Abù Ọma 46:1-11; 90:1-17

Lesson 291 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Si otú a me ka ayi mara iguta ubọchi-ayi, ka ayi we me ka obi amam-ihe bia” (Abù Ọma 90:12).
Notes

Onyenwe anyị nọ Nso Inyeaka

Ndị niile dere Abù Ọma amụtawo ịtụkwasị Chineke obi. Onye ọ bụla ọ bụ -- Devid, Moses, maọbụ onye ọ bụla ọzọ náede abù ọ chọtara Onye ọ pụrụ ijekwuru mgbe ọ nọ ná nsogbu, ịchọta inyeaka.

N’okwu mmmalite nke Abù Ọma iri anọ na isii, onye dere ya kwupụtara sị: “Chineke buru ayi ebe-mgbaba na ike, O mewo ka achọta Ya n’iye aka nke-uku na nkpagbu nile.” Ọ na-anọ n’akụkụ anyị inyere anyị aka mgbe ọ bụla anyị kpọkuru Ya.

N’ụbọchị niile ahụ mgbe Ụmụ Israel nọ na njèm ha ijeru Ala Kenean, Moses dekwara okwu yiri nke anyị gụworo: “Ebe obibi-gi ka Chineke nke dị site na mgbe ochie bu, n’okpuru ka ogwe-aka mgbe ebigh-ebi di kwa” (Deuteronomi 33:27). Mgbe ụfọdụ anyị nọ ná nsogbu anyị náechè na ekpochapụwo ihe niile site n’ebe anyị nọ; anyị nwere ike inwe mmetụta dịka anyị ná-ada -- na ọ dịghị ihe dị n’okpuru anyị. Ma ọ bụrụ na ntụkwasị-obi anyị dị nime Chineke mgbe ebighị ebi, ogwe-aka Ya dị n’okpuru anyị, Ọ gaghị ekwe kwa ka anyị daa.

Chineke gwara Aisaia sị, “Mu onwem gēbu kwa; e, Mu onwem gēku n’aka me kwa ka unu wepuga onwe-unu” (Aisaia 46:4). Mgbe Pọl na-edekwara onye mkwusa bụ nwaokoroọbịa ana-akpọ Timọti akwụkwọ, ọ sịrị: “Onye-nwe-ayi gādọputam n’ajọ ọlu nile ọ bula, Ọ gāzọputakwam ka m’bata n’ala-eze-Ya di n’elu-igwe” (2 Timọti 4:18).

Chineke Ebe Mgbàbà Anyị

Ebe mgbàbà bụ ebe ịnọ n’udo, ebe nchebé. Anyị nwere ebe nchebé dị iche iche ebe ana-edebe anụ-ọhịa ha wee nọọ n’udo ka dinta ghara iwere egbe gbagbuo ha. N’ebe ụfọdụ adịghị ekwe ka mmadụ gbue ụfọdụ anụmanụ ma ọbụ nnụnụ. Ọ na-adị ka ụmụ anụmanụ ndịa ha na-enwe mmetụta nke ịnọ n’udo ahụ, ha na-ejègharị kwa n’igwè n’inweonwe n’ọhịa ahụ -- nkekanke n’oge ịchụnta mgbe anụmanụ niile ahụ maara na ha enweghị nchebé ma ha pụọ n’ebe ahụ. Chineke chọrọ ka mmadụ ghọta na ya pụrụ ịchọta ebe mgbàbà nime Onyenwe anyị. Ekwensu na-agba mmadụ àkụ ya n’ebe niile, ọtụtụ ndị ọ na-enweta kwa adịghị amata ebe ha ga-achọta ebe mgbàbà. Ọ bụrụ na ha ga-elebà anya nime Baịbụl, ha ga-achọpụta dịka onye dere Abù Ọma chọpụtara, na Chineke bụ ebe mgbàbà ebighị ebi anyị. Ndị ná-agbakuru Chineke maka inyeaka na-achọta udo nye mkpụrụobi ha ná-alọ mmiri.

Anyị apụghị iji anya anyị hụ àkụ niile ekwensu na-agbá, ma anyị pụrụ ịhụ nsogbu ha na-eweta. Ihe ọjọọ niile, iruuju, ekworo, mpako, na ịkpọ asị bụ ihe àkụ ya na-eweta. Mgbe agha dị ukwu dara, ndịagha ewee were ngwa agha jọrọ njọ ná-egburịta onweha, anyị na-amata na ọ bụ ekwensu malitere ya site n’ịgba àkụ ụta ya dị iche iche nwere nsì.

O nwere ike ịgbá anyị akụ ahụ wee weta échìchè ọjọọ, okwu jọrọ njọ, na omume ịmara onweanyị náánị. Ihe niile dị otú ahụ esiteghị na Chineke, anyị achọghị kwa ha ná ndụ anyị. Òlee otú anyị gaesi gbanarị? Site n’ịgbakuru Ebe mgbàbà anyị, Chineke mgbe ebighị ebi. Ọbara Jisọs ga-asachapụ ihe niile Ọ na-achọghị, Ọ ga-agbaghara kwa mmehie niile wepụ kwa échìchè ọjọọ nke ndị niile ga-arịọ Ya.

Ịtụ Egwù Adighị

Mgbe anyị nọ n’udo nime ebe mgbàbà ahụ, anyị adịghị atụ egwù ihe ọ bụla. Jisọs na-anọ n’akụkụ anyị, “n’iye aka nke-uku na nkpagbu nile.” Onye ahụ dere Abù Ọma sịrị na ya agaghị atụ egwù ọbụná ma asị na ala-ọma jijiji tụbà ugwu nime óké osimiri. Ọtụtụ mmadụ na-atụ egwù mgbe ha nwere mmetụta nke ịma jijiji ntà. Chee échìchè óké egwù ga-atụ ha ọ bụrụ na ewezuga ugwu n’ọnọdụ ya gaa n’etiti óké osimiri! Mgbe enwere ala-ọma jijiji n’otù obodo ntà, ndị niile bi nime ya tụrụ egwù nke ukwu -- ha niile ewezuga otù agadi nwanyị onye dị ka ọ na-enwe ọñụ na ya. Mmadụ nile maara ya, n’ikpe-azụ otù onye wee jụọ ya sị, “Nne, ọ bụ na egwù adịghị atụ gị?” Ọ zara sị “É-è, anam añụrị ọñụ ịmata na enwerem Chineke onye pụrụ ime ka ụwa maa jijiji.”

Onye ahụ dere Abù Ọma adịghị atụ kwa egwù nke ebili mmiri n’elu óké osimiri. Ọ na-atụkwasị obi na Chineke pụrụ ime ka udo dị n’elu mmiri ná-agba aghara. Ya na Jisọs anọkọbeghị nime ụgbọntà dịka ndị ná-eso ụzọ Jisọs nọdụrụ n’elu Osimiri Galili mgbe Jisọs sịrị, “Di ju, kpuchie ọnu-gi,” ifufe wee febie; ma otú ọ dị ọ matara na Chineke pụrụ ime ya. Ọ mụtawo ịmara Chineke onye kèrè óké osimiri na ala, ebili mmiri na ụfụfụ ha niile na-agwa ya okwu banyere ike nke Chineke inye ifufe na osimiri iwu. Nime otù Abù Ọma anyị ná-agụ na: “O nēkwu okwu, Ọ we me ka óké ifufe guzo ọtọ, nke nēbuli nmali-miri-ya nile elu … Ọ nēme ka óké ifufe guzo n’idere du, nmali-miri-ya nile we gba nkiti” (Abù Ọma 107:25, 29).

Ekpughere Ike Chineke

Otù ụbọchị ukwu ná-abịa mgbe ụwa niile ga-ahụ mata kwa ike Chineke. N’ụdà nke olu Ya ụwa niile ga-eji kwa óké ọkụ wee gbazee. Otù Olu ahụ kwuru okwu ụwa wee dị ga-ebibi kwa ya ọzọ n’ụbọchị ikpé.

Ma tupu aga-ebibi ụwa, oge udo ga-adị n’elu ụwa nke a. Nime Abù Ọma a anyị na-anụ abụ banyere Ọchịchị Puku Arọ, oge Onyenwe anyị ga-emeka agha niile kwụsị. Ọ dịghị mmadụ ọ bụla pụrụ ịkwụsị agha -- ọbụná nnọkọ ikpé nke ndị sitere na mba dị iche iche. Ma Jisọs pụrụ ịkwụsị ya. Mgbe Ọ ga-abịa kwa ịkwụsị ha, ịlụ ọgụ agaghị adị kwa ọzọ. Ọ ga-egosi ndị mmehie na ndị ná-ekweghị ekwe n’ụbọchị ahụ na Ya nwe ike niile, na Ya na-achị kwa ụwa niile.

Ọ dịghị eze ọ bụla ma ọbụ onye ná-enye iwu ga-enwe ike iguzo n’iru Eze Jisọs anyị mgbe Ọ na-abịa. Aga akụda ike ha niile kpamkpam mgbe ha nụrụ Olu ahụ site n’Eluigwe, Kraist ewee bịa guzoo oche eze Ya n’elu ụwa nke a. Anyị onweanyị dịka ndị Kraist nwere Jehova nke ụsụ niile nke ndịagha n’akụkụ anyị ugbu a. “Chineke nke Jekob buru ayi ulo-elu.”

Olileanya Anyị

Ndụ anyị n’elu ụwa a dị mkpụmkpụ ma ewere ya tụnyere ebighị ebi. Ihe dị óké mkpà nye anyị taa bụ ime ka o doo anyị anya na anyị jikeere maka ndụ nke ná-abịa. Ndị niile ná-ejikere onweha isoro Kraist chịa adịghị ekwe ka ihe ọ bụla bata n’etiti ha na òfùfè ha na-efè Eze nke mgbe ebighị ebi.

Pita Onyeozi na-ele anya obodo ahụ ka mma ná-enwu kwa enwu, o wee dee sị: “Ma dika nkwa-Ya si di, ayi nēle anya elu-igwe ọhu na uwa ọhu, nke ezi omume bi nime ha. N’ihi nka, ndi m’huru n’anya, ebe unu nēle anya ihe ndia, nānunu ọku n’obi ka ewe hu unu n’udo, ndi nēnwegh ntupọ, ndi anāpugh kwa ita uta n’iru Ya” (2 Pita 3:13, 14). Anyị chọrọ ibi nime ụwa ọhụụ ahụ ebe ihe niile ga-adị mma zue kwa òkè, ma anyị nwere ihe anyị ga-eme ka anyị wee kwesị ibi n’ebe ahụ. Ọ dịghị mmehie ma ọbụ ihe ọjọọ ọ bụla ga-adị n’ebe ahụ, ya mere aghaghị ịsachapụ anyị mmehie anyị niile, site n’Ọbara Jisọs, tupu anyị ewee bụrụ ndị jikeere ịbà n’ebe ahụ dị ebube.

Nime Abù Ọma a nke Moses, o kpere ekpere sị, “Si otú a me ka ayi mara iguta ubọchi-ayi, ka ayi me ka obi amam-ihe bia.” Ka anyị tụgharịa uche otú oge anyị n’ebe a ra ogologo ka anyị wee were ụbọchị ọ bụla mee ihe bàra urù. Ụfọdụ mmadụ na-eme omume dịka ha chèrè na ha ga-ebi n’ụwa a rue mgbe ebighị ebi na ọ dịghị kwa ha mkpà ime ihe ọ bụla ijikere izute Chineke. Ọ bụrụ na anyị na-ebi ụbọchị ọ bụla dịka anyị kwere na Jisọs ga-abịa n’ọgwụgwụ ụbọchị ahụ, anyị ga-elezianya n’omume anyị ka anyị wee ghara imejọ Ya.

Anyị amataghị ma ndụ anyị ọ ga-akwụsị site n’ihe mberede ma ọbụ ọrịa, anyị ewee guzo n’iru Onyenwe anyị. Ndụ bụ ihe ná-edoghị anya, ma ọnwụ doro anya -- náánị ma Jisọs bịara kpọrọ anyị. Anyị chọrọ ibi ndụ anyị ụbọchị niile otú ọ gabụ na anyị agaghị atụ egwù ịrapụ ụwa a.

Dịka Otù Nzeume

Ọbụná asị na anyị adị ndụ ruo iri arọ asaa ma obụ iri arọ asatọ, dịka Moses dere, òlee otú aga-eji were nke a tụnyere ebighị ebi? Moses sịrị na ọbụná ibi ndụ ra ogologo otú ahụ bụ náánị “dika otù-nze ume.” Mmadụ nwere ike ịkọrọ gị akụkọ, i chefue kwa ya otù oge ahụ. Ma ọbụ ọ bụrụ na ọ dị ụtọ, i nwere ike icheta ya nwa mgbe; ma o webataghị ihe ọ bụla dị iche ná ndụ gị.

Tụgharia uche banyere ọtụtụ ijéri kpakpando Chineke naelekọta ná-ejide kwa ha n’ọnọdụ ha ka ha ná-ejégharị n’iru Eluigwe. Chee échìchè banyere otụtụ ijéri mmadụ ndị biworo ndụ n’ụwa a n’ihe ra ka puku arọ isii (6000) gara aga. Gịnị ka otù onye bụ ma ewere ya tụnyere ọnụ ọgụgụ ra otú a, nime ọtụtụ arọ niile ahụ? Náánị ma anyị mere ihe dị óké mkpà, ọ dịghị onye ga-amata maọbụ chọọ ịmata mgbe ihe dị ka narị arọ ma ọbụ karịa otú ahụ gasịrị ma ọ dịwo mgbe anyị biri ndụ. Ana-echeta ndị bụ dike maọbụ nnukwu mmadụ náánị nwa mgbe ntà karị.

Ọbụná mba na-ebili ná-ada kwa, ewee chefue ha. Chineke sịrị: “Le, aguwo mba nile n’otù ntu-miri nātupu n’ite-miri, na n’uzuzu nke ihe-ọtùtù: le, Ọ nāchili agwe-etiti dika ifurifu-ihe” (Aisaia 40:15).

Nke Ya Ruo Ebighịebi

Ka anyị na-ele onweanyị site n’ihe ndịa eji tụnyere anyị, anyị ná-achọpụta na anyị bụ ndị ná-adịghị mkpà dị kwa ntà n’ezie. Ọ bụrụ na ndụ anyị n’ụwa ga-efu dịka urukpu dị n’iru Eluigwe, ma ọbu dịka ahịhịa ná-etó n’ụtụtụ ewee gbutuo ya n’abalị; ọ bụrụ kwa na aga ebibi ọlụ anyị lụrụ n’anụ-arụ, gịnị bụ ihe dị mkpà? Gịnị bụ ihe ná-adịgide? Gịnị mere anyị ji nọdụ n’ebe a?

Jisọs kèrè anyị nye onweYa, ibi ndụ na isoro Ya ñụrịkọọ ọñụ ebighị ebi. “Gi onwe-gi kère ihe nile, ọ bu kwa n’ihi ọchichọ-Gi ka ha diri, ka ekè-kwa-ra ha èkè” (Nkpughe 4:11). Ndụ anyị n’ebe a bụ ijikere anyị maka ebube nke ụwa ná-abia, nke ga-adịgide ebighị ebi.

Ndụ anyị n’ụwa nwere ike ịdị “dika otù nze-ume”; ma Chineke anyị ná-adị mgbe niile ebighị ebi. Chineke mgbe ebighị ebi ahụ bụ ebe mgbàbà anyị, ebe anyị ná-ezoro. Ọ bụ Ya bụ Olileanya anyị, Nzọpụta anyị, Nkasiobi anyị na Onye ndú anyị. Nime Ya ka anyị na-achọta ọñụ ugbu a, anyị ga-amata kwa óké ọñụ nke ndụ ebighị ebi.

Moses kpere ekpere sị, “Were ebere-Gi me ka afọ ju ayi n’ututu.” Nke ahụ pụrụ ịpụta ná mmalite nke ndụ anyị. Ebere Chineke na-abịakwasị anyị ọbụná mgbe anyị ka bụ ndị ntorọọbịa. Anyị onweanyị dịka ụmụntakịrị na ndị ntorọọbịa ka ana-eme ka afọ ju site n’ịhụn’anya Ya nye anyị ka anyị ná-enye obi anyị ná mmalite nke ndụ anyị.

Moses kpekwara ekpere ka emee ka ọlụ aka anyị guzosie ike. Ọ chọrọ ime ihe ná-agaghị agba ọkụ mgbe Jisọs bịara. Ihe niile anyị meere Jisọs, n’ihi na anyị hụrụ Ya na ndị Ya n’anya ga-adịgide ebighị ebi. Ọ dịghị ọlụ ọzọ karịrị iritere Jisọs otù mkpụrụobi n’urù. Ụdị ọlụ ahụ dị ka ọla-ọcha na ọla-edo ọkụ ná-agaghị emetụta -- náánị ịnụcha ya mee kwa ka ọ maa mma karị. Daniel Onyeamụma dere na ndị niile riteere Kraist mkpụrụobi n’urù gana-amụ “dika kpakpando rue mgbe nile ebigh-ebi” (Daniel 12:3).

Ka anyị niile n’otù n’otù jikere ugbu a anyị bụ ndị ntorọọbịa maka ebube ahụ nke ná-abia. Otú a ka aga-eme ka afọ ju anyị, anyị ewee nwee kwa ọñụ nke isoro Onyenwe anyị na Eze anyị chịa mgbe niile ebighịebi.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị bụ ebe mgbàbà?
  2. Ònye bụ ebe mgbàbà nke ndị Kraist?
  3. Site na gịnị ka ana-azọpụta anyị mgbe anyị nọ n’udo nime ebe mgàbà ahụ?
  4. Òlee ebe anyị ga-eje ka anyị wee chọta Jisọs?
  5. Ogologo ndụ ra añaa ka Chineke kweworo mkwà inye anyị?
  6. Òlee otú nke ahụ ra ma ewere ya tụnyere ebighị ebi?
  7. Gịnị ka Moses gwara anyị ka anyị were ụbọchị niile ná-eme?
  8. Òlee ụdị ọlụ ga-adịgide ebighị ebi?