Ọlu Ndi-ozi 8:26-40.

Lesson 292 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ọ buru na I gēwere ọnu-gi kwuputa Jisus na Ọ bu Onye-nwe-ayi, ọ buru kwa na I gēwere obi gi kwere na Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, agāzọputa gi” (Ndi Rom 10:9).
Cross References

I Ijéozi Filip nye Onozi Etiopia ahụ

1. Mmụo ozi zipụrụ Filip n’ọzara ebe o zutere otù nwoke si Etiopia bịa, Ọlu Ndi-ozi 8:26-28

2. Mmụọ Nsọ gwara Filip ka ọ nọnyere nwoke ahụ nke nọ n’ụgbọ ala ahụ, Ọlu Ndi-ozi 8:29

3. Onozi ahụ na-agụ amụma eburu banyere Kraist, Ọlu Ndi-ozi 8:30-33; Aisaia 53:7, 8

4. Malite n’ihe eburu n’amụma Filip kwusaarà onozi ahụ ihe banyere Jisọs, Ọlu Ndi-ozi 8:34, 35

II Nchègharị na Ịwụ mmiri nke Onozi ahụ

1. Onozi ahụ rịọrọ ka awụọ ya mmiri na mmiri, nke ná-egosi na akụziworo ya ihe banyere iwu ahụ nke Jisọs, Ọlu Ndi-ozi 8:36

2. Agwara ya “Ọ buru na i ji obi-gi dum we kwere agēme gi,” Ọlu Ndi-ozi 8:37; 3:19; Mak 11:24; 16:15-18; Jọn 1:12; 3:14-16; 6:35; 12:46; Ndi Rom 1:16

3. Mgbe awụsịrị ya mmiri, onozi ahụ gara n’ụzọ ya ná-añụrị ọñụ, Ọlu Ndi-ozi 8:38-40; Ndi Rom 8:16; I Pita 1:8; Abù Ọma 51:12.

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Ịrapụ Ntute ahụ

Filip, onye mkwusa nke Oziọma ahụ, otù nime mmadụ asaa ahụ ná-ejere nzukọ Kraist ozi bụ onye arọpụtaworo n’oge gara aga ka o nyere Ndịozi ahụ aka, anọworị ná ntute ahụ dị ebube na Sameria. Ọtụtụ mmadụ ekwerewo kwa n’okwu Chineke nke Filip kwusara n’ebe ahụ wee ná-añụrị kwa nime ọñụ ọhụụ na udo nke ha chọtaworo. Chineke ejiwo kwa ha lụọ ọlụ n’ụzọ dị ebube idubà Ndị Sameria nime omimi nke eziokwu nke ime mmụọ ya na mnwapụta bara ụba n’ebe Chineke nọ. Mgbe ahụ Pita na Jọn alaghachịworị na Jerusalem, ọ bụ kwa n’oge a ka otù mmụọ ozi nke Onyenwe anyị gwara Filip okwu wee sị ya bilie ná-aga n’akụkụ ndịda.

Nke a abụghị ijè dị mfé bụ nke Chineke sịrị Filip jee, ebe amatara na ha na-eji ụkwụ aga ọtụtụ ebe ha chọrọ ịga. Filip ga agabiga kwa Jerusalem ọzọ bụ obodo nke ọ rapụworo n’oge ná-adịghị anya n’ihi ọtụtụ mkpagbu. Agwaghị anyị ma ya na Ndịozi kparitara ụkà n’ebe ahụ. Ihe niile anyị matara bụ na ọ ná-aga n’iru n’ijè ya n’ebe ndịda rue mgbe Chineke duuru ya jerue n’ụgbọ ala ahụ nke ná-ebu onozi Etiopia ahụ.

Ịchọta Chineke

Onye a nke ná-eje ozi n’ọchịchị ndị Etiopia jererị na Jerusalem ịkpọ isi-ala. Ọ bụ kwa nwoke nke ná-atụ egwù Chineke ma bụrụ kwa onye ná-achọsi ihe banyere Chineke ike karịa. Ma o nweghị ike ịchọta ihe nke ná-agụ obi ya site n’ememe niile nke òfùfè Ụlọukwu Chineke. Ọ bụ mmadụ ole bataworo n’ụlọ chọọchị jụrụ oyi nke jupụtara n’omen’ala ma ọbụghị náánị na ha rapụrụ ná-enweghị ihe eji aka na ịdà mbà nke obi n’ihi na Mmụọ Nsọ na ike nke Chineke adịghị n’ebe ahụ! N’oge gara aga n’akụkọ nke ndị Israel, ebube nke Chineke jupụtara Ụlọukwu Chineke na Jerusalem rue mgbe ndị nchụàjà ná-apụghị kwa iguzo n’ijéozi ha. Ọ bụ náánị oge ntà gafeworo tutu ọbịbịa nke onozi ahụ mgbe ndị nchụàjà nke Ụlọukwu Chineke duuru igwè mmadụ ndị tiri mkpu megide Jisọs sị “Kpọgide Ya n’obe.” Ha ajụwo Ọkpara Chineke! Iru Chineke anọnyeghị kwara ha ozọ. Chọọchị ọ bụla nke ná-enweghị Kraist nwụrụ anwụ nime Mmụọ. Otù aka ahụ ka ọ dị kwa n’ihe banyere obi mmadụ: oge niile Kraist na-abụ eze n’obi ọ na-ejupụta ná ndụ na olileanya nke ime mmụọ; ma mgbe ihe niile ọzọ chụpụrụ Kraist, obi ahụ na-anwụ nime mmụọ.

Mgbe agụụ Chineke na-agụ mmadụ, Onyenwe anyị na-achọ ụzọ dị iche iche izute mkpụrụobi ahụ. Anyị anatawo ọtụtụ akwụkwọ ozi site n’aka ndị chọtaworo akwụkwọ ndị Apostolic Faith bụ nke atụfuworo ọbụná n’ebe dị anya nke ụwa dịka diamond nke di n’ọhịa Ndịda America. Ha amataghị otú akwụkwọ niile ahụ si rute n’ebe ahụ achọtara ha ma ha gụrụ ha, site kwa n’eziokwu nke ha nwetara n’akwụkwọ niile ahụ, ha chọtara Chineke. Onyenwe anyị kpọpụtara Filip site ná ntute nke ná-aga n’iru ka otù onye a wee nwee nzọpụta. Chineke ga-ezipụ Eziokwu ahụ gaa gburugburu ụwa niile, ma ọ bụrụ na ọ dị mkpà, ka o rute otù onye nke ji obi eziokwu ná-achọ ụzọ ka mma isi bie ndụ.

Ịchọ Eziokwu ahụ

Aha ahụ nke bụ “onozi” ka ana-enye ndị ná-ejozi n’ụlọ ikpé ọ bụ ezie na ihe onozi pụtara ná nkọwa ya abụghị ihe metụtara ha. Nwoke a bụ onye ná-elekọta àkụ niile nke Kandesi, Ezenwanyị Etiopia. Ọ bụ nwoke atụkwasịrị-obi. Ma ọ na-achọ ihe ọ ga-eji mee ka afọ ju alaala obi ya. Ná-arụghịụka o nwere ọtụtụ ihe onwunwe nke ụwa nke a; ọ bụrụ kwa na ha nwere ike inye ya ojuju afọ nime ndụ ya ọ gaghi ejeworị Jerusalem ịkpọ isi-ala. Akpịrị ịkpọ nkụ nke mkpụrụobi na-eduru ụmụ mmadụ site n’otù ebe wee rue ebe ọzọ nime ịgbá mbọ ha inweta ojuju afọ nke ha na-achọ. Ọtụtụ mmadụ amataghị ihe ọ ga-ewe ha iji mejụọ akpịrị ịkpọ nkụ ahụ; ma ha ga-anwa ime ka afọ ju ha site n’ihe ụtọ dị iche iche nke ụwa nke a, náánị ihe ha na-achọpụta bụ na ihe niile nke ụwa pụrụ inye bụ ihe efu na ihe ná-adịghị adịgide. Ọ bụ náánị Chineke pụrụ imeju ma mee kwa ka obi mmadụ nke agụụ na-agụ nwee afọ ojuju.

Nke a abụghị mbụ anyị na-agụ ihe banyere onozi Etiopia nke bụ onye eziomume bụrụ kwa onye chọrọ ime uche Chineke. N’ọchịchị nke Zedekaia, mgbe ndị ọjọọ tụbara Jeremaia nime òlùlù ka o mikpuo nime apịtị, Ebed-melek, onozi Etiopia nke ụlọ eze, nụrụ ihe banyere ya wee were iruọma o nwere n’ebe eze nọ mee ka ewepụta Jeremaia site n’òlùlù ahụ. Ebed-melek tụdaara Jeremaia nkịrịka ákwà ochie dị nrò, ka o wee tinye ha na mkpá abụ ya abụọ iji mee ka ụdọ ahụ ghara imerụ ya arụ mgbe anadọpụta ya site n’òlùlù ahụ. Ọ dịghị ịkpá ókè agbụrụ nke dị n’obi nwoke ahụ n’ihi na akpụkpọ arụ nke onye Etiopia ahụ dị oji ma Jeremaia bụ onye Ju. Onozi ahụ hụrụ Jeremaia n’anya ná-asọpụkwara ya n’ihi na ọ bụ Onye amụma nke Chineke. Onye oji ahụ nyere aka ime ka onye Ju ahụ pụta nime òlùlù! N’ihe ọmụmụ nke ụbọchị taa, anyị chọpụtara na Filip, eleghịanya nke bụ onye Ju nke Grik, jere ijé dị ogologo ịkọrọ otù onye Etiopia akụkọ banyere Jisọs.

Ikwusa Jisọs

Mgbe Filip bịaruru ụgbọ ala ahụ nso, o wee nụ ka onozi ahụ na-agụ Aisaia isi iri ise na atọ ahụ dị ebube. Lee ụdị ohere ọma nke a bụ, ịkorọ nwoke a ihe banyere Jisọs! Filip ekweghị ka ohere ahụ funarị ya. Mgbe onozi ahụ gụrụ, “Esekpuru Ya, dika aturu, je ogbugbu; dika nwa-aturu da-kwa-ra ogbi n’iru onye nākpacha ya aji, otú a ka Ọ nādigh-asaghe ọnu-Ya,” ọ chọrọ ịmata onye Onye amụma ahụ na-ekwu ihe banyere ya. Filip weèrè otù isiokwu ahụ nke Akwụkwọ nsọ wee kwusaa ihe banyere Jisọs. Filip gosịrị onozi ahụ na Jisọs Kraist mezuru amụma niile eburu na Testament Ochie banyere Mesaia ahụ nke ekwere ná mkwà. Ọ dịghị obi abụọ ọ bụla dị na ya na o sitere na nke a wee kọwaa òzízí niile banyere okwukwe niile nke ndị Kraist. Ọmụmụ nke Jisọs, ndụ Ya, òzízí Ya, ọlụ ebube Ya niile, ahụhụ Ya, ọnwụ Ya, na mbiliten’ọnwụ Ya tinye kwara ememe nke ọwụwụ mmiri, aghaghị ịbụworị isiokwu niile nke dị ná mkparịta ụkà ha n’ụbọchị ahụ. Ọ bụ ohere dị ngọzi nye Filip, ná-enweghị kwa obi abụọ o kpebiri na ya aghaghị imetụ ihe niile ya nwere ike aka nime nkọwa ya niile n’ụbọchị ahụ n’ihi na eleghịanya ọ gaghị ahụ kwa onozi ahụ anya ọzọ.

Onozi ahụ kwenyere akụkọ ahụ dịka Filip si kọọ ya, ma mgbe ha bịaruru na mmiri, ọ chọrọ ka awụọ ya mmiri. Filip sịrị, “ọ buru na iji obi-gi dum we kwere, agēme gi.” Nke a gosipụtara nkeọma ná-ekwusi kwa ike na iji obi kwere bụ ihe ana aghaghị ime iji nweta nzọpụta. “Anēji obi kwere rue ezi omume; anēji kwa ọnu kwuputa rue nzọputa” (Ndi Rom 10:10). Onyenwe anyị bụ Onye ná-emeso obi, ọ dịghị kwa mgbanwe zuru òkè ná-adị ná ndụ ana-ahụ anya rue mgbe agbanwere obi. Mmadụ pụrụ ime ndozi na mgbanwe ụfọdụ ná-adịghị adịgide n’omume ya niile ma ya onwe ya abụghị “onye ekerè ọhụụ tutu rue mgbe Chineke gbaghaara njehie ya niile wee nye ya ike ibi ndụ karịa mmehie site n’Ọbara nke Jisọs. Onozi ahụ nwere okwukwe ahụ nke náesi ná mkpụrụobi epupụta, o wee chọọ kwa ka awụọ ya mmiri na mmiri. Jisọs sịrị, “Onye nke kwere, nke eme-kwa-ra ya baptizim, agāzọputa ya” (Mak 16:16).

Ọwụwụ mmiri nke Mmiri

Ọwụwụ mmiri nke mmiri bụ ihe ịrịba-àmà pụtara ìhè nke ná-egosi ọlụ alụworo nime obi. Mmadụ ụfọdụ na-eji náánị uche ha kwere ewe wụọ ha mmiri nke mmiri, ná-echè na mmiri ahụ ga-ehichapụ mmehie ha niile. Ma mgbe ná-adịghị anya ha na-achọpụta na ọ dịghị ọlụ mgbanwe nke alụworo n’obi ha na ha ka nọ kwa n’otù ọnọdụ anụ-arụ ahụ nke ha nọworo nime ya tutu awụọ ha mmiri. Ndịọzọ na-akụzi na ọwụwụ mmiri nke mmiri adịghị mkpà, ha na-arapụ kwa ya kpamkpam. Awụwọ kwa ndịọzọ mmiri mgbe ha ka bụ nnọọ ụmụntakịrị ha wee chee na ọwụwụ mmiri nke ahụ ezuwo. Ma Okwu Chineke na-akụziri anyị n’ebe o doro anya na anyị aghaghị ibu ụzọ kwere tutu awụọ anyị mmiri. Okwukwe nke akpọworo aha n’ebe a bụ okwukwe ahụ nke ná-eweta ọzịzá site n’Eluigwe, nke ná-agba àmà na agbagharawo onye ahụ mmehie ya niile, na ndụ ya agbanwewo kwa. Ihe ịrịba-àmà ga-eso kwa okwukwe dị otú ahụ, Mmụọ nke Chineke ga-agba kwa àmà na onye ahụ bụ nwa Chineke.

Otù aka ahụ kwa ọ dị ndị ná-adịghị achọ ka abịanye ha nime mmiri. Ha na-arọrọ ime ememe ahụ site n’ịwụkwasị ha mmiri n’isi mgbe ha na-egbunye ikpèrè nime mmiri. Ma nime Akwụkwọ nsọ anyị gụrụ, “Ma-ọbu ùnu amagh na ka ayi ra, bú ndi emere baptism ibà nime Kraist Jisus, emere ayi baptism ibà n’ọnwu-Ya? Ya mere esitere na baptism-ayi likọ ayi na ya ibà n’ọnwu-ahu: ka dika esitere n’ebube nke Nna-Ya me ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie, ka ayi onwe-ayi we jeghari kwa na ndu ọhu otú a. N’ihi na asi na ejiri oyiyi ọnwu-me ka ayi na Ya tokọ buru otù ihe, agēji kwa oyiyi nke nbilite-n’ọnwu Ya me ka ayi na Ya tokọ buru otù ihe” (Ndi Rom 6:3-5).

Ma Filip ma onozi ahụ bara nime mmiri. N’ebe ahụ ka Filip wụrụ onozi ahụ mmiri. Anyị matara na onozi ahụ echègharịwo n’ezie, n’ihi na ọ naaga n’ụzọ ya ná-añụrị ọñụ. O kwerewo ma rube kwa isi n’iwu nke Onyenwe anyị, ibuarọ ya agwụwo kwa. Nrubeisi a, n’onwe ya ga-enye ya ọñụ dị ukwu. Ihe ọ ná-enweghị ike ịchọta n’ememe èfù nke ịkpọ isi-ala n’Ụlọukwu Chineke dị na Jerusalem, nwoke nke Etiopia a chọtara ya n’ọzara n’ebe náánị otù onye mkwusa ná-akọrọ ya akụkọ banyere nzọpụta nke Chineke.

Ọ dịghị ndị ọbụ abụ azụrụ olu ha nkeọma nọ n’ebe ahụ ịbụ abụ otuto nke Chineke, ma ọñụ jupụtara n’obi ndịkom abụọ ahụ bụ ndị sọpụụrụ Chineke ma rube kwa isi n’iwu Ya niile n’ụbọchị okpom-ọkụ ahụ nime ọzara ná-ekpo ọkụ. Ọ dịghị ihe ngosi nke òfùfè ahaziri nkeọma nye onye ahụ nwere nchègharị n’ụbọchị ahụ mgbe agụụ eziokwu ahụ na-agụ obi ya, Chineke nọ n’ebe ahụ ikpughere ya na inyere ya aka ikwere na ịnata nzọpụta ahụ ekwere ná mkwà. Chineke adịghị anọgide náánị n’otù ebe. Ọ pụrụ ịlụọlụ ebe ọ bụla. Adịghị kwa egbochi Chineke n’ụzọ ọ bụla. Ọ pụrụ iji onye ọ bụla lụọ ọlụ bú onye ji obi nke agụụ naagụ ná-ekpe ekpere rue Oche eze Amàrà.

Jisọs gwara ndị ná-eso ụzọ Ya ka ha gaa n’ụwa niile kwusara ihe niile ekèreèkè Oziọma ahụ “nēme ha baptizim ba n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ nsọ” (Matiu 28:19; Mak 16:15). Ọ bụ ohere dị ebube irubeisi nye iwu na ụkpụrụ niile nke Chineke, anyị na-achọta kwa ezi ọñụ mgbe anyị mere otú ahụ. Onozi ahụ wee ná-aga n’ụzọ ya ná-añụrị ọñụ, otú a kwa ka ọ ga-adịrị onye Kraist ọ bụla nke ná-erubeisi n’iwu nke Jisọs ewee wụkwa ya mmiri nime mmiri n’oge ná-adịghị anya amụsịrị ya ọzọ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Ònye bụ Filip? Gịnị bụ kwa ọlụ enyere ya n’otù mgbe ka ọ lụọ?
  2. Gịnị ka Onyenwe anyị gwara Filip ka o mee n’oge a?
  3. Ònye ka Filip zutere n’ọzara ahụ?
  4. Gịnị bụ ebe ọgụgụ nke onozi ahụ na-agụ na Baịbụl? Ọ bụ kwa ihe banyere onye ka edere n’ebe ọgụgụ ahụ?
  5. Gịnị bụ ajụjụ nke onozi ahụ jụrụ Filip?
  6. Òlee otú Filip si zaa ajụjụ ahụ nke onozi jụrụ ya?
  7. Mgbe ha bịaruru na mmiri, gịnị ka onozi ahụ chọrọ ime?
  8. Kọwaa ụdị ọwụwụ mmiri nke Okwu Chineke kụziri.
  9. Òlee ndị tozuru òkè ịwụ mmiri nke mmiri? Gịnị mere ọwụwụ mmiri nke mmiri adịghị asachapụ mmehie?
  10. Gịnị ka ememe ọwụwụ mmiri nke mmiri pụtara ma ọbụ Ihe ịrịba-àmà nke dị na ya?