I Ndi Eze 13:1-34; 2 Ndi Eze 23:15-18

Lesson 293 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “JEHOVA, bu Chineke-ayi, ka ayi gēfe òfùfè, olu-Ya ka ayi gēge kwa nti” (Joshua 24:24).
Notes

Ikpere Arụsị

Anyị na echèta akụkọ banyere Eron onye mere nwa-ehi ọla-edo wee kpọsaara ndị ahụ sị, “Ndia bu chi gi, Israel, ndi mere ka I si n’ala Ijipt rigoputa” (Ọpupu 32:4). Nke a megidere iwu nke mbu: “Gi enwela Chi ọzọ tiyerem” (Ọpupu 20:3). Nwa-ehi ọla-edo! Lee ụdị ihe ná-abàghị urù dị otú a ndịa jiri gbanwere Chineke ukwu a Onye mewooro ndị Ya ọtụtụ ezi ihe!

Mgbe ọtụtụ arọ gasịrị anyị hụkwara nwoke ọzọ Jeroboam bụ Eze, ka o mekwara ụmụehi ọlaedo abụọ awụrụ anwụ wee kpọsakwara ndị ahụ sị: “Le chi-gi, Israel ndi mere ka I si n’ala Ijipt rigoputa” (I Ndi Eze 12:28). Mgbalị ọzọ iji nwa ehi ọla-edo gbanwere Chineke ukwuu nke Eluigwe na ụwa, ma nke a agazighị kwa!

Ka arọ naga otú a ka ụmụ mmadụ na-emere onwe ha arụsị ná-efè kwa ha òfùfè karia ifè Chineke òfùfè. Ọ bụ ezie na nime obodo anyị mepere anya, ụmụ mmadụ adịghị emere onwe ha ụmụ ehi ọla-edo wee ná-ada n’iru ha ná-ekpekwara ha. Ma, enwekwara ụdị ikpere arụsị ọzọ dị iche iche. Ndị ná-ejé mgbe niile n’ebe ana-ekiri ihe, n’ebe ité egwú, ebe ana-agba bọlụ, na ebe ọzọ dị iche iche ana-eme ihe ụtọ nke ụwa na-efè chi nke ihe ụtọ. Chineke ga-eme ka ha baa n’ikpé otù ụbọchị bụ ndị ahụ ná-ahụghị Ya n’anya, ná-ejighị kwa obi ha niile feè ya òfùfè.

Onye nke Chineke

Otù ụbọchị ka Jeroboam guzoro n’akụkụ ebe ịchụàjà isure ihe nsureọkụ ná-esì ìsì ụtọ nye ụmụehi ahụ o meworo, otù onye nke Chineke wee si na Juda bịa wee bue amụma banyere ọmụmụ Josaia, nke mezuru mgbe ihe ra ka narị arọ atọ na iri arọ isii (360) gasịrị; o kwukwara na aga-esure ọkpụkpụ nke ndị nchụàjà ajọomume ahụ n’elu otù ebe ịchụàjà ahụ otù ụbọchị. Dịka ihe àmà na ihe aga-emezu, Onyenwe anyị mere ka ebe ịchụàjà ahụ wee gbawaa wụsị kwa ntụ.

Amụma a eburu mere ka iwe wee Jeroboam, o wee setipụ aka ya sị, “Jidenu ya.” Mgbe ọ na-agbalị kwa iseghachị aka ya, ọ pụghị kwa, n’ihi na ọ kpọnwụwo. “Biko, chọ ime ka iru JEHOVA, bù Chineke-gi, dajua, gi kpe kwa ekpere banyerem, ka akam we laghachikutem,” ka ọ sịrị.

Jeroboam nọ n’isure ihe nsureọkụ ná-esì ìsị ụtọ nye chi ụgha; ma ugbu a ọ chọrọ inyeaka, ọ chọrọ ya site n’aka Jehova bụ Chineke. Onye nke Chineke kpere ekpere, aka eze ahụ wee dị kwa ya mma. Otú ahụ ka ọ na-adị ọtụtụ mmadụ taa: ụdị okpukpé ọ bụla dị mma ọ bụrụ na ihe naaga nkeọma; ma mgbe nsogbu mberede bịara, ha na-achọ ekpere nke ndị bụ ezi ndị nke Chineke ndị ana-anụ ná-aza kwa ekpere ha.

Eze wee rịọ onye nke Chineke ahụ ka o soro ya laa n’ụlọ ya ka ọ gbaa onwe ya ume. Ọ sịkwara, “M’gēnye kwa gi onyinye.” Ma onye nke Chineke jụrụ isoro eze, n’ihi na enyere ya iwu site na Chineke ka ọ ghara iri ihe, ghara kwa ịñụ ihe ọñụñụ, ka o soro kwa ụzọ ọzọ laa. Ná-arụghị ụkà ihe kpatara nwoke a ga-eji ghara isoro ha mekọrịta ihe bụ n’ihi na ha echigharịwo pụọ site n’ezi òfùfè nke Chineke. N’irubeisi n’iwu Chineke, ọ malitere ịlaghachị site n’ụzọ ọzọ ná-abụghị nke o si bịa.

Onye amụma Bụ Agadi

Ụmụokorọbịa ụfọdụ nọ ná-ege ntị n’okwu Joroboam na onye nke Chineke ahụ na-ekwu. Ha ahụwo kwa ụzọ onye nke Chineke ahụ sitere ná-alaghachị, ha wee mee ngwangwa jee kọọrọ nna ha ihe niile mere. Nna ha, onye amụma bụ agadi nọ na Betel, wee jụọ sị, “Òlee nke bu uzọ o jere?” Mgbe ha gwara ya, ọ sị, “Jikwaranum inyinya-ibu.” Onye amụma ahụ bụ agadi wee pụọ ná-agbasi ọsọ ike. N’ikpe-azụ, mgbe ọ gbakwuru onye nke Chineke ahụ, ọ jụọ sị “Ọ bu gi onwe-gi bu onye nke Chineke ahu nke siri na Juda bia?” “Ọ bu mu onwem,” bụ ọzịzá nke onye nke Chineke ahụ nọdụrụ ná-ezu ike n’okpuru osisi terebinth. Onye amụma ahụ bụ agadi wee rịọ ya sị, “Sorom je n’ulo, ri kwa nri.”

Ọ bụ ezie na ike ga-agwụwo yarị, akpirị na-akpọ ya nkụ, agụụ na agụ kwa ya, ma ọ ka kpebi kwara imezu iwu ahụ niile nke Jehova nyeworo ya, onye nke Chineke wee sị na agwara ya erila nri, añụkwala mmiri, alaghachịkwala n’ụzọ o siri jee.

Emere Ka Obi ya Tụgharịa

Ọtụtụ mgbe ekwensu nwere ike ghara inwe mmeri ná mgbalị ya mbụ imegide nwa Chineke. Ma ọ ga-agbalị ọzọ eleghịanya site n’ụzọ dị iche. Onye amụma ahụ bụ agadi adaghị mbà ngwangwa. O kpebie n’obi ya sị, m’ga-agbalị ọzọ. Kama ọ ga-asị, “Jehova gwaram okwu,” ọ sirị: “Mu onwem bu kwa onyeamuma dika gi; mọ-ozi we gwam okwu n’okwu Jehova, si, Me ka o soro gi lata n’ulo-gi, ka o we rie nri ñu kwa miri.” Lee ụgha nke a o wepụtara n’ụzọ aghụghọ! Otú a kwa ka ekwensu na-eme, iwere okwu ụgha kwagide ihe o kwuru ka o wee merie.

Ejidere Ya n’ọnyà

Ọ bụrụ na onye nke Chineke ahụ akwụsịghị n’okpuru osisi terebinth, agadi nwoke ọjọọ ahụ agaghị ejekwuwo yarịị. Ọ kwụsịrị ọ nọdụrụ ala; o gere ntị; ya na onyeiro wee nwee mkparịta ụkà. Emesịa ọ laghachị azụ wee jee n’ụlọ onyeamụma ahụ bụ agadi; ya na ya wee rie nrị ñụa kwa mmiri. Ejidewo ya n’ọnyà nke onyeiro!

Akụkọ dị mwuta nke onye nke Chineke ahụ agwụghị n’ebe ahụ. Ka ndịkom abụọ ahụ nọdụrụ nánri, onyeamụma ahụ bụ agadi wee kwupụta ikpé nke ga-adakwasị nwoke ahụ Chineke ziworo ịlụ otù ọlụ: N’ihi na ọ nupụụrụ Jehova isi wee lọghachị rie nri, ñụa kwa iheọñụñụ, ọ gaghị eru ụlọ ná ndụ. Ka ọ na-aga n’ụzọ ya ịlaghachị ụlọ, ọdụm wee zute ya gbuo kwa ya.

Chineke enyewo ya ọlụ ka ọ lụọ, ọ lụwokwa ya nkeọma. Ma mgbe ọ na-alaghachị n’ụlọ ya, ọ rapụrụ ụzọ ahụ. Mgbe Chineke nyesiworo ya iwu banyere ihe ọ ga-eme na ihe ọ gaghị eme, gịnị mere o ji gee ntị n’okwu nke onye amụma ahụ na-ekwu okwu ụgha onye sịrị na ya natara ozi dị iche?

Ọnyà N’ogologo Ụzọ Ahụ

Site na mgbe ahụ ekwensu enwewo ihe fọdụrụ ntakirị ka o rue puku arọ atọ (3000) nke mnwapụta ichigharị obi nke ndị ná-eso Onyenwe anyị pụọ site n’ụzọ ahụ dị warara dị kwa mkpagide. Aghụghọ ya kadị kwa taa dịka ọ dị n’oge nke Jeroboam n’ịchụso ndị nke Chineke; otú ahụ ka o jupụtakwara n’amamihe aghụghọ ime ka ha nọdụ n’okpuru osisi terebinth izuru ike. Ọ ga aka anyị mma ilezianya hụ na anyị ná-ege olu nwayọ ahụ dị ntà nke Mmụọ Nsọ ntị mgbe niile, ghara igentị n’ọkpukpọ òkù nke ụwa ma ọbụ ekwnsu. Nwaokoro ntà maọbụ nwaagbọghọ ntà nwere ike sị, “Bia ka ayi jee n’ebe ana-egwuriegwú dị iche iche.” I nwere ike ịzaghachị sị, “Abụm onye Kraist, adịghịm eje n’ụdị ebe ahụ.” Ọ ga-arụ gị ụkà sị, “Ma, abụkwam onye Kraist, otú ọ dị ana-meje n’ebe ahụ mgbe niile.” Otú ọ dị, ọ bụrụ na obi gi na Eluigwe na-enwe “mmekọrịta,” otù ihe ga-agwa gị na ụlọ egwuriegwú abụghị ebe kwesịrị ezi onye Kraist ijé.

Ekwensu ochie ahụ na-achị nwa Chineke ọ bụla daghachịrị azụ ọchị, ná-ákwá kwa ya emò. Lee óké ihe ọjọọ dakwasịrị onye a Chineke na-edú na mbụ, onye rubewokwara isi n’olu nke Chineke. Ílì ya n’ezie bụ ihe ncheta nke nnupụisi na ọdịda. N’ogologo ụzọ anyị dịka ndị Kraist ana-enwe ọtụtụ ihe atụ nke ná-akọrọ anyị banyere nnupụisi, ọdịda, na mmadụ iwezuga onwe ya n’ebe Onyenwe anyị nọ. Ireọkụ nke mma-agha dị n’ebe ọwụwaanyanwụ nke Ogige Iden bụ ihe ncheta nke ebe nnupụisi mbụ nime ụwa (Jenesis 3:24). Otù ogidi nnu na-egosipụta ebe otù nwanyị laghachịrị azụ site n’iso Onyenwe anyị (Jenesis 19:26). Óké obo nkume n’azụ obodo ná-egosi ebe Ekan zutere ọnwụ erughị eru n’ihi mmehie ya (Joshua 7:26).

N’Ụzọ Ịla Ụlọ

Obi anyị jupụtakwara n’ekele n’ihi na enwekwara ihe ncheta nke mmeri n’ụzọ nke ná-edu site n’ụwa rue Otuto. Okwu Chineke jupụtara n’ihe ndepụta banyere ndịkom na ndịnyom ndị ná-echigharịghị n’aka-nrị ma ọbụ n’aka-ekpe, ma ọbụ chigharịa azụ, ha ejewo kwa ijé ha nkeọma rue “Ulo.” Gụọ n’Akwụkwọ Ndị Hibru isi iri na otù nke kọrọ akụkọ ná mkpịrịkpi banyere ndị meriworo site n’okwukwe. Gụọ kwa akụkọ banyere ndụ nke ndịa bụ ndị mmeri n’otù n’otù. Ịmara ihe banyere ndịa nweworo ntachịobi nọgide rue ọgwụgwụ ga-eme ka okwukwe gị dị elu.

Ọ bụrụ kwa na anyị onwe anyị taa ekpebie n’obi anyị ilegide Ezi Onye ndú ahụ anya na irubeisi n’iwu niile enyere anyị ọ bụghị ụfọdụ nime ha, anyị onwe anyị kwa, ga-enwe ike otù ụbọchị isonye ndị debeworo ma lụọ kwa ọgụ n’ihi okwukwe ahụ.

“D’ike, lu’ọgu, meri’ih’ọjọ;

Guzos’ike, ala-kwa-l’azu.

Ọ bụrụ n’I g’emeri,

Nọgidesise ike.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị bụ ihe ịrịba-àmà enyere igosi na amụma nke onye nke Chineke ahụ bụ eziokwu?
  2. N’aka onye ka Jeroboam chọrọ ọgwụgwọ nke aka ya?
  3. Gịnị ka i chère kpatara Jeroboam ji chọọ ka onye nke Chineke ahụ soro ya laa n’ụlọ ya?
  4. Gịnị mere o ji jụ ijé?
  5. Gịnị bụ ndahie mbụ onye nke Chineke ahụ mere?
  6. Gịnị bụ ihe onye amụma ahụ bụ agadi nyere dịka ihe ngọpụ mere o ji kpọrọ ya laa n’ụlọ ya?
  7. Kwue banyere ọnwụ mwute nke onye nke Chineke ahụ.
  8. Gịnị mere o ji bụrụ ihe jọgburu onwe ya ịnupụisi n’ihe Chineke kwuru?