Ọlu Ndi-ozi 8:26-40

Lesson 292 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ya mere, ganu, me mba nile ka ha buru ndi nēso uzọm, nēme ha baptizim bà n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ” (Matiu 28:19).
Notes

Alụrụ Ọlụ Ebube Dị Iche iche

Ekwuwo okwu Chineke jupụtara n’ike nke Chineke gbaa kwa ọtụtụ àmà ná-akpali mmụọ n’óké ntute ahụ ná-aga n’iru na Sameria. Emezu kwara ememe nke ọwụwụ mmiri, nke ná-echetara anyị nzukọ ntute mmụọ anyị na-eme kwa arọ na Faith city, Igbesa, Nigeria. N’ọgwụgwụ nke nzukọ ntute, ndị ná-ejé ozi na ndị ọlụ na-alaghachị n’ụlọ ha ịgan’iru n’ọlụ ha nke ịgbasa Oziọma.

Onye kwusaworo na Sameria bụ Filip, onye amatakwara dịka Deacon Mkwusa-njègharị. Anyị ga-echeta na ọ bụ otù onye nime ndị arọpụtara ilekọta ihe onwunwe nke nzukọ. Onye bụ ezi onye Kraist n’ezie na-anọ ná njikere mgbe niile inye aka, ná-agbanyeghị ụdị ọlụ dapụtara.

Ndị ahụ ji otù olu na otù obi gee Filip ntị ka ọ na-ekwusa, ewee lụọ kwa ọtụtụ ọlụ ebube ná nzukọ ya niile: anapụtara ndị mmụọ ná-adịghị ọcha ji, agwọrọ ndị nrịarịa na ndị ngwụrọ. Filip bụ nna nke ụmụ agbọghọbịa anọ ná-ekwusa kwa okwu Chineke.

Ijéru Ọzara ahụ

Otù ụbọchị mmụọ ozi nke Onyenwe anyị zutere Filip wee gwa ya ka o jee n’akụkụ ndịda rue n’ọzara Geza. Ọ pụrụ ichèworị sị, Nke ahụ bụ náánị ịtufu oge; ma ọbụ ọ pụkwararị ịjụsị, N’ihi gịnị? dịka ụmụntakịrị na-eme mgbe niile. Ọ jụghị ajụjụ ọ bụla banyere iwu ahụ nke mmụọ ozi nyere ya, kama dịka Abraham mgbe ochie, “ ọ we puọ, nāmagh ebe ọ nēje” (Ndi Hibru 11:8). Ànyị jikeere isoro Onyenwe anyị ná-agbanyeghị ebe ma ọbụ ọnọdụ anyị n’ụbọchị taa? Ànyị jikeere ịsị, “Onyenwe anyị, tụgharịa àtụmààtụ ma ọ bụrụ na ha na-emegide àtụmààtụ nke Gị nyem”?

Filip jere ijé ọtụtụ maịlị n’ike ọgwụgwụ. Eleghịanya ọ zọrọ nzọ ụkwụ ọ bụla n’okwukwe. Ka ọ na-aga ka mkpebi ya na-adị ike karị. Ájá nke ọzara ahụ ná-adịwanye ọkụ, ma ihe dịkariri n’alaala obi ya bụ ijé ebe ahụ Onyenwe anyị zigaworo ya.

Náánị ndị ijé olenaole ka ana-ahụ n’ụzọ nke ọzara; ma, lee, otù ụgbọala ná-abịa n’iru. “Jekuru ugbọ-ala ahu, nọyaba kwa ya nso,” ka olu nke Mmụọ Nsọ ji nwayọ gwa Filip. O wee gbakuru ụgbọala ahụ, ọ hụ kwa otù onozi ná-anọdụ nime ụgbọala ahụ ná-agụ Baịbụl ya. Ọ jụọ ya sị, “I nāmata ihe I nāgu?” “É-è, n’ihi na m̀’gēsi aña pu imata, ma ọ buru na ọ digh onye gēdum?” bụ ọzịzá nke nwoke ahụ onye ná-elekọta àkụ niile nke ezenwanyị Etiopia.

Onozi bụ onye ana-ewe n’ọlụ dị mkpà, ná-arụghị kwa ụkà onye nke a bụ ezi nwoke. Ọ bụ ihe doro anya na ọ ga-anụworị banyere ahụhụ na ọnwụ nke Jisọs bụ nke mere n’ihe ra ka otù arọ gara aga tutu oge ahụ na Jerusalem. Ma otú ọ dị, ka ọ na-agụ n’Akwụkwọ Aisaia, ọ ghọtaghị nkeọma na ihe ya na-agụ bụ ihe banyere Jisọs. Siterị n’Etiopia ka o biliworo bịa ikpere Chineke n’Ụlọukwu dị na Jerusalem, ma ọ chọtabeghị ihe ahụ nke obi ya na-achọ. Filip Onye mkwusa wee saghe ọnụ ya kwusaara ya Jisọs, ná-egosi onozi ahụ na Otù onye ahụ nke Aisaia Onye amụma na-ekwu ihe banyere ya bụ Jisọs.

Ọlụ Dịrị Anyị

Ọ bụ ezie na Filip nọ n’ọzara ahụ náánị ya, o mere ngwa ikwu otù ahịrị okwu n’ihi Jisọs. Ị na-eme ihe niile ị pụrụ ime iduzi ndị mmehie baa n’ụzọ nke nzọpụta? Ọ dị ndị ntorọọbịa nọ n’ụlọ akwụkwọ gị ọ na-agụ agụ ịchọta Jisọs nke ná-asị kwa, dịka onozi ahụ, “É-è, n’ihi na m̀’gēsi aña pụ ịmata, ma ọ buru na ọ digh onye gēdum?” Ka anyị lezie ndụ anyị anya nkeọma mee kwa ka o doo anyị anya n’ezie na ọdịghị ohere ọ bụla funarịrị anyị ịgwá ndị ọzọ banyere Jisọs. Enwere ike Onyenwe anyị na-agwa otù onye taa sị, “Bilie, nāga n’akuku ndida,” maọbụ n’ụzọ ọzọ, “Gaa n’akuku ebe m’ga-eziga gị ka ewee nweta otù mkpụrụobi agụ naagụ.”

Akọrọ akụkọ banyere mkparịta ụkà nke elere-anya na ọ gara n’etiti Jisọs na Gabriel. Ọ dị ka ha na-akparịta ụkà banyere àtụmààtụ nke ịgbasa Oziọma mgbe Jisọs rịgosịrị n’Eluigwe ịlakwuru Nna Ya. Jisọs gwara Gabriel na Ya rapụrụ ndị ná-eso ụzọ Ya ka ha jee gwa ụwa banyere Kraist ahụ. Mgbe ahụ Gabriel wee jụa sị, “Ma gịnị ga eme ma ọbụrụ na ha emeghị ya?” Ma, dịka akụkọ ahụ na-aga, Jisọs zara sị, “Enweghịm àtụmààtụ ọzọ.”

Ndị enyim ndị Kraist, ọ bụ ọlụ dịrị anyị ịkọrọ mkpụrụobi niile nọ n’ọchịchịrị akụkọ banyere Jisọs. Anyị achọghị ịbịaru n’oche ikpé Kraist wee hụ onye anyị ná-ahụ ụbọchị niile n’ụlọ akwụkwọ, n’ọlụ, ma ọbụ n’okporo ụzọ, ka ọ na-atụ anyị aka ná-asị, “I gwaghịm ihe banyere Jisọs; ị kpọghịm òkù ịbịa n’ụlọ nzukọ.”

Okwukwe Sitere N’ala Obi

Ụgbọala ahụ wee buru Filip na onozi ahụ ná-aga n’iru n’iru. Ná mberede ìhè wee mụwaa ná mkpụrụobi nke onye ijé ahụ sitere n’Etiopia. Otù ọdọ mmiri ma ọbụ mmiriiyi dị n’akụkụ ụzọ n’iru ha. “Le, miri; gini nānapu imem baptizim?” bụ okwu nke onye ahụ chègharịrị ọhụụ. Filip zara sị, “Ọ buru na I ji obi-gi dum we kwere, agēme gi.” N’ezie ọ bụ site n’obi ya niile ka onozi ahụ pụrụ ikwu sị, “Ekwerem na Jisus Kraist bu Ọkpara Chineke.” Ọñụ juru obi ya. Ya na onye ahụ emekọtawo bụ onye ahụ sị, “Ya onwe-ya bupuru nmehie ọtutu madu” (Aisaia 53:12).

Ọwụwụ Mmiri Nke Mmiri

O doro anya na ọ dịghị ajụjụ ajụrụ n’ụbọchị ahụ banyere otú aga-esi wụọ mmiri ahụ dịka ọ dị n’ụbọchị ndịa. Náánị otù ụzọ ziri ezi -- ụzọ nke Baịbụl. Ọ bụ ezie na ana-ahụ ọtụtụ ụdị nke ọwụwụ mmiri n’ụwa taa, ọ bụrụ na enwere ajụjụ banyere eziokwu a nke sitere na Baịbụl, onye ahụ nwere ike ịsaghe Okwu Chineke ịchọta ọzịzá ya n’ebe ahụ. Mgbe emikpuru mmadụ nime mmiri ọ na-egosi isokọ n’ọnwụ na òlìlì na mbiliten’ọnwụ nke Kraist (Ndi Rom 6:3, 4). Náánị ndị nwụrụ anwụ ka ana-eli; ọ bụ kwa náánị ndị nwụworo n’ebe mmehie, ụwa, anụ-arụ na ekwensu dị bụ ndị kwesịrị ka elie ha na ọwụwụ mmiri. Jọn wụrụ Jịsos mmiri nke mmiri. Ozi ikpe-azụ O nyere ndị ná-eso ụzọ Ya bụ: “Ya mere, ganu, me mba nile ka ha buru ndi nēso uzọm, nēme ha baptizim bà n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ” (Matiu 28:19).

Òlee ihe-atụ nke ọwụwụ mmiri nke mmiri ọzọ apụrụ ịchọta karịa nke enyere n’Ọlu Ndi-ozi 8:38; “Ha abua we rida na miri, ma Filip ma onozi ahụ; ọ we me ya baptisim.”Amaokwu nke naeso ya bụ: “Mgbe ha siri na miri rigota, Mọ nke Onye-nwe-ayi wepuru Filip; onozi ahu ahugh kwa ya ọzọ.”

Ụgbọala Nke Oziọma

Enwere ike nfunarị nke Filip funarịrị onozi ahụ ga-emeworị ka ọ maa jijiji, ọ bụ ezie na onye nkuzi ya funarịrị ya ma ọ chọtawo Mesaia ahụ. Ọ bụghị kwa onye ná-amaghị ihe banyere Onye ahụ nwere ọtụtụ Ihe mgbu, onye ọ gụworo ihe banyere ya. Kraist emewo ka mkpụrụobi ya nwere onwe ya.

Ụgbọala ahụ wee ná-ga n’iru n’iru, ná-ebu onozi ahụ na Oziọma nke Nzọpụta ná-alaghachị n’ala Etiopia. “Ụgbọala nke Oziọma” ka na-aga kwa n’iru taa na-ezisa ozi nke olileanya nye mmadụ niile. Ndị ná-awagharị ná-achọ nnapụta site ná mmehie, iruuju na nsogbu, nwere ike bànye nime ụgbọala a wee ná-aga n’ụzọ ha ná-añụrị ọñụ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Òlee ebe Filip nọ mgbe eziri ya ozi ijéru Geza?
  2. Gịnị mere onozi ahụ jiri jee Jerusalem?
  3. Gịnị ka ọ na-eme mgbe Filip zutere ya na mbụ?
  4. Ọ dị ka obi ọ tọrọ ya ụtọ ịhụ Filip?
  5. Òlee ebe ọ na-agụ nime Akwụkwọnsọ?
  6. Gịnị bụ óké mgbanwe batara ná ndụ ya?
  7. Kwue ihe mere Filip mgbe ọ wụsịrị onozi ahụ mmiri
  8. Gịnị bụ ihe ọmụmụ dị mkpà anyị pụrụ ịmụta site n’akụkọ a?