I Ndi Eze 16:29-34; 17:1-24.

Lesson 296 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Le, anya JEHOVA di n’aru ndi nātu egwù Ya, bú n’aru ndi nēchere ebere Ya; ịnapụta nkpuru-obi-ha n’ọnwụ na idebe ha ndu n’oké unwu” (Abù Ọma 33:18, 19).
Cross References

I Ọchịchị Ajọomume nke Ehab

1. Ajọomume nke Ehab karịrị nke ndị eze Israel niile buru ya ụzọ, I Ndi Eze 16:29-34

2. Elaija, nwoke náekpe ekpere baara Ehab mbá, I Ndi Eze 17:1; Jemes 5:17, 18

II Nchébe Na Nrọpụta Nke Chineke nye Elaija

1. Ugoloọma na enye Elaija nri, I Ndi Eze 17:2-7; Luk 12:24; Abù Ọma 147:9; Matiu 6:25-33

2. Arọpụtakwaara Elaija ihe oriri n’ụlọ nwanyị ahụ di ya nwụrụ, I Ndi Eze 17:8-16; Matiu 10:41, 42; Luk 4:25, 26

3. Elaija mere ka nwa nwoke nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ si n’ọnwụ bilie, I Ndi Eze 17:17-24

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Ifè Beal

Mgbe Jeroboam nwa Nebat kpụrụ ụmụ ehi abụọ nke ọla-edo wee kwusaa sị “Le chi gi, Israel, mere ka I si n’ala Ijipt rigoputa,” wee mee ka Israel mehie site n’ikpere arụsị, ọ ga-adịworị ka o ruwo n’ebe kachasị elu nke nleli na ajọomume megide Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. Ma n’ebe Ehab nọ ọ bụrụ ya ihe dị ntà n’anya ijéijè ná mmehie niile nke Jeroboam. O mehiekwara karịa site n’iwebata òfùfè Beal n’Israel, ya na omume ọjọọ na nke ogbugbu mmadụ ya niile. Ndị Israel naeme kwa mmehie ahụ niile nke Chineke jiri nye iwu ikpochapụ ndị Kenean niile. Ndị nchụàjà nke Beal bụ náánị ndị ogbu mmadụ, n’ihi na òfùfè Beal chọrọ ka ana-eji ụmụntakịrị ná-achụrụ ya àjà.

Mwute nke Elaija

Ọ bụghị ihe ijuanya na ihe banyere ndị Israel na-emetụ Elaija n’obi; ọ matakwara ọbụbụ ọnụ nke dị n’iwu ahụ megide Ụmụ Israel n’ihi mmehie niile a. Ọ gụtara na Jehova ga-emechi eluigwe ma jide kwa mmiri òzùzò Ya ma ọ bụrụ na ha añaghị ntị n’iwu Ya niile. O metụrụ ya n’obi na ugbu a bụ oge ana-aghaghị ime ihe banyere ọnọdụ nke Ụmụ Israel; “o we kpesie ekpere ike ka miri aghara izò: miri ezogh kwa n’ala arọ atọ na ọnwa-isi” (Jemes 5:17). Elaija nwere ibu arọ n’ihi ndị ya; ọ chọrọ ịhụ na Ụmụ Israel laghachikutere Chineke ná-agbanyeghị ihe ọ ga-efù ha. Ọ gụghị ọnọdụ ọ bụla ọ ga-anọ ma ọbụ ahụhụ ọ bụla ọ ga-ahụ n’ihé ma ya bụrụ na ekpochapụrụ òfùfè Beal. O jikeèrè ka ya na ndị ahụ mehiere hụkọọ ahụhụ, ọ bụrụ náánị na Chineke ga-eme ka iheọjọọ ha kwụsị. Ụwa n’ụbọchị taa chọrọ ndịkom na ndịnyom ndị dịka Elaija ndị nwere ibu-arọ ịhụ na ndịọzọ chègharịrị site ná mmehie ha.

O guzo n’iru Chineke

“JEHOVA bụ Chineke nke Israel, nādi ndu, Onye m’guzoworo n’iru Ya igirigi ma-ọbu miri ozuzo agagh-adi ma-ọli n’arọ ndia, ma ọ bu nání dika okwum si di” (I Ndi Eze 17:1). N’ezie nke a bụ mkwuwaokwu siri nnọọ ike nke mmadụ ọ bụla nke pụrụ ịnwụ anwụ ga-ekwu -- náasị na site n’okwu ọnụ ya eluigwe pụrụ inye ma ọbụ gbochie mmiri òzùzò ya. Okwu nke a abụghị ihe ekwuru ngwàngwà mgbe ahụ ọ gbabatara ya n’uche, kama ọ bụ ihe ekpere nke óké ịsụ udè, na ịgbá mgbá kwagidere. Okwu dị otú a esiteghị n’ọchịchọ efù kama o sitere n’inwe mmekọ dị nsọ n’ebe Chineke dị ndụ nọ.

Okwu ahụ nke ná-asị, “JEHOVA, bú Chineke nke Israel nādi ndu, Onye m’guzoworo n’iru Ya ta” na-egosi na Elaija ná-adị ndụ ná-ejègharị kwa dịka ọ nọ mgbe ọ bụla n’iru Chineke dị ndụ. Anyị onwe anyị n’ụbọchị taa aghaghị ịmata kwa mgbe ọ bụla na Chineke maara okwu anyị niile, na échìchè obi anyị, na omume bụ ihe ana-atụle n’iru Ya. Ka nwoke, na nwanyị na nwata ọ bụla mara na nkeji niile nke dị nime awaà na awaà niile nke dị n’ụbọchị ọ bụla na ọ na-eguzo n’iru Chineke nke pụrụ ime ihe niile.

Na Mmiri Iyi Kerit

Gịnị ka Elaija ga-ahụ n’akụkụ mmiri iyi Kerit? Ò nwere ụlọ ntà ma ọbụ ọgbà nkume dị n’ebe ahụ? Ka ọbụ na ọ gaje ibi n’okpùrù ndò nke eluigwe? Nke a abụghị nsogbu Elaija; n’ihi na ọ nọdụrụ n’ebe ahụ nke Chineke sịrị ya jee. “I gāñu miri sitere na miri-iyi ahu; ọ bu kwa ugolo-ọma ka M’nyeworo iwu izù gi n’ebe ahu.

Ụmụ ugoloọma! Ụdị ihe oriri dị añaa ka nke a ga-abụ! Gịnị ka ugoloọma pụrụ iweta nke ga-abụ ihe-oriri kwesịrị onye nke Chineke ahụ? Akwụkwọnsọ na-ekwu sị: “Tugharinu uche n’ugolo-ọma, na ha adigh-agha nkpuru, ha adigh-ewe kwa ihe ubi; nke nēnwegh ime-ulo ntà ma-ọbu ọba” (Luk 12:14). Ndịa bụ ụmụ nnụnụ nke ga ná-ebutere Elaija ihe oriri kwa ụbọchị. N’ezie ọ bụ ibi ndụ nke okwukwe ka Chineke na-achọ n’aka Elaija, ma Elaija nwere okwukwe. Chineke ná-azụ ugolo-ọma, ma ugolo-ọma náazụ kwa Elaija. Gịnị gbasara anyị ịma otú, ma ọbụ ebe o sitere, ebe ọ bụ n’aka Chineke ka o sitere. “N’ihi na ndụ kariri ihe eji azù ya, aru kari-kwa-ra uwe oyiyi-ya” (Luk 12:23). “Anya abua nke JEHOVA di n’aru ndi ezi-omume, nti-Ya abua ghe-kwa-ra oghe ná nkpu ha nētiku Ya” (Abù Ọma 34:15). Chineke nke Elaija ka ná-adị kwa ndụ, otú a ka ugolo-ọma dị kwa ndụ. Ihe dị ụkọ n’ụbọchị taa bụ okwukwe nke Elaija.

Anwara okwukwe Elaija. Mmiri iyi ahụ takọrọ! O zukwaraghị ya ichere ka nnụnụ ndịa butere ya ihe oriri nke ụbọchị ya, n’ihi na mmiriiyi ahụ nke ọ na-añụ atakọworị, ọbụná mmiri iyi nke Kerit bụ ebe Chineke zigara ya. Elaija ajụghị ajụjụ ọ bụla kama ọ cheere n’akụkụ mmiri ahụ nke takọrọ atakọ tutu “Okwu JEHOVA we rue ya nti, si, bilie, je Zarefat, nke diri Zaidon, biri n’ebe ahu: le enyewom otù nwanyị di-ya nwuru nọ n’ebe ahu iwu izu gi”

Nwanyị Di ya Nwụrụ nke Zaidon

Zarefat abụghị obodo nwere àkụ-na-ụba riinne; nwanyị ahụ di ya nwụrụ abụghị kwa ọgaranya. N’ebe ahụ ka nwanyị ahụ gara ná-achịkọta nkụ. Ị nwere ike ịtụgharị uche otú ọ ga-adị gị ma ọ bụrụ na ezigara gị ka i biri n’ebe otù nwanyị na nwa ya nwoke nọ n’óké agụụ, nke nri ha nwere ná-agaghị ezuru ha iriju afọ otù ugbò, ma olileanya adịghị kwa maka ọdịn’iru? Ị nwere ike ịrịọ sị “Buru uzọ merem... ogbe achịcha nta”? ma ọbụ okwukwe ịsị: “Okpokoro utú ọka ahu agagh-agwu, ite manu ahu agagh-akọ gi kwa, rue ubọchi JEHOVA gēnye miri-ozuzo n’elu uwa”? Ma-ọbụ ị ga-ele anya ka nne nọ n’agụụ nye onye ọbịa achịcha ebe agụụ na-agụsi nwa ya nwoke ike? Ọ nọ na-ele anya ná-atụkwa mmanụ na ihe oriri ahụ n’ihe ọtụtụ kwa ụbọchị, bụ nke ji nwayọ nwayọ ná-agwụ. Ma ugbu a ihe fọdụrụ bụ otù iko ụtụ ọkà na ngàji mmanụ olenaole!

Ọ bụghị ihe ijuanya na Onyenwe anyị Jisọs Kraist kwuru sị “Ọtụtụ ndiyom di-ha nwuru di n’ala Israel n’ubọchi Elaija, mgbe emechiri elu-igwe arọ-atọ na ọnwa isi, mgbe óké unwu dara n’ala ahu nile; ma ọ digh onye ọ bula nime ha ka ezigara Elaija, kama nání Zarefat, n’ala Zaidon, jekuru nwayi di-ya nwuru” (Luk 4:25, 26).

N’ebe a ka ahụrụ nwanyị omume ya dị ichè; onye jikeere irubere Chineke isi n’etiti nsogbu nke agụụ na ọnwu. Chineke lere anya n’etiti ụmụ nwanyị niile di ha nwụrụ n’ala Israel, ma Ọ hụghị onye O nwere ike ịtụkwasị-obi dịka Ọ pụrụ ịtụkwasị otù nwanyị a di ya nwụrụ nke mba ọzọ nke Zaidon. Dịka Chineke ná-ele anya ná Nzukọ Ya taa, Ọ na-ahụ omume ọma niile ahụ nke ná-adị Ya mma? Ka Ọ ga-akpọ onye ọbịa (ma ọbụ onye mbaọzọ) ka o nye onye amụma Ya nri? “Nwayi nke nējide onwe ya nke-ọma ònye gāchọputa ya? n’ihi na ọnu-ahia-ya kariri rubi nke uku” (Ilu 31:10).

Nwanyị ahụ di ya nwụrụ nke Zarefat nwere ike ịnụworị ihe banyere Chineke nke Israel tutu Elaija abịa. Chineke gwara Elaija “enyewom otù nwayị di-ya nwuru nọ n’ebe ahụ iwu izù gi.” Ịma ihe banyere Chineke nke zụrụ Ụmụ Israel iri arọ anọ mgbe ha na-awagharị nime ọzara, ná-eji kwa nri ndị mmụọ ozi ná-azụ ha, ná-enye kwa ha mmiri sitere na nkume, kwesịrị ịkụnye okwukwe n’obi onye ọ bụla. Otù ihe bụ ikwere na Chineke pụrụ ịlụ, Ọ lụwo kwa ọtụtụ ọlụ ebube, ihe ọzọ bụ kwa ịtụkwasị Ya obi mgbe okwu nke ihe ahụ kachasị ukwu bịaruru -- okwu banyere ọnwụ na ndụ -- mgbe o metụtara anyị onwe anyị ma ọbụ ụmụ anyị. Mkwà niile nke Chineke ná-eguzosi ike. Okwu niile ahụ “N’ihi na otú a ka JEHOVA bú Chineke Israel, siri, okpokoro utú ọkà ahu agagh agwu, ite manu ahu agagh-akọ gi kwa” ka okwu ndịa so kwa n’àzụ, “okpokoro utú ọkà ahu agwugh, ite manu ahu akọgh kwa”. Chineke anyị dị ukwu!

Ndụ site ná ndị Nwụrụ Anwụ

Ọzọ kwa etinyere okwukwe Elaija n’ọku, o wee pụta bụrụ ihe anụchara anụcha dịka ọla-ọcha na ọla-edo. N’oge a nwa nwoke nke nwanyị ahụ malitere ịrịa ọrịa wee nwụọ. Elaija wee baa nime ụlọ ya, nwata ahụ nwụrụ anwụ na-atọgbọ kwa n’ihe ndina nke Onye amụma ahụ, o wee tikue Chineke. O setịrị onwe ya n’elu nwata ahụ ugbò atọ. “JEHOVA we ge nti olu Elaija; nkpuru-obi nwata ahụ we bịaghachi nime ya, o we di ndu” Nke a bụ ụdị mmadụ dị añaa! Ọ bụ okwukwe di añaa bụ nke a nke nwere ike ịkpọghachi onye nwụrụ anwụ ka ọ dị ndụ!

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Ònye bụ nwunye Ehab?
  2. Òlee obodo o si bịa? Gịnị bụ kwa okpukpé ya?
  3. Gịnị mere Elaija ji kpee ekpere ka mmiri ghara izò?
  4. Òlee otú Elaija ga-esi ná-enweta ihe oriri mgbe ọ nọ na mmiri iyi Kerit?
  5. Gịnị mere mmiri iyi ahụ ji takọrọ?
  6. Òlee obodo nke Zarefat dị na ya?
  7. N’ihe gbasara gịnị ka Jisọs ji kpọọ aha nwanyị Zarefat ahụ di ya nwụrụ anwụ?
  8. Òlee ihe ịrịba-àmà abụọ nke emere n’ụlọ nwanyị ahụ di ya nwụrụ?
  9. Kpọọ ọtụtụ ụzọ, nke ewepụtara n’ihe ọmụmụ a, nke ga-abụwọrị ihe mnwapụta nke okwukwe Elaija.
  10. Gịnị mere nwanyị ahụ di ya nwụrụ ji kwere na Elaija bụ onye nke Chineke?