I Ndi Eze 13:1-34; 2 Ndi Eze 23:15-18.

Lesson 293 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ma Pita na ndi-ozi zara, si, Ayi aghagh ikweyere Chineke kari madu” (Ọlu Ndi-ozi 5:29).
Cross References

I Ebe Ịchụàjà nke Mmehie

1. Otù nwoke nke Chineke zigara bịaruru Betel ikwugide ebe ịchụàjà nke ikpere arụsị nke Jeroboam wuru, I Ndi Eze 13:1; Hosea 8:11

2. Onye nke Chineke ahụ buru amụma banyere mbibi nke gaje ịbịkwasị ebe ịchụàjà ahụ, enyekwara ihe ịrịba-àmà, I Ndi Eze 13:2, 3; Aisaia 7:14-16; Ọpupu 3:12; Matiu 1:23; Ọnu-ọgugu 12:8-10; Ọlu Ndi-ozi 13:9-11

3. Jeroboam guzogidere Onye amụma ahụ ma Chineke wee tie ya ihe otiti, I Ndi Eze 13:4, 5; Ọnu-ọgugu 12:8-10; Ọlu Ndi-ozi 13:9-11

4. Emere ka aka Jeroboam dị mma ọzọ site n’arịrịọ ekpere nke onye amụmụ ahụ, I Ndi Eze 13:6

II Nnupụisi

1. Onye amụma ahụ jụrụ nlekọta nke eze ahụ chọrọ ilekọta ya, I Ndi Eze 13:7-10; Abù Ọma 94:20; Ndi Efesọs 5:11; Ilu 23:6-8

2. Otù agadi nwoke nke Betel, site n’okwu ụgha dị iche iche, rụgidere Onye amụma ahụ ka ọ rapụ iwu nke Chineke nyere wee soro ya, I Ndi Eze 13:11-18; Matiu 26:74; Jenesis 27:18, 19; Luk 22:48

3. Onye amụma nke Chineke kwenyere okwu ụgha karịa okwu nke Chineke, I Ndi Eze 13:19; Taitọs 1:10-16; Matiu 15:7-9; I Timọti 1:6, 7; 4:2; 6:3-5; 2 Timọti 4:3, 4; 2 Pita 2:1-3

III Ikpé

1. Onye nke Chineke ahụ natara okwu nke Chineke na ọ gaghị eje ijé ya rue ọgwụgwụ n’ihi nnupụisi ya, I Ndi Eze 13:20-22; I Samuel 13:13, 14; 15:22, 23

2. Emere ka ikpé Chineke dakwasị onye nke Chineke ahụ, I Ndi Eze 13:23-25; Levitikọs 10:3; Ọnu-ọgugu 20:2, 24; I Samuel 4:18; Ọlu Ndi-ozi 5:1-10

3. Onyeamụma ụgha ahụ liri onye nke Chineke onye o kwupụtakwara na ọ bụ nwanna ya, I Ndi Eze 13:26-32

4. Ikpé nke Chineke dakwasịrị ebeịchụàjà nke Jeroboam na èzínaụlọ nke Jeroboam dịka ekwuworo yarịị, I Ndi Eze 23:15-18; Aisaia 46:5-11.

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Ikpere Arụsị na Nnupụisi

Ihe ọmụmụ anyị banyere ebe ịchụàjà Jeroboam na Onye amụma ahụ nke nupụrụisi nwere ihe bara urù nye onye Kraist n’ụbọchị taa. Nime ya anyị na amụta ọzọ na “Chineke abugh onye nēle madu anya n’iru” na ikpé Ya ga-eji ike dakwasị onye nke Ya nke na-eme mmehie megide Ya, dịka ọ ga-esi kwa dakwasị onye nke ná-ekpere arụsị. Okwu nke Samuel bụ Onye amụma mgbe ahụ o kwuru okwu megide Sọl n’ihi njehie ya n’okwu Chineke, dakọtara nnọọ nkeọma n’ihe ọmụmụ a: “Àjà-nsure-ọku na àjà ọzọ, hà nātọ JEHOVA utọ dika ige nti olu JEHOVA? Le, ige nti di nma kari ichu àjà, iña nti di nma kari abuba ebulu. N’ihi na nmehie nke iju-ase n’aka ndi-mọ ka nnupu-isi bu, ikpere-arusi na terafim ka isi-ike bu kwa” (I Samuel 15:22, 23).

Ihe ngosipụta abụọ pụtara ìhè banyere ikpé Chineke nime ihe ọmụmụ a kwesịrị ka arịba ha àmà, n’ihi na ha metụtara ụzọ mmehie ukwu abụọ jọgburu onwe ha: nke bụ ikpere arụsị na ilelị okwu nke Chineke. Anyị amụwo n’ihe ọmụmụ ụfọdụ gara aga ná adịghị anagide ikpere arụsị, n’ụdị ọ bụla, n’etiti ndị nke Chineke. Israel kwesịrị ịbụ “IHE NSỌ JEHOVA NWERE,” n’ihi nke a elereanya na ha ga-abụ ndị ewepụtara ichè nye Chineke na ọlụ Ya. Ọ dịghị ihe ọzọ Chineke pụrụ ime ma ọ bụghị ikwu okwu ikpé megide ụdị ikpere arụsị niile ahụ nke Jeroboam malitere. Ebe ịchụàjà nke ikpere arụsị ya ka o kpachaara anya ma kpebie kwa guzobe site n’isi ike nke obi ya ka o wee duhie Israel, isi n’òfùfè nke ịkpọ isi-ala nye Jehova pụta ka o wee mezuo ọchịchọ na nzube ya niile. Mgbe onye nke Chineke bịara itimkpu megide ebe ịchụàjà nke mmehie a, wee nye kwa ihe ịrịba-àmà iji gosi ikpé Chineke nke gaje ịbịa, nke a wee bụrụ ozi ikpe-azụ Chineke ziri eze ahụ nke dapụwororị, onye nọ kwa n’uche ajụrụ ajụ. Ana-ekwu ya mgbe niile na mmadụ ịdapụ n’àmàrà na-apụta ìhè n’ụzọ abụọ: nke mbụ, mmadụ na-arapụ Chineke ma n’ikpe-azụ Chineke arapụ mmadụ. Ikpé mmadụ ikpé na-abụ mmeso ikpe-azụ nke Chineke na-emeso ụmụ mmadụ; n’ebe Jeroboam nọ ụbọchị ebere abụrụwo ihe ná-agafe agafe.

Agaghị Arapụ Eziokwu kwenyere Ụgha

Chineke agwaworị onyeozi Ya sị, “erila nri, añu-kwa-la miri, alaghachi-kwa-la n’uzọ i siri je” mgbe ọ nọ ná-ezi ozi-ya. Mgbe eze ahụ chọrọ ka Onye amụma ahụ soro ya baa n’ụlọ ya, Onye amụma ahụ jụrụ ajụ, nke bụ kwa ụdị omume na ihe o kwesịrị ime. Ma ọ bụ nnọọ ihe mwuta na Onye amụma nke Chineke ahụ anọgideghị n’ọjụjụ nke ọ jụworo itinye aka n’oriri nke ndịa ná-ekpere arụsị. Onyenwe anyị ekwuwo sị, “Mgbe M’nāsi onye ezi omume, na ọ ghagh idi ndu; onye ahu ewe tukwasi obi n’ezi omume-ya, me ajọ omume, ezi omume-ya nile, agagh echeta ha; ma n’ajọ omume-ya nke o meworo, nime ya ka ọ gānwu” (Ezikel 33:13).

Otù agadi nwoke nke Betel jekwutere Onye amụma ahụ mgbe ọ ná-anọdụ ala n’okpuru osisi terebinth, ma site n’ịgwa ya okwu ụgha, agadi nwoke ahụ wee rụgide Onye amụma ahụ ka o soro ya laghachị. Irubeisi wee ghọọ mmehie! Mgbe Onye amụma ahụ na-eso nwoke ahụ n’oriri ya, okwu nke Chineke bịara ná-ekwu na ọ bụ ọnwụ ga-abụ ụgwọ ọlụ nke njehie ahụ. Onye nke Chineke a nke dabara n’okwu ụgha nke onye amụma ụgha a nwererị ike ọ gaghị abụ onye mbụ o duhiere, kama ọ bụ ezi ihe atụ nke ihe ná-abịakwasị mmadụ ahụ onye ná-arapụ eziokwu nke Chineke, wee kwere ma jeso kwa okwu ụgha. Otù nime ọtụtụ ụzọ nke ekwensu na-esi ebibi mkpụrụobi ọtụtụ mmadụ bụ inwogha onwe ha ka ha yie ndị ụkọ nke Kraist. Ọ na-abịa ọtụtụ mgbe dịka mmụọ ozi nke ìhè; ọ bụghị kwa ihe iju anya ma asị na ndị ná-ejere ya ozi na-eme kwa onwe ha ka ha yie ndị ná-eje ozi eziomume. (Lee 2 Ndi Kọrint 11:14, 15).

Nzuzu nke ijeso nrọ, ọhụ, ibu amụma, mkpughe, ihe dị iche iche, ma ọbụ ihe ọzọ dị iche iche ana-akpọ ngosipụta nke Mmụọ Chineke nke ana-ejighị Okwu Chineke tụlee nkeọma, aghaghị ịbụ ihe aga-ekwusi okwu ike banyere ha. Okwu Chineke bụ ihe kachasị elu, zuru òkè karịsia, bụrụ kwa njikọta nke mkpughe niile nke Chineke n’Onwe Ya ga-enye mmadụ banyere uche Ya rue mgbe Ọ gabịa ọzọ. “Ayi diri iwu, di, kwa-ra ihe-àmà: ọ buru na ha adigh-ekwu dika okwu a si di, n’ezie ọ digh chi-ọbubọ diri ha” (Aisaia 8:20).

Chineke na-edụ ndị Ya mgbe ụfọdụ n’ụzọ dị ebube na n’ụzọ karịrị nghọta mmadụ, dịka o dupụtara ndị Israel n’ala Ijipt site n’igweoji n’ehihie na ogidi ọkụ n’abalị; ma mgbe Ọ na-eji ihe ndịa ná-alụ ọlụ, ha na Okwu Chineke na-adakọrịta oge niile. Ana-enye Chineke otuto n’ihe ndịa; ọ dịghị mgbe ọ bụla ha na-emegide ihe niile Chineke kwuru nime Okwu Ya. Ìgwè ndị amụma ụgha gbasara n’ebe niile n’ụwa taa, ndị ná-ejere Setan ozi, ha dum na-ekwupụta na ha jupụtara n’onyinye dị iche iche nke Mmụọ Nsọ na amamihe pụrụ ichè banyere uche Chineke nke ana-edepụtaghị na Baịbụl. Ọtụtụ mmadụ ka eduhieworo, dịka Onye amụma nke dị n’ihe ọmụmụ anyị, n’ijeso ndị amụma ụgha ndịa a n’ihi akụkọ ọma na ire ụtọ ha.

Iso Mmebi Iwu nwekọ Ihe

Onye nke Chineke ahụ, site n’iwezuga onwe ya n’ihe Chineke nyere n’iwu wee jeso onye na-ekwu okwu ụgha, emeghị náánị mmehie kama o ketakwara òkè n’ajọomume nke onye òtù ya. O gosịrị ihe-àtụ pụtara ìhè site n’iketa òkè n’ihe oriri nke onye amụma ụgha a na iso ya nwekọọ ihe. Ọ na-emebi nkewapụ ahụ nke ezi arụ Kraist na-ekewapụ onweya site n’ihe ọ bụla gbagọrọ agbagọ nke jọkwara njọ nke ana-eme n’aha okpukpé. Ana-agwa ụmụ Chineke ka ha na ndị ọ bụla ghara inwe mmekọ bụ ndị na-ekwupụta n’egbgugbere ọnụ na ha bụ ndị ná-eso ụzọ Kraist ma ha abụghị. Pọl, degaara nzukọ nke dị n’Efesọs akwụkwọ, “Unu esola ọlụ nke ọchichiri nke nāmigh nkpuru nēnwekọ ihe, ma kama nke ahu nātu-kwa-nu ha nmehie-ha n’anya” (Ndi Efesọs 5:11). Jọn Onye ahụrụ n’anya degaara ndị nsọ niile akwụkwọ sị, “Ọ buru na onye ọ bula abiakute unu, ma o wetagh ozizi a, unu akpọbatala ya n’ulo, unu asi-kwa-la ya biri nke-ọma: n’ihi na onye nāsi ya biri nke ọma: nēso ya n’inwekọ ọlu-ya nile, nke bu ajọ ọlu” (2 Jọn 10, 11). (Gụọ kwa Ndi Galetia 1:8). N’ezie, agadi nwoke nke Betel ahụ ewetaghị eziokwu nye Onye amụma nke Chineke ahụ kama ụgha nke ya onwe ya chèpụtara.

Mgbe ọ bụla mmadụ matara eziokwu nke Chineke ma nabata okwu ụgha nke ekwensu n’ọnọdụ okwu Chineke ahụ, ọ na-esiri onye ahụ ike ịlaghachị n’ezi okwukwe ya nime Kraist. Ọ dị ọtụtụ amaokwu nke Akwụkwọnsọ nke ná-adọsi mmadụ aka-ná-ntị ike, banyere ihe egwù na ụgwọ ọlụ nke ga-adịrị ndị ná-arapụ ụzọ eziokwu nke Chineke wee jeso okwu ụgha niile nke setan. Chineke ebuwo ụzọ dọọ Onye amụma Ya aka-ná-ntị banyere ihe a nke pụrụ ime, ka ọ ghara ịbụ ihe ga-abịakwasị ya onwe ya; ọbụná dịka ọ dọrọ Adam na Iv akanántị n’Ogige Iden na n’ụbọchị ha ga-eri mkpụrụ nke osisi nke ịma ezi ihe na iheọjọọ, na ha aghaghị ịnwụ. Anyị matara site n’ihe ọmụmụ anyị na Onye amụma nke Chineke ahụ nabatara ịdọ aka-ná-ntị a, n’ihi na ọ jụrụ ile ọbịa nke Jeroboam chọrọ ile ya. Mgbe ná-adịghị anya ọ rapụrụ ịdọ aka-ná-ntị ahụ n’ihi na otù onye gwara ya na ya nwere ozi site n’ebe Chineke nọ banyere ya, nke ya onwe ya ná-anataghị.

Ọ bụ ezie na Chineke na-ekpughe uche Ya mgbe niile nye mmadụ ahụ nke o metụtara, site na Mmụọ Ya na Okwu Chineke, Ọ pụkwara ikpughe uche Ya nye anyị site na ndụm-ọdụ nke ndị ná-ejere Ya ozi. Ndị ná-ejere Chineke ozi bụ ndị etere mmanụ ịbụ ndị ọzụzụ atụrụ nke ìgwè atụrụ Chineke. Mgbe enwere okwu nke ná-agbagwoju anya nke ajụjụ ná-apụta kwa nime ya, enwere ike ịmata uche Chineke site n’ịchọ ndụm-ọdụ na ódúdú n’aka ndịozi nke Chineke.

Ịchọ ndụm-ọdụ nke ndị ná-ejere Chineke ozi bụ ihe ziri ezi dịka Okwu Chineke si dị. Pọl gwara ndịnsọ niile: “Nēkwenyenu ndi-isi unu, nēdo-kwa-nu onwe unu n’okpuru ha n’ihi na ndi ahu nāmu anya n’ihi nkpuru-obi-unu dika ndi gāza ajuju banyere unu; ka ha we were ọñụ me nka, ghara isu ude: n’ihi na nka gābu ihe nābagh unu urù” (Ndi Hibru 13:17). Otù okwu ndụm-ọdụ nke sitere na Testament Ochie ná-asị “Kwerenu na JEHOVA, bú Chineke-unu unu gēkwesi kwa ntukwasi-obi; kwerenu na ndi-amuma Ya, ihe gāga-kwa-ra unu nke-ọma” (2 Ihe Emere 20:20). (Gụọ kwa 2 Ndi Kọrint 10:8; 13:10; Ọlu Ndi-ozi 15:1-6). Okwu ndụm-ọdụ anyị natara n’aka ndị ná-ejere Chineke ozi ga-abụ nke ya na Okwu Chineke dakọtara, ma ọ ga-akacha mma oge ụfọdụ ma ọ bụrụ na agụpụtara anyị ya n’Okwu nke Chineke.

Ọ bụghị otú a ka ọ dị n’ebe Onye amụma nke Chineke ahụ nọ ma-ọlị. O zutere otù onye nke ọ ná-amaghị onye gwara ya na ya bụ onye nke Chineke. Ọ pụtara ìhè na Onye amụma nke Chineke ahụ nabatara okwu nke nwoke a ná-emeghị ihe ọ bụla iji tulee ma ọbụ eziokwu ka onye ọbịa ahụ na agwa ya. Onye nsọ nke Chineke agaghị ịbụ onye nwere ike ịtule ma chọpụta kwa ihe bụ eziokwu na okwu ugha. Mmụọ nke Chineke na Baịbụl bụ ndị ndú abụọ ná-adịghị aghaagha nime ụwa nke onyensọ nke Chineke nwere ike iji chọpụta olu na uche Onyenwe ya. Chineke na-achọ ka anyị gee Mmụọ Chineke ma were kwa Okwu Chineke ná-anwale ndị ahụ ná-abịakute anyị n’ụzọ dị otú a, ka anyị wee mata onye anyị ga-anabata na onye anyị ga-ajụ. Na mkpụrụobi rapụrụ uche Chineke nke ọ mataworo na mbụ bụ nzuzu kachasị ibe ya. O kwesịrị ịtụle ike na eziokwu nke ozi ọ bụla ná-abịakute ya. Ọ bụrụ na ịgba-àmà na ódúdú nke Mmụọ Chineke bụ ihe eledara anya ma nupụkwara isi, Mmụọ Chineke ga-arupụ mkpụrụobi ahụ, mkpụrụobi ahụ ga-abụrụ ekwensu ihe oriri. (Gụọ 2 Timọti 2:26)

Ihe ọjọọ nke ụmụ mmadụ n’ụbọchị ndịa nke bụ mmadụ ịrapụ eziokwu na ndụm-ọdụ na ódúdú nke Chineke, wee ná-egentị n’okwu ụgha nke ndị amụma ụgha, ga-eweta ihe ubi jọgburu onwe-ya. Òzízí ụgha ga-agbasa ebe dum n’òzùzù òkè ya na mgbe ọchịchị nke Onye ahụ ná-emegide Kraist n’oge Óké Mkpagbu ahụ. Onye ahụ nke ná-emegide Kraist ga-ekwupụta na ya onwe-ya bụ Chineke, ụmụ mmadụ ga-ekwere kwa ya. Baịbụl na-ekwu sị: “N’ihi na ha anatagh ihu-n’anya nke ezi-okwu nke-ọma ka ewe zọpụta ha … Chineke nēzite-kwa-ra ha ilusi-ọlu-ike nke njehie, ka ha kwere ugha ahụ: ka ewe kpe ha nile ikpe, bu ndi nēkwegh eziokwu, kama ajọ omume diri ha ezi nma” ( 2 Ndi Tesalọnaika 2:10-12). N’ihi na ụmụ mmadụ rapụrụ eziokwu, Chineke ga-eme ka ha kwere okwu ụgha, ka ha wee nata ọmụma ikpé ziri ezi. Ebe ha ná-achọghị iso Kraist, aga-eme ka ha jeere setan ozi (Gụọ Aịsaia 8:6-8)

Anyi amataghị otú nghọta nke Onye amụma Chineke ahụ ra banyere iso ndị òzízí ụgha ná-enwekọ ihe, kama Chineke adọwo ya aka-ná-ntị banyere ịnọdụ-ala na iso onye ọ bụla rikọọ ihe n’ala ahụ. Ịdọ aka-ná-ntị ahụ nke Chineke dọrọ ya ezuwo iduzi ya, ọ ga-ezuwọrị ókè ma ọ bụrụ na Onye amụma nke Chineke ahụ rubere Ya isi. Chineke abụghị onye ajọomume ma ọbụ onye ná-enweghị obi ebere. Mgbe ọdụm dọgburu onye nke Chineke ahụ, nke ahụ bụ ikpé ziri ezi nke Chineke. Isoro onye amụma ụgha ahụ nwekọọ ihe bụ nnọọ óké njehie dị ukwuu n’ebe iwu niile nke Chineke nyere ya dị nke mere na ikpé Chineke dakwasịrị ya n’ihi nnupụisi ya.

Ịgbakwasị ukwuu n’obiebere nke Chineke wee kpachara anya daba nime mmehie bụ njehie dị ukwuu. Onye dere Abù Ọma kpere ekpere ka ewezuga ya n’ụdị mmehie a jọgburu onwe ya (Abú Ọma 19:13). Ma n’ụbọchị ndịa mgbe ọ fọdụrụ náánị nwa oge Jisọs abịaghachị n’ụwa, ọ dị ka ụmụ mmadụ enweghị egwù ọ bụla banyere ikpé Chineke n’ebe mmehie nganga a dị. Ọtụtụ ná-akpachara anya nábata ma ná-enye kwa aka ikwusa òzízí ụgha, ha ewee si n’ụzọ dị otú a daba n’ọnyà nke ekwensu, ha ga-enwe kwa, ụdị ikpé ọmụma dị otú a n’ikpé-azu

N’ụbọchị ikpé-azụ ndịa, mgbe ụdị okpukpé dị ịche iche na abaụbá -- ndị ka n’ọnụ ọgụgụ nime ha bụ kwa amamihe ụwa na nchèpụta nke ụmụ mmadụ -- Onye nke Kraist ga-eme nkeọma n’isoro ihe-átụ nke ndị nsọ nke Chineke ndị nụrụ mkwusa nke Pọl. Ha lara n’ụlọ ha “nēnyocha ihe nile edeworo n’akwukwọ nsọ kwa-ụbọchị, ma ihe ndia di otú a” (Ọlu Ndi-ozi 17:11). Anyị ga-enwe ntụkwasịobi na udo nke obi n’okwu nke Jisọs nke sịrị na “ Ọ buru na onye ọ bula achọ ime ihe Ọ nāchọ, ọ gamara ihe òzízí a bu, ma o sitere n’aka Chineke, ma-ọbu na Mu Onwem nēkwu site n’Onwem” (Jọn 7:17). Mkpụrụobi ahụ nke ná-achọsiike ịmara uche nke Chineke na eziokwu Chineke ga-anụ olu Chineke, agaghị kwa eduhie ya, ma onye ahụ nke ná-ege onye ọ bụla nke ná-ebugharị akụkọ ntị bụ onye ná-ekwupụta kwa na ya bụ onye nke Kraist, ná-ebughị ụzọ were Mmụọ Nsọ na Okwu nke Chineke tụlee mmụọ ndị ahụ, gaabụ onye elomiri ngwangwa n’ọnyà nke ekwensu.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị mere Onye amụma ahụ ji bịa ịkpọ mkpu megide ebe ichụaja Jeroboam?
  2. Òlee ụdị iheọjọọ ahụ nke adọrọ anyi aka-ná-ntị banyere ha n’ihe ọmụmụ a?
  3. Gịnị mere onye nke Chineke ahụ ji nupụisi n’iwu nke Chineke?
  4. Gịnị mere ikpé Chineke jiri dakwasị onye nke Chineke a?
  5. Òlee otú onye nke Kraist ga-esi mata onye sitere n’ebe Chineke nọ bịa n’ezie na onye ná-esiteghị n’ebe Ọ nọ?
  6. Gịnị ga-eme mkpụrụobi ahụ ná-arapụ eziokwu nke Chineke wee kwere okwu ụgha?
  7. Gịnị ga-eme ka ụmụ mmadụ kwere okwu ụgha n’ụbọchị ikpé-azụ a kama ikwere eziokwu?
  8. Gịnị ka Baịbụl ná-agwa anyi banyere iso ndị amụma ụgha ná-enwekọ ihe?