Abụ Ọma 46:1-11; 90:1-17

Lesson 291 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBU N’ISI: “Ka idi-utọ nke Onye-nwe-ayi bú Chineke-ayi, dikwasi ayi: Gi me kwa ka ọlu aka-ayi guzosie ike n’aru ayi; e, ọlu aka-ayi me ka o guzosie ike” (Abụ Ọma 90:17).
Cross References

I Ntụkwasị-obi Nke Ndị Kwere ekwe

1. Egwù adịghị emekpà ezi nwa Chineke arụ n’ihi na Chineke bụ ebe mgbabà siriike, Abụ Ọma 46:1-3; I Jọn 4:18

2. Oziọma ná-enye inwebiga ndụ ókè, Abù Ọma 46:4, 5; Jọn 10:10

3. Ndị iro nke ndị nke Chineke dị ọtụtụ, ma Chineke na eme ka ndị nke Ya merie, Abụ Ọma 46:6-9

4. Ndị ná-ele anya Chineke ga amara Ya n’ezie, Abụ Ọma 46:10, 11; Ọpupu 14:13; Aisaia 40:31

II Chineke nke Oge na Ebighịebi

1. Oge adịghị ebilata ịdị adị nke Chineke, Abụ Ọma 90:1, 2

2. Emere ka ndụ nke mmadụ n’elu ụwa dị mkpụmkpụ n’ihi mmehie ya, Abụ Ọma 90:3, 5-9

3. Otù puku arọ dị ka iheefu n’ebe elekere nke oge Chineke dị, Abụ Ọma 90:4

4. Akụziiri mmadụ ka ọ gụọ ụbọchị ndụ ya ọnụ, Abụ Ọma 90:10-12

5. Chineke na ekpughe ezi ịdịmma nke ndụ nye ndị niile ná achọ ya, Abụ Ọma 90:13-17

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Ebe Mgbabà Siri ike

Chineke bụ nnọọ ezi inyeaka n’oge mkpà nye ndị niile ná atụkwasị Ya obi. Ọ dị mgbe ụfọdụ ọ na adị ka ụwa niile nọ n’usoro imegide onye ahụ nke hụrụ Chineke n’anya ma náefé kwa Ya òfùfè; ma otù ntụgharị uche banyere ike nke Chineke, ịdị ukwu Ya, na mmasị O nwere n’ebe ọ dị mma nke mkpụrụobi ụmụ mmadụ dị ga-eweta okwukwe ọhụụ iji merie nsogbu niile ahụ nke ná-anyịgbu ya. Onye dere Abụ Ọma 46 na ndị niile edere ihe banyere ha nime ya, dị ka ndị meriworo mkpagbu ukwu nke dakwasịrị ọgan’iru nke obodo ha. Eleghịanya ọ bụ ibu agha nke ndị agha ala ọzọ, n’ihi na ebe Abụ Ọma a na-atụaka bụ obodo nke Chineke -- Jerusalem; ma alụgbubeghị obodo a n’oge a n’ihi na Chineke bụrụ ha ebe mgbabà na ike, n’ihi na n’oge ná-adịghị anya aka Ya dị ike setipụrụ ịzọpụta ha site ná nhụjuanya ha.

Ọ bụ okwukwe dị ndụ ka ndị ahụ nwere; ma okwukwe dị otú a pụkwara ịkwalite ogwe-aka nke Chineke nime ụwa n’ụbọchị taa, ịlụ ọlụ ebube dị ukwu n’ebe ndị ahụ nọ bụ ndị ga-eji obi eziokwu kpọkuo Ya site n’alaala obi ha. Egosikwara nime Abụ Ọma nke a onyinyo nke na-ezipụta ọgba aghara dị ukwuu nke ọtụtụ ihe èkèrèèkè, ma otú ọ dị onye dere Abụ Ọma ahụ na ekwu na ndị ahụ atụghị egwù ọ bụla. Okwukwe na ntụkwasị-obi ha nime Chineke nke mgbe ebighịebi jidesịrị ha ike. Eleghịanya ọ bụ ihe egwù ahụ dị ukwu nke dakwasịrị ha wuliri okwukwe ha ijidesi Chineke ike. Mgbe mmadụ bịaruru n’ebe inyeaka ná-adịghị kwa wee kpọkuo Chineke, mgbe ahụ Chineke pụrụ igosi ike Ya. Ike nke Chineke na apụta ìhè karịsịa mgbe ekpughere ya gafee ihe niile nke mmadụ nwere ike ime.

Onye ahụ dere Abụ Ọma dere: “N’ihi nka ayi agagh-atu egwù mgbe uwa nāgbanwe, ma-ọbu mgbe anēwezuga ugwu nile n’ọnọdu ha ga n’etiti óké osimiri.” Eleghịanya ọ bụ nsogbu ha dị iche iche wetaara ha mbibi ahụ dị ukwuu. Otú ọ dị, otù ụbọchị na-abịa, ọ dị kwa nso, mgbe ọnọdụ dị otú a gaemezu. “Ubọchi Onye-nwe-ayi gābia dika Onye-ori; nke ọ bu nime ya ka elu-igwe gēji oké ùzù gabiga, ihe nile di n’elu-igwe gāba kwa ọku we la n’iyi, uwa na ọlu nile aluru nime ya gērechapu kwa” (2 Pita 3:10). Náánị ndị ahụ nwere okwukwe dị ndu nime Chineke dị ndụ ga-agbanarị ụbọchị ahụ. “Ebe anēme ka ihe ndia nile la n’iyi otú a, ọ bu aha madu gini ka unu nāghagh ibu n’ibi-obi nsọ nile na nsọpuru Chineke nile?” (2 Pita 3:11).

Mmiri nke Ndụ

Nime obodo Jerusalem nke mbidi gbara gburugburu ka otù isi iyi ọma nke náadịghị atalata atalaata site n’arọ rue n’arọ dị. Mmiri nke isiiyi ahụ na-asụ nwayọ gabiga obodo ahụ n’ụzọ dị obosara ma ọ dịghị omimi. Ọ dịghị mkpà iji ụgbọ mmiri agabiga nime ya. Ọ bụ ihe doro anya, na Jerusalem bụ isi obodo nke uwa niile n’oge ahụ, ma otú ọ dị ewughị ya n’ebe apụrụ iji ụgbọ mmiri gabiga na ya. Otú ọ dị, mgbe ana-eji ndịagha nọchigide obodo ahụ gburugburu n’oge agha, mgbe ahụ ịdị mkpà nke mmiri ahụ dị ná-apụta ìhè. Isiiyi mmiri dị otú a nke ná-enye ndụ abụghị ihe aga-ekwe ka ndịiro nọ n’azụ mgbidi obodo ahụ, mebie, kwụsị, ma ọbụ gbochie ya, n’ụzọ ọ bụla.

Ma eleghịanya mmiri iyi Shailo apụghị ibulite nnukwu ụgbọ mmiri nke ụmàrà ná-anyagharị, ma ọ na-alụ ọlụ dị ukwuu karịa nke a. Emere ka mmiri ya gazuo obood ahụ niile site n’ọtụtụ òkpò mmiri nke eji aka mee, nke ụfọdụ mmiri iyi ha na-aga n’okpùrù ala inye ndị niile bi na Jerusalem mmiri. N’ebe ahụ ka apụrụ imeju akpịrị ịkpọ nkụ nke ndị ahụ rue n’ụlọ ọ bụla n’obodo ahụ. Shailo bụ ihe ná-egosipụta ebere Chineke nke Israel nke ná-adịghị agwụagwụ n’ebe ndị Ya nọ.

Nime ọtụtụ amụma eburu banyere Mesaia ka ahụrụ okwu ndịa: “Nkpa-n’aka eze agagh-esi n’ebe Juda nọ wezuga onwe-ya, nkpa-n’aka onye nēnye ukpuru agagh-esi kwa n’etiti ukwu-ya abua wezuga onwe-ya rue mgbe Shailo gābia; ọ bu kwa ya gēnwe iña-nti ndi di iche iche” (Jenesis 49:10). Ọ bụghị ihe mere ná-amaghị ama na otù nime aha nke Ọkpara Chineke na aha nke isiiyi a ná-adịghị atalata nke dị n’obodo Chineke ga-adakọta, n’ihi na Jisọs bụ Isiiyi nke ebere Chineke nke emeghere nye mmadụ niile bi n’elu ụwa. Jisọs guzoro wee tie mkpu n’óké Ụbọchị ikpe-azụ nke ememe ahụ, “Ọ buru na akpiri kpọrọ madu ọ bula nku, ya biakutem ñua miri” (Jọn 7:37). Osimiri nke àmàrà Chineke abụghị ihe ná-adịghị omimi dịka Shailo, kama o nweghị nsotụ. Ezikiel kọwaara ihe banyere osimiri a nke si n’ụlọ Chineke ná-asụpụta: “Ọ bu osimiri nke m’nāpugh igabiga: n’ihi na miri ahu etowo eto, buru miri ogwugwu, osimiri nke anāgagh-agabiga” (Ezikiel 47:5). Àmàrà Chineke adịghị ụkọ nye ndị niile nwere obi ịchọ na inweta ya.

Otù Ebe Ewusiri ike

Jerusalem, Obodo nke Chineke ka amaàrà nkeọma n’ụwa niile dịka ebe ewusiri ike. Ọ bụ obodo siri ike ịlụgbu n’ihe banyere ibu agha, n’ihi otú esi wusie ya ike dịka ihe ana-ahụ anya si dị. Ọ ghorọ ebe nchebe dị ukwuu mgbe Ụmụ Israel ji obi ha niile ná-efé Chineke ha n’eziokwu. N’oge dị otú ahụ Chineke na-ebibi onyeiro ahụ ma ọbụ chụghachị ya àzú tutu ọ ga-abịaru nso obodo ahụ ịgba-àkụ ya ma ọbụ ibu agha ọ bụla megide ya (Aisaia 37:33). Ọbụná asị na eji ndịagha nọchigide ya, ndịiro ahụ apụghị ịbata nime obodo ahụ oge niile ụmụ Chineke na-edebe okwukwe na ntụkwasị-obi ha na Ya.

Ihe ana-ahụ anya nke onye dere Abù Ọma na-akọwa na-egosi ihe ịmatụ mara mma banyere ihe nke mmụọ. Onye Kraist ọ bụla na-anọ nime ụwa a dịka ebe ewusiri ike nke eziomume megide ihe ọjọọ niile na ndị ajọomume niile bụ ndị ná-eme óké mkpatụ nime ụwa. Chineke akwadebeworo ndị Ya ihe agha nke mmụọ nime ụwa nke a, ndị niile yikwasịwo kwara ya ka enyere ike iguzogide na imeri kwa mmehie na ekwensu. Chineke agbawo ndị Ya ogige gburugburu, dịka Ọ gbara Job (Job 1:10). Ọ dịghị nsogbu, ahụhụ, ọnwụnwa, ma ọbụ ihe mmegide nke ga-abịkwasị nwa Chineke, ma ọ bụghị na Chineke kwenyere ka ihe ndịa niile gafee ogige ahụ wee bịarue nso ụmụ Ya, dịka O kwere ka ihe otiti ahụ bịakwasị Job, otú ọ dị, nwa Chineke ahụ ga-enwe mmeri ma ọ bụrụ na okwukwe na ntụkwasị-obi ya ná-eguzosiike n’ebe Nna nke Eluigwe nọ. Mgbe ọ bụla okwukwe na ntụkwasị-obi na-adịgide nime obi, ọ bụrụ kwa na obibi ndụ nke onye Kraist ahụ guzosiri ike, ndịiro apụghị ịkwada ebe ahụ ewusiri ike nke Chineke. Anyị na-emeribiga òkè site n’aka Onye ahụ nke hụrụ anyị n’anya (Ndi Rom 8:35-39).

Chineke nke mgbe Ebighị ebi

Ihe ọ bụla gbasara ụwa nke a nwere mmalite na ọgwụgwụ; ma Chineke ukwu ahụ Onye kèrè ụwa na ihe niile nke di nime ya. Na-adị “Site na mgbe ebigh-ebi rue mgbe ebigh-ebi.” O nweghị mmalite nke ụbọchị ma ọbụ ọgwụgwụ nke arọ. O siri ike ka mmadụ bụ anụ-arụ ghọta eziokwu a, nkekanke ma ọ bụrụ na agbapụtabeghị mkpụrụobi ya ma mee ka ya na Chineke nke Eluigwe ná-enwe mmekọrịta.

Na mbụ, ekèrè mmadụ n’onyinyo na oyiyi nke Chineke, ná-agbaghị kwa agụgọ, ndụ ebighị ebi bụ kwa otù nime ihe nketa ya. Ọ bụ na akụghị Osisi nke Ndụ nime Ubi Iden ahụ Agbara ogige? Chineke nyere mmadụ ahụ nke ná-enweghị mmehie ike iri mkpụrụ nke sitere n’osisi nke Ndụ ahụ. Otú ọ dị, mmehie batara n’obi nke mmadụ, wee chụpụ ya site n’Ubi ahụ Agbara ogige ma mee kwa ya ka o tụfuo mkwà na ngọzi niile nke Chineke kwadobeere ya nime ọnọdụ ya nke enweghị mmehie ọ bụla. Mmehie nke dị nime obi mmadụ gbanwere ụdị ebighị ebi nke anụ-arụ ya; n’ihi na Chineke adọworị aka-ná-ntị ná nnupuisi n’iwu Ya ga-eweta ọnwụ, ma ọnọdụ ebighị ebi nke mkpụrụobi mmadụ nke ná-adịghị anwụ anwụ ka ana-agbanweghị. Ọ na-adịgịde ndụ rue ọgbọ niile nke mgbe ebighị ebi. Ọnwụ nke anụ-arụ apụtaghị ọnwụ nke mkpụrụobi. Nwoke ahụ bụ Adam gbara aro 930 wee nwụọ n’ihi mmehie mbụ ahụ nke o mehiere. Ka arọ na-agabiga otú a kwa ka ogologo ndụ nke mmadụ n’ebelata. Onye dere Abù Ọma kwuru na ụmụ mmadụ ekwesịghị inwe olileanya ịdịgide ndụ n’ụwa karịa arọ 80, ma nke a bụ kwa eziokwu rue n’oge nke anyị.

Échìchè a niile dị ka ọ bụ isiokwu nke onye dere Abù Ọma nke iri iteghete bu n’obi. Chineke na-adịgide rue ebighị ebi, otú a kwa ka mkpụrụobi nke mmadụ ọ bụla dị. Otú mmadụ si bie ndụ ya mgbe ọ nọ n’ụwa, na mmeso nke obi ya n’ebe Chineke nọ, na omume ya niile n’ebe iwu Chineke dị, na-ekpebi ebe mkpụrụobi ya ga-anọ ebighị ebi. Onye dere Abù Ọma kwuwara nnọọ eziokwu ahụ nkeọma na ndụ mmadụ bụ ihe ná-adị nwa oge, na ọ ghaghị iwere ohere niile o nwere mgbe ọ dị n’okorọbịa chọọ iru na àmàrà nke Chineke. Ọ bụ náánị n’ebe a ka aga-enweta ezi ihe kachasị mma nke ndụ. Ụmụ mmadụ na-ebu ụzọ achọ inyeaka n’ebe ọzọ dị iche iche, ma ọ bụrụ na aga-achọta ezi afọ ojuju, aga-achọta ya náánị nime Chineke site na Jisọs Kraist na Ọbara nke Mkpuchi mmehie nke ọ wụsara n’elu Obe. “Si otú a me ka ayi mara iguta ubọchi ayi, ka ayi we me ka obi amam-ihe bia” (Abù Ọma 90:12). Ọbụná amamihe nke ụwa kwesịrị ịkụziri ụmụ mmadụ ịhụ na ọ baghị úrù ọ bụla ịga n’iru ịchọ ọñụ ahụ nke ná-adị nwa oge, ebe ọñụ kachasị ukwu nke mmadụ pụrụ ịmata bụ nzọpụta nke mkpụrụobi ya site ná mmehie -- ime ka ọ bata n’àmàrà na mnwekọ nke ya na Onye kèrè ya. Ọ bụghị náánị na mnwapụta a na-enye obiụtọ na afọ ojuju, kama ọ na-eweta ndụ ebighị ebi dịka mkwà ya kachasị ukwu nye obi ahụ nke kwesịrị ntụwasị-obi.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị mere nwa Chineke ji enwe obiike?
  2. Àrọ ole ka Chineke gbara?
  3. Ọ bụ arọ ole nke anyị na-apụta otù ụbọchị n’anya Chineke?
  4. Kọwaa otú onye dere Abù Ọma si kwue ihe banyere ogologo ndụ nke mmadụ.
  5. Ọ bụ arọ ole ka mmadụ na-adị ndụ dịka onye dere Abù Ọma kwuru?
  6. Òlee otú aga-esi were ogologo arọ ndụ ahụ tụnyere ogologo arọ ụmụ mmadụ na-adị ndụ n’ụwa taa?
  7. Òlee oge kwesịrị ná ndụ iji malite ịchọ àmàrà nke Chineke ná ndụ gị?