I Ndi Eze 18:1-46.

Lesson 297 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ọ gēru kwa na, tutu ha akpọ, Mu gāza; mgbe ha onwe-ha nọ nēkwu okwu, Mu onwem gānu” (Aisaia 65:24)
Cross References

I Nlata nke Elaija

1. Elaija zutere Obadaia onye zigara Ehab ka ọ gaa zute ya, I Ndi Eze 18:1-16

2. Ehab boro Elaija ebubo na ọ bụ ya naemekpa Israel arụ, I Ndi Eze 18:17, 18; 21:20; I Samuel 1:14; 17:28

II Mwapụta site N’ọkụ

1. Elaija gwara Ehab ka ọ chịkọta ndị Israel niile na ndị amụma niile nke Beal, I Ndi Eze 18:19, 20

2. Ndị ahụ niile kwerịkọtara ka ele ule ịnwapụta ma ọ bụ Jehova ka ọ bụ Beal bụ ezi Chineke, I Ndi Eze 18:21-26; 43:9

3. Chi ahụ nke ga-eji ọkụ za ga-abụ ezi Chineke, I Ndi Eze 18:24; Levitikọs 9:24; Ndi Ikpe 6:21; I Ihe Emere 21:26; 2 Ihe Emere 7:1, 3

4. Ndị amụma Beal kpọkuru chi ha ụbọchị ahụ niile ma ha anataghị ọzịzá, I Ndi Eze 18:25-29; Aisaia 45:20; Jeremaia 10:5; 51:17, 18; Daniel 5:23

5. Elaija doziri ebe ịchụàjà nke Chineke dịka ntụzi-aka nke okwu Chineke si dị, I Ndi Eze 18:30-35; Ọpupu 24:4; Joshua 4:3, 4

6. Chineke kpepụtara Onye amụma Ya site n’iji ọkụ ripịa ebe ịchụàjà ahụ na ihe niile dị na ya, I Ndi Eze 18:36-39; Ọnu-ọgugu 16:28-30; Aisaia 28:21, 22; Zekaraia 14:4, 5

7. Elaija gburu ndị amụma Beal niile, I Ndi Eze 18:40

III Arịrịọ Ekpere dị ike nke ukwu nke Ná-alụsị ọlụ ike

1. Elaija kpere ekpere, Chineke wee zite mmiri òzùzò, I Ndi Eze 18:41-46; Jemes 5:16, 17.

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Okwu nke Chineke

“Ọ gēru, ọ buru na i gegh nti olu JEHOVA, bú Chineke-gi, ilezi-anya ime ihe nile O nyere n’iwu na ukpuru Ya nile nke mu onwem nēnye gi n’iwu ta; na nkọcha nile ndia ga-abịakwasi gi we rue gi aru: … Elu-igwe-gi nke di n’elu isi-gi gābu kwa ọlà, ala nke di n’okpuru gi gābu kwa ígwè. JEHOVA gēme ka miri-ozuzo nke ala gi buru uzuzu na ájá: ọ gēsi n’elu-igwe dakwasi gi, rue mgbe agēkpochapụ gi” (Deuteronomi 28:15, 23, 24). Ndị Israel, ka arọ ná-agabiga, mụtara na ịdọ aka-ná-ntị a nke sitere na Chineke abụghị okwu efù. Elaija onye Tisbe, guzoro n’iru Ehab wee sị: “JEHOVA, bú Chineke nke Israel nādi ndu, Onye m’guzoworo n’iru Ya, igirigi ma-ọbu miri-ozuzo agagh-adi ma-ọli n’arọ ndia, ma ọ bu nání dika okwum si di” (I Ndi Eze 17:1). O wee dị otú ahụ. Arọ atọ na ọnwa isii, ọ dịghị mkpụrụ mmiri òzùzò ma ọbụ igirigi ahụrụ n’Israel. Ọ bụ ezie na Ehab chọgharịrị Onye amụma ahụ bụ Elaija n’obodo ahụ niile, ma apụghị ịchọta ya; mmiri ezoghi kwa.

Nlata Elaija

Ihe ọgbụgba nke ikpé Chineke megide ala ahụ na ndị bị nime ya metụtakwara Ehab n’onwe ya, n’ihi na mgbe ọ hụrụ Elaija n’ikpé-azụ ihe mbụ o kwuru bụ, “Ọ bu gi bu nka, gi onye nēmekpa Israel aru?” Ehab hụrụ Elaija dịka onye bụ isi nsogbu ya niile; nke mere na o jikere ịta Onye amụma nke Chineke ụta kama ikwenye na ọ bụ mmehie ya wetara ọnọdụ ahụ nke jọgburu onwe ya. Elaija nyere ya ọzịzá kwesịrị ekwesị: “Emekpaghm Israel aru; kama ọ bụ gi onwe-gi, na ulo nna-gi nime nrapu unu rapuworo ihe niile JEHOVA nyere n’iwu, iwe jeso Bealim.”

Ọkpụkpọ òkù ahụ nke Òfùfè

Ndị Israel niile na ndị amụma Beal zukọrọ ịnụ ihe Elaija, bụ nwoke ahụ nke pụrụ imechi eluigwe ka mmiri ghara izo ga-ekwu. Ntụpụta ya dịịrị onye ọ bụla mfé ịghọta: ka ewue ebe ịchụàjà, ka achụọ kwa àjà n’elu ya; ma chi ahụ nke ga-eji ọkụ ripịa àjà ahụ ga-abụ ezi Chineke ahụ nke dị kwa ndụ n’ezie, ọ bụ kwa Ya ka ha ga ná efè òfùfè. Ọ bụ iché-akamgbá dị ukwu ka Elaija chere ha n’iru. Ndị amụma Beal dị narị anọ na iri ise (450), ndị amụma Ashera dị kwa narị anọ (400) ma Elaija, dịka ya onwe ya matara bụ náánị otù onye nke ná-anọchite anya Jehova. Mkwuwaokwu nke Elaija sitere n’okwukwe dị nsọ nke o nwere na Chineke nke pụrụ ime ihe niile, Elaija matakwara na ọnụ ọgụgụ abụghị ihe ọ bụla n’ebe Chineke nọ. Elaija matara na ndụ ma ọbụ ike adịghị nime arụsị Beal ahụ dara ogbi nke Ụmụ Israel na efé òfùfè n’ihi nzuzu na okwukwe efù ha nwere na ya. Chineke ji ụzọ dị ike ná-egosi Ụmụ Israel na ọ dịghị ihe ọ bụla nke ha pụrụ ime ma ọbụ nke ha ná-apụghị ime nke ga-agbanwe ọbụná n’ụzọ dịkarịsịrị ntà ihe ahụ nke Chineke na-eme. Ka ndị amụma Beal nwapụta ịdị adị nke chi ha otù ugbò a ma ọbụ rapụ ya ebighị ebi dịka ihe ná-eduhie eduhie. Nke a bụ isiokwu nke okwu ahụ Elaija gwara ndị ahụ; ha nábatakwara ichéakamgbá ahụ.

Arụsị dị Iche iche Dara ogbi

Enwere ọchịchọ dị nime obi ụmụ mmadụ nke ifè otù ihe òfùfè; setan ewerewo ọchịchọ a nke dị n’obi mmadụ site n’ọmụmụ lụọọlụ n’ụzọ ime ka ha bụrụ orù ka o wee mezue nzube ya. Ọ na-ewere egwù na ikwere n’ihe efù mejue obi ụmụ mmadụ ọtụtụ mgbe, iji mee ka ha fee arụsị dị iche iche òfùfè; ha abụrụwo kwa orù nye ihe niile ahụ, ha apụghị ịgbanarị ọchịchịrị nke setan ma ọbụghị site n’ike Chineke. Israel arapụwo ifè ezi Chineke òfùfè ewee mee ka ha ma n’ọnyà nke ikwere n’ihe efù nke ndị ná-amaghị Chineke na ifè arụsị òfùfè. Ha bụ nnọọ ndị iheọma meere na Chineke ka na-echeta ha ọbụná izitere ha nwoke dị ka Elaija ịkwụsị ikpere arụsị a na iweghachị obi ha n’ebe Chineke nọ.

Ndị amụma Beal nọgidere n’iti mkpu ụbọchị ahụ niile, na imebiga ihe ókè nke okpukpé ha nke igbukasị onwe ha arụ, na ime ụñara dị iche iche ime ka arụsị ha lụọ ọlụ ebube nye ha. Nke a bụ ihe ịma-àtụ pụtara ìhè karịsịa na Baịbụl banyere imebiga ihe ókè nke okpukpé ná-abaghị urù. Elaija kwara ha emò ma nye kwa ha ụbọchị ahụ niile iji nweta ọzịzá sitere n’Eluigwe nke eji ọkụ zaa. Ma ọ dịghị ọzịzá bịara, ọ pụghị kwa ịbịa n’ụdị ọnọdụ dị otú ahụ.

Moses gwara Ụmụ Israel okwu sị: “I mawo kwa ta, cheta-kwa-ra obi-gi na JEHOVA, Ya onwe-ya bu Chineke n’elu-igwe di n’elu na n’elu uwa di n’okpuru: ọ digh onye ọzọ” (Deuteronomi 4:39). Okwukwe na Chineke dị na Ọ na-egosi kwa Onwe-ya Onye ná-enyeghachị ndị ná-achọsi Ya ike ụgwọ-ọlụ, bụ mkpịsị ugodi nke eji anata ihe n’aka Chineke (Ndi Hibru 11:6). Chineke na-eleru anya nkeọma n’ụzọ nke ụmụ mmadụ si abịakute Ya, ọzọ, òfùfè nke Chineke aghaghị ịbụ ihe aga-eme dịka ntụzi-aka nke Okwu Chineke si dị.

Ebe Ịchụàjà nke Chineke

Mgbe ndị amụma Beal tufusiworo ike ha niile n’efù n’ịkpọku Beal n’ekpere, Elaija wee wue ebe ịchụàjà nye Chineke dịka Okwu Chineke si dị ná-ewere nkume iri na abụọ, otù nye ebo ọ bụla nke Israel. Mgbe ọ na-ejikere ịchụàjà ya, Elaija gwara ndị ahụ niile ka ha bịaruo nso. Ná-agbaghị agụgọ Elaija chọrọ ka ndị ahụ lezie ya anya nkeọma ma mata kwa n’onwe ha na ọ dịghị aghụghọ ọ bụla o ji n’isure àjà nsureọkụ ya kama ihe niile dị ka Okwu Chineke si dị. Mgbe ọ tụkwasịworo óké ehi n’elu ebe ịchụàjà ahụ ma gwuo kwa olùlù gburugburu ya, Elaija mere ka ndị ahụ gbajupụta mmiri nkeọma n’ebe ịchụàjà ahụ na n’àjà ahụ niile ùgbò atọ. Ọ dịghị ọkụ ala ọzọ achọrọ n’ebe a. Ihe ahụ kachasị óké ọnụ-ahịa n’ala ahụ -- mmiri -- ka eji ya na ihe ịchụàjà ahụ chụara Chineke nke Israel àjà.

O rue n’oge ịchụàjà anyasị, bụ oge nke Chineke rọpụtara na mgbe ochie, Elaija kpere ekpere ya nye Chineke. Ọ dị mfé, ọ pụtakwara ìhè, ọ dị mkpirisi, ma o jupụtara n’okwukwe. O chetaara Chineke na ya na-eme ihe a niile dịka ihe O nyere n’iwu si dị, Elaija kpekwara ekpere ka Chineke gosipụta Onwe-ya ugbu a ma chigharị kwa obi ndị ahụ ka ha laghachikute Ya. Ọkụ Chineke dara n’ọzịzá arịrịọ ekpere a, wee ripịa àjà ahụ, na ebe ịchụàjà ahụ, ọbụná mmiri ahụ nke dị n’olùlù ahụ! Ndị ahụ niile wee daa kpue iru ha n’ala dịka otù onye wee kwenye, na “JEHOVA, Ya onwe-ya bu Chineke.”

Ndị ahụ wee jide ndị amuma nke Beal gbue kwa ha n’aka Elaija. Otú a ka onye amụma ụgha ọ bụla na onye mkwusa nke okpukpé ụgha ọ bụla ga-esi hụ ahụhụ n’ikpé nke Chineke wee baa n’amam-ikpé ebighị ebi. Aga ekpughe ha n’ikpè-azụ, dịka ndị ná-ekpere arụsị na ndị ná-eso ụzọ Setan, ha na Setan ga-enwekọ kwa otù ụdị amamikpé ahụ.

Ekpere Òkpùkpù Asaa

Ọlụ Elaija ákàagwụghị, n’ihi na enwebeghịị mmiri òzùzò. Chineke emewo ka ndị ahụ niile mara na Ya onwe-ya na-adị ndụ, ugbu a Elaija ga-arụgidesi Chineke ike n’ekpere ka o wee zite mmiri òzùzò. Mgbe ọ rịgooro n’elu-ugwu, o wee malite ikpe ekpere, obi Elaija ga-ejupụtaworị n’okwukwe na ntụkwasị-obi, n’ihi na ọ gwara Ehab, “Olu ùzù oké miri-ozuzo nāda.” Ọ bụ ezie na Elaija kpere ekpere ọtụtụ ugbò ma ọ daghị mbà n’ekpere ya. Ọ dịbeghị anya mgbe Elaija nwere mkpughe banyere ịdị ukwu na ike nke Chineke, nke mere ka okwukwe ya nime Chineke guzosie ike. Ọ bụ ndị ahụ ka ọ na-arịọrọ arịrịọ, ma ibu-arọ ya dị kwa ukwu. Ihe o mere bụ iziga onye ná-ejere ya ozi ugbò asaa ile ma mmiri òzùzò dị, ma obi Elaija jigidesiri Chineke ike ọ pụghị kwa ịrapụ Ya ka Ọ laa -- dịka Jekob onye rụgidere Chineke n’ekpere o kweghị kwa ka mmụọ ozi nke Chineke laa rue mgbe ngọzi ahụ bịara. Mgbe onye ná-ejere Elaija ozi bịara wee gwa ya na ọ hụrụ igweoji ra ka aka mmdụ, nke a bụ ihe-àmà zuru òkè nye Elaija. Ọ matara na óké mmiri òzùzò ga-eso kwa ya n’oge ná-adịghị anya. Mgbe ọ dọsịrị Ehab aka-ná-ntị ka o si n’ugwu ahụ rịdaa tutu mmiri òzùzò egbochie ya, Elaija gbara ọsọ n’obiụtọ ná-enye Chineke otuto, n’iru ugbọ ala Ehab.

Eji ájà kpụọ Elaija dịka eji ya kpụọ mmadụ ọ bụla. Jemes gwara anyị na ọ “bu madu yiri ayi n’aru-ya” (Jemes 5:17), nke n’egosi na o nweghị ịdịmma ọ bụla ma ọbụ onyinye dị iche iche nke ndị Kraist ọzọ ná-apụghị inweta. “O we kpesie ekpere ike ka miri ghara izo; miri ezogh kwa n’ala arọ atọ na ọnwa isi. O we kpe ekpere ọzọ; elu-igwe we nye miri-ozuzo ala we mia mkpuru ya.” Anyị nwere ike ịrụgide Chineke ka O nye aha-Ya otuto, ma ọ bụrụ na ndị Ya ga-ekpesie ekpere ike dịka Elaija. Ekpesighị ekpere ike na-eme ka ike nke ọtụtụ ndị nke Kraist ghara iru otú o kwesịrị. Ikwere na Chineke náánị n’okpokoro isi agaghị anata ihe ọ bụla n’aka Chineke. Aghaghị iji iti mkpu ákwá kpọkuo Chineke n’okwukwe site n’alaala obi. Anyị agaghị ekwe ka ihe ọ bụla mebie eziokwu ahụ na Chineke dị na ọ ga-anụ za kwa ekpere. Mgbe ahụ anyị ga-ahụ na ọkụ ga-adakwasị àjà na onyinye anyị ọbụná dịka o si dakwasị nke Elaija. Ọ na-atọ Chineke ụtọ igosipụta Onwe-ya nye ndị Ya, Ọ ga-eme kwa otú a mgbe niile ma ọ bụrụ na anyị ekpere ekpere n’okwukwe.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị mere mmiri òzùzò ezoghị n’Israel arọ atọ na ọnwa isii?
  2. Gịnị ka Elaija nwere ime n’ịkwụsị mmiri òzùzò ahụ?
  3. Gịnị mere Elaija ji kpọkọta ndị ahụ?
  4. Gịnị mere ndị amụma Beal apụghị inweta ọzịzá site n’aka Beal?
  5. Gịnị mere Elaija ji were nkume iri na abụọ wue ebe ịchụàjà?
  6. Gịnị ka Chineke ji za ekpere Elaija ma Ọ zaghị nke ndị amụma Beal?
  7. Òlee otú Elaija si mara na mmiri gaje izo?
  8. Gịnị mere Elaija ji kpee ekpere ugbò asaa maka mmiri òzùzò?
  9. Gịnị kpatara ọgan’iru dị ukwu nke Elaija nwere n’ịkpọku Chineke?