I Ndi Eze 16:29-34; 17:1-24

Lesson 296 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Okpokoro utu ọka ahu agwugh, ite manu ahu akọgh kwa, dika okwu JEHOVA si di” (I Ndi Eze 17:16).
Notes

Mmehie na Onye Mmehie

Nime Akwụkwọ Jenesis anyị na-agụ na iheọjọọ nke mmadụ riri nne n’ụwa na Jehova chègharịrị na Ya mere mmadụ. Ọ sịrị, “M’gēkpochapu madu n’elu ala, bú ndi M’keworo” (Jenesis 6:7). Anyị chètara na anyị mụrụ ihe ọmụmụ banyere Iju-mmiri ahụ nke kpochapụrụ mmadụ niile ewezuga Noa na èzínaụlọ ya. Obi Chineke ka na-enwe kwa mwute n’ebe mmehie nọ, ụbọchị na-abịa kwa mgbe Ọ ga-ezitekwara ndị mmehie mbibi ọzọ. N’ihe ọmụmụ anyị nke taa anyị na-amụ na Ehab bụ Eze “we me ihe ọzọ ikpasu JEHOVA, bú Chineke Israel iwe, karị ndi eze nile nke Israel ndi buru ya uzọ” (I Ndi Eze 16:33).

Elaija, Onye amụma kwesịrị ntụkwasịobi nke Chineke, onye anyị ga-amụta ọtụtụ ihe banyere ya, wee nwee mmetụta banyere mmehie na ikpere arụsị nke dị n’Israel. Ná-atụghị egwù iru nke mmadụ, otù ụbọchị ọ gwara eze sị: “JEHOVA, bú Chineke nke Israel, nādi ndu, Onye m’guzoworo n’iru Ya, igirigi ma-ọbu miri-ozuzo agagh-adi ma-ọli n’arọ ndia, ma ọ bu náni dika okwum si di” (I Ndi Eze 17:1). Aghaghị ikpochapụ mmehie, Elaija jikekwara ịhụ ahụhụ, ọ bụrụ na ọ dị mkpà, ka ewee mee ka ndị ahụ chigharịkute Chineke.

Akwụsịrị Mmiri Òzùzò

Lee otú obi anyị jupụtara n’ekele n’ihi ndị nke Chineke ndị ná-eguzoro eziokwu! Moses setipụrụ mkpan’aka ya n’elu osimmiri, mmiri ahụ wee kewaa (Ọpupu 14:21); nwoke ọzọ, bụ Joshua, nyere anyanwụ na ọnwa iwu, ha wee guzo. Elaija kwuru okwu, mmiri òzùzò niile na ọbụná igirigi wee kwụsị. Ọ matara na Chineke ga-akwụsị mmiri òzùzò. Ma aga-anwapụta okwukwe ya. Ma mmiri ezoghị, ọ naeme ka ihe oriri dị ụkọ, ụnwụ ahụ ga-adị n’ala Israel ga-emetụta kwa ya onwe ya. Elaija, ị pụrụ ịtụkwasị Chineke obi?

Chineke nọ n’ebe ahụ ịgwa ya ebe ọ ga-eje ugbu a ihe niile na-akpọ nkụ nri wee na-akọ kwa. Eze ọjọọ ahụ na-achọgharị kwa Elaija. Ná-arụghị ụkà eze ga-asịworị, “Ọ bụ gi ka aga-ata ụta n’ihi enwegh miri-ozuzo nile a.”

Elaija nọ n’udo, ezobekwara ya nkeọma pụọ n’ebe eze ahụ nọ, ka ọ ná-añụ mmiri sitere n’otù mmiriiyi, náeri kwa achịcha na anụ nke ugolo-ọma na-ebutere ya ụtụtụ na anyasị. O doro anyị anya na ọ bụ Chineke duziri ugolo-ọma ebe ọ ga-ebute nri ahụ. Ma chere, oge mnwapụta ka dị n’iru. Mmiriiyi ahụ wee malite ịtakọrọ ntakịrị ntakịrị, rue otù ụbọchị enweghị kwa ọbụná ntakịrị fọdụrụ. O ruola ugbu a Elaija! Okwu gị kwụsịrị mmiri òzùzò; ugbu a ebe i si enweta mmiri akpọwo nkụ. Gịnị fọdụrụ ugbu a, Elaija?

Nwanyị ahụ Di ya Nwụrụ na Nwa ya Nwoke

Anyị ekweghị na Elaija dara mba ka ọ na-echere okwu sitere n’ọnụ Onyenwe anyị. Eleghịanya akpịrị ya akpọwo nkụ nke ukwu ka ọ na-ele ala ebe mmiri dịrị na mbụ nke kpọsịworo nkụ ugbu a. Ma mgbe ná-adịghị anya, ọ nụrụ olu Chineke ka Ọ na-asị ya, “Bilie, je Zarefat, … biri n’ebe ahu: le, enyewom otù nwayi di ya nwuru nọ n’ebe ahu iwu izù gi” (I Ndi Eze 17:9).

“Ònye bu kwa Onye a, na Ọ nēnye … iwu, ha nāña kwa Ya ntị” (Luk 8:25). Ugolo-ọma ñara ntị n’iwu Chineke; nwanyị ahụ di ya nwụrụ ñakwara ntị n’iwu Ya. Ifufe na mmiri, ụwa niile, osimiri na igweoji, na anụmanụ niile kwa, na-aña ntị n’olu Ya. Náánị ndị mmehie na-ajụ irubeisi n’iwu Ya!

Ogologo ijè ahụ rue Zarefat bụ nke pụrụ iwetara mmadụ ike ọgwụgwụ, o ruru ihe ra ka narị maịlị, maịlị niile nke ụzọ ahụ ga-ewe ya ịtụkwasị Chineke obi n’ijé ya. Ọ bụ kwa mmadụ onye maara agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ dịka anyị onwe anyị n’oge a (Jemes 5:17). Ma, ka ọ na-abà n’obodo ahụ, lee nwanyị ahụ di ya nwụrụ anwụ ka ọ na-achịkọta nkụ. N’ike ọgwụgwụ na akpịrị ịkpọ nkụ site n’ijé ahụ, ná-arụghị kwa ụkà, n’óké agụụ, Elaija sịrị ya, “Biko, kuterem nwanti miri n’ihe, ka m’we ñua.” Ka ọ naaga, ọ kpọrọ ya òkù ọzọ sị, “Biko, wetaram iberibe achicha n’aka gi.”

Akwụghachịrị Ụgwọ n’ihi Irubeisi

O nwere mmiri, ma nri o nwere fọdụrụ náánị ntakịrị. Ọ gwara ya na ya nwere náánị otù nju aka ụtụọka n’okpọkoro na mmanụ ntà n’ite, nke ọ na-akwado idoziri onwe ya na nwa ya nwoke, “ka ayi we rie, nwua.” Mgbe ahụ Elaija wee gwa ya okwu abụọ ahụ ná-enye agbam-ume nime Baịbụl. Na Jenesis 15:1, anyị na-agụ, “Atula egwu”; na Nkpughe 1:17, “Atula egwu.” Ọtụtụ ugbò ka anyị na-agụta “Atula egwu” nime Baịbụl. Lee otú obi anyị jupụtara n’ekele n’ihi okwu ndị ahụ! Ị chèghị na obi nwanyị ogbenye ahụ di ya nwụrụ anwụ ga-ejupụtaworị n’ọñụ n’okwu nnabata ndị ahụ?

O mere ngwa jee irubere Elaija isi. O buru ụzọ mee otù achịcha wetara ya; o wee meere onwe ya mee kwara nwa ya nwoke. Ọ bụrụ na mmadụ eburu ụzọ chee ihe banyere ndịọzọ, o doro anya na ngọzi nke Onyenwe anyị na-eso. N’ezie, o sokwara nwanyị a di ya nwụrụ anwụ, n’ihi na ya na ụlọ ya niile nwere nri ha riri nke zuuru ha ọtụtụ ụbọchị. Ụtụ ọka agwụghị n’okpokoro ahụ, mmanụ akọghị kwa n’ite rue mgbe ụnwụ ahụ gwụrụ (I Ndi Eze 17:14-16). Ị chèghị na nwaokoro ahụ ga-eguzo naele nne ya n’ịtụn’anya, ka ọ na-ewepụta ụtụọka site n’okpokoro ahụ, ná-echè ebe o sitere? ọ bụ kwa na ị kweghị na nne ahụ ga-agwaworị nwa ya na Chineke na-etinye ya n’ihi na ya enwewo obiọma n’ebe Onye amụma Ya nọ?

Ule Ọzọ

Emesịa, otù ụbọchị nwaokoro ntà ahụ wee rịa ọrịa nwụọ kwa. Di nke nne ahụ bụ ogbenye anwụwo, ugbu a nwa ya wee nwụọ kwa. Ọ fọdụrụ ntakịrị ka ọ dị ka Jehova echigharịwo iru Ya imegide nwanyị a di ya nwụrụ anwụ, ma nke a bụ náánị ụzọ igosi ya na Elaija bụ onye nke Chineke n’ezie. O wee jekwuru Elaija otù ugbò ahụ maka inyeaka. O wee nara nwa ahụ, buru kwa ya rịgoo nime ụlọ nke ya debe kwa ya n’elu ihe ndina ya. Nke a bụ ule ọzọ elere okwukwe Elaija, ma Chineke ekwesịwo ntụkwasịobi nye ya: o riwo achịcha na anụ ugolo-ọma butere; ọ ñụwo mmiri sitere ná mmiriiyi ahụ; o riwo nri na table nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ anwụ.

O kpesiri ekpere ike nye Chineke maka nwa ahụ nime ụlọ náánị ya. Chineke zakwara ekpere ya ọzọ n’oge hour nke mkpà a wee nyeghachi nwa ahụ ndụ. “Le, nwa-gi nādi ndu,” ka o kwuru ka ọ na-enye nne ahụ nwa ya. “Nwayi ahu we si Elaija, ugbu a amawom nka na onye nke Chineke ka i bu, na okwu Jehova bu kwa ezi-okwu n’ọnu-gi” (I Ndi Eze 17:24). O chèwo na ọ bụ onye nke Chineke mgbe ụtụ ọka na mmanụ ahụ na-abawanye, ma ugbu a ọ matawo na Elaija bụ onye nke Chineke n’eziokwu. Anya ya nke okwukwe pụrụ ịhụ gafee nwoke ahụ hụ Chineke nke ọ na-efè. N’ezie O zigaworo ya nwanyị ahụ, n’ihi na anyị na-agụ na enwere ọtụtụ ndịnyom di ha nwụrụ n’Israel n’oge ahụ, mgbe óké ụnwụ dị n’ala ahụ, ma ọ dịghị onye ọ bụla nime ha ezigaara Elaija (Luk 4:25). Chineke matara na nwanyị a nke ọ fọdụrụ ntakịrị ka ọ nwụọ ga-erubeisi n’iwu nke Elaija. Chineke hụrụ omume nke echèreghị onwe onye náánị nke obi ya, ekele na ịhụn’anya ọ ga-egosi Elaija. Ọ matara na ọ ga-ekwere n’ihe ịrịba-àmà niile onye nke Chineke ahụ ga-eme. Otú ahụ ka o mekwara.

Ịtụkwasị Chineke Obi

Otù nwanyị gbara àmà n’òfùfè nrò na ọ dịbeghị mgbe ya nwere ohere ịnọ n’agụụ n’ihi Oziọma. Ọ bụrụ na elee anyị ule dịka Elaija ma ọbụ nwanyị Zarefat ahụ di ya nwụrụ anwụ, ànyị pụrụ ịtụkwasị Chineke obi? Jisọs sịrị, “Tugharinu uche n’ugolo-ọma: … Chineke nāzu ha: ùnu onwe-unu abugh ihe oké ọnu-ahia kari anu-ufe nke-uku?” “Tugharinu uche n’urodi … Ma ọ buru na Chineke eyikwasi ahihia di n’ubi uwe otú a, … Ọ gagh-eyikwasi kari unu uwe nke-uku, unu ndi okwukwe ntà?” (Luk 12:24, 27, 28). N’ebe a anyi nwere mkwà nke ihe oriri na uwe oyiyi. Agwakwara anyị sị: “Ọbụná agiri-isi nile nke isi-unu ka aguworo” (Matiu 10:30); “Ya mere, unu atula egwu; ọnu-ahia unu onwe-unu kariri nke ọtụtụ egwele” (Matiu 10:31). N’Abù Ọma 147:9, anyị na-agụ, “Ọ nēnye anumanu nri-ya, nēnye kwa umu-ugolo-ọma nke nākpọku Ya.” Ọ bụrụ na Chineke na-echè échìchè banyere ugolo-ọma, lee otú Ọ ga-enyezu ụmụ-ogbenye na ndịnyom ná-enweghị di ihe niile ná-akpá ha, (Abù Ọma 146:9) ma anyị niile kwa. Ànyị pụrụ ịtụkwasị Ya obi n’ebe siri ike?

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Òlee ebe agwara Elaija ka o jee zoo onweya?
  2. Òlee ụdị nnunu ná-ebutere ya nri?
  3. Chọta ebe ọzọ nime Akwụkwọnsọ nke ná-ekwu okwu banyere nnụnụ ndịa.
  4. Òlee ebe ezigara Elaija mgbe mmiriiyi ahụ takọọrọ?
  5. Gịnị bụ ihe mbụ ọ rịọrọ nwanyị ahụ di ya nwụrụ anwụ? Na nke abụọ?
  6. Elaija ọ sịrị na ụtụ ọka na mmanụ ahụ ga-adịru ole mgbe?
  7. Kwue ihe mere mgbe nwa nwoke nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ anwụ nwụrụ.
  8. Gịnị ka ị chère kpatara eji ziga Elaija ijékwuru nnọọ nwanyị nke di ya nwụrụ anwụ?