Ọlu Ndi-ozi 6:8-15; 7:1-60.

Lesson 289 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Anamagu na ahuhu nile nke oge di ugbu a ekwesigh ka ekwuta ha ma ele ebube ahu anya, bú nke agaje ikpughe n’ebe ayi nọ” (Ndi Rom 8:18).
Notes

Onye Mbụ Egburu n’ihi Okwukwe Ya

Onye mn mbụ egburu n’ihi okwukwe Ndị Kraist bụ otù nwaokorọbịa aha ya bụ Stifen. Arọpụtawo Stifen ịbụ onye ná-ejeozi (deacon) n’oge mmalite nke Nzukọ, o jidesikwara ọlụ ya ike. Inyeaka ọ na-enyere ndị ogbenye na nri ọ na-enye ndị agụụ na-agụ adịghị egbochị ya ikpesi ekpere ike.

Chineke na-ele anya ka ndị Ya nyere ndị ná-enweghị ihe oriri na uwe na ndị nwere mkpà niile ọzọ dị iche iche nke anụ-arụ aka. Ngọzi dị ukwu karịa ga-abịakwasị onyinye anyị ọ bụrụ na anyị kpee ekpere ka ngọzi nke Chineke soro onyinye ahụ. Karịa nke ahụ, náánị ezi ọlụ anyị lụrụ agaghị ewetara anyị nzọpụta. Anyị aghaghị ikpesi ekpere ike ka Mmụọ Chineke nọgide ná ndụ anyị, ka anyi onwe anyị wee nwee ike ijikere izute Jisọs, bụrụ kwa inyeaka nye ndịọzọ

Mmụọ Chineke dịkwasị ná ndụ Stifen; site kwa n’okwukwe ya nime Chineke, ọ lụrụ ọtụtụ ọlụ ebube na ihe iriba-àmà dị ukwu n’etiti ụmụ mmadụ. Ma ndị okpukpé nke oge Stifen anabataghị ezi ọlụ niile ahụ n’ihi na alụrụ olụ niile ahụ n’aha Jisọs. Ha mesoro Stifen n’otù aka ahụ ha si mesoo Jisọs. Ndị Farisii na-ekwosa ya ekworo, ná-echè kwa na òzízí niile nke Jisọs megidere Iwu Moses. Ha eleziwo anya mụọọ Iwu Moses, ha na-anyakwa isi n’ịnụ ọkụ n’obi ha idebe ọtụtụ ememe na iwu. Ọ bụ na ọgbọ ndị nchụàjà na ndị ode akwụkwọ akọwabereghị ha Iwu ahụ otú ọ ga-eju ha afọ? Gịnị ga-eme ka ha ñaa ntị n’ihe ọzọ dị iche ugbu a, nke onye ha ná-amataghị na-agwa ha?

Okwukwe Nime Onyenwe anyị

Otú ọ dị, Stifen amụtawo ịmara Jisọs. Azọpụtawo Stifen site ná mmehie ya niile, o nwekwara okwukwe zuru òkè nime Onyenwe anyị Jisọs Kraist dịka Ọkpara Chineke. O doro ya nnọọ anya na Jisọs bụ Ọkpara Chineke na o jikeere ịnwụ n’ihi okwukwe ya. Okwukwe ya mere ka ọ dị ike iguzo megide ndị ná-akwa Jisọs emò.

Ndị ná-achọghị igentị n’ihe Stifen na-ekwusa kpọrọ ya bịa n’iru nnọkọ ikpé, ma ọbụ n’ụlọ ikpé, wee rọpụta ndị àmà okwu ụgha ịgba-àmà megide ya. Ndị àmà ụgha ahụ sịrị na o kwuluwo, ma ihe o kwuru bụ náánị ihe Jisọs kwuworo. O sogbughị onweya n’ihi okwu ụgha niile ha kwuru megide ya. Okwukwe ya dị na Jisọs, ebube nke Onyenwe anyị bịakwasị kwara ya nke ukwu na ndị ahụ sịrị na iru ya dị ka iru mmụọ ozi.

N’ikpe-azụ, onye isi nchụàjà bụ onye ọkà ikpé ahụ, jụrụ Stifen ma ebubo niile eboro ya ha bụ eziokwu. Òkwuwo okwu megide Moses, megide kwa Chineke? Ò kwujọwo Ụlọukwu ha dị nsọ? Gịnị mere Stifen ji kwuo okwu banyere nkwatu nke Ụlọukwu ahụ?

Ọzịzá nke Stifen

Stifen malitere ịzaghachị otú a, “Umu-nnam na ndi bu nnam.” Eleghịanya ọtụtụ ndịkom nọ ná nzukọ ahụ bụ okenye karịa ya, ọ na-akwanye kwara ha ùgwù n’ihi ọnụ ọgụgụ nke arọ ha na ọnọdụ ha. Stifen wee gaa n’iru ịkọwapụta na ya ekwulughị. Ọ kwanyeworo Abraham ùgwù nke ukwu, ọbụná dịka ndị Fasirii na ndị ode akwụkwọ kwanyewooro ya. Ndị Ju na-akpọ Abraham nna nke okpukpé ha, ma ha na-elefuru eziokwu ahụ anya na ọ bụ site n’okwukwe (ọ bụghị kwa site n’ọlụ) ka azọpụtara Abraham. “Abraham kwere Chineke, ewe guọ nke ahu nye ya n’ezi omume.”

Jisọs ekwuwo sị, “Obi tọrọ … Abraham utọ nke-uku ihu ubọchim; o we hu ya, ñuri kwa ọñu” (Jọn 8:56). Abraham ebiwo ndụ site n’okwukwe -- okwukwe nime Jisọs onye ana-amụbeghị n’ụwa -- site kwa n’okwukwe ahụ agụwo ya n’onye eziomume. Ma ndịa sitere na Nna Abraham ekweghị na Jisọs mgbe O guzoro n’etiti ha; ha akpọgbuwo kwa Ya n’óké iwe ha.

Abraham abụworị onye eziomume ọtụtụ arọ tupu enye iwu. Ntọala nke ịmata eziihe na iheọjọọ adịworị site ná mmalite, Abraham enwewo kwa obi ịghọta ha. O biri ndụ ya nime eziokwu nke Oziọma: “Onye ezi omume gēsite n’okwukwe di ndu.”

Chineke agwawo Abraham ihe ga-eme ụmụ ya. Na mbụ, Ya na Abraham gbara ndụ aga-esite ná mkpụrụ ya gọzie agbụrụ niile nke ụwa. Nke ahụ na-atụ aka mgbe Jisọs ga-abịa inye mmadụ niile nzọpụta. Ọ bụrụ na ndị Ju leziri anya nkeọma mụọọ ihe banyere ndụ Abraham, òlee otú ha si lefuru eziokwu ahụ anya? Stifen achọpụtawo ya mgbe ọ gụrụ Akwụkwọ nsọ; ọ gwakwara onweya eziokwu, na mgbe ọ hụrụ Jisọs, ọ matara Ya dịka mmezu nke amụma ahụ Abraham buru.

Akụkọ Ndị Ju

Stifen gara n’iru ịkọ akụkọ niile banyere Ndị Ju, rue n’oge ewuru Ụlọukwu Solomon, Ọ gwara ha ihe niile banyere ịnọn’orù nke Ụmụ Israel n’Ijipt, o kwusị kwara eziokwu ahụ ike na Chineke zitere Moses ịbụ onye nnapụta. Eboro Stifen ebubo na ọ sọpụrụghị Iwu Moses, nke pụtara na ọ sọpụrụghị Moses n’onweya, ma o gosịrị ha na ya ghọtara ihe banyere Moses karịa ha.

Stifen kwupụtara na Chineke kpọrọrị Moses site ná mmalite nke ndụ ya ịbụ onye nnapụta nke Israel, ma Ndị Israel aghọtaghị. Moses echèrewo rue mgbe ọ gbara iriarọ anọ tutu ya agbalịa inyere ndị ya aka, tutu oge ahụ ọ natawo kwa ọzụzụ kachasị mma nke ọ pụrụ inweta n’obí eze nke Ijipt. Mgbe ndị nke ya jụrụ ya, ọ gbapụrụ gbalaga n’obodo ọzọ ebe o biri iriarọ anọ ọzọ, ebe ndị Israel bụ ndị jụworo inyeaka ya, na-ahụjụ anya dịka ndịorù n’Ijipt. Chineke ekwuwo na Moses ga-abụ onye ndú nke ndị Israel, ọkpụkpọ ahụ guzosikwara ike.

Ịdị Ukwu nke Moses

Ka Stifen na-akọ akụkọ Israel, o kwusiri ihe banyere ịdị ukwu nke Moses ike. Ọ bụ Moses ka Chineke nyeworo Iwu ahụ. Chineke akpọwo Moses ịbụ onye ná-anọchịta anya Ya nye ndị ahụ. Moses ekwewo kwa Ụmụ Israel mkwà sị: “Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka onye-amuma, nke di ka mu onwem, biliere gi site n’etiti gi, site n’umu-nne-gi; onye ahu ka unu gēge nti.”

Ihe a niile ka Stifen gwara ndị náebo ya ebubo. Onye amụma ahụ nke Moses kwewo kwara ha mkwà ya bụ Jisọs, Stifen ekwerewo kwa na Ya. Ma ndị Farisii ndịa jupụtara n’eziomume nke onweha ekwereghị, ha naebo kwa Stifen ebubo na ọ sọpụrụghị Moses site n’ikwusa Jisọs.

Ụlọukwu Ahụ

Mgbe enwetasịworo Kenean, Solomon wuru otù Ụlọukwu mara mma nke ukwu na Jerusalem maka òfùfè Chineke. Nke a wee bụrụ kwa ebe nzukọ nke ezi okpukpé. Ma n’ụbọchị edoro Ụlọukwu ahụ nsọ, Solomon kpere ekpere sị: “Le, elu-igwe na elu-igwe nke elu-igwe agagh-anagide Gi; ulo a nke m’wuworo, ò gēsi kwa aña ịnagide Gi?” (2 Ihe Emere 6:18). Chineke nke Solomon na-ekpere dị ukwu nke ukwu na ọbụná eluigwe niile apụghị ịnagịde Ya.

Chineke ekwuwo kwa site n’ọnụ Aisaia Onye amuma sị: “Elu-igwe bu oche-ezem, uwa bu kwa ihe-mgbakwasi-ukwum: àha ulo gini ka unu gēwurum? Ma-ọbu àha ebe gini gābu ebe izu-ikem? N’ihi na ihe niile ndia ka akam meworo” (Aisaia 66:1, 2). Chineke dị ukwu karịa Ụlọukwu ahụ. Jisọs na Chineke ra n’òkìkè. Ọ dị kwa ukwu n’ike dịka Nna. Ya mere ọ bụ na Jisọs adịghị ukwu karịa Ụlọukwu ahụ? Òlee otú ndị Farisii si kwuo na Stifen na-ekwujọ Chineke site n’ikwusa okwu banyere Jisọs?

Ndị Ná-ekwesị Olu ha Ike

Mgbe Stifen rutere n’akụkụ a nke akụkọ ya, akpaliri ya nke ukwu site n’iru abụọ nke ndị ahụ ná-ebo ya ebubo na ọ pụghị kwa ijide onweya. Ọ hụtara na apụghị ime ka ha kwenye site ná nkọwa ya niile nke Oziọma ahụ, o wee sị ha: “Ndi kwesiri olu ike na ndi anēbigh úgwù n’obi na nti, unu onwe-unu nālu ọgu megide Mọ Nsọ mgbe nile.” Mmụọ Chineke agbalịwo ime ka ha chee échìchè igosi eziokwu nke Oziọma, igosi ha na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Ma dịka ndị bụ nna ha kpagbuworo ndị amụma, otú a ka ha ná-eme. Ma ha mere mmehie kachasị site n’ịkpọgbu Jisọs, Onye Eziomume ahụ.

Lee otú okwu a niile were ndị Ju iwe, bụ ndị nwere náánị eziomume nke onweha! Ikpé nke ihe niile Stifen kwuru mara ha, amamikpé ha nwere wee mee kwa iwe ha dị ọkụ karị. Ha malitere ịtụtụrụ nkume náatụ orù nke Chineke ahụ dị ọcha dị kwa nsọ. Ma Stifen alaghịazụ maọlị. Mmụọ Chineke dakwasịrị ya, ka o welikwara anya ya ọ hụ ọhụ nke Onyenwe ya dị ebube. Onye nzọpụta ahụ o kweere na Ya Onye o kwusakwara bụ Ọkpara Chineke n’ezie, ná-echere kwa ịnabata ya n’Ala Ebube ahụ. Stifen sịrị ndị ahụ: “Le, anamahu elu-igwe, ka emegheworo ha, na Nwa nke madu ka Ọ na-eguzo n’aka-nri Chineke.” Ọ naeguzo! Mgbe Jisọs lachachiri n’Elu-igwe, Ọ nọdụrụ ala n’aka-nri Chineke (Ndi Hibru 10:12), ịrịọ arịrịọ n’ihi anyị. Ma mgbe Stifen na-akwado ịrapụ ụwa a dịka onye egburu n’ihi okwukwe ya, Jisọs biliri wee guzo ịsọpụrụ ya n’ihi ijigide okwukwe ya rue ọgwụgwụ.

Iwe were ndị Ju ahụ nke ukwu na ha gbalịrị ka itimkpu ha lomie okwu nke ya, ha kpuchikwara aka ná ntị ha ka ha wee ghara ịnụ ihe ha kpọrọ okwu nkwulu. Ha wee tụpụ Stifen n’obodo, n’ebe ahụ ka ha weere nkume buru ibu tụọ ya rue mgbe ọ nwụrụ.

Ụgwọ ọlụ nke Stifen

Stifen arịọghị ka emeere ya ebere, ma ọbụ gbalịa ịgbanarị ndịiro ya. Náánị ihe o mere bụ iweli anya ya lekwasị Chineke, kpee kwa ekpere: “Onye-nwe-ayi Jisus, nara mọm nke-ọma.” Okwu ikpe-azụ o kwuru bụ okwu nke mgbaghara: “Onye-nwe-ayi atukwasila nmehie a n’isi-ha,” o wee daa n’ụra iteta n’Eluigwe. Ọ bụ náánị otù nzọ ụkwụ rue Ocheeze Chineke, ebe Jisọs nọ ná-echere izute ya. Ụgwọ Stifen kwụrụ adịghị ukwu karịa ụgwọ ọlụ ọ natara. “Nsogbu nke okporoụzọ gaadị ka ọ bụghị ihe mgbe m’ruru n’ọgwụgwụ nke ụzọ ahụ.”

Nhuju-anya adịghị eme ka egwù tụọ okwukwe nke ezi ndị Kraist. Mgbe emesịrị, mgbe anaemekpa ha arụ n’okpuru Sisa jọgburu onweya, okwukwe na agbam-ume ha mere ka ọtụtụ ndị nché ndị Rom obi ha siriike nye Jisọs obi ha. Ha sịrị na ọ bụrụ na ndị Kraist a ana-emejọ pụrụ ịbụ abụ banyere Eluigwe n Onye nzọpụta ha mgbe ana-eduru ha gaa n’ebe aga-egbu ha ma ọbụ n’etiti ebe ọdụm ga-adọgbụ ha wee rie anụ ha, ọ doro anya na ọ ghaghị ịbụ na ọ dị Chineke na-ejigide ha; Eluigwe aghaghị kwa ịbụ ebe doro anya ha ga-eje. Obi siriike nke ndị agha Rom gbazere site n’ịhụn’anya nke Jisọs. Ha onweha kwa, wee nye ndụ ha n’ihi Kraist.

Ka Chineke tinye mmụọ ahụ nime anyị bụ nke ga-eme ka anyị kwesị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị ọbụná ma asị na anyị ga-atọgbọ ndụ anyị n’ihi okwukwe anyị! Ọtụtụ mmadụ ọbụná n’oge nke anyị a egosipụtawo ịhụn’anya ha nye Jisọs site n’ịnwụ ọnwụ n’ihi Ya kama ịgọnarị Ya. N’ezie ụgwọ ọlụ ha ga-adị ukwu n’Eluigwe. Ha nwere ịhụn’anya nke Chineke ahụ nime obi ha nke ná-enyere ha aka ịgbaghara ndị ahụ ná-akpagbu ha dịka Stifen mere, na dịka Onyenwe anyị n’Onweya mere: “Nna, gbaghara ha; n’ihi na ha amatagh ihe ha nēme” (Luk 23:34).

Mkwenye nke Pọl

N’etiti ndịkom ọjọọ ahụ tụrụ Stifen nkume ka otù nwaokorọbịa nọ onye jiworo ọtụtụ oge mụọọ ihe banyere Iwu ma ọ kpagburu Nzukọ ndị Kraist n’ihi na o chere na ndị ná-eso Jisọs na-enupụisi n’Iwu ahụ. O jidere uwe nke ndị gburu Stifen, kwenye kwa na Stifen kwesịrị ịnwụ. Aha nwaokorọbịa ahụ bụ Sọl, onye mesịrị bụrụ onye amatara dịka Pọl Onyeozi ukwu. Sọl ezutebeghị Jisọs rue oge ihe a mere, ma oge ga-abịa mgbe ya onwe ya kwa ga-abụ onye kwere ekwe, onye ga-ahụ kwa ahụhụ ma nwụọ kwa n’ihi otù Jisọs ahụ Onye Stifen nyere ndụ ya n’ihi Ya.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Ònye bụ Stifen?
  2. Gịnị mere ndịFarisi achọghị ịnụ ihe Stifen naekwusa?
  3. Òlee otú esi zọpụta Abraham?
  4. Òlee otú anyi si mata na Abraham kwere na Jisọs?
  5. Gịnị ka Stifen maara banyere Moses?
  6. Gịnị ka Moses kwuworo banyere Jisọs
  7. Gịnị ka Stifen kpọrọ ndịodeakwụkwọ na ndị Farisii?
  8. Gịnị ka ndị Ju mere Stifen?
  9. Gịnị ka Stifen hụrụ tupu ya anwụọ?
  10. Gịnị bụ okwu ikpeazụ nke Stifen?