Ọlu Ndi-ozi 6:1-7; I Timọti 3:1-16; 5:17-19; Titọs 1:5-9;I Pita 5:1-5

Lesson 288 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Nēkwenyenu ndi-isi-unu, nēdo-kwa-nu onwe-unu n’okpuru ha: n’ihi na ndi ahu nāmu anya n’ihi nkpuru-obi-unu” (Ndi Hibru 13:17).
Notes

Itó Étóv

Ka ndị ná-eso ụzọ Jisọs na-ekwusa banyere Jisọs, atụkwasịrị mmadụ n’ọnụ ọgụgụ ha. Òtù ndị kwere ekwe bara ụba ruo na Ndị ozi apụghị kwa ịlụzụ ọlụ niile dịrị ha nkeọma. Ndị Ju ná-asụ asụsụ Grik malitere ịtamù na elefuuru ndịnyom ha ndị di ha nwụrụ anwụ anya. Otù akụkụ nke ọlụ Ndịozi bụ ikesara ndị nọ ná mkpà ihe nke anụ-arụ (Ọlu Ndi-ozi 4:35).

Ebe Ndịozi bụ ndị Hibru, ọ ga-adị ka ha na-elekọta otù ndị anya karị ndịọzọ, n’ihi na anụghị na elefuuru ndịnyom Hibru ndị di ha nwụrụ anwụ anya. Ọ ga-abụ na akpachapụghị anya lefuru ha anya. Baịbụl kuziri ihe megide ime ihe n’ụzọ ịsọ anya (Ilu 24:23; Job 13:10; Levitikọs 19:15). Pọl dere okwu ndịa nye Timọti: “Anamagwasi gi ike n’iru Chineke, na n’iru Kraist Jisus, na n’iru ndi-mọ-ozi arọputara, ka i debe iwu ndia, ghara ima ikpé mgbe i kānugh, ghara kwa ime ihe ọ bula n’uzọ isọ-anya” (I Timọti 5:21).

Okwu Mkpesa

Agwaghị anyị onye ekpesara mkpesa a. Mgbe ụfọdụ ụmụ mmadụ na-eburu ntamù ha jekwuru ndịenyi na ndị agbata-obi ha, ma ha adịghị ejekwuru ndị isi ha bụ ndị pụrụ idozi ihe ahụ ná-ezighị ezi. Otù onye buuru okwu a jekwuru Ndịozi ná-achọghị ka ekpuchie ihe ọ bụla, ewee mee ka ihe butere okwu ntamù ahụ kwụsị

Ọ bụrụ na elefuru gị anya mgbe ana-eke akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ, ị ghaghị eme ka onye nkụzi gị mara banyere ya? Ọ bụrụ na mgbe unu nọ n’ọzara ebe anyanwụ na-achasi ike, ewee nye ndịọzọ ihe na-eme ka arụ jụọ mmadụ oyi ma enyeghị gị ị ghaghị agwa nne gị na enyeghị gị? Ọ bụghị ihe ziri ezi ime ka ndị isi mara mgbe ihe ná-adịghị agazi agazi?

Anyị amaghị ma o kwesịrị ka enwee ụdị okwu ntamù a. Ma o ziri ezi, maọbụ na o zighị ezi, emere ka ihe wetara ntamù ahụ kwụsị. Akpọrọ nzukọ, ìgwè ndị ná-eso ụzọ Jisọs nọ kwa n’ebe ahụ. Ewee kpebie ihe banyere okwu ntamù ahụ.

Ijiobichụaàjà Dị Omimi

Jisọs akpọwo ndị ná-eso ụzọ Ya ịlụrụ Ya ọlụ. Ọ gwawo ụfọdụ nime ha sị, “Bianu som n’azu, M’gēme unu ndi-ọku nākuta madu” (Matiu 4:19). Jisọs gwara ndị ná-eso ụzọ Ya na ọ bụghị ha onweha rọpụtara Ya, kama na ọ bụ Ya onweya rọpụtara ha, wepụta kwa ha iche, ka ha jee mịa mkpụrụ (Jọn 15:16). Jisọs kpọrọ Ndịozi iri na abụọ ahụ wee zipụ ha ijé kwusaa Oziọma, gwọọ kwa ndị arụ ha ná-adịghị ike (Matiu 10:1-8). Mgbe Jisọs rịgosịrị n’Eluigwe (Ọlu Ndi-ozi 1:9), o wee bụrụ ọlụ dịrị Ndịozi iri na abụọ ahụ ikwusa na ịgbasa Oziọma nke nzọpụta. Nke a bụ ọlụ nke mmụọ ahụ akpọrọ ha ịlụ.

Ka ọnụ ọgụgụ ndị kwere ekwe na-aba ụba, otú a ka ọlụ dịrị ha na-aba ụba. Ndịozi iri na abụọ ahụ wee gwa nzukọ ahụ ka ha rọpụta mmadụ asaa ndị aga-enyefe ụfọdụ ọlụ ahụ n’aka ịlụ -- ilekọta ihe nke anụ-arụ. Mmadụ iri na abụọ ahụ wee sị na ha “gānọgidesi ike n’ekpere ayi, na ijé-ozi okwu Chineke.” O metụrụ ha na o kwesịghị ka asị na o nwere ihe napụrụ ha oge na nlegide anya ha n’ebe ọlụ ahụ nke Chineke kpọrọ ha nọ.

Ndị Deacon

Mmadụ asaa ahụ ná-elekọta ihe n’ụlọ nzụkọ ka ana-ewere dịka ndị deacon. Arọpụtara ha inyere Ndị ozi aka na ikesa ihe oriri nye ndị ahụ nọ ná mkpà. Tupu arọpụta ha, Ndịozi gwara ndị ahụ sị, “Chọputanu n’etiti unu ndikom asa ndi agbara ha ezi àmà, ndi juputara na Mọ Nsọ na amam-ihe.” Ihe ndịa ka achọrọ -- ndị agbaara ezi àmà, jupụtara na Mmụọ Nso na amamihe. Ihe ahụ achọrọ dị elu ma ndị ahụ chọrọ ịbụ ndị ọlụ nye Onyenwe anyị aghaghi ibi ndụ dị nsọ na nke ziri ezi.

Mmadụ asaa ahụ agbaara ezi àmà bụ ndị ana-akpọ aha dị mma n’ebe ụmụ mmadụ nọ. Ha nwere omume dịmma, bụrụ kwa ndị ná-adịghị ịtaụta. Ụmụ mmadụ ga-enwe ntụkwasịobi n’ebe ndị dị otú a nọ. Ndịkom asaa ndịa nwekwara onyinye nke ihe nke mmụọ. Ha jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ha anatawo ọwụwụ mmiri nke Mmụọ Nsọ, nke bụ onyinye nke Chineke (Ọlu Ndi-ozi 2:38; 10:45), nke na-eme ka mmadụ bụrụ onye àmà nye Onyenwe anyị, ná-enye kwa onye ahụ ike ijéozi (Ọlu Ndi-ozi 1:8). Ha ejiwo ike ahụ lụọ ọlụ ma ọbụghị otú a, ha gaara etufu ya. Ha anọgidewo n’ikpe ekpere na iji ndụ ha chụọ àjà nye Chineke. Ịnata Mmụọ Nsọ bụ ngọzi dị ebube, kama ọdị óké mkpà na mmadụ ga-edebe ngọzi nke Chineke ná ndụ ya.

Elekwara anya na ndị deacon asaa ahụ ga-enwe amamihe. Ọ bụ kwa ihe elereanya na o ziri ezi na ndịkom a ga-enwe kwa ọzụzụ nke ga-enyere ha aka ilekọta ọlụ nke etinyere ha n’aka.

Nzukọ ahụ rọpụtara ndị deacon asaa ahụ. Ndịozi wee kwagide ya, wepụta kwa ha ichè site n’ekpere. Anyị na-ahụ na apụrụ idozi aghọtaghị aghọta ọsọsọ ná-enweghị mmekpa-arụ. Ndịozi eleghị anya n’ike nke onweha. Ewere ọlụ ahụ ndịọzọ pụrụ ịlụ nyefee n’aka ndị deacon asaa ahụ. Ọ bụghị na Ndịozi na-elefuru ọlụ dịrị ha anya, kama ha naekesa ya. Ha jiri ịhụn’anya na amamihe tinye ndịkom a atụkwasịrịobi n’ọnọdụ ilekọta ihe ndịa ná-adị nwa oge. Obi ga-atọworị Chineke ụtọ banyere ụzọ a esi dozie ihe, n’ihi na ọnụ ọgụgụ ndị kwere ekwe bara ụba, ewee kwusaa kwa Okwu Chineke ná-enweghị mgbochi.

Ndị Nlekọta ọzọ Nime Ụlọ nzukọ

Mgbe ọtụtụ mmadụ batara nime nzukọ, ewee meghee ọtụtụ ụlọ nzukọ ọzọ, ọ dị kwa mkpà na aga-enwe ndị ná-ejere nzukọ Kraist ozi na ndị nlekọta n’ụlọ nzukọ karị ka enwere na mbụ. Nime ihe odide nke Pọl na Pita anyị hụrụ ụfọdụ ndụm-ọdụ banyere ndị ná-elekọta nzukọ Kraist anya na ndị okenye na ndị ná-ejere nzukọ Kraist ozi. Ndị ná-elekọta nzukọ Kraist anya bụ ndịozi ndị nzukọ niile nọ n’okpuru ha. Agbara ha ume ka ha, “nējide okwu ahu nke kwesiri ntukwasi-obi” ka ha wee pụ “idusi ọdụ ike nime ozízí nke nēnye ezi ndu, na itu kwa (ha) mmehie ha n’anya” bụ ndị naege gị ntị (Taitọs 1:9). Ndịozi ọzọ, tinyekwara ụfọdụ ndịọlụ, ka akpọrọ ndịokenye. Ha onwe ha kwa ka asịrị “nāzunu ìgwè aturu nta Chineke.” Nke a pụtara na ha ganaenye aka n’ihe nke mmụọ (I Pita 5:2). Ha gaebi ndụ nke gaabụ ihe ilereanya nye ndị nke Chineke.

Ógó achọrọ ka ndị nlekọta a ruo bụ otù ihe ahụ. Chineke na-ele anya na ndị ahụ ná-alụ ọlụ banyere ihe nke mmụọ ma ọbụ ilezi ihe nke ná-adị nwa oge ga-ebi ezi ndụ, ná-enweghị ịta-ụta, ana-adịghị akalu, ma dị kwa umeala n’obi.

Ndị Nlekọta Nzukọ N’ụbọchị Taa

Nime nzukọ anyị, nke bụ Apostolic Faith, anyi nwere ndị nlekọta yiri ndị ahụ enwere nime nzukọ n’oge Ndịozi. N’ebe isi ụlọ nzukọ anyị dị na Portland, Oregon, enwere onyeisi kachasị ana-akpọ General Overseer, onye ọlụ niile dị n’aka. Anyị nwekwara Onye na-enyere Onye nlekọta Kachasị aka onye na-enye aka n’ọlụ ahụ dị ukwu. Ọ bụ ezie na anyị adịghị arọpụta ndịokenye na ndị na-ejere nzukọ Kraist ozi, ma anyị nwere ndị amatara dịka ndị ná-alụ ọlụ ndị ná-ejere nzukọ Kraist ozi, na ọlụ ndị okenye. Ndị ná-enyere ndị ná-ejere Kraist ozi aka bụ “ndịọlụ.”

Anyị nwere ndị ná-ejere Kraist ozi na ndị ọlụ ndị enwere ike ịkpọ ndị okenye. Ha ná-ekpere ndị ọrịa ekpere, ha na ndịisi na-ekwurịta kwa okwu banyere ihe nke mmụọ, ná-enye kwa ụmụ mmadụ ndụm-ọdụ. Ọ dị kwa ndị ana-ewere dịka ndị ná-ejere nzukọ Kraist ozi, bụ ndị ná-elekọta ihe niile ahụ ná-adị nwa oge. Ọlụ ha pụrụ ịbụ ilekọta ebe ana-edebe ụgbọala, ma ọbụ iso n’òtù ndị ná-alụ ụlọ ọhụụ niile, iso n’òtù ndị ná-alụ ọlụ n’ebe ana-ebipụta akwụkwọ, na ihe niile yiri ihe ná-adị nwa oge. Ma ihe nke mmụọ, ma ihe nke ná-adị nwa oge, ha niile bụ akụkụ nke Oziọma, nke ọ bụla apụghị ịga n’iru nkeọma ma ewezuga nkeọzọ.

Ka anyị na-eji obi anyị na aka anyị ná-achụàjà, Mmụọ Chineke na-achọpụta ná-enye kwa onye ọ bụla ọlụ kwesịrị ya. Mmadụ pụrụ iji ikwesị ntụkwas-obi jide otù ọlụ na nwa mgbe, emesịa Chineke pụrụ inye ya ọlụ ọzọ. Nime mmadụ asaa ahụ eburu ụzọ rọpụta dịka ndị ná-ejere nzukọ Kraist ozi, abụọ nime ha ka enyekwara ọlụ ọzọ ịlụ. Stifen, ebe “o juputara n’amara na ike, ọ nālu oké olu-ebube na ihe-iriba-ama di iche iche n’etiti ndi-Ju. … Ha enwegh kwa ike iguzogide amam-ihe na Mọ Nsọ o ji ekwu okwu” (Ọlu Ndi-ozi 6:8, 10). Mkwusa nke Stifen wetaara ndị-Ju amamikpé nke mere ka ha “we guzo ndi-àmà ugha” megide ya, tuọ kwa ya nkume. Ọ bụụrụ ya òkè dị ukwu ịbụ onye Kraist mbụ egburu n’ihi okwukwe ya. Filip mesịkwara bụrụ onyeozi. O “kwusara Kraist” n’óké ntute ahụ na Sameria nke mere na ọtụtụ mmadụ chègharịrị ewee zọpụta ha (Ọlu Ndi-ozi 8:5, 12). Ezigara ya ijekwuru onozi nke Etiopia, inyere onozi ahụ aka ka o chègharịa (Ọlu Ndi-ozi 8:27, 37).Onye anyị na ya nọ ugbu a ná-efèkọ òfùfè bụwororị onyeisi ndị usher anyị. Ọ bụ onye kwesịrị ntụkwasị-obi n’ọlụ ya, Chineke wee kpọọ ya ijide ọnọdụ ọzọ dị ichè. Ọtụtụ arọ agawo ugbu a ka ọ bụ onyeozi nke Kraist, wee ná-ekwusa kwa Oziọma n’ikwesị ntụkwasị-obi

Ọtụtụ ụmụntakịrị na ụmụ ntorọbịa enwewo ọchịchọ ịbụ ndịọlụ nye Onyenwe anyị. Ha ewerewo ndụ ha chụọàjà nye Chineke ka ha wee bụrụ ihe emere ka ọ bụrụ “ihe-nsọpuru, ihe edoworo nsọ, ihe bara n’ihe ka Onye-nwe-ya were ya me ihe, ihe edoziworo iji lu ezi ọlu nile ọ bụla” (I Timọti 2:21). Mmụọ Chineke enyeworo ha aka inwetazu ihe niile ahụ achọrọ iji bụrụ ndịozi na ndị ọlụ. Ha ebiwo ndụ ahụ ana-apụghị ịkalu nke bụ ịdị nsọ, uche zuru òkè, eziomume, na ijidesi onwe ike. Ha ahụwo ndị nke Chineke n’anya, ha enwewo kwa obi ebere ịnabata na ilezi ha anya nkeọma. Ha achịziwo onwe ha nkeọma bụrụ kwa ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe niile. N’ụzọ dị otú a, ha edoziwo onweha ịbụ ngwáọlụ n’aka Chineke. N’oge ná-adịghị anya Chineke enyewo ha ohere ịbụ ndị nkuzi nke ụbọchị ụkọ, ndị ọlụ na ndịozi nke Onyenwe anyị.

Ụfọdụ ndị bụ ụmụntakịrị na ụmụ ntorọbịa n’ụbọchị taa nwere ọchịchọ ahụ dịnsọ, kwesịkwara ekwesị ịlụrụ Chineke ọlụ. Ọ bụrụ na Onyenwe anyị anọọọdụ ha ga-abụ ndị nlekọta nke nzukọ Kraist. Lee otú obi ga-esi tọọ Chineke ụtọ mgbe ụmụntakịrị doziri ndụ ha ijere Ya ozi, naele kwa anya n’iru oge Ọ ga-arọpụta ha ịnọchi otù ọnọdụ nime ozi Ya!

Nsọpụrụ

“Ka agua ndi-okenye ná ndi kwesiri nsọpuru okpukpu abua, bú ndi nāchi isi nke-ọma, ma nke kachasinu ndi nādọgbu onwe-ha n’ọlu nime okwu Chineke na ozizi” (I Timọti 5:17). Ọ dị nsọpụrụ kwesịrị ndị ahụ Chineke nyere ohere ijide ọkwa dị icheiche. Chineke atụkwasịworo ha nsọpụrụ. Ànyị ga-eleda ha anya? Ànyị ná-akwanyere ha ugwu “were kwa ihu-n’anya sọpuru ha gabiga ókè nke-uku ri nne n’ihi ọlu-ha” (I Ndi Tesalọnaika 5:13). Ànyị na-egosi nsọpụrụ anyị nwere n’ebe ha nọ site n’idebe onweanyị n’okpuru ha -- irubere ha isi (I Pita 5:5; Ndi Hibru 13:17). Ọ bụ ihe ziri ezi, bụrụ kwa ihe dabara nkeọma ịkpọ ndịozi Onyenwe anyị na ndị ọlụ “Nwanna” na “Nwanne” karịa ịkpọ ha náánị aha ahụ enyere ha, ọbụná ma asị na anyi matara ha nkeọma. Nkekanke ụmụntakịrị, na ndị ntorọbịa aghaghị igosi ụdị nsọpụrụ ahụ nye ndị ahụ Chineke rọpụtara ijide ọlụ pụrụ ichè.

Nlekọta

Ọ dịghị ihe onwunwe enyere ndị Livai nke Ụmụ Israel n’ala Kenean. Onyenwe anyị bụ ihe nketa ha (Deuteronomi 10:9). Ọ bụ nime Ụlọukwu Chineke ka ha na-eje ozi, ná-esite kwa n’ihe enwetara n’ebe ahụ ná-eriju afọ dịka Onyenwe anyị kwere ná nkwà. “Ọbuná otú a ka Onye-nwe-ayị kara àkà ka ndi nēkwusa oziọma Ya si n’ozi ọma ahụ di ndu” (I Ndi Kọrint 9:13, 14). Ndịozi, ndị okenye, na ndị ná-ejere nzukọ Kraist ozi anataghị ụgwọ ọnwa. Mgbe Jisọs zipụrụ Ndiozi ikwusa na ịgwọ ọrịa niile dị iche iche, Ọ sịrị, “Onye ọlu kwesiri ihe eji azù ya” (Matiu 10:10). Ihe niile bụ mkpà ha, dịka iheoriri, ebe obibi, ihe oyiyi na ihe niile ọzọ banyere ijé ha ka enyere ha, ma ọ dịghị ụgwọ ọnwa akwụrụ ha. Otú a ka ọ dịrị anyị: ndị ahụ achọrọ oge ha niile nime ọlụ a, ndị ná-enweghị kwa ụzọ ọzọ nke inyeaka si abịa, ọ bụ Oziọma na-elekọta ha anya. Ndị ahụ ná-enyeghị oge ha niile, na-agbalị naeji aka ha alụpụta ihe ha na-eri. N’ihe ndịa niile, ọñụ nke ijéozi a, bụ ụgwọ ọlụ ha.

Chineke nyere anyị niile ndụma-ọdụ a: “Nēkwenye ndiisi unu, nēdo-kwa-nu onwe-unu n’okpuru ha: n’ihi na ndi ahu nāmu anya n’ihi nkpuru-obi-unu” (Ndi Hibru 13:17).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Mgbe Jisọs rigosịrị n’Eluigwe, òlee ndị arapụụrụ ọlụ ịgbasa Oziọma?
  2. Gịnị mere eji rọpụta mmadụ asaa mbụ ahụ bụ ndị ná-ejere nzukọ Kraist ozi?
  3. Gịnị bụ ọlụ ha?
  4. Òlee otú esi rọpụta ha?
  5. Gịnị ka achọrọ n’aka ndị ahụ ná-ejere nzukọ Kraist ozi?
  6. Òlee ndị nlekọta nzukọ Kraist ọzọ emesịrị rọpụta?
  7. Ònye pụrụ ịbụ onye nlekọta nime nzukọ anyị taa?
  8. Gịnị ka nwatakịrị pụrụ ime iji dozie ndụ ya, ka o wee bụrụ onye ọlụ nye Chineke?
  9. Òlee otú anyị ga-esi gosi nsọpụrụ nye ndị ahụ Chineke debere n’ọnọdụ dị elu?
  10. Òlee ụzọ esi arọpụta ndịozi nke nzukọ n’ụbọchị taa?