe di anya, ka ha ra bú ndi Onye-nwe-ayi Chineke ayi gākpọtara Onwe-Ya” (Ọlu Ndi-ozi 2:39). Azọpụtawo ndị Sameria doo kwa ha nsọ, ha egosipụtawo kwa nke a site ná ndụ ha. Ya mere ha bụ ndị tozuru òkè ịchọ, na ịnata Onyinye àmàrà ukwu ahụ nke Ike, bụ nke Chineke kwere ná mkwà na aga-enye n’ọgbọ a.

Nzukọ Ekpere Ukwu ahụ

Ndị ana-enye ọwụwụ mmiri nke Mmụọ Nsọ bụ náánị ndị agbaghaworo mmehie ha na ndị asachawokwara obi ha site n’ọlụ àmàrà nke abụọ nke Ọbara óké ọnụ nke Jisọs. Ọlụ àmàrà abụọ ndịa nke Chineke ka ana-akpọ ịgụ mmadụ n’onye eziomume na odudo nsọ zuru òkè. Pita na Jọn hụrụ igbu màrà màrà nke iru ndịa chègharịrị ọhụụ na Mmụọ Nsọ nke pụtara ìhè n’etiti ha, ya na agụụ nke dị n’obi ndịa nke amụworo ọhụụ ịmụta ihe banyere Chineke karịa, ya mere Ndịozi ahụ gwara ha ihe banyere Onye nkasị-obi ahụ nke Jisọs Kraist zitere nime ụwa iduzi na idubà ha n’eziokwu niile. Ndị Sameria ahụ amụworo ọhụụ nabatara eziokwu ahụ nkeọma, nzukọ ekpere dị ukwu wee malite.

Tulee otú obi ga-esi tọọ Pita na Jọn ụtọ mgbe ha na-ahụ ndị Sameria ndịa, ndị, Ndị Ju kpọkwara asị, ka ha jiri obi ha ná-achụàjà ná-arapụ kwa ndụ ha n’aka Chineke! Pita na Jọn wee sonye ná nzukọ ekpere ukwu ahụ; ma mgbe ha na-ekpe ekpere ná-ebikwasị kwa ha aka n’isi, ndị Sameria ndịa wee náta ọwụwụ mmiri nke Mmụọ Nsọ na ọkụ. Ugbu a ebe ọ bụ na mkwà nke a dịrị ha dịkwara ụmụ ha, na kwa “ndi nile nọ n’ebe di anya ka ha ra bú ndi Onye nwe-ayi Chineke gākpọtara Onwe-Ya” (Ọlu Ndi-ozi 2:39), anyị maara na ọ dịkwara anyị taa. Ọ bụghị náánị mmadụ 120 ahụ ndị zukọrọ n’ụlọ elu ahụ ka ọ dịrị. Ọ bụghị náánị Ndị Ju ahụ bụ ndị kwere na Kraist ka enyere ya. Mkwà ahụ adịrịghị náánị oge nke Nzukọ Kraist mbụ ahụ. Onyinye àmàra a dị ebube dịrị ndị niile edoworo nsọ -- Onye Ju ma ọbụ Onye Mbaọzọ -- ndị ji obi ha niile acho Ya. Ị natawo mkwà nke Nna site na mgbe i kwere?

Mgbalị maka Iji Ego Zụta Ike ahụ

Mgbe Saimon onye mgbasị hụrụ ike nke Mmụọ Nsọ a, ọ chọrọ inweta ya n’onwe ya. Rue ogologo oge o mewo ka ndịa kwere na ya onwe ya bụ onye ukwu, onye nwekwara ike karịrị ike niile. Eleghịanya ọ chọrọ ike a ka o were ya nọgide ná abụ onye ukwu n’etiti ha. Baịbụl ná-ekwu sị, “Asi na madu nēchè na ọ bu ihe mgbe ọ nābugh ihe ọ bula, ọ nāghọ onwe-ya aghụghọ n’obi” (Ndi Galetia 6:3). Saimon achọghị ike a n’ụzọ Baịbụl si kuzie ya, dịka ndị Sameria mewororị. Saimon gbalịrị iji ego zuta ya. Eleghịanya Pita chetara, n’oge a, ihe mere Ananaias na Safaira. Ma ọ dịghị mmụọ nke ikwenyere ihe ọjọọ maọbụ ọchịchọ ego nke dị nime Pita. Ọ sịrị Saimon, “Ka ọla-ọcha gi so gi la n’iyi.” Ọ bụrụ na ukọ-Chukwu ọ bụla nke ná ekwu Okwu Chineke taa nwere ụdị mmụọ nke Pita, agaghị enwe ndị ọ bụla nke nọ ná nzukọ Kraist náánị ime ka ọlụ aka nke onwe ha naaga n’iru. Pita anaraghị ego Saimon wee tie ya aka ntakịrị n’àzụ, wee kpọọ ya ezi mmadụ ka o we ná-anata ezi ihe n’aka ya na iruọma nke náadị nwa oge. Pita baara ya mbá n’iru mmadụ niile, wee gwa ya ka o chègharịa n’obi ọjọọ ya, n’ihi na obi ya ezighị ezi n’iru Chineke.

Anyị apụghị izonarị Chineke. “Chineke nwere ike ituputa échìchè na izù niile nke obi … ihe nile gba ọtọ buru kwa ihe emegheworo n’anya Ya, bú Onye ayi gākọrọ akukọ banyere omume ayi” (Ndi Hibru 4:12, 13). Agwaghị anyị ma Saimon onwe ya o chègharịrị n’ezie, ma ọ rịọrọ Pita ka o kpeere ya ekpere ka ikpé ndịa ghara ịdakwasị ya. Baịbụl náekwu mgbe ọ na adọ aka-ná-ntị sị “Karia ihe-ndebe-gi nile chebe obi-gi; n’ihi na site na ya ka nputa nile nke ndu di”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Ònye bụ Onyeisi nime ndị ná esogbu ndị nke Kraist n’oge a?
  2. Ònye buuru Oziọma ahụ gaa nime Sameria?
  3. Ònye bụ onye ahụ amaara nkeọma nke chègharịrị n’obodo ahụ?
  4. Ònye ka esi na Jerusalem zite inyeaka ná ntute ahụ?
  5. Òlee onyinye amara ahụ dị ukwu nke ndị nsọ nọ na Sameria natara n’aka Chineke n’oge a?
  6. . Gịnị ka Saimon,onye mgbasị ahụ chọrọ ime?

  7. Gịnị bụ ọzịzá Pita nyere Saimon?