I Ndi Eze 14:1-20

Lesson 294 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “ Ụzọ di nke ziri ezi n’iru madụ ma nsọtu-ya bụ ụzọ nile nke ọnwu” (Ilu 14:12).
Cross References

I Nduhie ahụ nke Agbalịrị Iduhie

1. Jeroboam zigara nwunye ya n’ụzọ aghụghọ jekwuru Ahaija ịjụ àsè banyere nwa ya nwoke nke arụ ná-adịghị ike, I Ndi Eze 14:1, 2

2. Nwunye Jeroboam weere onyinye jekwuru Onye amụma ahụ, I Ndi Eze 14:3, 4

3. Chineke gwara Ahaija na nwunye Jeroboam ná-abịa ma tinye kwa ọzịzá n’ọnụ ya, I Ndi Eze 14:5, 6

II Ikpé Chineke Megide Jeroboam

1. Jehova bụ Chineke adọkapụwo alaeze Israel site n’ụlọ Devid, wee bulie kwa Jeroboam elu ịbụ eze, I Ndi Eze 14:7, 8

2. Jeroboam edebeghị iwu niile nke Chineke, kama o mere iheọjọọ karịa ndị niile buru ya ụzọ, I Ndi Eze 14:9

3. Chineke kwuwapụtara ikpé zuru òkè megide ụlọ Jeroboam, I Ndi Eze 14:10, 11

4. Nwata ahụ arụ ná-adịghị ike nwụrụ, ma ndị Israel ruuru ya ujù wee lie kwa ya, I Ndi Eze 14:12-14, 17, 18

III Amụma Eburu Banyere Mgbasasị Nke Ndị Israel

1. Ụmụ Israel gbasoro mmehie niile nke Jeroboam; n’ihi nke a Chineke kwuru okwu banyere nropụ ha site n’ala ha mgbe oge ahụ ákà-erughị, I Ndi Eze 14;15, 16

2. Jeroboam, onye ahụ mere ka Ụmụ Israel mehie, sooro nna ya ha dina n’ọnwụ, I Ndi Eze 14:19, 20

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

“O gēru kwa, ọ buru na i nu ihe nile M’gēnye gi n’iwu, ọ buru kwa na i je ije n’uzọm nile, me ihe ziri ezi n’anyam, idebe ukpurum nile na ihe nile M’nyere n’iwu, dika Devid bú orùm mere; na M’gānọyere gi, wu-kwa-ra gi ulo kwesiri ntukwasi-obi, dika M’wuru Devid, M’gēnye kwa gi Israel” (I Ndi Eze 11:38). Chineke mezuru okwu a n’ebe Jeroboam nọ site nime ya eze nke ebo iri nke Ụmụ Israel, ma Jeroboam jụrụ nnọọ kpamkpam imezu akụkụ nke ya n’ọgbụgbandụ ahụ. Ma ugbu a nwa ya nwoke bụ Abaija, onye ana-ele anya dịka nwa-eze nke ga-achị Israel n’ọdịn’iru ná-arịa ọrịa; ma ọ dịghị ihe ọ bụla apụrụ ime nke ga-eweta ọgwụgwọ. Ná-agbanyeghị mgbalị ha niile iji nápụta nwatakịrị ahụ, ọnọdụ ya wee ná-adị njọ karịa.

Nime Ọnọdụ nke Enweghị Olileanya

Nime ọnọdụ ya nke enweghị olileanya, Jeroboam kpebiri izigara Ahaija Onye amụma nke meworo agadi ozi bụ onye ziworo yarịị ozi na ọ gaje ịbụ eze. Jeroboam tụrụ egwù ijekwuru Onye amụma ahụ n’onwe ya, n’ihi na o jeghị ijè na ndụm-ọdụ nke Chineke bụ nke Onye amụma ahụ gwara yarịị, Jeroboam achọghị kwa ịnụ ịbámbá ya dị ike. Nwunye Jeroboam ga-abụ onye kwesịrị ijé ozi a, dịka o chere, n’ihi na ọ dịghị onye ọzọ achọrọ ka ọ mara ihe banyere ozi nzuzo a ma ọ bụghị náánị ndị èzínaụlọ ahụ. Ọ bụ ezie na nwa ya nwoke ná-arịa ọrịa ịnwụ anwụ, ọ dị kwa mkpà ka nne ya nọdụ n’ụlọ ilekọta nwatakịrị ahụ, ma otú ọ dị, ozi a bụ ihe dị mkpà nke ukwu nke mere na ọ ghaghị ịrapụ ọlụ niile dịrị ya n’ụlọ ijekwuru Onye amụma ahụ. Ma ọ gaghị eje dịka nwunye Jeroboam -- ọ ghaghị inwogharị onwe ya. Ọ bụrụ na ndị Israel amata na nwunye Jeroboam na ejekwuru Onye amụma nke Chineke maka ndụm-ọdụ, ha ga-amata na chi niile nke Jeroboam apụghị inyere ya aka n’oge óké mkpà. Ọzọ, ọ bụrụ na amata onye ọ bụ, Jeroboam tụrụ egwù na ọzịzá nke aga-enye ya site n’aka Chineke nwere ike ọ gaghị adịmma, n’ihi mmehie niile nke Jeroboam.

Ewo, lee nzúzú nke mmadụ! Chineke Ọ pụrụ ileba anya n’ihe omimi zoroezo nke ọdịn’iru, ịkọwa ma nwatakịrị ahụ ọ ga-adị ndụ ma ọbụ na ọ ga-anwụ, ma ọ gaghị enwe ike ịmata onye ahụ ná-ajụ àsè, asịkwarị na onye ahụ nwogharịrị onwe ya? Ihe ọmụmá Chineke gafere okwu ọnụ nke ụmụ mmadụ, n’ihi na Ọ bụ Onye nwere ike ịtụpụta échìchè na ìzù niile nke obi. “Ọ dịgh kwa ihe èkèrè èkè nke nāputagh ìhè n’iru Ya: kama ihe niile gba ọtọ buru kwa ihe emegheworo n’anya Ya, bú onye ayi gākọrọ akukọ banyere omume ayi” (Ndi Hibru 4:13).

Ekpere

Chineke bụ Chineke nke ná-anụ ma náaza kwa ekpere, nkekanke mgbe ekpere niile ahụ na-abịakute Ya site n’alaala obi nke ziri ezi na nke eziokwu. Ndị mmehie ndị ná-abịakute Chineke aghaghị ịmara na ekpere ahụ nke onye ná-echègharị echègharị, “Chineke, ka obi Gi juru n’ebe mu, bu onye nmehie, nọ,” na mgbe eji okwukwe kpe ya, ga eweta ọzịzá dị mma. Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe ndị ná-adịghị asọpụrụ Chineke ekpewo ekpere site n’ọchịchọ onwe onye, ma ọbụ site ná nzube nke ná-adịghị nsọ, ma ọbụ site n’ọchịchọ dị iche iche nke anụ-arụ. Edewo ihe banyere ọzịzá nke ụdị ekpere ndịa na Baịbụl, ma ihe ha na akụzi ka edepụtara n’ụzọ ana-apụghị ihichapụ ya. Ọ bụrụ na ekpere anyị abụghị ihe eji obi eziokwu na ezi nzube kpee, ọ ka mma na ekpeghị ya ma ọlị.

Ná-agbaghị agụgọ ozi ahụ nke Jeroboam zigaara Onye amụma ahụ bụ ekpere, ma ọ bụghị n’obi eziokwu. Ọ chọghị inyeaka nke Chineke n’ụzọ ọ bụla -- ọ chọrọ náánị ịmara ma nwa ahụ ọ ga-adị ndụ ma ọbụ na ọ ga-anwụ. Ahaija ekwurworị na Chineke ga-ewu ụlọ kwesịrị ntụkwasị-obi ná mkwụghachị ụgwọ ọlụ n’ihi nrubeisi. Jeroboam nọgidesịrị ike n’olile-anya ahụ nke atụfuworo, ma ihe niile ọ pụrụ ịhụ n’àzụ ya mgbe ọ na-aga n’ụzọ bụ nnupụisi. Hezekaia jiri obi eziokwu kpee ekpere mgbe ọnwụ cheere ya iru: “JEHOVA, biko cheta otú m’jeghariworo n’iru Gi n’ezi-okwu na n’obi zuru òkè, ọ bu kwa ihe di nma n’anya-Gi ka m’meworo” (Aisaia 38:3). Ma Jeroboam jiri nwayọ daghachị àzụ ná-ekwughị ihe ọ bụla banyere omume ya n’oge gara aga, n’ihi na ndụ mmehie ahụ aghaghị ịma ya ikpé. Otú ọ dị, ọ dịghị onye mmehie ma ọbụ mmehie ọ bụla nke apụrụ izopụ n’anya nnyocha nke Chineke anyị bụ Onye eziomume.

Jeroboam nwere ịhụn’anya dị ukwu n’ebe nwa ya nwoke nọ; ma ọ bụ ihe ijuanya na ọ ghọtaghị na Chineke ji ọrịa nwatakịrị a nke ahụrụ n’anya ná-akpo ya ka ọ bịarue ná nchègharị. Ọ bụrụ na o meghere obi ya n’ezi nchègharị, ma rịọ kwa Onye amụma ahụ ka o nyere ya aka n’ekpere ịpụta n’ọnọdụ a jọgburu onwe ya, ná-agbaghị agụgọ, Chineke ga-anụwọrị ekpere niile ahụ ma gwọọ kwa nwatakịrị ahụ dịka Ọ gwọrọ aka Jeroboam n’oge gara aga. Ma dịka ihe otù onye ná-ede akwụkwọ kwuworo, ọtụtụ mmadụ ná-achọsi ike ka agwá ha iheọma nke ga-emere ha karịa ịgwa ha iheọjọọ ha mere maọbụ ọlụ dịrị ha ịlụ. Ọ ga-adịwororị Jeroboam mfé ịgbanarị ọdịn’iru ya nke gbara ọchịchịrị ma ọ bụrụ na ọ rọọrọ ijé ijè dịka ndụm-ọdụ niile nke Chineke si dị. Ụzọ abụọ ghere oghe nye onye ọ bụla taa: “Obosara ka ọnu-uzọ ahụ di, mbara ka uzọ ahu di kwa, nke nēduba n’ila-n’íyì, ọtutu ka ha di kwa, bú ndi nēsi na ya nābà, n’ihi na warara ka ọnu-uzọ ahu di, mkpagide ka uzọ ahu di kwa, nke nēdubà ná ndu, ole-na-ole ka ha di kwa, bú ndi nāchọta ya” (Matiu 7:13, 14). Ihe anyị rọọrọ ga-ekpebi ebe anyị ga-anọ ebighị ebi. Gịnị mere ị gaghị esi n’ọnụ ụzọ ahụ dị warara baa n’ụzọ ahụ nke ná-eduba ná ndụ na ọgan’iru nke ná-eguzosi ike?

Nzùzù nke Amamihe Mmadụ

Jeroboam nwererị àtụmààtụ dị iche iche nke onwe ya iji mee ka ala-eze ya guzosie ike ma bụrụ kwa nke nwere ọgan’iru. Ọ dịghị urù ọ bụla ọ hụrụ n’ịtụkwasị Chineke dị ndụ obi bụ Onye nyeworo ndị Israel n’aka ya, amamihe ụwa kwuru sị ka okwukwe dị n’ụdị ihe apụrụ ịhụ anya na ihe dị ike. Otù nime ihe niile Jeroboam mere ná mmalite nke ọchịchị ya bụ ime ka obodo Shekem na Penuel bụrụ ebe ewusiri ike. O chère na ya nwere nchebe n’ebe agbara mgbidi gburugburu karịa nke ọ pụrụ inweta n’ịtụkwasị obi n’ike nke Jehova, ebe ọ ná-amụtabeghị eziokwu ahụ na nchebe dị ukwu dị n’ala nke ana-agbaghị mgbidi gburugburu mgbe ana-atụkwasị-obi n’ike nke Chineke karịa nke apụrụ inwe n’ike niile ejikọtara ọnụ nke ebe ewusiri ike nke ụwa maara. Jeroboam chọrọ ime ka ala-eze ya dị ike, n’ihi nke a o wezugara onwe ya na ndụm-ọdụ nke Chineke ahụ náadị ebighị ebi wee tụkwasịobi ya n’obodo dị iche iche nke eji ihe ná-alan’íyì wuo. Ugbu a, Jeroboam chọrọ inyeaka n’oge olileanya ya gwụsịworo, ọ dịghị inyeaka ọ bụla dịrị ya site n’ebe Chineke nọ.

Ndị ụwa ka na-eme kwa ụdị ihe nzùzù dị otú a. Ha ná-achọ ọgan’iru, obiụtọ, arụ-ike, na ogologo ndụ n’ụzọ niile nke ha chèpụtara n’obi ha, ma ha rapụrụ ụzọ ahụ ziri ezi. Chineke ekwuwo ya otú o doro anya sị: “Onye ahu nke nāchọ ihu ndu n’anya, na ihu ezi ubọchi, ya me ka ire ya ghara ikwu ihe ọjọ, me kwa ka egbugbere-ọnu ya ghara ikwu okwu aghughọ: ya si kwa n’ihe ọjọ wezuga onwe ya, me ezi ihe; ya chọ udo, gbaso kwa ya. N’ihi na anya abua nke Onye-nwe-ayi di n’aru ndi ezi omume, nti-Ya abua di kwa n’ebe aririọ ha di” (I Pita 3:10-12). Nke a bụ ụzọ nke Obe ahụ, ụzọ nke Onye Kraist, ụzọ nke Jisọs Kraist -- ụzọ nke ná-edubà n’Otuto. Jisọs bịara n’ụwa ka ụmụ mmadụ wee nwee ndụ, na “ka ha nwebiga kwa ya ókè”; ma lee otú o si bụrụ mmadụ olenaole bụ ndị jikere ịga n’ụzọ ahụ nke ná-eweta ezi ọñụ zuru òkè nke okwu ọnụ mmadụ ná-apụghị ịkọwa!

Ozi nke Siri ike

Nwunye Jeroboam bịakutere Ahaija bụ Onye amụma ná nwogharị o nwogharịrị onwe ya. Ọ dịghị otù onye n’obodo ahụ niile nke matara eze nwanyị ahụ; Ahaija agaghị achọpụtaworọ n’onwe ya, n’ihi na anya ya adịghị ahụzi ụzọ nkeọma n’ihi na ọ ghọwo agadi; ma Chineke gwara Ahaija na nwanyị ahụ ná-abịa ọbụná tutu ọ bịaruo n’ọnụ-ụzọ. Ngwangwa anụrụ nzọ ụkwụ ya, Ahaija wee sị “Bata, nwunye Jeroboam; n’ihi gini kwa ka gi onwe-gi nēme onwe-gi dika onye ala ọzọ? ma mu onwem bu onye-ozi siri ike n’ebe i nọ.”

Ọtụtụ mmadụ aghọgbuwo ibe ha site ná ngosi nke okpukpé jupụtara ná nduhie na iruabụọ. Ha enwogharịwo omume ha mgbe ha nọ n’etiti ụmụ mmadụ rue mgbe ndị ụwa kpọrọ ha ndị nke Kraist. Ọtụtụ mmadụ nwere ike ikwu ihe banyere Baịbụl na isiokwu dị iche iche nkeọma dịka onye mụrụ ihe ọmụmụ ukwu dị nime Baịbụl (Theologian). Ọ dị ọtụtụ mmadụ nime ụwa ndị ná-egosi onwe ha dịka ha bụ ụmụ Chineke, ebe ana-amụbatabeghị ha nime ézínaụlọ nke Chineke site n’ọmụmụ ọhụụ ahụ dị mkpà nke Jisọs kụziri Nikọdimọs. (Lee Jọn 3:1-21). Chineke na-ahụ gafee ákwà mgbochị nke mnwogharị -- Ọ dịghị ele ihe ana-ahụ anya kama Ọ na-ele obi. Ọ bụrụ na awụsawo Ọbara Jisọs Kraist nime obi, ihe niile ezuwo; ma ọ bụrụ na Ọbara ahụ adịghị na ya, ọ bụ ihe doro anya na ozi siri ike ga-ada ná ntị ha: “Puanu n’irum, ndi anābu ọnu, ga n’ọku ebigh-ebi ahu nke edoziworo nye ekwensu na ndi-mọ-ozi-ya” (Matiu 25:41).

Ahaija gwara nwunye Jeroboam eziokwu ahụ nke gaje imezu. Ozi ya adịghị ogologo, kama o kwuru banyere ọgwụgwụ nke ọchịchị Jeroboam na nke ézínaụlọ ya. Nwa ya nwoke ahụ nke ná-arịa ọrịa aghaghị ịnwụ ngwangwa nne ya batara nime obodo ya. Jehova Chineke nke Israel hụrụ ụfọdụ ihe dị mma nime obi nwatakirị ahụ banyere Ya onwe Ya; n’ihi nke a, Chineke wee mee ka ndị ahụ tieere ya aka n’obi n’ihi ọnwụ ya ma lie kwa ya òlìlì dị mma; ma ndị niile ọzọ fọdụrụ n’ézínaụlọ Jeroboam zutere ọnwụ mberede dị iche iche nke ọ ná-adịghị kwa onye ọ bụla liri ha ma ọlị. Nhụjuanya ndịa niile sitere ná mmehie niile na nnupụisi nke Jeroboam megide Chineke. Eziokwu ahụ ná-eguzosi ike: na aga-ebibi mmadu niile n’otù n’otù, èzínaụlọ dị iche iche ma ọ bụrụ na ha anọgidesie ike ná mmehie ha.

Ọ bụ ná mmanye?

Okwu nke Jehova site n’ọnụ Ahaija jikọtara ọtụtụ ihe karịa náánị ikpé nke ụlọ Jeroboam. Chineke chetakwara mmehie nke Ụmụ Israel n’otù oge ahụ. Jeroboam eguzobeworị ụmụehi ọla-edo ahụ, Ụmụ Israel kpachaara anya soro ụzọ ka mfé, ọ bụ ezie na ha maara na ime otú ahụ bụ imebi iwu Chineke. Ahaija bụ otù onye nime ọtụtụ ndị amụma mbụ buru amụma banyere mgbasasị nke Ụmụ Israel n’ihi mmehie ndịa Ụmụ Israel agaghị kwa enwe udo, kama ha ga-adị ka ahịhịa nke ná-erugharị n’elu mmiri -- nime ọgba aghara mgbe niile wee ná-agbagharị kwa iru na àzụ mgbe niile. N’ikpe-azụ aga-achụsasị ha gafee ókè osimiri. Ọnụ Jehova ekwuwo ya; nime ọtụtụ arọ ná-esonị emezuru amụma ahụ dịka edeworo ya.

Eleghịanya Ụmụ Israel tara Jeroboam ụta n’ihi ọnọdụ ha. Ọ bụ na ọ bụghị ya dubàra ha ná mmehie? Òlee ndị sooro n’ime mmehie ahụ? Chineke tụkwasịrị ikpé nke mmehie n’isi ndị ikpé ya mara. Ọtụtụ puku ngọpụ banyere mmehie ka ana-anụ kwa ụbọchị. Ụfọdụ mmadụ ná-ata otù ihe ụta n’ihi mmehie ha, ndịọzọ ná-ata kwa ihe ọzọ ụta. Agaghị atụkwasị ụgwọ ọlụ ya n’isi onye ọzọ. Ọbara nke Jisọs ewetawo ọgwụgwọ nye mmehie nke onye ọ bụla, Chineke ná-enye kwa onye ahụ nke ná-esogide Ya ike ibi ndụ karịa mmehie “Onye nēmeri emeri, ya ka M’gēkwenye ka o som nọdu ala n’oche-ezem,.dika Mu onwem meri-kwa-ra, we so Nnam nọdu ala n’oche-eze-Ya” (Nkpughe 3:21).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị mere ọrịa nwa nwoke Jeroboam jiri metụta ya nke ukwu?
  2. Gịni mere nwunye Jeroboam jiri nwogharịa onwe ya mgbe ọ na-ejekwuru Onye amụma nke Chineke?
  3. Mnwogharị ahụ o duhiere Onye amụma ahụ?
  4. Ònye zaghaghiri Jerobaom ajụjụ ya, Onye amụma ka ọ bụ Jehova?
  5. Gịnị bụ amamikpé dị egwù nke atụkwasịrị nime nzaghachi ajụjụ a?
  6. Gịnị mere ejiri kwupụta amam-ikpé a megide Jeroboam na ụlọ ya?
  7. Gịnị bụ ụgwọ ọlụ enyere Abaija n’ihi ezi ihe ahụ nke ahụworo nime ya?
  8. Òlee otú ihe si dịrị Ụmụ Israel n’ihi mmehie ha mere megide Jehova?
  9. Oge ra añaa ka okwu Jehova kwuru site n’ọnụ Onye amụma nọrọ tutu o mezuo?