Ọlu Ndi-ozi 8:1-25.

Lesson 290 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Unu ka nkwa nka diri, na umu-unu, na ndi nile nọ n’ebe di anya, ka ha ra, bú ndi Onye-nwe-ayi Chineke-ayi gākpọtara Onwe-ya” (Ọlu Ndi-ozi 2:39).
Notes

Ihe Mbụ Anyị Matara Banyere Pọl

Lee óké iheọjọọ anyị bú ụzọ mata banyere Pọl Onyeozi! Ya onweya onye ga-abụ Onyeozi ukwu nke Ndị Mbaọzọ malitere site n’ịkpagbu Nzukọ Kraist. Ọ dị ya ụtọ ịhụ ọnwụ Stifen, bụ onye Kraist mbụ egburu n’ihi okwukwe ya. O chère na ndị Kraist na-ekwulu Chineke dịka ndị Farisii chèkwara, o wee ná-agbalịsị ike ná-ekwuchitara Iwu ahụ.

Ọ bụghị náánị na Stifen tụfuru ndụ ya kama ọtụtụ ndị Kraist ọzọ ka ejidere site n’ụlọ ha wee tụbaa ha n’ụlọ mkpọrọ, ọbụná ụfọdụ ka egburu egbu. Chee échìchè otú ọ bụ ihe jọgburu onweya mgbe otù òtù ndị Kraist nọkọrọ n’ụlọ nke ha ná-abụ abụ ma ọbụ ná-agụ Baịbụl, na mberede ewee jide ha tụbà ha n’ụlọ mkpọrọ n’ihi nke a. N’ala anyị, ebe anyị nwere onwe anyị n’ihe banyere okpukpé, ọ ga-esiri anyị ike ichè ihe banyere mmeso dị otú a; ma ọtụtụ ndị Kraist ahụjuwo anya n’ụzọ dị otú a n’ihi okwukwe ha nime Chineke.

Pọl n’onwe ya kwuru banyere ọlụ ya n’etiti ndị Kraist sị: “Esitekwara n’ime ka ha hu ahuhu-nmehie ọtutu mgbe n’ulo-nzukọ nile chọ uzọ ime ka ha kwulu Chineke; ebe anya nādighm nma gabiga ókè megide ha, m’we nēsogbu ha we rue obodo di iche iche di n’azu ala-ayi” (Ọlu Ndi-ozi 26:11). Ọbụná mgbe ha gbalịrị ịgbapụ site n’obodo ahụ ọ chụsoro ha n’azụ. Ma mgbe emesịrị ọ tụkwasịrị, “Ọ merem ebere, n’ihi na emerem ya nāmagh ama nime ekwegh-ekwe” (I Timọti 1:13).

Ikwusa N’ebe niile

Ndị nchụàjà na Pọl mere ihe niile ha nwere ike ime ibibi Nzukọ nke ndị Kraist dị na Jerusalem, nke na ndị Kraist siri n’ebe ahụ pụọ. Ma ebe ọ bụla ha jeruru, ha na-ekwusa banyere Jisọs. Mkpagbu ahụ emeghị ka ha kpuchie ọnụ ha. Kama ihichapụ Ọziọma ahụ, emere ka ọ gbasaa n’ọtụtụ obodo ọzọ.

Ndị ná-eso ụzọ Jisọs kwusara na Jisọs bụ Ọkpara Chineke nime Judia na Sameria niile, na Ọ nwụwo kwa wee si kwa n’ọnwụ bilie ọzọ. Ná-arụghị ukà, ha kwukwara banyere ọhù nke Stifen hụrụ banyere Kraist enyeworo otuto. Nke ahụ bụ ihe ọzọ ná-egosi ha na Jisọs dị ndụ; na Ọ bụghị kwa Onye Galili ahụ ewedara ala, Nwoke Nazaret ahụ, kama ọ bụ Kraist enyeworo otuto. Lee ụdị Onye nzọpụta ha nwere ikwusa! Ọ bụ ezie na o nwere ike iwere ndụ ha, ma ha nọgidere ná-agwa ụmụ mmadụ n’ebe niile na Jisọs bụ Mesaia ahụ ana-ele anya ya, Onye nnapụta nke Israel.

Ntute nke Filip na Sameria

Onye ọzọ ná-eje ozi arọpụtara ya na Stifen bụ otù nwoke ana-akpọ Filip. Nkume ahụ atụrụ Stifen emeghị ka egwù tụọ Filip, ọ kwụsịghị kwa mkwusa ọ na-ekwusa. Ọ nabatara ákámgbá ahụ, wee gaa n’iru n’ikwusa; Chineke wee site na ya lụọọlụ, naeme ihe iriba-àmà dị ukwu. Dịka ihe nlụpụta nke ijéozi Filip, agwọrọ ndị ọrịa, achụpụkwara mmụọ ná-adịghị ọcha nime ndị ha na-ejide. Jisọs ekwuworị na ụdị ihe àmà niile ahụ ga-eso mkwusa nke Oziọma, Filip nwapụtakwara n’ezie na okwu niile ahụ bụ eziokwu. Mmụọ Chineke dị n’arụ ya, ụmụ mmadụ ñakwara ya ntị. Ha nwekwara ọñụ ịnabata ozi nke oziọma ya. “Oké ọñụ we di n’obodo ahụ.”

Ezi onye Kraist ọ bụla na-enwe mmetụta nke udo na ọñụ dị omimi nime obi ya. Ọ dịghị ụzọ ọ bụla ọzọ apụrụ isi chọta ọñụ na udo ahụ ma ọbụghị site na mmadụ inweta mgbaghara nke mmehie ya. Chineke nke onye Kraist bụ Nna nke ịhụn’anya Onye ná-achọ ka ụmụ Ya rubere Ya isi kwanye kwara Ya ùgwù, ma Ọ bụ kwa Onye ná-awụkwasị ụmụ Ya ịhụn’anya na ngọzi. Anyị na-enwe ọñụ irubere Ya isi n’ihi na anyị hụrụ Ya n’anya. Jisọs kpọrọ ọbụná ụmụntakirị bịakute Onweya wee sị, “Alaeze eluigwe bu nke ndi di otú a.” Lee obiụtọ anyị nwere na Chineke anyị hụrụ anyị n’anya ná-achọ kwa imere anyị ezi ihe mgbe niile!

Chi niile nke ndị ná-amaghị Chineke adịghị otú ahụ. Ndị amụma ụgha na-agwa ụmụ mmadụ na ha aghaghị ịchụàjà ọjọọ nke ná-enweghị kwa obi ebere ime ka iwe chi ha dị iche iche dajụọ; ọbụná mgbe ụfọdụ ana-agwa ha ka ha nye ụmụ ha mụrụ. Ihe egwù ná-adịkarị n’òfùfè ha ebe ha ná-agbalị idozi mmehie ha meworo wee webata kwa obiụtọ n’obi ha. Ma mgbe niile iruuju na obi ilu bụ náánị ihe ha na-enweta. Anyị nwere obiụtọ na anyị matara ụzọ ka mma, anyị pụkwara ịkọrọ ndịọzọ akụkọ nke ịhụn’anya Jisọs nke ná-enye ụmụ Ya ọñụ.

Ndị gere ntị n’okwu Chineke nke Filip kwuru nwere ọñụ ịnụ ozi ya na ọtụtụ kweere ihe o kwuru. Ọ gwara ha banyere udo nke obi ha na-achọ mgbe niile.

Ihe Ịrịba-àmà nke Ekwensu

Otù nwoke dị ana-akpọ aha ya Saimon onye meworo ọtụtụ ihe ịrịba-àmà n’etiti ndị Sameria site n’ike nke ekwensu. Ndị ahụ echèworị na ọ bụ chi n’ihi ihe ọ pụrụ ime. Ma ọ dịghị ọñụ dị n’iso ya. O werewo okwu ụgha nke ekwensu megharịa ndị ahụ anya. Ọ bụghị mmadụ niile na-eme ihe ịrịba-àmà sitere na Chineke.

Ekwuru banyere ndị mgbasị, ndị ná-ajụ ndị mmụọ ase, na ndị ná-agba afa nime Baịbụl, ma enyekwara ịdọ akanántị n’ebe ahụ na Ụmụ Chineke agaghị esoro ha nwekọrịta ihe ọ bụla. Ike ha sitere n’ekwensu, onye Kraist agaghị kwa aña ha ntị. Chineke sị na ha bụ ihe arụ. Ọ sịkwara: “Unu echela ndi nāju mọ ihe iru, unu eche-kwa-la ndi-dibia-afa iru; unu achọputala ha, iwere ha meru onwe-unu” (Levitikọs 19:31).

Mgbe Saimon onye mgbasị hụrụ obiụtọ nke ndị kweere na Jisọs anawụkwa mmiri dịka Jisọs kuziri nwere, ya onweya kwa wee kwere. Ma ọ dịghị ihe ọzọ, o kwuru na ya kweere; ọ na-esoro kwa ndị na-anụ okwu Filip ná-ezukọ ná-enwe ọñụ na ngọzi niile nke nzọpụta. Ihe niile Saimon hụrụ Filip mere n’aha Jisọs karịrị ihe ọ bụla ya onweya nweworo ike ime.

Pita na Jọn n’ime Sameria

Mgbe Ndịozi nọ na Jerusalem nụrụ banyere óké ntute ná-aga n’iru na Sameria ha zigara Pita na Jọn ijé nyere ha aka. Ọ bụ ezie na azọpụtawo ọtụtụ mmadụ doo kwa ha nsọ mgbe Filip ná-ekwu okwu Chineke, awụwokwa ha mmiri nke mmiri, ọ dịghị onye ọ bụla nime ha nataworo ọwụwụ mmiri nke Mmụọ Nsọ. Mgbe Pita na Jọn bịaruru, ha malitere ikpe ekpere ka ha niile nwee ike ịnata ọwụwụ mmiri nke Mmụọ Nsọ.

Lee óké nzukọ ekpere ha nwere! Ndịnsọ ọhụụ ahụ chọrọ ka ewere ike Chineke mejue ha, dịka emewooro ndị ná-eso ụzọ Jisọs n’Ụbọchị Pentikọst. Ọ bụ ihe apụrụ ime na ha ga anata kwa ike ahụ?

N’arụ Anụ-arụ Niile

Joel Onye amụma ekwuworị sị: “Ọ gēru kwa ma emesịa, na M’gāwusa Mọm n’aru anu-aru nile, bú madu” (Joel 2:28). Pita kwukwara sị: “Unu ka nkwa nka diri, na umu-unu, na ndi nile nọ n’ebe di anya, ka ha ra, bú ndi Onye-nwe-ayi Chineke ayi gākpọtara Onwe-ya” (Ọlu Ndi-ozi 2:39).

Ugbu a, ọ bụrụ na ndị Sameria ndịa ga-ekwere, nye kwa onweha kpamkpam n’ime uche Onyenwe anyị, ha onweha pụkwara ịnata ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ. Ha na-achọsị ya ike rue n’ime otú ahụ? N’ezie, ọ dị ha mkpà. Mgbe Pita na Jọn kpeere ha ekpere bikwasị kwa ha aka n’isi, ha natara Mmụọ Nsọ. Lee óké ọñụ mmadụ na-enwe mgbe ọ bụụrụ ụlọ nsọ nke Mmụọ Nsọ!

Ọ bụghị site N’ọla-ọcha

Saimon hụrụ otú Mmụọ Chineke si bịakwasị ndịnsọ ndịa n’ọzịzá ekpere nke Pita na Jọn, o wee chọọ kwa inweta ike ahụ ha nwere. O jikeere iwere ego zụrụ ya. Ewo, lee otú o si bụrụ onye kpuruìsì ichè na ya pụrụ iji ego zụta ike Chineke! Ná-arụghị ụkà ndị Kraist gara adị ọtụtụ n’ụwa taa karịa otú ha ra ugbu a ọ bụrụ na apụrụ iji ego zụta nzọpụta. Ma gịnị ka ego bụ? Ọ gaghị adịgide. Ọbụná ọla-ọcha na ọla-edo ga agba nchara.

Chineke chọrọ akụkụ anyị nke ná-adị ebighịebi: mmụọ anyị, ọchịchọ anyị, ịhụn’anya anyị. Mgbe anyị nyeworo Ya ihe niile ahụ, anyị abụrụwo nke Ya mkpamkpam O nwekwara ike iwere anyị mee ihe dị Ya mma. Ihe Saimon mere wutere Pita nke ukwu na ọ sịrị ya: “Ka ọla-ọcha-gi so gi la n’iyi, n’ihi na i chère na i gānata onyinye Chineke site n’ego.”

Ọtụtụ ndị okpukpé emebiwo nzukọ ha site n’ime ka ego bụrụ ihe dị ha mkpà karịa Mmụọ Chineke. Jisọs sịrị, “N’efu ka unu natara, nyenu n’efu.”

Ọlụ anyị bụ ikwusa nzọpụta nye obi furu efu, inye n’efu ihe ahụ nke Chineke nyeworo anyị. Anyị aghaghị kwa ibi ndụ n’iru ụmụ mmadụ kwa ụbọchị n’ụzọ ha ga-amata na anyị bụ ndị Kraist. Mgbe anyị nwere ibu-arọ n’ihi ọlụ nke Onyenwe anyị, anyị ga-enye ụfọdụ ego anyị iji kwagide ya -- n’afọofufo. Onye Kraist ga-ahụ Chineke n’anya rue na ọ ga-enye otù ụzọ n’ụzọ iri na onyinye ya niile n’ọñụ.

Olileanya ka dịkwara Saimon. Ọ bụrụ na ọ ga-echègharị, Onyenwe anyị ga-agọzi ya. Ọ pụrụ inweta ike ahụ ọ chọrọ ọ bụrụ na ọ ga-enye ihe Onyenwe anyị chọrọ -- obi ya na ọchịchọ ya. Ruo kwa n’ụbọchị taa, mmadụ pụrụ ịnata ike ahụ, ọwụwụ mmiri nke Mmụọ Nsọ, ọ bụrụ na edoro onye ahụ nsọ n’ezie, o kwere kwa na mkwà niile nke Chineke, chọsie kwa mnwapụta nke dị ebube ike.

Pita na Jọn laghachiri Jerusalem mgbe emesịrị nzukọ ahụ, ma ndịọzọ ná-eso ụzọ Jisọs gara n’iru na-ekwusa n’obodo ntà niile nke Sameria.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị bụ ihe mbụ agwara anyi banyere Pọl?
  2. Gịnị mere Chineke ji meere Pọl ebere?
  3. Ònye kpaliri ntute ahụ dị na Sameria? Gịnị mere o ji nọrọ na Sameria?
  4. Òlee otú ndị ahụ si nabata ya?
  5. Ònye bụ Saimon? gịnị kwa ka ọ chọrọ?
  6. Gịnị ka ndị Sameria natara mgbe Pita na Jọn bịara?
  7. Òlee otú anyị pụrụ isi nata ike site n’aka Chineke?