2 Ihe Emere 14:1-15; 15:1-19; 16:1-14

Lesson 295 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nātukwasi madu obi, we me ka anu-aru, bú madu, buru ogwe-aka-ya, onye obi-ya nēsi kwa n’ebe JEHOVA nọ wezuga onwe-ya” (Jeremaiah 17:5).
Notes

Ibibi Arụsị niile

Mgbe Esa bụụrụ eze nke atọ nke Juda, udo dị n’ala ahụ arọ iri. “Esa we me ezi ihe nke zikwara ezi n’anya JEHOVA.” Esa wee gbaa ndị ahụ ume ịchọ Chineke na irubeisi n’iwu Ya niile. O wee wezuga ebe ịchụàjà niile nke ala ọzọ na ebe niile dị elu, tụpịa ogidi niile na ihe oyiyi nke òfùfè arụsị.

Ndị mụrụ Esa abụghị ndị ná-ekpere ezi Chineke. Ọchịchị nke nna ya na Juda jọgburu onwe ya. Nne Esa ewuwo arụsị n’ebe dị elu (I Ndi Eze 15:13). Ọbụná na ọ bụ ezie na ndị mụrụ Esa adịghị efè ezi Chineke òfùfè, Esa mere ihe dị ụtọ n’iru Chineke. Mmehie, ikpere arụsị, na iheatụ ọjọọ gbara ya gburugburu ma Esa mere ihe ọ matara bụ ezi ihe. Anyị pụrụ ileanya na Chineke ga-anọnyere anyị, nyekwara anyị aka mgbe anyị mere ihe ziri ezi ọbụná na ọ bụ ezie na ndịọzọ nọ anyị gburugburu adịghị erubere Chineke isi.

N’oge Udo

Esa gwara ndị ahụ na Jehova enyewo ha udo n’ihi na ha achọwo Chineke. N’oge udo, ha na-alụsị ọlụ ike. Mgbidi, ụlọ elu, ibo ọnụ-ụzọ ama, na mkpọrọ ka ha ji wusie obodo ahụ ike. Ha wee wue, ihe wee gakwara ha nkeọma. Emekwara ka ndịagha nke Esa bawanye ụba dị kwa ike karị. N’oge nke udo, Esa na-alụsị ọlụ ike ná-ejikere maka oge ndịiro ga-abịa imegide ya. Ọ bụ ihe ziri ezi nye onye Kraist ị na-eme onwe ya ka ọ dị ike mgbe niile. Kama ịnọ ná-emeghị ihe ọ bụla, onye Kraist kwesịrị ịnọgidesi ike n’ịmụ Okwu Chineke, n’ihi na nke ahụ na-eweta ike, okwukwe, na agbam-ume nye ya. Agwara anyị na Okwu Chineke bụ “mma-agha nke Mọ Nsọ” (Ndi Efesọs 6:17). Site kwa n’ekpere, ana-eme ka onye Kraist dị ike, ana-eyikwasị kwa ya ihe agha nke Chineke, nke ụfọdụ nime ya bụ okpu agha nke bụ nzọpụta, ihe agha nke ná-egbochi obi bụ eziomume, na ọta nke bụ okwukwe.

Ekpere na Mmeri

N’oge ná-adịghị anya, Zera bụ onye Etiopia, wee bilie ibuso Esa agha. Ndịagha nke onyeiro dị ihe ra ka okpukpu abụọ nke ndịagha. Esa, ná-agụghị narị ụgbọ-ala atọ ha nwere. Ma egwù atụghị Esa, n’ihi na ntụkwasị-obi ya dị nime Chineke. Esa kpere ekpere wee rịọ Chineke ka O nyere ya aka. Esa sịrị: “Yere ayi aka, JEHOVA bú Chineke-ayi; n’ihi na ọ bu na Gi ka ayi dabere, ọ bu kwa n’aha-Gi ka ayi biaworo imegide ìgwè a.” Esa emewo ka ndịagha ya baa ụba, mee kwa ka obodo ya dị ike. Ná-agbanyeghị nke a ọ tụkwasịrị Chineke obi ịnapụta ya. Esa eleghịanya na náánị Chineke ga-alụ ọgụ ahụ, o tinyeghị kwa okwukwe ya nime mmadụ na iheagha.

Chineke zara ekpere Esa. Chineke tigburu ndị Etiopia ahụ n’iru Esa. Mgbe ha gbara ọsọ, Esa na ndị ya chụrụ ha ewee merie ndịiro. Chineke nyere ndị Juda mmeri n’ebe ndịiro ha nọ -- karịa kwa. Esa na ndịagha ya tigburu obodo niile nọ gburugburu wee lụta ọtụtụ anụụlọ, atụrụ na ịnyịnyaibu, ya mere ha nwere ihe karịa ka ha nweworo tutu agha ahụ amalite. N’ihi na Esa mere ihe ziriezi, Chineke wee nye ya izuike, ọgan’iru, na mmeri, zaa kwa ekpere ya. Ị chere na ọ dịịrị Esa mma ime ihe dị Chineke ụtọ? Ọ dị mma ifè Chineke òfùfè na ime ihe ziriezi n’oge nke anyị a?

Otù Ịdọ Aka-ná-ntị

Azaraia nwa Oded nwere ozi ọ ga-ezi Esa na ndị ahụ niile. Ọ sịrị, “JEHOVA nọnyere unu, mgbe unu nọnyere Ya; ọ bụrụ kwa na unu achọ Ya, Ọ gēme ka unu chọta Ya; ma ọ buru na unu arapu Ya, Ọ gārapu unu.” Ha anwapụtawo akụkụ nke mbụ nke ozi Azaraia. Esa ọ chọghị inyeaka Chineke, ha wee merie n’agha? Ha achọghị ka Chineke rapụ ha, ya mere, ha ñara ntị n’ịdọ akanántị nke Onye amụma. Ọ sịwo, “Ma unu onwe-unu, dinu ike, ekwela ka aka-unu kuda: n’ihi na ugwọ-ọlu diri ọlu-unu.”

Ezi Òfùfè

Esa wee mee ka ebe ịchụàjà Jehova dị ọhụụ, kpọọ kwa ndị ahụ ifè òfùfè. Ha wee were “obi-ha nile na nkpuru-obi ha nile” chọọ Chineke. Ha na Jehova wee baa n’ọgbụgbandụ, ha wetakwara Ya onyinye. Ha kwere Chineke mkwà na aga-eme ka onye ọ bụla ná-agaghị ekpe ekpere chọọ kwa Chineke nwụọ. Ọbụná ezenwanyị, nne Esa, onye mewooro onwe ya arụsị n’ebe dị elu ka ewepụrụ. Esa gbuturu arụsị ya, suree kwa ya n’ọkụ n’akụkụ mmiriiyi Kidron.

Ndị ahụ nyere Jehova onyinye dịka ndị Kraist taa na-eji obi ha chụara Ya àjà. Mgbe ndị Juda jiri obi ha niile na “otú ọ nātọzu ha utọ” chọọ Chineke, O mere ka ha chọta Ya. Óké ọñụ na itimkpu, na ịfụ opi na opi ike wee dị. Chineke wee nye ha udo na izu ike ọ dịghị kwa agha dị nime ọtụtụ arọ.

Ụmụ mmadụ taa nwere ike inwe udo nke ime mmụọ site n’ịchọ Chineke site n’obi ha niile, site n’ikwe Chineke mkwà, na site n’inye Ya onyinye site n’ijiobichụọàjà. Anyị kwesịrị icheta okwu nke Azaraia bụ Onyeamụma. Onyenwe anyị ga anọnyere anyị mgbe anyị nọnyere Ya, ma Ọ ga-arapụ kwa anyị ọ bụrụ na anyị arapụ Ya.

Agha Ọzọ

Obi nke Esa zuru òkè ụbọchị niile o soro Chineke jee ijè. Oge bịakwara mgbe esogburu udo nke ala ahụ ọzọ. Mmadụ ga-ele anya na Esa ga-ekpe ekpere maka inyeaka Jehova, na ịtụkwasị Chineke obi. Chineke anapụtawo Esa n’aka ndị Etiopia. Azaraia bụ Onyeamụma adọwo harị akanántị na Chineke ga-arapụ ha ọ bụrụ na ha arapụ Ya. Ha na Jehova abàwo n’ọgbụgbandụ na ha ga-ewere obi ha niile chọọ Ya. Gịnị ka ha mere n’oge nsogbu? Hà debere mkwà na ijiobichụọàjà ahụ ha mere na mbụ n’iru Chineke?

Esa chọrọ inyeaka nke Ben-hedad, Eze Siria, onye ná adịghị mgbe ọ bụla ọ bụworo enyi nke Ụmụ Israel, ọ dịghị kwa mgbe ọ bụla o meere ha ezi ihe. Esa wee wepụ àkụ ụlọ Jehova. Ọtụtụ arọ gara aga tutu oge a, o dowo ọla-ọcha na ọla-edo ndịa nsọ nye Jehova ma ugbu a ọ na-ewere ha. Ị iji chọta iruọma nke Ben-hedad, Esa nyere Ben-hedad onyinye site n’àkụ ndịa, nke ná-abụghị nke ya iji mee ihe n’ụzọ dị otú a. Esa wee mee ka ọgbụgbandụ dị n’etiti ya na Ben-hedad, site kwa n’ime nke a o mebie ọgbụgbandụ nke ya na Jehova. Esa adabereghị kwa n’Onyenwe anyị ịlụrụ ya agha. Ugbu a Esa na-atụkwasị mmadụ obi.

Otù Ọgbụgbandụ

Ọ bụ ihe jọrọ njọ na Esa na Ben-hedad mere ọgbụgbandụ? Ọgbụgbandụ ahụ gosipụtara na Esa na-adabere Ben-hedad, na ọ dịghị kwa adabere Chineke ịnapụta ya ọzọ. Anyị na-agụ nime Baịbụl na: “Ọ digh eze anēji uba nke usu-ndi-agha-ya zọputa: adigh-eji kwa ike riri nne naputa dike” (Abù Ọma 33:16). Ekwuru okwu ọbụbụ ọnụ megide ndị ná-atụkwasị mmadụ na ihe agha obi karịa ịdabere Chineke na ịchọ Ya (Aisaia 31:1). Akpọkwasịrị mmadụ ahụ ọbụbụ ọnụ bụ onye ná-atụkwasị mmadụ obi wee si n’ịtụkwasị Jehova obi wezuga onwe ya (Jeremaia 17:5)

Ben-hedad ahụghị Chineke ma ọbụ ndị nke Ya n’anya. Ọ bụ onyeiro nke Ụmụ Israel siterị ná mmalite. Ndị nke Ben-hedad ewetaworo Ụmụ Israel nsogbu, ha ebusowo kwa ha agha ọtụtụ ugbò. Ná-arụghị ụkà ihe kpatara Ben-hedad ji kwenye ka ya na Esa baa n’ọgbagbandụ ahụ bụ inweta ọla-ọcha na ọla-edo ahụ. Ọ bụghị nnọọ na o nwere mmetụta banyere Esa na ndị ya.

Ben-hedad bụ ihe-atụ nke ụwa, nke ná-abụghị enyi nye ndị nke Chineke. Chineke achọghị ka anyị na ekwensu (onyeiro anyị) ma ọbụ onye ọ bụla na-eso ya jikọta n’ihe ọ bụla. Ben-hedad zipụtara onwe ya dịka ọ na-enyere Esa aka ma o nweghị mmetụta banyere ọgan’iru Esa ma ọbụ mmekọrịta ya na Onyenwe anyị.

Gịnị bụ nlụpụta nke ọgbụgbandụ ya na Ben-hedad? Ndị Siria zipụrụ ndịagha ha megide ndịiro nke Juda, ewe lụgbuo kwa ọtụtụ obodo, ma Esa enweghị udo. Nime arọ niile gaworo aga, Esa ekwuwo na Jehova enyewo ha udo n’ihi na ha achọwo Chineke. Mgbe ha ná-achọghị kwa Chineke, ha enweghị udo ma ọbụ izuike.

Ịtụkwasị Chineke Obi

Ka anyị mụta ihe site n’ihe ọmụmụ nke Esa. Ka anyị lekwasị Onyenweanyị anya maka inyeaka, anyị ga-enwe kwa udo na izuike. Ka anyị na ụwa na mmadụ ghara ịná-eme ọgbụgbandụ, dịka Esa na ndị Siria bụ ndịiro ya siterị ná mmalite, ndị ga-abụ kwa ndịiro ya n’ọdịn’iru mere ọgbụgbandụ. Chineke anọnyeworo anyị n’arọ niile gaworo aga, ọ bụrụ kwa na anyị arapụghị Ya, Ọ ga-anọnyere anyị n’ụbọchị niile na-abịa.

Ngọzi na mkwà dị iche iche dịrị ndị ga-erubere Chineke isi (Deuteronomi 28:1-14). N’ọtụtụ ebe nime Baịbụl agwara anyị ka anyị tụkwasị Chineke obi: “Ọ di nma igbabà nime JEHOVA kari itukwasi madu obi” (Abù Ọma 118:8). “Onye nātukwasi JEHOVA obi, agēme ka ọ nọ n’elu” (Ilu 29:25).

Anyị amụwo ihe banyere Devid onye bụrụ eze nke Ụmụ Israel. Devid tụkwasịrị Chineke obi, ewee napụta ya n’aka ndịiro ya. O nyere Jehova otuto n’ihi inyeaka Ya. (Lee Ihe ọmụmụ 244). Gụọ ihe Devid dere n’Abù Ọma banyere ịtụkwasị Jehova obi (Abụ Ọma 18:31; 32:1, 2; 34:20; 37:3).

Job bụ nwoke ọzọ onye tụkwasịrị Chineke obi ya. Ọbụná na ọ bụ ezie na ụmụ Job nwụsịrị, ìgwè anụ-ụlọ ya, ọ fọdụrụ ntakịrị ka ọ bụrụ na ihe niile o nwere gwụsịrị, ma ọ ka tụkwasịrị obi ya na Jehova. Setan bụ onyeiro nke Job dịka ọ bụ kwa onyeiro anyị mekpara Job arụ site n’iwere “ihe-ofifi ọjọ tie Job, site n’ọbụ-ukwu-ya rue opu-n’isi-ya” (Job 2:7), ma Job tụkwasịrị Chineke obi. Mgbe ndị enyi ya bịara ịkasi ya obi, Job mere ka ha mata na ntụkwasị-obi ya dị nime Chineke. Job sịrị, “Le, Ọ gēgbum; m’gagh-echere” (Job 13:15). Dịka ihe nlụpụta nke ntụkwasịobi nke Job, “JEHOVA we tukwasi n’ihe niile Job nwere okpùkpù abua” Jehova gọzikwara ikpe-azụ ndụ Job karị mmalite ya (Job 42:10-12).

Udo Adịghị

Job ritere urù site n’ịtụkwasị Chineke obi. Ma Esa ò ritere urù site n’ịdabere Ben-headad? Ikpe-azụ arọ niile nke ndụ Esa dị iche site na ndụ nke ndị tụkwasịrị Chineke obi. “I nēchebe onye emeworo ka uche ya dabere na Gi, ọ we nādizu n’udo: n’ihi na ọ bụ Gi ka ọ nātukwasi obi” (Aisaia 26:3). Ọ bụ ezie na achụlagara ndịiro Esa n’oge ahụ, o wee wue kwa obodo abụọ site n’ihe mkwata n’agha ahụ, Esa wepụrụ onwe ya site na nchebe na nlekọta nke Chineke o nweghị kwa udo.

Hanani bụ Onye amụma gwara Esa okwu. O chetaara Esa na Chineke anapụtawo ndị agha ya n’aka ụsụ nke ndịiro mgbe ọ dabeere n’Onyenwe anyị. Hanani gwara Esa na o mewo omume nzuzu, na ọ ghaghị enwe kwa udo, kama agha. Okwu ahụ niile mezuru. Agha dị n’etiti Esa na Beasha, bụ Eze Israel, n’ụbọchị niile fọdụrụ nke ndụ ha. Mgbe emesịrị, ndị Asiria bụ ndị ha na Esa gbara ndụ, buru agha megide nwa nwoke Esa onye malitere ịchị n’ọnọdụ ya.

Okwu niile nke Hanani bụ Onye amụma atọghị Esa ụtọ, ọ bụ ezie na ha bụ eziokwu. Esa emeghị omume dịka nwoke onye hụrụ Onyenwe anyị n’anya. Ọ tụbàra Onye amụma ahu n’ụlọ mkpọrọ n’ihi okwu ya niile ahụ, ọ “nēkosa ya ọnuma n’ihi ihe a.” Ọ bụghị náánị Hanani bụ onye Esa mejọrọ. Ụfọdụ ndịọzọ ka o mekpara arụ n’otù oge ahụ.

Ekwesịghị ntụkwasị-obi

Lee otú ọ bụ ihe mwuta ịgụ okwu dị otú a banyere Esa onye malitere nkeọma ifè na ijere Onyenwe anyị ozi! Jisọs sịrị, “Onye were ntachiobi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa” (Matiu 10:22). Baịbụl na-akuzi na ọ bụ náánị ndị kwesịrị ntụkwasịobi rue n’ọgwụgwụ nke ndụ ha bụ ndị ga-anata ụgwọọlụ. Ịmalite isoro Kraist náánị ezughị kama anyị aghaghị ịnọgide n’itụkwasị Onyenwe anyị obi rue n’ọgwụgwụ nke ndụ anyị. N’ọgwụgwụ nke ndụ Pọl, ọ sịrị: “Agbasiwom ngba ọma ahu, agbasiwom ọsọ ahu, edebesiwom okwukwe ahu: nke fọduru bu na edebeworom okpu-eze nke ezi omume ahu” (2 Timọti 4:7, 8).

Iwe na Ọrịa

Ikpe-azụ nke ndụ Esa jupụtara n’iwe na enweghị obiụtọ. Obi agaghị ezu ya ike banyere ntinye o tinyere Onye amụma nke Jehova n’ụlọ mkpọrọ. Ọ ghaghị inweworị amamikpé n’obi ya n’ihi na o mejọrọ ndị ahụ. Ọ dịghị ihe ọ bụla mere aga-eji kwere na o chègharịrị wee rịọ Chineke ka Ọ gbaghara ya. N’ọnọdụ dị otú a, Esa apụghị inwe obiụtọ. Ọzọ kwa, ọ na-arịa ọrịa. Ọ rịara ọrịa n’ụkwụ ya “ọria-ya di uku ri nne.” Ma Esa achọghị kwa Chineke.

Ndịọzọ nime Baịbụl tụkwasịrị Chineke obi maka ọgwụgwọ. Anyị matara na Chineke na-agwọ ndịọrịa taa. Baịbụl gwara anyị ihe anyị ga-eme mgbe anyị na-arịa ọrịa: “Ọ di onye ọ bula n’etiti unu nāhuju anya? ya kpe ekpere. … Ọ di onye ọ bula n’etiti unu nke aru-ya nādigh ike? Ya kpọ ndi-okenye nke nzukọ Kraist ka ha biakute ya; ka ha kpe kwa ekpere n’isi ya, nēte ya manu olive n’aha Onye-nwe-ayi: ekpere nke okwukwe ahu gāzọputa kwa onye ahu aru nādigh ike, Onye-nwe-ayi gēme kwa ka o bilie” (Jemes 5:13-15).

Ma Esa chọrọ ndị dibịa, o wee nwụọ. Ọ bụ ezie na enyere ya òlìlì mara mma were kwa ọtụtụ ụdà ná-esi ísì ụtọ techie arụ ya, suree kwa ọtutụ ihe nsureọkụ ná-esi ísì ụtọ, lee otú ọ ga-akaworị mma ọ bụrụ na apụrụ ikwu na ọ tụkwasịrị Jehova obi rue n’ọgwụgwụ nke ndụ ya, na ọ natakwara ụgwọọlụ nke Chineke na-enye ndị niile kwesịrị ntụkwasịobi. “Le ka ezi ihe-Gi si ba uba, nke i tukọbaworo nye ndi nātu egwu Gi, nke i luworo nye ndi nāgbabà nime Gi n’iru umu madu!” (Abù Ọma 31:19).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Òlee otú Esa si malite ọchịchị ya?
  2. N’ụzọ dị añaa ka o si tụkwasị Jehova obi?
  3. Gịnị ka o mere ka ezi òfùfè wee guzosie ike?
  4. Gịnị mere arụsị nke nne ya?
  5. Ònye nyeere Esa aka n’agha o buru megide ndị Etiopia?
  6. Gịnị mere Esa ji zue ike agha?
  7. Gịnị bụ ndahie nke Esa?
  8. Ònye buru agha megide nwa Esa?
  9. Gịnị bụ ihe ọmụmụ anyị pụrụ ịmụta site ná ndụ Esa?
  10. Gịnị bụ mkwà ụfọdụ dịịrị ndị ná-atụkwasị Chineke obi?