Lesson 295 - Senior
Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “JEHOVA nọyere unu, mgbe unu nọyere Ya; ọ burukwa na unu achọ Ya, Ọ gēme ka unu chọta Ya: ma ọ buru na unu arapu Ya, Ọ gārapu kwa unu” (2 Ihe Emere 15:2).Cross References
I Ezi Mmalite Nke Esa
1. O mebiri ikpere arụsị, 2 Ihe Emere 14:1-3; 15:8, 16, 17
2. Ọ dụrụ ndị Juda ọdụ ka ha chọọ Chineke, 2 Ihe Emere 14:4
3. O nyere Chineke ọla-ọcha na ọla-edo, 2 Ihe Emere 15:1-8; Malakai 3:8-12
4. O rubeere onye amụma ahụ isi, 2 Ihe Emere 15:1-8
5. Ya na Chineke gbara ndụ, 2 Ihe Emere 15:9-15
6. O kpere ekpere, 2 Ihe Emere 14:11
II Ihe Ime Eziomume Nke Esa Lụpụtara
1. Ala ahụ nwere izuike, 2 Ihe Emere 14:5, 6; 15:19; Deuteronomi 28:1-14
2. Ha wuru obodo nwee kwa ọgan’iru, 2 Ihe Emere 14:7, 8
3. Chineke zara ekpere Esa, 2 Ihe Emere 14:9-15
III Ọdịda Esa
1. Esa na ndị ná-emebiiwu gbara ndụ, I Ihe Emere 16:1-6; 2 Ndi Kọrint 6:14, 17, 18; Abù Ọma 118:8, 9
2. Chineke anabataghị ọgbụgbandụ ahụ, 2 Ihe Emere 16:7-9; Abù Ọma 33:16; 146:3; Aisaia 31:1
3. Okwu Jehova mere ka iwe wee Esa, 2 Ihe Emere 16:10; I Pita 2:20
4. Esa chigharịkwuru ndị dibịa, 2 Ihe Emere 16:11, 12; Jeremaia 17:5-8; Job 13:15
5. Esa wee nwụọ, 2 Ihe Emere 16:13, 14; Ezikiel 33:13
IV Ntụkwasụịobi Anyị Na Chineke Maka Ọgwụgwọ
1. Ọgwụgwọ dị kwa nime Mkpuchi mmehie ahụ, Aisaia 53:4, 5
2. Aga akpọ Ndịokenye nke Nzukọ Kraist, Jemes 5:13-15; Ọlu Ndi-ozi 19:11, 12
3. Ekwere anyị mkwà ọgwụgwọ nsọ, Mak 16:18
Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHENjégharị iwe Nke Esa Megide Ikpere Arụsị
Esa ji njègharị iwe nke imegide ikpere arụsị malite ọchịchị ya “O we wezuga ebe-ichu-àjà nile nke ala ọzọ, na ebe nile di elu” otú ọ dị, anyị gụrụ na “ewezughagh ebe di elu” (I Ndi Eze 15:14). Ọ bụ ihe pụtara ìhè na Esa kpara òkè n’etiti ebe ịchụàjà ewuru nye chi ndị ala ọzọ na ebe dị elu nke ana-achụrụ ezi Chineke àjà. (Lee I Samuel 9:12; 10:5; I Ndi Eze 3:4). “Ewezugagh ebe di elu: otú ọ di obi Esa zuru òkè n’ebe JEHOVA nọ n’ubọchi ya nile.” Nke a na-egosi na Chineke chọrọ ka ewezuga ebe dị elu niile ka ana-achụkwa àjà náánị n’Ụlọukwu Chineke dị na Jerusalem. (Lee Deuteronomi 12:13, 14) Nke a mekwara ka anyi mara na ọ dịghị mgbe ọ bụla Esa chigharịrị kpeere, arụsị. Okwu a nke náasị na obi Esa zuru òkè ụbọchị ya niile metụtara náánị okwu banyere ikpere arụsị ma o metụtaghị omume ya niile ọzọ maọbụ izuòkè nke onye Kraist dịka anyị maara ya taa.
Ọgan’iru na Ọnwụnwa
“Eziomume nēbuli mba: ma ihe-ihere nke ndi nile di iche iche ka nmehie bu” (Ilu 14:34). Chineke ekwewo mkwà ngọzi dị ukwu na nke bakwara ụba nye ndị niile nke gaege ntị n’olu Ya: “Onye agọziri agọzi ka gi onwe-gi gābu n’obodo, onye agọziri agọzi ka gi onwe-gi gābu kwa n’ọhia … Ihe agọziri agọzi ka abọ-gi na ihe-gi iji agwọ achịcha gābu” (Deuteronomi 28:3, 5). Ndị Juda nwetara ngọzi ndịa niile n’oge ọchịchị nke Esa, Chineke nyere ha udo arọ iri site ná mmalite nke ọchịchị ya. “Ha we wue, ihe we gara ha nke ọma” (2 Ihe Emere 14:7).
Mgbe mmadụ na enweta ngọzi niile nke Chineke n’ụba ná-enweta kwa ihe niile ọ chọrọ ihe niile wee ná-agara ya nkeọma, o nwere ike ichè na ihe niile ganá aga nkeọma otú a. Ma ọ bụghị mgbe niile ka ọ ga-adị otú ahụ. Ọnwụnwa dị iche iche na-abịa mgbe ụfọdụ -- nke ana-atụghị anya ya, na nke ọ ná-adịghị ihe kpatara ya. Ndị agha dị ike nke ọnụ ọgụgụ ha ra ka otù nde pụkutere Esa. Mgbe ndị Juda nọ n’udo ihe wee ná-agakwara ha nkeọma, mgbe ahụ ka óké ìgwè ndị agha nke Etiopia bịakwasịrị ha. Ma Esa echèzọbeghị Chineke; o meworị onwe ya dịka ọ dị ike n’oge o nwere àkụ na-ụba ririnne. Ọtụtụ mgbe ụmụ mmadụ ná-echéfu Chineke mgbe ihe ná-agara ha nkeọma, ma ọ ga-abụ ihe dị mma mmadụ ijikere onwe ya n’ihe nke mmụọ, ka ọ ga-abụ mgbe ọnwụnwa bịara ọ gaghị enwe ike ịkwada onye ahụ. (Lee Jud 20, 21). Ọ bụ ezie na oge ọnwụwa kwesịrị ka ọ bụrụ oge mmadụ inyocha obi ya na ime ka mkwà dị iche iche o kwererị dị ọhụụ, ma ọ bụrụ na okwukwe nke onye ahụ ná-eguzosi ike, ọ pụrụ ịsị: “JEHOVA, ọ digh onye tiyere Gi iye aka, n’etiti onye bara uba na onye ike nādigh: yere ayi aka, JEHOVA, bụ Chineke ayi; n’ihi na ọ bu na Gi ka ayi dabere (2 Ihere Emere 14:11).
“JEHOVA we tigbue ndi Etiopia n’iru Esa” (2 Ihe Emere 14:12). Ọ bụ ihe bara óké urù mmadụ ibindụ nke ekpere na inwe ezi nguzosiike ka ọ gaabụ n’oge ihe gaadapụta na mberede ka okporoụzọ nke okwukwe anyị wee ghereoghe. Anyị gaelezianya ịhụ mgbe ọrịa maọbụ óké mkpà bịara na ọ dịghị ihe ọ bụ nọchịrị ụzọ n’etiti anyị na Chineke, na anyị nọ kwa n’aka Ya. Chineke chigharịrị agha a o wee ghọọ mmeri dị ukwu nye Esa. Ndị ahụ nke soro ya kwatara ọtụtụ ihe mkwata n’agha, ma ìgwè ehi ma ìgwè Kamel bara ụba. Otù aka ahụ kwa, ka ọnwụnwa anyị pụrị ichigharị wee ghọọ mmeri dị ukwu ma ọ bụrụ na anyị edebe onwe anyị n’okpuru nchebe Chineke. “Guanu ya n’ọñu nile, mgbe ọ bula unu dabara n’ọnwunwa di iche iche” (Jemes 1:2). “Ka nnwaputa nke okwukwe unu, ebe ọ dikariri ọla-edo oké ọnụ-ahia nke uku, bú ọla-edo nke nāla n’íyì, ọ bu ezie na anēji ọku nwaputa ya, ka ewe hu nnwaputa ahụ na ọ nēweta otuto na ebube ahụ na nsọpuru” (I Pita 1:7).
Inwe Ntachi-obi rue Ọgwụgwụ ihe niile
Mgbe Esa bulatara ihe ahụ niile akwatara n’agha na Jerusalem, Azaraia bú onye amụma ji ozi a nke sitere na Chineke bịa zute ya: “JEHOVA nọnyere unu, mgbe unu nọyere Ya; ọ buru kwa na unu achọ Ya, Ọ gēme ka unu chọta Ya, ma ọ buru na unu arapu Ya Ọ gārapu unu” (2 Ihe-Emere 15:2). Ozi a bụ ịdọ aka-ná-ntị nye ndị niile ga-achọ ime ka Eluigwe bụrụ ebe obibi ha na ọ bụ ihe dị mkpà “iwere ntachi-obi nọgide rue ọgwụgwọ ihe nile” (Matiu 24:13). Okwu Chineke nke sitere n’ọnụ Ezikiel onye amụma kwusiri isiokwu a ike: “Mgbe M’nāsi onye ezi-omume, na ọ ghagh idi ndu; onye ahu ewe tukwasi obi n’ezi omume-ya, me ajọ omume, ezi omume ya nile, agagh-echeta ha; ma n’ajọ omume-ya nke o meworo, nime ya ka ọ gānwu” (Ezikiel 33:13). Ndụ ebighị ebi dabeere n’ịnọgidesi ike mgbe niile rue ọgwụgwụ ihe niile.
Site n’iru akwụkwọ dị iche iche nke akwụkwọ akụkọ onye amụma ahụ gosiri ndị Juda oge mgbe Israel nọ ná-enweghị ezi Chineke, ná-enweghị kwa ezi onye nchụàjà ná-akuziri ha ihe, ná-enweghị kwa iwu. Ọ bụ oge gbara ọchịchịrị n’ezie -- oge nke udo ná-adịghị. Anyị gụtara na “okporo-uzọ ghara idi, ndi nēje ijè n’uzọ we je n’okporo-uzọ gbagọrọ agbagọ. Obodo ntà we ghara idi” (ma ọbụ “anọchisiri okporo-uzọ nile, ma ndi ijè si n’uzọ ntà nke ọhia ná agafe. Ndi nile bi n’obodo ntà nile we gwusia” (Ndi Ikpe 5:6, 7), n’ihi na ndị Israel naebi nime olùlù na ọgbà dị iche iche. Ihe ndịa niile mezuru n’ihi na ha arapuwo Jehova: “JEHOVA nọyere unu, mgbe unu nọyere Ya; … ma ọ buru na unu arapu Ya, Ọ gārapu unu” (2 Ihe Emere 15:2).
Òfùfè nke sitere nime Obi
Esa bụ eze na ndị ahu nábatara okwu ahụ wee baa kwa n’ọgbụgbandụ nke ifè Chineke òfùfè. Ha jiri náárị ehi asaa na puku atụrụ asaa nke Chineke nyere ha n’agha ahụ chụọàjà n’ebe ịchụàjà, ewee mee ka ọgbụgbandụ ahụ guzosie ike, “na ime ka onye ọ bula nwua nke nāchọgh JEHOVA, bú Chineke Israel” (2 Ihe Emere 15:13). Ọ bụ ịñụ íyì siri ike nke ukwu, ma Chineke sọpụụrụ ya. Ọ dị kwa Chineke ezimma “Juda nile we ñụria ọñụ n’ọñụñụ iyi ahụ: n’ihi na ha were obi ha nile ñụa iyi, were kwa otú ọ nātọzu ha ụtọ chọ Ya; O we me ka ha chọta Ya” (2 Ihe Emere 15:15). Mgbe unu ga-eji obi unu niile chọ Ya mkwà Chineke kwere bụ, “M’gēkwe kwa ka unu chọtam” (Jeremaia 29:13, 14). Ihe ọ bụla nke ná-abụghị mmadụ iji obi ya niile fèe Chineke òfùfè adịghị atọ Chineke ụtọ. Chineke ịgbọpụ ndị ahụ n’ọnụ Ya bụ ikpé nke ekpere megide ndị ná-ekpoghị ọkụ ha ajụghị kwa oyi.
Ọdịda
Ọ bụ n’arọ nke iriatọ na isi nke ọchịchị ya ka ụkwụ Esa malitere ichichapụ. Chèe échìchè banyere nke a! Iri arọ atọ na ise nke ịgba ọsọ nkeọma, iri arọ atọ na ise nke jupụtara n’ọlụ ọma -- n’ikpe-azụ o wee daa! Nke a na-egosi otú o si dị mkpà ijiobichụọàjà kwa ụbọchị iché nchè na ikpe ekpere. “Unu nāgbari ọsọ nke ọma; onye gbọchiri unu, ka unu ghara ikweyere ezi okwu ahu” (Ndi Galetia 5:7). Esa, ọ bụ gịnị kpatara nke a? Ị chezọrọ ikpe ekpere? Ị dịwo ukwu na onwe gị jubigara gị afọ ókè nke mere na i chere na i nwere ike imeri ọnọdụ a ná-enweghị inyeaka nke Chineke? Ị bawoụba nke ukwu nke mere na i chere na ego nwere ike imere gị ihe niile kama ilegide Chineke anya? Ị nọwo ebe dị anya site n’ebe Chineke nọ nke mere na ozi nke onye amụma na-eme ka iwe wee gị? Weda onwe gị n’ala, Esa, Chineke ga-anụ kwa olu gị. Ma Esa ewedaghị onwe ya n’ala. O mere ka obi ya sieike, o wee tụbà onye amụma ahụ n’ụlọ mkpọrọ, wee kpagbuo kwa ụfọdụ nime ndị ya.
Ọgwụgwọ Nsọ
Otú a ka iheodide nke Akwụkwọnsọ ga-esiworị dezuo ọlụ niile nke Esa ma ọbụghị na ọ tụkwasịrị n’elu nke a sị “Esa we ria ọria n’ukwu ya abua n’arọ nke-orú-na-iri-na-iteghete ọ bu eze; ọria-ya di uku ri nne: ọzọ kwa, n’ọria-ya ọ chọgh JEHOVA, kama ọ chọrọ n’etiti ndi-dibia” (2 Ihe Emere 16:12). Esa egosiwo kwa ọzọ enweghị ntụkwasị-obi na Chineke na ịdabere nnọọ n’ogwe-aka nke anụ-arụ bụ mmadụ “Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nātukwasi madu obi, we me ka anu-arụ bú madu buru ogwe-aka-ya, onye obi-ya nēsi kwa n’ebe JEHOVA nọ wezuga onwe-ya (Jeremaia 17:5). Mmadụ ụfọdụ na-echè na Chineke na-esite n’aka ndị dibịa ná-agwọ ọrịa; ndịọzọ ná-èchè kwa na ọgwụgwọ nsọ bụ ma onye chọọ -- nke bụ na mmadụ nwere ike ịchọ ya ma ọ bụrụ na o nwere okwukwe, ma ọbụ lefuru ya anya dịka o si masị onye ahụ. Ma ihe ana-ekwu n’ebe a bụ na Esa mere iheọjọọ: nke mbụ, ọ chọghị Chineke; nke abụọ, o chigharịkwuru ndị dibịa.
Baịbụl kụziri ihe banyere ọgwụgwọ nsọ nkeọma n’Agbà Ochie na n’Agba Ọhụụ. “Mu onwem bu JEHOVA nke nēme ka aru di gi nma” (Ọpupu 15:26). “Gọzie JEHOVA nkpuru-obim, echezọ-kwa-la nmeso ọma ya ọ nēmeso gi: bú onye nāgbaghara gi ajọ omume-gi nile; onye nāgwọ ọria gi nile” (Abù Ọma 103:2, 3). “Ọ di onye ọ bula n’etiti unu nāhuju anya? ya kpe ekpere … Ọ di onye ọ bula n’etiti unu nke aru-ya nādigh ike ya kpọ ndi okenye nke nzukọ Kraist ka ha biakute ya; ka ha kpe kwa ekpere n’isi-ya, nēte ya manu olive n’aha Onye-nwe-ayi: ekpere nke okwukwe ahụ gāzọputa kwa onye ahu aru nādigh ike, Onye-nwe-ayi gēme kwa ka o bilie” (Jemes 5:13-15). Ka Chineke nyere ndị ya aka ịtụkwasị Ya obi ma ghara ịdabere n’ogwe-aka nke anụarụ bụ mmadụ. “Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nātukwasi madu obi, … Onye agọziri agọzi ka nwoke ahu bu nke nātukwasi JEHOVA obi” (Jeremaia 17:5, 7). Ị aga-achọ ịdị ka Esa onye chọrọ n’aka ndị dibịa maọbụ dịka Job onye sịrị, “Le ọ gēgbum; m’gagh echere: (ma-ọbu asi kwa na Ọ ga-egbum, mu onwem ganātukwasi obim na Ya)” (Job 13:15).
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE- Òlee obodo Esa bụ eze ha?
- Kọwaa ihe banyere arọ niile ahụ ndị bu ụzọ n’ọchịchị eze nke Esa.
- Àrọ ole ka Esa bụ eze tutu ekwue iheọjọọ banyere ya?
- Òlee otú ha si baa ụba bụ ndịagha Etiopịa nke busoro Esa agha?
- Kwue ùgbò abụọ nke Esa rapụrụ ịtụkwasị Chineke obi.
- Gịnị ka eji tụnyere nwoke ahụ onye ná-atụkwasị mmadụ obi? na onye Jehova bụ ntụkwasịobi ya?
- Chọta ebe kwagidere ya n’Akwụkwọnsọ na mmadụ nwere ike ịdapụ wee bụrụ onye furu èfù.
- Kwuo ebe Akwụkwọnsọ kwagidere ya na anyị pụrụ irita urù n’ọnwụnwa anyị dịka Esa ritara n’agha ahụ nke ya na ndị Etiopịa lụrụ.
- Chọta ihe nkọwa anọ nime ihe ọmụmụ a nke gosiri na Juda ji obi ha niile chọọ Chineke.
- Were nhụjuanya na ntụkwasị-obi nke Job n’ebe Chineke nọ tụnyere nke Esa.