I Ndi Eze 19:1-18

Lesson 298 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Onye-nwe-ayi matara idọpụta ha n’ọnwụnwa bú ndi nāsọpuru Chineke, na idebe ndi ajọ omume n’ahuhu nmehie rue ubọchi ikpé” (2 Pita 2:9).
Cross References

I Omume Jezebel n’ebe Chineke nọ

1. Iheịrịbaàmà niile nke oge garaaga ewetaghị mgbanwe ọ bụla nime Jezebel nke náegosi na náánị ọlụebube apụghị ime ka ndị náadịghị asọpụrụ Chineke chigharịkute Chineke, I Ndi Eze 19:1-3; 18:21-61; Matiu 14:3-11; Matiu 3:1-17 na 11:7-14; I Samuel 24:1-22; 26:1-25; 27:1

2. Dịka onyeiro nke Chineke na nke nsọpụrụ Chineke, Jezebel jiri ụzọ niile ọ hụrụ imezu nzube ya, I Ndi Eze 19:1, 2; 18:13; 21:7-16, 25

3. Jezebel nwụrụ mgbe oge ọnwụ ya ákàerughị n’ihi mmehie ya, 2 Ndi Eze 9:30-37

II Elaija na omume ya n’ebe Chineke nọ

1. Ọnwụnwa dị ukwu na mwuta nke ime mmụọ ma ọbụ nke ana-ahụ anya ná-abịara ndị ná-atụ egwù Chineke mgbe ụfọdụ, ọtụtụ oge mgbe enwesịrị mmeri dị ukwu nke ihe mmụọ, I Ndi Eze 18:1, 17-46; Ọnu-ọgugu 11:1-15; Joshua 7:6-9; Job 3:1-26; 10:1; Abù Ọma 31:1-24; Maika 7:1-7

2. Chineke nyere Elaija iwu ka o zoo onwe ya ná mmalite nke mkpagbu ahụ, I Ndi Eze 17:1-16

3. Ọsọ Elaija gbara n’oge a dị ka o bu n’obi na ọ bụ uche Chineke n’ihi ihe ahụ nke mere na mbụ, I Ndi Eze 19:4

III Ntụgharịuche nke Chineke banyere Onyeamụma Ya

1. Chineke eweghị iwe maọbụ gosi enweghị ndidi n’ebe Elaija nọ, kama o zigaara ya nkasịobi na nri, I Ndi Eze 19:5-8; Abù Ọma 103:13, 14, 17, 18; Matiu 4:11; Luk 22:43; Ndi Hibru 4:14-16; Aisaia 40:31; 41:10

2. Elaija gara n’iru n’ijè ya iru n’Ugwu Sainai, I Ndi Eze 19:8

3. Na Sainai Chineke gosịrị ịdị-adị Ya dịka Chineke dị nsọ, ná-abụghị kwa ike efu nke òkìkè. I Ndi Eze 19:9-14; Ọpupu 20:1; 33: 11, 18-23; 34:1-8

4. Enyere Elaija ọlụ ọ ga-alụ, nke ná-egosi na ọ ka bụ kwa onye amụma nke Chineke, I Ndi Eze 19:15-17

5. Chineke ná-enwerị, n’oge niile ndị fọdụrụ Ya ná-ekwesị ntụkwasị-obi, I Ndi Eze 19:18; Ndi Rom 11:2-5; Luk 12:32; Aisaia 1:9; 40:11; Nkpughe 3:4-12.

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Enwewo mmeri dị ukwu nke ihe mmụọ. Ebibiwo ndị amụma Beal gosi kwa mba Israel na Chineke nke nna ha Abraham bụ ezi Chineke ahụ, Ọ bụ kwa náánị Ya bụ Chineke. Nke a mere site ná nzute nke Elaija na Obadaia zutere na nzute ya na Ehab zutekwara n’ikpe-azụ, onye boro Elaija ebubo na ọ bụ ya buteere Israel arọ niile nke óké ụnwụ, ala ịkpọ nkụ, na nsogbu. Ma otú ọ dị, Elaija guzogidere eze ahụ, wee gwa ya na ọ bụ ya butere nsogbu ahụ niile n’ihi na o wezugara onwe ya n’ifè Chineke wee ná-efè Beal.

Edoziri ihe iji lee ule nke aga-eji mara onye bụ ezi Chineke. Enyere ndị amụma Beal ohere nke ha n’ihe ha kwenyere, bụ nke ha na-ekwu na Beal bú chi-anyanwụ nwere ike ime ihe kachasị mma -- ma ọ bụrụrị na ọ bụ ezi chi nke nwere ndụ na ike. Ma ikpere Beal alụpụtaghị ezi ihe ahụ nke achọrọ, ya mere ndị obodo ahụ niile tụgharịrị n’ebe Elaija nọ, bụ onye rịọrọ Chineke nke Israel arịrịọ wee nata kwa ọzịzá nke ekpere ya n’otù ntabi-anya ahụ. Site n’ezi nchègharị nke ndị Israel na mkwenye ha kwenyere n’ezí Chineke, Elaija rịọrọ ka Chineke zite mmiri òzùzò, azazu kwara ekpere a n’òzùzù òkè, mgbe nke a mesịrị Elaija wee gbaa ọsọ rịda n’ugwu ahụ jerue Jezreel, nke ịdị anya ya ruru, dịka agwara anyị, ihe ra ka maịlị iri na ise (ma ọbụ kilometre iri abụọ na anọ).

Ịhe Ịrịba-àmà na Urù ha Bara

N’oge ijéozi nke Jisọs n’elu ụwa arịrịọ Ya, n’oge dị iche iche maka ihe ịrịba-àmà iji wee gosi Ibụchị Ya na ike O nwere. Mgbe niile Ọ hụrụ na ihe ịrịba-àmà ma ọbụ ọlụ ebube ga-aba urù iji wee mee ka ụmụ mmadụ kwere n’eziomume ma ọbu n’ike Ya, Ọ dịghị etufu oge ịlụ ọlụ ebube ahụ ma ọbụ inye ihe ịrịba-àmà ahụ. Ma dịka edeworo ya ọtụtụ oge gara aga nime usoro ihe ọmụmụ a Chineke adịghị alụ ọlụ ebube ma ọbụ nye ihe ịrịba-àmà iji mezue ọchịchọ èfù nke ụmụ mmadụ, ma ọbụ ime ihe ha ga-eji chịa ọchị, ma ọbụ ime ihe mgbagwoju-anya nke karịrị ike ha ma ọbụ nghọta ha. Mgbe ọ bụla enyere ihe ịrịba-àmà, ma ọbụ lụọ ọlụ ebube, ana-eme ya ka ewee nye Chineke otuto, ka ewee sọpụrụ kwa aha Chineke na nke Ọkpara Ya bụ Jisọs Kraist, ka emee ka ụmụ mmadụ chègharịa, na ka ewee nye ha nkasị-obi ma ọbụ ịgbaume. Dịka anyị na-amụ ihe banyere ndụ na ijéozi nke Jisọs anyị na-ahụ na Ọ lụrụ ọlụ ebube dị iche iche n’ihi ihe ndịa.

Ma n’ihe banyere Jezebel, na ọtụtụ ndịọzọ nime Baịbụl anyị nwere ike ịhụ na náánị ọlụ ebube apụghị iduba ụmụ mmadụ nime Chineke ma-ọbụ nsọpụrụ Chineke. Náánị ma ọ bụ na ọ dị agụụ eziomume dị n’obi ndị ahụ ná-amaghị Chineke, o nweghi ọnụ ọgụgụ ọlụ ebube maọbụ ihe ịrịba-àmà pụrụ ime ka ha chigharịkute Chineke. Otù nime ihe mbụ mmadụ kwesịrị inwe mgbe ọ na-achọ ngọzi nke Chineke bụ inwe okwukwe na Chineke dị, na Ọ bụ Ya bụ ezi Chineke ahụ, na Ọ na-egosi kwa Onwe Ya Onye ná-enyeghachị ndị ná-achọ Ya ụgwọ ọlụ. Chineke pụrụ iji ọlụ ebube mee ka onye ji obi eziokwu ná-arụụka kwere, ma ọbụ ka onye ahụ nke ná-akpachapụghị anya jụ ịmata ihe banyere ike ịdị adị nke Chineke mata.

Jisọs rụtụrụ ndị ahụ nke ná-ajụ Ya ajụjụ maka ihe ịrịba-àmà aka n’ihe ịrịba-àmà enyewororị nime Okwu Chineke. Ọ gwara ha na ọ bụrụ na ha anaraghị ihe ịrịba-àmà ahụ niile na ha agaghị anara kwa ihe ịrịba-àmà nke Ya pụrụ inye ha. Ha jiri ịkpáchara anya rọrọ ime iheọjọọ. Ọ kwukwara na aga-eji ihe ịrịba-àmà ahụ niile enyeworo ha kpee ha ikpé site kwa na ha maa ha ikpé.

Jezebel ahụwo Chineke ka Ọ na-alụ ọlụ ebube, site n’ịzá ekpere nke orù Ya. Ejidere mmiri òzùzò, ewee nyeghachị kwa ya mgbe emesịrị. Ọkụ ahụ adawo kwa n’elu ebe ịchụàjà nke Chineke ná-agbanyeghị ihe mgbochi niile megidere ya, ebe ndị amụma Beal n’ịnụọkụ n’obi nke imebiga ihe òkè nke okpukpé ha, apụghị igosi ọbụná n’ụzọ dịkarịsịrị ntà na Beal, bụ chi ná-anụ ihe ka ọ fọdụkwarị ịzá ekpere ha. Ịgbaọsọ rue maịlị 15 (maọbụ kilomita 24) nke onye amụma ahụ gbara bụ kwa ọlụ ebube n’onwe ya nke pụrụ ime ka Jezebel kwere na Chineke nọnyere onye amụma Ya, ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ka emee ka ya kwenye. Ma ọ chọrọ mmehie Ya, wee jụkwa ihe ngosi ọ bụla enyere iji gosi nzuzù nke ihe ahụ niile nke ọ na-eme. N’ihi na ọ gara n’iru inupụisi megide ebere nke Chineke wee rọrọ kwa ụzọ mmehie ya niile akàrà mbibi ya akàrà.

Ụmụ mmadụ n’ụbọchị taa na-ajụ kwa irita urù site n’ike nke Chineke ana-egosi ha, ịhụn’anya, na ebere ana-egosi n’akụkụ ha niile n’ihi na ha na-arọrọ mmehie karịa ibi ndụ ná-enweghị mmehie, ịjọkarị njọ nime mmehie kama eziomume, ịnọ n’orù setan kama ịbụ nwa nke Chineke, ịnọ n’ọchịchịrị nke obi ịdambà kama inwe olile-anya nke “anapugh imebi, nke anādigh emeru kwa emeru, nke nādigh-atalata kwa” (I Pita 1:3, 4). Enyere ọtụtụ ihe ịrịba-àmà maka ọdịmma nke mmadụ niile, ma olenaole na-ekwenye n’ịdịmma nke Chineke Onye pụrụ ime ihe niile site na ha.

Nwa Chineke ọ bụla amụrụ ọhụụ bụ ọlụ ebube. E, ụbọchị niile nke ndụ ya dịka onye Kraist bụ ọlụ ebube. Nzọpụta site ná mmehie na ndụ nke otù mmadụ bụ ihe ịrịba-àmà nke zuru òkè ịma onye ọ bụla ikpé bụ onye hụrụ ndụ nke onye nke Chineke ahụ ma jụ kwa òkù nke Oziọma ahụ ezitere site na ya. Otù nnyeghachị nke arụike site n’ike nke Chineke ezuwo igosi na Chineke dị, ná-egosi kwa na Mkpuchi mmehie nke dị nime Kraist ka na-alụ kwa ọlụ maka mkpà niile nke ụmụ mmadụ. Chineke enyewo ọtụtụ ihe ịrịba-àmà na ọlụ ebube zuru ezù iji mee ka onye ọ bụla kwere n’ebere Ya, ike Ya, na ịdị adị Ya.

Ịdamba nke Ime mmụọ na nke Anụ-arụ nke Onye Ná-asọpụrụ Chineke

Ụbọchị niile dị mma nye onye Kraist dịka mmadụ niile maara nkeọma. O nweghị kwa ụbọchị iruuju ma ọbụ ịkwa-ụta n’ihi mmehie niile o mere n’oge gara aga na agụụ anụ-arụ niile. Onye nke Kraist na-ebi ndụ nke na-enye Chineke otuto ná-agbalịsi kwa ike ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ n’ihe niile ọ na-eme. Ọ na-eji ike ya niile eme ihe ahụ niile nke ga-alụpụta eziomume. Ọ bụghị ihe ịgba-agụgọ na ana-eji ike nke mmụọ na nke anụ-arụ alụ ọlụ Chineke ma mgbe ọ bụla eweresịrị ike niile a lụọ ọlụ, ike na-agwụ orù nke Chineke ahụ o wee daa mbà mgbe ụfọdụ.

Mmadụ aghaghị ịhụ obi ebere ahụ nke Chineke ji ná-emeso Elaija. Ihe ukwu niile a mere na hour olenaole gara aga, tinyekwara nnupụisi pụtara ìhè nke Jezebel megide Chineke, n’ezie dịka ihe ana-ahụ anya kwesịrị iwetara Elaija ma ọbụ onye nke Chineke ọ bụla obi ịdamba. Site n’ihe niile ahụrụ anya n’oge ahụ ntute ahụ enwere n’Israel bụ nnọọ nke ná-esiteghị n’ala obi. Elaija matara na ọ bụrụ na ndị ná-achị achị n’Israel echigharịkuteghị Chineke, na obodo ahụ niile agaghị eme otú ahụ. Agaghị enwe kwa òfùfè nke Ụlọukwu Chineke ma ọ bụrụ na eze ahụ ekweghị ka amalite ya ọzọ. Elaija matakwara na ndị Israel aghaghị ịlaghachị n’ikpere arụsị ọzọ ma ọ bụrụ òfùfè nke ezi Chineke abụghị ihe emere nime mmụọ na n’ịnụ ọkụ n’obi. Ọ dị ka agasị na mgbalị ya niile abụrụwo ihe laran’iyi n’ile ya anya dịka mmadụ.

Otú ọ dị, anyị pụrụ ịhụ na ọ bụ ezie na ebili mmiri nke ọnwụnwa pụrụ ịmali elu gburugburu anyị, o wee dị ka iheọma anyị mere pụtara ìhè n’ụdị dị ntakịrị, ọ bụrụ na anyị mara na anyị na-erubere Chineke isi, anyị aghaghị adamba ná ndụ ma ọbụ laghachị àzụ n’ọlụ ahụ nke Chineke nyere anyị ịlụ. Chineke ga-eduru anyị rue n’ọgwụgwụ ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị Ya obi. Ọ gaghị arapụ iji anyị lụọ ọlụ n’elu ụwa tutu rue mgbe Ọ ga-akpọ anyị laa n’ụlọ dị n’Eluigwe. Anyị nwere ọlụ anyị ga-alụrụ Ya oge niile anyị na-adị ndụ. Ọlụ ahụ nwere ike ịgbanwe n’ụdị ya dịka arọ ná-agafe, dịka ihe anyị nwere ike ime na ike anyị si agbanwe, ma ọ ghaghị ịbụ ọlụ nke Chineke, ọ bụ kwa ohere dịrị anyị ịlụ ya ná-aga n’iru rue mgbe Ọ ga-eduru anyị jee ịnara ụgwọ ọlụ ebighị ebi anyị.

Elaija ga-echeworị na omume a o mere site n’ịgbapụ n’ebe Jezebel nọ n’oge a bụ dịka uche Chineke si dị ebe agwara ya n’oge gara aga ka o zopụ onwe ya site n’ọnụmà nke onye mkpagbu ahụ. Ọ bụghị mgbe niile ka Chineke na-eji usoro ahụ nke O ji lụọ ọlụ na mbụ alụ ọlụ. Na O nyere anyị iwu ime otù ihe n’oge gara aga apụtaghị na Ọ ga ná-achọ ka anyị ná-eme otù ụdị ihe ahụ mgbe niile. Aghaghị ime ka anyị mata ihe bụ uche ya, eleghianya anyị agaghị amata taa ihe ga-abụ uche Ya banyere echi.

Otù mmụọ ozi nke si n’ebe Chineke nọ bịa zụrụ Elaija o wee gbalaga n’Ugwu Saịnaị n’ebe ahụ kwa ka Chineke kpugheere ya onwe Ya. Mgbe anyị na-adambà, ma ọbụ mgbe ike gwụrụ anyị, ọ kachasị mma ịga n’iru Chineke, n’ihi na n’ebe ahụ ka apụrụ imeju anyị ma mee kwa ka anyị dịike karịa maka agha na nsogbu niile nke dị n’iru anyị. Ọ dịghị ike aga-enweta n’ụwa. Ọ bụ Isi iyi ahụ nke sitere na Chineke bụ náánị ebe mkpụrụobi anyị nke akpịrị ná-akpọ nkụ pụrụ inweta ojuju afọ. N’Ugwụ Saịnaị, ma ọbụ Ugwu Horeb, ka Chineke kpugheere Elaija eziokwu ụfọdụ dị ebube ma nye kwa ya ọlụ ọ ga-alụ n’otù oge ahụ maka ọdịmma nke Nzukọ Kraist nke Àgbà Ochie ahụ n’ọdịn’iru.

Ihe yiri ibe ha n’akụkọ a na nke Moses n’elu otù ugwu ahụ bụ nnọọ ihe ekwesịrị ikwu okwu banyere ha. Ndịkom ndịa nke Chineke hụrụ ịdịike niile nke ihe ekèrè ekè ka egosipụtara ha n’iwe na ike ha, ma ha abụọ lefere ịdị ike nke ihe ndịa ekèrè ekè anya legide Chineke nke Eluigwe anya bụ Onye ahụ nke karịrị ịdị ike nke ihe ekèrè ekè, ike niile nke pụrụ imetụta ndụ mmadụ, mmụọ nke ana-apụghị ịhụanya ma ọbụ ijide aka, maọbụ ntụpụta èfù nke uche mmadụ. Ha hụrụ Chineke dịka ihe karịrị egbe eluigwe, karị kwa ifùfè, karị kwa ala-ọma jijiji karị kwa ọkụ nke ná-esiteghị n’aka mmadụ. Ndịkom ndịa nke Chineke na ndịkom ndịọzọ nke Chineke hụrụ Chineke dịka Ọ dị -- Onye Nsọ, Onye bụ Otù Ebube nime Ịbụisi ebighị ebi nke Chineke nke ná-enweghị nsọtụ.

Elaija na Moses n’otù n’otù zutere Chineke n’Ugwụ Saịnaị. Ha abụọ nọ n’ebe ahụ na gburugburu ebe ahụ, n’ihi na ha bụ ndị ná-agbaọsọ n’ihi ndụ ha site n’aka ndị mkpagbu ahụ ndị kpebiwororị ibibi ha. Moses nọchiri anya Iwu. Elaija nọchikwara anya ndị amụma; emekwara ka ha abụọ pụta ìhè n’oge Nwogha nke Kraist. Ndịkom abụọ ndịa nụrụ olu Chineke. Ha abụọ bụ kwa ndị amụma. Ha abụọ bụ ndị ná-agbalịsi ike ịhụ na aha na ijéozi nke Chineke guzosiri ike n’etiti ndị ná-ekpere arụsị.

Ndịahụ Fọdụrụ nke Kwesịrị Ntụkwasị-obi

Ihe ọzọ nke ná-egosipụta na ọ bụ ezie na Chineke baara Elaija mbá ma O weghị iwe megide ya bụ na enyere ya ọlụ ọzọ ọ ga-alụ n’oge a. Agaje ite Hazael mmanụ ịbụ eze ndị Siria. Hazael abụghị onye Israel, ala-eze ahụ nke ọ gaje ịchị abụghị kwa nke Israel. Anyị na-ahụ site na nke a na “ndi nāchi isi bu kwa ndi Chineke doworo” (Ndi Rom 13:1), na Chineke na-eleba kwa anya n’ihe niile ana-eme nime ụwa a. Otú ọ dị, dịka usoro ọchịchị nke govment anyị si dị n’ala Nigeria ugbu a, ọ bụ ndị obodo na-ahụ ihe banyere nrọpụta nke ndị ga-achị achị, nwa Chineke ọ bụla aghaghị ịlụ ọlụ niile o kwesịrị ịlụ n’obodo site n’ịtụli-aka elu ịrọputa ndị echèrè na ha dị mma karịrịsịa n’etiti ndị ná-azọ ọchịchị na ụzọ kachasị mma isi mee nke a, ná-agbanyeghị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke onye ahụ nọ nime ya.

N’Akwụkwọnsọ ana-ewere onye ọ bụla ná-achịisi dịka onye ná-ejere Chineke ozi, ma ọbụ onye ná-amaghị Chineke ma ọbụ onye ná-asọpụrụ Chineke. Aisaia kwuru okwu banyere Sairọs, n’ihe ra ka narị arọ na iriise (150) tutu amụọ eze ahụ, na ọ bụ orù Chineke. Akpọkwara Nebukadneza, orù nke Chineke. Akpọrọ ndịkom ndịa ndịorù nke Chineke n’ihi na Chineke jiri ha mezue nzube Ya dị icheiche, ọtụtụ mgbe iji ha nye obodo ahụ nke Ọ rọpụtara ahụhụ. Ihe ọmụmụ banyere ndụ Hazael na-egosi na Chineke jiri ya lụọ ọlụ n’ihi nzube a.

Agaje ité Jihu mmanụ ịbụ eze Israel iso n’otù nime ndị ga-anọchi anya Ehab. Chineke gaje kwa iji ya lụọ ọlụ ime ka uche Chineke banyere Israel pụta ìhè. Ma otite mmanụ nke kachasị otite mmanụ nke ndịa bụ Elaisha dịka onye ga-anọchi anya Elaija. Elaisha gaje ịbụ onye ndú nke ndị Israel n’ihe nke mmụọ, n’ihi nke a o jere ozi ọtụtu arọ n’ikwesị ntụkwasị-obi.

Ihe edepụtara banyere ijéozi nke Elaija rue ugbu a bụ ihe ra ka arọ atọ na ọkàrà, nke ra kwa ka arọ nke Onyenwe anyị jiri jeeozi. Ma nime oge ahụ ọ lụrụ ọtụtụ ọlụ dị ebube site na Chineke nke nọkwarị dịka ihe nlere-anya nye ndị ná-asọpụrụ Chineke nke ọgbọ niile. Elaija chèrè na náánị ya nọ n’oge a, na ọlụ ya nye Chineke alụpụtabeghị ihe atụrụ anya ya ịlụpụta maka ala-eze ahụ, ma Chineke gwara ya n’owuwe anya na aka nwekwara ndị fọdụrụ bụ ndị kwesị kwara ntụkwasị-obi, ndị ná-akpọbeghị isi-ala nye Beal

Puku mmadụ asaa nwere ike ịdị ka ọ bụ ọnụ ọgụgụ dị ukwu ma mgbe eji ya tụnyere ọnụ ọgụgụ nke ndị Israel niile -- bụ mba ahụ dị ukwu nke ha na Chineke gbararị ndụ ka ha bụrụ ihe nke aka Ya -- anyị ga-ahụ na ihe ná-erughị otù ụzọ nime otù narị nke ndị Israel bụ ihe dị nime òtù ahụ. Jisọs sịrị na ndị ahụ bụ ndị soro Ya ga-abụ náánị “ìgwè aturu ntà.” O nyeghị anyị nchekwube ọ bụla banyere ntute dị iche iche nke ga-eru ụwa niile nke aga-enwe n’ọgwụgwụ oge ndịa nke aga-azọpụta ìgwè mmadụ dị ukwu n’ọnụ ọgụgụ n’ụwa site na ya. Kama nke a, Ọ gwara anyị na ọ bụ mmadụ olenaole ga-adị ná njikere izute Ya.

“Mgbe Nwa nke madu gābia, Ọ gāhu okwukwe n’elu ụwa?” (Luk 18:8). Onye ọ bụla nime anyị kwesịrị ịjụ ajụjụ a mgbe anyị na-elepụ anya ná-ahụ ụwa nke jupụtara ná ndị ná-ekweghị ekwe. Nke a ga-eme anyị ka anyị mee ka mgbalị anyị dị òkpùkpù abụọ n’ịdọgbu onwe anyị n’ọlụ ịhụ na agbasara okwukwe a n’ọtụtụ ebe n’ụwa dịka enwere ike ime. Ma aga-ajụ ajụjụ ahụ n’ụzọ ọ ga-emetụta mmadụ niile n’otù n’otù karịa nke a. Anyị aghaghị ịjụ ya banyere onwe anyị.

Ọ bụ ndị ná-eso ụzọ Ya ka Jisọs na-agwa okwu mgbe Ọ na-ekwu ihe banyere ọbịbịa Ya nke ga-eme na mberede ná nkewa ahụ nke aga-enwe n’oge ahụ. Ọ bụ ndị ahụ wereworo aha Ya na ịta ụta Ya, na ndị niile rapụworo ihe niile n’ihi Ya, ka Pita kwuru okwu nke ịdọ aka-ná-ntị ndịa: “Ọ buru kwa na ọ di ike izọputa onye ezi omume, òle ebe agēgosi onye nādigh-asọpuru Chineke na onye-nmehie” (I Pita 4:18). Ọ bụrụ na ọ dịrị ndị ahụ rapụworo ihe niile, ndị gbalịworo iguzooro Aha ahụ nke dị óké ọnụ-ahịa karịa aha niile, ndị jikewororị iji ọbara ha mee ka òzízí Ya niile guzosie ike ma ọ bụrụ na ọ dị mkpà, ndị kpebiworo n’onweha iburu obe Ya iso Ya, ná-ebu kwa ịta-ụta Ya -- ọ bụrụ na ọ bụ ndịa ka ajụrụ ajụjụ a banyere inwe okwukwe gịnị ka aga-ekwu banyere ndị ahụ ndị akaemerughị ihe ndị ahụ meworo?

Aga-enwe ndị fọdụrụ afọdụ bụ ndị kwesị kwara ntụkwasị-obi, ma ọ ga-abụ náánị ihe fọdụrụ afọdụ. Ihe fọdụrụ afọdụ bụ ihe fọdụrụ site n’ihe ahụ zuwororị òkè. Ihe fọdụrụ afọdụ bụ nnọọ ihe dị ntà nke ekewapụtara n’ihe ahụ zuru òkè. Ihe fọdụrụ afọdụ bụ ihe fọdụrụ dịka ihe ọnụ-ahịa ha dị ala n’ahịa nke ụwa. Ana-ere ha n’ọnụ-ahịa dị ala karịa ihe ọnụ-ahịa ha ruru. Lee otú onyinye a si bụrụ eziokwu bụ nke Mmụọ Nsọ rọpụtara iji gosipụta Nzukọ Kraist ahụ nke aga-ewepụ na nzuzo dịka Nwanyị ahụ Ana-alụ ọhụụ nke Kraist. Ha bụ ndị fọdụrụ afọdụ bụ ndị kwesịrị ntụkkwasị-obi ndị ụwa na-ewere dịka ndị ná-abaghị urù ma Chineke hụrụ ha n’anya!

Òlee maka ha niile? Ebe ọ bụ na tutu mmadụ abụrụ otù onye nime ha niile ọ dị mkpà na anyị ga-eme ihe ahụ niile nke ndị ụwa na-akpọ ịchụàjà, gịnị bụ ihe dị mkpà nke aga-eme iji mee ka anyị bụrụ otù nime ndị ahụ fọdụrụ afọdụ? Apụrụ ịchọta ọzịzá nke ajụjụ ndịa nime Okwu Chineke. Okwukwe ahụ nke Kraist kwuru na ọ ga-adị ụkọ nime ọtụtụ mmadụ n’ọgwụgwụ oge ahụ bụ otù nime ihe niile ahụ dị mkpà nke ana-apụghị iwezuga. Ka Chineke kwe ka ndị niile ná-agụ ihe ndịa niile edepụtara “nāgbasi ngba ike n’ihi okwukwe ahu” ma bụrụ kwa otù nime ndị ahụ fọdụrụ afọdụ ndị kwesịrị ntụkwasị-obi!

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Kọwaa ụfọdụ nime ọlụ ebube niile ahụ ga-emeworị Jezebel ka ọ ghọta mmehie na nzuzu ya.
  2. Jezebel ò ritara urù site n’ọlụ ebube ahụ niile? Nye ihe mkwagide maka ọzịzá gị.
  3. Gịnị ọzọ dị mkpà ma ewezuga ọlụ ebube iji zọpụta ụmụ mmadụ ná mmehie ha?
  4. Tụlee ihe niile ahụ mere ná ndụ Elaija nke mekwara ná ndụ Moses.
  5. Àrọ ole ka edepụtara nke Elaija jiri jeeozi ya?
  6. Ònye bụ onye ahụ nke gaje ịnọchị anya Elaija?
  7. Chineke Ò were iwe megide Elaija n’ihi na ọ gbapụrụ n’iru Jezebel?
  8. Gịnị mere Elaija egosịghị nsọpụrụ ahụ o gosịrị mgbe ọ nụsịrị Olu ntà ahụ nke dị nwayọ mgbe ọ hụrụ mpụta ìhè nke ihe ekèreèkè?
  9. Gịnị ka Olu ntà ahụ nke dị ezi nwayọ na-egosi anyị banyere Chineke?
  10. Òlee otú aga-esi were onye ná-achị obodo nke ná-amaghị Chineke dịka orù nke Chineke?