I Ndi Eze 21:1-29

Lesson 300 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: Onye nēmekpa èzí-na-ulo nke aka ya aru ka onye akpiri urù nēzigh ezi nākpọ nku bu: ma onye nākpọ onyinye iri-ngo asì gādi ndu” (Ilu 15:27)
Cross References

I Ubi vine Ahụ enwere Anya-ukwu na ya

1. Ehab chọrọ ịzụ ubi vine Nebot, I Ndi Eze 21:1, 2

2. Ọjụjụ Nebot jụrụ bụ dịka Iwu si dị, I Ndi Eze 21:3; Levitikọs 25:23; Ọnu-ọgugu 36:7; Ezikiel 46:18

3. Ehab gbarụrụ iru, I Ndi Eze 21:4

II Nzube Ọjọọ nke Jezebel

1. O ledara ihe enyere n’Iwu anya, I Ndi Eze 21:5-7

2. O wee tụọ àtụmààtụ nke igbu mmadụ, I Ndi Eze 21:8-10

3. O mezuru àtụmààtụ nke igbu mmadụ ahụ, I Ndi Eze 21:11-14

4. Ehab wee were ihe nketa ahụ, I Ndi Eze 21:15, 16

III Elaija Kwupụtara Ahụhụ nke gaje Ịdakwasị Ehab

1. Okwu Jehova wee rue Elaija ntị banyere Ehab, I Ndi Eze 21:17-19

2. O wutara Ehab n’ihi na ejidewo ya, I Ndi Eze 21:20

3. Ehab nụrụ ihe banyere ahụhụ ahụ nke ga-adakwasị èzínaụlọ ya, I Ndi Eze 21:21-24

4. Akpọrọ aha Jezebel dịka onye kpaliri Ehab ime omume ọjọọ na ikpere arụsị, I Ndi Eze 21:25, 26; 16:31; 18:13

5. Mweda n’ala nke Ehab napụtara ya n’ahụhụ ya na nwa mgbe ntà, I Ndi Eze 21:27-29; Abù Ọma 86:5; Abù-Ákwà 3:22.

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Iwu Banyere Ihe nketa

Ọ ga-adị ka Ehab na-enyerị Nebot ezi ihe iji gbanwere ubivine ya, ma ọ bụrụ na eleba anya n’ihe na-eme taa banyere mmekọrịta nke ihe banyere ihe nketa. Ehab sịrị na ya ga-enye Nebot ubivine ka mma ma ọbụ kwụghachị ya ihe o ruru n’ego. Ma otú ọ dị, iwu ndị Israel dị ichè na nke anyị n’ihi na Chineke enyewo iwu sị, “Agagh-ere ala ahu rue mgbe ọ gādiru; n’ihi na Mu nwe ala ahu: n’ihi na ndi-ọbia na ndi-nnọdu ka unu bu n’alam” (Levitikọs 25:23). N’ụzọ dị otú a anyị hụrụ na Ehab na-achọ inweta ihe megidere iwu Chineke.

Iwu nke Chineke nyere banyere ala ndị Israel zuru òkè n’ihe banyere àkụnaụba ọ bụ ezie na nke a adịghị amasị mkpụrụobi nke onye ahụ nwere anyaukwu. Ọ bụrụ na mmadụ sitere n’ihi ịbụ ogbenye ree ala ya, aghaghị iweghachi ala ahụ nye onyenwe ya na mbụ n’oge ememe nke Arọ óké ọñụ (ma ọbụ n’Arọ Jubilee) nke ana-eme kwa iri arọ ise ọ bụla. N’ihi nke a mmadụ agaghị abụ onye nwere ọtụtụ ala ma mee ndịọzọ ka ha bụrụ ndị ogbenye nwere ala ntakịrị ebe ha na-alụ ọlụ ubi. Adụkwara ndị ná-achị achị ọdụ banyere nke a: “Ọzọ, onyeisi aghagh-ewere ihe ọ bula n’ihe-nketa nke ndim, inapu ha ihe-nketa-ha n’ike; ihe nke si n’ihe-onwunwe-ya puta ka ọ gēme ka umu-ya ndikom keta: ka ndim we ghara igbasa, onye ọ bula ọ pua n’ihe-onwunwe-ya” (Ezikiel 46:18). Chineke achọghị ka ndị ná-achị isi n’Israel megide ndị ha na-achị ma ọbụ ghọgbuo ha. Ọ rapụwokwara ndị ndú nke ihe nke ime mmụọ ndụm-ọdụ n’ụbọchị taa: “Nāzunu ìgwè aturu nta Chineke nke di n’etiti unu, nēlekọta ha anya, ọ bugh n’ihi na nkpà nākpa unu, kama site n’ọchichọ obi, dika Chineke chọrọ; ọ bugh kwa n’ihi urù nēweta ihere, kama n’ihi na unu di ọku n’obi; ọ bugh kwa dika agāsi na unu nēme ndi bu ihe-nketa dika unu bu ndi-nwe-ha, kama nēme onwe-unu ihe-atù ìgwè aturu nta ahu gēñomi” (I Pita 5:2, 3).

Mgbapụta na Oge Óké ọñụ

Mgbe mmadụ na-ere ala ya, ọ na-ere ya dịka ọnụ ọgụgụ arọ nke fọdụrụ si dị tutu Arọ Óké ọñụ eruo; dịka ihe ịma-atụ, ọ bụrụ na ọ fọdụrụ arọ iri na asatọ tutu Jubiliee erue ma ọnụ-ahịa erere ala ahụ bụ ¤1,800 kwa arọ, aga na-ewepụ ¤100 n’ọnụ-ahịa erere ala ahụ tutu Arọ Jubilee erue, mgbe ahụ ọ gapụ n’ihe ibé. Mgbe ọ bụla onye nwe ya na mbụ, ma ọbụ nwanne ya, chọrọ ime otú a, o nwere ike ịgbapụta ya site n’ịkwụ ọnụ-ahịa erere ya na mbụ ná-ewepụ kwa ihe n’ọnụ ya dịka Arọ Jubilee ji dị nso site na mgbe erere ala ahụ.

Akụkọ banyere Rut bụụrụ anyị ihe-atụ dị mma banyere otú Boaz, dịka onye sitere n’èzínaụlọ ahụ, ji gbapụta ihe onwunwe nke Naomi, ma nabata kwa Rut dịka nwunye ọhụụ ya. Rut wee si otú a bụrụ ụdị Nwunye ọhụụ nke Kraist nke sitere ná Ndị mbaọzọ. Erere anyị nye mmehie, rue mgbe Kraist Onye mgbapụta anyi jiri Ọbara Ya dị óké ọñụ-ahịa gbata anyị ka anyị wee keta “ihe nketa anapugh imebi, nke anādigh-emeru kwa emeru, nke nādigh-atalata kwa, nke edebeworo n’elu-igwe nye unu” (I Pita 1:4). Ị na-agụ ihe nketa gị n’ihe dị óké ọñụ-ahịa dịka Nebot gụrụ nke ya? Ọ sịrị Ehab, “Ya burum ihe-árú sitere na JEHOVA, bú inye gi ihe-nketa nnam-hà” (I Ndi Eze 21:3).

Anya-ukwu

N’ihi na ọ nataghị ihe o ji anya-ukwu ná-achọ, Ehab, dịka nwatakịrị iwe na-ewe si agbarụ iru ya “we dina n’ihe ndina-ya, chigharia iru-ya, o righ kwa nri.” Nke a gosiri otú anya-ukwu dị n’obi ya si dị ukwu. Iwu nke iri n’iwu ahụ nke Chineke nyere Ụmụ Israel bụ “Gi enwela anya-uku … n’ebe ihe ọ bula di nke madu ibe-gi nwere” (Ọpupu 20:17). Ehab si n’elu mgbidi nke ụlọ ukwu eze lefee anya wee hụ ubi vine a mara mma nke ukwu ma kpebìe na ọ ga-abụ ebe dị mma nye ya ịkụ akwụkwọ nri. Ma ugbu a ọ dị ka ọ dịghị ihe ọjọọ ọ bụla dị ya n’ịchọ iwere ala ntakịrị ahụ nke dị nso ihe onwunwe ya, ma Chineke asịwo É-è. Ọ bụrụ na onye agbata-obi anyị nwere ihe dị mma nke ọ na-añụrị ọñụ na ya, nke a bụ ohere nke ya, ọ bụrụ na o nwere karịa anyị, ọ pụtaghị ihe ọ bụla; ọ ka bụ kwa nke ya, anyị ga-elezi kwa anya ka anya anyị ghara iduba ọchịchọ nke obi anyị n’ihe onye ọzọ.

Anya-ukwu so n’otù nime mmehie kachasị ochie n’akụkọ ụwa, ọ na-abụ kwa ọdịda nke ọtụtụ mmadụ taa. Ma eleghịanya setan mere ka Iv ná-agagharị osisi ahụ gburugburu, ná-ele kwa mkpụrụ ya anya rue mgbe ọ ná-apụghị iguzogide ya ọzọ. O wee duba ọgbọ niile nke ụmụ mmadụ nime mmehie. Lot weliri anya ya lee ala niile dị larị nke Jọdan bụ nke mmiri na-ede nkeọma, ngwangwa o wee ma ụlọikwu ya na nchèrịta iru Sọdọm, ma n’ikpe-azụ o jisiri ike wepụga onwe ya n’ihi ndụ ya. Ekan hụrụ ụfọdụ n’ihe akwatara n’agha nke Jeriko otù ezi uwe nwụda nke Babilon, na narị shekel ọla-ọcha abụọ, na otù mkpirimkpi ọla-edo; o wee were ha, n’ihi nke a atụgburu ndị èzínaụlọ ya niile na nkume. Gihezi hụrụ onyinye niile nke Neaman o wee gbaso ha, ma n’ikpe-azụ ekpenta Neaman rapara ya n’arụ. Judas legidere anya n’ego wee ree Onyenwe ya n’ọnụ-ahịa dị mkpụrụego ọla-ọcha iri atọ, ma o mere ka ndụ ya gwụsịa site n’ịkwụgbu onweya. Ọ bụghị ihe ịtụn’anya na adụrụ anyị ọdụ: “Unu ahula uwa, ma-ọbu ihe nke di n’uwa, n’anya. Ọ buru na onye ọ bula ahụ uwa n’anya, ihu-n’anya nke Nna-ayi adigh nime ya, n’ihi na ihe nile nke di n’uwa, bú agu ihe ọjọ nke anu-aru, na agu ihe ọjọ nke anya, na oké-okwu nke ibi-obi, esitegh na Nna-ayi, kama o sitere n’uwa” (I Jọn 2:15, 16).

Àkụ N’eluigwe

Ọ bụghị náánị ihe ịdọ akanántị megide inwe anya-ukwu n’ebe ihe nke ụwa a dị ka arapụrụ anyị kama agwakwara anyị ebe ọchịchọ na àkụ anyị niile kwesịrị ịdị: “Kpadonu àku n’elu-igwe nye onwe-unu, ebe nlà ma-ọbu nchala nādigh erichapu, ebe ndi-ori nādigh egwupu kwa, ha adigh-ezu kwa ori: n’ihi na n’ebe àkù-gi di, n’ebe ahu ka obi-gi gādi kwa” (Matiu 6:20, 21). “Tukwasinu uche n’ihe di n’elu, ọ bugh n’ihe di n’elu uwa” (Ndi Kọlosi 3:2). Jisọs sịrị nwaokoro ọgaranya ahụ: “Ọ buru na i nāchọ ka i zue òkè, laba, re ihe nile i nwere, nye ndi-ogbenye, i gēnwe kwa àkù n’elu-igwe: bia kwa som” (Matiu 19:21).

Onye nke Kraist nwere ndụ ebighị ebi n’ihi nke a ka ọ ná-aghaghị iwezuga anya ya n’ebe ihe ndịa niile naadị ná nwaoge dị wee lekwasị ihe niile ná-adị ruo mgbe ebighịebi anya. Ehab hụrụ ubi. Gịnị ka ị ná-ahụ? Òlee ebe anya gị dị? Abraham “nēle anya obodo ahu nke nwere ntọ-ala ahu, nke Chineke bu onye-ọkà-ya na onye luru ya” (Ndi Hibru 11:10). Ọ bụ kwa otù onye nime ndị ahụ bụ ndị kelere wee “kwuputa na ha bu ndi-ọbia na ndi nọ dika ọbia n’elu uwa. N’ihi na ndi nēkwu ihe di otú a nēgosi na ha nāchọ ala nke gābu nke aka ha” (Ndi Hibru 11:13, 14). Gịnị ka ị ná-achọ? Ehab chọrọ ubivine; Jezebel nwetara ya nye ya.

Jezebel

“Otú ọdi, ọ digh onye dika Ehab, onye rere onweya ime ihe jọrọ njọ n’anya JEHOVA, onye Jezebel, bú nwunye ya rafuru” (I Ndi Eze 21:25). Ihe ịmatụ na ọ bụ Jezebel rafuru Ehab pụtara ìhè mgbe ọ sịrị: “Ọ bugh gi onwe-gi bu eze nāchi Israel ugbu a? bilie, rie nri, ka obi-gi di nma: mu onwem gēnye gi ubi-vine Nebot, bú onye Jezreel” (I Ndi Eze 21:7). Okwu niile a ka o ji gbaa ìzù igbu Nebot. Ọ hụrụ na emezuru ìzù ahụ, mgbe ahụ o wee zie Ehab ka ọ rịda inweta ubivine ahụ. Ịwụsị ọbara ná-emeghị ihe ọjọọ dị otú a na ụdị aghụghọ ná-enweghị obi ebere nke a adịghị ihe ọ pụtara nye onye a tejiri iru ya nzụ na òdò, nke ná-efè kwa Beal òfùfè. O gburu ndị amụma niile nke Chineke ma ná-elekọta narị ndị amụma asatọ na iri ise ndị bụ nke ya. Ọ pụrụ iji aghụghọ gbue mmadụ dịka aga-asị na ọ na-ebuli aha chi ya elu, ma, bụrụ kwa onye ji obi ya niile ná-efesi Beal ike. Omume ihe dị iche iche nke akpọkwasịworo n’aha okpukpé abụrụwo akụkọ ntetọ nke metụtara ọtụtụ ọgbọ n’akụkọ nke ụwa niile.

Ikpé na Ebere

Ma otú ọ dị, ka onye ọ bụla ghara ichè na Chineke adịghị ahụ (ma ọbụ echèta) ihe ndịa niile; n’oge ná-adịghị anya ikpé ga-abịa. Chineke zigara Elaija ịtụ Ehab mmehie ya n’anya mgbe ọ rịdara inweta ubivine Nebot. Elaija gwara nnọọ Ehab ikpé ahụ niile nke ga-adakwasị ya na èzínaụlọ ya. Nkịta gaje iri ozù Jezebel n’ọnụ-ụzọ ama Jezreel, n’oge ná-adịghị anya aga-ebipụ ihe onwunwe niile nke Ehab. N’ụzọ ana-atụghị anya ya ozi nke Onye amụma nke Chineke a ná-anụ ọkụ bara n’obi nke eze mmebi iwu a. O wee yikwasị ákwà mkpé n’arụ ya ná-ejegharị kwa nwayọọ nwayọọ. Ewo, lee ịhụn’anya dị ukwu nke Chineke anyị Onye gosiri ebere nye ọbụná Ehab mgbe o wedatara onweya ala n’iru Chineke!

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị mere Nebot eresịghị Ehab ubivine ya?
  2. Gịnị gosịrị na Ehab nwere anya-ukwu?
  3. Gịnị ka iwu kwuru banyere inwe anya-ukwu?
  4. Kpọọ aha ndịọzọ daworo ada n’ihi anya-ukwu.
  5. Òlee otú Jezebel siri nápụta ubivine Nebot nye Ehab?
  6. Gịnị gosịrị na ikpé mara Ehab nime ihe mmekpù ahụ?
  7. Òlee onye ọzọ ikpé makwara n’izu ọjọọ a?
  8. Kọwaa iwu banyere ire ihenketa n’Israel?
  9. Òlee oge na ebe Elaija zutere Ehab?
  10. Gịnị bụ ikpé ahụ ekwupụtara megide Ehab?
  11. Gịnị ka okwu Elaija lụpụtara ná ndụ Ehab?
  12. Òlee otú esi gosi Ehab ebere Chineke?