I Ndi Eze 20:1-43

Lesson 299 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Unu ekwela ka eduhie unu; Chineke abugh onye anēleli; n’ihi na nkpuru ọ bula madu nāgha, nke ahu ka ọ gēweta kwa n’ubi” (Ndi Galetia 6:7).
Cross References

I Nnọchigide n’agha nke Anọchigidere Sameria

1. Ben-hedad na iri ndị-eze atọ na abụọ nọchigidere Sameria n’agha, I Ndi Eze 20:1

2. Ezigara Ehab ozi inye ihe niile o nwere dịkarịsịrị óké ọnụ-ahịa, I Ndi Eze 20:2, 3

3. Eze Israel kwenyere inye ihe niile ahụ achọrọ site n’aka ya, I Ndi Eze 20:4

4. Ozi nke abụọ bịara ná-ekwupụta ọtụtụ ihe sikarịrị nke mbụ ahụ ike ime, I Ndi Eze 20:5, 6

5. Ehab na ndị okenye Israel ekwenyeghị n’ihe ahụ achọrọ n’ozi nke abụọ ahụ, I Ndi Eze 20:7-9

II Agha Ahụ

1. Ben-hedad nyaraisi n’ịdịike nke ike ya, ma Ehab jiri ilu ziri ezi weda ịnyaisi ya n’ala, I Ndi Eze 20:10, 11

2. Edoro ndịagha Siria n’usoro, I Ndi Eze 20:12

3. Ụmụ okorọbịa ndị bụ ndị ná-achịisi n’ókè ala dị iche iche bụ ndị duru ndịagha Israel, Ehab wee bụrụ onye ndú ná-atụziaka n’agha ahụ, I Ndi Eze 20:13-19

4. Ndịkom Israel wee tigbuo, nwoke ọ bụla nwoke ibe ya, wee tinye ndịagha Siria n’ọgba aghara dị ukwu, I Ndi Eze 20:20, 21

5. Onye amụma ahụ dọrọ Ehab aka-ná-ntị na ndị Siria ga-abịaghachi ọzọ, I Ndi Eze 20:22

6. Iji gosi na Ya pụrụ ime ihe niile, Chineke raara ụsụ ndịagha Siria nke ugbò abụọ nye n’aka Israel, I Ndi Eze 20:23-30

III Elezighịanya Nke Ehab

1. Ben-hedad bụ onye emeriri emeri wee zigara Ehab ozi maka ime udo, I Ndi Eze 20:31, 32

2. Ehab wee zie ozi kpọọ Ben-hedad, ha wee gbaa ndụ, I Ndi Eze 20:33, 34; I Samuel 15:3, 8, 9

3. Onye amụma wee nwogharịa onweya, wee chee okwu Jehova n’iru Ehab n’ilu, I Ndi Eze 20:35-40

4. Ehab kwupụtara ikpé ọmụma dịrị ya onweya, I Ndi Eze 20:40-43

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Otù Onyinyo nke Ndụ

Nime akụkọ banyere mmekọ niile na agha niile dị n’etiti Ehab eze Israel na Ben-hedad eze Siria, apụrụ ịhụ ezi onyinyo nke ndụ. Ehab biri ndụ n’ụwa ihe ra ka narị arọ iteghete gara aga tutu amụọ Kraist, ma omume o mere n’ebe Chineke nọ adịghị iche n’omume apụrụ ịhụ ná ndụ ụfọdụ mmadụ n’ụwa taa. Ehab abụrụwo eze Israel ihe ra ka arọ iri na asatọ tutu Ben-hedad anọchigide ala ahụ n’agha, ma arọ niile a ka alaworo n’iyì n’ibi ndụ ajọomume na ikpere arụsị. O kwesịghị ka eze ahụ mehie ná-amaghị ama, n’ihi na ọ bụ Ụmụ Israel, ndị Chineke rọpụtara ka ọ náachị ma Chineke gosikwara ikwesị ntụkwasị-obi Ya site n’ịdọ eze ahụ akanántị n’ụzọ dị iche iche banyere mkwụghachị ụgwọ dị egwù na ikpé nke ajọomume ya niile ga-eweta. Ma eze ahụ nọgidesịrịike n’ajọomume ya. Eleghịanya o chere na mkwụghachị ụgwọ nke mmehie agaghị adị ukwu dịka ndị amụma kwuwororị.

Ụbọchị wee rue mgbe mmehie niile Ehab jibidoro ya. Chineke wee were Ben-hedad mee ngwa-ọlụ iweta Ehab n’ikpé ọmụma. Ìgwè ndịagha dị ọtụtụ, na ịnyịnya ibu, na ụgbọala gbara obodo Sameria gburugburu bụ ndịagha ejikọrọ ọnụ na ngwa-agha nke iri ndị-eze atọ na abụọ bụ ndị dịnyere Ben-hedad n’ijè a. Ben-hedad zigara ozi na Sameria, ná-akwọwa ihe ha ga-eme ka udo wee dị; ọ bụ ezie na ọnụ-ahịa ahụ dị ka ọ dị nnọọ elu, ma Ehab zaghachịrị na ya ga-emezu ihe niile achọrọ. Ọ dịghị ihe ọ bụla ọzọ Ehab pụrụ ime, n’ihi na ndịagha ntà ahụ nke dị na Sameria enweghị ohere ọ bụla itida nnọchigide ahụ ná-enweghị enyemaka sitere n’èzí. Ọnọdụ Ehab nime mmụọ ekwesịghị ekwesị ịkpọku Chineke maka enyemaka, Beal apụghị kwa inyere ya aka. Ehab ejeworo mmehie ozi ma ugbu a ọ ghaghị kwa ịnara ụgwọ ọlụ niile nke ndụ mmehie ahụ ga-eweta.

Owuwe ihe Ubi nke Mmehie

Chineke bụ onye kwesịrị ntụkwasị-obi nye mkpụrụobi ọ bụla. Ndị ná-abà nime mmehie na-eme nke a inupụrụ akọnauche ha na olu Chineke nke pụrụ iduba ha n’ụzọ niile nke eziomume isi. O nwere ihe dị ná mkpụrụobi mmadụ site n’ọmụmụ nke na-eme ka ọ mata na ụbọchị ikpé na-abịa. Ọ fọdụrụ ihe ntà ka mmadụ dum kwenye na onye náagha mkpụrụ nke mmehie n’ikwesi olu ike aghaghị inwe olileanya iwe ihe ubi dị egwù n’ọdịn’iru, nkekanke ma ọ bụrụ na onye ahụ echègharịghị site n’ụzọ mmehie niile ya. Ma otú ọ dị, ekwensu eduhiewo ọtụtụ ndị mmehie site n’ime ka ha chee na ha pụrụ ịnọ n’obi ụtọ nime mmehie otù oge ná-agbanyeghị otú mmehie ahụ si jọgbue onweya, emesịa na ha ga-esite ná mmehie niile ahụ dịkarịsịrị njọ chịgharịa wee gbanarị ọtụtụ nime ụgwọ ọlụ nke mmehie. Onye mmehie na-amata, na mmehie ga-achọ ụfọdụ ihe n’aka ya na ọnụ-ahịa dị iche iche, ma ọ naachè na ya pụrụ ịnaakwụ ụgwọ ndịa ka ọ naaga n’iru nime mmehie. O jikeere ịkwụụgwọ ọnụahịa nke dị ntà, ma náenwe olileanya na nnukwu ọkpụrụkpụ nke ajọomume ya agaghị abịaru ikpé. Ọ bụghị ihe mgbagwoju-anya na Chineke ekwuwo si, “Unu ekwela ka eduhie unu, Chineke abugh onye anēlelì: n’ihi na nkpuru ọ bula madu nāgha, nke ahu ka ọ nēweta kwa n’ubi” (Ndi Galetia 6:7).

Enweghị Afọ Ojuju

Ben-hedad enweghị ojuju afọ ọbụná mgbe Ehab kwere n’ihe mbụ ahụ ọ rịọrọ. Ehab ekwewo mkwà sị, “Nke gi ka mu onwem na ihe nile m’nwere bu” -- ndi nwunye, ụmụ, ọla-edo na ọla-ọcha. Ozi nke abụọ kwuru ka emeghepụsịa ọnụ ụzọ ama nke obodo Sameria nye ndịorù Ben-hedad, ka ha wee baa were ihe ọ bụla anya ha chọsiri ike. Ọchịchọ nke ahụ karịrị nke Ehab na ndị okenye Israel pụrụ ịnagide; n’ihi na ọ ka ha mma ịnwụ anwụ karịa na ha ga-erubeisi rue ná nweda n’ala dị otú ahụ. Ọ bụrị ihe iju-anya, na Ehab ga-eguzo ná mkpebi dị otú a megide Eze Siria ebe o kwesịworo mkwà inye Ben-hedad ihe niile o nwere. Ehab, dị ka ìgwè mmadụ ndị agbà ọhụụ a pụrụ iche na ya pụrụ ịkwụ ụgwọ site n’akwụkwọ nke ikwe mkwà náánị, ma o doro ya anya nkeọma na mkwà ya abụghị náánị nke akwụkwọ mgbe Ben-hedad kwuru na ya ga-achịrị ihe niile ahụ ekwere ya ná mkwà laa.

Otú a kwa ka ọtụtụ ndị mmehie hụworo na ekwensu enweghị afọ ojuju ịrapụ ha ka ha dabà nime mmehie nke ntà wee ghara ịgami agami. Ekwensu bụ nna ukwu ahụ nke ike ná-adịghị agwụ. Ọ na-enye kwa ọlụ dị ike, ná-achụso kwa ndị niile nọ n’okpuru ya ka ha ná-agami agami nime mmehie. Mmehie na-achọ ọnụahịa dị elu nke ukwu; ma, ọ bụ ezie na onye mmehie na-echè nime obi ya na ya ga akwụ ụgwọ nke ibi ndụ mmehie, ma oge ga-abịa mgbe mmadụ ná-aghaghị ikpebi na ya agaghị aga kwa n’iru ime mmehie. Ma dịka Ehab chọpụtara, onye mmehie na-ahụta kwa na ike ahụ nke ná-achị ya karịrị ike nke ya onweya. Ọ dịghị kwa olileanya dịrị ya maka nnapụta site n’ebe mmadụ ekèrè èkè nọ.

Enyemaka nke si n’Èzí

Ehab ga-anyaworị isi na ya agaghị ekwenye n’ihe niile Ben-hedad chọrọ: ma ọ ga-abụ náánị nwaoge rue mgbe ike nke ndịagha Siria ga-etiwa mgbidi Sameria niile, ma ọbụ nọchigide n’agha ahụ emee ka ha baa n’óké ụnwụ nke ga-emerị ka ha nwụbilata ghara kwa inwe ike iluso ndịiro nke ná-emegide ha ọgụ. Ọ bụrụ na enyemaka esighị n’ebe ọzọ bịa ndị Sameria na Ehab ga-abụworị ndị lara n’iyì; ma Ehab nwetara enyemaka site n’ebe ọzọ! Inyeaka ahụ sitere n’ebe dị nnọọ ichè karịa ebe o kwesịrị ịtụanya ya -- inyeaka ahụ sitere n’ebe Chineke nọ bịa. Ehab ekpeghị ekpere ma ọlị, ma aga enweworị ndị eziomume olenaole bi n’obodo ahụ ndị kpere ekpere. Arịrịọ ekpere Abraham maka Sọdọm mere ka Chineke kwe mkwà ịrapụ obodo ahụ ná-ebibighị ya ma ọ bụrụ na apụrụ ịhụta ndị eziomume iri nime ya. O juru Ehab anya nke ukwu, o kwesị kwara ka o ju ya anya, mgbe onyeamụma ahụ ji ozi bịa sị ha Chineke gaje ịnapụta obodo ahụ. Amanyeghị Chineke amanye ka o nyere onye ajọomume aka, nkekanke mmadụ ahụ kpachapụrụ anya chigharịa site n’ụzọ ahụ ziri ezi nke kwesịrị ka o soro lụọ ọlụ ma jee kwa ijè n’ìhè dịka Ehab. Onye amụma ahụ tụziri usoro agha nke Ehab ga-esoro, Chineke weta kwara mmeri ọbụná dịka O kwere mkwà. O, obi ebere nke Chineke anyị, na Ọ pụrụ inye onye ajọomume dị ka Ehab nnukwu nnapụta dị otú a!

Enyemaka ahụ nke sitere n’ebe ọzọ dịkwara onye mmehie ọ bụla, otù aka ahụ! Ọ bụ ezie na ajọomume ya dị ukwu, ọ bụ ezie na ọnọdụ ya kwa ka agaasị na olileanya adịghị, ọbụná ike adịghị nime ya itijipụ mkpọrọ nke mmehie, ma Chineke arọpụtawo ụzọ nnapụta site ná mmehie. “Madu nke hujuru anya ka mu onwem bu! ònye gàdọputam n’aru nke ọnwu a? Ma ekele diri Chineke na ndọputa sitere n’aka Jisus Kraist Onye-nwe-ayi” (Ndi Rom 7:24, 25). “N’ihi na Nwa nke madu biara ichọ na izọputa ihe nke furu efu” (Luk 19:10). “N’ezie anamaghọta na Chineke abugh onye nēle madu anya n’iru … onye ọ bula nke kwere na ya gānata ngbaghara nmehie” (Ọlu Ndi-ozi 10:34, 43). Jisọs Kraist Onyenwe anyị bịara n’elu ụwa nke a, bie ndụ, nwụọ, si kwa n’ílì bilie, ka ewee zọpụta onyemmehie site n’ụlọ mkpọrọ nke mmehie, ka ewee nabata ya n’Alaeze nke Eluigwe. Ehab gbanarịrị ntipịa, site n’ekpere nke onye ọzọ, ma eleghịanya; ma onye mmehie aghaghị ikpe ekpere nke ya onweya, ma ọ bụrụ na ọ na-achọ ịnata nzọpụta. Mmadụ dum pụrụ ịbịakute Onyenwe anyị -- ọ dịghị onye ana-egbochi; ma mmadụ niile aghaghị ịbịa site n’otù ụzọ: site n’okwukwe nime Jisọs Kraist, site n’ichigharị site ná mmehie niile emere, na site n’irubeisi n’okwu nke Chineke dịka ìhè nke agbasara ma kpughee kwa nye ndị mmehie. Lee ka ịdịmma nke Chineke si dị ukwu! Onye ahụ kachasị njọ nwere ezi ohere ahụ ịbịa maka nnapụta ọbụná dịka onye eziomume nke onweya pụrụ ime. Mmadụ ahụ nke matara na ọ nọ n’ọnọdụ enweghị olileanya na nke ịla n’iyì; site n’otú mmadụ pụrụ ichè, pụrụ ịchọta nnapụta mgbe ọ bịakutere Chineke.

Nnapụta

“Je ime onwe gi ka i di ike, mara, bu kwa ihe i neme: n’ihi na n’ọgbugba arọ ka eze Siria ganārigota imegide gi” (I Ndi Eze 20:22). Onye amụma ahụ jị kwa okwu ịdọ akanántị bịakute kwa Ehab nke ugbò abụọ. Chineke enyewo ndị ahụ nnapụta dị ukwu site n’aka ndịiro ha; ma O gwakwara ha, na onye iro ahụ ga-abịa ọzọ na mgbe dị ka nke a n’arọ ná-abịa abịa. Okwu Chineke bụ eziokwu. Eze Siria chịkọtara ndịagha niile wee doo ndị ọchị-agha ịbụ ndị ná-achị ụsụ ndịagha n’ọnọdụ ndị-eze dịka emere n’agha nke mbụ. Ndị Siria zubere ibuso Ụmụ Israel agha n’ala dị larị n’ihi na ha kpebiri na Chineke nke Israel bụ chi nke elu ugwu na ọ bụghị nke ndagwurugwu. Ndị Siria bịara n’anya ike imegide Israel. Ndịagha ha jupụtara obodo niile, ma ndịagha Israel dị n’iru ha “dika igwe-ewu nta abua”; ma ụsụ ndịagha na ọnụ ọgụgụ mmadụ abụghị ihe ọ bụla n’ebe Chineke anyị nọ. Chineke nyere Israel mmeri ahụ iji wee gosi ndị Siria, nke ná-ekpere arụsị na Chineke nke Israel dị, na ọ dị kwa ike karị ihe niile, na Ya onweya jupụtara nime ihe niile ekèrèèkè.

Ndụ nke onye Kraist na-agbaso onyinyo ahụ dị ebe a n’ụzọ ririnne. Chineke na-akpọpụta onye mmehie site ná ndụ jọgburu onwe ya ná njọ wee nye ya nnapụta dị ebube nke na-ebibi ajọomume na agụụ nke mmehie. Mmadụ ahụ abụrụwo onye ekèrè ọhụụ nime Kriast Jisọs, ndụ ahụ na-apụta kwa ìhè ná ndụ ya; ma Chineke na-adụ onye ahụ ọdụ ka ọ na-ejégharị n’ìhè nke Okwu ya, ka o wee dị ike nime Onyenwe anyị, ka o yikwasị kwa ihe agha niile nke Chineke; n’ihi na oge ule aghaghị ịdị. Onyeiro nke mkpụrụobi ahụ, bụ ekwensu, ga-alaghachị ịnwa na iché okwukwe na ntọala nke onye Kraist ahụ ákámgbá n’iru. Ọ bụrụ na onye Kraist ahụ ekwesị ntụkwasị-obi n’ebe Chineke nọ, ohere adịghị nye onyeiro ahụ inwe mmeri, n’ihi na “Onye ahu Nke nọ nime unu ka onye ahu nke nọ n’uwa uku” (I Jọn 4:4). Ọzọ kwa, “Ọ digh ọnwunwa ọ bula nwaworo unu ma-ọbugh nke madu nānagide: ma Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye nāghagh-ekwe ka anwa unu kari nke unu puru inagide; kama n’oge ọnwunwa ahu Ọ gēme kwa uzọ ngbapu, ka unu we nwe ike inagide ya” (I Ndi Kọrint 10:13).

Mkwà niile nke Ekwensu

Mmeri dị ebube ka enyeworo Ehab na Ụmụ Israel n’ebe ndịagha Siria nọ ugbò abụọ n’usoro n’usoro. Ehab kwesịrị ịmataworị n’oge ahụ na Chineke na ndị Siria na-ese okwu, ọ bụ ezie na Ben-hedad agbanarịwo ọnwụ wee dịrị ndụ. Ben-hedad zigaara Ehab ozi arịrịọ ka emeere ya ebere, ná-amataghị otú aga-esi nabata ozi ahụ; ma Ehab nabatara akụkọ nke mgbanarị nke Ben-hedad gbanarịrị ọnwụ ma kpọọ ya “nwanna.” Akpọrọ nzukọ n’etiti ndịeze abụọ ahụ nke lụpụtara ọgbụgbandụ wee mee ka Ben-hedad laghachị kwa na Siria n’udo. O kwere Ehab mkwà sị, “Obodo nile nke nnam nāra n’aka nna-gị, m’gēnyeghachi gi ha, i gākwa-kwa-ra onwe-gi amá nime Damaskọs, dika nnam kwara nime Sameria.” Lee ka ekwensu si dị aghụghọ! Ehab akaeduruworị ndịagha ya baa nime obodo Siria were kwa ala ahụ dum, ma kama nke a, ọ bara n’ọgbụgbandụ n’ihi nwantịị mkwà ekwere ya.

Ekwensu ji ọtụtụ mkwà dị ukwu ná-anwa mkpụrụobi nke OnyeKraist ọ bụla náánị ịhụ na mmadụ ahụ siri n’iso Chineke lachaghị àzụ wee bụrụ orù nke ekwensu; ma mkwà niile ọ bụla nke ihe ụwa a dị óké ọnụ-ahịa maọbụ nke nwere óké urù ma ọbụ aha amaara nkeọma nke ekwensu na-enye bụ náánị ihe efù. Ekwensu na-ekwe mkwà ihe dum ma ọ dịghị otù nime ha ọ na-enye ma ọ bụghị iruuju, ma Chineke na-ekwe ọtụtụ mkwà ma na-enye kwa ọtụtụ ihe karị nke mkpụrụobi ahụ pụrụ ichepụta. Lee, ịdị nzuzu nke mmadụ onye ná-ege ntị ná mkwà niile nke mmehie ma jikere ịnara àkụ dị ntà, nke ná-akpọnwụ akpọnwụ, nke ná-apụ kwa n’anya, nke ná-adị kwa nwa oge ntà! Chineke enyewo onye Kraist ezigbo mmeri na mkwà nke ndụ ebighị ebi na àkụ nke ná-adị ebighị ebi nke ná-abịa. Ò nwere ihe ọ bụla apụrụ ikwu nke aga-eji ọnụ-ahịa ya tụnyere ya? Ọ dịghị, o nweghi nnọọ ihe ọ bụla ma ọlị!

Ihe Akàràakà

Otù onye amụma bịakutere Ehab nke ugbò atọ, ma o jighi okwu nke agbam-ume ma ọbụ nke udo bịa n’oge nke a. Chineke debere otù ilu n’iru eze ahụ nke mere ka ọ bụrụ ihe dịrị ya inye ọzịzá kwesịrị ya. Ngwangwa eze zara, sị “Otú a ka ikpe-gi si di; gi onwe-gi ekwubiwo ya.” Onye amụma ahụ wee wepụ ihe o jiri nwogharịa onweya; ná mgbagwoju-anya nke eze, o wee sị, “Otú a ka JEHOVA siri, N’ihi na i zilagawo nwoke ahu ka ọ puọ n’aka-gi, bú onye M’wezugara ka ebibie ya, ndu-gi gala-kwa-ra ndu-ya, ndi-gi gala-kwa-ra ndi ya.”

Chineke ekèwo mmadụ ka ọ bụrụ onye nwere onwe ya ime omume dịka o si chọọ. Onye ahụ nke ná-arọrọ ifè Chineke, nke ná-ekwere na Ya ná-erube kwara Kraist isi dịka Onye nzọpụta ya, gaaba n’Eluigwe mgbe ndụ ya nke kwesịrị ntụkwasị-obi ga-agwụsị n’ụwa nke a; ma nwoke ahụ onye náajụ ịkwá ákwá nke mkpụrụobi ya, ná-arọrọ kwa ụzọ niile nke ụwa na mmehie, ná-efè kwa ekwensu ahụ òfùfè, ka aga-atụba nime ọdọ ọkụ ahụ n’ọgwụgwụ nke ihe niile. Rọrọ ihe kasị mma! “Otú a ka ikpé gi si di; gi onwe-gi ekwubiwo ya.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị bụ ozi Ben-hedad zigaara Ehab?
  2. Nzaghachị Ehab, o juru Ben-hedad afọ?
  3. Gịnị bụ mkpebi nke Ehab na ndị okenye Israel banyere ozi nke ugbò abụọ ahụ?
  4. Ònye meriri n’agha ahụ? N’ihi gịnị?
  5. Gịnị mere onyeamụma ahụ ji bịakute Ehab nke ugbò abụọ?
  6. Òlee otú Ehab si meso Ben-hedad, bụ onye adọtara n’agha?
  7. Gịnị mere omume Ehab jiri wee Chineke iwe?
  8. Òlee ụzọ Chineke si gosi Ehab na ihe o mere dị njọ?