I Ndi Eze 14:1-20

Lesson 294 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ọ digh ihe ọ bula ekpuchiworo ekpuchi, nke anāgagh-ekpughe; ọ digh kwa ihe ezoro ezo, nke anāgagh-ama” (Matiu 10:26).
Notes

Mmehie nke Jeroboam

Ụfọdụ ndị edere ihe banyere ha na Baịbụl ka amatara n’ihi okwukwe ha, ụfọdụ n’ihi ntachi-obi ha, ndịọzọ kwa ka amatara n’ihi óké ọlụ ha lụrụ. Ma amatara ụfọdụ ma ọbụ ná-echeta ha n’ihi ndahie na ọdịda ha. Mgbe niile aga na-echeta Jeroboam, aga-ejikọta aha ya na okwu ise ndịa, na o “ji me ka Israel mehie.” Ugbò iri na iteghete nime Baịbụl ka ekwuru okwu a banyere Jeroboam. Lee ihe mwuta ọ bụ ikwu okwu dị otú a banyere onye kwesịrị ịbụ onyendú kwesịrị ntụkwasịobi nke ndị nke Chineke! Anyị na-echeta na ọ bụ Jeroboam bụ onye mere ụmụehi abụọ nke ọla-edo ahụ, chụkwara ha àjà, wee gwa ndị ahụ na ha arịgọzuwo Jerusalem ifè òfùfè; ya mere ha onwe ha fekwara ụmụehi ọla-edo ahụ òfùfè.

Ọ bụghị náánị na mmehie nke nwoke a jọgburu onwe ya metụtara Ụmụ Israel, kama ọbụná èzínaụlọ nke ya onwe ya ka emekpara arụ. Ka anyị ná-echeta mgbe niile na ndụ anyị naebi na enwe mmetụta n’ebe ndị anyi na ha na-akpakọta nọ. “N’ihi na ọ digh onye ọ bula n’etiti ayi nke di ndu n’ebe ya onwe ya nọ, ọ digh kwa onye ọ bula nwuru anwu n’ebe ya onwe-ya nọ” (Ndi Rom 14:7). Anyị na-agụ na Baịbụl na, “Ọbuná nwata nēme ka amata ya site n’omume-ya nile, ma ọlu-ya di ọcha, ma o zi-kwa-ra ezi” (Ilu 20:11).

Ịchọ Ndụm-ọdụ

Ugbu a anyị chọpụtara na nwa Jeroboam dara ọrịa. Ya mere Jeroboam sịrị ka nwunye ya nwogharịa onwe ya wee jekwuru Ahaija Onye amụma na Shailo ịjụta ma nwa ahụ ọ ga-adị ndụ. Nne a nke obi ná-adịghị mma wee were ọtụtụ onyinye n’aka ya, nke bụ omen’ala ha mgbe ha na-ejekwuru onye amụma, o wee jee ijeé ya ịchọ onye nke Chineke. Onye amụma nke Chineke ahụ kpuruìsì, ya mere ọ ga-abụworị ihe ná-adịghị mkpà nye nwunye Jeroboam inwogharị onwe ya; ma anya nke ime mmụọ ya ghereoghe dị kwa nkọ ịmata ọbụná nzọ ụkwụ nke nwanyị ahụ. “Nti” nke obi-ya kwa adịghị arọ, n’ihi na olu Chineke ekwuwo, gwa ya na nwanyị ahụ na-abịa, nye kwa ya ndụm-ọdụ ihe ọ ga gwa ya.

Onye Ná-ekpughe Ihe Nzuzo

Ọtụtụ mgbe Chineke ná-ekpughe ihe nzuzo na ihe niile ezoro ezo nye ndị Ya. Otù mgbe ụmụokorontà abụọ tiwara ụzọ baa n’otù ụlọ zuru kwa ego mgbe ha matara na èzínaụlọ ahụ agawo ụlọ ụkọ ha ifè òfùfè. Mgbe ndị èzínaụlọ ahụ latara wee chọpụta na ezuwo ha ori, otù mgbe ahụ ka nne ha sịrị na ya amatawo onye mere ihe a. N’echi ya ndị uwe-oji wee jekwuru ụmụokorontà abụọ ahụ ịsị ha kwupụta ihe ha mere. Mgbe akpọtara ha n’iru ndị ahụ ha mejọworo, ụmụokoro ahụ wee chọọ ịmata ihe mere eji chee na ọ bụ ha. Nne ahụ gwara ha na Chineke bi n’Eluigwe egosiwo ya onye ikpé ahụ mara. O wee sị ha na ha aghaghị ịna-echeta na Chineke na-ahụ ihe niile ha na-eme na O nwekwara ụzọ ikpughere ndị nke Ya ihe meworo. “N’ezi-okwu Chineke-unu bu Chineke nke chi nile, na Onye-nwe ndi-eze, na Onye nēkpughe ihe-nzuzo nile” (Daniel 2:47).

Ọ dịghị mkpà ka nwunye Jeroboam kọwaa onwe ya -- n’ezie, o nweghị dị oghere ikwu okwu. Onye amụma nke Chineke kwuru okwu niile, wee basiere ya mbá ike n’ihi mnwogharị ahụ o nwogharịrị onwe ya. Apụrụ ịghọgbu ụwa nime uwe nke iruabụọ; site n’ime omume iruabụọ ụfọdụ na-adị ka ha na-aga n’iru n’ihe banyere okpukpé. Ụfọdụ na-adị kwa ka ha na-enweta iruọma nke onye ọzụzụ atụrụ ma ọbụ onye mkwusa ha site n’inye ha onyinye ma ọbụ site n’iruabụọ ná-egosi na ha bụ ihe ha ná-abụghị, ma Chineke nọ n’Eluigwe ná ahụzu ha niile, Ọ ga-eme kwa ka ọ pụta ìhè otù ụbọchị.

Lee otú nzuzu nwunye Jeroboam ra na o chère na anya onye nke Chineke apụghị ịhụ gabiga uwe aghụghọ ya ahụ! Ezi nwa Chineke adịghị enwe ihe ọ na-ezo ma ọbụ ihe ọ na-ekpuchi. Ndụ ya dị ka akwụkwọ asaghere asaghe, nke mmadụ niile maara, ná-agụ kwa (2 Ndi Kọrint 3:2). Ọ dịghị atụ egwù ma ọbụ mee ihere iguzo n’iru onye Kraist ọzọ ma ọbụ onye mmehie.

Ozi Ahaija

Ahaija gwara nwunye Jeroboam na ya bu “onye-ozi siri ike” nye ya, ma ọbụ, n’uzọ ọzọ, ozi dị ilu nke ukwu, Ọ gwara ya ka ọ laghachị gwa di ya na Jehova Chineke nke Israel ekwuwo na ebe ya onwe ya dịka eze nke ndị ahụ edebeghị iwu nke Jehova, kama o mere iheọjọọ site n’ime chi ọzọ dị iche iche na itụfu Jehova n’azụ ya, na Jehova ga-eme ka iheọjọọ bịakwasị ụlọ Jeroboam. Agaghị elì ọbụná ndị ha nwụrụ anwụ. Ndị ga-anwụ n’obodo, nkịta ga-eri ha; ndị nke ga-anwụ n’ọhịa, anụ-ufe nke Eluigwe ga-eri ha. O wee sị, “Bilie la n’ulo-gi: mgbe ukwu-gi ná àba n’obodo, nwata ahu gānwu kwa.” Nke bụ ọzịzá enyere ya!

Aga-eropụ kwa ụmụ Israel n’ezi ala ahụ, wee fesaa kwa ha n’ebe dị anya, ka Ahaija kwuru. O wee were okwu ikpé dị ilu nke ukwu mechie amụma ya; “Ọ (Jehova) gārara kwa Israel nye n’ihi nmehie Jeroboam nile, nke ọ mehieworo, na nke o ji me ka Israel mehie.”

Emezuru Okwu Chineke

N’ezie, ọ ghaghị ịbụ n’obi dị arọ ka nwanyị ahụ laghachịrị n’ụlọ ya. Nwa ya nwoke bụ Abaija aghaghị ịnwụ, èzínaụlọ ya niile ga-anwụ kwa ọbụná ná-enweghị onye ga-elì ha. Ka ọ na-abịaru na mbata ụzọ, nwa ya wee nwụọ. Otú ọ dị, náánị nwa nwoke a bụ onye kwesịrị inwe ílì n’ụlọ Jeroboam niile, n’ihi na ahụrụ nime ya ezi ihe n’ebe Jehova, bụ Chineke nọ. Anyị na-agụ na n’oge ọchịchị nke Esa bụ Eze ka egburu ndị niile sitere n’ụlọ Jeroboam, ọ dịghị kwa “Onye ọ bula nke nēku ume fọduru Jeroboam rue mgbe o kpochapuru ya; dika okwu JEHOVA si di, nke o kwuru n’aka orù Ya, bú Ahaija” (I Ndi Eze 15:29).

Anyị niile matara na Ụmụ Israel, ndị Ju, ka achụsara n’ụwa niile. Okwu Chineke ná-emezu, mmehie adịghị agabiga kwa ná-enweghị ahụhụ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị bụ ọnọdụ Jeroboam n’oge a?
  2. Gịnị mere Jeroboam ji zigaa nwunye ya ijekwuru Onye amụma?
  3. Òlee otú Ahaija si mata na nwunye Jerobaom na-abịa ịhụ ya?
  4. Òlee otú enwere ike isi were Jerobaom tụnyere Devid?
  5. Kwuo ná mkpirisi okwu ikpé ekwuru megide ụlọ Jeroboam Israel niile kwa.
  6. Gịnị mere nwa Jeroboam ahụ ná-arịa ọrịa?
  7. Gịnị bụ ihe kpatara eji lie nwaokoro a?
  8. Kpọọ aha ndịọzọ nime Baịbụl bụ ndị gbalịrị ikpuchi mmehie.